-
Ì So ‘Ụzọ Ịhụnanya Kasị Mma’?Ụlọ Nche—2009 | Julaị 15
-
-
E nweghị onye obi na-anaghị atọ ụtọ ịnọ n’ezinụlọ mmadụ niile hụrụ ibe ha n’anya ma dịrị n’otu! Stor·geʹ bụ okwu Grik a naara ejikarị akọwa ịhụnanya e bu pụta ụwa ndị mmadụ na-ahụ ndị ezinụlọ ha. Ndị Kraịst na-ahụ ndị ezinụlọ ha n’anya. Pọl buru amụma na n’oge ikpeazụ, ndị mmadụ ‘agaghị enwe obi mmadụ.’b—2 Tim. 3:1, 3.
N’ụwa taa, ọ dị mwute na ezigbo ịhụnanya nke kwesịrị ịdị n’ezinụlọ adịghịzi. Olee ihe mere ọtụtụ ndị gaara abụ nne ji ete ime? Gịnị mere ọtụtụ ezinụlọ ji eleghara ndị nne na nna ha merela agadi anya? Olee ihe mere ọnụ ọgụgụ ndị na-agba alụkwaghịm ji ebukwu ibu? Azịza ha bụ́, Enweghị obi mmadụ.
-
-
Ì So ‘Ụzọ Ịhụnanya Kasị Mma’?Ụlọ Nche—2009 | Julaị 15
-
-
b “Enweghị obi mmadụ” bụ ụdị ọzọ e si sụgharịa stor·geʹ. Ọ bụrụ na e tinye a, nke pụtara “enweghị,” n’azụ stor·geʹ, ọ pụtara “enweghị obi mmadụ.”—Gụọkwa Ndị Rom 1:31.
-