Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w95 1/15 p. 4-7
  • Jiri Ndụ nke Bụ Ndụ n’Ezie Kpọrọ Ihe

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Jiri Ndụ nke Bụ Ndụ n’Ezie Kpọrọ Ihe
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ụzọ Na-eduga ná “Ndụ ahụ nke Bụ Ndụ n’Ezie”
  • Ọ Dị Mkpa Iwere Ndụ Anyị nke Ugbu A n’Oké Ihe
  • Iwu Dị Oké Mkpa Banyere Ọbara
  • Iji Ndụ nke Bụ Ndụ n’Ezie Akpọrọ Ihe
  • Ile Ndụ Anya Otú Chineke Si Ele Ya
    Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi?
  • Jiri Ndụ Kpọrọ Ihe
    Gịnị Ka Baịbụl Na-akụziri Anyị?
  • Na-ele Onyinye nke Ndụ E Nyere Gị Anya n’Ụzọ Kwesịrị Ekwesị
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2004
  • Ì Ji Ndụ Kpọrọ Ihe Otú Chineke Ji Ya Kpọrọ Ihe?
    “Nọrọnụ n’Ịhụnanya Chineke”
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
w95 1/15 p. 4-7

Jiri Ndụ nke Bụ Ndụ n’Ezie Kpọrọ Ihe

NDỤ nke a ọ̀ bụ nanị ndụ dịnụ? Site n’ịgba anyị ume ‘ijide ndụ ahụ nke bụ ndụ n’ezie,’ Bible na-egosipụta na e nwere ihe kanụ. (1 Timoti 6:17-19) Ọ bụrụ na ndụ anyị nwere ugbu a abụghị ndụ ahụ nke bụ ndụ n’ezie, gịnị bụ?

Ihe dị gburugburu akụkụ akwụkwọ nsọ e hotara na-egosi na ọ bụ “ndụ ebighị ebi” nke onye na-atụ egwu Chineke kwesịrị ijidesi ike. (1 Timoti 6:12) Nye ihe ka nnọọ n’ọnụ ọgụgụ, nke a pụtara ndụ ebighị ebi n’elu ụwa. Adam, nwoke mbụ, nwere olileanya nke ndụ ebighị ebi n’ụwa paradaịs. (Jenesis 1:26, 27) Ọ ga-anwụ nanị ma o riri site “n’osisi ịma ezi ihe na ihe ọjọọ.” (Jenesis 2:17) Ma n’ihi na Adam na nwunye ya, Iv, ji nnupụisi rie site n’osisi ahụ, Chineke kwupụtara amamikpe nke ọnwụ ahụ. ‘N’ụbọchị ha riri site na ya,’ ha nwụrụ n’anya Chineke ma malite nretọ ha gaa n’ọnwụ nkịtị. Ndụ ha abụkwaghị ụdị nke ha nụworo ụtọ ya na mbụ.

Ụzọ Na-eduga ná “Ndụ ahụ nke Bụ Ndụ n’Ezie”

Iji mee ka “ndụ ahụ nke bụ ndụ n’ezie” kwe omume, Jehova Chineke mere ndokwa ịnapụta ihe a kpọrọ mmadụ. Iji nyere anyị aka ịghọta ndokwa nke a, ka anyị chee echiche banyere otu obere ụlọ ọrụ mmepụta ihe. Ígwè ọrụ nile dị na ya gbachara ọrụ ma na-ewetara ndị ji ha arụ ọrụ nsogbu n’ihi na onye mbụ rụrụ ọrụ ebe ahụ ọtụtụ afọ gara aga leghaara akwụkwọ ntụzi ọrụ nke onye ọrụ ya anya ma mebie ígwè ọrụ nile dị na ya. Ndị ji ha arụ ọrụ taa pụrụ nanị iji ihe ha nwere mee ihe kasị mma ha pụrụ ime. Onye nwe ụlọ ọrụ mmepụta ihe ahụ chọrọ ịrụzi ígwè ọrụ ndị ahụ iji nyere ndị ọrụ ya aka, ọ na-edokọkwa ego dị mkpa n’ihi nzube ahụ.

‘Onye ọrụ ígwè ọrụ’ mbụ, bụ́ Adam, ejighị ndụ e nyeworo ya kpọrọ ihe. N’ihi ya, o bufeere ụmụ ya ndụ na-ezughị okè, nke yiri ígwè ọrụ na-adịghị arụzi ọrụ. (Ndị Rom 5:12) Dị ka ndị ikpeazụ ji ha arụ ọrụ n’ụlọ ọrụ mmepụta ihe ahụ, bụ́ ndị na-apụghị imezi ọnọdụ ahụ, ụmụ Adam enwebeghị ike inwetara onwe ha ndụ ahụ nke bụ ndụ n’ezie. (Abụ Ọma 49:7) Iji dozie ọnọdụ nke a yiri nke olileanya na-adịghị na ya, Jehova zitere Ọkpara ọ mụrụ nanị ya n’ụwa ka ọ zụtaghachi ndụ ebighị ebi maka ihe a kpọrọ mmadụ. (Luk 1:35; 1 Pita 1:18, 19) Site n’ịnwụ ọnwụ ịchụ àjà n’ihi ihe a kpọrọ mmadụ, Ọkpara Chineke mụrụ nanị ya, Jisọs Kraịst, nyere ego a chọrọ—ndụ nke kwekọrọ na nke Adam tụfuru. (Matiu 20:28; 1 Pita 2:22) Site n’àjà nke a dị oké ọnụ ahịa, Jehova nwere ugbu a ihe ndabere maka iweta ndụ ahụ nke bụ ndụ n’ezie.

Nye ihe a kpọrọ mmadụ na-erube isi, àjà mgbapụta Jisọs ga-apụta ndụ agwụghị agwụ n’ụwa paradaịs. (Abụ Ọma 37:29) E setịpụụrụ ndị nile ga-alanarị “agha nke oké ụbọchị ahụ nke Chineke, Onye pụrụ ime ihe nile,” nke a na-akpọ Ha–Magedọn, olileanya nke a. (Mkpughe 16:14-16) Ọ ga-ekpochapụ omume ọjọọ nile n’ụwa. (Abụ Ọma 37:9-11) A ga-akpọlite ndị nọ ná ncheta Chineke bụ́ ndị nwụrụ tupu oge ahụ bịa na Paradaịs e weghachiri n’elu ụwa, ha ga-enwekwa olileanya nke ịnụ ụtọ ndụ nke bụ ndụ n’ezie nke e chekwaara ndị nile na-erubere Chineke isi.—Jọn 5:28, 29.

Ọ Dị Mkpa Iwere Ndụ Anyị nke Ugbu A n’Oké Ihe

Nke a apụtaghị na anyị pụrụ n’izi ezi igosi enweghị nkwanye ùgwù maka ịdị nsọ nke ndụ anyị nwere ugbu a. Onye nwe ụlọ ọrụ mmepụta ihe ahụ ọ̀ ga-emefu oge na ego n’ịrụzi ígwè ọrụ maka onye ọrụ nke na-adịghị elekọta ya anya? Kama nke ahụ, ọ̀ bụ na onye ahụ were ha n’ọrụ agaghị etinye ígwè ọrụ ahụ a rụziri arụzi n’aka onye nke mere ihe nile o nwere ike ime iji lekọta nke ochie?

Ndụ bụ onyinye dị oké ọnụ ahịa site n’aka Jehova. Dị ka isi iyi nke ihe ọma ebe onyinye ahụ sitere, ọ chọrọ ka anyị were ya n’oké ihe. (Abụ Ọma 36:9; Jemes 1:17) N’ikwu banyere nchegbu Jehova maka ndị mmadụ n’elu ala, Jisọs sịrị: “Ọbụna agịrị isi nile nke isi unu ka a gụworo.” (Luk 12:7) Jehova nyere ndị Israel iwu ka ha ghara igbu mmadụ, nke o doro anya na ọ gụnyere egbughị onwe onye. (Ọpụpụ 20:13) Nke a na-enyere anyị aka izere ile igbu onwe onye anya dị ka otu nhọrọ.

Ịmara mmasị ịhụnanya Jehova n’ọdịmma anyị, ndị na-atụ egwu Chineke na-etinye ụkpụrụ Bible n’ọrụ n’omume ndị e nwere n’oge a. Dị ka ihe atụ, n’ihi na a chọrọ ka ezi ndị Kraịst ‘sachapụ n’onwe ha mmerụ nile nke ahụ na nke mmụọ, na-emezu ịdị nsọ n’egwu Chineke,’ ha na-ajụ ụtaba na ọgwụ ndị na-emeghasị uche.—2 Ndị Kọrint 7:1.

Mmasị Chineke ná ndụ mmadụ ka a na-ahụkwu ná ndụmọdụ ya ịnọgide na-enwe “obi a gwọrọ ọrịa ya” na izere omume rụrụ arụ. (Ilu 14:30; Ndị Galetia 5:19-21) Site n’ịrapagide n’ụkpụrụ ndị a dị elu, a na-echebe anyị pụọ n’ihe ndị dị ka ọnụma na-emerụ ahụ na ọrịa ndị a na-ebute site ná mmekọahụ.

Nchegbu Jehova maka ndụ nke ndị ya pụtakwara ìhè n’okwu ịdọ aka ná ntị ya izere iribiga nri ókè na ịṅụbiga mmanya ókè. (Deuterọnọmi 21:18-21; Ilu 23:20, 21) A dọrọ ndị Kraịst aka ná ntị na ndị anyaukwu na ndị aṅụrụma agaghị eketa Alaeze Chineke, ya bụ, ọ dịghị mgbe ha ga-enwe ndụ ahụ nke bụ ndụ n’ezie. (1 Ndị Kọrint 6:9, 10; 1 Pita 4:3) Site n’ịgba ume imeru ihe n’ókè, Jehova na-akụziri anyị ime ihe na-abara anyị onwe anyị uru.—Aịsaịa 48:17.

Mgbe anyị biri ndụ n’ikwekọ n’ụkpụrụ Chineke, anyị na-egosi na anyị ji ndụ anyị nwere ugbu a akpọrọ ihe. Otú ọ dị, ndụ ahụ nke bụ ndụ n’ezie dị mkpa ọbụna karị. Ebe ọ bụ ruo ebighị ebi, ezi ndị Kraịst na-ewere ya n’ihe dị mkpa karịa ndụ ha nwere ugbu a. Mgbe Jisọs Kraịst jiri ndụ ya chụọ àjà, o doro onwe ya n’okpuru uche Jehova. Nrubeisi nye Nna ya pụtara ihe dị nnọọ ukwuu nye ya karịa ndụ ya n’ebe a n’elu ala. Ụzọ Jisọs gbasoro dubara ná mbilite n’ọnwụ ya na na ya ịnata ndụ anwụghị anwụ n’eluigwe. (Ndị Rom 6:9) Ọnwụ ya pụtakwara ndụ ebighị ebi maka ihe a kpọrọ mmadụ na-erube isi ndị na-egosipụta okwukwe n’àjà mgbapụta ya.—Ndị Hibru 5:8, 9; 12:2.

Iwu Dị Oké Mkpa Banyere Ọbara

O kwere nghọta na ndị na-eso ụzọ Jisọs nwere echiche ya. Ha na-achọ ime ihe na-atọ Chineke ụtọ n’ihe nile, ọbụna dị ka Kraịst mere. Otu ihe bụ na nke a na-akọwa ihe mere ha ji ajụ mmịnye ọbara, nke ndị dọkịta ụfọdụ na-akpọ ihe na-azọpụta ndụ. Ka anyị lee ụzọ mmadụ si egosipụta na ya ji ndụ ahụ nke bụ ndụ n’ezie akpọrọ ihe site n’ịjụ mmịnye ọbara.

Dị ka Jisọs Kraịst, ezi ndị Kraịst na-achọ ịnọ ndụ n’anya Chineke, nke na-achọkwa nrubeisi zuru ezu nye Ya. Okwu Chineke na-enye ndị na-eso ụzọ Kraịst iwu, sị: “Unu hapụ ihe nile a chụrụ n’àjà nye arụsị, na ọbara, na anụ a nyagburu anyagbu, na ịkwa iko.” (Ọrụ 15:28, 29) N’ihi gịnị ka e ji tinye iwu nke a banyere ọbara n’iwu ndị ji ndị Kraịst?

Iwu e nyere ndị Israel chọrọ ka e zeere ọbara. (Levitikọs 17:13, 14) Ndị Kraịst anọghị n’okpuru Iwu Mosis. Ma ha ghọtara na iwu ka a ghara iri ọbara bu Iwu ahụ ụzọ; e buwo ụzọ nye ya Noa mgbe Iju Mmiri ahụ gasịrị. (Jenesis 9:3, 4; Ndị Kọlọsi 2:13, 14) Iwu a dịịrị ụmụ nile nke Noa, onye mba nile nọ n’elu ụwa sitere na ya. (Jenesis 10:32) Tinyere nke ahụ, Iwu Mosis na-enyere anyị aka ịhụ ihe mere Chineke ji nọgidesie ike n’ịdị nsọ nke ọbara. Mgbe ọ machibidosịrị ndị Israel iwu iri ọbara nke ụdị ọ bụla, Chineke sịrị: “Ndụ nke anụ ahụ, n’ọbara ka ọ dị: Mụ onwe m enyewokwa unu ya n’elu ebe ịchụàjà ikpuchiri mkpụrụ obi unu mmehie ha: n’ihi na ọbara ka ọ bụ nke na-ekpuchi mmehie n’ime mkpụrụ obi.” (Levitikọs 17:11) Chineke debere ọbara iche maka iji chụọ àjà n’elu ebe ịchụàjà. Iwu ya banyere ịdị nsọ nke ọbara na-ekpughe ikike ya n’ebe ihe nile dị ndụ n’elu ụwa dị. (Ezikiel 18:4; Mkpughe 4:11) Ile ndụ anyị anya site n’ọnọdụ nke Jehova, anyị na-aghọta na ọ bụghị nke anyị kama nanị na Chineke tinyere ya n’aka anyị.

Dị nnọọ ka onye ọrụ ahụ n’ihe atụ anyị ga-ahụ maka ígwè ọrụ ahụ, e tinyere ndụ anyị nwere ugbu a n’aka anyị. Gịnị ka ị ga-eme ma ọ bụrụ na ígwè ọrụ gị chọrọ ndozi, onye mekanik atụọkwa aro idozi ya na-eji akụkụ ndị akwụkwọ ntụzi ọrụ nke onye ọrụ machibidoro kpọmkwem? Ọ̀ bụ na ị gaghị aga chọọ mekanik ndị ọzọ iji hụ ma a pụrụ idozi ígwè ọrụ ahụ n’ikwekọ ná ntụziaka nke akwụkwọ ntụzi ọrụ ahụ? Ndụ mmadụ dị mkpa nke ukwuu dịkwa mgbagwoju anya karịa ígwè ọrụ. N’Okwu ya sitere n’ike mmụọ nsọ, bụ́ akwụkwọ ntụzi ọrụ maka idebe ụmụ mmadụ ndụ, Onye Mere anyị machibidoro iji ọbara na-akwado ndụ anyị iwu. (Deuterọnọmi 32:46, 47; Ndị Filipaị 2:16) Ọ̀ bụ na ezi uche adịghị n’ịrapagide n’ihe ndị a chọrọ n’akwụkwọ ntụzi ọrụ ahụ?

N’ezie, ndị Kraịst na-arịa ọrịa ndị na-asị ka e jiri usoro ọgwụgwọ ọbara na-adịghị ya lekọta ọnọdụ ha adịghị ajụ ọgwụgwọ ọgwụ nile. Nanị ihe ha na-achọ bụ ọgwụgwọ nke ga-egosi nkwanye ùgwù maka ndụ ha—ma nke ugbu a ma nke ọdịnihu. Ndị dọkịta ji obi ike na-akwanyere nguzo ahụ nke ndị Kraịst weere ùgwù na-agba akaebe maka abamuru ndị dị n’ịgwọ ha n’ụzọ kwekọrọ n’arịrịọ ha. “Izute Ndịàmà Jehova dugara m n’usoro ọhụrụ nke ihe ndị e ji akpọrọ ihe,” ka otu dọkịta na-awa ahụ bụ́ onye na-enyebu ndị mmadụ ọbara nke ukwuu kwuru. Ugbu a ọ na-agbalị ịgwọ ọbụna ndị na-abụghị Ndịàmà n’ejighị ọbara.

Iji Ndụ nke Bụ Ndụ n’Ezie Akpọrọ Ihe

Gịnị bụ usoro ọhụrụ nke ihe ndị e ji akpọrọ ihe nke dọkịta a na-awa ahụ chọtara site n’ịgwọ Ndịàmà Jehova? Ugbu a ọ matawo na ịgwọ onye ọrịa gụnyere ọ bụghị nanị akụkụ ahụ nke ọrịa ahụ metụtara kama onye ahụ dum. Ọ̀ bụ na e kwesịghị inye onye ọrịa ohere ịchọ nlekọta kasị mma maka ọdịmma anụ ahụ, ime mmụọ, na mmetụta uche ya?

Nye Kumiko dị afọ 15, mmịnye ọbara iji gwọọ ọrịa leukemia ya na-eweta ọnwụ bụ nhọrọ kasị njọ a pụrụ ime. Ịgbalị ịgbatịkwu ndụ ya site n’ụzọ a ruo izu ole na ole, ọnwa, ma ọ bụ ọbụna afọ erughị ihe ọ ga-emesịa fuo ya. Ebe ọ rarawooro ndụ ya nke ugbu a nye Jehova Chineke dị ka otu n’ime Ndịàmà ya, ọ kwanyeere ịdị nsọ nke ndụ na ọbara ùgwù. Ọ bụ ezie na nna ya na ndị ikwu ya ndị ọzọ megidesiri nguzo ya ike, Kumiko guzosiri ike. Otu oge dọkịta ya jụrụ ya, sị: “Ọ bụrụ na Chineke gị na-agbaghara ọdịda, ọ̀ bụ na ọ gaghị agbaghara gị ọbụna ma ọ bụrụ na ị nakwere mmịnye ọbara?” Kumiko jụrụ ikwenye wee si otú ahụ merụọ ihe ndị dabeere na Bible o kwere na ha. “Ịgagidesi aka ike n’okwu nke ndụ,” o guzogidere n’ebe ọ kwụ. (Ndị Filipaị 2:16, NW) Dị ka nne ya ochie na-ekweghị ekwe kwuru, “Kumiko agaghị agbahapụ okwukwe ya.” N’oge na-adịghị anya àgwà nna ya na nne ya ochie nakwa nke ndị dọkịta na-elekọta ya gbanwere.

Okwukwe siri ike nke Kumiko n’ebe Jehova Chineke nọ, bụ́ onye pụrụ ịkpọlite ya site n’ọnwụ, kpaliri ọtụtụ obi. Ka ọ ka nọ ndụ, ọ rịọrọ nna ya: “Ọbụna ma a sị na mụ anwụọ, a ga-akpọlite m na Paradaịs. Ma ọ bụrụ na e bibie gị na Ha–Magedọn, m gaghị ahụ gị. Ya mere biko mụọ Bible.” Nna ya nọgidere nanị na-asị: “Mgbe ahụ dịrị gị, m ga-amụ ya.” Ma mgbe Kumiko nwụrụ site n’ọrịa ya na-adịghị ala ala, nna ya tinyere n’igbe ozu ya otu ihe o dere nke na-asị: “M ga-ahụ gị na Paradaịs, Kumiko.” Mgbe ememe olili ozu ahụ gasịrị, ọ gwara ndị bịara ememe ahụ okwu wee sị: “Ekwere m Kumiko nkwa na m ga-ahụ ya na Paradaịs. Ọ bụ ezie na enwebeghị m ike ikwere ya n’ihi na amụbeghị ihe otú zuru ezu, ekpebisiri m ike ileba anya na ya. Biko nyerenụ m aka.” Ndị ọzọ nọ n’ezinụlọ ya malitekwara ịmụ Bible.

Kumiko nwere ezi nkwanye ùgwù maka ndụ chọọkwa ịdị ndụ. O nwere ekele maka ihe nile ndị dọkịta ya mere iji zọpụta ndụ ya nke ugbu a. Ma, site n’ime ihe kwekọrọ ná ntụziaka ndị dị n’akwụkwọ ntụzi ọrụ nke Onye Okike ahụ, o gosipụtara na ya ji ndụ ahụ nke bụ ndụ n’ezie kpọrọ ihe. Nye ọtụtụ nde mmadụ, nke ahụ ga-abụ ndụ ebighị ebi na paradaịs elu ụwa. Ị̀ ga-eso n’ime ha?

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya