Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w94 4/15 p. 13-18
  • Na-ejegharịnụ Dị Ka Ndị Chineke Ziri Ihe

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Na-ejegharịnụ Dị Ka Ndị Chineke Ziri Ihe
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ndị E Ziri Ihe Ha Ritekwa Uru
  • Ozizi Na-abara Ndị Òtù Ezinụlọ Uru
  • Ozizi Dị Mma
  • Izi Ihe Na-enye Aka Maka Oge Anyị Dị Oké Egwu
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
  • Mmekọahụ—Olee Ndụmọdụ nke Dị Irè n’Ezie?
    Obi Ụtọ—Ụzọ E Si Enweta Ya
  • Ò Nwere Ihe Dị Njọ n’Inwe Mmekọahụ Tupu Alụmdi na Nwunye?
    Teta!—2004
  • Olee Otú M Pụrụ Isi Zere Mmekọahụ Tupu Alụmdi na Nwunye?
    Teta!—2004
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
w94 4/15 p. 13-18

Na-ejegharịnụ Dị Ka Ndị Chineke Ziri Ihe

“Ka anyị rịgoruo ugwu Jehova . . . Ọ ga-ezikwa anyị ụzọ Ya ụfọdụ, anyị ga-ejekwa ije n’okporo ụzọ Ya nile.”​—⁠MAỊKA 4:2.

1. Dị ka Maịka kwuru, gịnị ka Chineke ga-emere ndị ya na mgbe ikpeazụ?

ONYE amụma Chineke bụ́ Maịka buru amụma na “n’ikpeazụ nke ụbọchị ndị a,” bụ́ oge anyị, ọtụtụ ndị ga-achọsi Chineke ike, iji fee ya ofufe. Ndị a ga-agbarịta ibe ha ume, na-asị: “Ka anyị rịgoruo ugwu Jehova . . . Ọ ga-ezikwa anyị ụzọ Ya ụfọdụ, anyị ga-ejekwa ije n’okporo ụzọ Ya nile.”​—⁠Maịka 4:​1, 2.

2, 3. Olee otú e si na-emezu amụma Pọl banyere ndị mmadụ ịbụ ndị na-ahụ ego n’anya taa?

2 Ọmụmụ ihe anyị nke 2 Timoti 3:​1-⁠5 pụrụ inyere anyị aka ịhụ ihe ndị ịbụ onye Chineke ziri ihe na “mgbe ikpeazụ” na-arụpụta. N’isiokwu bu ụzọ, anyị malitere ịrịba ama uru na-abịara ndị buuru ịdọ aka ná ntị Pọl n’obi ịghara ịbụ ndị “na-ahụ nanị onwe ha n’anya.” Pọl gbakwụnyere na n’oge anyị ụmụ mmadụ ga-abụkwa “ndị na-ahụ ego n’anya.”

3 Ọ dịghị onye akara ugo mmụta mahadum n’ihe ọmụmụ akụkọ ihe mere eme nke oge a dị mkpa iji ghọta otú nke ahụ si akọwa oge anyị n’ụzọ dị mma. Ị̀ gụbeghị banyere ndị na-ebinye ndị mmadụ ego na ndị isi ụlọ azụmahịa, bụ́ ndị inweta ọtụtụ nde naira kwa afọ na-adịghị eju afọ? Ndị a hụrụ ego n’anya ka na-achọ inwetakwu, ọbụna site n’ụzọ megidere iwu. Okwu Pọl kwesịkwara ọtụtụ ndị, ndị ọ bụ ezie na ha abaghị ọgaranya, nwere nnọọ anyaukwu dị otú ahụ, afọ adịghị eju ha eju. Ị pụrụ ịma ọtụtụ ndị dị otú ahụ n’ógbè unu.

4-6. Olee otú Bible si enyere ndị Kraịst aka izere ịghọ ndị na-ahụ ego n’anya?

4 Ihe Pọl kpọtụrụ aha ọ̀ bụ akụkụ nke ọdịdị mmadụ nke a na-apụghị izere ezere? Ọ bụghị otú ahụ dị ka ihe Onye Chepụtara ihe e dere na Bible kwuru, bụ́ onye kwuru eziokwu a n’ogologo oge gara aga, sị: “Ịhụ ego n’anya bụ mkpọrọgwụ nke ihe ọjọọ nile dị iche iche: nke ụfọdụ na-agbasosi ike, e wee duhie ha n’okwukwe anyị, ha werekwa ọtụtụ ihe mgbu dụpuo onwe ha.” Rịba ama, Chineke asịghị, ‘Ego bụ mkpọrọgwụ nke ihe ọjọọ nile dị iche iche.’ Ọ sịrị na ọ bụ “ịhụ ego n’anya.”​—⁠1 Timoti 6:10.

5 N’ụzọ na-adọrọ mmasị, ihe dị gburugburu okwu Pọl na-egosi na ụfọdụ ezi ndị Kraịst na narị afọ mbụ bara ọgaranya n’ime usoro ihe dị ugbu a, ma hà ketara akụ̀ na ụba ma ọ bụ na hà kpatara ya. (1 Timoti 6:17) Mgbe ahụ, o kwesịrị ido anya na n’agbanyeghị ọnọdụ anyị n’ihe banyere ego, Bible na-adọ anyị aka ná ntị banyere ihe ize ndụ nke ịghọ onye nwere ịhụnanya ego. Bible ò zikwuru ozizi na-enye aka banyere izere ntụpọ nke a dị njọ na nke a na-ahụ n’ebe nile? N’ezie ọ na-ezi, dị ka nke a na-ahụ n’Ozizi Elu Ugwu nke Jisọs. A maara amamihe ya n’ụwa nile. Rịba ama, dị ka ihe atụ, ihe Jisọs kwuru na Matiu 6:​26-⁠33.

6 Dị ka e dekọrọ na Luk 12:​15-⁠21, Jisọs kwuru banyere otu ọgaranya, bụ́ onye nọgidere na-agbalị ịkpakọtakwu akụ̀ na ụba ma bụrụ onye tụfuru ndụ ya na mberede. Gịnị bụ isi ihe Jisọs na-ekwu? O kwuru, sị: “Debekwanụ onwe unu ka unu ghara inwe anyaukwu ọ bụla: n’ihi na ọ bụghị n’ihe o nwebigara ókè ka ndụ mmadụ dị, o sighị n’ihe o nwere pụta.” Tinyere inye ndụmọdụ dị otú ahụ, Bible na-akatọ ịdị umengwụ ma na-ekwusi okwu ike banyere abamuru nke ọrụ e ji obi eziokwu rụọ. (1 Ndị Tesalọnaịka 4:​11, 12) Oo, ụfọdụ ndị pụrụ ịrụ ụka na ozizi ndị dị otú ahụ ekwesịghị oge anyị​—⁠ma ha kwesịrị ya, ha na-arụkwa ọrụ.

Ndị E Ziri Ihe Ha Ritekwa Uru

7. Olee ihe mere anyị ga-eji nwee obi ike na anyị pụrụ inwe ihe ịga nke ọma n’itinye ndụmọdụ Bible n’ọrụ banyere akụ̀ na ụba?

7 N’ọtụtụ mba, ị ga-achọta ihe atụ ndị dị adị nke ndị ikom na ndị inyom sitere n’ọha mmadụ nile na ọnọdụ akụ̀ na ụba nile, bụ́ ndị tinyeworo ụkpụrụ Chineke ndị a n’ọrụ. Ha abaworo onwe ha na ezinụlọ ha uru, ọbụna dị ka ndị nọ n’èzí pụrụ ịhụ. Dị ka ihe atụ, n’akwụkwọ bụ́ Religious Movements in Contemporary America, nke onye na-ebipụtara Princeton University akwụkwọ, bụ́ onye ọkà n’ihe ọmụmụ nke agbụrụ ihe a kpọrọ mmadụ, dere, sị: “N’akwụkwọ dị iche iche nke [Ndịàmà] na n’okwu ha na-ekwu n’ọgbakọ ha a na-echetara ha na ha adịghị adabere n’ụgbọ ala ọhụrụ, uwe ndị dara oké ọnụ ahịa, ma ọ bụ ibi ndụ okomoko maka ọnọdụ ha ná ndụ. N’otu oge ahụ Onyeàmà ga-eji obi eziokwu rụọrọ onye were ya n’ọrụ ọrụ [ma] na-eme ihe n’eziokwu n’ụzọ nile . . . Àgwà ndị dị otú ahụ na-eme ka ọbụna onye na-enweghị ọtụtụ nkà baa uru dị ka onye e were n’ọrụ, ụfọdụ Ndịàmà n’ebe Ugwu Philadelphia [U.S.A.] arịgowo n’ọkwá ọrụ ndị nwere ùgwù.” N’ụzọ doro anya, e mewo ka ndị nakwerewooro ozizi n’ọnụ Chineke site n’Okwu ya mụrụ anya maka àgwà ndị na-eme ka o sie ike karị iche ọnọdụ ndị e nwere ugbu a ihu. Ahụmahụ ha dị iche iche na-egosi na ozizi Bible na-eduga ná ndụ ka mma, nke dị obi ụtọ karị.

8. N’ihi gịnị ka a pụrụ iji jikọta “ndị mpako,” “ndị a fụliworo elu,” na “ndị nkwulu,” gịnịkwa ka okwu atọ ndị a pụtara?

8 Anyị pụrụ ijikọta ihe atọ ndị ọzọ Pọl depụtara. Na mgbe ikpeazụ, mmadụ ga-abụ “ndị na-anya isi, ndị mpako, ndị nkwulu.” Atọ ndị a eyighị, ma ha nile nwere ihe jikọtara ha na mpako. Nke mbụ bụ “ndị na-anya isi.” Otu akwụkwọ ọkọwa okwu na-agwa anyị na okwu Grik bụ́ isi ebe a pụtara: “‘Onye na-ebuli onwe ya elu karịa otú ọ dị,’ ma ọ bụ ‘na-ekwe nkwa karịa ihe ọ pụrụ ime.’” Ị pụrụ ịghọta ihe mere ụfọdụ Bible ji eji okwu ahụ bụ́ “ịnya isi” na-eme ihe. Ọzọ bụ “ndị mpako,” ma ọ bụ n’ụzọ nkịtị “ime ka onye ka ndị ọzọ.” Nke ikpeazụ, “ndị nkwulu.” Ụfọdụ pụrụ iche banyere ndị nkwulu dị ka ndị na-ekwu okwu banyere Chineke n’ụzọ nsọpụrụ na-adịghị, ma isi ihe dị n’okwu ahụ na-agụnye okwu na-emerụ ahụ, nke na-emebi aha, ma ọ bụ nke mkparị megide ụmụ mmadụ. Ya mere Pọl na-ezo aka ná nkwulu megide ma Chineke ma mmadụ.

9. N’ụzọ megidere àgwà ndị na-emerụ ahụ juru ebe nile, àgwà ndị dị aṅaa ka Bible na-agba ndị mmadụ ume ịzụlite?

9 Olee mmetụta ị na-enwe mgbe ị nọ n’ebe ndị mmadụ nọ, bụ́ ndị kwekọrọ ná nkọwa Pọl, ma hà bụ ndị ọrụ ibe gị, ụmụ akwụkwọ ibe gị, ma ọ bụ ndị ikwu? Ọ̀ na-eme ka ndụ dịrị gị mfe karị? Ka ndị dị otú ahụ hà na-eme ka ndụ siere gị ike, na-eme ka o sikwuoro gị ike ịgba mgba megide oge anyị? Ma, Okwu Chineke na-akụziri anyị ịjụ àgwà ndị a, na-ezi ozizi dị ka nke a na-achọta ná 1 Ndị Kọrint 4:7; Ndị Kọlọsi 3:​12, 13; na Ndị Efesọs 4:29.

10. Gịnị na-egosi na ndị Jehova na-erite uru site n’ịnakwere ozizi Bible?

10 Ọ bụ ezie na ndị Kraịst ezughị okè, itinye ozizi ọma ndị a n’ọrụ na-enyere ha aka nke ukwuu n’oge ndị a dị oké egwu. Magazin Itali bụ́ La Civiltà Cattolica kwuru na otu ihe mere Ndịàmà Jehova ji nọgide na-eto “bụ na òtù ahụ na-enye ndị òtù ya ihe ejimara doro anya na nke siri ike.” Ma, site n’ikwu “ihe ejimara siri ike,” ihe onye edemede ahụ na-ekwu ọ̀ bụ “ndị na-anya isi, ndị mpako, ndị nkwulu”? N’ụzọ megidere nke ahụ, magazin ndị Jesuit ahụ rịbara ama na òtù ahụ “na-enye ndị òtù ya ihe ejimara doro anya na nke siri ike, ọ bụkwa ebe dịịrị ha, ebe a na-eji ikpo ọkụ na echiche nke ịbụ ụmụnna na ịdị n’otu na-anabata ha.” Ò doghị anya na ihe ndị a kụziwooro Ndịàmà na-enyere ha aka?

Ozizi Na-abara Ndị Òtù Ezinụlọ Uru

11, 12. Olee otú Pọl si gosi n’izi ezi ihe ọnọdụ ga-adị ka ya n’ọtụtụ ezinụlọ?

11 Anyị pụrụ ịchịkọta ihe anọ ndị na-esonụ, bụ́ ndị nwetụrụ njikọ. Pọl buru amụma na na mgbe ikpeazụ, ọtụtụ ndị ga-abụ “ndị na-ekwenyeghị ndị mụrụ ha, ndị na-enweghị ekele, ndị na-adịghị ọcha n’obi, ndị ihe mmadụ ibe ha na-adịghị atọ ụtọ.” Ị maara na abụọ ntụpọ ndị a​—⁠enweghị ekele na adịghị ọcha n’obi⁠—​gbara anyị gburugburu. Ma anyị pụrụ ịhụ n’ụzọ dị mfe ihe mere Pọl ji tinye ha n’etiti ịbụ “ndị na-ekwenyeghị ndị mụrụ ha” na “ndị ihe mmadụ ibe ha na-adịghị atọ atọ.” Anọ ahụ na-enwe ihe njikọ.

12 Ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ mmadụ nile na-ahụ ihe na-emenụ, ndị na-eto eto ma ọ bụ ndị meworo okenye, ga-ekweta na erubereghị ndị mụrụ ụmụ isi jupụtara n’ebe nile, ọ na-akawanyekwa njọ. Ọtụtụ ndị mụrụ ụmụ na-eme mkpesa na ndị na-eto eto yiri ka ndị na-adịghị enwe ekele maka ihe nile e mewooro ha. Ọtụtụ ndị ntorobịa na-eme mkpesa na ndị mụrụ ha eguzosighị ike n’ezie nye ha (ma ọ bụ nye ezinụlọ ha n’ozuzu) kama bụrụ ndị mikpuru onwe ha n’ọrụ, ma ọ bụ ihe ụtọ ha, ma ọ bụ nanị n’ihe banyere onwe ha. Kama ịgbalị ịmata onye ụta dịịrị, lee anya n’ihe ndị siworo na ya pụta. Ịkpọasị n’etiti ndị toruworo ogo mmadụ na ndị ntorobịa na-edujekarị ndị nọ n’agbata afọ iri na atọ ruo iri na itoolu iguzobe ụkpụrụ nke ha maka omume ọma, ma ọ bụ omume rụrụ arụ. Gịnị siworo na ya pụta? Ọ̀tụ̀tụ̀ na-aba ụba nke afọ ime ndị nọ n’agbata afọ iri na atọ na iri na itoolu, nsikwopụ afọ ime, na ọrịa a na-ebute site ná mmekọahụ. Ọtụtụ mgbe, ụkọ nke ihe mmadụ ịdị ibe ya ụtọ n’ime ezinụlọ na-eduga n’ime ihe ike. Ma eleghị anya ị pụrụ ịkọ ihe atụ ndị sitere n’ógbè unu, ihe nnwapụta nke na ihe mmadụ ịdị ibe ya ụtọ na-apụ n’anya.

13, 14. (a) N’ihi nretọ nke ọtụtụ ezinụlọ, n’ihi gịnị ka anyị kwesịrị iji ṅaa Bible ntị? (b) Okwu ndụmọdụ amamihe dị na ya dị aṅaa ka Chineke na-enye maka ndụ ezinụlọ?

13 Nke a pụrụ ịkọwa ihe mere ọtụtụ ndị mmadụ ji na-atụgharị megide ndị ahụ yiri ka ha bụbu akụkụ nke ezinụlọ ha gbasapụrụ agbasapụ, ndị sitere n’otu ebo, agbụrụ, ma ọ bụ otu ndị. Ma buru n’uche na anyị adịghị ewelite ihe ndị a iji lekwasị anya n’ihe ndị na-adịghị mma ná ndụ taa. Ihe mmasị abụọ bụ́ isi anyị nwere bụ: Ozizi dị iche iche nke Bible hà pụrụ inyere anyị aka izere ịta ahụhụ n’ihi ajọ ihe ndị ahụ Pọl depụtara na ma ànyị ga-erite uru site n’itinye ozizi nile nke Bible n’ọrụ ná ndụ anyị? Azịza ha pụrụ ịbụ ee, dị ka a na-ahụ n’isi ihe anọ ahụ dị ná ndepụta Pọl.

14 Otu okwu jikọtara ọtụtụ ihe kwesịrị ekwesị: Ọ dịghị izi ihe nke karịrị nke sitere na Bible n’imepụta ndụ ezinụlọ nke na-eme ka obi kpoo ọkụ na nke na-enwe ezi ihe ịga nke ọma. A na-egosipụta nke a site na nanị otu ihe atụ nke ndụmọdụ ya nke pụrụ inyere ndị òtù ezinụlọ aka ọ bụghị nanị izere ihe ize ndụ kama inwe ihe ịga nke ọma. Ndị Kọlọsi 3:​18-⁠21 na-enye ihe atụ dị mma banyere nke ahụ, ọ bụ ezie na e nwere ọtụtụ akụkụ okwu ndị ọzọ mara mma ma baa uru, bụ́ ndị a gwara ndị bụ di, nwunye, na ụmụaka. Ozizi nke a dị irè n’ụbọchị anyị. Ọ bụ eziokwu na ọbụna n’ezinụlọ nke ezi ndị Kraịst, e nwere nsogbu na ihe ịma aka dị iche iche. N’agbanyeghị nke ahụ, ihe dum na-esi n’ime ya apụta na-egosipụta na Bible na-ezi ozizi na-enye nnọọ aka maka ezinụlọ dị iche iche.

15, 16. Ọnọdụ dị aṅaa ka onye nnyocha chọpụtara mgbe ọ na-amụ banyere Ndịàmà Jehova na Zambia?

15 Ruo otu afọ na nkera, onye na-eme nnyocha sitere na University of Lethbridge, Canada, mụrụ ihe banyere ndị ọha mmadụ na Zambia. O kwubiri, sị: “Ndịàmà Jehova na-enwe ihe ịga nke ọma ka ukwuu karịa ndị òtù nke okpukpe ndị ọzọ n’ịnọgide na-enwe njikọ alụmdi na nwunye siri ike. . . . Ihe ịga nke ọma ha na-egosi mgbanwerịta mmekọrịta e mere mgbanwe na ya n’etiti di na nwunye, ndị ga-aza ajụjụ n’ihu onye isi ọhụrụ, bụ́ Chineke, banyere ụzọ ha si emerịta ibe ha ihe ná mgbalị inyerịta nkwado nke ha chọtara ọhụrụ, nke na-adịghị eyi egwu . . . A na-akụziri di nke bụ Onyeàmà Jehova itozu okè iji buru ibu maka ọdịmma nke nwunye ya na ụmụaka. . . . A na-agba di na nwunye ume ịbụ mmadụ ndị na-eguzosi ike n’ezi ihe . . . Ọchịchọ nke a kasị mkpa maka iguzosi ike n’ezi ihe na-eme ka alụmdi na nwunye sie ike.”

16 Ihe ọmụmụ ahụ dabeere n’ọtụtụ ahụmahụ ndị mere eme n’ezie. Dị ka ihe atụ, onye a na-eme nnyocha kwuru na n’ụzọ megidere ihe bụ omenala, “a na-ahụkarị ndị ikom Ndịàmà Jehova ka ha na-enyere ndị nwunye ha aka n’ubi, ọ bụghị nanị n’oge a na-eme nkwadebe, kamakwa mgbe a na-akụ ihe ọkụkụ na mgbe a na-akọ ala.” Otú a o doro anya na e nwere ọtụtụ ahụmahụ a na-apụghị ịgụta ọnụ gburugburu ụwa bụ́ ndị na-egosi na ozizi Bible na-emetụta ndụ ndị mmadụ.

17, 18. Ihe ndị dị aṅaa na-eju anya pụtara ìhè n’otu ihe ọmụmụ banyere ihe nketa okpukpe na mmekọahụ tupu alụmdi na nwunye?

17 Isiokwu bu ụzọ kpọtụrụ uche ná nchọpụta ndị dị na Journal for the Scientific Study of Religion. Na 1991 o nwere ihe odide a kpọrọ “Ihe Nketa Okpukpe na Inwe Mmekọahụ Tupu Alụmdi na Nwunye: Ihe Àmà Sitere n’Aka Ụfọdụ Ndị Nọchitere Anya Ndị Ntorobịa ná Mba.” Ma eleghị anya ị maara otú inwe mmekọahụ tupu alụmdi na nwunye si jupụta ebe nile. Mgbe ha ka bụ nnọọ nwata, ọtụtụ na-adaba n’ire ọkụ nke ahụ, ọtụtụ ndị nọ n’agbata afọ iri na atọ na iri na itoolu na-enwekwa ọtụtụ ndị ha na-eso enwe mmekọahụ. Ozizi dị iche iche nke Bible ọ̀ pụrụ ịgbanwe usoro nke a zuru ebe nile?

18 Ndị osote prọfesọ atọ mụrụ ihe banyere ajụjụ ahụ tụrụ anya ịchọpụta ‘na ndị nọ n’oge uto na ndị ntorobịa a zụlitere n’omenala ndị Kraịst na-adịghị emekebe mgbanwe eyichaghị ka ha ga-enwe mmekọahụ tupu alụmdi na nwunye.’ Ma gịnị ka ihe ndị mere eme gosipụtara? Ná nchịkọta, site na 70 pasent ruo 82 pasent enwewo mmekọahụ tupu alụmdi na nwunye. Nye ụfọdụ “ịrapagidesi ike n’ụkpụrụ e ketara eketa [belatara] okwukwe ọ pụrụ ikwe mee inwe mmekọahụ tupu alụmdi na nwunye, ma ọ bụghị n’ọnọdụ nke ‘mmekọahụ tupu alụmdi na nwunye nke ndị nọ n’agbata afọ iri na atọ ruo iri na itoolu.’” Ndị nnyocha ahụ kwuru okwu banyere ụfọdụ ndị ntorobịa sitere n’ezinụlọ ndị yiri ka ha ji okpukpe kpọrọ ihe, bụ́ ndị “yikarịrị nnọọ ka ha ga-enwe mmekọahụ tupu alụmdi na nwunye ma e jiri ha tụnyere ndị nọ n’Okpukpe Ndị Bụ Isi nke Protestant.”​—⁠Ọ bụ anyị dere okwu ụfọdụ n’ụdị dị iche.

19, 20. Olee otú ozizi Chineke siworo nyere ọtụtụ ndị ntorobịa n’etiti Ndịàmà Jehova aka, chebekwa ha?

19 Ndị prọfesọ ahụ chọpụtara ihe dị nnọọ iche n’etiti ndị ntorobịa nke Ndịàmà Jehova, bụ́ ndị so “n’òtù nke kasị pụọ iche n’ebe ndị ọzọ nọ.” N’ihi gịnị? “Ọ̀tụ̀tụ̀ nraranye na mmadụ nile ijikọ aka ọnụ n’ime ihe nke ihe kpaliri ya bụ ahụmahụ, ihe a na-atụ anya, na ikere òkè n’ihe omume dị iche iche nke okpukpe . . . pụrụ n’ozuzu ya ime ka e nwee ọ̀tụ̀tụ̀ dị elu nke ịrapagidesi ike n’ụkpụrụ dị iche iche nke okwukwe.” Ha kwukwara, sị: “A na-atụ anya n’aka Ndịàmà ịrụzu ọrụ ha nke ịbụ ndị nkwusa dị ka ndị nọ n’oge uto na ndị ntorobịa.”

20 Ya mere ozizi Bible metụtara Ndịàmà Jehova n’ụzọ dị mma site n’inyere ha aka izere omume rụrụ arụ. Nke ahụ na-apụta nchebe pụọ n’ọrịa dị iche iche a na-ebute site ná mmekọahụ, nke ụfọdụ n’ime ha na-enweghị ngwọta, ndị ọzọkwa na-egbu mmadụ. Ọ pụtara na ha enweghị nrụgide nke isikwopụ afọ ime, nke Bible na-ezi na ya na igbu mmadụ bụ otu ihe ahụ. Ọ pụtakwara ndị ntorobịa nwere ike ịbanye n’ime alụmdi na nwunye n’akọ na uche dị ọcha. Nke ahụ pụtara alụmdi na nwunye ndị e wukwasịrị n’elu ntọala siri ike karị. Ọ bụ ozizi ndị dị otú ahụ pụrụ inyere anyị aka ịnagide ọnọdụ dịnụ, inwe ahụ ike karị, inwe obi ụtọ karị.

Ozizi Dị Mma

21. Olee ihe ndị Pọl buru amụma ha n’izi ezi maka oge anyị?

21 Ugbu a laghachi azụ na 2 Timoti 3:​3, 4, ma rịba ama ihe ọzọ Pọl kwuru ga-eme ka oge anyị bụrụ nke dị oké egwu nye ọtụtụ ndị​—⁠ma ọ bụghị nye mmadụ nile: “[Ndị mmadụ ga-abụ] ndị na-adịghị agba ndụ, ndị na-ebo ebubo ụgha, ndị na-adịghị ejide onwe ha, ndị dị ka anụ ọhịa, ndị na-adịghị ahụ ezi ihe n’anya, ndị na-arara mmadụ nye n’aka ndị iro ha, ndị isi ike, ndị a fụliworo elu, [na] ndị na-ahụ ihe ụtọ n’anya kama ịhụ Chineke n’anya.” Lee ka nke a si zie ezie! Ma, ozizi sitere na Bible pụrụ ichebe anyị ma kwadebe anyị ịnagide ọnọdụ dịnụ, inwe ihe ịga nke ọma.

22, 23. Pọl mechiri ndepụta ya n’agbamume dị aṅaa dị mma, gịnịkwa ka ọ na-egosi?

22 Pọl onyeozi mechiri ndepụta ya n’ụzọ na-agba ume. Ọ gbanwere ihe nke ikpeazụ ka ọ bụrụ iwu Chineke nke pụkwara iwetara anyị abamuru dị ukwuu. Pọl kpọtụrụ aha ndị “na-enwe ụdị nke nsọpụrụ Chineke, ma ha agọwo ike ya: gị gbakụtakwa ndị a azụ.” Cheta na ndị ntorobịa na chọọchị ụfọdụ nwere n’ezie ọ̀tụ̀tụ̀ ka elu nke mmekọahụ tupu alụmdi na nwunye karịa ná nkezi. Ee, ọbụna ma ọ bụrụ na omume rụrụ arụ nke ndị ahụ na-aga chọọchị bụ nanị n’ọ̀tụ̀tụ̀ e nwere ná nkezi, nke ahụ ọ gaghị abụ ihe na-egosipụta na ụdị ofufe ha bụ nke na-adịghị ike? Ọzọkwa, ozizi dị iche iche nke okpukpe hà na-agbanwe otú ndị mmadụ si eme omume n’azụmahịa, otú ha si emeso ndị nọ ha n’okpuru, ma ọ bụ otú ha si emeso ndị ikwu?

23 Okwu Pọl na-egosi na anyị kwesịrị itinye n’omume ihe anyị na-amụta site n’Okwu Chineke, na-enwe ụzọ ofufe nke na-egosipụta ezi ike nke Iso Ụzọ Kraịst. Banyere ndị ụdị ofufe ha bụ nke na-adịghị ike, Pọl na-agwa anyị, sị: “Gị gbakụtakwa ndị a azụ.” Nke ahụ bụ iwu doro anya, nke ga-ewetara anyị abamuru ndị e ji n’aka.

24. Olee otú agbamume dị ná Mkpughe isi 18 si kwekọọ ná ndụmọdụ Pọl?

24 Ọ̀ bụ site n’ụzọ dị aṅaa? Ọ dị mma, akwụkwọ ikpeazụ nke Bible na-egosipụta otu nwanyị nke ihe atụ, nwanyị na-akwa iko, nke a kpọrọ Babilọn Ukwu. Ihe àmà na-egosi na Babilọn Ukwu ahụ na-anọchite anya alaeze ụwa dum nke okpukpe ụgha, bụ́ nke Jehova Chineke nyochaworo ma jụ ya. Ma ọ bụghị iwu na a ga-agụnye anyị. Mkpughe 18:4 na-agba anyị ume, sị: “Ndị nke m, sinụ n’ime ya pụta, ka unu wee ghara iso ya nwekọọ mmehie ya nile, gharakwa ịnata ụfọdụ n’ime ihe otiti ya nile.” Nke ahụ ọ́ bụghị otu ozi ahụ nke Pọl ziri, “gị gbakụtakwa ndị a azụ”? Anyị ime ihe kwekọrọ na ya bụ ụzọ ọzọ anyị pụrụ isi rite uru site n’izi ihe Chineke.

25, 26. Ọdịnihu dị aṅaa na-echere ndị na-anakwere ugbu a ma na-etinye ozizi sitere n’aka Jehova Chineke n’ọrụ?

25 N’oge na-adịghị anya Chineke ga-etinye aka kpọmkwem n’ihe omume ụmụ mmadụ. Ọ ga-ekpochapụ okpukpe ụgha nile na akụkụ ndị ọzọ nile nke usoro ihe ọjọọ dị ugbu a. Nke ahụ ga-abụ ihe ịṅụrị ọṅụ, dị ka Mkpughe 19:​1, 2 na-egosi. N’ụwa a ga-enye ndị nakweere ma na-agbaso izi ihe Chineke ohere ka ha nọgide na-agbaso izi ihe ya nile mgbe ihe mkpọbi ụkwụ ndị nke oge a dị oké egwu gabigara.​—⁠Mkpughe 21:​3, 4.

26 N’ezie, ịdị ndụ n’elu ala Paradaịs ahụ nke e weghachiri eweghachi ga-adị ụtọ gabiga otú anyị pụrụ iche n’echiche. Chineke na-ekwe nkwa na ọ ga-ekwe anyị omume, anyị pụkwara ịtụkwasị ya obi kpam kpam. Otú a ọ na-enye anyị ihe bara ụba mere anyị ga-eji nakwere ma gbasoo ozizi ya nke na-enye aka. Olee mgbe? Ka anyị gbasoo ya ugbu a n’oge anyị nke dị oké egwu na n’ime Paradaịs ahụ o kwere nkwa ya.​—⁠Maịka 4:​3, 4.

Ihe Ndị A Ga-echebara Echiche

◻ Olee otú ndị Jehova si erite uru site ná ndụmọdụ ya banyere akụ̀ na ụba?

◻ Otu magazin ndị Jesuit gbara akaebe maka ihe ọma ndị dị aṅaa na-abiạra ndị na-ejere Chineke ozi site n’itinye Okwu ya n’ọrụ?

◻ Otu ihe ọmụmụ na Zambia kpughere abamuru ndị dị aṅaa na-abịara ezinụlọ ndị na-etinye ozizi Chineke n’ọrụ?

◻ Nchebe dị aṅaa ka ozizi Chineke na-enye ndị na-eto eto?

[Igbe dị na peeji nke 15]

LEE OKÉ ỤGWỌ A GA-AKWỤ!

“Ndị nọ n’agbata afọ ndụ iri na atọ ruo iri na itoolu na-eche oké ihe ize ndụ nke ọrịa AIDS ihu n’ihi na ha na-enwe mmasị ịnwale mmekọahụ na ọgwụ ọjọọ, na-eme ihe dị ize ndụ ma na-ebi ndụ maka oge a nọ na ya, nakwa n’ihi na ọ na-adị ha ka ha apụghị ịnwụ anwụ ma na-ajụ ịchịisi,” ka otu akụkọ e wepụtara n’otu nzukọ banyere ọrịa AIDS na ndị nọ n’agbata afọ ndụ iri na atọ na iri na itoolu kwuru.​—⁠Daily News nke New York, Sunday, March 7, 1993.

“Ụmụ agbọghọ nọ n’afọ ndụ agbata iri na atọ na iri na itoolu bụ́ ndị na-enwe nnọọ mmekọahụ na-apụta dị ka ndị ọzọ ‘nọ n’ihu ihu’ nke ntiwapụ ọrịa AIDS, ka otu ihe ọmụmụ òtù United Nations mere na Europe, Africa na Ebe Ndịda Ọwụwa Anyanwụ Esia chọpụtaworo.”​—⁠The New York Times, Friday, July 30, 1993.

[Foto ndị dị na peeji nke 16, 17]

Ozizi Bible na-abara Ndịàmà Jehova uru n’ọgbakọ na n’ebe obibi

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya