Isi nke Iri Abụọ na Otu
Nzube Jehova Enwee Mmezu Dị Ebube
1, 2. (a) Gịnị bụ nzube Jehova banyere ihe ndị o kere eke nwere ọgụgụ isi? (b) Olee ndị a gụnyere n’ezinụlọ Chineke dị n’otu, nke ndị na-efe ya ofufe mejupụtara?
IHE nile e kere eke nwere ọgụgụ isi ịbụ ndị dị n’otu n’ofufe nke onye ahụ nanị ya bụ ezi Chineke, na ha nile inwe nnwere onwe dị ebube dị ka ụmụ Chineke—ọ bụ ya bụ nzube ịhụnanya nke Jehova. Ọ bụkwa ihe ndị hụrụ ezi omume n’anya na-achọsi ike.
2 Jehova malitere imezu nzube a dị ebube mgbe ọ malitere ọrụ ike ihe. Ihe mbụ o kere bụ Ọkpara, onye bụ́, kemgbe o si n’ọnwụ bilie, “onyinyo nke ebube [Chineke] na ihe nnọchiteanya nke onye ọ bụ kpọmkwem.” (Ndị Hibru 1:1-3) Ọkpara a pụrụ iche, ebe ọ bụ nanị Chineke kere ya. Ka oge na-aga, a gaje isite n’aka Ọkpara a kee ihe ndị ọzọ nile: nke mbụ, ndị mmụọ ozi nọ n’eluigwe, e mesịa, ụmụ mmadụ nọ n’elu ala. (Job 38:7; Luk 3:38) Ndị a nile mejupụtara otu ezinụlọ nke gụnyere eluigwe na ala. Nye ha nile, Jehova bụ Chineke, Eze Eluigwe na Ala, na Nna ha na-ahụ n’anya.
3. (a) Gịnị ka anyị nile ketaworo site n’aka nne na nna anyị mbụ? (b) Olee ndokwa ịhụnanya Jehova meere ụmụ Adam?
3 Mgbe a mara nne na nna anyị mbụ bụ́ mmadụ ikpe ọnwụ dị ka ndị leziri anya mee mmehie, a chụpụrụ ha n’Iden, Chineke jụkwara ha. Ha kwụsịrị ịbụ akụkụ nke ezinụlọ ya nke eluigwe na ala. (Jenesis 3:22-24; Deuterọnọmi 32:4, 5) Anyị nile bụ ụmụ ha, n’ihi ya, a mụkọtara anyị na ọchịchọ ime mmehie. Ma Jehova maara na ụfọdụ n’ime ụmụ Adam na Iv ga-ahụ ezi omume n’anya. Ya mere, O ji ịhụnanya mee ndokwa nke ndị a pụrụ isite na ya nweta “nnwere onwe dị ebube nke ụmụ Chineke.”—Ndị Rom 8:20, 21.
Ọnọdụ Magburu Onwe Ya Efunahụ Izrel
4. Ihe ùgwù dị aṅaa ka Jehova nyere Izrel oge ochie?
4 Ihe dị ka afọ 2,500 mgbe e kesịrị Adam, Jehova mere ka ụmụ mmadụ ụfọdụ nweta ihe ùgwù nke iso Ya nwee mmekọrịta pụrụ iche. Ọ họọrọ Izrel oge ochie ka ha bụrụ ndị ya, nyekwa ha Iwu ya. (Jenesis 12:1, 2) O mere ka ha ghọọ otu mba ma jiri ha mee ihe n’ihe metụtara nzube ya. (Deuterọnọmi 14:1, 2; Aịsaịa 43:1) Otú ọ dị, ha ka nọ n’agbụ nye mmehie na ọnwụ, n’ihi ya, ha enweghị nnwere onwe ahụ dị ebube nke Adam na Iv nwere na mbụ.
5. Olee otú ndị Izrel si tụfuo ọnọdụ ha pụrụ iche n’anya Chineke?
5 Ka o sina dị, ụmụ Izrel nwere ọnọdụ dị mma n’anya Chineke. Ha nwekwara ibu ọrụ nke ịsọpụrụ Jehova dị ka Nna ha na ịrụ ọrụ kwekọrọ ná nzube ya. Jizọs mesiri ike mkpa ọ dị ka ha na-arụzu ọrụ dịịrị ha. (Matiu 5:43-48) Otú ọ dị, mba Izrel emeghị nke a. Ọ bụ ezie na ndị Juu ahụ kwuru na “anyị nwere otu Nna, bụ́ Chineke,” Jizọs kwuru na omume ha na mmụọ ha na-egosipụta na-emegide ihe ahụ ha kwuru. (Jọn 8:41, 44, 47) N’afọ 33 O.A., Chineke mere ka Iwu ahụ kwụsị ịdị irè, mmekọrịta pụrụ iche nke Ya na Izrel bịakwara ná njedebe. Ma nke a ọ̀ pụtara na ndị mmadụ apụghị iso Chineke nwee mmekọrịta dị mma?
Ịchịkọta “Ihe Ndị Dị n’Eluigwe”
6. Gịnị bụ nzube nke “nlekọta ihe” ahụ Pọl hotara ná Ndị Efesọs 1:9, 10?
6 Pọl onyeozi gosiri na ụfọdụ ndị n’etiti ihe a kpọrọ mmadụ pụrụ iso Chineke nwee mmekọrịta pụrụ iche. Dị ka ihe atụ, banyere ndokwa Jehova mere nke ndị na-egosipụta okwukwe pụrụ isite na ya ghọọ ndị òtù ezinụlọ Ya, Pọl dere, sị: “[Chineke] mere ka anyị mara ihe nzuzo dị nsọ nke uche ya. Ihe nzuzo a bụ dị ka ihe dị ya ụtọ si dị bụ́ nke o zubeworo n’ime onwe ya maka nlekọta ihe n’ozuzu nke oge ahụ a kara aka, ya bụ, ịchịkọtaghachi ihe nile n’ime Kraịst, ihe ndị dị n’eluigwe na ihe ndị dị n’ụwa.” (Ndị Efesọs 1:9, 10) “Nlekọta ihe” a hiwere isi n’ebe Jizọs Kraịst nọ. E si n’aka ya na-eme ka ụmụ mmadụ nwee ọnọdụ dị mma n’anya Chineke. Ọnụ ọgụgụ a kpaara ókè n’ime ha nwere atụmanya nke ịnọ n’eluigwe. Ọnụ ọgụgụ buru nnọọ ibu karị ga-ebi n’ụwa ruo mgbe ebighị ebi.
7. Olee ndị bụ “ihe ndị dị n’eluigwe”?
7 Nke mbụ, malite na Pentikọst 33 O.A., e lebara anya ‘n’ihe ndị dị n’eluigwe,’ ya bụ, ndị ga-eso Kraịst bụrụ ndị nketa n’Alaeze eluigwe. Dabere n’okwukwe ha nwere n’uru nke àjà Jizọs, Chineke gụrụ ha ná ndị ezi omume. (Ndị Rom 5:1, 2) Ka oge na-aga, a gụnyere ndị Juu na ndị Jentaịl, “ihe ndị [ahụ] dị n’eluigwe” gajekwa ịdị 144,000 n’ọnụ ọgụgụ. (Ndị Galeshia 3:26-29; Mkpughe 14:1) Ọ bụ nanị ihe fọdụrụ n’ime ha ka nọ n’ụwa.
Ịchịkọta “Ihe Ndị Dị n’Ụwa”
8. Olee ndị bụ “ihe ndị dị n’ụwa,” oleekwa mmekọrịta dị n’agbata ha na Jehova?
8 Otu nlekọta ihe ahụ na-achịkọtakwa “ihe ndị dị n’ụwa.” A na-achịkọta ọtụtụ nde mmadụ ugbu a n’atụmanya nke ịdị ndụ n’ụwa ruo mgbe ebighị ebi. N’ịbụ ndị ha na ihe ahụ fọdụrụ ná ndị nketa Alaeze gbakọrọ aka, ha na-eme ka aha Jehova dị ukwuu ma na-ebuli ofufe ya elu. (Aịsaịa 2:2, 3; Zefanaịa 3:9) Ha na-akpọkwa Jehova “Nna” n’ihi na ha matara na ọ bụ ya bụ isi iyi nke ndụ. Ha nwekwara ọnọdụ dị mma n’anya ya n’ihi okwukwe ha nwere n’ọbara Jizọs nke a wụsịrị. (Mkpughe 7:9, 14) Ma ebe ha ka bụ ndị na-ezughị okè, ịnakwere ha dị ka ụmụ Chineke n’ụzọ zuru ezu ka ga-abụ n’ọdịnihu.
9. Olee nkwa nke Ndị Rom 8:21 na-ekwe ihe a kpọrọ mmadụ?
9 Ndị a, bụ́ ndị nwere olileanya ibi n’ụwa na-echesi ike ugbu a, oge a ga-eme ka ụmụ mmadụ e kere eke “nwere onwe [ha] pụọ n’ịbụ ohu nke ire ure.” (Ndị Rom 8:21) Ntọhapụ ahụ ga-amalite mgbe Kraịst na usuu ndị agha ya nke eluigwe meworo ka oké mkpagbu ahụ bịa ná njedebe n’Amagedọn. Nke a ga-apụta mbibi nke ajọ usoro ihe dum nke Setan, nke ihe ga-esochi ya bụ ngọzi nke Ọchịchị Puku Afọ Kraịst n’ike Alaeze.—Mkpughe 19:17-21; 20:6.
10. Ndị ohu Jehova ga-abụ abụ otuto dị aṅaa?
10 Lee ihe na-enye obi ụtọ ọ ga-abụ mgbe ndị ohu Jehova nọ n’ụwa jikọrọ ọnụ wee kwupụtaghachi ihe ndị ohu ya nọ n’eluigwe na-ekwu, bụ́ ndị ji ọṅụ na-ekwu, sị: “Ọrụ gị dị ukwuu ma dị ebube, Jehova Chineke, Onye Pụrụ Ime Ihe Nile. Ụzọ gị bụ nke ezi omume na nke eziokwu, Eze mgbe ebighị ebi. Olee onye na-agaghị atụ gị egwu n’ezie, Jehova, ma nye aha gị otuto, n’ihi na nanị gị na-eguzosi ike n’ihe? N’ihi na mba nile ga-abịa kpọọ isiala n’ihu gị, n’ihi na e mewo ka iwu ezi omume gị pụta ìhè.” (Mkpughe 15:3, 4) Ee, ndị ohu Jehova nile ga-adị n’otu n’ofufe nke nanị ezi Chineke ahụ. A ga-akpọlite ọbụna ndị nwụrụ anwụ n’ọnwụ ma nye ha ohere nke iso na-eto Jehova.—Ọrụ 24:15.
Nnwere Onwe Magburu Onwe Ya Dị n’Ihu
11. Nnwere onwe dị aṅaa nke magburu onwe ya ka ndị gabigara oké mkpagbu ahụ ga-enwe?
11 Mgbe oké mkpagbu ahụ, na Amagedọn nke bụ́ njedebe ya, kpochapụsịworo ajọ omume n’ụwa, Setan bụ́ Ekwensu agakwaghị abụ “chi nke usoro ihe a.” Ndị na-efe Jehova ofufe agakwaghị na-agbaso mmetụta ọjọọ nke Setan mgba. (2 Ndị Kọrint 4:4; Mkpughe 20:1, 2) Okpukpe ụgha agakwaghị na-akụzi ihe na-abụghị eziokwu banyere Jehova ma ọ bụ bụrụ ihe na-akpata nkewa n’etiti ọha mmadụ. Ndị ọchịchị bụ́ mmadụ agakwaghị na-ekpe ndị na-ejere ezi Chineke ahụ ozi ikpe na-ezighị ezi ma na-erigbu ha. Lee nnwere onwe magburu onwe ya a ga-enwe!
12. Olee otú a ga-esi mee ka mmadụ nile nwere onwe ha pụọ ná mmehie na ihe ndị ọ na-akpata?
12 Dị ka “Nwa Atụrụ Chineke nke na-ewepụ mmehie nke ụwa,” Jizọs ga-eji uru nke àjà ya hichapụ mmehie nke ihe a kpọrọ mmadụ. (Jọn 1:29) Mgbe Jizọs nọ n’ụwa ma gbaghara mmadụ mmehie ya, ọ gwọrọ onye ahụ ọ gbaghaara mmehie ya dị ka ihe àmà nke na-egosi na ọ gbagharawo ya. (Matiu 9:1-7; 15:30, 31) N’otu aka ahụ, Kraịst Jizọs, dị ka Eze eluigwe nke Alaeze Chineke, ga-agwọ n’ụzọ ọrụ ebube ndị ìsì, ndị ogbi, ndị ntị chiri, ndị otu akụkụ ahụ́ ha na-adịkwaghị, ndị isi mgbaka, na ndị na-arịa ụdị ọrịa ọ bụla ọzọ. (Mkpughe 21:3, 4) Ndị nile na-erube isi ga-eme ka ‘iwu nke mmehie’ ghara ịdịkwa irè ka echiche ha na omume ha wee bụrụ nke dị ma ha onwe ha ma Chineke ụtọ. (Ndị Rom 7:21-23) Mgbe ọ na-erule ná ngwụsị nke Narị Afọ Iri ahụ, a ga-emewo ka ha nweta izu okè nke mmadụ, ‘n’onyinyo na n’oyiyi’ nke nanị ezi Chineke ahụ.—Jenesis 1:26.
13. Mgbe Ịchịisi Narị Afọ Iri ahụ bịara ná njedebe, olee ihe Kraịst ga-eme, gịnịkwa ga-esi na ya pụta?
13 Mgbe Kraịst meworo ka ihe a kpọrọ mmadụ zuo okè, mgbe ahụ ọ ga-enyeghachi Nna ya ikike o nyere ya iji rụọ ọrụ a: “Ọ ga-enyefe alaeze ahụ n’aka Chineke na Nna ya, mgbe o meworo ka ọchịchị nile na ikike na ike nile ghara ịdị irè. N’ihi na ọ ghaghị ịchị dị ka eze ruo mgbe Chineke debeworo ndị iro nile n’okpuru ụkwụ ya.” (1 Ndị Kọrint 15:24, 25) Ọchịchị Puku Afọ Iri nke Alaeze ahụ ga-emezuworị n’ụzọ zuru ezu, nzube e ji guzobe ya; ya mere, ọ gakwaghị adị mkpa ka ọchịchị a nke bụ́ ọchịchị na-enye aka nọgide na-adị n’agbata Jehova na ihe a kpọrọ mmadụ. Ebe ọ bụkwa na a ga-ewepụwo mmehie na ọnwụ kpam kpam ma gbapụta ihe a kpọrọ mmadụ, mkpa Jizọs dị dị ka Onye Mgbapụta ga-abịa ná njedebe. Bible na-akọwa, sị: “Mgbe ahụ Ọkpara ahụ n’onwe ya ga-edokwa onwe ya n’okpuru Onye ahụ nke doro ihe nile n’okpuru ya, ka Chineke wee bụrụ ihe nile n’ebe onye ọ bụla nọ.”—1 Ndị Kọrint 15:28.
14. Gịnị ka a ga-eme ka ụmụ mmadụ nile e mere ka ha zuo okè gabiga, n’ihi gịnịkwa?
14 Mgbe nke a gasịrị, a ga-enye ihe a kpọrọ mmadụ e mere ka ha zuo okè ohere igosipụta na ihe ha họọrọ ime bụ ijere onye ahụ nanị ya bụ ezi Chineke ozi ruo mgbe ebighị ebi. N’ihi ya, tupu o were ha dị ka ụmụ ya n’ụzọ zuru ezu, Jehova ga-eme ka e lee ụmụ mmadụ nile ahụ e mere ka ha zuo okè ule ikpeazụ. A ga-atọhapụ Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya n’abis. Nke a agaghị arụpụtara ndị hụrụ Jehova n’anya n’ezie mmerụ ahụ́ na-adịgide adịgide. Ma a ga-ebibikọta onye ọ bụla nke ji eguzosighị ike n’ihe kwe ka e duba ya n’inupụrụ Jehova isi na onye nnupụisi mbụ ahụ na ndị mmụọ ọjọọ ya ruo mgbe ebighị ebi.—Mkpughe 20:7-10.
15. Olee ọnọdụ ga-adị ọzọ n’etiti ihe nile Jehova kere eke nwere ọgụgụ isi?
15 Mgbe ahụ, Jehova ga-ewere ụmụ mmadụ nile ahụ e mere ka ha zuo okè, bụ́ ndị kwadoro ọbụbụeze Chineke n’oge ule ikpeazụ ahụ, dị ka ụmụ ya. Malite n’oge ahụ gaa n’ihu, ha ga-ekere òkè n’ụzọ zuru ezu ná nnwere onwe ahụ dị ebube nke ụmụ Chineke dị ka ndị so n’ezinụlọ Chineke n’eluigwe na ala. Ihe nile e kere eke nwere ọgụgụ isi nọ n’eluigwe na n’ụwa ga-adịghachị n’otu ọzọ n’ife ya ofufe dị ka onye nanị ya bụ ezi Chineke. Nzube Jehova ga-emezuworị n’ụzọ dị ebube! Ị̀ chọrọ iso n’ezinụlọ eluigwe na ala ahụ na-enwe obi ụtọ, nke na-adịru ebighị ebi? Ya bụrụ otú ahụ, anyị na-agba gị ume ịṅa ntị n’ihe Bible na-ekwu na 1 Jọn 2:17: “Ụwa na-agabiga, otú ahụkwa ka ọ dị ọchịchọ ya, ma onye na-eme uche Chineke na-anọgide ruo mgbe ebighị ebi.”
Ntụleghachi n’Ụdị Nkwurịta Okwu
• Tupu nnupụisi ahụ nke weere ọnọdụ n’Iden, olee mmekọrịta Jehova na ndị nile na-efe ya ofufe nwere?
• Olee ọrụ dịịrị ndị bụ́ ndị ohu Chineke?
• Ole ndị ka ga-aghọ ụmụ Chineke, oleekwa otú nke a si emetụta nzube Jehova banyere ofufe dị n’otu?
[Foto dị na peeji nke 190]
Ụmụ mmadụ na-erube isi ga-adị ndụ n’ime paradaịs ga-ezu ụwa ọnụ