Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • od isi 13 p. 130-140
  • “Na-emenụ Ihe Niile Iji Nye Chineke Otuto”

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • “Na-emenụ Ihe Niile Iji Nye Chineke Otuto”
  • Ndị A Haziri Ime Uche Jehova
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • ỊKPA ÀGWÀ ỌMA NA IFE CHINEKE OTÚ Ọ CHỌRỌ
  • ỊDỊ ỌCHA
  • EZIGBO NTỤRỤNDỤ
  • IHE NDỊ A NA-EME N’ỤLỌ AKWỤKWỌ
  • ỌRỤ NA NDỊ ENYI
  • ANYỊ NA ỤMỤNNA ANYỊ DỊ N’OTU
  • Chineke Hụrụ Ndị Na-adị Ọcha n’Anya
    “Nọrọnụ n’Ịhụnanya Chineke”
  • Ntụrụndụ Ziri Ezi Bụ́ nke Na-eme Ka E Nwee Ume Ọhụrụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2006
  • Ntụrụndụ Ị Na-enwe Ọ̀ Na-abara Gị Uru?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2011
  • “Ị̀ Hụrụ M n’Anya Karịa Ihe Ndị A?”
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2017
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ndị A Haziri Ime Uche Jehova
od isi 13 p. 130-140

ISI NKE 13

“Na-emenụ Ihe Niile Iji Nye Chineke Otuto”

IHE niile anyị na-ekwu na ihe niile anyị na-eme kwesịrị ime ka a na-enye Jehova otuto ebe ọ bụ na anyị enyefeela ya onwe anyị. Ọ bụ ya mere Pọl onyeozi ji sị: “Ma ùnu na-eri ihe ma ùnu na-aṅụ ihe ọṅụṅụ ma ùnu na-eme ihe ọ bụla ọzọ, na-emenụ ihe niile iji nye Chineke otuto.” (1 Kọr. 10:31) Nke a pụtara na anyị ga na-akpa àgwà otú Jehova chọrọ. Ọ ga-egosikwa na anyị na-eme ka ya. (Kọl. 3:10) Ebe anyị dị nsọ, anyị kwesịrị ịna-eṅomi Chineke.​—Efe. 5:​1, 2.

2 Pita onyeozi gwara Ndị Kraịst otú ha ga-esi na-eme ya. Ọ sịrị: “Dị ka ụmụ na-erube isi, kwụsịnụ ịbụ ndị na-eme omume dị ka ọchịchọ unu nwere n’oge gara aga si dị, mgbe unu na-amaghị ihe, kama, dị ka Onye Nsọ ahụ nke kpọrọ unu, bụrụkwanụ ndị dị nsọ n’omume unu niile, n’ihi na e dere, sị: ‘Unu ga-adị nsọ, n’ihi na adị m nsọ.’” (1 Pita 1:​14-16) Jehova chọrọ ka Ndị Kraịst niile na-adị nsọ otú ahụ o si chọọ ka ụmụ Izrel dịrị. Nke a pụtara na ha ekwesịghị imerụ onwe ha, ha ekwesịghịkwa ịna-akpa àgwà ka ndị ụwa. Ha ga-esi otú a bụrụ ndị Jehova họọrọ maka ijere ya ozi dị nsọ.​—Ọpụ. 20:5.

3 Ọ bụrụ na anyị chọrọ ịna-adị nsọ, anyị ga na-eme ihe niile Jehova gwara anyị n’Akwụkwọ Nsọ ka anyị na-eme. (2 Tim. 3:16) E ji Baịbụl kụziere anyị banyere Jehova na ụzọ ya, ihe anyị mụtara emezie ka anyị bịaruo ya nso. Baịbụl a kụziiri anyị mere ka o doo anyị anya na anyị kwesịrị ibu ụzọ na-achọ Alaeze Chineke ma na-eme uche ya mgbe niile. (Mat. 6:33; Rom 12:2) Ọ pụtara na anyị kwesịrị iyiri mmadụ ọhụrụ ahụ.​—Efe. 4:​22-24.

ỊKPA ÀGWÀ ỌMA NA IFE CHINEKE OTÚ Ọ CHỌRỌ

4 Ọ naghị adị mfe mgbe niile ịkpa àgwà otú Jehova chọrọ. Onye iro anyị bụ́ Ekwensu na-achọsi ike ka anyị kwụsị ife Jehova. Ụwa ọjọọ a na ezughị okè anyị na-emekwa ka ọ na-esiri anyị ike mgbe ụfọdụ irubere Jehova isi. Anyị kwesịrị ịgbasi mbọ ike ka anyị nwee ike ịna-efe Chineke otú ọ chọrọ. Akwụkwọ Nsọ gwara anyị ka ọ ghara iju anyị anya ma a kpagbuwe anyị ma ọ bụ ma ọnwụnwa bịara anyị. Anyị ga-atarịrị ahụhụ n’ihi ezi omume. (2 Tim. 3:12) Obi kwesịrị ịna-atọ anyị ụtọ mgbe a na-akpagbu anyị n’ihi na ọ na-egosi na anyị na-eme uche Chineke.​—1 Pita 3:​14-16; 4:​12, 14-16.

5 N’agbanyeghị na Jizọs zuru okè, ọ mụtara nrubeisi n’ahụhụ ndị ọ tara. O kweghị ka Setan nwata ya, ọ chọwaghịkwa ọkwá n’ụwa. (Mat. 4:​1-11; Jọn 6:15) Ọ dịtụdịghị mgbe Jizọs chere echiche ịkwụsị ife Chineke. Ọ bụ eziokwu na isi o rubeere Chineke mere ka ụwa kpọọ ya asị, ọ kwụsịghị ime uche Jehova. Obere oge tupu e gbuo Jizọs, ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya na ụwa ga-akpọkwa ha asị. Si mgbe ahụ gawa, a malitere ịkpagbu ndị na-eso ụzọ Jizọs. Ma, ihe kasiri ha obi bụ na ha ma na Ọkpara Chineke emeriela ụwa.​—Jọn 15:19; 16:33; 17:16.

6 Ọ bụrụ na anyị achọghị ịbụ nke ụwa, anyị kwesịrị ịna-akpa àgwà otú Jehova chọrọ, dị ka Jizọs mere. Anyị ekwesịghịkwa itinye aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị ma ọ bụ n’esemokwu ndị e nwere n’ebe anyị bi. Anyị kwesịrị ịgbara omume rụrụ arụ e ji mara ụwa a ọsọ. Anyị kwesịkwara iji ihe e kwuru na Jems 1:21 kpọrọ ihe. Ebe ahụ sịrị: “Wepụnụ iru unyi niile na ihe ahụ na-abaghị uru, nke bụ́ ihe ọjọọ, jirikwanụ nwayọọ nabata okwu Chineke nke a kụrụ n’ime unu dị ka mkpụrụ, nke nwere ike ịzọpụta mkpụrụ obi unu.” Ọ bụrụ na anyị ana-amụ Baịbụl ma na-aga ọmụmụ ihe, a ‘ga-akụ okwu Chineke’ n’obi anyị, ihe nke ụwa agaghịkwa na-agụ anyị agụụ. Jems sịrị: “Ùnu amaghị na ịbụ enyi ụwa bụ ịbụ onye iro Chineke? Ya mere, onye ọ bụla nke chọrọ ịbụ enyi ụwa na-eme onwe ya onye iro Chineke.” (Jems 4:4) Ihe a o kwuru gosiri na Baịbụl na-adọsi anyị aka ná ntị ike ka anyị na-eme ihe Jehova chọrọ mgbe niile ma ghara ịbụ nke ụwa.

7 Okwu Chineke dọrọ anyị aka ná ntị ka anyị ghara ịna-akpa àgwà rere ure. Ọ gwara anyị, sị: “Ka a ghara ịkpọtụdị ịkwa iko na ụdị adịghị ọcha ọ bụla ma ọ bụ anyaukwu aha n’etiti unu, dị nnọọ ka o kwesịrị ndị nsọ.” (Efe. 5:3) N’ihi ya, anyị kwesịrị ịhụ na anyị anaghị eche gbasara ihe ọ bụla rụrụ arụ, anyị ekwesịtụdịghị ịkpọtụ ha aha mgbe anyị na ndị ọzọ na-akparịta ụka. Ọ bụrụ na anyị agbaara ihe ndị a ọsọ, ọ ga-egosi na anyị chọrọ ịna-akpa àgwà otú Jehova chọrọ.

ỊDỊ ỌCHA

8 Anyị amụtala na Ndị Kraịst kwesịrị ịna-akpa àgwà ọma ma na-efe Chineke otú ọ chọrọ. Anyị makwa na Ndị Kraịst kwesịrị ịna-adị ọcha. N’oge ochie, Chineke gwara ụmụ Izrel ka ha debe ebe ha bi ọcha n’ihi na yanwa dị nsọ. Anyị kwesịkwara ịna-adị ọcha ka Jehova “ghara ịhụ ihe ọ bụla na-ekwesịghị ekwesị” n’ahụ́ anyị.​—Diut. 23:14.

9 Na Baịbụl, e nwere ihe jikọrọ mmadụ ịdị nsọ na mmadụ ịdị ọcha. Dị ka ihe atụ, Pọl kwuru, sị: “Ndị m hụrụ n’anya, ka anyị sachapụ onwe anyị mmerụ niile nke anụ ahụ́ na nke mmụọ, wee mee ka ịdị nsọ anyị zuo okè n’egwu Chineke.” (2 Kọr. 7:1) N’ihi ya, ma ụmụnna nwoke ma ụmụnna nwaanyị kwesịrị ịna-asa ahụ́ ma na-asụ ákwà ha mgbe niile. N’agbanyeghị otú ihe si dị ná mba ọ bụla, anyị ga-enwetali mmiri na ncha anyị ga-eji na-asa ahụ́, na-ahụkwa na ụmụ anyị dị ọcha.

10 A ma anyị ama n’obodo anyị dị iche iche n’ihi ozi ọma anyị na-ekwusa. Otu ụzọ anyị si ezi ndị agbata obi anyị ozi ọma bụ idebe ime ụlọ anyị na gburugburu ụlọ anyị ọcha na ịhụ na anyị haziri ihe niile ahazi. Ọrụ a bụ ọrụ dịịrị mmadụ niile n’ezinụlọ. Ụmụnna anyị ndị nwoke kwesịrị ịhụ na gburugburu ụlọ ha na-adị ọcha mgbe niile n’ihi na ọ ga-eme ka ndị ọzọ na-ekwu okwu ọma banyere anyị. Ọ bụrụ na ndị isi ezinụlọ ana-eme ihe a ma na-akụziri ndị ezinụlọ ha Okwu Chineke, ọ na-egosi na ha na-elekọta ezinụlọ ha nke ọma. (1 Tim. 3:​4, 12) Ụmụnna anyị nwaanyị kwesịkwara iso na-edebe ụlọ ha ọcha, karịchaa ime ụlọ ha. (Taị. 2:​4, 5) Ụmụaka anyị a zụrụ nke ọma na-adịkwa ọcha ma na-edebe ime ụlọ ha ọcha. Ọ bụrụ na ndị niile nọ n’ezinụlọ agbakọọ aka na-eme ka ụlọ ha na-adị ọcha, ọ na-egosi na ha chọrọ ibi n’ụwa ọhụrụ mgbe Alaeze Chineke ga na-achị ụwa.

11 Ọtụtụ ndị Jehova taa na-eji ọgba tum tum ma ọ bụ ụgbọala ha aga ọmụmụ ihe. N’ebe ụfọdụ, ụmụnna anyị na-ejikarị ụgbọala aga ozi ọma. Anyị kwesịrị ịna-edebe ụgbọala anyị ọcha ma na-ahụ na ha na-arụ ọrụ nke ọma. Otú ụlọ anyị na ụgbọala anyị dị kwesịrị igosi na anyị dị nsọ ma dịrị ọcha otú ndị Jehova kwesịrị ịna-adị. Anyị kwesịkwara ịhụ na akpa ozi ọma anyị na Baịbụl anyị na-adị mma n’anya.

12 Anyị kwesịrị ịna-ejike otú ga-egosi na anyị na-ejere Jehova ozi. Ọ bụrụ na anyị chọrọ ịga hụ onye a ma ama, anyị agaghị anwa anwa yiri uwe na-adịghị mma n’anya ma ọ bụ nke na-ekwesịghị ekwesị. Anyị kwesịdịrị ijikere nke ọma karị ma anyị chọọ ịga ozi ọma ma ọ bụ ime ihe omume n’ọgbakọ n’ihi na anyị na-anọchite anya Jehova. Otú ejiji anyị na uwe anyị dị nwere ike ime ka ndị ọzọ nwee mmasị ife Jehova ma ọ bụkwanụ ghara inwe mmasị ife ya. Ọ gaghị adị mma ma anyị yiri ákwà na-adịghị mma n’anya ma ọ bụ nke nwere ike ime ka ndị ọzọ sụọ ngọngọ. (Maị. 6:8; 1 Kọr. 10:​31-33; 1 Tim. 2:​9, 10) N’ihi ya, anyị chọwa ịga ozi ọma, ọmụmụ ihe, mgbakọ sekit, mgbakọ ukwu, ma ọ bụ mgbakọ mba niile, anyị kwesịrị ịdị ọcha ma jiri ejiji dị mma otú Akwụkwọ Nsọ kwuru. Ihe mere anyị ga-eji eme ya bụ na anyị chọrọ ka a na-eto Jehova mgbe niile.

Ihe niile anyị na-ekwu na ihe niile anyị na-eme kwesịrị ime ka a na-enye Jehova otuto ebe ọ bụ na anyị enyefeela ya onwe anyị

13 Anyị kwesịkwara ijike nke ọma ma anyị gawa ileta isi ụlọ ọrụ anyị ma ọ bụ alaka ụlọ ọrụ anyị. Cheta na Betel pụtara “Ụlọ Chineke.” N’ihi ya, anyị kwesịrị ijike nke ọma ma na-akpa àgwà otú anyị si akpa ma anyị gaa ọmụmụ ihe n’Ụlọ Nzukọ Alaeze.

14 Anyị chọọ ịtụrụ ndụ ma ọ bụ chọọ ime ihe ndị ọzọ dịịrị anyị, anyị kwesịrị iji ejiji dị mma. Anyị nwere ike ịjụ onwe anyị, sị, ‘Ihe a m yi ọ̀ ga-eme ka ihere mewe m izi ndị mmadụ ozi ọma?’

EZIGBO NTỤRỤNDỤ

15 Izu ike na igwu egwu na-eme ka ahụ́ na-agbasi anyị ike. O nwedịrị mgbe Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya ka ha gaa “zurutụ ike” n’ebe ndị mmadụ na-anaghị anọkarị. (Mak 6:31) Izu ike, ịtụrụ ndụ, ma ọ bụ igwuri egwu ga-eme ka ahụ́ gbasie anyị ike ịna-arụ ọrụ anyị.

16 E nwere ihe dị iche iche ndị mmadụ ji atụrụ ndụ taa. N’ihi ya, Ndị Kraịst kwesịrị ịsa anya ná mmiri họrọ ndị nke dị mma ha ga-eji na-atụrụ ndụ. Ọ bụ eziokwu na ntụrụndụ na-enyere anyị aka ná ndụ, o kwesịghị ịbụ ihe mbụ ná ndụ anyị. Baịbụl dọrọ anyị aka ná ntị na “n’oge ikpeazụ,” ndị mmadụ ga-abụ “ndị hụrụ ihe ụtọ n’anya kama ịbụ ndị hụrụ Chineke n’anya.” (2 Tim. 3:​1, 4) Ọtụtụ n’ime ihe ndị mmadụ ji atụrụ ndụ taa ekwesịrịghị ndị na-efe Jehova.

17 Ndị Kraịst oge mbụ gbara mbọ ka a ghara inwe ihe jikọrọ ha na ụwa nke oge ahụ e ji ntụrụndụ na-adịghị mma mara. N’ámá egwuregwu ndị Rom, ihe ndị mmadụ ji atụrụ ndụ bụ ikiri ebe ndị ọzọ na-ata ahụhụ. Ha na-ekiri ndị na-eme ihe ike, ndị na-egbu mmadụ ibe ha, na ndị na-akwa iko. Ma, Ndị Kraịst oge ahụ anaghị anwa anwa ekiri ihe ndị ahụ. Ọ bụkwa ụdị ihe ndị a ka ọtụtụ ndị ji atụrụ ndụ taa. Anyị kwesịrị ‘ichesi nche ike’ n’otú anyị si eje ije ma gbaara ntụrụndụ rụrụ arụ ọsọ. (Efe. 5:​15, 16; Ọma 11:5) O nwere ike ịbụ na o nweghị ihe dị njọ n’ihe ndị anyị ji atụrụ ndụ, ma otú anyị si jiri ha na-atụrụ ndụ nwere ike ịdị njọ.​—1 Pita 4:​1-4.

18 E nwere ihe ndị dị mma Ndị Kraịst nwere ike iji na-atụrụ ndụ. Ọtụtụ ndị na-eji ihe Akwụkwọ Nsọ na ihe akwụkwọ anyị dị iche iche kwuru ekpebi ụdị ntụrụndụ ha ga na-enwe.

19 Mgbe ụfọdụ, otu ezinụlọ nwere ike ịkpọ ezinụlọ ndị ọzọ ka ha na ha nọrịa. Ụmụnna na-agba akwụkwọ nwekwara ike ịkpọ ụmụnna ndị ọzọ ka ha bịa oriri agbamakwụkwọ ha ma ọ bụ ụdị oriri ọzọ. (Jọn 2:2) Ọ bụ ndị kpọrọ oriri ka ihe niile a ga-eme na ya dị n’isi. O doro anya na e kwesịrị ịkpachara anya ma ọ bụrụ na ọtụtụ ndị ga-abịa oriri ahụ. N’ụdị oriri a, e nweela ndị ṅụbigara mmanya ókè, ndị ribigara nri ókè, na ndị kpara àgwà ọjọọ ndị ọzọ. Ọ bụ ya mere Ndị Kraịst na-achọghị ka ụdị ihe a mee n’oriri ha ji akpọ mmadụ ole na ole, hụkwa na e gbughị oge mechaa ya. Ọ bụrụ na a ga-enye ndị mmadụ mmanya na-aba n’anya, onye kpọrọ oriri ahụ kwesịrị ịhụ na o nweghị onye ṅụbigara mmanya ókè. (Fil. 4:5) Ọ bụrụ na anyị agbalịa hụ na nnọkọ oriri ndị anyị na ụmụnna anyị na-enwe dị mma, na-agbakwa anyị ume ife Chineke otú ọ chọrọ, nri na mmanya agaghị abụ ihe ndị kacha anyị mkpa.

20 Ọ dị mma ka anyị na-ele ndị ọzọ ọbịa. (1 Pita 4:9) Anyị chọọ ịkpọ oriri ma ọ bụ chọọ ka anyị na ụmụnna anyị ụfọdụ nọrịa ma tụrụ ndụ, anyị kwesịrị ịkpọkwa ndị ọ na-enweghị ka ọ hà ha. (Luk 14:​12-14) A kpọọ anyị oriri, anyị kwesịrị ịkpa àgwà dị mma. Ọ ga-egosi na anyị na-eme ihe e kwuru na Mak 12:31. Anyị kwesịkwara ikele ndị kpọrọ anyị oriri.

21 Obi na-atọ Ndị Kraịst ụtọ maka ihe ọma Chineke na-emere ha. Obi na-atọkwa ha ụtọ maka na ha nwere ike ‘ịna-eri ihe, ịna-aṅụ ihe ọṅụṅụ, na ịna-ahụ ihe ọma n’ihi ịrụsi ọrụ ike ha niile.’ (Ekli. 3:​12, 13) Ọ bụrụ na onye kpọrọ oriri na ndị ọ kpọrọ oriri emee ihe niile “iji nye Chineke otuto,” obi ga-atọ ha niile ụtọ n’ihi na oriri ahụ emeela ka okwukwe ha sikwuo ike.

IHE NDỊ A NA-EME N’ỤLỌ AKWỤKWỌ

22 Ụmụ Ndịàmà Jehova na-aga ụlọ akwụkwọ praịmarị na nke sekọndrị iji mụta otú e si agụ na otú e si ede ihe. Mgbe ha nọ n’ụlọ akwụkwọ, ha na-achọsi ike ịmụta otú e si ede ihe na otú e si agụ ihe nke ọma. Ihe ndị ọzọ a na-akụziri ha n’ụlọ akwụkwọ ndị a na-enyere ha aka ijekwuru Jehova ozi. N’oge niile ha na-aga akwụkwọ, ha na-agbalịsi ike ka ha ‘cheta Onye Okike Ukwu ha.’ Otú ha si eme ya bụ ibute ihe ndị gbasara ofufe Chineke ụzọ.​—Ekli. 12:1.

23 Ọ bụrụ na ị bụ Onye Kraịst na-eto eto ka na-aga akwụkwọ, kpachara anya ka gị na ndị na-eto eto ibe gị bụ́ ndị ụwa ghara ịna-akpachi anya. (2 Tim. 3:​1, 2) Ebe ọ bụ na Jehova akụzierela anyị ọtụtụ ihe ndị ga-eme ka anyị ghara ịna-akpa àgwà ka ndị ụwa, i kwesịrị ime ike gị niile ka ị ghara ịna-akpa àgwà ka ha. (Ọma 23:4; 91:​1, 2) Ihe ga-enyere gị aka bụ iji ihe ndị Jehova na-akụziri anyị kpọrọ ihe.​—Ọma 23:5.

24 Ọtụtụ ụmụ akwụkwọ bụ́ Ndịàmà Jehova anaghị eso eme ihe ụfọdụ na-esoghị n’ihe a na-amụ n’ụlọ akwụkwọ n’ihi na ha achọghị ka e nwee ihe jikọrọ ha na ụwa. Ndị nkụzi ha ma ọ bụ ụmụ akwụkwọ ibe ha nwere ike ha agaghị aghọta ihe mere na ha anaghị eso eme ihe ndị ahụ. Ma, ihe ka mkpa bụ irubere Chineke isi. Ọ pụtara na ị ga na-eme ihe akọnuche gị e ji Baịbụl zụọ gwara gị. Ị ga-ekpebisikwa ike na ị gaghị eso n’asọmpi egwuregwu ụwa ma ọ bụ na-eme ihe ndị e ji eto mba. (Gal. 5:​19, 26) Ọ bụrụ na ị na-eme ihe ndị mụrụ gị nọ n’ọgbakọ ji Baịbụl na-akụziri gị, gị na ndị na-eme nke ọma n’ọgbakọ ana-akpakwa, ị ga na-eme ihe Jehova chọrọ.

ỌRỤ NA NDỊ ENYI

25 Baịbụl kwuru na ọ bụ ndị isi ezinụlọ ga na-egboro ndị ezinụlọ ha mkpa ha. (1 Tim. 5:8) N’agbanyeghị nke ahụ, ebe ha na-ejere Chineke ozi, ha ma na ha kwesịrị iji ihe ndị metụtara ofufe Chineke kpọrọ ihe karịa ọrụ ha ji akpa afọ ezinụlọ ha. (Mat. 6:33; Rom 11:13) Ọ bụrụ na ha ana-asọpụrụ Chineke, ihe oriri na uwe ndị ha nwere ejukwa ha afọ, ha agaghị na-echegbu onwe ha ma na-achụ ego ka à na-anwụ anwụ.​—1 Tim. 6:​6-10.

26 Ndị Kraịst niile na-arụ ọrụ ha ji akpata ego kwesịrị ịna-akwụwa aka ọtọ otú Baịbụl kwuru. Ọ pụtara na ha ekwesịghị itinye aka n’ihe ọ bụla ga-eme ka ha mebie iwu Chineke ma ọ bụ iwu obodo ha. (Rom 13:​1, 2; 1 Kọr. 6:​9, 10) Anyị ma na mkpakọrịta ọjọọ na-emebi omume ọma. Baịbụl kwuru na anyị bụ ndị agha Kraịst. N’ihi ya, anyị anaghị etinye aka n’ụdị azụmahịa nwere ike ime ka anyị mebie iwu Chineke ma ọ bụ mee ka anyị bụrụ nke ụwa, ma ọ bụkwanụ mebie adịm ná mma anyị na Chineke. (Aịza. 2:4; 2 Tim. 2:4) Anyị na-agbakwa mbọ ka a ghara inwe ihe jikọrọ anyị na okpukpe ụgha, ya bụ, “Babịlọn Ukwu ahụ,” n’ihi na Chineke kpọrọ ya asị.​—Mkpu. 18:​2, 4; 2 Kọr. 6:​14-17.

27 Ọ bụrụ na anyị na-eme ihe Chineke kwuru, anyị agaghị eji oge anyị na ụmụnna anyị ji anọkọ efe Chineke ekwu banyere ihe anyị ji akpata ego ma ọ bụ ihe ọzọ ga-abara naanị anyị uru. Ihe mere anyị ji aga ọmụmụ ihe, mgbakọ sekit, na mgbakọ ukwu bụ ka anyị fee Jehova. A na-akụziri anyị Okwu Chineke n’ebe ndị a, anyị ‘ana-agbarịtakwa ibe anyị ume.’ (Rom 1:​11, 12; Hib. 10:​24, 25) Ọ bụ naanị ihe gbasara ofufe Chineke ka anyị na ụmụnna anyị kwesịrị ịkparịta n’oge ndị ahụ.

ANYỊ NA ỤMỤNNA ANYỊ DỊ N’OTU

28 Jehova chọrọ ka ndị niile na-efe ya “nọgide n’ịdị n’otu nke mmụọ nsọ, n’ihe nkekọ nke bụ́ udo.” (Efe. 4:​1-3) Onye ọ bụla n’ime ha na-achọ ihe ga-abara ndị ọzọ uru, ọ bụghị ihe ga-abara naanị ya uru. (1 Tesa. 5:15) O doro anya na ị hụla na ụmụnna nọ n’ọgbakọ unu na-achọ ihe ga-abara ndị ọzọ uru. N’agbanyeghị agbụrụ anyị si, mba anyị si, ndị anyị bụ, ebe anyị gụruru akwụkwọ ma ọ bụ otú anyị nweruru ego, iwu Chineke bụ maka anyị niile. Ndị ụwa achọpụtadịla na o nweghị ihe dị iche n’etiti onye ukwu na onye nta ná nzukọ Jehova.​—1 Pita 2:12.

29 Pọl onyeozi kwuru ihe ọzọ mere anyị ji dịrị n’otu. Ọ sịrị: “E nwere otu ahụ́, nweekwa otu mmụọ nsọ, ọbụna dị ka a kpọrọ unu n’otu olileanya ahụ nke a kpọrọ unu ka unu nweta; otu Onyenwe anyị, otu okwukwe, otu baptizim; otu Chineke na Nna nke mmadụ niile, onye bụ́ isi nke mmadụ niile na onye na-arụ ọrụ site n’aka mmadụ niile nakwa n’ime mmadụ niile.” (Efe. 4:​4-6) Ọ pụtara na ihe anyị ghọtara n’ihe niile Baịbụl na-akụzi kwesịrị ịbụ otu iji gosi na anyị kwetara na Jehova bụ Ọkaakaa. Nke bụ́ eziokwu bụ na Jehova akụzierela ndị ya asụsụ dị ọcha, ya bụ, eziokwu ndị dị na Baịbụl. Nke a emeekwala ka ha jiri otu obi na-efe ya.​—Zef. 3:9.

30 Otú ọgbakọ Ndị Kraịst si dịrị n’otu na-eme ka obi na-eru ndị niile na-efe Jehova ala. Anyị ahụla otú ihe Jehova kwuru si na-emezu. O kwuru, sị: “M ga-eme ka ha dịrị n’otu, dị ka ìgwè atụrụ nke nọ n’ogige atụrụ.” (Maị. 2:12) Anyị kwesịrị ịna-agba mbọ eme ihe Jehova kwuru ka anyị nwee ike ịnọgide na-adị n’otu.

31 Obi kwesịrị ịdị onye ọ bụla Jehova kpọbatara ná nzukọ ya dị ọcha ụtọ. Aha Jehova a kpọkwasịrị anyị karịrị ihe ọ bụla anyị hapụrụ iji mee uche ya. Ọ bụrụ na anyị chọrọ ka anyị na Jehova nọgide na-adị ná mma, anyị ga-agbalịsi ike na-akpa àgwà otú ọ chọrọ ma na-agwa ndị ọzọ ka ha na-eme otú ahụ.​—2 Kọr. 3:18.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya