Rụsie Ọrụ Ike Maka Nzọpụta nke Ezinụlọ Gị
“Na-azụpụta ha n’ọzụzụ na ịdụ ọdụ nke Onyenwe anyị.”—NDỊ EFESỌS 6:4.
1, 2. Ihe ịma aka ndị dị aṅaa na-eche ndị nne na nna ihu taa?
OTU magazin a ma ama kpọrọ ya oké mgbanwe. Nke a bụ n’otu isiokwu kọwara mgbanwe na-akpata nkụja bụ́ ndị werewooro ọnọdụ n’ezinụlọ n’afọ ndị a. A sịrị na ndị a bụ “ihe sitere ná ntiwapụ nke ịgba alụkwaghịm, nlụgharị di ma ọ bụ nwunye, ịgbaghachi alụkwaghịm, ụmụ a kwatara n’iko, na ihe ndọlị ndị ọhụrụ n’ime ezinụlọ ndị dị n’otu.” Ihe nrụgide na ndọlị ndị ahụ abụghị ihe ịtụnanya, n’ihi na Bible buru amụma na ndị mmadụ ga-eche “oge dị oké egwu” ihu na “mgbe ikpeazụ” ndị a.—2 Timoti 3:1-5.
2 Ya mere ndị nne na nna taa na-eche ihe ịma aka ndị ọgbọ ndị gafeworonụ na-amaghị ihu. Ọ bụ ezie na ụfọdụ ndị nne na nna n’etiti anyị azụlitewo ụmụ n’ụzọ nile nke Chineke ‘site na nwa ọhụrụ,’ ọtụtụ ezinụlọ ka na-amalite nnọọ amalite ‘ijegharị n’eziokwu ahụ.’ (2 Timoti 3:15; 3 Jọn 4) Ụmụ ha pụrụ itopụtawo mgbe ndị mụrụ ha malitere ịkụziri ha ụzọ nile nke Chineke. Ọzọkwa, a na-achọta ọnụ ọgụgụ na-arị elu nke ezinụlọ ndị nwere nanị nne ma ọ bụ nna na ezinụlọ ndị e kuchiri ekuchi n’etiti anyị. N’agbanyeghị ihe bụ ọnọdụ gị, okwu ntụziaka nke Pọl onyeozi dị irè: “Na-azụpụta ha n’ọzụzụ na ịdụ ọdụ nke Onyenwe anyị.”—Ndị Efesọs 6:4.
Ndị Nne na Nna bụ́ Ndị Kraịst na Ọrụ Ha
3, 4. (a) Ihe ndị dị aṅaa meworo ka òkè ndị bụ́ nna dalata? (b) N’ihi gịnị ka ndị Kraịst bụ́ nna na-agaghị eji bụrụ nanị ndị na-akpata nri ma ọlị?
3 Rịba ama na Pọl gwara “ndị bụ́ nna” n’ụzọ bụ isi okwu ya ndị di ná Ndị Efesọs 6:4. Otu onye na-ede akwụkwọ kọwara na n’ọgbọ ndị gara aga “ọ dị ndị bụ́ nna n’aka inye ụmụ ha nzụlite nke omume na nke ime mmụọ; ọ dịịrị ndị bụ́ nna ịhụ maka ọzụzụ nke ụmụ ha. . . . Ma Oké Mgbanwe n’Usoro Mmepụta Ihe wepụsịrị mmekọrịta nke a chiri anya; ndị bụ nna hapụrụ ugbo na ụlọ ahịa ha, hapụ ụlọ ha ịga rụọ ọrụ n’ụlọ ọrụ mmepụta ihe dị iche iche na e mesịa n’ọfịs dị iche iche. Ndị bụ nne weghaara ọrụ ndị dịbuuru ndị bụ́ nna. N’ụzọ na-arịwanye elu, ịbụ nna ghọrọ ihe a na-ekwu nanị n’ọnụ.”
4 Ndị ikom bụ́ ndị Kraịst: Afọ ejula unu n’ịbụ nanị ndị na-akpata nri, na-ahapụrụ nwunye unu ọzụzụ na nzụlite nile nke ụmụ unu. Ilu 24:27 gbara ndị bụ́ nna n’oge ochie ume, sị: “Dozie ije ozi gị n’èzí, jikerekwaara ya onwe gị n’ọhịa; e mesịa wuokwa ụlọ gị.” N’otu aka ahụ taa, dị ka nwoke na-arụ ọrụ, ọ pụrụ ịdị gị mkpa ịdọgbusi onwe gị ike n’ọrụ ruo ogologo oge iji nweta ihe e ji ebi ndụ. (1 Timoti 5:8) Otú ọ dị, e mesịa, biko wepụta oge iji “wuokwa ụlọ gị”—ná mmetụta uche na n’ime mmụọ.
5. Olee otú ndị nwunye bụ́ ndị Kraịst pụrụ isi rụọ ọrụ maka nzọpụta nke ezinụlọ ha?
5 Ndị nwunye bụ́ ndị Kraịst: Unu onwe unu kwa aghaghị ịrụsi ọrụ ike maka nzọpụta nke ezinụlọ unu. Ilu 14:1 na-asị: “Nwanyị ọ bụla nke maara ihe ewuwo ụlọ ya.” Dị ka ndị nwekọ alụmdi na nwunye, gị na di gị na-ekerịta ibu ọrụ nke ịzụlite ụmụ unu. (Ilu 22:6; Malakaị 2:14) Nke a pụrụ ịgụnye inye ụmụ unu ahụhụ, ịkwadebe ha maka nzukọ ndị Kraịst na ozi ubi, ma ọ bụ ọbụna iduzi ọmụmụ ihe ezinụlọ mgbe di gị na-enweghị ike ime otú ahụ. Ị pụkwara ime ihe dị ukwuu n’ịkụziri ụmụ unu nkà dị iche iche nke ezinụlọ, ezi akparamagwa, ịdị ọcha anụ ahụ, na ọtụtụ ihe ndị ọzọ na-enye aka. (Taịtọs 2:5) Mgbe ndị bụ́ di na nwunye na-arụkọ ọrụ ọnụ n’ụzọ dị otú a, ha pụrụ ilekọta mkpa nke ụmụ ha n’ụzọ ka mma. Gịnị bụ nnọọ ụfọdụ n’ime mkpa ndị ahụ?
Ilekọta Mkpa Mmetụta Uche Ha
6. Òkè ndị dị aṅaa ka ndị bụ́ nne na nna na-ekere ná ntolite mmetụta uche nke ụmụ ha?
6 “Mgbe nwanyị nke na-azụ nwa na-elezi ụmụ nke aka ya anya,” ha na-enwe mmetụta nke ịnọ ná nchebe, ntụkwasị obi, na ịhụnanya. (1 Ndị Tesalọnaịka 2:7; Abụ Ọma 22:9) Ndị nne ole na ole pụrụ iguzogide mkpali nke ịwụkwasị ụmụ ọhụrụ ha nlekọta. Aịsaịa onye amụma jụrụ, sị: “Nwanyị, ọ̀ ga-echezọ nwa ya na-aṅụ ara, wee ghara inwe obi ebere n’ahụ nwa afọ ya?” (Aịsaịa 49:15) Ndị nne si otú a na-ekere òkè dị mkpa ná ntolite mmetụta uche nke ụmụaka. Otú ọ dị, ndị nna na-ekerekwa òkè dị mkpa n’akụkụ nke a. Onye nkụzi banyere ezinụlọ bụ́ Paul Lewis na-asị: “Enwetụbeghị m otu onye ọrụ ebere nke lekọtatụworo nwa [na-enupụ isi] bụ́ nke kọrọ na ha nwere mmekọrịta dị mma ha na nna ha. Ọbụna otu n’ime ọtụtụ narị adịghị.”
7, 8. (a) Ihe àmà dị aṅaa ka e nwere nke nkekọ siri ike n’etiti Jehova Chineke na Ọkpara ya? (b) Olee otú ndị bụ́ nna pụrụ isi soro ụmụ ha guzobe nkekọ nke ịhụnanya?
7 Ya mere ọ dị oké mkpa na ndị Kraịst bụ́ nna ga-eji nlezianya zụlite nkekọ ịhụnanya n’ebe ụmụ ha nọ. Dị ka ihe atụ, tụlee Jehova Chineke na Jisọs Kraịst. Mgbe e mere Jisọs baptism, Jehova kwupụtara, sị: “Gị onwe gị bụ Ọkpara m M hụrụ n’anya; ihe Gị dị m ezi mma.” (Luk 3:22) E kwuru ihe dị ukwuu n’okwu ole na ole ndị ahụ! Jehova (1) nakweere Ọkpara ya, (2) kwupụta n’ihu ọha ịhụnanya ya maka Jisọs, nakwa (3) mee ka a mara na ihe Jisọs dị ya ezi mma. Ma, nke a abụghị nanị mgbe Jehova kwupụtara ịhụnanya ya maka Ọkpara ya. Jisọs mesịrị gwa Nna ya, sị: “Ị hụrụ m n’anya mgbe a ka atọghị ntọala ụwa.” (Jọn 17:24) Ma, n’ezie, ọ̀ bụ na nnakwere, ịhụnanya, na ịbụ ndị ihe ha dị nna ha ezi mma adịghị ụmụ nile na-erube isi, bụ́ ndị ikom na ndị inyom, mkpa?
8 Ọ bụrụ na ị bụ nna, ma eleghị anya ị pụrụ ime ihe dị ukwuu iji wulite nkekọ ịhụnanya nke gị na ụmụ gị site n’ime mgbe mgbe ngosi ịhụnanya ndị kwesịrị ekwesị a na-ahụ anya na ndị nke okwu ọnụ. Ọ bụ eziokwu na ọ na-esiri ndị ikom ụfọdụ ike igosipụta ịhụnanya ha, karịsịa ma ọ bụrụ na ọ dịghị mgbe ha nwetara ngosipụta pụtara ìhè nke ịhụnanya site n’aka nna nke ha. Ma ọbụna mgbalị dị ihere iji gosi ụmụ gị ịhụnanya pụrụ inwe mmetụta dị ike. E kwuwerị, “ịhụnanya na-ewuli elu dị ka ụlọ.” (1 Ndị Kọrint 8:1) Ọ bụrụ na ụmụ gị nwere mmetụta nke ịbụ ndị nọ ná nchebe n’ihi ịhụnanya gị nke onye bụ nna, ha ga na-achọkarị ịbụ ‘ụmụ n’ezie’ nakwa na-enwere onwe ha ịgwa gị ihe nzuzo ha.—Ilu 4:3.
Ilekọta Mkpa Ime Mmụọ Ha
9. (a) Olee otú ndị Israel bụ́ nne na nna bụ́ ndị na-atụ egwu Chineke si hụ maka mkpa ime mmụọ nke ezinụlọ ha? (b) Ohere ndị dị aṅaa ka ndị Kraịst nwere ịkụziri ụmụ ha ihe mgbe a na-akwadoghị akwado?
9 Ụmụaka nwekwara mkpa ime mmụọ. (Matiu 5:3) Mosis gbara ndị Israel bụ́ nne na nna ume, sị: “Okwu ndị a, nke mụ onwe m na-enye gị n’iwu taa, ga-adịkwasịkwa n’obi gị: ị ga-ejisikwa ike izi ha ụmụ gị, ị ga-ekwukwa okwu banyere ha mgbe ị na-anọdụ n’ụlọ gị, na mgbe ị na-eje ije n’ụzọ, na mgbe ị na-edina ala, na mgbe ị na-ebili ọtọ.” (Deuterọnọmi 6:6, 7) Ọ bụrụ na ị bụ nne ma ọ bụ nna bụ́ onye Kraịst, ị pụrụ ime ihe dị ukwuu nke izi ihe gị n’ọnọdụ a na-akwadoghị akwado, dị ka “mgbe ị na-eje ije n’ụzọ.” Oge e ji jiri ụgbọ ala ezinụlọ na-eme njem, na-azụ ahịa, ma ọ bụ soro ụmụ gị na-aga site n’ụlọ ruo n’ụlọ n’ozi ndị Kraịst na-enye ohere ndị dị mma iji zie ihe n’ọnọdụ ndị na-enye ntụsara ahụ. Oge nri bụ oge dị mma nke ukwuu maka ezinụlọ ịkparịta ụka. “Anyị na-eji oge nri ekwurịta banyere ihe ndị mere n’ụbọchị,” ka otu nne naakọwa.
10. N’ihi gịnị ka ọmụmụ ihe ezinụlọ ji abụ ihe ịma aka mgbe ụfọdụ, mkpebi dịkwa aṅaa siri ike ka ndị nne na nna na-aghaghị ime?
10 Otú ọ dị, izi ihe a kwadoro akwado site n’ọmụmụ Bible a na-eme n’ụzọ chiri anya nke gị na ụmụ gị dịkwa oké mkpa. Ọ bụ eziokwu na “uche gbagọrọ agbagọ bụ ihe e kekọtaworo n’obi” ụmụaka. (Ilu 22:15) Ụfọdụ ndị nne na nna na-asị na ụmụ ha pụrụ n’ụzọ dị mfe igbochi ọmụmụ ihe ezinụlọ ha. N’ụzọ dị aṅaa? Site n’ịkpa aghara na ịkpa àgwà ịtụ ọ́bọ̀, site n’ime ka e nwee ihe ndọpụ uche ndị na-agbakasị ahụ (dị ka ha na ụmụnne ha ịlụ ọgụ), ma ọ bụ site n’ime ka ọ bụ na ha amaghị eziokwu Bible ndị bụ́ isi. Ọ bụrụ na nke a eruo n’ọ̀tụ̀tụ̀ nke ịghọ ọgụ nke onye a ga-eme uche ya, uche nke nne ma ọ bụ nna aghaghị isi ike karị. Ndị Kraịst bụ́ nne na nna agaghị ada mbà ma ọlị ma kwere ka ụmụ ha chịkwaa ezinụlọ ha.—Tụlee Ndị Galetia 6:9.
11. Olee otú a pụrụ isi mee ọmụmụ ihe ezinụlọ ihe dị ụtọ?
11 Ọ bụrụ na ụmụ gị adịghị anụ ụtọ nke ọmụmụ ihe ezinụlọ, ma eleghị anya a pụrụ ime mgbanwe ụfọdụ. Dị ka ihe atụ, è ji ọmụmụ ihe ahụ eme ihe ngọpụ iji tụleghachi ihe ọhụrụ ndị ụmụ unu mehiere? Ma eleghị anya ọ ga-akasị mma ịtụle nsogbu ndị dị otú ahụ ná nzuzo. À na-enwe ọmụmụ ihe unu n’ụzọ chiri anya? Ọ bụrụ na ị na-akagbu ya maka ihe ngosi telivishọn ma ọ bụ egwuregwu nke na-amasịkarị gị, ma eleghị anya ụmụ gị agaghị eji ọmụmụ ihe ahụ kpọrọ ihe nke ọma. Ị̀ na-enwe ikpo ọkụ ma na-anụ ọkụ n’obi n’ụzọ i si eduzi ọmụmụ ihe ahụ? (Ndị Rom 12:8) Ee, e kwesịrị ịdị na-anụ ụtọ ọmụmụ ihe. Gbalịa ịhụ na ụmụaka ahụ dum tinyere ọnụ. Nwee àgwà ziri ezi ma na-ewuli elu, jiri ikpo ọkụ na-aja ụmụ gị mma n’ihi ha ikere òkè. Ma, agụzula nanị ihe a na-amụ, kama gbalịa iru n’obi.—Ilu 23:15.
Ịdọ Aka ná Ntị n’Ezi Omume
12. N’ihi gịnị ka ịdọ aka ná ntị na-ejighị metụta inye ahụhụ nkịtị mgbe nile?
12 Ụmụaka nwekwara mkpa siri ike maka ịdọ aka ná ntị. Dị ka nne ma ọ bụ nna, i kwesịrị ịkpara ha ókè. Ilu 13:24 na-asị: “Onye na-egbochi mkpanaka ya na-akpọ nwa ya asị: ma onye na-ahụ ya n’anya na-adọsi ya aka ná ntị ike.” Otú ọ dị, Bible adịghị ekwu na a ghaghị inye ahụhụ mgbe nile site n’iti ihe. Ilu 8:33 na-asị: “Nụrụnụ ịdọ aka ná ntị,” a gwakwara anyị na “ịbasi mba ike na-abami n’ime onye nghọta karịa ka [narị] otiti ihe ga-aba n’ime onye nzuzu.”—Ilu 17:10.
13. Olee otú e kwesịrị isi nye nwatakịrị ịdọ aka ná ntị?
13 N’otu ọnọdụ, ịdọ aka nà ntị n’ụzọ a na-ahụ anya pụrụ ikwesị ekwesị. Otú ọ dị, ọ bụrụ na e mee ya n’iwe, o yikarịrị ka ọ ga-agafe ókè ma ghara ịdị irè. Bible na-adọ aka ná ntị, sị: “Ndị bụ́ nna, akpasula ụmụ unu iwe, ka obi ghara ifu ha.” (Ndị Kọlọsi 3:21) N’ezie, “mmegbu na-eme ka onye maara ihe ghọọ onye nzuzu.” (Eklisiastis 7:7) Onye ntorobịa e menyere iwe pụrụ ọbụna inupụ isi megide ụkpụrụ nile nke ezi omume. N’ihi ya ndị nne na nna kwesịrị iji Akwụkwọ Nsọ mee ihe n’ịdọ ụmụ ha aka ná ntị n’ezi omume n’ụzọ dị ike ma bụrụ nke a haziri nke ọma. (2 Timoti 3:16) A na-eji ịhụnanya na ịdị nro na-enye ịdọ aka ná ntị Chineke.—Tụlee 2 Timoti 2:24, 25.a
14. Gịnị ka ndị nne na nna kwesịrị ime ma ọ bụrụ na ha enwee mkpali ịdaba n’oké ọnụma?
14 Otú ọ dị, “anyị nile na-asụ ngọngọ n’ọtụtụ ihe.” (Jemes 3:2) Ọbụna nne ma ọ bụ nna nke na-ahụkarị n’anya pụrụ ịsụ ngọngọ n’ihe nrụgide nke oge a nọ na ya ma kwuo ihe na-ekwekọghị n’obi ọma ma ọ bụ mee ngosipụta nke ọnụma. (Ndị Kọlọsi 3:8) Ọ bụrụ na nke ahụ emee, ekwela ka anyanwụ daa mgbe nwa gị ka nọ n’oké mwute ma ọ bụ gị onwe gị nọrọ n’ọnọdụ mkpasu iwe. (Ndị Efesọs 4:26, 27) Gị na nwa gị dozie okwu, na-arịọ mgbaghara ma nke ahụ yie ihe kwesịrị ekwesị. (Tụlee Matiu 5:23, 24.) Igosipụta obi umeala dị otú ahụ pụrụ ịdọta gị na nwa gị nso karị. Ọ bụrụ na ọ dị gị ka ị pụghị ịchịkwa mmụọ gị nakwa na ị ga-adaba n’oké ọnụma, rịọ enyemaka n’aka ndị okenye ọgbakọ a họpụtara ahọpụta.
Ezinụlọ Ndị Nwere Nanị Nne ma ọ bụ Nna na Ndị nke Ụmụ Na-esiteghị n’Otu Nne na Nna
15. Olee otú a pụrụ isi nyere ụmụaka ndị nọ n’ezinụlọ nwere nanị nne ma ọ bụ nna aka?
15 Ma, ọ bụghị ụmụaka nile nwere nkwado nke mmadụ abụọ mụrụ ha. N’ime United States, 1 nwatakịrị n’ime 4 ka a na-azụlite n’aka nanị nne ma ọ bụ nna. ‘Ụmụ mgbei’ juru eju n’oge Bible, e kwupụtakwara nchegbu maka ha ugboro ugboro n’Akwụkwọ Nsọ. (Ọpụpụ 22:22) Taa, ezinụlọ ndị Kraịst nwere nanị nne ma ọ bụ nna n’otu aka ahụ na-eche ihe nrụgide na ihe isi ike dị iche iche ihu, ma ha pụrụ inwe nkasi obi n’ịmara na Jehova bụ “nna nke ụmụ mgbei, na onye ikpe nke ndị inyom di ha nwụrụ.” (Abụ Ọma 68:5) A gbara ndị Kraịst ume “ileta ụmụ mgbei na ndị inyom di ha nwụrụ n’ime mkpagbu ha.” (Jemes 1:27) Ndị kwere ekwe ibe ha pụrụ ime ihe dị ukwuu n’inyere ezinụlọ ndị nwere nanị nne ma ọ bụ nna aka.b
16. (a) Gịnị ka ndị nne ma ọ bụ nna ọ bụ nanị ha kwesịrị ime maka ezinụlọ nke ha? (b) N’ihi gịnị ka inye ịdọ aka ná ntị pụrụ iji sie ike, ma n’ihi gịnị ka a na-aghaghị iji nye ya?
16 Ọ bụrụ na ị bụ nne ma ọ bụ nna nke ọ bụ nanị gị, gịnị ka gị onwe gị pụrụ ime iji baara ezinụlọ gị uru? Ọ dị gị mkpa ịdị uchu banyere ọmụmụ Bible ezinụlọ, ịga nzukọ, na ozi ubi. Otú ọ dị, ịdọ aka ná ntị pụrụ ịbụ ihe ịma aka siri ike karịsịa. Ma eleghị anya ị ka na-eru újú n’ihi mfu nke di ma ọ bụ nwunye gị ị hụrụ n’anya n’ọnwụ. Ma ọ bụ ị ka na-agbaso mmetụta nke obi ọmụma ikpe ma ọ bụ iwe n’ihi ntisa alụmdi na nwunye mgba. Ọ bụrụkwa na nwa ahụ ga-abụ ọ nọtụrụ onye a ọ nọtụrụ onye nke ọzọ, ị pụrụ ọbụna ịdị na-atụ egwu na nwa ahụ pụrụ ịdị na-ahọrọ ịnọnyere di ma ọ bụ nwunye gị kewapụrụnụ ma ọ bụ nke a gbara alụkwaghịm. Ọnọdụ ndị dị otú ahụ pụrụ ime ka o sie ike ná mmetụta uche inye ịdọ aka ná ntị a haziri nke ọma. Otú ọ dị, Bible na-agwa anyị na “nwata nke a na-ahapụ n’onwe ya na-eme ka ihere mee nne ya.” (Ilu 29:15) Ya mere atọla n’obi ọmụma ikpe, ịkwa ụta, ma ọ bụ nrụgide mmetụta uche nke sitere n’aka onye ị lụrụ na mbụ. Guzobe ụkpụrụ ndị ezi uche dị na ha na ndị kwụ chịm. Emebila ụkpụrụ dị iche iche nke Bible.—Ilu 13:24.
17. Olee otú òkè ndị òtù ezinụlọ kwesịrị ikere pụrụ isi gharakwa ido anya n’ezinụlọ nwere nanị nne ma ọ bụ nna, gịnịkwa ka a pụrụ ime iji gbochie nke a?
17 Ma, ihe isi ike pụrụ ibilite ma ọ bụrụ na nne ọ bụ nanị ya emesoo nwa ya nwoke dị ka nnọchiteanya di—nwoke nwe ụlọ—ma ọ bụ nwa ya nwanyị dị ka onye a na-agwa ihe nzuzo, jiri nsogbu ndị miri emi na-ebogbu ya. Ime otú ahụ ekwesịghị ekwesị, ọ na-emekwa ka nwatakịrị nwee mgbagwoju anya. Mgbe òkè nke nne ma ọ bụ nna na nke nwatakịrị na-edokwaghị anya, ịdọ aka ná ntị pụrụ ịdakpọ. Mee ka a mara na ọ bụ gị bụ nne ma ọ bụ nna. Ọ bụrụ na ị bụ nne nwere mkpa maka okwu ndụmọdụ dabeere na Bible, chọọ ya n’aka ndị okenye ma ọ bụ ma eleghị anya n’aka nwanna nwanyị tozuru okè nke meworo okenye.—Tụlee Taịtọs 2:3-5.
18, 19. (a) Gịnị bụ ihe ịma aka ụfọdụ ezinụlọ ebe ndị ụmụ na-esiteghị n’otu nne na nna na-eche ihu? (b) Olee otú ndị nne na nna na ụmụaka n’ezinụlọ ebe ụmụ na-esiteghị n’otu nne na nna pụrụ isi gosi amamihe na nghọta?
18 Ezinụlọ dị iche iche ebe ụmụ na-esighị n’otu nne na nna na-echekwa ihe ịma aka ihu n’otu aka ahụ. Ọtụtụ mgbe, nne ma ọ bụ na nna kuchiri nwa na-achọpụta na “ịhụnanya bịara ozugbo” na-adị ụkọ. Dị ka ihe atụ, ụmụ sitere ná nne ma ọ bụ nna ọzọ pụrụ ịdị na-emeghachi omume ngwa ngwa nnọọ n’ihe ọ bụla yiri igosi ụmụ mmadụ mụrụ n’onwe ya ihu ọma karị. (Tụlee Jenesis 37:3, 4.) N’ezie, ụmụ sitere ná nne ma ọ bụ nna ọzọ pụrụ ịdị na-alụ ọgụ megide iru újú maka nne ma ọ bụ nna ha nke hapụrụ na egwu nke na ịhụ nne ma ọ bụ nna kuchiri ha n’anya ga-abụ eguzosighị ike n’ihe nye nna ma ọ bụ nne mụrụ ha. Mgbalị nile iji nye ịdọ aka ná ntị dị mkpa pụrụ ịbụ nke e ji ihe ncheta bụ́, ‘Ọ bụghị gị mụrụ m!’ zute.
19 Ilu 24:3 na-asị: “Amamihe ka e ji ewu ụlọ; ọ bụkwa nghọta ka e ji eme ka o guzosie ike.” Ee, ọ na-ewe amamihe na nghọta n’akụkụ nke mmadụ nile ka ezinụlọ ebe ụmụ na-esighị n’otu nne na nna nwee ihe ịga nke ọma. Mgbe oge na-aga, ụmụaka aghaghị ịnakwere eziokwu ahụ na-egbukarị mgbu nke bụ na ihe agbanwewo. Ọ pụkwara ịdị ndị nne na nna kuchiri nwa mkpa ịmụta inwe ndidi na ọmịiko, ọ bụghị ịdị oké ngwa ịbụ onye a kpasuru iwe mgbe e chere ihe yiri ịbụ onye a jụrụ ajụ ihu. (Ilu 19:11; Eklisiastis 7:9) Tupu i were ọrụ nke onye na-enye ịdọ aka ná ntị, rụọ ọrụ n’iguzobe ọbụbụ enyi n’ebe nwa ahụ nọ. Ruo mgbe e guzobere nkekọ dị otú ahụ, ụfọdụ pụrụ ile ya anya dị ka ihe ka mma ikwe ka nne ma ọ bụ nna nke ọ bụ ya mụrụ nwa ahụ nye ịdọ aka ná ntị. Mgbe nrụgide bilitere, a ghaghị ime mgbalị iji kwurịta okwu. “E nwere amamihe n’ebe ndị na-agbakọ izu nọ,” ka Ilu 13:10.c
Nọgide Na-arụ Ọrụ Maka Nzọpụta nke Ezinụlọ Gị!
20. Gịnị ka onye isi ezinụlọ bụ́ onye Kraịst kwesịrị ịnọgide na-eme?
20 Ezinụlọ ndị Kraịst siri ike abụghị ihe ndabara ma ọlị. Unu bụ́ ndị isi ezinụlọ aghaghị ịga n’ihu ịrụsi ọrụ ike maka nzọpụta nke ezinụlọ unu. Mụrụ anya, na-ahụta àgwà ndị na-adịghị mma ma ọ bụ ọchịchọ nke ndị ụwa. Setịpụ ihe nlereanya ọma n’okwu, n’akparamagwa, n’ịhụnanya, n’okwukwe, na n’ịdị ọcha. (1 Timoti 4:12) Gosipụta mkpụrụ nke mmụọ Chineke. (Ndị Galetia 5:22, 23) Ndidi, nchebara echiche, mgbaghara, na ịdị nro ga-emesiwanye mgbalị gị nile ike ịkụziri ụmụ gị ụzọ nile nke Chineke.—Ndị Kọlọsi 3:12-14.
21. Olee otú a pụrụ isi nọgide na-enwe ọnọdụ na-ekpo ọkụ, nke obi ụtọ n’ezinụlọ mmadụ?
21 Site n’enyemaka Chineke, gbalịa ịnọgide na-enwe mmụọ obi ụtọ, nke na-ekpo ọkụ n’ezinụlọ gị. Wepụta oge nọkọọ ọnụ dị ka ezinụlọ, na-agbalịsi ike irikọ ọ dịkarịa ala otu ugbo nri ọnụ kwa ụbọchị. Nzukọ ndị Kraịst, ije ozi ubi, na ọmụmụ ihe ezinụlọ dị mkpa. Ma, e nwekwara “mgbe ịchị ọchị . . . na mgbe ite egwú.” (Eklisiastis 3:1, 4) Ee, setịpụ oge maka ntụrụndụ na-ewuli elu. Ije leta ebe ndebe ihe mgbe ochie, ebe a na-edebe ụmụ anụmanụ, na ebe ndị dị otú ahụ na-enye ezinụlọ dum ọṅụ. Ma ọ bụ ị pụrụ ịgbanyụ TV ma wepụta oge bụọ abụ, gee egwú, gwurie egwu, ma kpaa nkata. Nke a pụrụ inyere ezinụlọ aka ịbịa nso karị.
22. N’ihi gịnị ka i kwesịrị iji rụọ ọrụ maka nzọpụta nke ezinụlọ gị?
22 Ka unu nile bụ́ ndị nne na nna bụ́ ndị Kraịst nọgide na-arụ ọrụ ime Jehova obi ụtọ n’ụzọ zuru ezu ‘ka unu na-ejegharị n’ụzọ kwesịrị Onyenwe anyị ime otú ọ ga-atọ Ya ụtọ n’ụzọ nile, na-amị mkpụrụ n’ezi ọrụ nile ọ bụla, na-abakwa ụba n’ime ezi ihe ọmụma Chineke.’ (Ndị Kọlọsi 1:10) Wulite ezinụlọ gị n’elu ntọala nke nrubeisi nye Okwu Chineke. (Matiu 7:24-27) Jidekwa n’aka na mgbalị gị nile iji zụlite ụmụaka gị “n’ọzụzụ na ịdụ ọdụ nke Onyenwe anyị” ga-enwe nnwapụta ya.—Ndị Efesọs 6:4.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Lee isiokwu bụ́ “Echiche Nke Bible: ‘Mkpanaka nke Ịdọ Aka ná Ntị’—Ọ̀ Ghọọla Ihe Oge Ya Gafeworo?” na Teta! nke December 8, 1992.
b Lee Ụlọ Nche nke March 15, 1981, peji nke 6-18.
c Lee Ụlọ Nche nke May 1, 1985, peji nke 21-25.
Olee Otú Ị Ga-esi Zaa?
◻ Olee otú di na nwunye ga-esi rụkọọ ọrụ ọnụ n’iwulite ezinụlọ ha?
◻ Gịnị bụ mkpa ụfọdụ nke mmetụta uche nke ụmụaka, oleekwa ụzọ a ga-esi gboo ndị a?
◻ Olee otú ndị isi ezinụlọ pụrụ isi kụziere ụmụaka ha ihe ma n’ọnọdụ a kwadoro akwado na ndị a na-akwadoghị akwado?
◻ Olee otú ndị nne na nna pụrụ isi dọọ aka ná ntị n’ezi omume?
◻ Gịnị ka a pụrụ ime maka abamuru nke ezinụlọ ndị nwere nanị nne ma ọ bụ nna na ebe ndị ụmụ na-esiteghị n’otu nne na nna?
[Foto dị na peeji nke 16]
Ịhụnanya na nnwapụta nke onye bụ́ nna dị mkpa maka ntolite mmetụta uche nke nwatakịrị