Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w92 7/15 p. 8-13
  • Kraịst Kpọrọ Mmebi Iwu Asị—Ị̀ Kpọrọ Ya?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Kraịst Kpọrọ Mmebi Iwu Asị—Ị̀ Kpọrọ Ya?
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1992
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ụdị Ịkpọasị Atọ
  • Ihe Mere Anyị Ji Kwesị Ịkpọ Mmebi Iwu Asị
  • Ndị Ahụ Na-akpọ Mmebi Iwu Asị
  • Igosi Ịkpọasị Maka Mmebi Iwu
  • Ịkpọ Adịghị Ọcha nke Mmekọahụ Asị
  • Ịkpọ Okpukpe Ụgha na Ndapụ n’Ezi Ofufe Asị
  • Ị̀ Kpọrọ Mmebi Iwu Asị?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2011
  • Otú Mmebi Iwu Si Ju Ebe Niile n’Ụwa—Gịnị Ka Baịbụl Kwuru?
    Isiokwu Ndị Ọzọ
  • Ịmata Onye “Onye Ahụ Na-emebi Iwu” Bụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
  • Nanị Ụzọ A Ga-esi Ewepụ Ịkpọasị
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2000
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1992
w92 7/15 p. 8-13

Kraịst Kpọrọ Mmebi Iwu Asị—Ị̀ Kpọrọ Ya?

“Ị hụrụ ezi omume n’anya, wee kpọọ mmebi iwu asị; n’ihi nke a Chineke, bụ́ Chineke gị, tere gị mmanụ obi ụtọ n’isi karị ndị nketa ibe gị.”—NDỊ HIBRU 1:9.

1. E wezụga ịhụ ezi omume n’anya, gịnị ọzọ ka a chọkwara n’aka ezi ndị ohu nile nke Jehova Chineke?

EZI NDỊ ohu Jehova ji obi ha nile, mkpụrụ obi ha nile, uche ha nile, na ume ha nile hụ ya n’anya. (Mak 12:30) Ha chọrọ ime ka obi Jehova ṅụrịa site n’iguzosi ike n’ezi ihe. (Ilu 27:11) Iji mee nke ahụ, ọ bụghị nanị na ha aghaghị ịhụ ezi omume n’anya, kama ha aghaghị ịkpọ mmebi iwu asị. Onye Nlereanya ha, bụ́ Jisọs Kraịst, mere otú a n’ezie. Banyere ya e kwuru, sị: “Ị hụrụ ezi omume n’anya, wee kpọọ mmebi iwu asị.”—Ndị Hibru 1:9.

2. Gịnị ka a gụnyere ná mmebi iwu?

2 Gịnị bụ mmebi iwu? Ọ bụ mmehie, dị ka Jọn onyeozi gosiri mgbe o dere, sị: “Onye ọ bụla nke na-eme mmehie, ọ na-emekwa ihe na-emebi iwu: mmehie bụkwa mmebi iwu.” (1 Jọn 3:4) “Iwu adịghị egbochi ma ọ bụ chịkwaa” onye mmebi iwu. (Webster’s Ninth New Collegiate Dictionary) Mmebi iwu na-agụnye ihe nile na-adịghị mma, dị njọ, rụrụ arụ, mebiri emebi, na ihe na-abụghị eziokwu. Ile ụwa anya na-egosi anyị na mmebi iwu jupụtara n’ụwa taa otú ọ na-adịbeghị ná mbụ. Ajụjụ adịghị ya na anyị na-ebi ‘n’oge dị oké egwu’ nke Pọl onyeozi buru amụma ya na 2 Timoti 3:1-5. N’ihi mmebi iwu a nile, lee ka o si bụrụ ihe dị mma na e nyere anyị iwu ịkpọ ihe nile dị njọ asị! Dị ka ihe atụ, a gwara anyị, sị: “Unu ndị na-ahụ Jehova n’anya, kpọọnụ ihe ọjọọ asị.” (Abụ Ọma 97:10) N’otu aka ahụ, anyị na-agụ: “Kpọọnụ ihe ọjọọ asị, hụnụ ezi ihe n’anya.”—Emọs 5:15.

Ụdị Ịkpọasị Atọ

3-5. N’ụzọ atọ dị aṅaa ka e jiri okwu ahụ bụ́ “ịkpọasị” mee ihe n’Okwu Chineke?

3 Gịnị ka ịkpọasị pụtara? N’Okwu Chineke, e ji “ịkpọasị” mee ihe n’ụzọ atọ ndị dị iche. E nwere ịkpọasị nke ibu ihe ọjọọ n’obi na-akwalite, nke na-achọ imerụ onye a kpọrọ ya ahụ. Ndị Kraịst aghaghị izere ụdị ịkpọasị nke a. Ọ bụ ụdị nke kpaliri Ken igbu nwanne ya nwoke bụ Ebel onye ezi omume. (1 Jọn 3:12) Nke a bụkwa ụdị ịkpọasị nke ndị ndú okpukpe nwere n’ebe Jisọs Kraịst nọ.—Matiu 26:3, 4.

4 Ọzọkwa, e ji okwu ahụ bụ́ “ịkpọasị” mee ihe n’Akwụkwọ nsọ n’echiche nke inwe ịhụnanya dị ala. Dị ka ihe atụ, Jisọs kwuru, sị: “Ọ bụrụ na onye ọ bụla abịakwute m, ma ọ kpọghị nna nke ya asị, ya na nne nke ya, na nwunye nke ya, na ụmụ nke ya, na ụmụnne ndị ikom nke ya, na ụmụnne ndị inyom nke ya, ee, ndụ nke aka ya kwa, ọ pụghi ịbụ onye na-eso ụzọ m.” (Luk 14:26) N’ụzọ doro anya, ihe Jisọs bu n’uche bụ ịhụ ndị a n’anya n’ụzọ dị ala karịa nke anyị hụrụ ya. Jekọb ‘kpọrọ Lia asị,’ ma n’ezie ọ hụrụ ya n’anya n’ụzọ dị ala karịa ka ọ hụrụ Rechel.—Jenesis 29:30, 31.

5 Ma mgbe ahụ e nwere ihe okwu ahụ bụ “ịkpọasị” pụtara bụ́ nke anyị chọrọ ilebara anya n’ebe a karịsịa. O nwere echiche nke ụdị mmetụta siri ike dị otú ahụ nke enweghị mmasị maka mmadụ ma ọ bụ ihe nke na anyị na-ezere inwe ihe jikọrọ anyị na onye dị otú ahụ ma ọ bụ ihe dị otú ahụ. N’Abụ Ọma 139 e kwuru okwu banyere nke a dị ka “ịkpọasị nke zuru okè.” N’ebe ahụ, Devid kwuru, sị: “Ọ̀ bụghị ndị na-akpọ gị asị, Jehova, ka m na-akpọ asị? Ọ̀ bụghịkwa ndị na-ebili imegide gị ka m na-asọ oyi? Ọ bụ ịkpọasị nke zuru okè ka m ji kpọọ ha asị: ndị iro ka ha bụụrụ m.”—Abụ Ọma 139:21, 22.

Ihe Mere Anyị Ji Kwesị Ịkpọ Mmebi Iwu Asị

6, 7. (a) N’ụzọ bụ isi, n’ihi gịnị ka anyị kwesịrị iji kpọọ mmebi iwu asị? (b) Gịnị bụ ihe nke abụọ dị ike mere a ga-eji kpọọ mmebi iwu asị?

6 N’ihi gịnị ka anyị kwesịrị iji kpọọ mmebi iwu asị? Otu ihe mere ya bụ ka anyị wee nwee ike inwe ùgwù onwe onye na akọ na uche dị ọcha. Ọ bụ nanị n’ụzọ dị otú a ka anyị pụrụ isi soro Nna anyị nke eluigwe nke na-ahụ n’anya, onye bụ onye ezi omume, bụ Jehova, nwee mmekọrịta dị mma. Devid setịpụrụ ezi ihe nlereanya banyere nke a, dị ka a pụrụ ịhụ site n’ịgụ Abụ Ọma 26. Dị ka ihe atụ, o kwuru, sị: “Akpọwo m mkpọkọta ndị na-eme ihe ọjọọ asị, mụ na ndi na-emebi iwu adịghị anọkọkwa.” (Abụ Ọma 26:5) Ịhụnanya anyị maka Chineke na ezi omume kwesịrị ịkpali anyị inwe ekworo nke ezi omume—ee, ịkpọasị—maka ihe nile na-emebi iwu site n’ụzọ o si ele ihe anya, tinyere ajọ omume nile nke ndị ahụ na-enupụrụ Jehova isi ma na-akpọ ya asị. Ọzọkwa, anyị kwesịrị ịkpọ mmebi iwu asị n’ihi nkọcha nke ọ na-ewetara aha Chineke.

7 Ihe ọzọ mere ndị Jehova kwesịrị iji kpọọ mmebi iwu asị bụ n’ihi na ọ dị oké ize ndụ, na-emerụkwa ahụ nke ukwuu. Ịgha mkpụrụ nye anụ ahụ, nke pụtara ịgha mmebi iwu dị ka mkpụrụ, ga-arụpụta gịnị? Pọl dọrọ aka na ntị, sị: “Unu ekwela ka eduhie unu; Chineke abụghị onye a na-elelị: n’ihi na mkpụrụ ọ bụla mmadụ na-agha, nke ahụ ka ọ ga-ewetakwa n’ubi. N’ihi na onye na-agha mkpụrụ nye anụ ahụ onwe ya ga-esite n’anụ ahụ ahụ weta mmebi dị ka ihe ubi; ma onye na-agha mkpụrụ nye mmụọ nsọ ga-esite na mmụọ nsọ weta ndụ ebighị ebi dị ka ihe ubi.” (Ndị Galetia 6:7, 8) Ya mere, anyị ekwesịghị inwe ihe ọ bụla ma ọlị nke anyị na mmebi iwu kwesịrị inwekọ. N’ezie, ọ dị anyị mkpa ịkpọ ihe nile bụ mmebi iwu asị maka ọdịmma nke onwe anyị na udo nke uche.

Ndị Ahụ Na-akpọ Mmebi Iwu Asị

8. Ònye setipụworo ihe nlereanya mbụ nke ịkpọ mmebi iwu asị, dị ka akụkụ akwụkwọ nsọ dị aṅaa gosiri?

8 N’ịkpọ mmebi iwu asị, Chineke setịpụrụ ihe nlereanya mbụ maka ihe e kere eke ndị nwere ọgụgụ isi. Ọ na-ekwo ekworo ezi omume n’ihe banyere mmebi iwu, Okwu ya na-ekwukwa sị: “Ihe isii dị nke Jehova kpọrọ asị; ee, ihe asaa dị nke bụ ihe arụ nke mkpụrụ obi ya: anya dị elu, na ire okwu ụgha, na aka na-awụsị ọbara na-emeghị ihe ọjọọ; na obi nke na-echepụta echiche ajọ ihe, na ụkwụ na-eme ngwa ịgbaga n’ihe ọjọọ; na onye àmà okwu ụgha nke na-ekupụ okwu ụgha dị ka ume, na onye na-ezisa iseokwu n’etiti ụmụnne.” Anyị na-agụkwa, sị: “Egwu Jehova bụ ịkpọ ihe ọjọọ asị: npako, na nganga, na ụzọ ọjọọ, na ọnụ na-ekwu okwu ịgbakwute Chineke azụ, ka m kpọworo asị.” (Ilu 6:16-19; 8:13) Ọzọkwa, a gwara anyị sị: “Mụ onwe m, Jehova, na-ahụ ikpe ziri ezi n’anya, ana m akpọ nnapụ n’ihe ike na ajọ omume asị.”—Aịsaịa 61:8.

9, 10. Olee otú Jisọs si gosi na ọ kpọrọ mmebi iwu asị?

9 Jisọs Kraịst ṅomiri Nna ya n’ịkpọ mmebi iwu asị. Otú a, anyị na-agụ, sị: “Ị hụrụ ezi omume n’anya, wee kpọọ mmebi iwu asị; n’ihi nke a Chineke, bụ Chineke gị, tere gị mmanụ obi ụtọ n’isi karị ndị nketa ibe gị.” (Ndị Hibru 1:9) Jisọs setịpụụrụ anyị ihe nlereanya n’ụdị ịkpọasị nke a. O gosiri ịkpọasị ọ kpọrọ mmebi iwu site n’ikpughe ndị ahụ kpachapụrụ anya na-eme ya—ndị ndú okpukpe ụgha. Ọtụtụ mgbe, ọ katọrọ ha dị ka ndị ihu abụọ. (Matiu, isi 23) N’otu oge ọzọ, Jisọs gwara ha sị: “Unu onwe unu sitere na nna unu, bụ́ ekwensu, ọ bụkwa ihe na-agụ nna unu ka unu na-achọ ime.” (Jọn 8:44) Jisọs gosiri ịkpọasị ya maka mmebi iwu ọbụna ruo n’ókè nke iji ike ọkpụkpụ aka mee ihe, n’ugbo abụọ o mere ka ụlọ nsọ ahụ dị ọcha pụọ ná ndị okpukpe ihu abụọ ahụ nwere anya ukwu.—Matiu 21:12, 13; John 2:13-17.

10 Jisọs gosikwara ịkpọasị ya maka mmebi iwu na mmehie site n’inwere onwe ya kpam kpam pụọ n’ebe ha nọ. N’ihi ya, ọ pụrụ nnọọ ịjụ ndị na-emegide ya, sị: “Ònye n’ime unu tụrụ m mmehie n’anya?” (Jọn 8:46) Jisọs bụ “onye dị ọcha n’obi, onye na-enweghị obi ọjọọ, onye a na-emerụghị emerụ, onye e kewapụworo n’etiti ndị mmehie.” (Ndị Hibru 7:26) N’imesi nke a ike, Pita dere na Jisọs ‘adịghị mmehie ọ bụla o mere, a hụghịkwa aghụghọ n’ọnụ ya.’—1 Pita 2:22.

11. Ihe atụ Akwụkwọ nsọ ndị dị aṅaa ka anyị nwere nke ụmụ mmadụ ndị na-ezughị okè bụ́ ndị kpọrọ mmebi iwu asị?

11 Otú ọ dị, Jisọs bụ nwoke zuru okè. Ànyị nwere ihe atụ ndị dị n’Akwụkwọ nsọ nke ụmụ mmadụ na-ezughị okè ndị kpọrọ mmebi iwu asị n’ezie? N’ezie anyị nwere! Dị ka ihe atụ, Mosis na ndị Livaị ibe ya gosiri ịkpọasị dị ukwuu maka ikpere arụsị site n’igbu ihe dị ka 3,000 ndị kpeere arụsị, dị ka iwu Jehova nyere sị dị. (Ọpụpụ 32:27, 28) Fineas gosiri ịkpọasị dị ukwuu maka mmebi iwu mgbe o jiri ube gbuo mmadụ abụọ ahụ kwara iko.—Ọnụ Ọgụgụ 25:7, 8.

Igosi Ịkpọasị Maka Mmebi Iwu

12. (a) Olee otú anyị pụrụ isi gosi asị anyị kpọrọ mmebi iwu? (b) Olee ụzọ ụfọdụ na-arụ ọrụ anyị pụrụ isi zere echiche dị iche iche nke mmebi iwu?

12 N’ịbịarute n’oge nke anyị, olee otú anyị pụrụ isi gosi ịkpọasị anyị kpọrọ mmebi iwu? Site n’ịchịkwa echiche, okwu, na omume anyị. Ọ dị anyị mkpa iwulite àgwà nke ịdị na-eche banyere ihe ndị na-ewuli elu mgbe ọrụ anyị ji n’aka na-ejupụtaghị n’uche anyị. Ọ bụrụ na o mee na anyị dinara n’abalị ma ụra adịghị anyị n’anya, a pụrụ inwe ọchịchọ nke iche echiche ụfọdụ na-ezighị ezi, dị ka ịnọgide na-eche echiche mmejọ e mejọworo mmadụ ma ọ bụ ịdị na-eche echiche efu banyere mmekọahụ. Enyela ihe ndị dị otú a ohere mgbe ọ bụla, ma nweta àgwà nke ịdị na-eche echiche ndị bara uru. Dị ka ihe atụ, gbalịa ibu akụkụ akwụkwọ nsọ dị iche iche n’isi, obi ụtọ itolu ahụ, na mkpụrụ itolu ahụ nke mmụọ nsọ. (Matiu 5:3-12; Ndị Galetia 5:22, 23) Ị̀ pụrụ ịkpọ aha ndị ozi 12 ahụ? Ị̀ maara Iwu Iri ahụ? Olee ọgbakọ asaa ahụ e degaara akwụkwọ ná Mkpughe? Ibu abụ Alaeze n’isi na-enyekwa aka ime ka uche anyị dịrị n’ihe ndị bụ eziokwu, ihe kwesịrị nsọpụrụ, ihe ziri ezi, ihe dị ọcha, ihe kwesịrị ịhụnanya, ihe e kwuru nke ọma, ihe dị mma, na ihe kwesịrị otuto.—Ndị Filipaị 4:8.

13. Ịkpọ mmebi iwu asị ga-akpatara anyị ịkpọ ụdị okwu dị aṅaa asị?

13 Ọzọkwa, anyị na-egosi na anyị kpọrọ mmebi iwu asị site n’izere okwu nile na-adịghị ọcha. Ọtụtụ ndị ụwa na-enwe obi ụtọ n’ikwu na n’ịṅa ntị okwu egwuregwu ndị ruru unyi, ma ndị Kraịst aghaghị ịhapụ inwe ọbụna ọchịchọ nke ịṅa ha ntị. Kama nke ahụ, anyị kwesịrị ịpụ ma zere itinye ọnụ ná mkparịta ụka ọ bụla na-eduga n’ọnọdụ dị otú ahụ e wedara n’ala. Ọ bụrụ na anyị e nweghị ike ịpụ, ma ọ dịghị ihe ọzọ anyị pụrụ igosi site n’otu ihu anyị dị na anyị kpọrọ ụdị okwu dị otú ahụ asị. Ọ dị anyị mkpa ige ntị na ndụmọdụ ọma nke a: “Ka okwu ọ bụla nke na-ere ure ghara isi n’ọnụ unu pụta, kama ihe bụ ezi ihe, iwuli mmadụ elu dị ka ụlọ, dị ka mkpa sị dị, ka o wee nye ndị na-anụ ya amara.” (Ndị Efesọs 4:29) Anyị ekwesịghị imerụ onwe anyị site n’ikwu ihe na-adịghị ọcha ma ọ bụ site n’ịṅa ya ntị.

14. Nchebe dị aṅaa ka ịkpọ mmebi iwu asị ga-enye n’ihe banyere azụmahịa na ịrụ ọrụ?

14 Asị anyị kpọrọ mmebi iwu aghaghịkwa ịbụ nke e mere ka o megide omume mmehie nile. Ịkpọ mmebi iwu asị ga-enyere anyị aka izere ọnyà nke ịghọ aghụghọ n’ihe banyere nke a. Ezi ndị Kraịst adịghị anọgide n’ime mmehie. (Tụlee 1 Jọn 5:18.) Dị ka ihe atụ, anyị aghaghị izere omume azụmahịa aghụghọ nile. Taa, a rụgidewo ọtụtụ Ndịàmà Jehova ime ihe ndị bụ emeghị ihe n’eziokwu maka ndị were ha n’ọrụ, ma ha ajụwo ime otú a. Ndị Kraịst adịwo ọbụna njikere ịtụfu ọrụ ha kama ime ihe nke na-emebi akọ na uche ha e ji Bible zụọ. Ọzọkwa, anyị kwesịkwara igosi asị anyị kpọrọ mmebi iwu site n’ịghara imebi iwu okporo ụzọ na site n’ịghara ịghọ aghụghọ mgbe ọ bụ iwu na anyị aghaghị ịtụ ụtụ isi ma ọ bụ ụtụ ndị e ji ebubata ihe n’obodo.—Ọrụ 23:1; Ndị Hibru 13:18.

Ịkpọ Adịghị Ọcha nke Mmekọahụ Asị

15. Ikenye ụmụ mmadụ ọchịchọ ebumpụta ụwa siri ike maka inwe mmekọahụ na-emezu nzube ọma dị aṅaa?

15 Dị ka ndị Kraịst, anyị kwesịrị ịkpọ adịghị ọcha nile asị karịsịa, bụ́ ndị metụtara ihe banyere mmekọahụ. Site n’ike ihe a kpọrọ mmadụ inwe echiche ebumpụta ụwa siri ike nke inwe mmekọahụ, Chineke mezuru nzube abụọ dị mma. O mere ka ọ bụrụ ihe e ji n’aka na agbụrụ nke mmadụ agaghị anwụchapụ, o jikwa ịhụnanya kasị ukwuu nye ihe ga-eme ka e nwee obi ụtọ. Ọbụna ndị dara ogbenye, ndị na-amaghị akwụkwọ, ma ọ bụ ndị ọnọdụ ha na-adịghị mma n’otu ụzọ ma ọ bụ n’ụzọ ọzọ, pụrụ inweta obi ụtọ dị ukwuu ná mmekọrịta nke alụmdi na nwunye. Otú ọ dị, Jehova akpawo ókè ebe obi ụtọ nke mmekọrịta ahụ ga-ejedebe. Aghaghị ịkwanyere ihe ịkpa ókè ndị a nke Chineke kwupụtara ùgwù.—Jenesis 2:24; Ndị Hibru 13:4.

16. Gịnị kwesịrị ịbụ àgwà anyị n’ebe ntụrụndụ na omume metụtara mmekọahụ na-adịghị ọcha dị?

16 Ọ bụrụ na anyị kpọrọ mmebi iwu asị, anyị ga-eji ịdị uchu zere omume nile na-adịghị ọcha nke mmekọahụ na ihe ntụrụndụ rụrụ arụ. N’ihi ya, anyị ga-ezere akwụkwọ di iche iche, magazin dị iche iche, na akwụkwọ akụkọ dị iche iche rụrụ arụ n’ụzọ omume. N’otu aka ahụ, ọ bụrụ na anyị kpọrọ mmebi iwu asị, anyị agaghị ekiri ihe ngosipụta na-adịghị ọcha a na-ahụ anya, ma ọ bụ na telivishọn, na sinima, ma ọ bụ n’ebe a na-eme ihe nkiri. Ọ bụrụ na anyị ahụ otu ihe omume dị ka nke rụrụ arụ, e kwesịrị ịkpali anyị ịgbanyụ telivishọn ahụ ozugbo ma ọ bụ anyị kwesịrị inwe obi ike nke ịhapụ ebe ihe nkiri ahụ. N’otu aka ahụ, ịkpọ mmebi iwu asị ga-eme ka anyị zere egwu nile nke na-akpali agụụ mmekọahụ site n’ihe ọ na-agụ ma ọ bụ otú o si ada ụda. Anyị agaghị achọ ihe ọmụma nke ihe ndị rụrụ arụ kama anyị ga-abụ ‘ụmụ ọhụrụ n’ihe ọjọọ, ma bụrụ ndị tozuru okè n’uche.’—1 Ndị Kọrint 14:20.

17. Ndụmọdụ dị aṅaa ka Ndị Kọlọsi 3:5 na-enye, nke pụrụ inyere anyị aka ịnọgịde na-adị ọcha n’omume?

17 N’ụzọ kasị kwesị ekwesị, a dụrụ anyị ọdụ, sị: “Meenụ ka ihe nile dị unu n’ahụ nke dị n’elu ụwa nwụọ; ịkwa iko, adịghị ọcha, ọchịchọ ọjọọ [“agụụ mmekọahụ,” NW].” (Ndị Kọlọsi 3:5) Ajụjụ adịghị ya na ime ihe siri ike n’akụkụ anyị dị mkpa ma ọ bụrụ na anyị gaje inwe mkpebi nke ịnọgide n’ịdị ọcha nke omume. Banyere ngwaa okwu Grik ahụ e dere “nwụọ” ná Ndị Kọlọsi 3:5, akwụkwọ bụ́ The Expositor’s Bible Commentary na-ekwu, sị: “Ọ na-egosi na ọ bụghị nanị na anyị ga-abịada ma ọ bụ chịkwaa omume na àgwà ọjọọ. Anyị ga-ehichapụ ha, kpochapụ ụzọ ịdị ndụ ochie ahụ kpam kpam. ‘Gbuchapụ’ pụrụ iwepụta ịdị ike ya. . . . Ma ihe ngwaa okwu ahụ pụtara ma ikike nke ọnọdụ okwu ahụ na-atụ aro mkpebi onwe onye nke siri ike, na nke na-egbu mgbu.” N’ihi ya, anyị kwesịrị izere ihe osise ma ọ bụ ihe odide na-akpali agụụ mmekọahụ dị ka à ga-asị na ọ bụ ọrịa dị ize ndụ, na-efe efe, na-akpata ọnwụ, n’ihi na nke ahụ bụ ihe ọ bụ n’ụzọ omume na ime mmụọ. Kraịst gosipụtara otu ụdị echiche ahụ mgbe ọ sịrị ka e gbupụ aka, ụkwụ, ma ọ bụ ọbụna ghụpụ anya ma ọ bụrụ na ọ na-akpatara mmadụ ịsụ ngọngọ.—Mak 9:43-48.

Ịkpọ Okpukpe Ụgha na Ndapụ n’Ezi Ofufe Asị

18. Olee otú anyị pụrụ isi gosi ịkpọasị anyị maka mmebi iwu nke okpukpe?

18 Mgbe ahụkwa, dị ka Jisọs gosiri ịkpọasị maka mmebi iwu site n’ikpughe ndị okpukpe ihu abụọ, otú ahụ Ndịàmà Jehova taa na-egosi ịkpọasị ha maka ndị okpukpe ụgha nke mmebi iwu. N’ụzọ dị aṅaa? Site n’ikesa akwụkwọ e ji amụ Bible nke na-agba Babilọn Ukwu ahụ ọtọ igosi ihe ọ bụ n’ezie, nwanyị okpukpe nke na-akwa iko. Ọ bụrụ na anyị kpọrọ okpukpe ihu abụọ na-emebi iwu asị n’ezie, anyị ga-eji nkwuwa okwu kpughee Babilọn Ukwu ahụ, bụ́ alaeze ụwa nke okpukpe ụgha. Anyị ga-eme otú ahụ n’ihi ndị mmadụ obi ha ziri ezi, bụ́ ndị o meworo ka ha kpuo ìsì ma jide n’agbụ́ n’ụzọ ime mmụọ. Ruo n’ókè anyị kpọrọ mmebi iwu nke Babilọn Ukwu ahụ asị n’ezie, ọ bụ ruo n’ókè ahụ ka anyị ga-eji ịnụ ọkụ n’obi na-ekere òkè n’akụkụ dị iche iche nke ije ozi Alaeze ahụ.—Matiu 15:1, 3, 7-9; Taịtọs 2:13, 14; Mkpughe 18:1-5.

19. Olee otú anyị kwesịrị isi lee ndị dapụrụ n’ezi ofufe anya, ọ̀ bụkwa n’ihi gịnị?

19 Ibu ọrụ nke ịkpọ mmebi iwu asị na-emetụtakwa ọrụ nile nke ndị dapụrụ n’ezi ofufe. Omume anyị n’ebe ndị dapụrụ n’ezi ofufe nọ kwesịrị ịbụ nke Devid, onye kwupụtara, sị: “Ọ̀ bụghị ndị na-akpọ gị asị, Jehova, ka m na-akpọ asị? Ọ̀ bụghịkwa ndị na-ebili imegide gị ka m na-asọ oyi? Ọ bụ ịkpọasị nke zuru okè ka m ji kpọọ ha asị: ndị iro ka ha bụụrụ m.” (Abụ Ọma 139:21, 22) Ndị si n’ezi ofufe dapụ n’oge a agbasowo ụzọ nke “onye ahụ na-emebi iwu,” bụ́ ndị ụkọchukwu nke Krisendọm. (2 Ndị Tesalọnaịka 2:3) Dị ka Ndịàmà Jehova na-eguzosi ike n’ihe, n’ihi ya anyị enweghị ma ọlị ihe ọ bụla anyị na ha nwekọrọ. N’ịbụ ndị na-ezughị okè, ọ pụrụ ịdị mfe obi anyị inwe ọchịchọ nke ịdị na-akatọ ụmụnna anyị. Dị ka ndị mmadụ n’otu n’otu, ndị nke “ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche” bụ ụmụ mmadụ n’ezughị okè. (Matiu 24:45-47) Ma òtù nke a kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nweekwa uche. Ndị si n’ezi ofufe dapụ na-ekwusi okwu ike banyere mmehie ihe ma ọ bụ ihe ndị yiri emezighị ihe emezi nke ụmụnna ndị ahụ na-edu ndú. Anyị ịnọ n’enweghị ihe ize ndụ na-adabere n’izere okwu aghụghọ nke ndị dapụrụ n’ezi ofufe dị ka à ga-asị na ọ bụ nsí, bụ́ nke ọ bụ n’ezie.—Ndị Rom 16:17, 18.

20, 21. Olee otú a pụrụ isi chịkọta ihe ndị mere a ga-eji kpọọ mmebi iwu asị?

20 Anyị ahụwo na ụwa jupụtara ná mmebi iwu, nke ya na mmehie bụ otu ihe ahụ. O zughị ezu anyị ịhụ ezi omume n’anya; anyị aghaghịkwa ịkpọ mmebi iwu asị. Ụfọdụ n’ime ndị ahụ a chụpụworo site n’ọgbakọ ndị Kraịst pụrụ icheworị na ha hụrụ ezi omume n’anya, ma ha akpọghị mmebi iwu asị n’ụzọ zuru ezu. Anyị ahụwokwa ihe mere anyị kwesịrị iji kpọọ mmebi iwu asị. Anyị apụghị inwe ezi akọ na uche na ùgwù onwe onye ma ọ́ bụghị ma ànyị mere otú a. Ọzọkwa, mmebi iwu pụtara eguzosighị ike n’ihe n’ebe Jehova Chineke nọ. Mmebi iwu na-akpatakwara anyị ịghọta mkpụrụ ndị dị ilu nke ukwuu—enweghị obi ụtọ, mmebi, na ọnwụ.

21 Anyị arịbawokwa ama ụzọ anyị si egosi na anyị kpọrọ mmebi iwu asị. Anyị na-eme otú ahụ site n’ịghara inwe ma ọlị ihe jikọrọ anyị na ụdị ọ bụla nke emeghị ihe n’eziokwu, omume rụrụ arụ nke mmekọahụ, ma ọ bụ ndapụ n’ezi ofufe. Ebe anyị chọrọ ikere òkè n’iwepụ Jehova n’ụta, nweekwa ọchịchọ nke ime ka obi ya ṅụrịa, anyị aghaghị, ọ bụghị nanị ịhụ ezi omume n’anya na ijide ọrụ n’aka n’ozi ya, kamakwa ịkpọ mmebi iwu asị, dị ka Onye Ndú anyị na Onye Na-enye anyị iwu, bụ́ Jisọs Kraịst mere.

Olee Otú I Ga-esi Zaa?

◻ Olee otú Akwụkwọ nsọ si eji okwu ahụ bụ́ “ịkpọasị” eme ihe?

◻ Olee ezi ihe ụfọdụ ndị mere anyị ga-eji kpọọ mmebi iwu asị?

◻ Olee ihe atụ ọma ndị anyị nwere nke ndị ahụ kpọrọ mmebi iwu asị?

◻ Olee otú anyị pụrụ isi gosi ịkpọasị anyị maka mmebi iwu?

[Foto dị na peeji nke 9]

Jisọs mere ka ụlọ nsọ ahụ dị ọcha n’ihi na ọ kpọrọ mmebi iwu asị

[Foto dị na peeji nke 10]

Ọ bụrụ na anyị kpọrọ mmebi iwu asị, anyị ga-ezere ntụrụndụ nke omume mmekọahụ rụrụ arụ

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya