Isi nke 17
E Nyere ‘Mkpụrụ Obi Ndị E Gburu Egbu’ Ụgwọ Ọrụ
1. Oge dị aṅaa ka anyị na-ebi n’ime ya, ihe àmà dị aṅaa na-egosikwa nke a?
ALAEZE Chineke na-achị achị! Onye Na-anọkwasị n’elu ịnyịnya ọcha ahụ na-aga inwezu mmeri ya! Ịnyịnya ahụ na-acha uhie uhie, ịnyịnya ojii ahụ, na ịnyịnya ahụ ya yiri ozu na-agabiga n’ime ụwa! Ihe ịrụ ụka adịghị ya na amụma ndị Jisọs buru n’onwe ya banyere ọnụnọ ya dị ka eze na-enwe mmezu. (Matiu, isi nke 24, 25; Mak, isi nke 13; Luk, isi nke 21) Ee, anyị na-ebi n’ime mgbe ikpeazụ nke usoro ihe nke a. (2 Timoti 3:1-5) Ebe ọ dị otú ahụ, ka anyị lezie anya mgbe Nwa Atụrụ ahụ, bụ́ Jisọs Kraịst, na-emeghe akara nke ise dị n’akwụkwọ ahụ. Ná mkpughe ndị ọzọ dị aṅaa ka anyị ga-ekere òkè ugbu a?
2. (a) Gịnị ka Jọn hụrụ mgbe e meghere akara nke ise ahụ? (b) N’ihi gịnị ka ọ na-ekwesịghị ịbụrụ anyị ihe ijuanya ịgụ banyere ebe ịchụàjà ihe atụ n’eluigwe?
2 Jọn na-akọwa ihe nkiri na-akpali akpali, sị: “Mgbe ọ saghekwara akara nke ise, m wee hụ n’okpuru ebe ịchụàjà ahụ mkpụrụ obi nke ndị e gbururịị n’ihi okwu Chineke, na n’ihi àmà ahụ nke ha nwere.” (Mkpughe 6:9) Gịnị bụ nke ahụ? Ọ̀ bụ ebe ịchụàjà dị n’eluigwe? Ee! Ọ bụ nke mbụ Jọn kpọtụrụ ebe ịchụàjà aha. Otú ọ dị, ọ kọwaworị Jehova ka ọ na-anọkwasị n’ocheeze Ya, ndị cherub gbara ya gburugburu, oké osimiri ahụ e ji enyo mee, ọwá ọkụ ndị ahụ, na 24 ndị okenye ahụ ndị ji ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ—ihe ndị ahụ nile yiri ihe a na-ahụ n’ụlọ ikwuu nke elu ala, ebe ofufe Jehova n’Israel. (Ọpụpụ 25:17, 18; 40:24-27, 30-32; 1 Ihe Emere 24:4) N’ihi ya, ọ̀ ga-abụrụ anyị ihe ijuanya ịhụkwa ebe ịchụàjà ihe atụ n’eluigwe?—Ọpụpụ 40:29.
3. (a) N’ụlọ ikwuu ndị Juu nke oge ochie, olee otú a na-esi awụsa mkpụrụ obi “na ntọala ebe ịchụàjà” ahụ? (b) N’ihi gịnị ka Jọn ji hụ mkpụrụ obi nke ndị e gburu egbu n’okpuru ebe ịchụàjà nke ihe atụ n’eluigwe?
3 N’okpuru ebe ịchụàjà nke a, e nwere “mkpụrụ obi nke ndị e gbururịị n’ihi okwu Chineke, na n’ihi àmà ahụ nke ha nwere.” Gịnị ka nke a pụtara? Ndị a apụghị ịbụ mkpụrụ obi ndị na-enwekwaghị anụ ahụ—dị ka ndị ahụ ndị Grik na-ekpere arụsị kwenyere na ha. (Jenesis 2:7; Ezikiel 18:4) Kama nke ahụ, Jọn maara na ọbara na-ese onyinyo mkpụrụ obi ma ọ bụ ndụ, mgbe ndị nchụàjà nke ụlọ ikwuu ndị Juu n’oge ochie gburu anụmanụ e ji achụ àjà, ha na-efesa ọbara ya “n’ebe ịchụàjà gburugburu,” ma ọ bụ wụsa ya “na ntọala ebe ịchụàjà nke àjà nsure ọkụ.” (Levitikọs 3:2, 8, 13; 4:7; 17:6, 11, 12) Ya bụ, e nwere ihe siri ike jikọtara mkpụrụ obi anụmanụ ahụ na ebe ịchụàjà. Ma n’ihi gịnị ka a ga-eji hụ mkpụrụ obi, ma ọ bụ ọbara nke ndị ohu Chineke ndị a n’okpuru ebe ịchụàjà ihe atụ ahụ dị n’eluigwe? Ọ bụ n’ihi na e lere ọnwụ ha anya dị ka nke ịchụàjà.
