Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g20 nke 3 p. 8-9
  • Chọpụta Àgwà Ọma Ndị Ọzọ Nwere

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Chọpụta Àgwà Ọma Ndị Ọzọ Nwere
  • Teta!—2020
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Nsogbu Ahụghị Àgwà Ọma Ndị Ọzọ Nwere Ike Ịkpata
  • Amaokwu Baịbụl Ga-enyere Gị Aka
  • Ihe I Nwere Ike Ime
  • Njedebe nke Ajọ Mbunobi
    Teta!—2004
  • Ịkpọasị Bụ Ọrịa, Ì Bu Ya?
    Teta!—2020
  • Olee Mgbe Ịkpọasị Na-agaghị Adịkwa n’Ụwa?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2013
  • Ịkpọasị na Ịkpa Ókè Olee Ihe Ndị Na-akpata ha?
    Teta!—2009
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Teta!—2020
g20 nke 3 p. 8-9
Foto ndị na-egosi: 1. Ebe iwe na-ewe di na nwunye ọ dị ọsọ ọsọ na otu nwaanyị kpuru ìsì nọchiiri ha ụzọ. 2. Mgbe e mechara, obi dị di na nwunye ahụ ụtọ ka ha hụrụ nwaanyị ahụ kpuru ìsì ka ọ na-akpọ ụbọ.

Chọpụta Àgwà Ọma Ndị Ọzọ Nwere

Nsogbu Ahụghị Àgwà Ọma Ndị Ọzọ Nwere Ike Ịkpata

Mmadụ iche na ọ ka ndị ọzọ mma nwere ike ime ka ọ kpọ ndị ọzọ asị. Onye na-eche otú a na-ewere ya na o nweghị onye ka ya mma. Ọ na-ewere ndị ọzọ ka ndị na-enweghị ihe ha bụ. Onye ọ bụla nwere ike ịmalite chewe ụdị ihe a. Akwụkwọ bụ́ Encyclopædia Britannica kwuru, sị: “Ọtụtụ ndị na-eche na otú ha si ebi ndụ, nri ha, ejiji ha, àgwà ha, ihe ndị ha kweere, ihe ndị na-amasị ha, na ihe ndị ọzọ gbasara ha ka nke ndị ọ bụla ọzọ mma.” Olee otú anyị ga-esi zere ịna-eche otú ahụ?

Amaokwu Baịbụl Ga-enyere Gị Aka

“N’ịdị nwayọọ n’obi na-ewere na ndị ọzọ ka unu.”—NDỊ FILIPAỊ 2:3.

Olee ihe amaokwu a na-akụziri anyị? Anyị kwesịrị ịdị umeala n’obi ka anyị ghara ịna-eche na anyị ka ndị ọzọ. Ịdị umeala n’obi ga-enyere anyị aka ịghọta na e nwere ebe ndị ọzọ si kara anyị mma. O nweghị otu obodo ma ọ bụ agbụrụ ọ bụ naanị ha na-akpa àgwà ọma ma ọ bụ mara ihe karịa ndị ọzọ.

Dị ka ihe atụ, o nwere otu nwoke aha ya bụ Stefan. Ọ kpọburu ndị na-abụghị ndị obodo ha asị. Ma, o mechara kwụsị ya. O kwuru, sị: “Ihe ga-akacha enyere gị aka ịkwụsị ịkpọ ndị ọzọ asị bụ iwere ya na ha ka gị. Amaghị m ihe niile. Enwere m ike isi n’aka onye ọ bụla mụta ihe.”

Ihe I Nwere Ike Ime

Gbalịa mata ihe ndị ị na-agaghị emeli nakwa na e nwere ihe ndị ị na-emejọ. Matakwa na o nwere ihe ndị ọzọ ma eme karịa gị. E nwee àgwà ọjọọ onye si n’otu agbụrụ kpara, echela na mmadụ niile si n’agbụrụ ahụ nwere àgwà ọjọọ ahụ.

E nwee onye si n’otu agbụrụ ị na-ele anya ọjọọ, kama ịna-ele ya anya ọjọọ, jụọ onwe gị, sị:

Matakwa na o nwere ihe ndị ọzọ ma eme karịa gị

  • ‘Àgwà ndị m sịrị na ọ dịghị mma onye a na-akpa, hà bụ àgwà ọjọọ n’eziokwu ka ọ̀ bụ naanị na ha dị iche na nke m?’

  • ‘Onye a ò nwekwara ike ịhụ àgwà ndị na-adịghị mma m na-akpa?’

  • ‘Olee ebe ndị onye a na-eme nke ọma karịa m?’

Ọ bụrụ na ị gwa onwe gị eziokwu ma ị zawa ajụjụ ndị a, ọ ga-eme ka ị hụ àgwà ndị onye ahụ nwere ga-amasị gị, meekwa ka ị kwụsị ịkpọ ya asị.

Akụkọ Mere Eme: Nelson (Amerịka)

“N’oge m ndị obere, ebiri m n’ebe ọtụtụ ndị bi na ya si naanị n’otu agbụrụ. Ma, mgbe m dị afọ iri na itoolu, m kwagara n’otu nnukwu obodo ịrụ ọrụ. N’oge ahụ, mụ na ndị si n’agbụrụ dị iche iche na omenala dị iche iche malitere ibi, na-arụkọkwa ọrụ.

“Ka m na-amatakwu ha, mụ na ha ghọrọ enyi. Achọpụtara m na otú mmadụ si acha, asụsụ ya, na obodo o si agaghị eme ka m mata otú onye ahụ si arụsi ọrụ ike. Ọ gaghịkwa eme ka m mata ma m̀ ga-atụkwasịli ya obi ma ọ bụ mata otú o si ele ihe anya.

“M mechara lụọ onye mụ na ya na-esighị n’otu obodo na n’otu agbụrụ. Obi dịkwa m ụtọ na amatala m banyere ụdị nri ndị dị iche na nke anyị, nakwa ụdị egwú ndị m na-amabughị. Amụtala m na anyị niile nwere àgwà ọma, nweekwa ebe ndị anyị na-anaghị emete. Nke bụ́ eziokwu bụ na abụrụkwuola m ezigbo mmadụ n’ihi na àgwà ọma ndị mụ na ha na-esighị n’otu agbụrụ na-amasị m, mụ ana-emekwa ka ha.”

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya