-
Alụmdi na Nwunye Ò kwesịrị Ịbụ Njikọ Na-adịru Ogologo Ndụ Nile?Teta!—2001 | Febụwarị 8
-
-
Ndị Efesọs 4:26: “Ekwela anyanwụ daa ná mkpasu iwe unu.”a Otu nwoke nke nọ n’alụmdi na nwunye na-enye obi ụtọ kwenyere na akụkụ Akwụkwọ Nsọ a na-enyere ya na nwunye ya aka idozi nghọtahie n’egbughị oge. “Ọ bụrụ na ị pụghị ihi ụra mgbe unu nwesịrị nghọtahie, ọ dị ihe na-agahie agahie. Ị pụghị ịhapụ ka nsogbu ahụ gaa n’ihu,” ka o kwuru. Mgbe ụfọdụ ya na nwunye ya anọwo na-ekwurịta nsogbu ha ruo n’ime abalị. Ma ọ na-adị irè. Ọ gbakwụnyere, sị: “Itinye ụkpụrụ Bible n’ọrụ arụpụtawo ihe ndị magburu onwe ha.” Site n’ime nke a, nwoke a na nwunye ya enweela alụmdi na nwunye na-enye obi ụtọ ruo afọ 42.
-
-
Alụmdi na Nwunye Ò kwesịrị Ịbụ Njikọ Na-adịru Ogologo Ndụ Nile?Teta!—2001 | Febụwarị 8
-
-
a Dị ka usoro ọgụgụ oge nke Etiti Ebe Ọwụwa Anyanwụ Ụwa na narị afọ mbụ si dị, ụbọchị na-agwụ mgbe anyanwụ dara. Ya mere Pọl na-agba ndị na-agụ akwụkwọ ya ume iso ndị ọzọ dịrị n’udo tupu ụbọchị nke ọ bụla agafee.
-