Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w99 4/15 p. 18-22
  • Ụzọ Isi Mata ma Merie Adịghị Ike Ime Mmụọ Ọ Bụla

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ụzọ Isi Mata ma Merie Adịghị Ike Ime Mmụọ Ọ Bụla
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Nyochaa Ihe Agha Ime Mmụọ Gị
  • Ịmata Mgbaàmà Ya
  • Nzọụkwụ Ndị Dị Mma Iji Merie Adịghị Ike Ime Mmụọ
  • Nọgide Bụrụ Onye Dị Ike n’Ụzọ Ime Mmụọ Ugbu A
  • “Yikwasịnụ Ihe Agha Nile nke Chineke”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1992
  • “Yikwasịnụ Ekike Agha Zuru Ezu nke Sitere Na Chineke”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2004
  • “Yirinụ Ekike Agha Zuru Ezu nke Si n’Aka Chineke”
    Usoro Ihe Omume—Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ—2019
  • “Nọgidenụ Na-enweta Ike N’ime Onyenwe Anyị”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2004
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
w99 4/15 p. 18-22

Ụzọ Isi Mata ma Merie Adịghị Ike Ime Mmụọ Ọ Bụla

DỊ KA AKỤKỌ ỌDỊBENDỊ NA-EMEGHỊ EME NKE NDỊ GRIS SI DỊ, ACHILLES BỤ dike kasị nwee obi ike n’etiti ndị dike Gris lụrụ Agha Troy, bụ́ agha a lụsoro obodo Troy. Akụkọ mgbe ochie na-ekwu na mgbe Achilles bụ nwa ọhụrụ, nne ya sụnyere ya n’Osimiri Styx, si otú a mee ka ọ bụrụ onye ihe ọ bụla na-apụghị imetụta ma e wezụga ebe nne ya jidere ya aka—ikiri ụkwụ Achilles ahụ a na-atụ n’ilu. Nke ahụ bụ kpọmkwem ebe akụ́ ahụ na-egbu egbu, nke Paris, bụ́ nwa nwoke Eze Priam nke Troy gbara, gbatara ma gbuo Achilles.

Ndị Kraịst bụ ndị agha Kraịst, ndị na-alụ agha ime mmụọ. (2 Timoti 2:3) “Ịgba mgba anyị,” ka Pọl onyeozi na-akọwa, “abụghị imegide anụ ahụ na ọbara, kama ọ bụ imegide ịbụ ndị isi nile, imegide ịchị isi nile, imegide ndị onwe ụwa nke ọchịchịrị a, imegide ndị agha mmụọ nke ajọ ihe n’ebe dị n’eluigwe.” Ee, ndị iro anyị abụghị ndị ọzọ ma e wezụga Setan bụ́ Ekwensu na ndị mmụọ ọjọọ ya.—Ndị Efesọs 6:12.

N’ụzọ pụtara ìhè, nke a gaara abụ agha dị n’etiti òtù abụọ na-ahaghị nhata ma a sị na ọ bụghị n’ihi enyemaka anyị na-enweta site n’aka Jehova Chineke, bụ́ onye a kọwaworo dị ka “onye agha.” (Ọpụpụ 15:3) Iji chebe onwe anyị pụọ n’aka ndị iro ọjọọ anyị, e nyere anyị ihe agha ime mmụọ. Ọ bụ ya mere onyeozi ahụ ji gbaa ume, sị: “Yikwasịnụ ihe agha nile nke Chineke, ka unu wee pụ iguzogide ihe nile ekwensu na-ezupụta.”—Ndị Efesọs 6:11.

Obi abụọ adịghị ya na ihe agha ahụ Jehova Chineke nyere bụ nke kasị mma, nke nwere ike iguzogide ụdị mwakpo ime mmụọ ọ bụla. Leedị nnọọ anya n’ihe ndị Pọl depụtara: ihe okike nke bụ eziokwu, ihe agha na-egbochi obi nke bụ ezi omume, akpụkpọ ụkwụ nke bụ ozi ọma, ọta nke bụ okwukwe, okpu agha nke bụ nzọpụta, na mma agha nke bụ mmụọ nsọ. Olee ngwá ọrụ ka mma mmadụ pụrụ ịtụ anya inwe? N’iyikwasị ihe agha ndị dị otú ahụ, onye agha bụ́ onye Kraịst nọ n’ọnọdụ dị mma inwe mmeri, n’agbanyeghị ọnọdụ ndị siri ike.—Ndị Efesọs 6:13-17.

Ọ bụ ezie na ihe agha ime mmụọ ahụ sitere n’aka Jehova bụ nke kasị mma, bụrụkwa isi iyi nke nchebe nye anyị, anyị agaghị eji ya gwurie egwu. N’iburu n’uche Achilles ahụ e chere na a pụghị imeri emeri, ọ̀ ga-ekwe omume na anyị onwe anyị pụrụ inwe ebe anyị na-adịghị ike, bụ́ ikiri ụkwụ Achilles n’ụzọ ime mmụọ? Nke ahụ pụrụ ịkpata ọnwụ ma a wakwasị anyị na mberede.

Nyochaa Ihe Agha Ime Mmụọ Gị

Otu onye na-agba n’elu ice nke nwetara ihe nrite ọlaedo ugboro abụọ n’egwuregwu Olympic, bụ́ onye o yiri ka ahụ o siri ya nnọọ ike, dara na mberede ma nwụọ n’oge mmụgharị ihe. Ntakịrị oge mgbe nke ahụ gasịrị, a kọrọ otu akụkọ na-akpali echiche na The New York Times: “Ọkara nke ndị America 600,000 na-enwe obi nkụchi kwa afọ adịghị enwe mgbaàmà ọ bụla tupu o mee.” N’ụzọ doro anya, a pụghị ikpebi ọnọdụ ahụ ike anyị nanị site n’otú ahụ dị anyị.

Otú ahụkwa ka ọ dị mgbe a bịara n’ahụ ike ime mmụọ anyị. Ndụmọdụ Bible bụ: “Onye na-eche na ọ na-eguzo, ya lezie anya ka ọ ghara ịda.” (1 Ndị Kọrint 10:12) Ọ bụ ezie na ihe agha ime mmụọ anyị bụ nke kasị mma e nwere, adịghị ike pụrụ ibilite. Nke a bụ n’ihi na a mụrụ anyị ná mmehie, ọdịdị anyị nke ime mmehie na nke ezughị okè pụkwara imeri mkpebi anyị ime uche Chineke n’ụzọ dị mfe. (Abụ Ọma 51:5) N’agbanyeghị ezi ebumnobi anyị, obi anyị dị aghụghọ pụrụ ịghọgbu anyị site n’ichepụta echiche ma ọ bụ ime ngọpụ ndị na-abụchaghị eziokwu, nke na anyị na-eleghara adịghị ike anyị anya n’ụzọ dị mfe ma ghọgbuo onwe anyị iche na nsogbu adịghị.—Jeremaịa 17:9; Ndị Rom 7:21-23.

Tụkwasị na nke a, anyị na-ebi n’ụwa ebe a na-agwagbukarị ma na-agbanwe ihe bụ́ ezi ihe na ihe ọjọọ. A pụrụ ikpebi ma ihe ò ziri ezi ma ọ bụ na o zighị ezi site ná mmetụta onye ahụ na-enwe. A na-akwalite ụdị echiche a ná mkpọsa ngwá ahịa, ntụrụndụ na-ewu ewu, na n’usoro mgbasa ozi. N’ụzọ pụtara ìhè, ọ bụrụ na anyị akpachapụghị anya, a pụrụ ịrafu anyị gaa n’iche echiche otú ahụ, ihe agha ime mmụọ anyị pụkwara ịmalite ịghọ nke na-adịghị ike.

Kama ịdaba n’ụdị ọnọdụ ahụ dị ize ndụ, anyị kwesịrị ịṅa ntị na ndụmọdụ Bible bụ́: “Na-anwanụ onwe unu, ma ùnu dị n’okwukwe anyị; na-anwapụtanụ onwe unu.” (2 Ndị Kọrint 13:5) Mgbe anyị mere otú ahụ, anyị ga-enwe ike ịchọpụta adịghị ike ọ bụla pụrụ ibiliteworị ma mee ihe ndị dị mkpa iji dozie ha tupu ndị iro anyị ahụ ha ma mee mwakpo ha. Otú ọ dị, olee otú anyị pụrụ isi mee nnwale dị otú ahụ? Olee mgbaàmà ụfọdụ anyị kwesịrị ile anya ha ná nnyocha onwe onye a?

Ịmata Mgbaàmà Ya

Otu mgbaàmà a na-enwekarị nke pụrụ igosi adịghị ike ime mmụọ bụ iselata aka n’àgwà ịmụ ihe onwe onye anyị. Ụfọdụ na-eche na ha kwesịrị ịdị na-amụ ihe karị ma ha apụghị nnọọ ime ya. N’ihi ndụ taa nke jupụtara n’iji ọrụ n’aka, ọ dị mfe ịdaba n’ọnọdụ ọjọọ dị otú ahụ. Otú ọ dị, ihe ka njọ bụ na ndị mmadụ na-echekarị na ha na-agbalịtụ, ebe ha na-agụ mbipụta ndị e ji amụ Bible mgbe ọ bụla ike kwere ha, ha pụkwara ije nzukọ ụfọdụ nke ndị Kraịst.

Echiche dị otú ahụ bụ otu ụdị nke mmadụ ịghọ onwe ya aghụghọ. O yiri nwoke nke na-eche na ya ji ọrụ n’aka nke ukwuu nke na ya apụghị ịnọdụ ala rie nri kwesịrị ekwesị, ya mere ọ na-eritụ nri mgbe ọ bụla o kwere mee, ka ọ na-esi n’otu ihe banye n’ọzọ. Ọ bụ ezie na o nwere ike agụụ agaghị agụgbu ya, ọ pụrụ ịmalite inwe nsogbu ahụ ike ka oge na-aga. N’otu aka ahụ, ọ bụrụ na anyị adịghị eri nri ime mmụọ na-edozi ahụ mgbe dum, anyị pụrụ inwe ebe ndị na-adịghị ike n’ihe agha ime mmụọ anyị n’oge na-adịghị anya. N’ịbụ ndị echiche na àgwà nke ụwa na-awakpo mgbe nile, anyị pụrụ ịdaba ná mwakpo ndị na-eweta ọnwụ nke Setan n’ụzọ dị mfe.

Mgbaàmà ọzọ nke adịghị ike ime mmụọ bụ enwekwaghị echiche ịdị ngwa n’agha ime mmụọ anyị. Onye agha adịghị enwe mmetụta nke ahụ erughị ala na nke ihe ize ndụ nke agha n’oge udo. N’ihi ya ọ pụrụ iche na ọ dịghị mkpa ịdị njikere. Ọ bụrụ na a kpọọ ya na mberede ka ọ banye ọrụ, ọ pụrụ nnọọ ịbụ na ọ gaghị adị njikere. Otú ahụ ka ọ dị n’ụzọ ime mmụọ. Ọ bụrụ na anyị ekwe ka echiche ịdị ngwa anyị daa, anyị pụrụ ịghọ ndị na-adịghị njikere iguzogide mwakpo ndị pụrụ ịbịakwasị anyị.

Otú ọ dị, olee otú anyị pụrụ isi mara ma ànyị adabawo n’ọnọdụ a? Anyị pụrụ ịjụ onwe anyị ajụjụ ụfọdụ ndị pụrụ ikpughe otú ọnọdụ dị n’ezie: Ọ̀ na-agụ m agụụ ịga ozi ọma dị ka o si agụ m ịga mkpagharị? Àna m adị njikere iwepụta oge ịkwadebe maka nzukọ dị ka m na-adị n’ịga ahịa ma ọ bụ n’ikiri TV? Àna m echeghachi echiche azụ banyere nchụso ma ọ bụ ohere ndị m hapụrụ mgbe m ghọrọ onye Kraịst? Àna m enwe anyaụfụ n’ihe a sị na ọ bụ ndụ ọma nke ndị ọzọ na-ebi? Ndị a bụ ajụjụ na-akpali iche echiche, ma ha na-enye aka n’ịchọpụta adịghị ike ọ bụla n’ihe agha ime mmụọ anyị.

Ebe ihe agha nchebe anyị nwere bụ nke ime mmụọ, ọ dị oké mkpa na mmụọ Chineke dị ná ndụ anyị n’enweghị ihe mgbochi. A na-egosipụta nke a site n’ókè mkpụrụ nke mmụọ Chineke pụtaruru ìhè n’ihe omume nile anyị. Ị̀ bụ onye a na-akpasu iwe ma ọ bụkwanụ onye na-ewe iwe ngwa ngwa mgbe ndị ọzọ mere ma ọ bụ kwuo ihe na-amasịghị gị? Ọ̀ na-esiri gị ike ịnara ndụmọdụ, ka ị̀ na-eche na ndị ọzọ na-ahụchatakarị gị? Ị̀ na-enwe anyaụfụ dị ukwuu banyere ngọzi ma ọ bụ ihe ndị ọzọ rụzuru? Ọ̀ na-esiri gị ike gị na ndị ọzọ ịdị n’udo, karịsịa ndị ọgbọ gị? Nnyocha onwe onye e ji ezi obi mee ga-enyere anyị aka ịhụ ma ndụ anyị ò jupụtara ná mkpụrụ nke mmụọ Chineke ka ọrụ nke anụ ahụ hà ji aghụghọ na-abata.—Ndị Galetia 5:22-26; Ndị Efesọs 4:22-27.

Nzọụkwụ Ndị Dị Mma Iji Merie Adịghị Ike Ime Mmụọ

Otu ihe bụ ịmata mgbaàmà nke adịghị ike ime mmụọ; ihe ọzọ bụ ilekwasị ha anya ma mee ihe iji dozie ha. N’ụzọ dị mwute, ọtụtụ ndị na-emekarị ngọpụ, na-eme ka ọ dịchaghị njọ, na-ebelata nsogbu ahụ, ma ọ bụ na-agọpụ na ọ dị. Lee ka nke ahụ si dị ize ndụ—dị ka iyi ihe agha na-ezughị ezu na-eje agha! Omume dị otú ahụ ga-eme ka anyị bụrụ nnọọ ndị Setan ga-awakpo. Kama nke ahụ, anyị kwesịrị ime ihe doro anya ngwa ngwa iji dozie ntụpọ ọ bụla anyị pụrụ ịchọpụta. Gịnị ka anyị pụrụ ime?—Ndị Rom 8:13; Jemes 1:22-25.

Ebe anyị na-alụ agha ime mmụọ—agha nke na-agụnye ịchịkwa uche na obi nke onye Kraịst—anyị aghaghị ime ihe nile anyị pụrụ ime iji chebe ikike anyị. Cheta na ‘ihe agha nke na-egbochi obi bụ́ ezi omume,’ bụ́ nke na-echebe obi anyị, na “okpu agha nke bụ nzọpụta,” bụ́ nke na-echebe uche anyị, so n’ihe agha ime mmụọ anyị. Ịmụta iji ndokwa ndị a eme ihe n’ụzọ dị irè pụrụ ime ka anyị nwee mmeri kama ịbụ ndị e meriri.—Ndị Efesọs 6:14-17; Ilu 4:23; Ndị Rom 12:2.

Iyikwasị ‘ihe agha nke na-egbochi obi bụ́ ezi omume’ nke ọma na-achọ ka anyị na-enyocha onwe anyị mgbe nile banyere ịhụnanya anyị hụrụ ezi omume na asị anyị kpọrọ mmebi iwu. (Abụ Ọma 45:7; 97:10; Emọs 5:15) Ụkpụrụ anyị ọ̀ dịwo ala dị ka nke ụwa? Ànyị na-ahụtazi ihe ndị wụburu anyị akpata oyi n’ahụ ma ọ bụ ihe ndị kpasuburu anyị iwe dị ka ihe ntụrụndụ—ma ọ bụ n’ìhè ma ọ bụ n’ihe nkiri TV na sinima, n’akwụkwọ nakwa na magazin? Ịhụ ezi omume n’anya ga-enyere anyị aka ịhụ na ihe a na-ebuli elu n’ụwa dị ka nnwere onwe na ịma ihe pụrụ n’ezie ịbụ inwe mmekọahụ aghara aghara na aghụghọ zoro ezo.—Ndị Rom 13:13, 14; Taịtọs 2:12.

Ikpukwasị “okpu agha nke bụ nzọpụta” na-agụnye iburu ngọzi ndị dị ebube dị n’ihu n’uche nke ọma, ghara ikwe ka igbu mara mara na ihe ndọrọ nke ụwa dọpụ uche anyị. (Ndị Hibru 12:2, 3; 1 Jọn 2:16) Inwe echiche a ga-enyere anyị aka ime ka ọdịmma ime mmụọ anyị bute uru ihe onwunwe ma ọ bụ uru onwe onye ụzọ. (Matiu 6:33) Ya mere, iji jide n’aka na anyị yikwasịrị ihe agha a nke ọma, anyị aghaghị iji obi eziokwu jụọ onwe anyị, sị: Gịnị ka m na-achụso ná ndụ? M̀ nwere ihe mgbaru ọsọ ime mmụọ ndị a kapịrị ọnụ? Gịnị ka m na-eme iji ruo ha? Ma ànyị so n’ihe fọdụrụ ná ndị Kraịst e tere mmanụ ma ọ bụ ‘n’oké ìgwè mmadụ’ ahụ bara ụba, anyị kwesịrị iṅomi Pọl, bụ́ onye sịrị: “Mụ onwe m agụghị onwe m na ejidewo m [ya] ruo ugbu a: ma otu ihe ka m na-eme, ebe m na-echezọ ihe nile dị n’azụ, na-esetịpụkwa aka n’ebe ihe nile dị n’ihu dị, ana m agbakwuru oké ịgba ọsọ.”—Mkpughe 7:9; Ndị Filipaị 3:13, 14.

Pọl ji ndụmọdụ a mechie nkọwa ya banyere ihe agha ime mmụọ anyị: “Sitekwanụ n’ekpere na arịrịọ nile na-ekpe ekpere n’oge nile n’ime Mmụọ Nsọ, werekwa ịnọgidesi ike na ịrịọ arịrịọ nile banyere ndị nsọ nile na-amụ anya ime nke a.” (Ndị Efesọs 6:18) Nke a na-egosi ezi ihe abụọ anyị pụrụ ime iji merie ma ọ bụ gbochie adịghị ike ime mmụọ ọ bụla: Wulite ezi mmekọrịta n’etiti gị na Chineke, sorokwa ndị Kraịst ibe gị nwee nkekọ chiri anya.

Mgbe anyị nwere àgwà nke iji ekpere “nile” (nkwupụta mmehie anyị, ịrịọ mgbaghara, ịrịọ maka nduzi, ekele maka ngọzi, otuto ndị sitere n’obi) chigharịkwuru Jehova “n’oge nile” (n’ihu ọha, nanị anyị, n’onwe anyị, site n’obi), anyị na-aghọ ndị ha na Jehova nwere mmekọrịta chiri anya. Nke ahụ bụ ihe nchebe kasị ukwuu anyị pụrụ inwe.—Ndị Rom 8:31; Jemes 4:7, 8.

N’aka nke ọzọ, a na-adụ anyị ọdụ ikpe ekpere “banyere ndị nsọ nile,” ya bụ, maka ndị Kraịst ibe anyị. N’ekpere anyị, anyị pụrụ icheta ụmụnna ime mmụọ anyị nọ n’ala ndị dị anya bụ́ ndị na-enwe mkpagbu ma ọ bụ ihe isi ike ndị ọzọ. Ma gịnị banyere ndị Kraịst anyị na ha na-arụkọ ọrụ ma na-akpakọrịta kwa ụbọchị? O kwesịrị ekwesị ikpekwa ekpere banyere ha, ọbụna dị ka Jisọs kpere banyere ndị na-eso ụzọ ya. (Jọn 17:9; Jemes 5:16) Ekpere dị otú ahụ na-ejikọta anyị ọnụ, na-ewusikwa anyị ike iguzogide mwakpo nke “ajọ onye ahụ.”—2 Ndị Tesalọnaịka 3:1-3.

N’ikpeazụ, buru ndụmọdụ ịhụnanya Pita onyeozi n’uche nke ọma: “Ọgwụgwụ ihe nile dị nso: ya mere nweenụ uche zuru okè, nweekwanụ anya udo ka unu wee kpee ekpere: nke bụ́ isi ihe nile meenụ ka ịhụnanya ahụ unu na-ahụrịta onwe unu dị ike; n’ihi na ịhụnanya na-ekpuchi ọtụtụ mmehie.” (1 Pita 4:7, 8) Ọ dị nnọọ mfe ikwe ka ezughị okè mmadụ—nke anyị na nke ndị ọzọ—bata n’obi na n’uche anyị ma ghọọ ihe mgbochi, ihe mkpọbi ụkwụ. Setan maara adịghị ike a nke mmadụ nke ọma. Ịkpata nkewa ma merie bụ otu n’ime ụzọ aghụghọ ya. Ya mere, anyị aghaghị ime ngwa ngwa iji ịhụnanya siri ike maka ibe anyị kpuchie mmehie ndị dị otú ahụ, gharakwa ‘inye ekwensu ụzọ.’—Ndị Efesọs 4:25-27.

Nọgide Bụrụ Onye Dị Ike n’Ụzọ Ime Mmụọ Ugbu A

Mgbe ị chọpụtara na ntutu isi gị ghasara aghasa ma ọ bụ na taị gị gbagọrọ agbagọ, gịnị ka ị na-eme? O yikarịrị ka ị na-edozi ha ngwa ngwa o kwere mee. Mmadụ ole na ole ga-ahapụ ha nnọọ, na-eche na ihe ndị dị otú ahụ na-adịghị mma anya na-ahụ adịghị ihe ha mere. Ka anyị mee ihe ngwa ngwa otú ahụ n’ihe banyere adịghị ike ime mmụọ anyị. Ntụpọ anụ ahụ pụrụ ime ka ndị mmadụ na-ele anyị anya ọjọọ, ma ntụpọ ime mmụọ a na-edozighị pụrụ ịkpata enweghị ihu ọma Jehova.—1 Samuel 16:7.

Jehova ejiriwo ịhụnanya nye anyị ihe nile dị anyị mkpa iji nyere anyị aka ịchọpụta adịghị ike ime mmụọ ọ bụla na iji nọgide bụrụ ndị siri ike n’ụzọ ime mmụọ. Site ná nzukọ ndị Kraịst, mbipụta ndị e ji amụ Bible, na ndị Kraịst ibe anyị tozuru okè, ndị na-echekwa banyere anyị, ọ na-enye ihe ncheta na aro ndị bara uru mgbe nile banyere ihe anyị na-aghaghị ime. Ọ dị anyị n’aka ịnakwere ma tinye ha n’ọrụ. Nke a na-achọ mgbalị na ọzụzụ onwe onye. Ma cheta ihe Pọl onyeozi ji obi eziokwu kwuo: “Mụ onwe m na-agba ọsọ otú a, dị ka onye na-adịghị agba n’eleghị anya ihe; otú a ka m na-esu ọkpọ, dị ka onye na-adịghị apịa ifufe: ma ana m etipụta ahụ m ọnyá, meekwa ya ka ọ bụrụ ohu m: ka mụ onwe m ghara ịghọ onye a jụrụ ajụ n’ụzọ ọ bụla, mgbe m kwusasịrị okwu Chineke nye ndị ọzọ.”—1 Ndị Kọrint 9:26, 27.

Mụrụ anya, ekwekwala ma ọlị ka i nwee ikiri ụkwụ Achilles n’ụzọ ime mmụọ. Kama nke ahụ, ka anyị jiri ịdị umeala n’obi na obi ike mee ihe dị mkpa ugbu a iji mata ma merie adịghị ike ime mmụọ ọ bụla anyị nwere.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 19]

“NA-ANWANỤ ONWE UNU, MA ÙNU DỊ N’OKWUKWE ANYỊ; NA-ANWAPỤTANỤ ONWE UNU.”—2 Ndị Kọrint 13:5.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 21]

“NKE BỤ́ ISI IHE NILE MEENỤ KA ỊHỤNANYA AHỤ UNU NA-AHỤRỊTA ONWE UNU DỊ IKE; N’IHI NA ỊHỤNANYA NA-EKPUCHI ỌTỤTỤ MMEHIE.”—1 Pita 4:7, 8.

[Igbe/Foto dị na peeji nke 20]

JỤỌ ONWE GỊ . . .

◆ Ọ̀ na-agụ m agụụ iwepụta oge ịkwadebe maka nzukọ dị ka o si agụ m ịga ahịa ma ọ bụ ikiri TV?

◆ Àna m enwe anyaụfụ n’ihe a sị na ọ bụ ndụ ọma nke ndị ọzọ na-ebi?

◆ À na-akpasu m iwe ngwa ngwa mgbe ndị ọzọ mere ma ọ bụ kwuo ihe na-amasịghị m?

◆ Ọ̀ na-esiri m ike ịnara ndụmọdụ, ka m̀ na-eche na ndị ọzọ na-ahụchatakarị m?

◆ Ọ̀ na-esiri m ike mụ na ndị ọzọ ịdị n’udo?

◆ Ụkpụrụ m ọ̀ dịwo ala dị ka nke ụwa?

◆ M̀ nwere ihe mgbaru ọsọ ime mmụọ ndị a kapịrị ọnụ?

◆ Gịnị ka m na-eme iji ruo ihe mgbaru ọsọ ime mmụọ m?

[Ebe e sigasị nweta foto dị na peeji nke 18]

Achilles: Site n’akwụkwọ bụ́ Great Men and Famous Women; Ndị agha Rom nakwa peji nke 21: Historic Costume in Pictures/Dover Publications, Inc., New York

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya