Kpachara Anya Maka Itu Ọnụ
TAA ọtụtụ na-ele itu ọnụ anya dị ka ihe dị mma. Igosipụta ume, nkà, na ihe mmadụ rụzuru abụrụwo ihe na-ewu ewu. Ụfọdụ kwenyere na itu ọnụ dị mkpa maka ịrụzu ihe. Ndị ọzọ na-eche na ọ na-ebuli ùgwù onwe onye elu. Magazin bụ́ Time sịrị: “Echiche nke ịdị umeala, ọ bụ ezie na ọ nwụbeghị, amalitewo iyi ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ihe mgbe ochie.” Onye na-ede ihe bụ́ Jody Gaylin kwuru, sị: “N’ụzọ dị mwute, itu ọnụ na-adịghị eme ihere . . . bụ ihe na-ewu ewu ugbu a. Isoro enyi ma ọ bụ onye a maara kparịta ụka enweela ihe ọhụrụ na-eso ya: ito onwe onye.”
Ndị a na-eṅomi esetịpụwo ụkpụrụ ya. Ị pụrụ ịnụworị okwu nke onye bụbu dike n’ịkụ ọkpọ: “Ọ bụghị ihe ndabara na abụ m nwoke kachasị ukwuu n’ụwa n’oge a n’akụkọ ihe mere eme.” Okwu nke onye òtù egwú bụ́ Beatles bụkwa nke a ma nke ọma: “A ma anyị ama ugbu a karịa Jisọs Kraịst.” Ebe ụfọdụ na-ele okwu ndị dị otú ahụ anya dị ka ihe e ji ezi obi kwuo, ndị ọzọ hụrụ ndị kwuru ha dị ka ihe nlereanya nke mbuli onwe onye elu, bụ́ ndị kwesịrị ka a gbasoo.
Njupụta nke itu ọnụ na-ewelite ajụjụ bụ́: Ọ̀ bụ ihe dị mma ịnya isi banyere nkà ma ọ bụ ikike mmadụ nwere? N’ezie, ọ bụ ihe kwekọrọ n’okike mmadụ inwe obi ụtọ n’ihe ọ rụzuru na ọbụna isoro ezi ndị enyi na ndị ikwu kerịta ndị a. Ma gịnị banyere ndị na-ebi ndụ kwekọrọ n’okwu ahụ, “Ọ bụrụ na i nwere ya, gosi ya ụwa”? Ọzọkwa, gịnị banyere ndị, ọ bụ ezie na ha adịghị etu ọnụ n’ihu ọha, na-eji aghụghọ emerịrị ka ndị ọzọ mara ume ha nwere na ihe ndị ha rụzuru? Ụdị mkpọsa onwe onye dị otú ahụ ọ̀ dị mma, ọbụna dị mkpa, dị ka ụfọdụ na-azọrọ?
Mmetụta Ọ Na-enwe ná Mmekọrịta
Tụlee mmetụta itu ọnụ ndị ọzọ na-enwe n’ahụ gị. Dị ka ihe atụ, olee otú ị na-esi azaghachi n’okwu ndị a na-esonụ?
“Akwụkwọ ndị m na-edebeghị dị mma karịa akwụkwọ ndị ọzọ deworo.”—Onye na-ede akwụkwọ a ma nke ọma.
“A sị na m nọ ya mgbe a na-eke ihe, m gaara atụworị aro ụfọdụ ga-aba uru maka nhazi ka mma nke eluigwe na ala.”—Eze na-achị n’oge ụwa na-emepebeghị anya.
“A pụghị inwe Chineke ọ bụla n’ihi na, ọ bụrụ na e nwere, agaghị m ekwere na abụghị m Ya.”—Onye ọkà n’ihe ọmụma ụwa nke narị afọ nke 19.
À na-adọta gị nso n’ebe ndị a nọ site n’okwu ha? Ị̀ chere na mkpakọrịta ha ga-amasị gị? O yighị otú ahụ. N’ozuzu ha, itu ọnụ—nke a na-ejighị n’egwu ma ọ bụ nke e ji n’egwu—na-eme ndị ọzọ ka ha nwee mmetụta nke ahụ erughị ala, iwe, ma eleghị anya ekworo. Nke a bụ mmetụta o nwere n’ahụ onye ọbụ abụ ahụ bụ́ Esaf, onye kwupụtara, sị: “Ekwosoro m ndị na-anya isi ekworo.” (Abụ Ọma 73:3) N’ezie, ọ dịghị onye ọ bụla n’ime anyị chọrọ ịbụ ihe kpatara mmetụta ọjọọ n’ebe ndị enyi anyị na ndị anyị na ha na-akpakọrịta nọ! Ndị Kọrint nke Mbụ 13:4 sịrị: “Ịhụnanya . . . adịghị anya isi.” Ịhụnanya Chineke na ichebara mmetụta ndị ọzọ echiche ga-akpali anyị ịghara ịkpọsa nkà na ihe ndị anyị chere na anyị nwere.
Mgbe mmadụ chịkwara onwe ya ma kwuo okwu n’obi umeala, ọ na-eme ndị ọzọ gbara ya gburugburu inwe ahụ iru ala na obi ụtọ banyere onwe ha. Nke a bụ ikike dị oké ọnụ ahịa. Ma eleghị anya onye Britain ọnụ na-eru n’okwu bụ Lord Chesterfield bu nke a n’uche mgbe ọ dụrụ nwa ya nwoke ọdụ, sị: “Mara ihe karịa ndị ọzọ ma o kwe gị mee; ma agwala ha otú ahụ.”
Ndị mmadụ enweghị otú ụdị onyinye ahụ. Ihe gaara mmadụ were were bụ ihe ga-esiri onye ọzọ ike. Ịhụnanya ga-akpali mmadụ iji ọmịiko mesoo ndị a na-enyeghị onyinye n’akụkụ ndị o nwere ike na ha. O yikarịrị ka onye nke ọzọ o nwere onyinye n’akụkụ ndị ọzọ. Pọl onyeozi gwara anyị: “Esitere m n’amara nke e nyere m sị onye ọ bụla nọ n’etiti unu, ka ọ ghara ịtụkwasị uche n’onwe ya karị nke o kwesịrị ịtụkwasị uche; kama ịtụkwasị uche n’inwe uche zuru okè, dị ka Chineke kere ọ̀tụ̀tụ̀ nke okwukwe nye mmadụ nile n’otu n’otu.”—Ndị Rom 12:3.
Itu Ọnụ Na-esite n’Adịghị Ike
Ebe ụfọdụ ndị na-esi n’ebe onye na-etu ọnụ nọ wezụga onwe ha, na-enwe mmetụta ịdị ala karị n’ihu ha, ndị ọzọ na-emeghachi omume n’ụzọ dị iche. Ha na-ekwubi na ndị na-etu ọnụ anọghị ná ntụkwasị obi. Onye na-ede ihe bụ́ Frank Trippett na-akọwa ihe mere onye na-etu ọnụ, n’ụzọ na-ekwekọghị ekwekọ, pụrụ isi weda ùgwù ya ala n’anya ndị ọzọ: “Onye ọ bụla maara n’ime ime obi ya na itu ọnụ na-egosikarị ụfọdụ adịghị ike onwe onye dị imere ebere.” Ebe ọtụtụ na-ahụ n’ụzọ doro anya ihe onye ahụ na-etu ọnụ na-ekpuchi, ọ̀ bụ na ọ bụghị ihe amamihe dị na ya karị isi n’otuto onwe onye efu pụọ?
“Ma Otú ahụ Ka Ọ Dị n’Ezie!”
Otú a ka ụfọdụ na-esi agbalị igosipụta izi ezi nke otuto onwe onye. Ha na-eche na ebe ọ bụ ezie na e nyere ha onyinye n’akụkụ ụfọdụ, ime dị ka à ga-asị na ha adịghị otú ahụ ga-abụ inwe ihu abụọ.
Ma itu ọnụ ha ọ̀ bụ eziokwu? Ịtụ onwe onye n’ihe ọ̀tụ̀tụ̀ yiri ka ọ dabeere n’otú mmadụ si chee ma lee onwe ya anya. Ihe ndị anyị hụtara dị ka ike pụrụ iche n’ime onwe anyị pụrụ ịbụ ihe nkịtị n’ebe ndị ọzọ nọ. Eziokwu ahụ bụ na mmadụ na-enwe mmetụta ịbụ onye a rụgidere igosipụta ikike ya pụrụ ọbụna ịtụ aro na ọ dịghịdị ike otú ahụ—ọ dịghị ike zuru ezu ịnọrọ onwe ya n’emeghị mkpọsa. Bible kwetara na mmadụ nwere ọchịchọ nke nghọgbu onwe onye mgbe ọ dọrọ aka ná ntị, sị: “Onye na-eche na ọ na-eguzo, ya lezie anya ka ọ ghara ịda.”—1 Ndị Kọrint 10:12.
Ọbụna ọ bụru na mmadụ enwee nkà pụrụ iche n’otu akụkụ, nke a ọ̀ ga-eme ka itu ọnụ bụrụ ihe ziri ezi? Ee e, n’ihi na itu ọnụ na-eto mmadụ, ebe onyinye ọ bụla anyị nwere sitere n’aka Chineke bịa. O kwesịrị ịnara otuto ya. N’ihi gịnị ka anyị ji kwesị ịnara ịja mma maka ihe e ji mụọ anyị? (1 Ndị Kọrint 4:7) E wezụga nke ahụ, dị nnọọ ka anyị nwere ike, anyị nwekwara adịghị ike. Ime ihe n’eziokwu ọ̀ chọrọ anyị n’aka ịdọrọ uche gaa n’amaghị eme ma ọ bụ njehie anyị? Ole na ole n’ime ndị na-etu ọnụ yiri ka ha na-eche otú ahụ. Eze Herọd Agrịpa nke Mbụ pụrụ ịbụworị n’ezie onye e nyere onyinye ikwu okwu nke ọma. Ma adịghị umeala n’obi ya dujere n’ọnwụ na-adịghị mma. Ihe ọjọọ ahụ merenụ na-egosipụta ụzọ nghọgbu si jọọ njọ n’anya Chineke, dị ka ọ dịkwa n’anya ọtụtụ mmadụ.—Ọrụ 12:21-23.
A na-amata nkà na ike n’emeghị mkpọsa onwe onye. Mgbe ndị ọzọ ghọtara ma jaa àgwà ma ọ bụ ihe mmadụ rụzuru mma, ọ na-apụta n’ụzọ mara mma n’ahụ onye ahụ na-anata ya. Ilu 27:2 kwuru n’ụzọ amamihe, sị: “Ka onye ala ọzọ too gị, ma ọ bụghị ọnụ gị; ka onye mba ọzọ too gị, ma ekwela ka egbugbere ọnụ gị abụọ too gị.”
À Chọrọ Ya Iji Rụzuo Ihe?
Ụfọdụ na-eche na mkpọsa onwe onye e ji obi ike mee dị mkpa maka ịrụzu ihe n’ọha mmadụ na-asọrịta mpi nke oge a. Ha na-echegbu onwe ha na ọ bụrụ na ha ekwughị okwu ma kpọsaa ike ha, a gaghị ahụta ha ma nwee mmasị n’ebe ha nọ. Ihe nnọchianya nke nchegbu ha bụ okwu nke a sitere na magazin bụ́ Vogue: “N’oge ndị gara aga a na-ezi anyị na ịdị umeala n’obi bụ ihe ọma, ugbu a anyị na-amụta na mmadụ ịtakpuchi ọnụ ya pụrụ ịbụ ọrụsị.”
Nye ndị nwere mmasị inwe ọganihu n’ụzọ ụwa si ele ya anya, nchegbu ahụ pụrụ ịbụ nke ziri ezi. Ma ọnọdụ onye Kraịst dị iche. Ọ maara na Chineke na-elekọta ma na-ahọrọ iji ikike nke ndị dị umeala eme ihe, ọ bụghị nke ndị mpako. Ya mere, onye Kraịst enweghị mkpa nke ịhọrọ ụzọ nke mbuli onwe onye elu. N’eziokwu, onye nwebigara obi ike ókè pụrụ inweta ùgwù na-adịru nwa oge site n’inwe echiche onwe onye siri ike ma ọ bụ ịchịkwa ndị ọzọ. Ma ka oge na-aga a na-agba ya ọtọ ma weda ya ala, ọbụna mee ya ihe ihere. Ọ bụ dị ka Jisọs Kraịst kwuru: “Onye ọ bụla nke ga-eweli onwe ya elu, a ga-eweda ya; onye ọ bụla nke ga-ewedakwa onwe ya, a ga-eweli ya elu.”—Matiu 23:12; Ilu 8:13; Luk 9:48.
Abamuru Dị Iche Iche nke Ịdị Umeala n’Obi
Ralph Waldo Emerson dere, sị: “Onye ọ bụla m zutere ka m elu n’ụzọ ụfọdụ. N’ihi na, m na-amụta ihe site n’aka ya.” Okwu ya kwekọrọ n’agbamume Pọl onyeozi nyere n’okpuru ike Chineke na ndị Kraịst agaghị ‘eme ihe ọ bụla n’ụzọ ịkpa iche iche ma ọ bụ n’ụzọ ịchọ otuto efu, kama n’obi dị umeala na-agụrịta ibe ha ná ndị ka ha onwe ha mma.’ (Ndị Filipaị 2:3) Echiche obi umeala dị otú a na-etinye mmadụ n’ọnọdụ ịmụta ihe site n’aka ndị ọzọ.
Ya mere lezie anya ka ike gị ghara ịbụ adịghị ike gị. Ewepụla uru nke ikike gị na ihe ndị ị rụzuru site n’itu ọnụ. Gbakwụnye ịdị umeala n’obi n’àgwà ọma ndị i nwere. Nke a bụ ihe na-eweli ùgwù mmadụ n’ezie n’anya ndị ọzọ. Ọ na-enyere mmadụ aka inwe mmekọrịta ka mma n’ebe mmadụ ibe ya nọ ma wetakwa nnwapụta nke Jehova Chineke.—Maịka 6:8; 2 Ndị Kọrint 10:18.