Ebula Iwe n’Obi
Ọ PỤRỤ iyi ihe ịma aka karịa mgbe ọ bụla ọzọ izere ibu iwe n’obi mgbe mmadụ mejọrọ anyị. Bible nwere ndụmọdụ dị irè banyere ọnọdụ ndị dị otú ahụ. “Unu emehiela,” ka Pọl onyeozi dere, “mgbe unu na-ewe iwe: ekwela anyanwụ daa ná mkpasu iwe unu.”—Ndị Efesọs 4:26.
Mgbe mmadụ mejọrọ anyị, ọ bụ nnọọ ihe a tụrụ anya ya iwetụ iwe. Na Pọl kwuru “mgbe unu na-ewe iwe” na-enye echiche nke na iwe ahụ pụrụ ikwesị ekwesị mgbe ụfọdụ—ma eleghị anya ná nzaghachi nye mmeso ikpe na-ezighị ezi ma ọ bụ ikpejọ ikpe. (Tụlee 2 Ndị Kọrint 11:29.) Ma mgbe a na-edozighị ya, ọbụna iwe ziri ezi pụrụ ịkpata mbibi, na-eduba ná mmehie dị ukwuu. (Jenesis 34:1-31; 49:5-7; Abụ Ọma 106:32, 33) Ya mere, gịnị ka ị pụrụ ime mgbe a kpasuru gị iwe?
N’ọnọdụ ka ukwuu metụtara njehie ndị dị nta, ị pụrụ ikpezi okwu ahụ n’obi gị ma “dere duu” ma ọ bụ jekwuru onye ahụ mejọrọ gị ma tụlee okwu ahụ. (Abụ Ọma 4:4; Matiu 5:23, 24) N’agbanyeghị nke e mere, ọ kasị mma idozi okwu ahụ ngwa ngwa ka iwe ghara ịka njọ ma mụpụta ihe ọdachi dị iche iche.—Ndị Efesọs 4:31.
Jehova na-agbaghara mmehie anyị n’ụba, ọbụna mmehie ndị ọ pụrụ ịbụ na anyị amaghị na anyị mere n’ihi anyị amaghị nke a na-akọ. Ọ̀ bụ na anyị apụghị n’otu aka ahụ ịgbaghara njehie dị nta nke mmadụ ibe anyị?—Ndị Kọlọsi 3:13; 1 Pita 4:8.
N’ụzọ na-adọrọ mmasị, okwu Grik maka “gbaghara” pụtara n’ụzọ nkịtị “ịhapụ.” Mgbaghara adịghị achọ ka anyị were ihe ọjọọ n’ihe dị nta ma ọ bụ nakwere ya. Mgbe ụfọdụ ọ pụrụ nanị ịgụnye ịhapụ ọnọdụ ahụ, na-amata na ihe ibu iwe n’obi ga-eme agwụla itinye ihe n’ibu arọ gị ma kpaghasịa ịdị n’otu nke ọgbakọ ndị Kraịst. Ọzọkwa, ibu iwe n’obi pụrụ ịbụ ihe na-emebi ahụ ike gị!—Abụ Ọma 103:9.