Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • Ndị Nlekọta A Họpụtara Ka Ha Na-azụ Ìgwè Atụrụ Chineke
    Ndị A Haziri Ime Uche Jehova
    • 5 N’akwụkwọ ozi mbụ Pọl onyeozi degaara Timoti nakwa n’akwụkwọ ozi o degaara Taịtọs, o kwuru ihe nwanna nwoke ga-eme tupu a họpụta ya ịbụ okenye. Baịbụl kwuru na 1 Timoti 3:​1-7, sị: “Ọ bụrụ na onye ọ bụla na-agbalị ka o ruo eru ịbụ onye nlekọta, agụụ ezi ọrụ na-agụ ya. Ya mere, onye nlekọta kwesịrị ịbụ onye a na-apụghị ikwujọ ekwujọ, di nke otu nwunye, onye na-emeru ihe n’ókè, onye uche ya zuru okè, onye na-eme ihe n’usoro, onye na-ele ọbịa, onye ruru eru izi ihe, ọ bụghị onye aṅụrụma nke na-ese okwu, ọ bụghị onye na-eti mmadụ ihe, kama onye nwere ezi uche, ọ bụghị onye nwere mmụọ ịlụ ọgụ, ọ bụghị onye hụrụ ego n’anya, o kwesịrị ịbụ onye na-elekọta ezinụlọ ya nke ọma, onye nwere ụmụ na-edo onwe ha n’okpuru ya, ndị na-eji ihe akpọrọ ihe; (n’ezie, ọ bụrụ na onye ọ bụla amaghị otú ọ ga-esi lekọta ezinụlọ nke ya, olee otú ọ ga-esi lekọta ọgbakọ Chineke?) ọ bụghị onye chegharịrị ọhụrụ, ka o wee ghara ịbụ onye nganga ga-afụli elu, o wee daba n’ikpe a mara Ekwensu. O kwesịkwara ịbụ onye ndị nọ n’èzí na-agbara akaebe dị mma, ka o wee ghara ịdaba ná nkọcha na n’ọnyà Ekwensu.”

  • Ndị Nlekọta A Họpụtara Ka Ha Na-azụ Ìgwè Atụrụ Chineke
    Ndị A Haziri Ime Uche Jehova
    • 7 N’agbanyeghị na ihe Akwụkwọ Nsọ kwuru ụmụnna nwoke ga na-eme tupu a họpụta ha ịbụ okenye abụghị obere ihe, o kwesịghị ime ka ha ghara ịgba mbọ ruo eruo. Ọ bụrụ na ndị okenye ana-akpa àgwà otú Akwụkwọ Nsọ kwuru ka ndị okenye na-akpa, ọ ga-enyere ụmụnna nọ n’ọgbakọ aka, ha ana-akpa àgwà ndị ahụ. Pọl kwuru na ihe mere e ji họpụta ndị okenye ndị a bụ́ “onyinye n’ụdị mmadụ” bụ “iji na-agbazi ndị nsọ, maka ọrụ ije ozi, maka iwuli ahụ́ nke Kraịst elu, ruo mgbe anyị niile ga-adị n’otu n’okwukwe nakwa n’ezi ihe ọmụma banyere Ọkpara  Chineke, ruo mgbe anyị ghọrọ dimkpa, ruo mgbe anyị toruru otú Kraịst toruru.”​—Efe. 4:​8, 12, 13.

Akwukwo Igbo (1984-2025)
Pụọ
Banye
  • Igbo
  • Ziga ya
  • Ịgbanwe Ihe
  • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
  • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
  • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
  • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
  • JW.ORG
  • Banye
Ziga ya