Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w97 5/15 p. 15-20
  • Nlekọta Ọchịchị Chineke n’Oge Ndị Kraịst

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Nlekọta Ọchịchị Chineke n’Oge Ndị Kraịst
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Òtù Na-achị Isi Nọ n’Ọrụ
  • Nlekọta n’Oge A
  • Nkwado Maka Israel nke Chineke
  • “Ọgbọ . . . Ga-abịa”
  • Ị̀ Natawo “Mmụọ Nke Eziokwu Ahụ”?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2002
  • Ònye Na-eduzi Ndị Chineke Taa?
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2017
  • Ndị Na-ebikọ ‘n’Ala’ E Weghachiri Eweghachi
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
  • Inye Òtù Na-achị Isi Nkwado n’Oge A
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
w97 5/15 p. 15-20

Nlekọta Ọchịchị Chineke n’Oge Ndị Kraịst

“Ọ dị Ya ezi mma . . . ịchịkọta ihe nile n’ime Kraịst anyị dị ka Isi, bụ́ ihe nile dị n’eluigwe, na ihe nile dị n’elu ụwa.” —NDỊ EFESỌS 1:9, 10.

1, 2. (a) Olee otú nchịkọta nke “ihe nile dị n’eluigwe” siri gaa n’ihu, na-amalite na 33 O.A.? (b) Olee otú ndị Kraịst e tere mmanụ siworo gosipụta mmụọ nke Mosis na Elaịja kemgbe 1914?

NCHỊKỌTA a nke “ihe nile dị n’eluigwe” malitere na 33 O.A., mgbe a mụrụ “Israel nke Chineke.” (Ndị Galetia 6:16; Aịsaịa 43:10; 1 Pita 2:9, 10) Mgbe narị afọ nke mbụ O.A. gasịrị, nchịkọta ahụ kwụsịlatara ka “ata” si n’ezi ofufe dapụ nke Setan kụrụ tokpuchiri ezi ndị Kraịst (ndị Jisọs kpọrọ “ọka”). Ma ka “mgbe ọgwụgwụ” ahụ na-eru nso, ezi Israel nke Chineke pụtaghachiri n’anya mmadụ, na 1919 kwa a họpụtara ya ilekọta ihe nile Jisọs nwere.a—Matiu 13:24-30, 36-43; 24:45-47; Daniel 12:4.

2 N’oge agha ụwa mbụ, ndị Kraịst e tere mmanụ rụrụ ọrụ ebube dị iche iche, dị nnọọ ka Mosis na Elaịja mewororị.b (Mkpughe 11:5, 6) Kemgbe 1919 ha ekwusawo ozi ọma ahụ n’ụwa na-ebu iro, na-eji obi ike nke Elaịja na-eme otú ahụ. (Matiu 24:9-14) Kemgbe 1922 kwa ha akpọsawo ikpe Jehova n’ahụ ihe a kpọrọ mmadụ, dị nnọọ ka Mosis wetara ihe otiti Chineke n’ahụ Ijipt oge ochie. (Mkpughe 15:1; 16:2-17) Ihe fọdụrụ nke ndị Kraịst a e tere mmanụ bụ taa ndị bụ isi mejupụtara òtù ụwa ọhụrụ nke Ndịàmà Jehova.

Òtù Na-achị Isi Nọ n’Ọrụ

3. Ihe omume ndị dị aṅaa na-egosi na a haziri ọgbakọ ndị Kraịst oge mbụ nke ọma?

3 Site ná mmalite, a haziri ụmụazụ Jisọs e tere mmanụ ahazi. Ka ọnụ ọgụgụ nke ndị na-eso ụzọ mụbara, e hiwere ọgbakọ dị iche iche, a họpụtakwara ndị okenye. (Taịtọs 1:5) Mgbe 33 O.A. gasịrị, ndị ozi 12 jere ozi dị ka òtù na-achị isi nke nọ n’isi ime mkpebi. N’ihi ya, ha butere ụzọ n’atụghị egwu n’ọrụ ịgba àmà ahụ. (Ọrụ 4:33, 35, 37; 5:18, 29) Ha haziri ikesara ndị nọ ná mkpa nri, ha zigakwara Pita na Jọn Sameria ime ihe ozugbo banyere akụkọ maka mmasị e nwetara n’ebe ahụ. (Ọrụ 6:1-6; 8:6-8, 14-17) Banabas kpọgaara ha Pọl iji mesie ha obi ike na onye a bụbu onye mkpagbu bụ ugbu a onye na-eso Jisọs. (Ọrụ 9:27; Ndị Galetia 1:18, 19) Mgbe Pita mesịịrị Kọniliọs na ezinụlọ ya nkwusa, ọ laghachiri Jerusalem ma kọwaara ndị ozi na ụmụnna ndị Judia ọzọ otú mmụọ nsọ siworo gosipụta uche Chineke n’ọnọdụ a.—Ọrụ 11:1-18.

4. Mgbalị dị aṅaa ka e mere igbu Pita, ma olee otú e si zọpụta ndụ ya?

4 Mgbe ahụ a wakporo òtù na-achị isi n’ụzọ obi ọjọọ. A tụrụ Pita mkpọrọ, ọ bụkwa nanị ntinye aka nke mmụọ ozi zọpụtara ndụ ya. (Ọrụ 12:3-11) Ugbu a na nke mbụ ya, onye ọzọ na-esoghị n’ime ndị ozi 12 ahụ batara n’ọkwá dị elu na Jerusalem. Mgbe a tọhapụrụ Pita site na mkpọrọ, ọ gwara otu ìgwè gbakọtara n’ụlọ nne Jọn Mak, sị: “Kọọrọ Jemes [onye otu nne ji ya na Jisọs] na ụmụnna anyị ihe ndị a.”—Ọrụ 12:17.

5. Olee otú e si gbanwee ndị mejupụtara òtù na-achị isi mgbe e gbusiri Jemes n’ihi okwukwe ya?

5 N’oge bu ụzọ, mgbe Judas Iskarịọt, onye ozi ahụ gbara mgba okpuru, gburu onwe ya, a hụtara mkpa inye onye ọzọ ya na Jisọs nọworịị n’oge ozi ya nke jikwa anya ya hụ ọnwụ na mbilite n’ọnwụ ya “ọrụ nlekọta ya” dị ka onyeozi. Otú ọ dị, mgbe e gburu Jemes, nwanne Jọn, ọ dịghị onye nọchiri ya dị ka otu n’ime mmadụ 12 ahụ. (Ọrụ 1:20-26; 12:1, 2) Kama nke ahụ, izo aka ọzọ e mere n’Akwụkwọ Nsọ n’ebe òtù na-achị isi nọ na-egosi na e mewo ka ọ saa mbara. Mgbe arụmụka bilitere banyere ma ndị Jentaịl so Jisọs hà kwesịrị ịnọ n’okpuru Iwu Mosis, e wegaara “ndị ozi na ndị okenye nọ na Jerusalem” okwu ahụ ime mkpebi banyere ya. (Ọrụ 15:2, 6, 20, 22, 23; 16:4) Dị ka ihe àmà na-egosi, n’ihi gịnị ka “ndị okenye” ji soro ugbu a n’òtù na-achị isi? Bible ekwughị, ma e nwere abamuru pụtara ìhè. Ọnwụ Jemes na mkpọrọ a tụrụ Pita egosiwo na otu ụbọchị a pụrụ ịtụ ndị ozi ahụ mkpọrọ ma ọ bụ gbuo ha. N’ọnọdụ ahụ pụrụ ime eme, inwe ndị okenye ọzọ ruru eru, nwere ahụmahụ n’ụkpụrụ òtù na-achị isi, ga-eme ka e jide n’aka na nlekọta ga na-aga n’ihu n’ụzọ dị n’usoro.

6. Olee otú òtù na-achị isi si gaa n’ihu na-arụ ọrụ na Jerusalem, ọbụna mgbe ndị òtù ya mbụ na-anọkwaghị n’obodo ahụ?

6 Mgbe Pọl bịara Jerusalem n’ihe dị ka afọ 56 O.A., ọ kọọrọ Jemes, Bible na-ekwu, “ndị okenye nile nọkwa n’ebe ahụ.” (Ọrụ 21:18) N’ihi gịnị ka e ji ghara ịkpọ ndị ozi aha ná nzukọ a? Ọzọkwa, Bible ekwughị. Ma ọkọ akụkọ ihe mere eme bụ́ Eusebius mesịrị kọọ na n’oge ụfọdụ tupu 66 O.A., “ndị ozi fọdụrụnụ, n’ịnọ mgbe nile n’ihe ize ndụ nke nkata a na-akpa igbu ha, bụ ndị a chụpụrụ na Judia. Ma iji kụzie ozi ha, ha mere njem gaa ala ọ bụla n’ike Kraịst.” (Eusebius, Akwụkwọ III, V, v. 2) N’eziokwu, okwu Eusebius abụghị akụkụ nke ihe ndekọ sitere n’ike mmụọ nsọ, ma ha kwekọrọ n’ihe ihe ndekọ ahụ na-ekwu. Dị ka ihe atụ, ka ọ na-erule 62 O.A., Pita nọ na Babilọn—ebe dị anya site na Jerusalem. (1 Pita 5:13) Ma, na 56 O.A., ikekwe ruokwa 66 O.A., o doro anya na òtù na-achị isi nọ n’ọrụ na Jerusalem.

Nlekọta n’Oge A

7. E jiri ya tụnyere òtù na-achị isi nke narị afọ mbụ, ọdịiche dị aṅaa pụtara ìhè ka e nwere ná ndị mejupụtara Òtù Na-achị Isi taa?

7 Malite na 33 O.A. ruo mgbe mkpagbu dakwasịrị Jerusalem, ihe àmà na-egosi na ndị Kraịst bụ́ ndị Juu mejupụtara òtù na-achị isi ahụ. N’oge nleta ya na 56 O.A., Pọl chọpụtara na ọtụtụ ndị Juu bụ́ ndị Kraịst nọ na Jerusalem, n’agbanyeghị ‘inwe okwukwe nke Onyenwe anyị Jisọs Kraịst,’ ka bụ ndị “obi ha na-anụkwa ọkụ nye iwu [Mosis].”c (Jemes 2:1; Ọrụ 21:20-25) Ọ pụrụ ịbụ na o siiri ndị Juu dị otú ahụ ike iche n’echiche na onye Jentaịl pụrụ iso n’òtù na-achị isi ahụ. Otú ọ dị, n’oge a, e nwewo mgbanwe ọzọ ná ndị mejupụtara òtù a. Taa, ọ bụ nanị ndị Kraịst bụ́ ndị Jentaịl e tere mmanụ mejupụtara ya, Jehova agọziwokwa nlekọta ha nke ukwuu.—Ndị Efesọs 2:11-15.

8, 9. Olee ihe ndị meworo n’Òtù Na-achị Isi n’oge a?

8 Malite n’oge e guzobere Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania na 1884 ruo 1972, onye isi oche nke Society nwere ikike dị ukwuu n’ime nzukọ Jehova, ebe e jikọrọ Òtù Na-achị Isi na bọọdụ ndị nlekọta nke Society n’ụzọ chiri anya. Ngọzi ndị e nwetara n’afọ ndị ahụ gosiri na Jehova nakweere ndokwa ahụ. N’agbata 1972 na 1975, e mere ka Òtù Na-achị Isi bukwuo ibu iru ndị òtù 18. Ihe gbasoro ndokwa narị afọ mbụ karị mgbe e nyere òtù a e mere ka o bukwuo ibu ikike ka ukwuu, ndị ụfọdụ n’ime ha bụ ndị ntụzi nke Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania.

9 Kemgbe 1975 ọtụtụ n’ime mmadụ 18 ndị a ejesịwo ozi elu ala ha. Ha emeriwo ụwa ma ‘soro Jisọs nọdụ ala n’ocheeze eluigwe ya.’ (Mkpughe 3:21) N’ihi nke a na ihe ndị ọzọ, Òtù Na-achị Isi nwere ndị òtù iri ugbu a, gụnyere otu nke a tụkwasịrị na 1994. Ihe ka ọtụtụ emewo nnọọ agadi. Otú ọ dị, a na-enye ụmụnna ndị a e tere mmanụ ezi nkwado ka ha na-arụzu ọrụ ha dị arọ. Olee ebe e si enweta nkwado ahụ? Inyobatụ anya n’ihe ndị na-ewere ọnọdụ n’oge a n’etiti ndị Chineke na-aza ajụjụ ahụ.

Nkwado Maka Israel nke Chineke

10. Olee ndị sonyewooro ndị e tere mmanụ n’ozi Jehova na mgbe ikpeazụ a, oleekwa otú e si buo nke a n’amụma?

10 Laa azụ na 1884 ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ndị nile ha na Israel nke Chineke na-emekọ ihe bụcha ndị Kraịst e tere mmanụ. Otú ọ dị, nwayọọ nwayọọ, ìgwè ọzọ malitere ịpụta, na 1935 kwa a matara ìgwè a dị ka “oké ìgwè mmadụ” nke Mkpughe isi nke 7. N’ịbụ ndị nwere olileanya elu ala, ndị a na-anọchite anya “ihe nile dị n’elu ụwa” nke Jehova zubere ịchịkọta n’ime Kraịst. (Ndị Efesọs 1:10) Ha na-anọchite anya “atụrụ ọzọ” nke ilu Jisọs banyere ogige atụrụ. (Jọn 10:16) Kemgbe 1935, atụrụ ọzọ enubatawo n’ime nzukọ Jehova. Ha “na-efe efe dị ka igwe ojii, ndị na-efekwa dị ka nduru si eferuo window ha.” (Aịsaịa 60:8) N’ihi mmụba nke oké ìgwè mmadụ ahụ na ndalata nke òtù ndị e tere mmanụ ka ọtụtụ na-ejezu ozi elu ala ha n’ọnwụ, atụrụ ọzọ ruru eru abịawo ikere òkè na-ebuwanye ibu n’ọrụ ndị Kraịst. N’ụzọ ndị dị aṅaa?

11. Ihe ùgwù ndị dị aṅaa, ndị dịbuuru nanị ndị Kraịst e tere mmanụ, ka e nyeworo atụrụ ọzọ?

11 Ikwusa ịdị mma nke Jehova abụrụwo mgbe nile ibu ọrụ pụrụ iche nke “mba dị nsọ” nke Chineke. Pọl kwuru banyere ya dị ka àjà ụlọ nsọ, Jisọs nyekwara ndị ga-abụ “òtù ndị nchụàjà ndị bụkwa eze” ọrụ ime nkwusa na izi ihe. (Ọpụpụ 19:5, 6; 1 Pita 2:4, 9; Matiu 24:14; 28:19, 20; Ndị Hibru 13:15, 16) Ka o sina dị, mbipụta Ụlọ Nche (Bekee) nke August 1, 1932 gbara ndị ahụ Jonadab sere onyinyo ha kpọmkwem ume ikere òkè n’ọrụ a. N’ezie, ọtụtụ n’ime atụrụ ọzọ dị otú ahụ anọworị na-eme otú ahụ. Taa, atụrụ ọzọ ahụ na-arụ ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ọrụ nkwusa nile dị ka akụkụ dị mkpa nke ‘ofufe ha na-efe Chineke ehihie na abalị n’ụlọ nsọ Ya.’ (Mkpughe 7:15) N’otu aka ahụ, n’akụkụ mbụ nke akụkọ ihe mere eme nke oge a nke ndị Jehova, ndị okenye ọgbakọ bụ ndị Kraịst e tere mmanụ, “kpakpando” n’aka nri Jisọs Kraịst. (Mkpughe 1:16, 20) Ma mbipụta Ụlọ Nche (Bekee) nke May 1, 1937, mara ọkwa na atụrụ ọzọ ruru eru pụrụ ịbụ ndị ohu kọmpini (ndị isi oche ndị nlekọta). Ọ bụrụgodị na e nwere ndị ikom e tere mmanụ, a pụrụ iji atụrụ ọzọ mee ihe ma ọ bụrụ na ndị ikom e tere mmanụ enweghị ike ibu ibu ọrụ a. Taa, ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ndị okenye nile nke ọgbakọ so n’atụrụ ọzọ ahụ.

12. Ụkpụrụ Akwụkwọ Nsọ ndị dị aṅaa ka e nwere maka atụrụ ọzọ ruru eru ịnata ibu ọrụ ndị dị arọ nzukọ a na-enye?

12 Ọ̀ dị njọ inye atụrụ ọzọ ahụ ụdị ibu ọrụ ahụ dị arọ? Ee e, ọ na-agbaso ụkpụrụ dị n’akụkọ ihe mere eme. Ụfọdụ ndị na-eso ụzọ bụ́ ndị mba ọzọ (ndị ala ọzọ) nwere ọkwá dị elu n’Israel oge ochie. (2 Samuel 23:37, 39; Jeremaịa 38:7-9) Mgbe ndọrọ n’agha gaa na Babilọn gasịrị, ndị Netinin ruru eru (ndị na-abụghị ndị Israel na-eje ozi n’ụlọ nsọ) bụ ndị e nyere ihe ùgwù nke ije ozi ụlọ nsọ ndị dịbuuru nanị ndị Livaị. (Ezra 8:15-20; Nehemaịa 7:60) Ọzọkwa, Mosis, bụ́ onye a hụrụ ya na Jisọs na nnwogha ahụ, naara ezi ndụmọdụ nke Jetro bụ́ onye Midia nyere ya. Ka oge na-aga, ọ gwara nwa Jetro bụ́ Hobab ka o duzie ha gabiga ọzara.—Ọpụpụ 18:5, 17-24; Ọnụ Ọgụgụ 10:29.

13. N’iji obi umeala kenye atụrụ ọzọ ruru eru ibu ọrụ, ezi mmụọ nke ònye ka ndị e tere mmanụ nọworo na-eṅomi?

13 Ka ọ na-aga ná ngwụsị nke afọ 40 n’ọzara, Mosis, n’ịmara na ọ gaghị aba n’Ala Nkwa ahụ, kpere ekpere ka Jehova nye onye ga-anọchi ya. (Ọnụ Ọgụgụ 27:15-17) Jehova gwara ya ka o nye Joshua ọrụ n’ihu ndị ahụ nile, Mosis mekwara otú ahụ, ọ bụ ezie na ọ ka gbasikwara ike n’anụ ahụ, ọ kwụsịghịkwa ijere Israel ozi ozugbo ahụ. (Deuterọnọmi 3:28; 34:5-7, 9) Site na mmụọ umeala yiri nke ahụ, ndị ahụ e tere mmanụ anọworị na-enye ndị ikom ruru eru n’etiti atụrụ ọzọ ahụ ihe ùgwù buwanyere ibu.

14. Amụma ndị dị aṅaa na-arụtụ aka n’ọrụ nhazi na-eto eto nke atụrụ ọzọ ahụ?

14 Ọrụ na-arịwanye elu nke atụrụ ọzọ ahụ na-arụ ná nzukọ a bụkwa ihe e buru n’amụma. Zekaraịa buru amụma na ndị Filistia na-abụghị ndị Israel ga-adị “ka sheik na Juda.” (Zekaraịa 9:6, 7, NW) Ndị sheikh bụ ndị chiifu nke ebo dị iche iche, n’ihi ya Zekaraịa na-ekwu na onye bụbu onye iro nke Israel ga-anara ezi ofufe ma bịa dịrị ka chiifu nke otu ebo n’Ala Nkwa ahụ. Ọzọ, mgbe ọ na-ekwu banyere Israel nke Chineke, Jehova sịrị: “Ndị ala ọzọ ga-eguzo na-azụ ìgwè ewu na atụrụ unu, ụmụ ala ọzọ ga-abụkwa ndị ọrụ ubi unu na ndị ọrụ ubi vine unu. Ma a ga-akpọ unu onwe unu ndị nchụàjà nke Jehova: ndị na-ejere Chineke anyị ozi ka a ga-asị na unu bụ.” (Aịsaịa 61:5, 6) “Ndị ala ọzọ” na “ụmụ ala ọzọ” ahụ bụ atụrụ ọzọ ahụ. E kenyewo ndị a ọrụ dị iche iche ka ha wee na-arụ ọrụ dị ukwuu karị ka ihe fọdụrụ e tere mmanụ bụ́ ndị na-eme agadi na-ejezu ozi elu ala ha ma na-aga ije ozi n’echiche zuru ezu dị ka “ndị nchụàjà nke Jehova” nke eluigwe, na-agba ocheeze ebube Jehova gburugburu dị ka “ndị na-ejere Chineke anyị ozi.”—1 Ndị Kọrint 15:50-57; Mkpughe 4:4, 9-11; 5:9, 10.

“Ọgbọ . . . Ga-abịa”

15. N’oge ọgwụgwụ a, olee ìgwè ndị Kraịst meworo “agadi,” oleekwa ìgwè na-anọchite anya “ọgbọ ahụ . . . ga-abịa”?

15 Ọ dịwo ihe fọdụrụ e tere mmanụ ọkụ n’obi ịzụ atụrụ ọzọ maka ibu ọrụ a mụbara amụba. Abụ Ọma 71:18 na-ekwu, sị: “Ọbụna ruo agadi na isi awọ ahapụla m, Chineke; ruo mgbe m ga-egosi ọgbọ ọzọ ogwe aka Gị, gosikwa onye ọ bụla nke ga-abịa ịdị ike Gị.” Mgbe ọ na-ekwu okwu banyere amaokwu a, Ụlọ Nche (Bekee) nke December 15, 1948, rụtụrụ aka na ọgbakọ nke ndị Kraịst e tere mmanụ emewo agadi n’ezie. Ọ gara n’ihu ikwu na ndị ahụ e tere mmanụ ji obi ụtọ “na-elepụ anya n’ìhè nke amụma Bible ma na-ahụ ọgbọ ọhụrụ.” Ole ndị kpọmkwem ka nke a na-ezo aka? Ụlọ Nche ahụ kwuru, sị: “Jisọs kwuru banyere ha dị ka ‘atụrụ ọzọ’ ya.” ‘Ọgbọ ahụ ga-abịa’ na-ezo aka n’ụmụ mmadụ bụ́ ndị ga-adị ndụ n’okpuru nlekọta ọhụrụ nke elu ala nke Alaeze eluigwe na-achị.

16. Ngọzi ndị dị aṅaa ka ndị so ‘n’ọgbọ ahụ ga-abịa’ na-atụsi anya ha ike?

16 Bible ekwughị n’ụzọ doro anya mgbe ndị Kraịst nile e tere mmanụ ga-ahapụ ụmụnna ha nke ‘ọgbọ a ga-abịa’ ma gaa n’ihu ịbụ ndị e nyekọtara ha na Jisọs Kraịst otuto. Ma ndị a e tere mmanụ nwere obi ike na oge maka nke a na-eru nso. Ihe ndị e kwuru n’oké amụma Jisọs banyere “mgbe ọgwụgwụ” ahụ anọwo na-emezu kemgbe 1914, na-egosi na mbibi nke ụwa a dị nso. (Daniel 12:4; Matiu 24:3-14; Mak 13:4-20; Luk 21:7-24) N’isi nso, Jehova ga-ewebata ụwa ọhụrụ nke ‘ọgbọ ahụ ga-abịa’ ga-anọ n’ime ya ‘keta alaeze [ógbè elu ala] e doziwooro ha site na ntọala nke ụwa.’ (Matiu 25:34) Obi dị ha ụtọ ịtụ anya mweghachi nke Paradaịs na ịkpọlite ọtụtụ nde ndị nwụrụ anwụ site na Hedis. (Mkpughe 20:13) Ndị e tere mmanụ hà ga-anọ ebe ahụ ịnabataghachi ndị a a kpọlitere n’ọnwụ? Laa azụ na 1925, Ụlọ Nche (Bekee) nke May 1 kwuru, sị: “Anyị agaghị ekwu n’onwe anyị ihe Chineke ga-eme ma ọ bụ na-agaghị eme. . . . [Ma] a na-eduje anyị ná nkwubi okwu bụ na a ga-ebuli ndị òtù Chọọchị [ndị Kraịst e tere mmanụ] tupu mbilite n’ọnwụ nke ndị ochie kwesịrị nsọpụrụ [ndịàmà kwesịrị ntụkwasị obi tupu oge ndị Kraịst].” N’ịtụle n’ụzọ yiri nke ahụ ma ụfọdụ ndị e tere mmanụ hà ga-anọ ya ịnabataghachi ndị ahụ a kpọlitere n’ọnwụ, Ụlọ Nche nke September 1, 1989, sịrị: “Nke a agaghị adị mkpa.”d

17. Ihe ùgwù magburu onwe ha ndị dị aṅaa ka ndị e tere mmanụ, dị ka otu ìgwè, ga-eso Eze e chiri echichi, bụ́ Jisọs Kraịst, kerịta?

17 N’eziokwu, anyị amaghị ihe ga-eme n’ọnọdụ nke onye Kraịst ọ bụla e tere mmanụ. Ma ọnụnọ nke Mosis na Elaịja sooro Jisọs nọrọ n’ọhụụ nnwogha ahụ na-egosi na a na-atụ anya na ndị Kraịst e tere mmanụ si n’ọnwụ bilie ga-eso Jisọs mgbe ọ ga-abịa n’ebube ‘inyeghachi onye ọ bụla dị ka omume ya si dị’ ka a na-ekpe ikpe ma na-emezu ihe o kpere n’ikpe. Ọzọ, anyị na-echeta nkwa Jisọs na ndị Kraịst e tere mmanụ bụ́ ndị ‘meriri’ ga-eso ya kere òkè ‘n’iwere mkpanaka ígwè zụọ mba nile dị ka atụrụ’ n’Amagedọn. Mgbe Jisọs bịara n’ebube, ha ga-eso ya nọdụ ala “na-ekpe ebo iri na abụọ nke Israel ikpe.” N’isonyere Jisọs, ha ‘ga-azọpịa Setan n’okpuru ụkwụ ha.’—Matiu 16:27–17:9; 19:28; Mkpughe 2:26, 27; 16:14, 16; Ndị Rom 16:20; Jenesis 3:15; Abụ Ọma 2:9; 2 Ndị Tesalọnaịka 1:9, 10.

18. (a) Gịnị bụ ọnọdụ dị banyere ‘nchịkọta nke ihe nile dị n’eluigwe n’ime Kraịst’? (b) Gịnị ka anyị pụrụ ikwu banyere ‘nchịkọta nke ihe nile dị n’elu ụwa n’ime Kraịst’?

18 N’ikwekọ ná nlekọta ya nke ihe dị iche iche, Jehova na-aga n’ihu “ịchịkọta ihe nile n’ime Kraịst.” N’ihe metụtara “ihe nile dị n’eluigwe,” nzube ya na-eru nso mmezu. Njikọ nke Jisọs na 144,000 nile n’eluigwe maka “ọlụlụ nwunye nke Nwa atụrụ ahụ” dị nso. N’ihi ya, ọnụ ọgụgụ na-arị elu nke ụmụnna atụrụ ọzọ tozuru okè, ndị nọteworo anya, na-anọchite anya “ihe nile dị n’elu ụwa,” abụrụwo ndị e kenyere ibu ọrụ ndị dị arọ karị n’ịkwado ụmụnna ha ndị e tere mmanụ. Lee oge na-akpali akpali anyị bi n’ime ya! Lee ihe obi ụtọ ọ bụ ịhụ ka nzube Jehova na-aga n’ihu ná mmezu ya! (Ndị Efesọs 1:9, 10; 3:10-12; Mkpughe 14:1; 19:7, 9) Leekwa ka ndị atụrụ ọzọ ahụ na-aṅụrị ọnụ ịkwado ụmụnna ha e tere mmanụ ka ìgwè abụọ a na-ejekọ ozi dị ka “otu ìgwè atụrụ” n’okpuru “otu Onye ọzụzụ atụrụ” n’ịnọ n’okpuru Eze ahụ, Jisọs Kraịst, nakwa maka otuto nke Eze ukwu nke Eluigwe na Ala, bụ́ Jehova Chineke!—Jọn 10:16; Ndị Filipaị 2:9-11.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

a Lee mbipụta Ụlọ Nche nke August 15, 1982, peji nke 16-26.

b Dị ka ihe atụ, na-amalite na 1914, “Foto Ihe Nkiri nke Okike”—ihe nkiri nwere akụkụ anọ—bụ nke e gosiri ndị nọ n’ebe ndị a na-ekiri ihe jupụtara na mmadụ n’ụwa Ọdịda Anyanwụ nile.

c Maka ihe nwere ike ịbụ ihe mere ndị Kraịst bụ́ ndị Juu ji anụrụ Iwu ahụ ọkụ n’obi, lee Insight on the Scriptures, nke Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., bipụtara, Mpịakọta nke 2, peji nke 1163-1164.

d Lee Ụlọ Nche, August 15, 1990, peji nke 30-31; December 15, 1990, peji nke 30.

Ị̀ Pụrụ Ịkọwa?

◻ Olee otú nzukọ Chineke siri gaa n’ihu na narị afọ mbụ?

◻ Olee otú Òtù Na-achị Isi siworo mụbaa n’akụkọ ihe mere eme nke Ndịàmà Jehova n’oge a?

◻ Akụkụ akwụkwọ nsọ ndị dị aṅaa na-akwado ka e nye atụrụ ọzọ ahụ ikike n’ime nzukọ Jehova?

◻ Olee otú e siri chịkọta “ihe nile dị n’eluigwe” na “ihe nile dị n’elu ụwa” n’ime Kraịst?

[Foto dị na peeji nke 16]

Ọbụna mgbe ndị òtù mbụ ya na-anọkwaghị na Jerusalem, òtù na-achị isi gara n’ihu na-arụ ọrụ ebe ahụ

[Foto ndị dị na peeji nke 18]

Ndị Kraịst e tere mmanụ tozuru okè abụrụwo ngọzi nye ndị Jehova

C. T. Russell 1884-1916

J. F. Rutherford 1916-1942

N. H. Knorr 1942-1977

F. W. Franz 1977-1992

M. G. Henschel 1992-

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya