Ka Anyị Kpọọ Ihe Ọjọọ Asị
JEHOVA bụ Chineke dị nsọ. N’oge ochie ọ bụ “Onye Nsọ nke Israel,” n’ihi ya kwa ọ chọrọ ka Israel dị ọcha, na-enweghị ntụpọ. (Abụ Ọma 89:18) Ọ gwara ndị ya ọ họpụtara, sị: “Unu ga-adịkwa nsọ, n’ihi na nsọ ka Mụ onwe m dị.” (Levitikọs 11:45) Onye ọ bụla nke chọrọ ‘ịrịgo n’ugwu Jehova’ aghaghị inwe “ọbụ aka abụọ na-emeghị ihe ọjọọ, na obi dị ọcha.” (Abụ Ọma 24:3, 4) Nke ahụ pụtara ihe karịrị nanị izere omume mmehie. Ọ pụtara “ịkpọ ihe ọjọọ asị.”—Ilu 8:13.
N’ịhụnanya, Jehova nyere iwu ndị sara mbara ka mba Israel nwee ike ịmata na izere ihe ọjọọ. (Ndị Rom 7:7, 12) Iwu ndị a gụnyere ụkpụrụ nduzi ndị siri ike banyere omume ọma. A kọwara ịkwa iko ndị lụrụ di ma ọ bụ nwunye, omume ndina ụdị onwe onye, mmekọahụ nke ndị ikwu, na ndina anụmanụ dị ka ihe ndị na-adịghị nsọ na-emerụ emerụ n’ụzọ ime mmụọ. (Levitikọs 18:23; 20:10-17) E bipụrụ ndị ikpe ime ụdị omume ndị ahụ rụrụ arụ mara ná mba Israel.
Mgbe ọgbakọ ndị Kraịst e tere mmanụ ghọrọ “Israel nke Chineke,” e setịpụụrụ ha ụkpụrụ omume yiri ndị ahụ. (Ndị Galetia 6:16) Ndị Kraịst kwa gaje ‘ịkpọ ajọ ihe asị.’ (Ndị Rom 12:9) Okwu Jehova gwara Israel metụtakwara ha: “Unu ga-adị nsọ; n’ihi na nsọ ka Mụ onwe m dị.” (1 Pita 1:15, 16) Ụdị omume ndị ahụ na-adịghị nsọ dị ka ịkwa iko nile, omume ndina ụdị onwe onye, ndina anụmanụ, na idina onye ikwu agajeghị imetọ ọgbakọ ndị Kraịst. A ga-agụpụ ndị jụrụ ịkwụsị ime ihe ndị dị otú ahụ pụọ n’Alaeze Chineke. (Ndị Rom 1:26, 27; 2:22; 1 Ndị Kọrint 6:9, 10; Ndị Hibru 13:4) Na “mgbe ikpeazụ” ndị a, otu ụkpụrụ ahụ na-emetụta “atụrụ ọzọ” ahụ. (2 Timoti 3:1; Jọn 10:16) N’ihi ya, ndị Kraịst e tere mmanụ na atụrụ ọzọ ahụ mejupụtara ndị dị ọcha, ziri ezi, ndị nwere ike ịza aha Chineke ha dị ka Ndịàmà Jehova.—Aịsaịa 43:10.
Idebe Ọgbakọ Ọcha
N’ụzọ dị iche, ụwa na-agbachi nkịtị n’ụdị nile nke omume rụrụ arụ. Ọ bụ ezie na ezi ndị Kraịst dị iche, ha ekwesịghị ichefu na ọtụtụ ndị na-ejere Jehova ozi ugbu a nọbu n’ụwa. E nwere ọtụtụ, ndị tupu ha mara banyere Chineke anyị dị nsọ, ahụghị ihe ọ bụla mere ha ga-eji ghara imejụ ọchịchọ na echiche efu nke anụ ahụ ha dara ada, na-atụrụgharị ná “njubiga ókè nke ndụ ịla n’iyi.” (1 Pita 4:4) Pọl onyeozi, mgbe ọ kọwasịrị omume ndị na-asọ oyi nke ndị mba ọzọ rụrụ arụ, kwuru, sị: “Otú a ka ụfọdụ n’etiti unu dịkwarịị.” Ma, ọ gara n’ihu kwuo, sị: “Ma unu sachara onwe unu, ma e doro unu nsọ, ma a gụrụ unu ná ndị ezi omume n’aha Onyenwe anyị Jisọs Kraịst, ya na n’ime Mmụọ nke Chineke anyị.”—1 Ndị Kọrint 6:11.
Lee okwu na-akasi obi nke ahụ bụ! N’agbanyeghị ihe mmadụ meburu ná ndụ, ọ na-agbanwe mgbe ozi ọma ahụ dị ebube banyere Kraịst nwere mmetụta n’obi ya. Ọ na-egosipụta okwukwe ma na-arara onwe ya nye Jehova Chineke. Malite mgbe ahụ gaa n’ihu ọ na-ebi ndụ omume dị ọcha, nke a sachara n’anya Chineke. (Ndị Hibru 9:14) A na-agbaghara mmehie ndị o mere na mbụ, ọ pụkwara ‘isetipụ aka n’ebe ihe nile dị n’ihu dị.’a—Ndị Filipaị 3:13, 14; Ndị Rom 4:7, 8.
Jehova gbaghaara Devid nwere nchegharị maka igbu ọchụ na ịkwa iko, Ọ gbagharakwaara Manase nwere nchegharị maka ikpere arụsị rụrụ arụ na oké mwụfu ọbara. (2 Samuel 12:9, 13; 2 Ihe Emere 33:2-6, 10-13) Anyị pụrụ inwe ekele n’ezie na ọ dị njikere ịgbagharakwara anyị ma ọ bụrụ na anyị echegharịa ma jiri obi eziokwu na ịdị umeala n’obi bịakwute ya. Ma, n’agbanyeghị na Jehova gbaghaara Devid na Manase, ndị ikom abụọ a—ha na ndị Israel—aghaghị ịnagide ihe ndị si n’omume mmehie ha pụta. (2 Samuel 12:11, 12; Jeremaịa 15:3-5) N’ụzọ yiri nke ahụ, ọ bụ ezie na Jehova na-agbaghara ndị mmehie nwere nchegharị, a pụrụ inwe ihe ndị a na-apụghị izere ezere si n’omume ha pụta.
Ihe Ndị A Na-apụghị Izere Ezere Si na Ya Pụta
Dị ka ihe atụ, nwoke na-ebi ndụ ịla n’iyi nke omume rụrụ arụ wee bute ọrịa AIDS pụrụ ịnakwere eziokwu ahụ ma gbanwee ndụ ya ruo n’ókè nke nraranye na baptism. Ugbu a ọ bụ onye Kraịst dị ọcha n’ụzọ ime mmụọ nke so Chineke na-enwe mmekọrịta ma nwee olileanya dị ebube maka ọdịnihu; ma ọ ka bu ọrịa AIDS. Ọ pụrụ imesịa nwụọ n’ihi ọrịa ahụ, ihe dị mwute ma bụrụ nke a na-apụghị ịgbanahụ agbanahụ si n’àgwà ya mbụ pụta. Nye ụfọdụ ndị Kraịst, mmetụta nke omume rụrụ arụ dị oké njọ e mere na mbụ pụrụ ịdịgide n’ụzọ ndị ọzọ. Ruo ọtụtụ afọ mgbe ha mesịrị baptism, ikekwe n’ihe fọdụrụ ná ndụ ha n’ime usoro ihe a, ha pụrụ ịdị na-alụso mkpali ndị ha na-enwe n’anụ ahụ ha ịlaghachi n’ụdị ndụ omume rụrụ arụ mbụ ha ọgụ. Site n’enyemaka nke mmụọ Jehova, ọtụtụ na-enwe ike iguzogide ya. Ma ha aghaghị ịdị na-ebu agha mgbe nile.—Ndị Galetia 5:16, 17.
Ndị dị otú ahụ adịghị emehie ma ọ bụrụhaala na ha na-achịkwa mkpali ha. Ma ọ bụrụ na ha bụ ụmụ nwoke, ha pụrụ iji amamihe kpebie ịghara ‘iru eru’ maka ibu ọrụ n’ime ọgbakọ mgbe ha ka ga na-agbaso mkpali anụ ahụ ndị siri ike mgba. (1 Timoti 3:1, NW) N’ihi gịnị? N’ihi na ha maara ntụkwasị obi nke ọgbakọ na-enwe n’ebe ndị okenye nọ. (Aịsaịa 32:1, 2; Ndị Hibru 13:17) Ha maara na a na-akpọtụrụ ndị okenye n’ọtụtụ okwu dịịrị onwe onye, ha aghaghịkwa ime ihe banyere ọnọdụ ndị chọrọ akọ. Ọ gaghị abụ ihe ịhụnanya, amamihe, ma ọ bụ ezi uche dị na ya nye onye nọ na-alụso ọchịchọ anụ ahụ ndị na-adịghị ọcha ọgụ mgbe nile iru eru maka ọnọdụ ibu ọrụ dị otú ahụ.—Ilu 14:16; Jọn 15:12, 13; Ndị Rom 12:1.
Nye nwoke bụ onye na-emetọ ụmụaka tupu e mee ya baptism, a pụrụ inwe ihe ọzọ ga-esi na ya pụta. Mgbe ọ mụtara eziokwu, ọ na-echegharị ma chigharịa, n’ewebataghị mmehie obi ọjọọ ahụ n’ime ọgbakọ. Ọ pụrụ inwe ọganihu dị mma mgbe ọ gasịrị, na-emeri ọchịchọ ọjọọ ya nile kpam kpam, ọbụnakwa chọọ ‘iru eru’ maka ọnọdụ ibu ọrụ n’ime ọgbakọ. Otú ọ dị, gịnị ma ọ bụrụ na ọ dị mkpa na ọ ka ga-ebi ndụ iji hichapụ aha ọjọọ o nwere n’ógbè ahụ dị ka onye na-emetọbu ụmụaka? Ọ̀ ga-abụ “onye a na-adịghị akalu, . . . [nwee] àmà dị mma site n’ọnụ ndị nọ n’èzí . . . [bụrụ] onye a na-apụghị ibo ebubo”? (1 Timoti 3:1-7, 10; Taịtọs 1:7) Ee e, ọ gaghị abụ. N’ihi ya, ọ gaghị eru eru maka ihe ùgwù ọgbakọ.
Mgbe Onye Kraịst Raara Onwe Ya Nye Mehiere
Jehova na-aghọta na anyị adịghị ike nakwa na ọbụna mgbe anyị mesịrị baptism anyị pụrụ ịdaba ná mmehie. Jọn onyeozi degaara ndị Kraịst n’ụbọchị ya, sị: “Ihe ndị a ka m na-edegara unu n’akwụkwọ, ka unu wee ghara imehie. Ọ bụrụkwa na onye ọ bụla emehie, anyị nwere otu Onye na-ekwu ọnụ anyị n’ebe Nna anyị nọ, Ya bụ Jisọs Kraịst, bụ́ Onye ezi omume: Ya onwe ya bụkwa ihe ịjụrụ Chineke obi banyere mmehie nile anyị; ma Ọ bụghị ihe ịjụrụ Ya obi banyere nanị mmehie nke anyị onwe anyị, kama Ọ bụkwa ihe ịjụrụ Ya obi banyere mmehie nke ụwa dum.” (1 Jọn 2:1, 2) Ee, dabere n’àjà Jisọs, Jehova ga-agbaghara ndị Kraịst e mere baptism bụ́ ndị dabara ná mmehie—ma ọ bụrụ na ha echegharịa n’ezie ma hapụ ụzọ ọjọọ ha.
A hụrụ ihe atụ nke a n’ọgbakọ narị afọ mbụ dị na Kọrint. Pọl onyeozi nụrụ okwu banyere ịkwa iko nke ndị ikwu n’ọgbakọ ahụ e guzobere ọhụrụ, o nyekwara ntụziaka ka a chụpụ nwoke mere ya. Ka oge na-aga, onye mmehie ahụ chegharịrị, Pọl gbakwara ọgbakọ ahụ ume ịnabataghachi ya. (1 Ndị Kọrint 5:1, 13; 2 Ndị Kọrint 2:5-9) N’ụzọ dị otú a, site n’ike ịgwọ ọrịa nke ebere ịhụnanya Jehova na oké ọnụ ahịa nke àjà mgbapụta Jisọs, e mere ka nwoke ahụ dị ọcha pụọ ná mmehie ya. Ihe ndị yiri ya pụrụ ime taa. Otú ọ dị, ọzọkwa, a sịgodị na onye e mere baptism nke mere oké ihe ọjọọ echegharịa ma bụrụ onye a gbaghaara n’anya Jehova, a ka pụrụ inwe ihe ndị na-aga n’ihu si ná mmehie ya pụta.—Ilu 10:16, 17; Ndị Galetia 6:7.
Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na nwa agbọghọ raara onwe ya nye akwaa iko, ọ pụrụ inwe oké mwute maka omume ya, n’ikpeazụkwa bụrụ onye e weghachitere n’ahụ ike ime mmụọ site n’enyemaka nke ọgbakọ. Ma gịnị ma ọ bụrụ na ọ dị ime n’ihi omume rụrụ arụ ya? Mgbe ahụ ihe o mere agbanweela ndụ ya dum n’ụzọ a na-apụghị ịgbanahụ agbanahụ. Nwoke lụrụ nwanyị ma kwaa iko pụrụ ichegharị ma ghara ịbụ onye a chụpụrụ. Ma nwunye ya aka ya dị ọcha nwere ihe ndabere Akwụkwọ Nsọ iji gbaa ya alụkwaghịm, ọ pụkwara ikpebi ime otú ahụ. (Matiu 19:9) Ọ bụrụ na o mee otú ahụ, nwoke ahụ, ọ bụ ezie na Jehova agbagharawo ya, ga-ebi ndụ ya nile fọdụrụnụ na-enwe ihe a siri ike si ná mmehie ya pụta.—1 Jọn 1:9.
Gịnị banyere nwoke gbara nwunye ya alụkwaghịm n’ụzọ enweghị ịhụnanya iji lụọ nwanyị ọzọ? Ikekwe ọ ga-emesịa chegharịa ma bụrụ onye a nabataghachiri n’ọgbakọ. Ka ọtụtụ afọ na-aga ọ pụrụ inwe ọganihu ma “ruo ntozu okè.” (Ndị Hibru 6:1) Ma ọ bụrụhaala na nwunye ya mbụ dị ndụ n’enweghị di, ọ gaghị eru eru ije ozi n’ọnọdụ ibu ọrụ n’ime ọgbakọ. Ọ bụghị “di nke otu nwanyị” n’ihi na o nweghị ndabere Akwụkwọ Nsọ iji gbaa nwunye ya mbụ alụkwaghịm.—1 Timoti 3:2, 12.
Ọ̀ bụ ihe ndị a abụghị oké ihe ndị mere onye Kraịst kwesịrị iji zụlite ịkpọasị maka ihe ọjọọ?
Olee Banyere Onye Na-emetọ Ụmụaka?
Gịnị ma ọ bụrụ na onye Kraịst e mere baptism nke toworo eto emetọọ nwatakịrị n’ụzọ mmekọahụ? Onye mmehie ahụ ọ̀ bụ onye ọjọọ nke na Jehova agaghị agbaghara ya ma ọlị? Ọ bụchaghị otú ahụ. Jisọs kwuru na a pụghị ịgbaghara ‘ikwulu Mmụọ Nsọ.’ Pọl kwukwara na àjà a ga-achụ banyere mmehie afọdụghị maka onye weere ọchịchọ obi na-anọ ná mmehie n’agbanyeghị ịma eziokwu ahụ. (Luk 12:10; Ndị Hibru 10:26, 27) Ma ọ dịghị ebe ọ bụla Bible na-ekwu na a pụghị ịgbaghara onye Kraịst toworo eto nke metọrọ nwatakịrị n’ụzọ mmekọahụ—ma ọ bụ n’ụzọ idina onye ikwu ma ọ bụ n’ụzọ ọzọ. N’ezie, a pụrụ ịsachapụ mmehie ya ma ọ bụrụ na o chegharịa n’ezie site n’obi ma gbanwee àgwà ya. Otú ọ dị, ọ ka pụrụ ịnọgide na-agbaso ọchịchọ anụ ahụ na-ezighị ezi ndị ọ zụlitere mgba. (Ndị Efesọs 1:7) A pụkwara inwe ihe ndị ga-esi na ya pụta ndị ọ na-apụghị izere.
Dabere n’iwu dị n’ala ebe o bi, onye mmetọ ahụ pụrụ nnọọ ije mkpọrọ ma ọ bụ nweta mmachibido ndị ọzọ site n’aka ndị ọchịchị. Ọgbakọ agaghị echebe ya pụọ na nke a. Ọzọkwa, nwoke ahụ egosipụtawo adịghị ike siri ike, a ghaghịkwa iburu ya n’uche si mgbe ahụ gaa n’ihu. Ọ bụrụ na o yie ka o nwere nchegharị, a ga-agba ya ume inwe ọganihu ime mmụọ, ikere òkè n’ozi ubi, ọbụna inwe ihe omume n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke na akụkụ ndị na-abụghị nke izi ihe ná Nzukọ Ije Ozi. Otú ọ dị, nke a apụtaghị na ọ ga-eru eru ije ozi n’ọnọdụ ibu ọrụ n’ọgbakọ. Olee ihe ndị dabeere n’Akwụkwọ Nsọ kpatara nke a?
Otu ihe bụ na onye okenye aghaghị ịbụ “onye na-ejidesi onwe ya ike.” (Taịtọs 1:8) N’eziokwu, ọ dịghị onye ọ bụla n’ime anyị nwere njide onwe onye zuru okè. (Ndị Rom 7:21-25) Ma onye Kraịst toworo eto nke rarawooro onwe ya nye nke dabara ná mmehie nke mmetọ nwatakịrị n’ụzọ mmekọahụ na-egosipụta adịghị ike anụ ahụ na-ekwekọghị n’okike. Ahụmahụ egosiwo na ụdị onye ahụ toworo eto pụkwara imetọ ụmụaka ndị ọzọ. N’eziokwu, ọ bụghị onye ọ bụla metọrọ nwatakịrị na-emeghachi mmehie ahụ ọzọ, ma ọtụtụ na-eme. Ọgbakọ apụghịkwa inyocha obi iji kwuo onye pụrụ na onye na-apụghị imetọ ụmụaka ọzọ. (Jeremaịa 17:9) N’ihi ya, ndụmọdụ Pọl nyere Timoti na-enwe mmetụta pụrụ iche n’okwu banyere ndị toworo eto e mere baptism bụ́ ndị metọworo ụmụaka: “Ebikwasịla onye ọ bụla aka n’isi ọsọ ọsọ, esokwala ndị ọzọ nwekọọ mmehie ha.” (1 Timoti 5:22) Iji chebe ụmụ anyị, onye a maara na o metọwo ụmụaka erughị eru maka ọnọdụ ibu ọrụ n’ime ọgbakọ. Ọzọkwa, ọ pụghị ịbụ onye ọsụ ụzọ ma ọ bụ jee ozi n’ozi oge nile ọzọ pụrụ iche.—Tụlee ụkpụrụ dị n’Ọpụpụ 21:28, 29.
Ụfọdụ pụrụ ịjụ, sị, ‘Ọ̀ bụ na ụfọdụ emebeghị ụdị mmehie ndị ọzọ ma nwee nchegharị dị ka a pụrụ ịhụ, nanị imeghachi mmehie ha mgbe e mesịrị?’ Ee, nke ahụ emewo, ma e nwere ihe ndị ọzọ a ga-atụle. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na mmadụ emesoo onye ọzọ toworo eto omume na-atụ aro omume rụrụ arụ, onye ahụ toworo eto kwesịrị inwe ike ịjụ mmeso ya. Ọ dị nnọọ mfe karị ịghọgbu, itigharị anya, ma ọ bụ imenye ụmụaka ụjọ. Bible na-ekwu banyere enweghị amamihe nke nwatakịrị. (Ilu 22:15; 1 Ndị Kọrint 13:11) Jisọs ji ụmụaka mee ihe atụ nke amaghị ihe ọjọọ. (Matiu 18:4; Luk 18:16, 17) Amaghị ihe ọjọọ nke nwatakịrị gụnyere enweghị ahụmahụ ma ọlị. Ihe ka ọtụtụ n’ụmụaka nwere obi eziokwu, ọchịchọ imenye obi ụtọ, ma si otú a bụrụ ndị e kpughere nye mmetọ site n’aka onye toworo eto ha maara ma tụkwasị obi. N’ihi ya, ọgbakọ nwere ibu ọrụ n’ihu Jehova ichebe ụmụaka ya.
Ụmụaka a zụrụ nke ọma na-amụta irube isi na ịsọpụrụ ndị mụrụ ha, ndị okenye, na ndị ọzọ toworo eto. (Ndị Efesọs 6:1, 2; 1 Timoti 5:1, 2; Ndị Hibru 13:7) Ọ ga-abụ mmerụ na-awụ akpata oyi n’ahụ ma ọ bụrụ na otu n’ime ndị a a na-elekwasị anya gaje iji ntụkwasị obi si n’obi dị ọcha nke nwatakịrị mee ihe n’ụzọ na-ezighị ezi iji rata ma ọ bụ manye ya ikweta ime omume mmekọahụ. Ndị e siworo n’ụzọ dị otú a metọọ n’ụzọ mmekọahụ na-agbakarị mgba ruo ọtụtụ afọ iji merie ihe mgbu mmetụta uche ọ na-arụpụta. N’ihi ya, onye na-emetọ ụmụaka ga-enweta ịdọ aka ná ntị siri ike na ihe mgbochi nke ọgbakọ. Ọ bụghị ọkwá ya dị ka onye e lekwasịrị anya kwesịrị ịbụ isi ihe, kama nke ahụ, ịdị ọcha n’enweghị ntụpọ nke ọgbakọ.—1 Ndị Kọrint 5:6; 2 Pita 3:14.
Ọ bụrụ na onye na-emetọ ụmụaka echegharịa n’obi eziokwu, ọ ga-aghọta amamihe dị n’itinye ụkpụrụ Bible n’ọrụ. Ọ bụrụ na ọ mụta ịkpọ ihe ọjọọ asị n’ezie, ọ ga-asọ ihe o mere oyi ma gbaa mgba izere imeghachi mmehie ya. (Ilu 8:13; Ndị Rom 12:9) Ọzọ, ọ ga-ekele Jehova n’ezie maka ịdị ukwuu nke ịhụnanya Ya, nke ọ bụ n’ihi ya ka onye mmehie nwere nchegharị, dị ka ya, ka pụrụ ife Chineke anyị dị nsọ ma nwee olileanya iso ná “ndị ziri ezi” ga-ebi n’elu ala ruo mgbe ebighị ebi.—Ilu 2:21.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Lee “Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ” ná mbipụta Ụlọ Nche nke May 1, 1996.
[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 28]
Ọ bụ ezie na Jehova na-agbaghara ndị mmehie nwere nchegharị, a pụrụ inwe ihe ndị a na-apụghị izere ezere si n’omume ha pụta