Ndị Nne na Nna, Gịnị Ka Ihe Nlereanya Unu Na-akụzi?
“Bụrụnụ ndị na-eṅomi Chineke, dị ka ụmụ a hụrụ n’anya; na-ejegharịkwanụ n’ịhụnanya.”—NDỊ EFESỌS 5:1, 2.
1. Ụdị nduzi ndị dị aṅaa ka Jehova nyere di na nwunye mbụ ahụ bụ́ mmadụ?
JEHOVA bụ Onye Mmalite nke ndokwa ezinụlọ. Ọ bụ ya mere ka ezinụlọ nile dịrị n’ihi na o guzobere ezinụlọ mbụ ma nye di na nwunye mbụ bụ́ mmadụ ikike ịmụ ụmụ. (Ndị Efesọs 3:14, 15) O nyere Adam na Iv ntụziaka ndị bụ́ isi banyere ibu ọrụ ha, o nyekwara ha ohere hiri nne iji ọchịchọ ha mee ihe n’ịrụzu ibu ọrụ ndị a. (Jenesis 1:28-30; 2:15-22) Mgbe Adam na Iv mehiesịrị, ọnọdụ ndị ezinụlọ na-aghaghị ịnagide ghọrọ ndị dị mgbagwoju anya karị. Ma, Jehova ji ịhụnanya nye ụkpụrụ nduzi ndị ga-enyere ndị ohu ya aka ịnagide ọnọdụ ndị dị otú ahụ.
2. (a) Site n’ụzọ ndị dị aṅaa ka Jehova siworo jiri ntụziaka e nyere n’ọnụ mesie ndụmọdụ e dere ede ike? (b) Olee ajụjụ ọ dị ndị nne na nna mkpa ịjụ onwe ha?
2 Dị ka Onye Nkụzi Ukwu anyị, Jehova emewo ihe karịrị inye anyị nduzi ndị e dere ede banyere ihe anyị kwesịrị ime na ihe anyị kwesịrị izere. N’oge ochie, o nyekọtara ntụziaka e dere ede na ntụziaka e kwuru n’ọnụ site n’aka ndị nchụàjà na ndị amụma nakwa site n’aka ndị isi ezinụlọ. Olee ndị o ji eme ihe n’oge anyị iji nye nkụzi dị otú ahụ a kụziri n’ọnụ? Ọ bụ ndị Kraịst bụ́ ndị okenye na ndị nne na nna. Ọ bụrụ na ị bụ nne ma ọ bụ nna, ị̀ na-eme òkè gị iji nye ezinụlọ gị ntụziaka n’ụzọ nile nke Jehova?—Ilu 6:20-23.
3. Gịnị ka ndị isi ezinụlọ pụrụ ịmụta n’aka Jehova banyere nkụzi dị irè?
3 Olee otú e kwesịrị isi nye ntụziaka dị otú ahụ n’ime ezinụlọ? Jehova na-esetịpụ ihe nlereanya na nke a. N’ụzọ doro anya, ọ na-ekwu ihe bụ́ ezi ihe na ihe bụ́ ihe ọjọọ, ọ na-ekwughachikwa ya ugboro ugboro. (Ọpụpụ 20:4, 5; Deuterọnọmi 4:23, 24; 5:8, 9; 6:14, 15; Joshua 24:19, 20) Ọ na-eji ajụjụ ndị na-akpali echiche eme ihe. (Job 38:4, 8, 31) Site n’iji ilu na ihe atụ ndị mere eme eme ihe, ọ na-akpali mmetụta uche anyị, na-akpụzikwa obi anyị. (Jenesis 15:5; Daniel 3:1-29) Ndị nne na nna, mgbe unu na-akụziri ụmụ unu ihe, ùnu na-agbalị iṅomi ihe nlereanya ahụ?
4. Gịnị ka anyị na-amụta n’aka Jehova banyere inye ịdọ aka ná ntị, n’ihi gịnịkwa ka ịdọ aka ná ntị ji dị mkpa?
4 Jehova na-akwụsi ike maka ezi ihe, ma ọ na-aghọta mmetụta ezughị okè na-enwe. Ya mere tupu o nye ntaramahụhụ, ọ na-akụziri ụmụ mmadụ na-ezughị okè ihe, na-enyekwa ha ịdọ aka ná ntị na ihe ncheta ugboro ugboro. (Jenesis 19:15, 16; Jeremaịa 7:23-26) Mgbe ọ na-adọ aka ná ntị, ọ na-emeru ya n’ókè, ọ bụghị imebiga ya ókè. (Abụ Ọma 103:10, 11; Aịsaịa 28:26-29) Ọ bụrụ na ọ bụ otú ahụ ka anyị si emeso ụmụ anyị ihe, ọ na-egosi na anyị maara Jehova, ọ ga-akakwa adịrị ha onwe ha mfe ịmara ya.—Jeremaịa 22:16; 1 Jọn 4:8.
5. Gịnị ka ndị nne na nna pụrụ ịmụta n’aka Jehova banyere ige ntị?
5 N’ụzọ magburu onwe ya, Jehova na-ege ntị dị ka Nna nke eluigwe na-ahụ n’anya. Ihe ọ na-eme abụghị nanị inye iwu. Ọ na-agba anyị ume ikwupụtara ya obi anyị. (Abụ Ọma 62:8) Ọ bụrụkwa na mmetụta ndị anyị na-ekwupụta ezichaghị ezi, ọ dịghị esi n’eluigwe bigbọọ n’ịbara anyị mba. Ọ na-eji ndidi akụziri anyị ihe. Ya mere, lee nnọọ ka ndụmọdụ Pọl onyeozi si kwesị ekwesị: “Bụrụnụ ndị na-eṅomi Chineke, dị ka ụmụ a hụru n’anya”! (Ndị Efesọs 4:31–5:1) Lee ihe nlereanya ọma Jehova na-esetịpụrụ ndị nne na nna ka ha na-achọ ịkụziri ụmụ ha ihe! Ọ bụ ihe nlereanya nke na-eru anyị n’obi ma na-akpali anyị ịchọ ije ije n’ụzọ ndụ ya.
Mmetụta nke Ihe Nlereanya Na-enwe
6. Olee otú àgwà na ihe nlereanya nke ndị nne na nna si emetụta ụmụ ha?
6 Tụkwasị ná ntụziaka e nyere n’ọnụ, ihe nlereanya na-enwe mmetụta dị ukwuu n’ebe ụmụaka nọ. Ma ọ̀ dị ndị nne na nna mma ma ọ bụ na ọ dịghị ha, ụmụ ha gaje iṅomi ha. Ọ pụrụ ịtọ ndị nne na nna ụtọ—mgbe ụfọdụ ọ pụrụ ịwụ ha akpata oyi—mgbe ha ga-anụ ka ụmụ ha na-ekwu ihe ha onwe ha kwuworo. Mgbe ma omume ma àgwà nke nne na nna na-egosipụta ekele miri emi maka ihe ime mmụọ, nke a na-enwe mmetụta dị mma n’ebe ụmụ ha nọ.—Ilu 20:7.
7. Ihe nlereanya dị aṅaa nke onye bụ́ nna ka Jefta setịpụụrụ ada ya, gịnịkwa si na ya pụta?
7 A kọwara mmetụta nke ihe nlereanya ndị nne na nna na-enwe nke ọma n’ime Bible. Jefta, bụ́ onye Jehova ji mee ihe iduru ụmụ Israel gaa merie ụmụ Amọn, bụkwa nna. Ihe ndekọ nke ihe ọ zaghachiri eze Amọn na-egosi na ọtụtụ ugboro, Jefta aghaghị ịgụwo akụkọ banyere mmeso Jehova mesoro ụmụ Israel. Ọ dịịrị ya mfe ihota akụkọ ahụ, o gosipụtakwara okwukwe siri ike n’ebe Jehova nọ. Obi abụọ adịghị ya na ihe nlereanya ya nyeere ada ya aka iwulite okwukwe na mmụọ ịchụ onwe onye n’àjà bụ́ ndị o gosipụtara site n’ije ozi ná ndụ ya nile dị ka nwanyị na-alụghị di nke a raara nye Jehova.—Ndị Ikpe 11:14-27, 34-40; tụlee Joshua 1:8.
8. (a) Ezi àgwà dị aṅaa ka nne na nna Samuel gosipụtara? (b) Olee otú nke ahụ si baara Samuel uru?
8 Samuel gosipụtara ezi ihe nlereanya dị ka nwata ma kwesị ntụkwasị obi nye Chineke dị ka onye amụma ná ndụ ya nile. Ọ̀ ga-amasị unu ka ụmụ unu dị ka ya? Tụlee ihe nlereanya nne na nna Samuel, bụ́ Hana na Elkena, setipụrụ. Ọ bụ ezie na ọnọdụ e nwere n’ezinụlọ ha adịchaghị mma, ha gara Shaịlo mgbe mgbe maka ife ofufe, n’ebe e nwere ụlọikwuu dị nsọ. (1 Samuel 1:3-8, 21) Rịba ama otú mmetụta Hana ji kpee ekpere haruru. (1 Samuel 1:9-13) Rịba ama mmetụta ha abụọ nwere banyere ịdị mkpa nke imezu nkwa ọ bụla e kwere Chineke. (1 Samuel 1:22-28) Obi abụọ adịghị ya na ezi ihe nlereanya ha nyeere Samuel aka ịzụlte àgwà ndị mere ka o nwee ike ịgbaso ụzọ ziri ezi—ọbụna mgbe ndị gbara ya gburugburu bụ́ ndị e chere na ha na-ejere Jehova ozi na-akwanyeghịrị ụzọ nile nke Chineke ùgwù. Ka oge na-aga, Jehova nyere Samuel ọrụ dị ka onye amụma Ya.—1 Samuel 2:11, 12; 3:1-21.
9. (a) Mmetụta ọma ndị dị aṅaa ka Timoti nwetara site n’ebe obibi? (b) Ụdị mmadụ dị aṅaa ka Timoti ghọrọ?
9 Ùnu ga-achọ ka nwa unu nwoke dị ka Timoti, bụ́ onye ghọrọ enyi Pọl onyeozi mgbe ọ bụ nwa okorobịa? Nna Timoti abụghị onye kwere ekwe, ma nne ya na nne ya ochie setịpụrụ ezi ihe nlereanya nke inwe ekele maka ihe ime mmụọ. Obi abụọ adịghị ya na nke a nyere aka n’ịtọ ezi ntọala maka ndụ Timoti dị ka onye Kraịst. A gwara anyị na nne ya, bụ́ Yunaịsị, na nne ya ochie bụ́ Lọịs, nwere “okwukwe ihu abụọ na-adịghị ya.” Ndụ ha dị ka ndị Kraịst abụghị nke ihu abụọ; n’ezie ha biri ndụ n’ụzọ kwekọrọ n’ihe ha sịrị na ha kweere, ha kụzikwaara Timoti na-eto eto ime otu ihe ahụ. Timoti gosipụtara na ya bụ onye a pụrụ ịdabere n’ebe ọ nọ nakwa na ya ji ezi obi chee banyere ọdịmma nke ndị ọzọ.—2 Timoti 1:5; Ndị Filipaị 2:20-22.
10. (a) Ihe nlereanya ndị dị aṅaa sitere n’èzí pụrụ imetụta ụmụ anyị? (b) Olee otú anyị kwesịrị isi meghachi omume mgbe mmetụta ndị a pụtara ìhè n’okwu ma ọ bụ n’àgwà ụmụ anyị?
10 Ihe nlereanya ndị na-emetụta ụmụ anyị adịghị esitecha n’ebe obibi. E nwere ụmụaka ha na ha na-agakọ akwụkwọ, ndị nkụzi ọrụ ha bụ ịkpụzi uche ụmụaka, ndị kwenyesiri ike na onye ọ bụla kwesịrị ikwekọ n’omenala ndị gbanyesiri mkpọrọgwụ ike n’agbụrụ ma ọ bụ n’ógbè, ndị ọkà n’egwuregwu bụ́ ndị a na-etokarị maka ihe ndị ha rụzuru, na ndị ọrụ obodo bụ́ ndị a na-akọ omume ha n’akụkọ. Ọtụtụ nde ụmụaka ahụwokwa obi ọjọọ na-adị n’oge agha. Ò kwesịrị iju anyị anya ma ọ bụrụ na mmetụta ndị a apụta ìhè n’okwu ma ọ bụ n’àgwà ụmụ anyị? Olee otú anyị si emeghachi omume mgbe ha mere otú ahụ? Ịba mbá n’ụzọ na-akpasu iwe ma ọ bụ ịdọ aka ná ntị siri ike ọ̀ na-edozi nsogbu ahụ? Kama imeghachi omume ọkụ ọkụ n’ebe ụmụ anyị nọ, ọ́ gaghị aka mma ịjụ onwe anyị, sị, ‘Ọ̀ dị ihe pụrụ inye aka n’ịghọta ụzọ isi dozie nsogbu a site n’ụzọ Jehova si emeso anyị ihe?’—Tụlee Ndị Rom 2:4.
11. Mgbe ndị nne na nna hiere ụzọ, olee otú nke a pụrụ isi metụta àgwà ụmụ ha?
11 N’ezie, ndị nne na nna na-ezughị okè agajeghị ime ihe banyere nsogbu dị iche iche mgbe nile n’ụzọ kasị mma. Ha ga-ehie ụzọ. Mgbe ụmụaka matara nke ahụ, ọ̀ ga-ebelata ùgwù ha na-akwanyere ndị mụrụ ha? Ọ pụrụ ime otú ahụ, karịsịa ma ọ bụrụ na ndị nne na nna anwaa ikpuchi njehie ha site n’iji aka ike na-egosipụta ikike ha. Ma ihe ga-esi na ya pụta pụrụ ịdị nnọọ iche ma ọ bụrụ na ndị nne na nna dị umeala n’obi ma na-ekweta ihie ụzọ ha n’ụzọ dị mfe. Na nke a, ha pụrụ isetịpụrụ ụmụ ha ihe nlereanya bara uru, bụ́ ndị ọ dị mkpa ịmụta ime otu ihe ahụ.—Jemes 4:6.
Ihe Ihe Nlereanya Anyị Pụrụ Ịkụzi
12, 13. (a) Gịnị ka ọ dị ụmụaka mkpa ịmụta banyere ịhụnanya, oleekwa otú a pụrụ isi kụzie nke a n’ụzọ kasị dị irè? (b) Gịnị mere o ji dị mkpa ka ụmụaka mụta ihe banyere ịhụnanya?
12 E nwere ọtụtụ ihe bara uru a pụrụ ịkụzi n’ụzọ kasị dị irè mgbe e ji ezi ihe nlereanya sochie ntụziaka e nyere n’ọnụ. Tụlee ole na ole n’ime ha.
13 Igosipụta ịhụnanya nke na-adịghị achọ ọdịmma onwe ya nanị: Ihe ịhụnanya pụtara bụ otu n’ime ihe mmụta ndị kasị mkpa a ga-eji ihe nlereanya mesie ike. “Anyị na-ahụ n’anya, n’ihi na [Chineke] buru ụzọ hụ anyị n’anya.” (1 Jọn 4:19) Ọ bụ Isi Iyi na ihe nlereanya kasịnụ nke ịhụnanya. A kpọtụrụ ịhụnanya a nke ụkpụrụ na-eduzi, bụ́ a·gaʹpe, aha ihe karịrị 100 ugboro n’ime Bible. Ọ bụ àgwà e ji amata ezi ndị Kraịst. (Jọn 13:35) A ga-egosipụta ịhụnanya dị otú ahụ n’ebe Chineke na Jisọs Kraịst nọ, ụmụ mmadụ kwesịkwara igosipụta ya n’ebe ibe ha nọ—ọbụna n’ebe ụmụ mmadụ ndị ọ pụrụ ịbụ na ihe ha adịghị amasị anyị, nọ. (Matiu 5:44, 45; 1 Jọn 5:3) Ịhụnanya a aghaghị ịdị n’obi anyị, ọ ga-apụtakwa ìhè ná ndụ anyị tupu anyị enwee ike ịkụziri ya ụmụ anyị n’ụzọ dị irè. Omume na-ekwu okwu karịa okwu ọnụ. N’ime ezinụlọ, ọ dị ụmụaka mkpa ịhụ na ịbụ ndị e gosiri ịhụnanya na àgwà ndị yiri ya, dị ka mmasị. E wepụ ihe ndị a, a na-abịada uto nwatakịrị n’ụzọ anụ ahụ, uche, na n’ụzọ mmetụta uche. Ọ dịkwa ụmụaka mkpa ịhụ ụzọ kwesịrị ekwesị e si na-egosipụta ịhụnanya na mmasị n’ebe ndị Kraịst ibe anyị bụ́ ndị na-abụghị ndị òtù ezinụlọ anyị nọ.—Ndị Rom 12:10; 1 Pita 3:8.
14. (a) Olee otú a pụrụ isi kụziere ụmụaka ịrụ ọrụ dị mma nke na-eju afọ? (b) Olee otú a pụrụ isi mee nke a n’ime ezinụlọ unu?
14 Ịmụta otú e si arụ ọrụ: Ọrụ bụ akụkụ dị oké mkpa nke ndụ. Ka mmadụ wee nwee mmetụta nke ùgwù onwe onye, ọ dị ya mkpa ịmụta otú e si arụ ọrụ dị mma. (Eklisiastis 2:24; 2 Ndị Tesalọnaịka 3:10) Ọ bụrụ na e kenyere nwatakịrị ọrụ ndị e nyere ya nnọọ obere ntụziaka na ha, e mesịakwa baara ya mba n’ihi arụghị ha nke ọma, o yighị ka ọ ga-amụta ịrụ ọrụ dị mma. Ma mgbe ụmụaka na-amụ ịrụ ọrụ site n’iso ndị mụrụ ha na-arụ ọrụ n’ezie, a na-ajakwa ha mma n’ụzọ kwesịrị ekwesị, o yikarịrị ka ha ga-amụta ịrụ ọrụ na-eju afọ. Ọ bụrụ na nne na nna ejiri nkọwa sochie ihe nlereanya ha, ụmụ ha pụrụ ịmụta ọ bụghị nanị otú e si arụzu ọrụ kamakwa otú e si emeri nsogbu, otú e si anọgidesi ike n’ọrụ ruo mgbe ọ gwụrụ, na otú e si eche echiche ma mee mkpebi. N’ọnọdụ dị otú a, a pụrụ inyere ha aka ịghọta na Jehova na-arụkwa ọrụ, na ọ na-arụ ọrụ dị mma, nakwa na Jisọs na-eṅomi Nna ya. (Jenesis 1:31; Ilu 8:27-31; Jọn 5:17) Ọ bụrụ na ezinụlọ na-arụ ọrụ ugbo ma ọ bụ na-achụ nta ego, ụfọdụ n’ime ndị òtù ezinụlọ ahụ pụrụ ịrụkọ ọrụ ọnụ. Ma ọ bụ ikekwe nne pụrụ ịkụziri nwa ya nwoke ma ọ bụ nwa ya nwanyị isi nri na ihichasị ebe a nọ rie nri. Nna nke na-arụ ọrụ n’ebe na-abụghị ụlọ ya pụrụ ime atụmatụ iso ụmụ ya rụọ ọrụ n’ụlọ. Lee ka o si bụrụ ihe bara uru mgbe nne na nna bu n’uche ọ bụghị nanị ịrụzu ọrụ ndị e nwere mgbe ahụ kama, ịkwadebe ụmụ ha ná ndụ ha nile!
15. N’ụzọ dịgasị aṅaa ka a pụrụ isi kụzie ihe banyere okwukwe? Nye ihe atụ.
15 Ịnọgide na-enwe okwukwe n’agbanyeghị ahụhụ: Okwukwe bụkwa akụkụ dị mkpa nke ndụ anyị. Mgbe a tụlere okwukwe n’ọmụmụ ihe ezinụlọ, ụmụaka pụrụ ịmụta ịkọwa ya. Ha pụkwara ịmata ihe na-eme ka okwukwe malite ito n’obi ha. Ma mgbe ha hụrụ ka ndị mụrụ ha na-egosipụta okwukwe kwụ chịm n’agbanyeghị ule ndị tara akpụ, mmetụta ya pụrụ ịdịru ogologo ndụ ha nile. Di nke otu onye a na-amụrụ Bible na Panama yiri ya egwu ịchụpụ ya n’ụlọ ma ọ bụrụ na ọ kwụsịghị ijere Jehova ozi. N’agbanyeghị nke ahụ, mgbe nile, ya na obere ụmụ ya anọ na-eje ije ruo kilomita 16, ha abanyezie bọs gbaa kilomita 30 ọzọ iji garuo n’Ụlọ Nzukọ Alaeze kasị nso. N’ịbụ ndị ihe nlereanya ahụ gbara ume, ihe dị ka mmadụ 20 so n’ezinụlọ ya anabatawo ụzọ nke eziokwu ahụ.
Isetịpụ Ihe Nlereanya n’Ọgụgụ Bible Kwa Ụbọchị
16. N’ihi gịnị ka e ji atụ aro ọgụgụ Bible ezinụlọ kwa ụbọchị?
16 Otu n’ime omenala ndị kasị baa uru nke ezinụlọ ọ bụla pụrụ iguzobe—omenala nke ga-abara nne na nna uru ma bụrụ ihe nlereanya dịịrị ụmụ ha iṅomi—bụ ịgụchi Bible anya. Ọ bụrụ na o kwe nnọọ omume, na-agụtụnụ Bible kwa ụbọchị. Ihe kasị mkpa abụghị ókè unu gụruru. Ihe ka nnọọ mkpa bụ otú e si agụchi ya anya na ụzọ e si na-agụ ya. Tụkwasị n’ịgụ Bible, ụmụaka pụrụ ịdị na-ege kaseti ndị a na-ege ege nke Akwukwọm nke Akukọ Bible ma ọ bụrụ na e nwere ha n’asụsụ unu. Ịgụ Okwu Chineke kwa ụbọchị na-enyere anyị aka ibute echiche Chineke ụzọ. Ọ bụrụkwa na a na-agụ ọgụgụ Bible dị otú ahụ dị ka ezinụlọ, n’abụghị nanị onye nke ọ bụla ịgụ ya n’onwe ya, nke a pụrụ inyere ezinụlọ ahụ dum aka ijegharị n’ụzọ nile nke Jehova. Ọ bụ omume a ka a gbara ume ya ná Mgbakọ “Ụzọ Ndụ nke Chineke” e mere na nso nso a n’ihe nkiri bụ́ Ezinụlọ—Meenụ Ọgụgụ Bible Kwa Ụbọchị Ụzọ Ndụ Unu!—Abụ Ọma 1:1-3.
17. Olee otú ọgụgụ Bible ezinụlọ na iburu akụkụ akwụkwọ nsọ ndị gbara ọkpụrụkpụ n’isi si enye aka n’itinye ndụmọdụ ahụ dị ná Ndị Efesọs 6:4 n’ọrụ?
17 Ịgụ Bible dị ka ezinụlọ kwekọrọ n’ihe Pọl onyeozi dere n’akwụkwọ ozi o ji ike mmụọ nsọ degara ndị Kraịst nọ n’Efesọs, nke bụ́: “Ndị bụ nna, akpasukwala ụmụ unu iwe: kama na-azụpụta ha n’ọzụzụ na ịdụ ọdụ nke Onyenwe anyị.” (Ndị Efesọs 6:4) Gịnị ka nke ahụ pụtara? “Ịdụ ọdụ” pụtara n’ụzọ nkịtị “itinye uche n’ime”; ya mere a na-agba ndị Kraịst bụ́ nna ume itinye uche Jehova Chineke n’ime ụmụ ha—inyere ụmụ ha aka ịmara echiche Chineke. Ịgba ụmụaka ume iburu akụkụ akwụkwọ nsọ ndị gbara ọkpụrụkpụ n’isi pụrụ inye aka iji mezuo nke a. Nzube ya bụ iji mee ka echiche Jehova na-eduzi echiche ụmụaka ahụ ka ọchịchọ na omume ha wee jiri nke nta nke nta na-egosipụta ụkpụrụ nsọpụrụ Chineke ma nne na nna hà nọ ya ma ọ bụ na ha anọghị ya. Bible bụ ntọala maka iche echiche dị otú ahụ.—Deuterọnọmi 6:6, 7.
18. Mgbe a na-agụ Bible, gịnị pụrụ ịdị mkpa iji (a) ghọta ya nke ọma? (b) rite uru site na ndụmọdụ dị na ya? (ch) meghachi omume n’ihe ọ na-ekpughe banyere nzube Jehova? (d) rite uru site n’ihe ọ na-ekwu banyere àgwà na omume ndị mmadụ?
18 N’ezie, ọ bụrụ na Bible gaje imetụta ndụ anyị, ọ dị anyị mkpa ịghọta ihe ọ na-ekwu. Nye ọtụtụ ndị, nke a pụrụ ịchọ ịgụ akụkụ akwụkwọ nsọ ụfọdụ ihe karịrị otu ugboro. Iji ghọta okwu ụfọdụ nke ọma, ọ pụrụ ịdị anyị mkpa ịchọ okwu n’akwụkwọ ọkọwa okwu ma ọ bụ n’Insight on the Scriptures. Ọ bụrụ na ọ bụ ndụmọdụ ma ọ bụ iwu dị n’akụkụ akwụkwọ nsọ ahụ, wepụtanụ oge iji kwurịta ọnọdụ ndị e kwesịrị itinye ya n’ọrụ n’oge anyị. Mgbe ahụ unu pụrụ ịjụ, sị, ‘Olee otú itinye ndụmọdụ a n’ọrụ pụrụ isi baara anyị uru?’ (Aịsaịa 48:17, 18) Ọ bụrụ na akụkụ akwụkwọ nsọ ahụ na-ekwu banyere akụkụ ụfọdụ nke nzube Jehova, jụọnụ, sị, ‘Olee otú nke a si metụta ndụ anyị?’ Ikekwe unu na-agụ akụkọ na-ekwu banyere àgwà na omume ndị mmadụ. Nrụgide ndị dị aṅaa ka ha nọ na-enwe ná ndụ? Olee otú ha si nagide ha? Olee otú anyị pụrụ isi rite uru site n’ihe nlereanya ha? Na-ewepụtanụ oge mgbe dum iji tụlee ihe ihe ndekọ ahụ pụtara ná ndụ anyị taa.—Ndị Rom 15:4; 1 Ndị Kọrint 10:11.
19. Site n’ịbụ ndị na-eṅomi Chineke, gịnị ka anyị ga na-enye ụmụ anyị?
19 Lee ụzọ mara mma ọ bụ isi kụnye echiche Chineke n’uche na n’obi anyị! N’ụzọ dị otú a, a ga-enyere anyị aka n’ezie ịghọ “ndị na-eṅomi Chineke, dị ka ụmụ a hụrụ n’anya.” (Ndị Efesọs 5:1) Anyị ga-esetipụkwa ihe nlereanya nke ụmụ anyị kwesịrị iṅomi n’ezie.
Ị̀ Na-echeta?
◻ Olee otú ndị nne na nna pụrụ isi rite uru site n’ihe nlereanya Jehova?
◻ N’ihi gịnị ka a na-aghaghị iji ezi ihe nlereanya nke ndị nne na nna sochie ntụziaka e ji ọnụ nye ụmụaka?
◻ Olee ihe ụfọdụ a na-akụzi n’ụzọ kasị mma site n’ihe nlereanya nke ndị nne na nna?
◻ Olee otú anyị pụrụ isi rite uru zuru ezu site n’ọgụgụ Bible ezinụlọ?
[Foto ndị dị na peeji nke 10]
Ọtụtụ na-agụkọ Bible ọnụ kwa ụbọchị dị ka ezinụlọ