4. N’ụzọ dị aṅaa ka ọnwụ nke ndị Kraịst e ji mmụọ mụta si bụrụ nke ịchụàjà?
4 N’eziokwu, ndị nile e ji mmụọ mụta dị ka ụmụ Chineke na-anwụ ọnwụ ịchụàjà. N’ihi ọrụ ha gaje ịrụ n’Alaeze eluigwe nke Jehova, ọ bụ nzube Chineke ka ha jụ, jirikwa olileanya nile nke ịdị ndụ ebighị ebi n’elu ala chụọ àjà. N’echiche dị otú a, ha na-eweda onwe ha n’ala nye ọnwụ ịchụàjà n’ihi ọbụbụeze Jehova. (Ndị Filipaị 3:8-11; tụlee 2:17.) Otú ahụ ka ọ dị n’echiche bụ ezie banyere ndị ahụ Jọn hụrụ n’okpuru ebe ịchụàjà ahụ. Ha bụ ndị e tere mmanụ ndị e gburu n’oge ha n’ihi ozi ịnụ ọkụ n’obi ha na-eje n’ịkwado Okwu na ọbụbụeze Jehova. ‘E gburu mkpụrụ obi ha n’ihi okwu Chineke, na n’ihi ọrụ ịgba àmà [mar·ty·riʹan] ahụ ha nwere.’
5. Olee ụzọ o si bụrụ na mkpụrụ obi ndị kwesịrị ntụkwasị obi, ọ bụ ezie na ha nwụrụ anwụ, na-akpọ òkù ka a bọọ ọ́bọ̀ ha?
5 Ihe nkiri ahụ nọgidere na-emeghe: “Ha wee were oké olu tie mkpu, sị, Ruo olee mgbe, Onyenwe anyị, onye dị nsọ, bụrụkwa onye eziokwu, ka ị na-ekpeghị ikpe bọọkwa ọ́bọ̀ ọbara anyị n’isi ndị bi n’elu ụwa?” (Mkpughe 6:10) Olee otú mkpụrụ obi ma ọ bụ ọbara ha ga-esi tie mkpu maka ịbọ ọ́bọ̀, ebe Bible gosiri na ndị nwụrụ anwụ amaghị ihe ọ bụla? (Eklisiastis 9:5) Otú ọ dị, ọ̀ bụ na ọbara Ebel onye ezi omume etighị mkpu mgbe Ken gbusịrị ya? Jehova gwara Ken okwu mgbe ahụ, sị: “Gịnị ka i meworo? Gee ntị! Olu ọbara nwanne gị na-etiku m site n’ala.” (Jenesis 4:10, 11; Ndị Hibru 12:24) Ọ bụghị na ọbara Ebel na-ekwu okwu n’ụzọ nkịtị. Kama nke ahụ, Ebel nwụrụ dị ka onye na-emeghị ihe ọjọọ, ọ dịkwa mkpa ka a taa onye gburu ya ahụhụ iji mezuo ikpe ziri ezi. N’otu aka ahụ, ndị Kraịst ndị a e gburu egbu emeghị ihe ọjọọ ọ bụla, a ghaghịkwa ịbọ ọ́bọ̀ ha n’ikpe ziri ezi. (Luk 18:7, 8) Mkpu ahụ a na-eti maka ịbọ ọ́bọ̀ na-ada oké ụda n’ihi na ọtụtụ puku n’ime ha anwụwo n’ụzọ dị otú a.—Tụlee Jeremaịa 15:15, 16.
6. Mwụfu ọbara na-emeghị ihe ọjọọ dị aṅaa ka a bọrọ ọ́bọ̀ ya na 607 T.O.A.?
6 A pụkwara iji ọnọdụ ahụ tụnyere nke e nwere na Juda nke dapụrụ n’ezi ofufe mgbe Eze Manase rịkwasịrị n’ocheeze n’afọ 716 T.O.A. Ọ wụfuru ọtụtụ ọbara na-emeghị ihe ọjọọ, ma eleghị anya ‘jiri mma nkwọ kwọwaa’ onye amụma bụ Aịsaịa. (Ndị Hibru 11:37; 2 Ndị Eze 21:16) Ọ bụ ezie na Manase mesịrị chegharịa, gbanweekwa, ikpe ọmụma ọbara ahụ nọgidere. N’afọ 607 T.O.A., mgbe ndị Babilọn bibiri alaeze Juda, ọ bụ “n’ezie n’okwu ọnụ Jehova ka ihe a dị n’ahụ Juda, isi n’ihu ya wezụga ha, n’ihi mmehie nile nke Manase, dị ka ihe nile si dị nke o mere; ọzọkwa, n’ihi ọbara na-emeghị ihe ọjọọ nke ọ wụsịrị; o wee mejuo Jerusalem n’ọbara na-emeghị ihe ọjọọ: Jehova ekweghịkwa ịgbaghara.”—2 Ndị Eze 24:3, 4.
7. Ònye ka ikpe mara n’ụzọ bụ isi maka ịwụfu “ọbara ndị nsọ”?
7 Dị ka ọ dị n’oge Bible, otú ahụ ka ọ dị taa na ọ pụrụ ịbụ na ọtụtụ ndị gburu ndịàmà Chineke anwụworị n’oge dị anya gara aga. Ma òtù ahụ nke kpatara ogbugbu ha ka dị ndụ, burukwa ikpe ọmụma ọbara. Ọ bụ nzukọ elu ala nke Setan, mkpụrụ elu ala ya. Otu nke pụtakarịsịrị ìhè n’ime ya bụ Babilọn Ukwu ahụ, bụ́ alaeze ụwa nke okpukpe ụgha.a A kọwara ya dị ka onye “ọbara ndị nsọ na ọbara ndị àmà Jisọs na-aba ya n’anya dị ka mmanya.” Ee, “ọ bụkwa n’ime ya ka a hụrụ ọbara nke ndị amụma na nke ndị nsọ, na nke ndị e gbuworo n’elu ụwa.” (Mkpughe 17:5, 6; 18:24; Ndị Efesọs 4:11; 1 Ndị Kọrint 12:28) Lee nnọọ oké ikpe ọmụma ọbara nke a bụ! Ruo ogologo oge Babilọn Ukwu ahụ nọgidere na-adị, ọbara nke ndị o gburu ga-anọgide na-akpọ òkù ka e mezuo ikpe ziri ezi.—Mkpughe 19:1, 2.
8. (a) Ndị dịgasị aṅaa ka e gburu n’ihi okwukwe ha n’oge ndụ Jọn? (b) Mkpagbu dị aṅaa ka ndị eze Rom kpaliri?
8 Jọn n’onwe ya hụrụ ndị e gburu n’ihi okwukwe ha n’ime narị afọ mbụ ahụ ka Agwọ ahụ nwere obi ọjọọ na mkpụrụ elu ala ya buru agha megide ọgbakọ ahụ na-eto eto nke ndị Kraịst e tere mmanụ. Jọn hụrụ ka a kpọgidere Onyenwe anyị n’elu osisi, dịkwa ndụ gabiga oge e gburu Stifen, na nwanne nke ya bụ Jemes, na Pita, Pọl, na ndị enyi ya ndị ọzọ. (Jọn 19:26, 27; 21:15, 18, 19; Ọrụ 7:59, 60; 8:2; 12:2; 2 Timoti 1:1; 4:6, 7) N’afọ 64 O.A., onyeeze Rom bụ Nero jiri ndị Kraịst mere ndị a ga-ata ụta, na-ebo ha ebubo na ọ bụ ha suru obodo ahụ ọkụ, iji megide akụkọ a na-anụ na ọ bụ ya mere ka e suo obodo ahụ ọkụ. Onye odeakụkọ ihe mere eme bụ Tacitus kọrọ, sị: “Ha [ndị Kraịst] nwụrụ site n’ụzọ dị iche iche nke ịkwa emo; e ji akpụkpọ anụ ọhịa yikwasị ụfọdụ n’ime ha, nkịta wee dọkasịa ha, ụfọdụ n’ime ha ka a [kpọgidere n’osisi],b e suru ụfọdụ n’ime ha ọkụ dị ka ihe na-enye ìhè n’anyasị.” Oké mmegide a gara n’ihu na-enwe n’okpuru Eze Domitian (81-96 O.A.) mere ka a chụpụ Jọn jee n’agwaetiti Patmọs. Dị ka Jisọs kwuru: “Ọ bụrụ na ha sogburu m, ha ga-esogbukwa unu.”—Jọn 15:20; Matiu 10:22.
9. (a) Isi ihe dị aṅaa e ji eduhie mmadụ ka Setan wepụtara n’ime narị afọ nke anọ O.A., gịnịkwa ka ọ bụ akụkụ ya bụ isi? (b) Olee otú ndị ọchịchị ụfọdụ nọ na Krisendọm si mesoo Ndịàmà Jehova n’oge Agha Ụwa Mbụ na nke Abụọ?
9 Ka ọ na-erule na narị afọ nke anọ O.A., agwọ ochie ahụ, Setan bụ́ Ekwensu, ewepụtawo ihe bụ́ isi o ji eduhie ụmụ mmadụ, bụ́ okpukpe ahụ si n’ezi ofufe dapụ bụ́ Krisendọm—okpukpe ndị Babilọn nke a kpọkwasịrị aha ụgha bụ́ “ndị Kraịst.” Ọ bụ akụkụ bụ́ isi nke mkpụrụ nke Agwọ ahụ, ọ gbasawokwa gaa n’ịbụ ìgwè dị ukwuu nke òtù dị iche iche na-emegiderịta onwe ha. Dị ka Juda oge ochie nke na-ekwesịghị ntụkwasị obi, ikpe ọmụma ọbara dị ukwuu na-adịkwasị Krisendọm, ebe o tinyeworo aka n’ụzọ dị omimi n’akụkụ abụọ ahụ nke Agha Ụwa Mbụ na nke Abụọ. Ndị ọchịchị ụfọdụ nọ na Krisendọm jikwara agha ndị a mee ihe dị ka ihe ngọpụ iji gbuo ndị ohu Chineke e tere mmanụ. Mgbe ọ na-akọ ihe banyere mkpagbu Hitler kpagburu Ndịàmà Jehova, otu ntụleghachi nke akwụkwọ Friedrich Zipfel bụ Kirchenkampf in Deutschland (Agha nke Chọọchị Dị Iche Iche na Germany) kọrọ, sị: “Otu ụzọ n’ụzọ atọ n’ime ha [Ndịàmà ahụ] ka e gburu, site ná mgbagbu ihu ọha, n’ụzọ ime ihe ike ndị ọzọ, agụụ, ọrịa ma ọ bụ ịrụ ọrụ dị ka ndị ohu. A hụtụbeghị ụdị mmesi ike dị otú a mbụ, ọ bụkwa n’ihi okwukwe siri ike nke a na-apụghị ime ka ya na echiche nke òtù ndọrọ ndọrọ ọchịchị National Socialist kwekọọ.” N’eziokwu, a pụrụ ikwu banyere Krisendọm, gụnyere ndị ụkọchukwu ya, sị: “N’ọnụ ọnụ uwe gị ka a chọtaworo ọbara nke mkpụrụ obi nke ndị ogbenye na-emeghị ihe ọjọọ.”—Jeremaịa 2:34.c
10. Mkpagbu dịgasị aṅaa ka ụmụ okorobịa so n’oké ìgwè mmadụ ahụ taworo ahụhụ ya n’ọtụtụ mba?
10 Kemgbe 1935, ụmụ okorobịa kwesịrị ntụkwasị obi ndị so n’oké ìgwè mmadụ ahụ atawo ahụhụ mkpagbu n’ọtụtụ ala. (Mkpughe 7:9) Ọbụna ka Agha Ụwa nke Abụọ na-agwụsị na Europe, nanị n’otu obodo, a kwụgburu 14 ụmụ okoro bụ́ Ndịàmà nke Jehova. Gịnị bụ mpụ ha mere? Ọjụjụ ha jụrụ ‘ịmụtakwa agha ọzọ.’ (Aịsaịa 2:4) N’oge ndị na-adịchabeghị anya, ụmụ okorobịa nọ n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ na n’Africa abụrụwo ndị e tigburu ma ọ bụ gbagbuo n’ihu ọha n’ihi otu ihe ahụ. Ọ bụ ihe e ji n’aka na ụmụ okoro ndị a nwụrụ n’ihi okwukwe ha, bụ́ ndị na-enye ụmụnna Jisọs e tere mmanụ ezi nkwado, ga-enweta mbilite n’ọnwụ baa n’ime ụwa ọhụrụ ahụ e kwere ná nkwa.—2 Pita 3:13; tụlee Abụ Ọma 110:3; Matiu 25:34-40; Luk 20:37, 38.
Uwe Mwụda Dị Ọcha
11. N’echiche dị aṅaa ka ndị Kraịst e tere mmanụ bụ ndị e gburu n’ihi okwukwe ha na-anata “uwe mwụda dị ọcha”?
11 Mgbe o dekọsịrị ihe banyere okwukwe nke ndị na-ekwesị ntụkwasị obi n’oge ochie, Pọl onyeozi kwuru, sị: “Ndị a nile, ọ bụ ezie na a gbaara ha àmà site n’okwukwe ha, ma ha anataghị nkwa ahụ, n’ihi na Chineke buru ụzọ lepụta ihe ka mma banyere anyị, ka a ghara ime ka ha zuo okè ma a sị na anyị anọghị ya.” (Ndị Hibru 11:39, 40) Gịnị bụ ‘ihe ahụ ka mma’ nke Pọl na ndị Kraịst ndị ọzọ e tere mmanụ na-atụ anya ya? Jọn hụrụ ya n’ọhụụ ebe a: “E wee nye ha n’otu n’otu uwe mwụda dị ọcha; e wee sị ha, ka ha zuru ike nwa oge ọzọ, ruo mgbe ndị ohu ibe ha na ụmụnna ha ga-ezukwa ezu, bụ́ ndị a gaje igbu dị ka e gbukwara ha onwe ha.” (Mkpughe 6:11) Nnata ha natara “uwe mwụda dị ọcha” metụtara mbilite n’ọnwụ ha ịbụ ndị mmụọ e kere eke na-adịghị anwụ anwụ. Ha adịghị atọgbọkwa dị ka mkpụrụ obi e gburu egbu n’okpuru ebe ịchụàjà, kama a na-akpọlite ha ịghọ akụkụ nke 24 ndị okenye ahụ ndị na-efe ofufe n’ihu ocheeze Chineke nke dị n’eluigwe. N’ebe ahụ, a na-enye ha ocheeze, na-egosi na ha abanyewo n’ihe ùgwù dị iche iche dị ka ndị eze. ‘E gbokwasịkwara ha uwe ọcha,’ na-egosi na a gụwo ha ná ndị ezi omume, ndị kwesịrị inweta ọnọdụ dị ùgwù n’ihu Jehova n’ime eluigwe. Nke a bụkwa ná mmezu nkwa Jisọs kwere ndị Kraịst ahụ e tere mmanụ nọ n’ọgbakọ dị na Sadis: “Onye na-emeri emeri ka a ga-egbokwasị uwe ọcha otú a.”—Mkpughe 3:5; 4:4; 1 Pita 1:4.
12. N’ụzọ dị aṅaa ka ndị e tere mmanụ a kpọlitere n’ọnwụ ‘na-ezuru ike nwa oge,’ ọ̀ bụkwa ruo olee mgbe?
12 Ihe àmà gosiri na mbilite n’ọnwụ nke eluigwe nke a malitere na 1918, mgbe Jisọs nọkwasịchara n’ocheeze na 1914, mgbe ọ malitesịkwara ịgba ịnyịnya ya iji malite mmeri ya dị ka eze site n’ikpochapụ Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya n’eluigwe. Ma, a gwara ndị ahụ e tere mmanụ a kpọlitere n’ọnwụ na ha aghaghị ‘izuru ike nwa oge ruo mgbe ọnụ ọgụgụ ndị ohu ibe ha’ ga-ezu. Ndị so n’òtù Jọn ndị ka nọ n’elu ala ebe a aghaghị igosipụta ikwesị ntụkwasị obi ha n’okpuru ule na mkpagbu, a ka pụkwara igbu ụfọdụ n’ime ndị a. Otú ọ dị, n’ikpeazụ, a gaje ịbọ ọ́bọ̀ ọbara ezi omume nile Babilọn Ukwu ahụ na ndị òtù ndọrọ ndọrọ ọchịchị ya wụfuru. Ka ọ dị ugbu a, ihe ịrụ ụka adịghị ya na ndị ahụ a kpọliteworo n’ọnwụ na-arụsi ọrụ ike n’eluigwe. Ha na-ezuru ike ọ bụghị site n’ịfanye aka n’ụkwụ wee tụsara ahụ n’emeghị ihe ọ bụla, kama ọ bụ n’echiche nke bụ na ha ji ntachi obi na-echere ụbọchị ịbọ ọ́bọ̀ Jehova. (Aịsaịa 34:8; Ndị Rom 12:19) Ozuzu ike ha ga-agwụ mgbe ha ga-ahụ mbibi nke okpukpe ụgha, dịkwa ka “ndị a kpọworo, ndị a họpụtawokwara, ndị kwesịkwara ntụkwasị obi,” ha ga-esoro Onyenwe anyị Jisọs Kraịst mee ihe n’imezu ihe e kpere n’ikpe megide akụkụ ndị ọzọ nile nke mkpụrụ ajọ omume Setan n’elu ala ebe a.—Mkpughe 2:26, 27; 17:14; Ndị Rom 16:20.
‘Ndị Nwụrụ Anwụ Ga-ebu Ụzọ Bilie’
13, 14. (a) Dị ka Pọl onyeozi si kwuo, olee mgbe mbilite n’ọnwụ gaa ná ndụ eluigwe malitere, oleekwa ndị a kpọlitere? (b) Olee mgbe a ga-akpọlite ndị e tere mmanụ ndị dịịrị ndụ ruo ụbọchị Onyenwe anyị n’ọnwụ gaa n’eluigwe?
13 Nghọta nke e nwetara mgbe e meghere akara nke ise ahụ kwekọrọ n’ụzọ zuru ezu n’akụkụ akwụkwọ ndị ọzọ ndị metụtara mbilite n’ọnwụ gaa n’eluigwe. Dị ka ihe atụ, Pọl onyeozi dere, sị: “N’ihi na nke a ka anyị na-agwa unu n’okwu [Jehova, NW], na anyị onwe anyị, bụ́ ndị nọ ná ndụ, ndị a na-ahapụ ruo [ọnụnọ, NW] nke onyenwe anyị, na anyị agaghị eburu ndị dara n’ụra ọnwụ ụzọ ma ọlị. N’ihi na Onyenwe anyị onwe ya ga-ewere oké ịkpọ òkù, were olu isi mmụọ ozi, werekwa opi nke Chineke, si n’eluigwe rịdata: ndị nwụrụ n’ime Kraịst ga-ebukwa ụzọ si n’ọnwụ bilie: mgbe ahụ anyị onwe anyị, bụ́ ndị nọ ná ndụ, ndị a na-ahapụ, anyị na ha ka a ga-ewelikọ n’igwe ojii, izute Onyenwe anyị n’ime mbara eluigwe: otú a ka anyị na Onyenwe anyị ga-anọkwa mgbe nile.”—1 Ndị Tesalọnaịka 4:15-17.
14 Lee nnọọ akụkọ na-akpali akpali amaokwu ndị a kọrọ! Ndị so n’ụmụnna Jisọs e tere mmanụ, ndị nọ ná ndụ ruo oge ọnụnọ Jisọs, ya bụ, ndị ka dị ndụ n’elu ala ruo ọnụnọ ya, agaghị ebu ndị ahụ nwụwororịị ụzọ banye n’eluigwe. Ndị dị otú ahụ, ndị nwụrụ n’ime Kraịst, ga-ebu ụzọ si n’ọnwụ bilie. Jisọs na-arịdata, ya bụ, ọ na-eche ha ihu, wee kpọlite ha gaa ná ndụ dị ka mmụọ, na-enye ha “uwe mwụda dị ọcha,” mgbe nke a gasịrị, ndị ahụ ka nọ ndụ dị ka mmadụ na-ejezu ozi elu ala ha, ọtụtụ n’ime ha na-anwụ ọnwụ ike n’aka ndị mmegide. Ha anaghị anọgidekwa n’ụra ọnwụ dị ka ndị buru ha ụzọ nwụọ mere. Kama nke ahụ, mgbe ha nwụrụ, a na-agbanwe ha ozugbo ahụ—“n’otu ntabi anya”—buru ha jee n’eluigwe iso Jisọs na ndị ọzọ so n’ahụ Kraịst nọkọọ. (1 Ndị Kọrint 15:50-52; tụlee Mkpughe 14:13.) Otú a, mbilite n’ọnwụ nke ndị Kraịst e tere mmanụ malitere n’oge na-adịghị anya ka ndị ịnyịnya anọ ahụ nke Apọkalips malitere ịgbafe.
15. (a) Ozi ọma dị aṅaa ka mmeghe nke akara nke ise ahụ wetaworo? (b) Olee otú ọgbụgba nke Onye Mmeri ahụ nke na-anọkwasị n’elu ịnyịnya ọcha ahụ ga-esi jedebe?
15 Mmeghe nke akara nke ise nke a dị n’akwụkwọ ahụ ezitewo ozi ọma banyere ndị e tere mmanụ na-ekwesị ntụkwasị obi, ndị meriworonụ, ndị nọgidere n’ikwesị ntụkwasị obi ruo ọnwụ. Ma ọ dịghị eweta ozi ọma ọ bụla nye Setan na mkpụrụ ya. Mgbafe nke Onye Mmeri ahụ nke na-anọkwasị n’elu ịnyịnya ọcha ahụ nọgidere na-aga n’ihu n’enweghị mgbochi ọ bụla, ọ ga-anọgidekwa na-aga ruo n’oge ụwa nke a nke “na-atọgbọkwa n’aka ajọ onye ahụ” ga-eme ngụzi. (1 Jọn 5:19) E mere ka nke a pụta ìhè mgbe Nwa Atụrụ ahụ meghere akara nke isii.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a E nyere nkọwa zuru ezu banyere ihe Babilọn Ukwu ahụ bụ n’Isi 33.
b Tụlee New World Translation Reference Bible, peji nke 1577, ihe ntụkwasị 5C, “Osisi Ịta Ahụhụ.”
c E nyere ihe àmà zuru ezu karị nke ikpe ọmụma ọbara dịkwasịrị okpukpe n’Isi 36.
Igbe dị na peeji nke 102]
‘Mkpụrụ obi ndị e gburu egbu’
Akwụkwọ Cyclopedia nke McClintock na Strong dere hotara na John Jortin, onye England bụ onye Protestant na narị afọ nke 18, onye ndị mụrụ ya bụ ndị òtù Huguenot nke France, kwuru, sị: “Ebe mkpagbu malitere ka Iso Ụzọ Kraịst jedebere . . . Ọ bụ mgbe e guzobesịrị Iso Ụzọ Kraịst dị ka okpukpe nke alaeze [Rom], mgbe e nyewokwara ndị ozi ya akụ na ùgwù, ka oké ajọ ihe ahụ bụ mkpagbu nwetara ike dị ukwuu, wee jiri ike ya hiri nne nke ukwuu mee ihe megide okpukpe nke Oziọma ahụ.”
[Foto dị na peeji nke 103]
“E wee nye ha n’otu n’otu uwe mwụda dị ọcha”