Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w91 5/15 p. 16-20
  • Nweenụ Ogologo Ntachi Obi n’Ebe Mmadụ Nile Nọ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Nweenụ Ogologo Ntachi Obi n’Ebe Mmadụ Nile Nọ
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Inwe Ogologo Ntachi Obi n’Ebe Ụmụnna Anyị Nọ
  • N’ime Ezinụlọ
  • N’ebe Ndị Nọ n’Èzí Nọ
  • Okwukwe na Olileanya Na-enye Aka n’Igosipụta Ogologo Ntachi Obi
  • Ekpere, Ịdị Umeala, na Ịhụnanya Ga-enye Aka
  • À Ga-eji Ọṅụ Na-enwe Ogologo Ntachi Obi?
  • ‘Yikwasịnụ Ogologo Ntachi Obi’
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2001
  • Tụlee Ndị Bụ Ihe Nlereanya nke Ogologo Ntachi Obi
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
  • Jehova Bụ Chineke Nke Ogologo Ntachi Obi
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2001
  • Ogologo Ntachi Obi
    Bụkuo Jehova Abụ
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
w91 5/15 p. 16-20

Nweenụ Ogologo Ntachi Obi n’Ebe Mmadụ Nile Nọ

“Anyị na-arịọ unu, ụmụnna anyị, na-adụnụ ndị na-adịghị agazi ije ọdụ, na-agụgụnụ ndị dara mbà n’obi, na-enyerenụ ndị na-adịghị ike aka, nweenụ ogologo ntachi obi n’ebe mmadụ nile nọ.”—1 NDỊ TESALONAỊKA 5:14.

1. N’ebee, ọ̀ bụkwa n’okpuru ọnọdụ ndị dị aṅaa ka Ndịàmà Jehova gosipụtaworo ogologo ntachi obi?

LEE aha ihe nlereanya Ndịàmà Jehova n’oge a gosipụtaworo n’inwe ogologo ntachi obi! Ha atachiwo obi n’oké ihe isi ike na mkpagbu n’ala ndị bụbu nke ndị ọchịchị Nazi na ndị ọchịchị Fascist na ná mba dị iche iche dị ka Malawi ruo n’oge dị ugbu a. Ndị bi n’ezinụlọ kewara ekewa n’ihe banyere okpukpe na-enwekwa ogologo ntachi obi.

2. Isi ihe abụọ dị aṅaa na-enye nkọwa juru afọ maka paradaịs ime mmụọ nke ndị Jehova nọ na ya?

2 N’agbanyeghị mkpagbu na ihe isi ike ndị ha nweworo, ndị Jehova raara onwe ha nye enwewo ngọzi dị iche iche nke paradaịs ime mmụọ. N’ezie, ihe ndị mere eme na-egosi na ndị Kraịst e tere mmanụ malitere inweta ya n’afọ 1919. Gịnị mere e ji nwee paradaịs ime mmụọ nke a? Nke mbụ, ọnọdụ paradaịs ndị a dị n’etiti ndị Jehova n’ihi na Chineke eweghachiwo ndị ohu ya e tere mmanụ gaa ‘n’ala’ ha, ma ọ bụ ọnọdụ, nke ofufe dị ọcha. (Aịsaịa 66:7, 8) Paradaịs ime mmụọ ahụ na-amụbawanyekwa n’ihi na onye ọ bụla nọ na ya na-egosipụta mkpụrụ nke mmụọ Chineke. Ogologo ntachi obi bụ otu n’ime mkpụrụ ndị a. (Ndị Galetia 5:22, 23) Ịdị mkpa nke àgwà nke a dị n’ebe ihe metụtara paradaịs ime mmụọ anyị dị bụ nke a pụrụ ịhụ site n’okwu nke onye ọkà mmụta bụ́ William Barclay kwuru: “A gaghị enwe ihe ọ bụla dị ka mmekọrịta ndị Kraịst ma ọ bụrụ na e nweghị makrothumia [ogologo ntachi obi]. . . . Ihe kpatakwara nke ahụ bụ nnọọ nke a—na makrothumia bụ oké ihe e ji amata Chineke (Rom 2.4; 9.22).” (A New Testament Wordbook, peji 84) Ee, ogologo ntachi obi dị nnọọ mkpa!

Inwe Ogologo Ntachi Obi n’Ebe Ụmụnna Anyị Nọ

3. Ihe mmụta dị aṅaa banyere inwe ogologo ntachi obi ka Jisọs nyere Pita?

3 O doro anya na Pita onyeozi nwere ihe isi ike ụfọdụ n’igosipụta ogologo ntachi obi, n’ihi na ọ dị mgbe ọ jụrụ Jisọs, sị: “Onyenwe anyị, ugbo ole ka nwanna m ga-emehie megide m, ewee m gbaghara ya? Ruo ugbo asaa?” Jisọs nyere ya ndụmọdụ, sị: “Asịghị m gị, Ruo ugbo asaa; kama, Ruo [ugbo iri asaa na asaa].” (Matiu 18:21, 22) N’ikwu ya n’ụzọ ọzọ, e nweghị ókè a kpaara ugbo ole anyị gaje ịnagide ihe mmadụ ibe anyị mere anyị ma gbaghara onye na-emehie megide anyị. E kwuwerị, anyị apụghị iche echiche na mmadụ ọ bụla ga-anọgide na-agụkọ ihe e mere ya ruo 77 ugbo! Ma, ịgbaghara n’ụzọ dị otú ahụ chọrọ mmadụ inwe ogologo ntachi obi.

4. Gịnị mere o ji dị ndị okenye mkpa karịsịa inwe ogologo ntachi obi?

4 Mgbe a bịara n’ihe banyere ụmụnna ime mmụọ igosipụta ogologo ntachi obi, ihe ịrụ ụka ọ bụla adịghị na ndị okenye ọgbakọ kwesịrị ịbụ ihe nlereanya. A pụrụ itinye inwe ndidi ha n’ule n’ihi na ụfọdụ n’ime ndị kwere ekwe ibe ha pụrụ ịbụ ndị na-adịghị elezi anya eme ihe ma ọ bụ ghara inwe mmasị. Ndị ọzọ pụrụ ịdị na-ala azụ mgbe a bịara n’ịkwụsị àgwà ndị dị njọ. Ndị okenye aghaghị ilezi anya ka ha ghara ịbụ ndị a kpasuru iwe ọsọ ọsọ ma ọ bụ mejọọ site n’adịghị ike nile nke ụmụnna ha ndị nwoke na ndị nwanyị bụ́ ndị Kraịst. Kama nke ahụ, ndị ọzụzụ atụrụ ime mmụọ ndị a kwesịrị icheta ndụmọdụ ahụ bụ: “Ma anyị onwe anyị, bụ́ ndị nwere ike, anyị aghaghị ibu adịghị ike nile nke ndị na-enweghị ike, na ịghara ime ihe na-atọ onwe anyị ụtọ.”—Ndị Rom 15:1.

5. Gịnị ka anyị ga-enwe ike ịnagide ma ọ bụrụ na anyị na-enwe ogologo ntachi obi?

5 Ọzọkwa, esemokwu onwe onye pụrụ ibilite n’ihi adịghị ike na njehie nile nke mmadụ. N’ihi adịghị ike nile ma ọ bụ omume nile nke mmadụ, anyị na-akpasu ụmụnna anyị iwe, dị ka a pụrụ isi kwuo ya, ha pụkwara imeso anyị otú ahụ. Ya mere, lee ka ndụmọdụ ahụ si kwesị ekwesị nke bụ: “Na-anagiderịtanụ ibe unu, werekwanụ amara gbaghara onwe unu, a sị na onye ọ bụla nwere ihe ịta onye ọ bụla ụta; ọbụna dị ka Onyenwe anyị [“Jehova,” NW] weere amara gbaghara unu, unu onwe unu meekwa otú a.” (Ndị Kọlọsị 3:13) ‘Ịnagiderịta ibe anyị’ pụtara inwe ogologo ntachi obi, ọ bụ ezie na anyị pụrụ inwe ezi ihe mere anyị ga-eji mee mkpesa megide onye ọzọ. Anyị agaghị emegwara ma ọ bụ taa nwanna anyị ahụhụ, ọbụna ịma ọ́sụ̀ megide ya.—Jemes 5:9.

6. N’ihi gịnị ka inwe ogologo ntachi obi ji bụrụ ihe amamihe dị na ya?

6 Ọ bụkwa n’ihi otu ihe ahụ ka e nwere ndụmọdụ ahụ dị ná Ndị Rom 12:19: “Ndị m hụrụ n’anya, unu abọlara onwe unu ọ́bọ̀, kama chaaranụ iwe ahụ ụzọ: n’ihi na e dewo ya n’akwụkwọ nsọ, sị, Mụ nwe ọ́bọ̀; mụ onwe m ga-enyeghachi, ka Onyenwe anyị [“Jehova,” NW] kwuru.” ‘Ịchara iwe ụzọ’ pụtara eweghị iwe ọsọ ọsọ, ma ọ bụ ogologo ntachi obi. Igosipụta àgwà nke a bụ ime ihe amamihe dị na ya, n’ihi na ọ ga-abara anyị na ndị ọzọ uru. Ọ bụrụ na nsogbu ebilitewo, ahụ na-adị anyị onwe anyị mma karị n’ihi na site n’inwe ogologo ntachi obi, anyị adịghị eme ka ọnọdụ dị njọ karị. Ahụ na-adịkwa onye ahụ anyị na-enwere ogologo ntachi obi mma karị n’ihi na anyị adịghị ata ya ahụhụ ma ọ bụ na-emegwara n’otu ụzọ ma ọ bụ n’ụzọ ọzọ. Ka a sịkwa ihe mere Pọl ji gbaa ndị Kraịst ibe ya ume ka ha ‘na-agụgụ ndị dara mbà n’obi, na-enyere ndị na-adịghị ike aka, na-enwe ogologo ntachi obi n’ebe mmadụ nile nọ’!—1 Ndị Tesalonaịka 5:14.

N’ime Ezinụlọ

7. N’ihi gịnị ka o ji dị mkpa ka ndị lụrụ di na nwunye na-enwe ogologo ntachi obi?

7 Ọ bụwo ihe e kwuru nke ọma na alụmdi na nwunye obi ụtọ bụ njikọ nke mmadụ abụọ na-eme nke ọma n’ịgbaghara ibe ha. Gịnị ka nke ahụ pụtara? Na ndị na-enwe obi ụtọ n’alụmdi na nwunye ha na-enwe ogologo ntachi obi n’imesorịta ibe ha ihe. A na-adọrọkarị mmasị ndị mmadụ gaa n’ebe ibe ha nọ n’ihi ọdịdị ha ndị dịrịtara iche. Ọdịiche ndị a pụrụ ịdị na-akpali akpali, ma ha pụkwara ịkpata esemokwu nke na-etinye ihe ná nrụgide na nchekasị bụ́ ndị maliteworo ime ka ndị Kraịst lụrụ di na nwunye na-enwe “mkpagbu n’anụ ahụ ha.” (1 Ndị Kọrint 7:28) Dị ka ihe atụ, ka e were na onye bụ di adịghị echegbukarị onwe ya banyere ụmụ irighiri ihe ma ọ bụ na ọ dịghị elezicha anya eme ihe ma ọ bụ na-adị nkịrịka n’anya. Nke a pụrụ nnọọ itinye nwunye ya n’ule. Ma ọ bụrụ na aro ndị e ji okwu ndị sitere n’obi ọma tụọrọ ya arụpụtaghị ihe ọ bụla, ọ pụrụ nnọọ ịnagide adịghị ike ya nile site n’inwe ogologo ntachi obi.

8. N’ihi gịnị ka ọ pụrụ iji dị mkpa ka ndị bụ di na-enwe ogologo ntachi obi?

8 N’aka nke ọzọ, onye bụ nwunye pụrụ ịbụ onye ọ na-adị oké mkpa ịhụ na irighiri ihe nile gazichara nke ọma, nweekwa àgwà nke eseso di ya okwu mgbe nile. Nke a pụrụ ichetara anyị akụkụ akwụkwọ nsọ ahụ nke bụ: “Ọ ka mma ibi n’elu uko karịa isoro nwunye nke na-ese okwu biri n’otu ụlọ.” (Ilu 25:24, Today’s English Version) N’ọnọdụ dị otú ahụ, ogologo ntachi obi dị mkpa iji mee ihe kwekọrọ na ndụmọdụ Pọl: “Ndị bụ di, hụnụ nwunye unu n’anya, unu enwekwala obi ilu n’ebe ha nọ.” (Ndị Kọlọsị 3:19) Ọ na-ewekwa ogologo ntachi obi nye ndị bụ di ịṅa ntị na ndụmọdụ Pita onyeozi: “Ndị bụ di, otú ahụ, soonụ nwunye unu bikọọ n’ụzọ ihe ọmụma, na-ekenye ihe bụ nwanyị nsọpụrụ, dị ka onye na-adịghị ike karị, dị ka unu na ha bụkwa ndị na-eketakọ amara nke bụ ndụ; ka e wee ghara igbochi ekpere unu.” (1 Pita 3:7) Adịghị ike nile nke nwunye ya pụrụ mgbe ụfọdụ itinye onye bụ di n’ule, ma ogologo ntachi obi ga-enyere ya aka ịnagide ha.

9. N’ihi gịnị ka ogologo ntachi obi ji dị mkpa n’akụkụ nke ndị mụrụ ụmụ?

9 Ndị mụrụ ụmụ kwesịrị inwe ogologo ntachi obi ma ọ bụrụ na ha ga-enwe ihe ịga nke ọma n’ịzụlite ụmụ ha. Ndị na-eto eto pụrụ ịdị na-emejọ n’otu ihe mgbe mgbe. Ọ pụrụ iyi ka hà na-agba isi akwara ma ọ bụ na ha adịghị amụta ihe ọsọ ọsọ, ha pụkwara itinye ndị mụrụ ha n’ule mgbe mgbe. N’okpuru ọnọdụ ndị dị otú ahụ, ọ dị mkpa ka ndị nne na nna bụ ndị Kraịst ghara iwe iwe ọsọ ọsọ, ghara ịbụ ndị a kpasuru iwe ma ọ bụ mebie udo nke uche ha, kama nọgidenụ na-adị jụụ ọ bụ ezie na unu na-eguzosi ike n’ụkpụrụ nile nke ezi omume. Ndị bụ nna kwesịrị icheta na ọ dịkwa mgbe ha bụ ndị na-eto eto, ma mejọọkwa ihe dị iche iche. Ha kwesịrị itinye ndụmọdụ Pọl n’ọrụ, nke na-asị: “Ndị bụ nna, akpasula ụmụ unu iwe, ka obi ghara ifu ha.”—Ndị Kọlọsị 3:21.

N’ebe Ndị Nọ n’Èzí Nọ

10. Olee otú anyị kwesịrị isi na-eme omume n’ebe e were anyị n’ọrụ, dị ka a na-ahụta site n’ahụmahụ dị aṅaa?

10 N’ihi ezughị okè na ọchịchọ onwe onye nke mmadụ, ọnọdụ ndị na-adịghị enye obi ụtọ nwere ike ibilite n’ebe onye Kraịst na-arụ ọrụ. Ọ bụ ihe amamihe dị na ya ịdị akọ na ịnagide mmejọ nile ka udo wee dị. Ihe na-egosi ụzọ nke a pụrụ isi bụrụ ihe amamihe bụ ahụmahụ nke otu onye Kraịst bụ onye e mesoro omume ikpọasị n’ebe ọ dị ukwuu bụ́ nke otu onye ọrụ ibe ya na-ekwoso ya ekworo kpatara. N’ihi na nwanna ahụ emeghị ka nke a ghọọ ihe iseokwu kama nwee ogologo ntachi obi, mgbe oge ụfọdụ gasịrị ọ maliteere onye ọrụ ahụ nke nyeworo ya nsogbu ọmụmụ Bible.

11. Olee mgbe ọ dị mkpa karịsịa anyị inwe ogologo ntachi obi, n’ihi gịnịkwa?

11 Ọ dị mkpa ka ndị Jehova na-enwe ogologo ntachi obi karịsịa mgbe ha na-agbara ndị na-anọghị n’ọgbakọ ndị Kraịst àmà. Mgbe mgbe, ndị Kraịst na-ezute mmeghachi omume ndị na-adịghị mma. Ọ̀ ga-abụ ihe ziri ezi ma ọ bụ nke amamihe dị na ya ịzaghachi n’otu aka ahụ? Ee e, n’ihi na nke ahụ agaghị abụ igosipụta ogologo ntachi obi. Ihe amamihe dị na ya ime bụ icheta na ịgbaso ilu ahụ amamihe dị na ya: “Ọzịza okwu dị nro na-eme ka ọnụma laghachi azụ: ma okwu mwute na-akpali iwe.”—Ilu 15:1.

Okwukwe na Olileanya Na-enye Aka n’Igosipụta Ogologo Ntachi Obi

12, 13. Àgwà ndị dị aṅaa ga-enyere anyị aka inwe ogologo ntachi obi?

12 Gịnị ga-enyere anyị aka igosipụta ogologo ntachi obi, ịnagide ọnọdụ ndị dị mwute? Otu ihe bụ inwe okwukwe ná nkwa nile nke Chineke. Anyị aghaghị ikwere na Chineke ga-eme ihe o kwuru. Akwụkwọ nsọ na-ekwu, sị: “Ọ dịghị ọnwụnwa ọ bụla nwaworo unu ma ọ bụghị nke mmadụ na-anagide: ma Chineke kwesịrị ntụkwasị obi, onye na-agaghị ekwe ka a nwaa unu karị nke unu pụrụ ịnagide; kama n’oge ọnwụnwa ahụ ọ ga-emekwa ụzọ mgbapụ, ka unu wee nwee ike ịnagide ya.” (1 Ndị Kọrint 10:13) N’ikwu ya n’ụzọ ọzọ, dị ka otu onye nọteworo anya n’eziokwu si kwuo ya: “Ọ bụrụ na Chineke kwere ka o mee, apụrụ m ịnagide ya.” Ee, anyị pụrụ ịnagide ya site n’inwe ogologo ntachi obi.

13 Ihe ọzọ e jikọrọ ya na okwukwe n’ụzọ chiri anya bụ olileanya n’Alaeze Chineke. Mgbe ọ ga-amalite ịchị ụwa, a ga-ewepụ ọnọdụ ọjọọ nile ndị kpatawooro anyị mwute. N’akụkụ nke a, onye ọbụ abụ ahụ bụ Devid kwuru, sị: “Haa aka iwe iwe, hapụkwa ọnụma: emela ka iwe gị dị ọkụ, ọ na-eduba nanị n’ime ihe ọjọọ. N’ihi na a ga-ebipụ ndị na-eme ihe ọjọọ: ma ndị na-ele anya Jehova, ndị ahụ ga-enweta ala.” (Abụ Ọma 37:8, 9) Olileanya ahụ e ji n’aka nke na Chineke ga-ekpochapụ ọnọdụ ndị a nile na-etinye mmadụ n’ọnwụnwa n’oge na-adịghị anya na-enyere anyị aka inwe ogologo ntachi obi.

14. Ahụmahụ dị aṅaa na-egosi ihe mere anyị kwesịrị iji nwee ogologo ntachi obi n’ebe di ma ọ bụ nwunye nke na-ekweghị ekwe nọ?

14 Olee otú anyị kwesịrị isi meghachi omume ma ọ bụrụ na di ma ọ bụ nwunye anyị nke na-ekweghị ekwe akpatara anyị obi mwute? Nọgide na-elegara Chineke anya maka enyemaka, nọgidekwa na-enwe olileanya na onye ahụ nke na-emegide gị ga-aghọ onye na-efe Jehova. Mgbe ụfọdụ nwunye nke otu onye Kraịst jụrụ ịkwadebe ihe oriri ya na ịsara ya uwe ya. Ọ na-eji okwu ndị rere ure eme ihe, ọ gaghị ekwunyere ya okwu ruo ọtụtụ ụbọchị, ọ nwakwara ọbụna ịkọ ya ọgwụ site n’ịta amụsụ. Di ya kwuru, sị, “Ma n’oge ọ bụla echigharịkwuuru m Jehova n’ekpere, atụkwasịrị m Ya obi inyere m aka ịzụlite ezi àgwà nke ogologo ntachi obi iji nwee ike ghara ịdapụ ná nguzo m dị ka onye Kraịst. Enwekwara m olileanya na n’otu ụbọchị àgwà nke obi ya ga-agbanwe.” Mgbe 20 afọ nke mmeso omume dị otú ahụ gasịrị, nwunye ya malitere ịgbanwe, ọ sịkwara: “Lee ka m si wee na-ekele Jehova na o nyeere m aka ịzụlite mkpụrụ nke mmụọ nsọ, bụ́ ogologo ntachi obi, n’ihi na apụrụ m ịhụ ihe ọ rụpụtara ugbu a: Nwunye m amalitewo ije ije n’okporo ụzọ nke ndụ!”

Ekpere, Ịdị Umeala, na Ịhụnanya Ga-enye Aka

15. N’ihi gịnị ka ekpere pụrụ iji nyere anyị aka inwe ogologo ntachi obi?

15 Ekpere bụ oké ihe ọzọ na-enye aka n’igosipụta ogologo ntachi obi. Pọl gbara ume, sị: “Unu echegbula onwe unu n’ihe ọ bụla; kama n’ihe nile ọ bụla site n’ekpere na arịrịọ, ya na ekele, meenụ ka Chineke mara ihe nile unu na-arịọ. Udo nke Chineke, nke kachasị uche nile, ga-echekwa obi unu na echiche uche unu nche n’ime Kraịst Jisọs.” (Ndị Filipaị 4:6, 7) Chetakwa ịṅa ntị n’agbamume ahụ bụ: “Tụkwasị Jehova ihe o nyeworo gị dị ka ibu, ya onwe ya ga-anagidekwa gị: ọ gaghị ekwe ka e wezụga onye ezi omume n’ọnọdụ ya ruo mgbe ebighị ebi.”—Abụ Ọma 55:22.

16. N’inwe ogologo ntachi obi, olee ụzọ ịdị umeala pụrụ isi nyere anyị aka?

16 Ịdị umeala bụkwa oké ihe ọzọ na-enye aka n’ịzụlite mkpụrụ mmụọ nsọ nke bụ ogologo ntachi obi. Onye nganga adịghị enwe ndidi. A na-emejọ ya ọsọ ọsọ, ọ na-ewe iwe ọsọ ọsọ, ọ gaghịkwa anagide mmeso omume ọ bụla na-adịghị mma. Ihe ndị a nile bụ ọnọdụ megidere ogologo ntachi obi. Ma onye dị umeala agaghị eji onwe ya kpọrọ ihe gabiga ókè. Ọ ga-echere ruo mgbe oge Jehova ruru, dị ka Devid mere mgbe Eze Sọl na-achụgharị ya na mgbe onye sitere n’agbụrụ Benjamin bụ Shimaị kparịrị ya. (1 Samuel 24:4-6; 2 Samuel 16:5-13) Otú a, anyị kwesịrị inwe ọchịchọ ije ije ‘n’obi dị umeala na ịdị nwayọọ nile, na ogologo ntachi obi, na-anagiderịta ibe anyị n’ime ịhụnanya.’ (Ndị Efesọs 4:2) Ọzọkwa, anyị kwesịrị ‘iweda onwe anyị n’ihu Jehova.’—Jemes 4:10.

17. N’ihi gịnị ka ịhụnanya ga-eji nyere anyị aka inwe ogologo ntachi obi?

17 Ịhụnanya na-adịghị achọ ọdịmma onwe ya nanị na-enyere anyị aka karịsịa inwe ogologo ntachi obi. N’ezie, “ịhụnanya nwere ogologo ntachi obi,” n’ihi na ọ na-eme ka anyị buru ọdịmma kachasịnụ nke ndị ọzọ n’obi. (1 Ndị Kọrint 13:4) Ịhụnanya na-enyere anyị aka inwe mmasị n’ebe ndị ọzọ nọ, itinye onwe anyị n’ọnọdụ nke ndị ọzọ, dị ka a pụrụ isi kwuo ya. Ọzọkwa, ịhụnanya na-enyere anyị aka inwe ogologo ntachi obi n’ihi na “ọ na-anagide ihe nile, na-ekwere ihe nile, na-ele anya ihe nile, na-enwe ntachi obi n’ihe nile. Ịhụnanya adịghị ada ada mgbe ọ bụla.” (1 Ndị Kọrint 13:7, 8) Ee, dị ka abụ Alaeze nke 108 dị n’akwụkwọ abụ ‘Na-abụnụ abụ, na-ekwekwanu ukwe n’ime obi unu’ si kwuo ya:

“Ịhụnanya na-ahụtakwa ihe ọma.

Ọ na-ewulite ịbụ ụmụnna.

Ọ dị obi ọma n’ahụ ndị mmehie,

Na-ahụta akụkụ ha dị mma.”

À Ga-eji Ọṅụ Na-enwe Ogologo Ntachi Obi?

18. Olee otú o si kwe omume inwe ogologo ntachi ya na ọṅụ?

18 Pọl kpere ekpere ka ndị kwere ekwe ibe ya nọ na Kọlọsị jupụta n’ezi ihe ọmụma nke uche Chineke ka ha wee nwee ike jee ije n’ụzọ dị Jehova mma, mee ihe dị ya ụtọ, ma mịa mkpụrụ n’ezi ọrụ ọ bụla. Ha ga-esi otú a bụrụ ndị ‘e mere ka ha dị ike n’ime ike nile, dị ka ike nke ebube ya si dị, ruo ntachi obi na ogologo ntachi obi nile, ya na ọṅụ.’ (Ndị Kọlọsị 1:9-11) Ma, olee otú mmadụ pụrụ isi nwee “ogologo ntachi obi nile, ya na ọṅụ”? Nke ahụ adịghị emegiderịta onwe ha, n’ihi na inwe ọṅụ nke e hotara n’Akwụkwọ nsọ abụghị nnọọ ihe metụtara obi ịdị mmadụ mma ma ọ bụ ịchị ọchị. Mkpụrụ mmụọ nsọ nke ọṅụ gụnyere inwe mmetụta nke afọ ojuju miri emi n’ihe banyere ime ihe ziri ezi n’anya Chineke. Ọ bụkwa ngosipụta nke inwe olileanya nke ịnata ụgwọ e kwere ná nkwa n’ihi igosipụta ogologo ntachi obi. Nke ahụ mere Jisọs ji kwuo, sị: “Ngọzi [“obi ụtọ,” NW] na-adịrị unu mgbe ọ bụla ha na-ata unu ụta, na-esogbukwa unu, na-ekwukwa ajọ ihe nile dị iche iche megide unu n’okwu ụgha, n’ihi m. Nụrịanụ ọṅụ, ka obi tọọkwa unu ụtọ nke ukwuu: n’ihi na ụgwọ ọrụ unu dị ukwuu n’eluigwe: n’ihi na otú a ka ha sogburu ndị amụma ndị buru unu ụzọ.”—Matiu 5:11, 12.

19. Ihe nlereanya ndị dị aṅaa na-egosi na ọ ga-ekwe omume inwe ogologo ntachi obi ma nwee ọṅụ?

19 Jisọs nwere ọṅụ dị otú ahụ. N’ezie, “n’ihi ọṅụ e debere ya n’ihu, ọ tachiri obi n’elu osisi ịta ahụhụ, na-elelị ihere anya.” (Ndị Hibru 12:2, NW) Ọṅụ ahụ nyeere Jisọs aka inwe ogologo ntachi obi. N’otu aka ahụ, tụlee ihe mere mgbe a pịara ndị ozi ụtarị ma nye ha iwu ka ha “ghara ikwu okwu n’aha Jisọs.” Ha “siri n’ihu nnọkọ ikpe ahụ laa, na-aṅụrị na a gụrụ ha ná ndị kwesịrị ka e mee ha ihe ihere n’ihi aha ahụ. Ma kwa ụbọchị, n’ụlọ ukwu Chineke na n’ụlọ nke aka ha, ha adịghị ahapụ izi ihe na izisa ozi ọma Jisọs, na ọ bụ Kraịst.” (Ọrụ 5:40-42) Lee aha ezi ihe nlereanya nke na-egosi na ndị na-eso ụzọ Kraịst pụrụ ịbụ ndị na-enwe ogologo ntachi obi ya na ọṅụ!

20. Ọ bụrụ na anyị egosipụta ogologo ntachi obi, olee otú nke a pụrụ isi metụta mmekọrịta anyị na ndị ọzọ?

20 N’ezie Okwu Chineke na-enye anyị ndụmọdụ amamihe dị na ya mgbe ọ na-agba anyị ume ka anyị ghara imegwara, ghara iwe iwe ọsọ ọsọ ma na-enwe olileanya maka ihe kasị mma—inwe ogologo ntachi obi! Ikpe ekpere mgbe nile na mkpụrụ nke a nke mmụọ Chineke dị anyị mkpa iji nagide ụmụnna anyị ndị nwoke na ndị nwanyị nọ n’ọgbakọ, ndị nọ n’ezinụlọ anyị, ndị nọ n’ebe anyị na-arụ ọrụ, na ndị mmadụ anyị na-ezute n’ije ozi ndị Kraịst. Gịnịkwa pụrụ inyere anyị aka igosipụta ogologo ntachi obi? Okwukwe, olileanya, ịdị umeala, ọṅụ, na ịhụnanya. N’ezie, site n’àgwà ndị dị otú ahụ, anyị pụrụ inwe ogologo ntachi obi n’ebe mmadụ nile nọ.

Ị̀ Na-echeta?

◻ N’ihi gịnị ka inwe ogologo ntachi obi ji dị anyị mkpa iji nọrọ na paradaịs ime mmụọ anyị?

◻ Gịnị mere o ji dị ndị okenye mkpa karịsịa inwe ogologo ntachi obi?

◻ Gịnị mere o ji kwesị ekwesị ndị bụ di na nwunye ịzụlite ogologo ntachi obi?

◻ Àgwà ndị ọzọ dị aṅaa ga-enyere anyị aka inwe ogologo ntachi obi?

[Foto dị na peeji nke 17]

Ndụmọdụ dị aṅaa sitere n’aka Jisọs nyeere Pita aka inwe ogologo ntachi obi?

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya