Ibi Ndụ n’Ụzọ Kwekọrọ ná Nkwa Alụmdi na Nwunye Gị!
ỤBỌCHỊ agbamakwụkwọ bụ ụbọchị ọṅụ. Ọ bụkwa ihe omume siri ike. Di na nwunye ọhụrụ ahụ na-ekwe nkwa siri ike nke ga-emetụta ndụ ha nile n’ihu. Ndị bịara agbamakwụkwọ ahụ dị ka ndị ọbịa bụ ndị akaebe nke nkwa a siri ike, ma Jehova Chineke bụ Onye Akaebe bụ isi.
Bible ekwughị usoro ọ bụla kpọmkwem ma ọ bụ ụdị ememe agbamakwụkwọ pụrụ iche a ga-eme. Ma, n’ịmata na o sitere n’aka Chineke, alụmdi na nwunye bụ nke a na-eme ka ọ dị nsọ dị ka a na-emekarị site n’iji nkwa agbamakwụkwọ eme ihe n’oge ememe okpukpe. Ruo ọtụtụ afọ Ndịàmà Jehova anọwo na-eji nkwa alụmdi na nwunye nke na-esonụ na-eme ihe: “Mụ —— na-ewere gị —— ịbụ (nwunye/di) m nke m ji gbaa akwụkwọ, ịhụ gị n’anya na ilekọta gị (Nwunye ọhụrụ: na ịsọpụrụ gị n’ụzọ dị omimi) dị ka iwu Chineke nke e dere n’Akwụkwọ Nsọ nye ndị Kraịst (bụ nwunye/di) si dị, ruo ogologo oge anyị abụọ ga-ebikọ n’elu ụwa dị ka ndokwa alụmdi na nwunye nke Chineke mere si dị.”a
Ihe A Ga-echebara Echiche
Ọ bụrụ na ị na-eche echiche ịlụ di ma ọ bụ nwunye, ọ ga-abụ ihe bara nnọọ uru iche echiche banyere ịdị omimi na ihe nkwa a pụtara tupu ụbọchị agbamakwụkwọ ahụ. Solomọn sịrị: “Ekwela ka ọnụ gị kwuo okwu ọsọ ọsọ, emekwala ka obi gị mee ngwa iwepụta okwu n’ihu Chineke.” (Eklisiastis 5:2) Gịnịkwanụ ma ọ bụrụ na ị lụọla alụọ? Mgbe ahụ ị ga-erite uru site n’ịtụgharị uche n’ịdị mkpa nke nkwa a siri ike nke i kwere n’ihu Jehova. Ị̀ na-adị ndụ n’ụzọ kwekọrọ na ya? Ndị Kraịst na-eji nkwa ha akpọrọ ihe. Solomọn gara n’ihu, sị: “Ihe ị na-ekwe ná nkwa, kwụghachi ya. Ọ dị mma ka ị ghara ikwe nkwa, karịa ikwe nkwa ma ị dịghị akwụghachi. Ekwela ka ọnụ gị mee anụ ahụ gị ka o mehie; asịkwala n’ihu onye ozi Chineke, na ọ bụ n’amaghị ama ka e mere ya.”—Eklisiastis 5:4-6.
Obi abụọ adịghị ya na ịtụle okwu ndị dị ná nkwa agbamakwụkwọ ahụ otu otu ga-atụkwasị ihe ná nghọta i nwere banyere nkwa a siri ike.
“Mụ —— na-ewere gị”: Ndị a bụ okwu nkwa ahụ ji malite. Ha na-eme ka ọ pụta ìhè na ị na-anakwere ibu ọrụ onwe onye maka mkpebi gị ịlụ di ma ọ bụ nwunye.
Ná ndokwa ndị Kraịst, e nweghị iwu ọ bụla nke Akwụkwọ Nsọ nke na-amanye mmadụ ịlụ di ma ọ bụ nwunye. Jisọs Kraịst n’onwe ya nọgidere n’alụghị nwunye ma tụọrọ ndị “pụrụ ịnagide ya” aro ịnọ n’alụghị di ma ọ bụ nwunye. (Matiu 19:10-12) N’aka nke ọzọ, ihe ka ukwuu ná ndị ozi Jisọs bụ ndị ikom lụrụ nwunye. (Luk 4:38; 1 Ndị Kọrint 9:5) O doro anya na mkpebi nke ịlụ di ma ọ bụ nwunye bụ okwu aka mmadụ. Ọ dịghị mmadụ ọ bụla nwere ikike Akwụkwọ Nsọ kwadoro ịmanye onye ọzọ ịlụ di ma ọ bụ nwunye.
N’ihi ya, ọ dị gị n’aka ịhọrọ ịlụ di ma ọ bụ nwunye. Ma eleghị anya, i ji aka gị họrọ onye ị na-alụ. Mgbe i kwere nkwa alụmdi na nwunye ahụ, na-asị, ‘Mụ na-ewere gị——,’ ị na-ewere ma ọ bụ na-anakwere onye ahụ na àgwà ọma ya nile—tinyekwara mmejọ ya nile.
Ka oge na-aga ma eleghị anya ị ga-achọpụta àgwà ndị ị na-amaghị na di ma ọ bụ nwunye gị nwere. A ga-enwe ihe agaghị dị ka e chere ya mgbe ụfọdụ. Bible na-asị na “mmadụ nile emehiewo, ha adịghị erukwa otuto Chineke.” (Ndị Rom 3:23) Ya mere ọ pụrụ ịdị gị mkpa ime mgbanwe ụfọdụ iji nabata di ma ọ bụ nwunye gị. Nke a pụrụ isi ike, mgbe ụfọdụkwa ọ pụrụ ịdị gị ka ọ bụ gị chịlie aka. Ma cheta, a na-ekwe nkwa alụmdi na nwunye n’ihu Jehova. Ọ pụrụ inyere gị aka inwe ihe ịga nke ọma.
“Ịbụ (nwunye/di) m nke m ji gbaa akwụkwọ”: N’agbamakwụkwọ mbụ e mere, mgbe a lụnyere Adam Iv, Jehova Chineke kwuru na “ha ewee ghọọ otu anụ ahụ.” (Jenesis 2:24; Matiu 19:4-6) N’ihi ya njikọ alụmdi na nwunye bụ mmekọrịta kasị chie anya nke pụrụ ịdị n’etiti mmadụ abụọ. Alụmdi na nwunye na-ewebata gị ná mmekọrịta ọhụrụ. Ị na-anakwere mmadụ ịbụ ‘nwunye nke i ji gbaa akwụkwọ’ ma ọ bụ ‘di nke i ji gbaa akwụkwọ.’ Ọ dịghị ka mmekọrịta ọ bụla ọzọ. Omume ndị na-akpata ntakịrị nsogbu ná mmekọrịta ndị ọzọ pụrụ ịkpata oké mwute ná ndokwa alụmdi na nwunye.
Were, dị ka ihe atụ, ndụmọdụ Akwụkwọ Nsọ ahụ a na-achọta ná Ndị Efesọs 4:26. N’ebe ahụ Bible na-asị: “Unu emehiela mgbe unu na-ewe iwe: ekwela anyanwụ daa ná mkpasu iwe unu.” Ikekwe ọ bụghị mgbe nile ka i doziworo nsogbu gị na ndị ikwu na ndị enyi gị nwere ngwa ngwa dị ka i kwesịrị. Ma di ma ọ bụ nwunye gị dị gị nso karịa onye ikwu ma ọ bụ enyi ọ bụla ọzọ. Edozighị okwu ngwa ngwa n’etiti gị na onye òtù ọlụlụ gị pụrụ itinye mmekọrịta ahụ pụrụ iche nke dị n’etiti unu abụọ n’ihe ize ndụ.
Ị̀ na-ekwe ka nghọtahie nke dị n’etiti gị na di gị ma ọ bụ nwunye gị ghọọ ihe mkpasu iwe ma ọ bụ obi ilu na-aga n’ihu? Nghọtahie na ọnọdụ ndị na-akpasu iwe hà na-adịgide ruo ọtụtụ ụbọchị? Iji bie ndụ n’ụzọ kwekọrọ ná nkwa gị, mgbe ihe isi ike bilitere ekwela ka otu ụbọchị gafere n’esoroghị di ma ọ bụ nwunye gị kpee udo. Nke a pụtara ịdị na-agbaghara ma na-echezọ tinyere ịnakwere mmejọ ndị nke gị na mmehie gị nile.—Abụ Ọma 51:5; Luk 17:3, 4.
“Ịhụ gị n’anya”: Onye ahụ gaje ịghọ di na-ekwe nkwa ‘ịhụ nwunye ọhụrụ ya n’anya na ilekọta ya.’ Ịhụnanya a na-agụnye ịhụnanya nwoke na nwanyị nke dọtara ha nso ma eleghị anya. Ma ịhụnanya nwoke na nwanyị ezughị. Ịhụnanya nke onye Kraịst na-ekwe ná nkwa igosi di ma ọ bụ nwunye ya dị omimi saakwa mbara karịa nke ahụ.
Ndị Efesọs 5:25 na-asị: “Ndị bụ di, hụnụ nwunye unu n’anya, dị ka Kraịst anyị hụkwara nzukọ Ya n’anya.” Ịhụnanya Jisọs maka nzukọ ya na ịhụnanya nwoke na nwanyị anọghị n’otu ọkwá ahụ ma ọlị. Okwu bụ́ “hụnụ” na “hụkwara” bụ́ ndị e ji mee ihe n’akụkụ akwụkwọ nsọ a sitere n’okwu bụ́ a·gaʹpe, nke na-ezo aka n’ịhụnanya nke ụkpụrụ na-eduzi. N’ebe a Bible na-enye ndị bụ di iwu inwe ịhụnanya nke na-adị mgbe nile, nke na-adịghị agha agha, nke na-adịgide adịgide maka ndị nwunye ha.
Ọ bụghị nanị ụdị mmetụta uche nke “ahụrụ m gị n’anya n’ihi na ị hụrụ m n’anya.” Onye bụ di na-achọ ọdịmma nke nwunye ya ọbụna na-ebute ya ụzọ tupu nke ya, nwunye na-ahụkwa di ya n’anya n’otu ụzọ ahụ. (Ndị Filipaị 2:4) Ịzụlite ịhụnanya dị omimi maka onye òtù ọlụlụ gị ga-enyere gị aka ibi ndụ kwekọrọ ná nkwa alụmdi na nwunye gị.
“Ilekọta”: Dị ka otu akwụkwọ ọkọwa okwu si kwuo, “ilekọta” pụtara ‘iji kpọrọ oké ihe, inwe ma ọ bụ igosi ịhụnanya maka.’ Ị ghaghị igosipụta ịhụnanya gị ma n’okwu ọnụ ma n’omume! Ọ dị nwunye mkpa karịsịa inweta mgbe nile ihe ngosipụta nke ịhụnanya di ya. Di ya pụrụ igbo mkpa anụ ahụ nile nke nwunye ya nke ọma, ma nke a ezughị. E nwere ndị nwunye nwere ihe oriri zuuru ha na ebe obibi mara mma ma ha bụ ndị obi na-adịghị ụtọ ma ọlị n’ihi ịbụ ndị ndị òtù ọlụlụ ha lefuuru anya.
N’aka nke ọzọ, nwunye nke maara na a hụrụ ya n’anya, jirikwa ya kpọrọ ihe nwere n’ezie ihe mere ọ ga-eji nwee obi ụtọ. N’ezie, a pụkwara ikwu otu ihe ahụ banyere di. A na-atụkwasikwu ihe n’ụzọ dị ukwuu n’ezi ịhụnanya site n’okwu ịhụnanya ndị sitere n’obi. N’Abụ nke Abụ, onye ọzụzụ atụrụ ahụ nke nwere ịhụnanya tiri mkpu, sị: “Lee ka okwu ịhụnanya gị nile si maa mma nke ukwuu, ewo nwanne m nwanyị, nwunye ọhụrụ nke m! Lee ka okwu ịhụnanya gị nile si dị mma nke ukwuu karịa mmanya, ísì ụtọ nke mmanụ gị nile kwa karịa ụdị ihe nile na-esi ísì ụtọ!”—Abụ nke Abụ 4:10, NW.
“Ịsọpụrụ gị n’ụzọ dị omimi”: Kemgbe ọtụtụ narị afọ, e nwewo ndị ikom metọworo ma wedaa ụmụ nwanyị ala. Ọbụna taa, dị ka magazin bụ́ World Health si kwuo, “imeso ụmụ nwanyị ihe ike na-eme ná mba nile na n’ọkwá nile nke ọha mmadụ na nke akụ̀ na ụba. N’ọtụtụ ọdịbendị, a na-ele iti nwunye ihe dị ka ihe ruuru nwoke.” Ọ pụrụ ịbụ na ihe ka n’ọnụ ọgụgụ n’ụmụ nwoke adịghị akpa àgwà dị otú ahụ. Ka o sina dị, ọ na-eyi ka ọtụtụ ụmụ nwoke adịghị egosi ezi mmasị n’okwu ndị metụtara ụmụ nwanyị. N’ihi ya, ọtụtụ ụmụ nwanyị azụlitewo àgwà na-adịghị mma banyere ụmụ nwoke. A nụwo ka ụfọdụ ndị nwunye kwuru, sị, “Ahụrụ m di m n’anya, ma apụghị m nnọọ ịsọpụrụ ya!”
Otú ọ dị, Jehova Chineke na-aja nwanyị nke na-agbalị ịsọpụrụ di ya mma—a sịgodi na di ya adịghị emezu ihe ndị ọ na-atụ anya ha site n’oge ruo n’oge. Ọ na-aghọta na di ya nwere ọrụ, ma ọ bụ ọkwá Chineke nyere ya. (1 Ndị Kọrint 11:3; Ndị Efesọs 5:23) N’ihi ya, nsọpụrụ dị omimi maka di ya bụ otu akụkụ nke ofufe na nrubeisi ya nye Jehova. Chineke adịghị eleghara nrubeisi nke ụmụ nwanyị na-atụ egwu Chineke anya.—Ndị Efesọs 5:33; 1 Pita 3:1-6: tụlee Ndị Hibru 6:10.
Nsọpụrụ n’alụmdi na nwunye aghaghị ịbụ nke ha na-enyerịta ibe ha, o kwesịkwara ịbụ nke a rụrụ ọrụ iji nweta kama ịbụ nanị nke a tụrụ anya ya ma ọ bụ kwuo ka e nye. Dị ka ihe atụ, e nweghị ohere ọ bụla maka okwu mkparị ma ọ bụ nke mkpasu iwe ná ndokwa alụmdi na nwunye. Ọ gaghị abụ ihe ịhụnanya ma ọ bụ nke nsọpụrụ ikwu okwu mweda n’ala banyere di ma ọ bụ nwunye gị. Ọ dịghị ezi ihe ga-esi n’ikpughere ndị ọzọ mmejọ di gị ma ọ bụ nwunye gị pụta ma ọ bụ ikwu banyere ha n’ihu ọha. Ọbụna n’egwuregwu mmadụ pụrụ igosi oké enweghị nsọpụrụ n’akụkụ a. Okwu dị ná Ndị Efesọs 4:29, 32 na-emetụta ma di ma nwunye. N’ebe ahụ Bible na-ekwu, sị: “Ka okwu ọ bụla nke na-ere ure ghara isi n’ọnụ unu pụta, kama ihe bụ ezi ihe, iwuli mmadụ elu dị ka ụlọ, dị ka mkpa si dị . . . Nwerịtanụ obi ọma n’ahụ ibe unu, nweenụ obi ọmịiko.”
‘Dị ka iwu Chineke nke e dere n’Akwụkwọ Nsọ si dị’: Chineke chọrọ ka anyị nwee nnwere onwe nke ime nhọrọ na nke ime ihe. Ọ dịghị eji ihe ndepụta zuru ezu nke iwu ndị na-achịkwa ndụ alụmdi na nwunye ebogbu anyị. Ma, o setịpụwo ihe nduzi ụfọdụ maka ọdịmma anyị.
Taa, e nwere ụba nke akwụkwọ e biri ebi banyere alụmdi na nwunye, ọtụtụ ndị nwekwara echiche nke ha dịgasị iche iche. Ma, kpachara anya! N’okwu alụmdi na nwunye, ihe dị ukwuu n’ihe ọmụma nke a na-agbasa na-emegide Bible.
Ghọtakwa na ọnọdụ otu di na nwunye na-adị iche n’ebe di na nwunye ọzọ dị. N’ụzọ ụfọdụ, ndị lụrụ di na nwunye yiri mpekere snow; ha pụrụ iyi onwe ha site n’ebe dị anya, ma n’ezie nke ọ bụla pụrụ iche, dị iche ná ndị ọzọ nile. Di na nwunye ọ bụla ọzọ nọ n’ụwa adịghị emepụta ihe yiri njikọta nke àgwà gị na nke di ma ọ bụ nwunye gị. Ya mere emela oké ngwa ngwa ịnakwere echiche onwe onye nke ndị ọzọ. E nweghị ụkpụrụ ọ bụla mmadụ mepụtara nke na-arụ ọrụ n’alụmdi na nwunye nile!
N’ụzọ dị iche na nke ahụ, iwu nile nke Bible bụ eziokwu ma na-arụkwa ọrụ. Pọl onyeozi dere, sị: “Ihe nile e deworo n’akwụkwọ nsọ bụ ihe si n’obi Chineke pụta, ọ bakwara uru iji zie ihe, na iji tụọ mmadụ mmehie ha n’anya, na iji mee ka uche mmadụ guzozie.” (2 Timoti 3:16; Abụ Ọma 119:151) Ọ bụrụ na ị gụọ Bible ma nakwere ozizi ya nile dị ka ihe nduzi ná ndụ ị na-adị kwa ụbọchị, ị ga-enwe ike ibi ndụ n’ụzọ kwekọrọ ná nkwa alụmdi na nwunye gị.—Abụ Ọma 119:105.
“Ruo ogologo oge anyị abụọ ga-ebikọ n’elu ụwa”: Nke a na-ezo aka n’ibikọ ọnụ na-adịte anya. Chineke na-enye iwu na “nwoke ga-ahapụ nna ya na nne ya, rapara n’ahụ nwunye ya.” (Jenesis 2:24) Jehova chọrọ ka unu bikọọ ọnụ. Jekọọrọ Chineke ozi ọnụ. Mụkọọ Okwu ya ọnụ. Wepụta oge gagharịkọọ ọnụ, nọdụkọọ ọnụ, rịkọọ nri ọnụ. Kporikọọ ndụ ọnụ!
Ụfọdụ ndị di na nwunye na-eme mgbalị iwepụta oge kwa ụbọchị nanị iji gwa ibe ha okwu. Ọbụna mgbe ọtụtụ afọ nke alụmdi na nwunye gasịrị, imekọ ihe ọnụ a dị mkpa maka obi ụtọ alụmdi na nwunye.
“Dị ka ndokwa alụmdi na nwunye nke Chineke mere si dị”: Alụmdi na nwunye bụ onyinye sitere n’aka Jehova Chineke, bụ́ onye guzobere ndokwa alụmdi na nwunye. (Ilu 19:14) Agbasoghị ndokwa nke a ga-eyi ọ bụghị nanị obi ụtọ nke alụmdi na nwunye gị egwu kamakwa mmekọrịta nke gị na Onye Okike. N’aka nke ọzọ, mgbe di na nwunye zụlitere ezi mmekọrịta nke ha na Jehova, nke a na-egosipụta site ná nrubeisi nye ndokwa ya nile, ha na ndị ọzọ ga-enwe mmekọrịta dị n’udo, tinyere ha abụọ.—Ilu 16:7.
Echezọla mgbe ọ bụla na Jehova bụ Onye Akaebe bụ isi nke nkwa alụmdi na nwunye gị. Nọgide na-ebi ndụ n’ụzọ kwekọrọ ná nkwa a siri ike, alụmdi na nwunye gị ga-abụkwa ihe na-ewetara Jehova Chineke otuto!
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
a N’ebe ụfọdụ a pụrụ inwe mkpa nke iji ụdị nkwa a nke a gbanwere agbanwe mee ihe iji rube isi n’iwu dị n’ógbè ahụ. (Matiu 22:21) Otú ọ dị, n’ihe ka n’ọnụ ọgụgụ mba, ndị di na nwunye bụ ndị Kraịst na-eji nkwa ahụ e depụtara n’elu eme ihe.
[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 22]
N’ụzọ ụfọdụ, ndị lụrụ di na nwunye yiri mpekere snow. Ha nile pụrụ iyi onwe ha site n’ebe dị anya, ma n’ezie di na nwunye ọ bụla dị nnọọ iche
[Ebe E Si Nweta Foto]
Snow Crystals/Dover