Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g21 nke 1 p. 6-7
  • Otú Anyị na Ndị Ọzọ Ga-esi Na-adị n’Udo

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Otú Anyị na Ndị Ọzọ Ga-esi Na-adị n’Udo
  • Teta!—2021
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Na-agbaghara Ndị Ọzọ
  • Dịrị Umeala n’Obi ma Na-asọpụrụ Ndị Ọzọ
  • Elela Mmadụ Anya n’Ihu
  • Dịrị Nwayọọ n’Obi
  • Na-emesapụ Aka, Na-ekelekwa Ndị Meere Gị Ihe
  • Ndị Na-emesapụ Aka Na-enwe Obi Ụtọ
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2018
  • ‘Werenụ Amara Na-agbaghara Onwe Unu’
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
  • Na-agbagharanụ Ibe Unu Kpamkpam
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2012
  • Ihe Isii Ga-enyere Mmadụ Aka Inwe Ezigbo Ihe Ịga nke Ọma
    Teta!—2009
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Teta!—2021
g21 nke 1 p. 6-7
Ebe otu ezinụlọ na-ele ndị mmadụ ọbịa n’ụlọ ha.

Otú Anyị na Ndị Ọzọ Ga-esi Na-adị n’Udo

Chineke gwara anyị otú anyị na ndị ọzọ ga-esi na-adị n’udo, ma ndị ezinụlọ anyị ma ndị anyị na ha na-arụkọ ọrụ ma ndị enyi anyị. Lee ụfọdụ ezigbo ndụmọdụ ndị o nyere baarala ọtụtụ ndị uru.

Na-agbaghara Ndị Ọzọ

‘Na-agbagharanụ ibe unu kpamkpam ma e nwee onye ibe ya mejọrọ.’​—NDỊ KỌLỌSI 3:13.

Anyị niile na-emejọ ihe. Anyị nwere ike imejọ ndị ọzọ, hanwa nwekwara ike imejọ anyịnwa. Ọ pụtara na anyị kwesịrị ịna-agbaghara ndị ọzọ, ndị ọzọ kwesịkwara ịna-agbaghara anyị. Anyị gbaghara onye mejọrọ anyị, anyị ekwesịghị ịnọgide na-eburu ya iwe n’obi. Anyị anaghị ‘eji ihe ọjọọ akwụ onye ọ bụla ụgwọ ihe ọjọọ.’ Anyị anaghịkwa eme, anyị gụrụ gụrụ, anyị echetara onye mejọrọ anyị ihe o mere anyị. (Ndị Rom 12:17) Ma, ọ bụrụkwanụ na ihe mmadụ mere gbawara anyị obi, ya ana-esikwara anyị ike ichefu ya? Anyị kwesịrị iji nkwanye ùgwù gwa onye ahụ banyere ya mgbe naanị anyị na ya nọ. Ebumnuche anyị kwesịrị ịbụ ime udo, ọ bụghị ka anyị gosi na ọ bụ yanwa ka ikpe mara.​—Ndị Rom 12:18.

Dịrị Umeala n’Obi ma Na-asọpụrụ Ndị Ọzọ

“Dịrịnụ umeala n’obi, na-ewerekwanụ na ndị ọzọ ka unu.”​—NDỊ FILIPAỊ 2:3.

Anyị dịrị umeala n’obi ma na-asọpụrụ ndị ọzọ, ọ ga-eme ka ndị mmadụ na-abịa anyị nso. Ha ma na anyị ga na-enwere ha obiọma ma na-echebara ha echiche, nakwa na anyị agaghị akpachara anya mewaa ha obi. Ma, ọ bụrụ na anyị ana-ewere ya na anyị ka ndị ọzọ ma ọ bụ na-achọkarị ka okwu bie n’ọnụ anyị, anyị na ndị ọzọ ga na-ese okwu mgbe niile, ndị mmadụ ga na-agbara anyị ọsọ, ndị enyi anyị ga-adịkwa ole na ole ma ọ bụrụdị na e nwere ndị nke anyị ga-enwe enwe.

Elela Mmadụ Anya n’Ihu

“Chineke anaghị ele mmadụ anya n’ihu. Kama ná mba ọ bụla, ọ na-anabata onye na-atụ egwu ya, nke na-emekwa ihe dị mma.”​—ỌRỤ NDỊOZI 10:​34, 35.

Ihe Chineke na-ele emere ndị mmadụ ihe ọma abụghị obodo ha si, asụsụ ha na-asụ, ọkwá ha, ma ọ bụkwanụ ụcha akpụkpọ ahụ́ ha. ‘O si n’otu mmadụ mee ka mmadụ niile nọ ná mba ọ bụla dịrị.’ (Ọrụ Ndịozi 17:26) Ọ pụtara na mmadụ niile bụ ụmụnne. Ọ bụrụ na anyị na-akwanyere ndị ọzọ ùgwù, jiri obiọma na-emeso ha ihe, ha ga na-enwe obi ụtọ, anyịnwa ga na-enwekwa obi ụtọ karịa. Obi ga-adịkwa Chineke ụtọ.

Dịrị Nwayọọ n’Obi

Yiri ịdị nwayọọ dị ka uwe.​—NDỊ KỌLỌSI 3:12.

Anyị dịrị nwayọọ n’obi, anyị ga-eme ka obi na-eru ndị ọzọ ala. Ụjọ agaghị na-atụ ha ịgwa anyị okwu ma ọ bụ ịgwa anyị ebe anyị mejọrọ n’ihi na ha ma na iwe agaghị ewe anyị. Ọ bụrụkwa na mmadụ ejiri iwe gwa anyị okwu, anyị meda obi zaghachi ya, o nwere ike ime ka obi jụrụ onye ahụ. Ilu 15:1 sịrị: “Mmadụ na-akwụsị iwe iwe ma e wetuo obi zaa ya okwu, ma okwu ọjọọ na-akpasu iwe.”

Na-emesapụ Aka, Na-ekelekwa Ndị Meere Gị Ihe

“A na-aka enwe obi ụtọ n’inye ihe karịa ka a na-enwe n’ịnara ihe.”​—ỌRỤ NDỊOZI 20:35.

Ọtụtụ ndị taa dị anyaukwu, na-echekwa naanị gbasara onwe ha. Ma, ndị na-emesapụ aka na-enwe ezigbo obi ụtọ. (Luk 6:38) Ihe mere ha ji enwe obi ụtọ bụ n’ihi na ha hụrụ ndị mmadụ n’anya karịa akụnụba. Otu ịhụnanya ahụ na-emekwa ka ha jiri obi ha niile kelee onye meere ha ihe ọma ma gosi na obi dị ha ụtọ. (Ndị Kọlọsi 3:15) Jụọ onwe gị, sị: ‘Olee onye m na-enwe mmasị ka mụ na ya nọrọ? Ọ̀ bụ onye na-anaghị enwe obi ụtọ maka ihe e meere ya na onye na-anaghị enyetụ mmadụ ihe ka ọ̀ bụ onye na-enwe obi ụtọ maka ihe e meere ya na onye na-emesapụ aka?’ Gịnị ka ihe a na-akụziri anyị? Bụrụ ụdị onye ị na-achọ ka ndị ọzọ bụrụ.​—Matiu 7:12.

Anaghịzi M Eleda Ndị Ọzọ Anya

“Akwụkwọ Nsọ kwuru, sị: ‘Na-elenụ ndị ọzọ anya otú unu si ele onwe unu . . . Unu amala ihe n’anya onwe unu.’” (Ndị Rom 12:16) “Ihe a Akwụkwọ Nsọ kwuru nyeere m aka ịkwụsị ịna-adị mpako na ịna-eleda ndị ọzọ anya. Anaghịzi m ewere agbụrụ m ka agbụrụ kacha mma. Anaghịkwa m eleda ndị na-ekpe okpukpe ọzọ anya. Ugbu a, ọ na-adịrị ndị ọzọ mfe imete m enyi, m na-ekelekwa ndị mmadụ ugbu a karịa otú m si eme na mbụ.”​—Asha.

Asha.

Mụtakwuo ihe ndị ọzọ:

Ị chọọ ịmatakwu banyere otú gị na ndị ọzọ ga-esi na-adịkwu ná mma, gaa na jw.org/ig n’ebe e dere IHE BAỊBỤL NA-AKỤZI, pịa UDO NA OBI ỤTỌ, pịzie OTÚ ANYỊ SI EMESO NDỊ ỌZỌ.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya