Yunaịsị na Lọịs—Ndị Nkụzi Bụ́ Ezi Ihe Nlereanya
Dị ka ndị ohu Jehova, anyị maara na ịkụziri ụmụ anyị banyere okpukpe n’ụzọ dị irè bụ ibu ọrụ siri ike. Ọbụna n’oge ndị kasị mma, ọrụ a pụrụ ijupụta n’ụdị ihe mgbochi na ihe isi ike dị iche iche. Nke a na-esikwu ike karị mgbe nne ma ọ bụ nna bụ́ onye Kraịst na-eche ihe ịma aka ahụ ihu n’ezinụlọ kewara ekewa n’ụzọ okpukpe. Ọnọdụ dị otú ahụ abụghị ihe ọhụrụ. Akwụkwọ Nsọ na-agwa anyị banyere otu nne nke chọtara onwe ya n’ọnọdụ yiri nke ahụ na narị afọ mbụ O.A.
Ezinụlọ nke otu nwanyị aha ya bụ Yunaịsị bi na Listra, obodo dị n’ógbè Lycaonia n’ebe ndịda etiti Asia Minor. Listra bụ ntakịrị obodo na-adịchaghị mkpa. Ọ bụ ógbè ndị Rom a kpọrọ Julia Felix Gemina Lustra, nke Ọgọstọs Siza guzobere iji gbochie ihe omume nke ndị na-apụnara mmadụ ihe n’ógbè ndị dị gburugburu ya. Yunaịsị bụ onye Juu bụ́ onye Kraịst nke ya na di ya bụ́ onye Grik, nwa ya nwoke bụ́ Timoti, na nne ya bụ́ Lọịs, biri n’ezinụlọ kewara ekewa n’ụzọ okpukpe.—Ọrụ 16:1-3.
O yiri ka e nwere ndị Juu ole na ole na Listra, ebe ọ bụ na Bible ekwughị na e nwere ụlọ nzukọ n’ebe ahụ, ọ bụ ezie na e nwere ndị Juu n’Aikọniọm, nke dị ihe dị ka kilomita 30 site n’ebe ahụ. (Ọrụ 14:19) Ya mere ọ ghaghị ịbụ ihe na-adịghịrị Yunaịsị mfe ikpe okpukpe ya. Eziokwu ahụ bụ́ na e bighị Timoti úgwù mgbe a mụsịrị ya edujewo ụfọdụ ndị ọkà mmụta iche na di Yunaịsị megidere echiche ahụ.
Otú ọ dị, ọ bụghị nanị Yunaịsị na-ekpe okpukpe ya. O yiri ka Timoti natara ọzụzụ ya ‘n’ihe dị nsọ nile e deworo n’akwụkwọ nsọ’ site ma n’aka nne ya ma n’aka nne nne ya, bụ́ Lọịs.a Pọl onyeozi gbara Timoti ume, sị: “Nọgide n’ime ihe nile ị mụtara, nke e mekwara ka i kwere ha, ebe ị matara mmadụ ndị ị mụtara ha n’ọnụ ha; ebe ị makwaara na i sitere n’oge ị dị na nwa ọhụrụ mata ihe dị nsọ nile e deworo n’akwụkwọ nsọ nke pụrụ ime ka ị bụrụ onye amamihe ịnata nzọpụta site n’okwukwe nke i kwere na Kraịst Jisọs.”—2 Timoti 3:14, 15.
Ọzụzụ ‘Site n’Oge A Dị na Nwa Ọhụrụ’
Mgbe Pọl sịrị na ọzụzụ Timoti ‘n’ihe dị nsọ nile e deworo n’akwụkwọ nsọ’ bụ nke e nyeworo ya ‘site n’oge ọ dị na nwa ọhụrụ,’ ihe àmà na-egosi na nke a pụtara site n’oge ọ bụ nwatakịrị. Nke a kwekọrọ n’ojiji o ji okwu Grik bụ́ (breʹphos) nke na-ezo aka na nwa a mụrụ ọhụrụ mee ihe. (Tụlee Luk 2:12, 16.) Yunaịsị si otú a jiri ọrụ Chineke nyere ya kpọrọ mkpa, n’egbughị oge ọ bụla n’ịmalite inye Timoti ọzụzụ nke ga-enyere ya aka itolite ghọọ ohu Chineke raara onwe ya nye.—Deuterọnọmi 6:6-9; Ilu 1:8.
‘E mewo ka Timoti kwere’ eziokwu Akwụkwọ Nsọ. Dị ka otu akwụkwọ ọkọwa okwu Grik si kwuo, okwu Pọl ji mee ihe n’ebe a pụtara “ịbụ onye e mere ka o kwenyesie ike; ịbụ onye e mesiri obi ike” n’ihe. Obi abụọ adịghị ya na oge na mgbalị dị nnọọ ukwuu dị mkpa iji kụnye nkweta siri ike dị otú ahụ n’obi Timoti, na-enyere ya aka ịtụgharị uche n’Okwu Chineke na inwe okwukwe na ya. Mgbe ahụ, o doro anya na ma Yunaịsị ma Lọịs rụsiri ọrụ ike iji kụziere Timoti ihe site n’Akwụkwọ Nsọ. Leekwa ụgwọ ọrụ nke ndị inyom ahụ na-efe Chineke nwetara! Pọl pụrụ ide banyere Timoti, sị: “E mere m ka m cheta okwukwe ihu abụọ na-adịghị ya nke dị n’ime gị; bụ́ okwukwe nke buru ụzọ biri n’ime nne gị ochie Lọịs na nne gị Yunaịsị; ma e mere m ka m kwenye na o bikwa n’ime gị.”—2 Timoti 1:5.
Lee ọrụ dị mkpa Yunaịsị na Lọịs rụrụ ná ndụ Timoti! Banyere nke a, onye edemede bụ́ David Read na-ekwu, sị: “Ọ bụrụ na onyeozi ahụ kweere na ọ dịghị ihe dị mkpa karịa ahụmahụ onwe onye nke ntọghata Timoti, ọ gaara echetawororị ya nke ahụ ozugbo. Ma ihe mbụ o nwere ikwu banyere okwukwe Timoti bụ na o buru ụzọ ‘biri n’ime Lọịs . . . na Yunaịsị.’” Okwu Pọl banyere okwukwe Lọịs, Yunaịsị, na Timoti na-egosi na mgbe mgbe, ọzụzụ Akwụkwọ Nsọ nke nne na nna na ọbụna nne na nna ochie nyere n’oge n’ebe obibi dị oké mkpa n’ikpebi ọganihu ime mmụọ nke onye na-eto eto ga-enwe n’ọdịnihu. Nke ahụ ò kwesịghị ime ka ndị òtù ezinụlọ chesie echiche ike banyere ihe ha na eme iji mezuo ibu ọrụ a n’ebe ma Chineke ma ụmụ ha nọ?
Ikekwe Pọl nọkwa na-eche banyere ụdị ọnọdụ ebe obibi Lọịs na Yunaịsị meworo ka e nwee. Onyeozi ahụ pụrụ ịgaworị ebe obibi ha n’oge mbụ ọ nọrọ na Listra, n’ihe dị ka na 47/48 O.A. E leghị anya a tọghatara ndị inyom abụọ ahụ gaa n’Iso Ụzọ Kraịst n’oge ahụ. (Ọrụ 14:8-20) Ikekwe mmekọrịta na-ekpo ọkụ, na-enye obi ụtọ nke ha na-enwe n’ezinụlọ ahụ metụtara ụdị okwu Pọl ji mee ihe mgbe ọ na-ezo aka n’ebe Lọịs nọ dị ka “nne ochie” Timoti. Dị ka ọkà mmụta bụ́ Ceslas Spicq si kwuo, okwu Grik o jiri mee ihe (mamʹme, n’ụzọ dị iche n’ebe teʹthe mgbe ochie ahụ, dịkwa ùgwù dị) bụ “okwu ịhụnanya nwata” ji ezo aka n’ebe nne ya ochie nọ, bụ́ nke na-egosi n’ebe a “ọdịiche nke ịkpachi anya na ịhụnanya.”
Ọpụpụ Timoti
O doghị anya ihe bụ kpọmkwem ọnọdụ ọlụlụ Yunaịsị mgbe Pọl gara Listra nke ugbo abụọ (ihe dị ka na 50 O.A.). Ọtụtụ ndị ọkà mmụta na-eche na ọ bụ nwanyị di ya nwụrụ. Otú o sina dị, n’okpuru nduzi nke nne ya na nne ya ochie, Timoti etowo ghọọ ezi nwa okorobịa, ikekwe, onye dị ihe dị ka afọ 20 n’oge ahụ. “Ụmụnna n’ime Kraịst ndị bi na Listra na Aikọniọm gbaara [ya] ezi àmà.” (Ọrụ 16:2) Dị ka ihe àmà na-egosi, a kụbanyewo ọchịchọ nke ịgbasa ozi ọma nke Alaeze ahụ n’obi Timoti, n’ihi na ọ nakweere ịkpọ òkù Pọl isonyere ya na Saịlas na njem ozi ala ọzọ ha.
Cheedị otú ọ dị Yunaịsị na Lọịs mgbe Timoti na-achọ ịpụ! Ha maara na ná nleta mbụ Pọl mere n’obodo ha, a tụrụ onyeozi ahụ nkume ma hapụ ya na-eche na ọ nwụọla. (Ọrụ 14:19) Ya mere ọ gaghị adịwororị ha mfe ikwe ka Timoti na-eto eto pụọ. Ma e leghị anya ha chere banyere ogologo oge ọ ga-anọ nakwa ma ọ̀ ga-alọta n’enweghị ọkọ ga-akọ ya. N’agbanyeghị nchegbu dị otú ahụ banyere ihe ndị pụrụ ime eme, obi abụọ adịghị ya na nne ya na nne ya ochie gbara ya ume ịnakwere ihe ùgwù a pụrụ iche nke ga-eme ka o nwee ike ijere Jehova ozi n’ụzọ ka zuo ezuo.
Ihe Mmụta Ndị Bara Uru
A pụrụ ịmụta ihe dị ukwuu site n’iji nlezianya tụlee banyere Yunaịsị na Lọịs. Okwukwe kwaliri ha inye Timoti nzụlite rijuru afọ n’ụzọ ime mmụọ. Ihe nlereanya tozuru okè, kwụrụ chịm nke nsọpụrụ Chineke nke ndị nne na nna ochie na-esetịpụrụ ụmụ ụmụ ha na ndị ọzọ pụrụ n’ezie ịbara ọgbakọ ndị Kraịst dum uru. (Taịtọs 2:3-5) Ihe nlereanya Yunaịsị na-echetakwara ndị bụ́ nne nwere di na-ekweghị ekwe banyere ibu ọrụ na ụgwọ ọrụ nke inye ụmụ ha ọzụzụ ime mmụọ. Ime nke a pụrụ ịchọ obi ike dị ukwuu mgbe ụfọdụ, karịsịa ma ọ bụrụ na nna ahụ enwechaghị echiche dị mma n’ebe nkwenkwe nke okpukpe nwunye ya dị. Ọ chọkwara ịdị akọ, ebe ọ bụ na onye Kraịst bụ́ nwunye aghaghị ịkwanyere ịbụisi nke di ya ùgwù.
E ji ọhụhụ ha hụrụ ka Timoti na-enwe ọganihu ime mmụọ ruo n’ókè nke ịghọ onye ozi ala ọzọ na onye nlekọta bụ́ ọkpọka kwụghachi okwukwe, mgbalị, na nnapụ onwe onye ihe nke Lọịs na Yunaịsị ụgwọ. (Ndị Filipaị 2:19-22) N’otu aka ahụ taa, ịkụziri ụmụ anyị eziokwu Akwụkwọ Nsọ chọrọ oge, ndidi, na mkpebisi ike, ma ihe ọma na-esi na ya apụta na-eme ka o kwesị mgbalị nile ahụ. Ọtụtụ ndị Kraịst bụ́ ndị ntorobịa bụ́ ezi ihe nlereanya, bụ́ ndị a kụziwooro ‘ihe dị nsọ nile site n’oge ha dị na nwa ọhụrụ’ n’ezinụlọ kewara ekewa n’ụzọ okpukpe na-ewetara nne ma ọ bụ nna ha nke na-efe Chineke oké ọṅụ. Leekwa otú ilu ahụ si bụrụ eziokwu, bụ́ nke na-asị: ‘Nwanyị mụrụ onye maara ihe ga-etegharịkwa egwú ọṅụ’!—Ilu 23:23-25.
Jọn onyeozi kwuru banyere ụmụ ime mmụọ ya, sị: “Enweghị m ọṅụ nke ka ihe ndị a ukwuu, bụ́ ịnụ ka ụmụ nke aka m na-ejegharị n’eziokwu ahụ.” (3 Jọn 4) N’ezie, ọtụtụ ndị mesịrị dị ka Yunaịsị na Lọịs, bụ́ ndị nkụzi abụọ bụ́ ezi ihe nlereanya, na-enwe otu ụdị mmetụta ahụ e kwupụtara n’okwu ndị ahụ.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a E gosiri na Lọịs abụghị nne nna Timoti site ná nsụgharị Syriac nke sịrị “nne nke nne gị” na 2 Timoti 1:5.