N’ihi Gịnị Ka A Ga-eji Enwe Ekele?
ỊWA ọkpụkpụ azụ manyere Harley ịgbanwe ọrụ ya site n’onye na-eji ígwè ọrụ arụ ọrụ gaa n’akawo ọfịs. Mgbe a jụrụ ya mmetụta o nwere banyere mgbanwe a, Harley sịrị: “Ana m enwe agụụ iji ígwè ọrụ arụ ọrụ. Ma n’ikwu nnọọ eziokwu, aka m nwee obi ụtọ n’ọrụ m na-arụ ugbu a karịa n’ọrụ mbụ m.”
N’ikwu ihe kpatara afọ ojuju ya, Harley na-akọ, sị: “Ọ bụ àgwà ndị mụ na ha na-arụkọ ọrụ. N’adịghị ka ndị nọ n’ebe m na-arụbu ọrụ, onye nlekọta na ndị ọrụ ibe m nke ugbu a na-enwe mmasị n’ihe m na-eme, ha adịghịkwa ala azụ n’ịja mma. Nke a emewo ka e nwee ọdịiche dị nnọọ ukwuu.” N’inwe mmetụta na ya bara uru ma dịkwa mkpa, Harley bụ onye ọrụ na-enwe obi ụtọ ugbu a.
Okwu ịja mma ma ọ bụ ekele, mgbe o kwesịrị ekwesị, na-ekpo obi ọkụ n’ezie. N’aka nke ọzọ, mmetụta nke enweghị obi ekele pụrụ ịjụ ahụ oyi dị ka Shakespeare kwuru: “Kuo, kuo, gị ifufe oge oyi, ị dịghị obi ọjọọ dị ka enweghị obi ekele mmadụ.” N’ụzọ dị mwute, ọtụtụ abụrụwo ndị e gosiri enweghị obiọma dị otú ahụ.
Nọrọ ná Nche Megide Enweghị Ekele
N’ụwa nke taa, ezi nkwupụta nke ekele na-apụ n’anya. Dị ka ihe atụ, otu onye edemede welitere otu ajụjụ: “Ọ bụrụ na nwanyị a na-alụ ọhụrụ nwetara ohere ide adres n’akwụkwọ ịkpọ òkù agbamakwụkwọ 200, n’ihi gịnị ka ọ na-apụghị inweta ohere iji dee kaadị i meela maka onyinye 163?” Mgbe mgbe a dịghị ekwu ọbụna okwu ahụ dị mfe bụ́ “ndewo.” Àgwà mụ onwe m godị na-anọchizi anya inwe ekele. Ọnọdụ a bụ otu n’ime akara e ji amata mgbe ikpeazụ. Pọl onyeozi dọrọ aka ná ntị, sị: “Ị ghaghị ịmara na ná mgbe ikpeazụ, oge ga-abụ nke jupụtara n’ihe ize ndụ. Ndị mmadụ ga-aghọ ndị na-achọ nnọọ ọdịmma onwe ha nanị . . . Ha agaghị enwe nnọọ ekele.”—2 Timoti 3:1, 2, Phillips.
N’ọnọdụ ndị ọzọ, otuto ọnụ efu na-anọchi anya ekele. Okwu ekele na-esite n’obi n’enweghị echiche maka uru onwe onye. Otú ọ dị, otuto ọnụ efu, nke na-abụkarị nke na-esighị n’obi na nke e kwufere ókè, pụrụ ibilite site ná nzube zoro ezo nke ịchọ mbuli elu ma ọ bụ inweta uru onwe onye ụfọdụ. (Jud 16) E wezụga ịghọgbu onye a na-agwa ya, okwu ụtọ dị otú ahụ yiri ka ọ bụ mkpụrụ nke nganga na mpako. Mgbe ahụ, olee onye ga-achọ ka a ghọgbuo ya site n’otuto ọnụ efu na-esighị n’obi? Ma ezi ekele na-enye ume ọhụrụ n’ezie.
Onye na-egosipụta obi ekele na-erite uru site n’ime otú ahụ. Ikpo ọkụ ọ na-enweta n’ihi inwe obi ekele na-atụnye ụtụ n’obi ụtọ na udo ya. (Tụlee Ilu 15:13, 15.) N’ịbụkwa àgwà ziri ezi, obi ekele na-echebe ya pụọ ná mmetụta na-ezighị ezi ndị dị ka iwe, ekworo, na ibu iwe n’obi.
‘Bụrụnụ Ndị Na-ekele Ekele’
Bible na-agba anyị ume ịzụlite mmụọ nke obi ekele ma ọ bụ ikele ekele. Pọl dere, sị: “Na-ekelenụ ekele n’ihe nile ọ bụla: n’ihi na nke a bụ ihe Chineke na-achọ n’ime Kraịst Jisọs n’ebe unu nọ.” (1 Ndị Tesalọnaịka 5:18) Pọl dụkwara ndị Kọlọsi ọdụ, sị: “Ka udo nke Kraịst na-ekpezikwa okwu n’obi unu . . . bụrụkwanụ ndị na-ekele ekele.” (Ndị Kọlọsi 3:15) Ọtụtụ abụ ọma nwere okwu ekele dị iche iche, na-egosipụta na ekele si n’obi bụ àgwà ọma Chineke. (Abụ Ọma 27:4; 75:1) N’ụzọ doro anya, Jehova Chineke na-enwe obi ụtọ mgbe anyị na-egosipụta ekele n’ihe ndị a na-eme kwa ụbọchị ná ndụ.
Ma olee ihe ndị na-eme ka o siere anyị ike ịzụlite mmụọ nke inwe ekele n’ime ụwa a nke na-enweghị ekele? Olee otú anyị pụrụ isi na-egosipụta àgwà nke inwe ekele ná ndụ a na-adị kwa ụbọchị? A ga-atụle ajụjụ ndị a n’isiokwu na-esonụ.