Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w92 5/15 p. 21-23
  • “Yikwasịnụ Ihe Agha Nile nke Chineke”

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • “Yikwasịnụ Ihe Agha Nile nke Chineke”
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1992
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ihe Agha Ahụ
  • Nọgide n’Ekpere, Guzosie Ike
  • “Yikwasịnụ Ekike Agha Zuru Ezu nke Sitere Na Chineke”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2004
  • Olee Otú Jehova Si Echebe Gị?
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2021
  • Ndị Mmụọ Ọjọọ—Olee Otú Anyị Pụrụ Isi Guzogide Ha?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2007
  • “Yirinụ Ekike Agha Zuru Ezu nke Si n’Aka Chineke”
    Usoro Ihe Omume—Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ—2019
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1992
w92 5/15 p. 21-23

“Yikwasịnụ Ihe Agha Nile nke Chineke”

NDỊ Kraịst iyi ihe agha? N’ihi gịnị ka ha ga-eji jie ejiji agha dị otú ahụ? Ọ̀ bụ na ha abụghị ndị hụrụ udo n’anya? (2 Timoti 2:24) Ee, ha bụ. Ka o sina dị, ezi ndị Kraịst nile nọ n’agha—nke ha na-agbalịsi ike na ya, ọ bụghị igbu mmadụ, kama imeri emeri.

A sị na Setan enupụghị isi, ọ dịghị mgbe agha dị otú ahụ gaara adị mkpa. Ma o nupụrụ isi, o duhiekwara Adam na Iv isonye ná nnupụisi ya. Eri mgbe ahụ, usoro nke ụwa nke biliteworo na-atọgbọ n’aka “ajọ onye ahụ,” Setan bụ Ekwensu. (1 Jọn 5:19) Ndị na-edo onwe ha n’okpuru Ọkaaka ahụ bụ́ ezie, bụ́ Jehova, aghaghị iguzogide mmetụta nke ụwa na onye ọchịchị ya. Ha aghaghị ịlụ ọgụ maka ndụ ime mmụọ ha. Iji mezuo nke a, a na-agba ndị Kraịst ume, sị: “Yikwasịnụ ihe agha nile nke Chineke, ka unu wee pụ iguzogide ihe nile ekwensu na-ezupụta.”—Ndị Efesọs 6:11.

Ihe Agha Ahụ

Rịba ama na anyị nwere mkpa maka “ihe agha nile nke Chineke” ma ọ bụrụ na a ga-echebe anyị nke ọma. Ya mere, ka anyị tụlee akụkụ nke ọ bụla nke ihe agha nke a dị ka Pọl onyeozi kọwara wee jiri obi eziokwu tụọ onwe anyị n’ihe ọ̀tụ̀tụ̀ iji mata ma à kwadebezuru anyị maka agha ime mmụọ.—Ndị Efesọs 6:14-17.

“Ya mere guzoonụ, mgbe unu weresịịrị eziokwu kee úkwù unu.” (Ndị Efesọs 6:14a) N’oge Bible ndị agha na-eyi belt ruru inch isii n’obosara nke e ji akpụkpọ anụ mee. Ihe nkedo nke a na-enye aka ichebe úkwù. Mgbe onye agha kesiri ihe nkedo ya ike, nke a na-egosi njikere ọ dị maka agha.

Mgbe ahụ, lee ka o si kwesị ekwesị na e ji eziokwu Chineke tụnyere ihe nkedo onye agha! Nke a na-eme ihe atụ dị mma nke na anyị kwesịrị idebe Okwu Chineke nke eziokwu ezi nso n’ebe anyị nọ, dị ka anyị kedoro n’ahụ anyị. Anyị kwesịrị ịtụgharị uche n’ụzọ dị omimi n’echiche ndị dị n’ime Okwu Chineke. Nke a ga-echebe anyị pụọ n’ịbụ ndị e ji ụgha na ihe aghụghọ dị iche iche duhie. Ọzọkwa, okwu ndị sitere n’ọnụ Jehova ga-akwado ma nye anyị ume ime mmụọ ma wusie nnọgidesi ike anyị n’ezi ihe ike.

“Werekwa ihe agha nke na-egbochi obi yikwasị, bụ́ ezi omume.” (Ndị Efesọs 6:14b) Ihe mgbochi obi nke onye agha chebere akụkụ ahụ nkịtị dị oké mkpa—obi. Ya mere, n’ekike agha ime mmụọ anyị nke Chineke nyere, ezi omume na-echebe obi anyị. Dị ka Akwụkwọ nsọ na-ekwu, obi bụ ihe atụ dị mma nke ihe anyị bụ n’ime—mmetụta anyị, echiche, na ọchịchọ anyị nile. Ebe Bible na-ekwukwa na obi na-achọkarị ime ihe ọjọọ, ọ dị oké mkpa ịzụlite mkpebi siri ike maka ijigide ụkpụrụ ezi omume Jehova. (Jeremaịa 17:9) Nrubeisi nye Chineke agaghị abụ ma ọlị site ná ngosipụta ihu abụọ; kama ọ ghaghị isite n’ime. Nke a chọrọ ka anyị zụlite ịhụnanya siri ike maka ezi omume na ịkpọasị siri ike n’otu aka ahụ maka mmebi iwu. (Abụ Ọma 45:7) Otú a a ga-echebe obi anyị.

“Werekwa nkwadebe nke bụ ozi ọma nke udo yikwasị n’ụkwụ unu.” (Ndị Efesọs 6:15) È yikwasịrị gị ihe n’ụkwụ n’ụzọ dị otú a? Hà na-akpọga gị n’ozi ubi mgbe nile iji kpọsaa ozi ọma? Ị̀ na-etinye mgbalị siri ike iji mee ka ọdịdị nke ọrụ nkwusa na nkụzi gị ka mma? N’eziokwu, ókèala ụfọdụ adịghị anabatakarị ozi ọma. Ndị mmadụ pụrụ igosipụta enweghị mmasị, mmegide, ma ọ bụ na-ewe iwe. Nkwusa anyị pụrụ ọbụna iwetara anyị mkpagbu. Ma site n’ịnọgidesi ike, ndị Kraịst na-azụlite ntachi obi, àgwà nke na-enye nchebe megide mwakpo nile nke Setan. Ọ bụ ezie na a kpagburu ya, Pọl bụ onye nkwusa na-anụ ọkụ n’obi, a na-agbakwa anyị ume ‘ịghọ ndị na-eṅomi ya, dị ka ya onwe ya ṅomiri Kraịst.’—1 Ndị Kọrint 11:1.

Iji ọrụ n’aka n’ọrụ nkwusa Alaeze na-emesi obi ike anyị ike n’ozi ọma ahụ. Ọzọ, ọ na-eme ohere ka mmụọ Jehova site n’anyị rụọ ọrụ ná mmezu nke uche ya. N’ezie, ọrụ dị otú ahụ na-eme ka anyị bụrụ ndị ha na ndị mmụọ ozi na-arụkọ ọrụ—ọbụna ndị ha na Jehova n’onwe ya na-arụkọ ọrụ. (1 Ndị Kọrint 3:9; Mkpughe 14:6) ‘Inwekwa ọtụtụ ihe ime n’ọrụ Onyenwe anyị’ na-eme ka anyị ‘guzosie ike, ndị a na-apụghị ifopụ efopụ.’ (1 Ndị Kọrint 15:58) Lee ihe nchebe dị ebube nke a na-enye!

“Welienụ ọta [“ọta ukwu,” NW] nke bụ okwukwe.” (Ndị Efesọs 6:16) Onye agha na-eji ọta ukwu echebe onwe ya site n’ụta na ube. Ma ó jighị ihe mgbochi, a pụrụ imerụ ya ahụ nke ukwuu ma ọ bụ ọbụna gbuo ya. Ndị Kraịst na-eche ngwá agha ndị na-egbu egbu ihu ọbụna karị—“àkụ́ ụta nile na-enwu ọkụ nke ajọ onye ahụ.” Ndị a gụnyere ihe nile Setan na-eji eme ihe iji mee ka okwukwe anyị ghara isi ike ma gbuo anyị n’ụzọ ime mmụọ. Ha gụnyere mkpagbu, ihe ụgha, nkà ihe ọmụma nduhie dị iche iche nke ụwa, ndọrọ nke ihe onwunwe, na ọnwụnwa itinye aka n’omume rụrụ arụ. Iji chebe anyị megide ihe ndị a nile, anyị nwere mkpa nke ọta ukwu. Ọ dịghị akụkụ ahụ anyị a pụrụ ịhapụ n’echebeghị ya.

Abraham na nwunye ya, Sera, nwere okwukwe siri ike. Mgbe ha tofeworo ogo ịmụ nwa, ha tinyere okwukwe ná nkwa Chineke nke na a ga-amụtara ha nwa. E mesịa, Abraham gosipụtara okwukwe dị ịrịba ama mgbe o rubere isi n’òkù a kpọrọ ya ịchụ Aịsak n’àjà, nanị nwa o nwere site na Sera ọ hụrụ n’anya. Jehova gbochiri aka Abraham ma nye ihe ọzọ a ga-eji chụọ àjà. Ma Abraham dị njikere irube isi. N’ihi gịnị? N’ihi na o nwere okwukwe zuru ezu na Jehova nwere ike ịkpọlite nwa ya ma mezuo nkwa ndị o kwere banyere ya.—Ndị Rom 4:16-21; Ndị Hibru 11:11, 12, 17-19.

Mosis nwekwara ụdị okwukwe nke dị anyị mkpa. Ọ jụrụ akụ̀ Ijipt, kama nke ahụ na-ahọrọ iso ndị Chineke taa ahụhụ mmegbu. N’ihi gịnị? N’ihi na o nwere okwukwe na Jehova dị, na ọ ga-agbapụtakwa ndị Israel. Okwukwe Mosis siri nnọọ ike nke na “ọ nọgidesiri ike, dị ka ọ na-ahụ Onye ahụ nke a na-apụghị ịhụ ya anya.”—Ndị Hibru 11:6, 24-27.

Ànyị nwere okwukwe a pụrụ iji tụnyere nke ahụ na Jehova? Mmekọrịta anyị na Jehova ò chiri nnọọ anya nke na ọ fọrọ nnọọ nke nta ka ọ bụrụ na anyị pụrụ ịhụ ya anya? Ànyị dị njikere ịchụ àjà ọ bụla ma nagide ihe isi ike ọ bụla iji jigide mmekọrịta anyị na Chineke? Ànyị nwere okwukwe zuru ezu na Jehova? (Ndị Hibru 11:1) Ọ bụrụ otú ahụ, àkụ́ ụta nile na-ere ọkụ nke Setan agaghị eji ike si n’ọta okwukwe anyị gafee.

“Narakwanụ okpu agha nke bụ nzọpụta.” (Ndị Efesọs 6:17a) Okpu onye agha chebere isi ya wee si otú ahụ na-echebe ụbụrụ ya—akụkụ ahụ na-achịkọta ọrụ akwara nile na nke echiche. E ji olileanya nzọpụta nke onye Kraịst tụnyere okpu agha n’ihi na ọ na-echebe uche. E mewo ka uche onye Kraịst dị ọhụrụ site n’ihe ọmụma zuru ezu, ma ọ ka bụ nke onye na-adịghị ike, onye na-ezughị okè. (Ndị Rom 7:18; 12:2) Ọ bụrụ na anyị ekwere ka echiche na-adịghị ọcha bụ́ nke na-ebibi okwukwe, nke mmụọ nke ụwa nke a na-eweta, na-azụ uche, obi ike anyị ná nzọpụta ga-anyụ ka ọkụ, ọ pụkwara imesịa nwụọ. N’aka nke ọzọ, ọ bụrụ na anyị anọgide jiri okwu ndị na-enye ume bụ́ ndị sitere n’ọnụ Chineke na-azụ uche anyị, olileanya anyị ga-anọgide na-egbukepụ egbukepụ ma doo anya. Ị̀ na-ekedosi okpu agha gị nke nzọpụta ike?

“Mma agha nke mmụọ nsọ, nke bụ okwu Chineke.” (Ndị Efesọs 6:17b) Okwu ahụ bụ na ihe nchebe kasị mma bụ ibute ụzọ n’ọgụ bụ eziokwu n’obubu agha onye Kraịst. Ka ụkwụ anyị, nke e ji ozi ọma nke udo kee, na-eburu anyị n’etiti ndị na-ekweghị ekwe, a hapụghị anyị n’enweghị ngwá agha. Okwu Chineke, bụ́ Bible, na-eje ozi dị ka mma agha dị ike iji gbupịa okwu ụgha na echiche ndị na-ezighị ezi n’ụzọ ime mmụọ na inyere ndị nwere obi ziri ezi aka ịchọta nnwere onwe ime mmụọ.—Jọn 8:31, 32.

Jisọs gosipụtara ike nke ngwá agha nke a, mgbe, dị ka a pụrụ ikwu ya, ọ lụsoro Setan bụ́ Ekwensu ọgụ. Mgbe a nwara ya n’ọzara, Jisọs chebere onwe ya megide mwakpo atọ nke Setan site n’iji Okwu Chineke mee ihe n’ụzọ dị irè na-asị: “E dewo ya n’akwụkwọ nsọ.” (Matiu 4:1-11) Ọ bụrụ na anyị amụta iji mma agha nke a eme ihe n’ụzọ nkà, anyị pụrụ inyere ndị dị umeala n’obi aka ịpụta n’okpuru ike Setan. Mgbe ahụ kwa, ndị okenye ọgbakọ na-eji Okwu Chineke echebe ìgwè atụrụ ahụ site na ndị mmadụ na-anwa ikpu okwukwe nke ndị na-adịchaghị ike ihu.—Ọrụ 20:28-30.

Onye agha inweta nkà n’iji mma agha eme ihe adịghị adị mfe. A chọrọ ọzụzụ na mmụgharị dị ogologo, nke e tinyere uche na ya iji na-eburu ya n’ụzọ nkà. N’otu aka ahụ, n’obubu agha ime mmụọ, ọ na-ewe ọmụmụ ihe dị ukwuu na mmụgharị ihe mgbe nile n’ozi iji buru onye nwere nka n’iji Okwu Chineke eme ihe. N’agbanyeghị otú ihe dị, ka anyị tinye mgbalị dị mkpa iji bụrụ ndị nwere nkà n’iji mma agha na-eme ihe n’ụzọ ime mmụọ, nwee ike ịdị “na-ekwuzi okwu nke eziokwu ahụ.”—2 Timoti 2:15.

Nọgide n’Ekpere, Guzosie Ike

Ihe nile mejupụtara ekike agha ime mmụọ anyị dị oké mkpa ka anyị wee nọgidesie ike n’ezi ihe nye Chineke. Ma olee otú anyị pụrụ isi kegide ekike agha nke a? Ịdị na-amụ Bible mgbe nile, na-ebu ụzọ kwadebe maka nzukọ nile nke ndị Kraịst, na ịdị na-ege ntị nke ọma ma na-ekere òkè dị irè na ha ga-enyere anyị aka ịnọgide na-eyikwasị ihe agha anyị. (2 Timoti 3:16; Ndị Hibru 10:24, 25) Iji ịnụ ọkụ n’obi na-ejechi ozi ubi anya, tinyere ezi mkpakọrịta ndị Kraịst ga-enyekwa aka ime ka ihe agha ime mmụọ anyị maka ibu agha na maka nchebe dịrị n’ọnọdụ dị mma.—Ilu 13:20; Ndị Rom 15:15, 16; 1 Ndị Kọrint 15:33.

Ịzụlite ọnọdụ uche ziri ezi dịkwa mkpa. Anyị aghaghị ịjụ ikwere ka ndọrọ nile nke ụwa nke a dọpụ uche anyị. Kama nke ahụ, ka anyị zụlite ‘anya na-ele otu ebe.’ (Matiu 6:19-24) N’iṅomi Jisọs Kraịst, anyị aghaghị ịmụtakwa ịhụ ezi omume n’anya na ịkpọ mmebi iwu asị. (Ndị Hibru 1:9) Ihe ndị a nile na-enyere anyị aka ịnọgide na-eyikwasị ihe agha ime mmụọ anyị nke Chineke nyere.

Mgbe ọ tụlesịrị ihe nke ọ bụla dị n’ihe agha ime mmụọ, Pọl kwubiri okwu site n’ịsị: “Sitekwanụ n’ekpere na arịrịọ nile na-ekpe ekpere n’oge nile n’ime mmụọ nsọ, werekwa ịnọgidesi ike na ịrịọ arịrịọ nile banyere ndị nsọ nile na-amụ anya ime nke a.” (Ndị Efesọs 6:18) Ndị agha na-eguzosi ike n’ihe na-eso isi ụlọ ọrụ ndị agha na-ekwurịta okwu mgbe nile ma na-erube isi n’ụkpụrụ iwu nile. Dị ka ndị agha bụ́ ndị Kraịst, ọ dị anyị mkpa iso Eze Onyenwe anyị, Jehova Chineke na-ekwurịta okwu, site ‘n’onye iwu [“ọchịagha,” NW] ya nye ndị nile dị iche iche,’ bụ́ Jisọs Kraịst. (Aịsaịa 55:4) A pụrụ ime nke a, ọ bụghị site n’ekpere elu ọnụ, kama site n’arịrịọ si n’ala ala obi nke na-egosi ịdị nso na nraranye dị omimi nye Jehova. Site n’iso Jehova na-ekwurịta okwu mgbe nile, anyị na-enweta ume kwa ụbọchị nke ga-akwado anyị n’ọgụ ahụ.

Jisọs sịrị: “Mụ onwe m emeriwo ụwa.” (Jọn 16:33) Jehova chọkwara ka anyị nwee mmeri. Ka ọnwụ Pọl onyeozi na-eru nso, ọ pụrụ ikwu, sị: “Agbasịwo m mgba ọma ahụ, agbasịwo m ọsọ ahụ, edebesịwo m okwukwe ahụ.” (2 Timoti 4:7) Ka anyị nwee ike ikwu ihe dị otú ahụ banyere òkè anyị keere n’ọgụ ahụ. Ọ bụrụ na anyị achọọ nke a n’ezie, ka anyị nwee ike “iguzogide ihe nile Ekwensu na-ezupụta” site n’ịnọgide na-eyikwasị ihe agha nile ahụ sitere n’aka Chineke.—Ndị Efesọs 6:11.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya