Dịrị Njikere Maka Ụbọchị Jehova!
Isi Ihe Ndị Sitere Ná Ndị Tesalọnaịka nke Mbụ
ỤBỌCHỊ Jehova! Ndị Kraịst nọ na Tesalọnaịka oge ochie chere na ọ dị oké nso. Ihe ha chere ò ziri ezi? Olee mgbe ọ ga-eji bịa? Nke ahụ bụ otu ihe dị oké mkpa nke e lebara anya na ya n’ime akwụkwọ ozi mbụ Pọl onyeozi degaara ndị Tesalọnaịka, bụ́ nke e zijere site na Kọrint n’ihe dị ka afọ 50 nke Oge Anyị.
Pọl na Saịlas guzobere ọgbakọ ahụ dị na Tesalọnaịka, bụ́ ọnọdụ ọchịchị nke ógbè ndị Rom nke Masedonia. (Ọrụ 17:1-4) Mgbe oge ụfọdụ gasịrị, n’akwụkwọ ozi mbụ o degaara ndị Tesalọnaịka, Pọl gwara ha okwu ịja mma, nye ha ndụmọdụ, tụleekwa ihe banyere ụbọchị Jehova. Anyị onwe anyị pụkwara irite uru site n’akwụkwọ ozi nke a, karịsịa ebe ụbọchị Jehova dị oké nso ugbu a.
Jaa Mma, Nyekwa Agbamume
Pọl bu ụzọ jaa ndị Tesalọnaịka mma. (1:1-10) Ha kwesịrị ịnata ịja mma n’ihi ọrụ ha ji ikwesị ntụkwasị obi na-arụ nakwa n’ihi ntachi obi ha. Ọ bụkwa ihe kwesịrị ịja mma na ha “weere ọṅụ nke mmụọ nsọ nara okwu ahụ nke ọma n’ime ọtụtụ mkpagbu.” Ị̀ na-aja ndị ọzọ mma, dị ka Pọl mere?
Onyeozi ahụ esetịpụwo ezi ihe nlereanya. (2:1-12) N’agbanyeghị ihe ihere e mere ya na Filipaị, o ‘ji nkwuwa okwu n’ime Chineke wee kwusaa ozi ọma ahụ’ gwa ndị Tesalọnaịka. Ọ jụwo ịnara ịja mma efu, anyaukwu, na ịchọ otuto. Pọl abụghị ibu arọ nye ha kama o mesoro ha n’ụzọ ịdị nwayọọ, dị ka nwanyị nke na-azụ nwa ya si emeso ya. Lee ezi ihe nlereanya nke a bụ nye ndị okenye ọgbakọ taa!
Okwu Pọl gara n’ihu ikwu gbara ndị Tesalọnaịka ume ka ha guzosie ike mgbe a na-akpagbu ha. (2:13–3:13) Ha anagidewo mkpagbu sitere n’aka ndị mba nke aka ha, Timoti ewetawokwara Pọl akụkọ ọma banyere ọnọdụ ime mmụọ ha. Onyeozi ahụ kpere ekpere ka ha jupụta n’ịhụnanya, ka e meekwa ka obi ha guzosie ike. N’otu aka ahụ, Ndịàmà Jehova n’oge a na-ekpe ekpere n’ihi ndị kwere ekwe ibe ha a na-akpagbu, na-agba ha ume ma ọ bụrụ na o kwere omume, na-aṅụrịkwa ọṅụ n’akụkọ banyere ikwesị ntụkwasị obi ha.
Nọgide Na-amụ Anya n’Ime Mmụọ!
Ọzọ, ndị Tesalọnaịka ahụ natara okwu ndụmọdụ. (4:1-18) Ha ga-aga n’ihu n’ije ije n’ụzọ na-atọ Chineke ụtọ, na-egosipụtakwu ịhụnanya ụmụnna, jirikwa aka ha na-arụ ọrụ iji nweta ihe ndị dị ha mkpa. Karịsịa, ha ga-akasirịta ibe ha obi, na-eji olileanya ahụ nke bụ na n’ọnụnọ Jisọs, ndị kwere ekwe e ji mmụọ nsọ mụta, bụ́ ndị nwụworo anwụ ka a ga-ebu ụzọ kpọlite, jikọtakwa ha na ya. Mgbe nke a gasịrị, ndị fọdụrụnụ n’etiti ndị e tere mmanụ, mgbe ha nwụrụ, bilitekwa n’ọnwụ, ga-esonyere Kraịst na ndị ahụ e buwororịị ụzọ kpọlite n’ọnwụ gaa ná ndụ eluigwe.
Pọl gara n’ihu ịtụle ụbọchị Jehova, nyekwuokwa okwu ndụmọdụ. (5:1-28) Ụbọchị Jehova na-abịa dị ka onye ohi, na-eme ka mbibi mberede bụrụ ihe e ji n’aka mgbe e tisịrị mkpu ahụ bụ: “Udo na ntụkwasị obi.” Ya mere, ndị Tesalọnaịka ahụ aghaghị ịnọgide na-amụ anya n’ime mmụọ, na-abụrụ ndị e chebere site n’ihe agha igbochi obi nke bụ okwukwe, na ịhụnanya, na-enwekwa olileanya nke nzọpụta dị ka okpu agha. Ha kwesịrị iji nsọpụrụ dị omimi na-ele ndị nlekọta nọ n’ọgbakọ anya, na-ezerekwa omume ọjọọ, dịkwa ka anyị na-aghaghị ime.
Akwụkwọ ozi mbụ ahụ Pọl degaara ndị Tesalọnaịka kwesịrị ịkpali anyị ịja ndị kwere ekwe ibe anyị mma na ịgba ha ume. O kwesịkwara ịkpali anyị ịbụ ezi ihe nlereanya n’akparamagwa na n’omume. N’ezie, okwu ndụmọdụ dị na ya pụkwara inyere anyị aka ịdị njikere maka ụbọchị Jehova.
Igbe/Foto dị na peeji nke 22]
Ihe Agha Igbochi Obi na Okpu Agha: N’ịgba ume maka ịmụrụ anya n’ime mmụọ, Pọl dere, sị: “Ka anyị nwee anya udo, yikwasịsịa ihe agha igbochi obi, bụ́ okwukwe na ịhụnanya; ya na okpu agha, bụ́ ile anya nzọpụta.” (1 Ndị Tesalọnaịka 5:8) Ihe agha igbochi obi bụ ihe e wusiri ike nke onye agha na-eji egbochi obi ya, bụ́ nke na-enwe mpempe ígwè, ụdọ ígwè dị iche iche, ma ọ bụ ibe ígwè siri ike. N’otu aka ahụ, ihe agha igbochi obi nke okwukwe na-echebe anyị n’ụzọ ime mmụọ. Gịnịkwanụ banyere okpu agha nke oge ochie? A na-ejikarị ígwè eme ya, ọ bụ okpu a na-eji eje agha, nke a rụrụ n’ụzọ a ga-eji ya chebe onye agha n’oge ọ na-alụ agha. Dị ka okpu agha na-echebe isi onye agha, otú ahụ ka olileanya nke nzọpụta na-esi echebe ike iche echiche, wee si otú ahụ na-eme ka onye Kraịst nọgide n’iguzosi ike n’ezi ihe. Lee nnọọ ka o si dịrị oké mkpa ka ndị Jehova yiri ihe agha ime mmụọ dị otú ahụ.—Ndị Efesọs 6:11-17.