Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • Ndị Nne na Nna, Nyerenụ Ụmụ Unu Aka Ka Ha “Mara Ihe Iji Nweta Nzọpụta”
    Ụlọ Nche (Nke A Na-amụ Amụ)—2017 | Disemba
    • 3. (a) Olee otú Timoti si ghọọ Onye Kraịst? Olee otú o si na-eme ihe ndị ọ mụtara? (b) Gịnị bụ ihe atọ Pọl gwara Timoti gbasara ha?

      3 Pọl onyeozi gara Listra n’afọ 47. Ọ ga-abụ mgbe Timoti, bụ́ onye nwere ike ịbụ nwa okorobịa n’oge ahụ, mụtara banyere ihe Jizọs na-akụzi. Ọ nọ na-eme ihe ọ mụtara na Baịbụl. Mgbe afọ abụọ gachara, ya na Pọl malitere iso na-aga ozi ọma. Mgbe ihe dị ka afọ iri na isii gachara, Pọl degaara Timoti akwụkwọ ozi, sị: “Nọgide n’ihe ndị ị mụtara, ndị e mekwara ka i kwere, ebe ị maara ndị i si n’aka ha mụta ha, ebe ị makwaara na ọ bụ malite n’oge ị bụ nwa ọhụrụ ka ị maara ihe odide ndị ahụ dị nsọ [Akwụkwọ Nsọ Hibru], bụ́ ndị nwere ike ime ka ị mara ihe iji nweta nzọpụta site n’okwukwe i nwere n’ime Kraịst Jizọs.” (2 Tim. 3:14, 15) Cheta na Pọl kwuru gbasara (1) ịmara ihe odide ndị ahụ dị nsọ, (2) ime ka i kwere n’ihe ndị ị mụtara, na (3) ịmara ihe iji nweta nzọpụta site n’okwukwe i nwere n’ime Kraịst Jizọs.

  • Ndị Nne na Nna, Nyerenụ Ụmụ Unu Aka Ka Ha “Mara Ihe Iji Nweta Nzọpụta”
    Ụlọ Nche (Nke A Na-amụ Amụ)—2017 | Disemba
    • ‘IME KA I KWERE’

      5. (a) Gịnị ka ‘ime ka i kwere’ pụtara? (b) Olee otú anyị si mara na e mere ka Timoti kwere n’ihe a kụziiri ya banyere Jizọs?

      5 Ịma ihe odide ndị dị nsọ dị mkpa. Ma, ịkụziri ụmụaka banyere ndị a kọrọ akụkọ ha na Baịbụl nakwa ihe ndị mere eme a kọrọ na Baịbụl abụghị ebe okwu biri. E mere ka Timoti “kwere.” Ihe okwu Grik e si na ya sụgharịa “ka i kwere” pụtara bụ “ime ka obi sie mmadụ ike” ma ọ bụ “ime ka mmadụ kwetasie ike na ihe o kweere bụ eziokwu.” Timoti ma Akwụkwọ Nsọ Hibru malite mgbe ọ bụ nwa ọhụrụ. O mechara kweta na Jizọs bụ Mesaya. E nwere ike ikwu ya n’ụzọ ọzọ na ihe ndị ọ mụtara mere ka okwukwe ya sikwuo ike. Nke bụ́ eziokwu bụ na Timoti kwetasiri ike banyere ihe a kụziiri ya nke na e mere ya baptizim, ya esoro Pọl na-eje ozi ala ọzọ.

      6. Olee otú ị ga-esi nyere ụmụ gị aka ka ha kwere n’ihe ha na-amụta n’Okwu Chineke?

      6 Olee otú ị ga-esi mee ka okwukwe ụmụ gị sie ike ka Timoti, ka e nwee ike ime ka ha kwere? Nke mbụ bụ inwe ndidi. Ime ka mmadụ kwere n’ihe a kụziiri ya na-ewe oge. Ọ bụghịkwanụ ihe ị ga-ebufere ụmụ gị naanị n’ihi na e mere ka i kwere. Nwa gị nke ọ bụla kwesịrị iji “ike iche echiche” ya kweta n’eziokwu Baịbụl. (Gụọ Ndị Rom 12:1.) Gịnwa bụ́ nne ma ọ bụ nna nwere ọrụ dị mkpa ị ga-arụ iji mee ka okwukwe nwa gị sie ike, nke ka nke, ma ọ jụọ gị ajụjụ. Ka anyị tụlee otu ihe atụ.

      7, 8. (a) Olee otú otu nna bụ́ Onye Kraịst si nwee ndidi mgbe ọ na-akụziri nwa ya ihe? (b) Olee mgbe i nweerela nwa gị ụdị ndidi ahụ?

      7 Otu nna aha ya bụ Thomas nwere nwa nwaanyị dị afọ iri na otu. Ọ sịrị: “Nwa m nwere ike ịjụ, sị, ‘Ọ̀ ga-abụ na Jehova kere otu ihe, ihe ahụ e jiri nwayọọ nwayọọ ghọọ ihe ndị ọzọ dị ndụ?’ ma ọ bụ, ‘Gịnị mere anyị anaghị atụ vootu iji mee ka ihe ka mma?’ Mgbe ụfọdụ, ana m ejide onwe m ka m ghara ịgwa ya ozugbo ihe ọ ga-ekwere. A sị ka e kwuwe, ihe ga-eme ka mmadụ kweta na ihe a kụziiri ya bụ eziokwu abụghị otu ọkpụrụkpụ ihe. Kama, ọ bụ ụmụ irighiri ihe ga-eme ka o kweta.”

      8 Thomas makwa na o kwesịrị inwe ndidi ka o nwee ike ịkụziri nwa ya ihe. Nke bụ́ eziokwu bụ na Ndị Kraịst niile kwesịkwara inwe ndidi. (Kọl. 3:12) Thomas ghọtara na ya na nwa ya ga-ekwurịta okwu ọtụtụ ugboro ka nwa ya nwee ike ikweta n’ihe ọ na-ekwu. Ya na nwa ya ga-ekwurịta ihe dị na Baịbụl ka o nyere ya aka ikweta n’ihe ọ na-amụ. Thomas kwuru, sị: “Mụ na nwunye m na nwa anyị kwuwe ihe dị mkpa, anyị ga-achọ ịmata ma ò kwetara n’ihe ọ na-amụ, nakwa ma ọ̀ ghọtara ya. Obi na-atọ anyị ụtọ ma ọ jụọ anyị ajụjụ. N’eziokwu, m na-echegbu onwe m ma ọ bụrụ na o kweta n’ihe ahụ n’ajụghị anyị ajụjụ.”

      9. Olee otú i nwere ike isi nyere nwa gị aka ka o kweta n’ihe Okwu Chineke na-ekwu?

      9 Ndị nne na nna jiri ndidi na-akụziri ụmụ ha ihe, ka oge na-aga, ụmụ ha ga-aghọtawa ihe ndị dị “obosara na ịdị ogologo na ịdị elu na ịdị omimi” dị n’ihe ndị ha kweere. (Efe. 3:18) Anyị kwesịrị iji ihe ha ga-aghọtali n’ihi afọ ndụ ha nọ na ya na-akụziri ha ihe. Ka ha na-ekwetasikwu ike n’ihe ndị ha na-amụta, ọ ga-adịrị ha mfe ịkọrọ ndị ọzọ ihe ndị ha kweere, ma ụmụ akwụkwọ ibe ha. (1 Pita 3:15) Dị ka ihe atụ, ụmụ gị hà nwere ike iji Baịbụl kọwaara mmadụ ebe mmadụ na-aga ma ọ nwụọ? Otú Baịbụl si kọwaa ya, hà ghọtara ya?a Cheta na i kwesịrị inwe ndidi iji nyere nwa gị aka ka o kweta n’ihe Okwu Chineke na-ekwu, ma mbọ ị gbara inyere ya aka efughị ọhịa.—Diut. 6:6, 7.

      10. Gịnị bụ ihe dị mkpa so n’ihe ị na-akụziri ụmụ gị?

      10 Ma, ka nwa gị nwee ike ikweta n’ihe ọ na-amụ, gịnwa ga-ebu ụzọ kweta na ha. Otu nne aha ya bụ Stephanie mụrụ ụmụ nwaanyị atọ. O kwuru, sị: “Kemgbe ụmụ m dị obere, m na-ajụ onwe m, sị: ‘M̀ na-agwa ụmụ m ihe mere m ji kwere na Jehova dị, na ọ hụrụ m n’anya, nakwa na ụzọ ya ziri ezi? Ụmụ m, hà ma na m hụrụ Jehova n’anya n’eziokwu?’ Agaghị m atụ anya ka ụmụ m kwere, ọ gwụkwala ma m kweere.”

Akwukwo Igbo (1984-2025)
Pụọ
Banye
  • Igbo
  • Ziga ya
  • Ịgbanwe Ihe
  • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
  • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
  • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
  • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
  • JW.ORG
  • Banye
Ziga ya