Isi nke 38
Toonụ Jaa Maka Ikpe Ya Nile!
1. Olee okwu Jọn nụrụ “dị ka oké olu nke oké ìgwè ndị nọ n’eluigwe”?
BABILỌN UKWU AHỤ adịghịkwa ọzọ! Nke a bụ n’ezie akụkọ na-enye ọṅụ. Ka a sịkwa ihe mere Jọn ji nụ mkpu ọṅụ nke otuto n’eluigwe! “Mgbe ihe ndị a gasịrị m wee nụ ihe dị ka oké olu nke oké ìgwè ndị nọ n’eluigwe, na-asị, Haleluya; nzọpụta nile na otuto nile na ike nile na-adịrị Chineke anyị: n’ihi na ikpe ya nile bụ eziokwu bụrụkwa ikpe ziri ezi; n’ihi na o kpere oké nwanyị ahụ na-akwa iko ikpe, bụ́ nwanyị nke weere ịkwa iko ya mebie ụwa, ọ bọkwara ọ́bọ̀ ọbara ndị ohu ya n’isi ya. Nke mere ya abụọ ha wee sị, Haleluya. Anwụrụ ọkụ ya na-arịgo elu ruo mgbe nile ebighị ebi.”—Mkpughe 19:1-3.
2. (a) Gịnị ka okwu ahụ bụ “Haleluya” pụtara, gịnịkwa ka Jọn ịnụ ya ugbo abụọ n’oge a na-egosipụta? (b) Ònye natara otuto maka ibibi Babilọn Ukwu ahụ? Kọwaa.
2 Haleluya n’ezie! Okwu ahụ pụtara “Toonụ Jaa,” ebe “Jaa” bụ ndebiri nke aha Chineke bụ Jehova. A na-echetara anyị n’ebe a agbamume nke onye ọbụ abụ ahụ, bụ: “Ka ihe ọ bụla nke na-eku ume too Jaa. Toonụ Jaa.” (Abụ Ọma 150:6) Jọn ịnụ mkpu ọṅụ nke ìgwè ndị nọ n’eluigwe ka ha na-abụ “Haleluya” ugbo abụọ n’ebe a ná Mkpughe na-egosi na mkpughe nke eziokwu Chineke na-ekpughe na-aga n’ihu. Chineke nke Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst bụ otu Chineke ahụ dị n’Akwụkwọ Nsọ Hibru nke bu ya ụzọ, Jehova bụkwa aha ya. Chineke ahụ nke kpatara ọdịda nke Babilọn oge ochie ekpewo Babilọn Ukwu ahụ ikpe ma bibie ya ugbu a. Nyenụ ya otuto nile maka oké ọrụ ahụ! Ike nke kpatara ọdịda ya bụ nke ya kama ịbụ nke mba ndị ahụ o ji mee ihe dị ka ngwá ọrụ n’ibibi ya. Ọ bụ nanị Jehova ka anyị na-aghaghị ikwu na nzọpụta sitere n’aka ya.—Aịsaịa 12:2; Mkpughe 4:11; 7:10, 12.
3. N’ihi gịnị ka oké akwụna ahụ jiworo kwesị nnọọ ịnata ikpe a mara ya?
3 N’ihi gịnị ka oké akwụna ahụ ji kwesị nnọọ ekwesị ịnata ikpe ọmụma nke a? Dị ka iwu ahụ Jehova nyere Noa si kwuo—sitekwa n’aka ya nye ihe nile a kpọrọ mmadụ—ịwụfu ọbara n’ụzọ jọgburu onwe ya na-eweta ikpe ọnwụ. E kwughachikwara nke a n’Iwu Chineke nyere Israel. (Jenesis 9:6; Ọnụ Ọgụgụ 35:20, 21) Ọzọkwa, n’okpuru Iwu Mosis ahụ, ma ịkwa iko anụ ahụ ma nke ime mmụọ bụcha ihe ndị kwesịrị ịkpata ọnwụ. (Levitikọs 20:10; Deuterọnọmi 13:1-5) Ruo ọtụtụ puku afọ, Babilọn Ukwu ahụ anọwo n’ikpe ọmụma ọbara, ọ bụkwa nwanyị na-akwa iko nke ukwuu. Dị ka ihe atụ, ụkpụrụ iwu Chọọchị Roman Katọlik nke igbochi ndị ụkọchukwu ya ịlụ nwunye akpatawo ajọ omume ịkwa iko n’akụkụ nke ọtụtụ n’ime ha, ọtụtụ n’ime ha taa ebutewokwa ọrịa AIDS. (1 Ndị Kọrint 6:9, 10; 1 Timoti 4:1-3) Ma mmehie ya ndị bụ isi, ndị ‘rapakọrọ n’otu ruo eluigwe,’ bụ ihe omume ya ndị na-awụ ibubo n’ahụ nke ịkwa iko ime mmụọ—nke ikpeazụ nke a bụ n’ịkụzi okwu ụgha dị iche iche na ijikọ onwe ya na ndị ndọrọ ndọrọ ọchịchị rụrụ arụ. (Mkpughe 18:5) Ebe ọ bụ na ntaramahụhụ emesịwo chụkwute ya, ìgwè ndị ahụ nọ n’eluigwe na-etipụ mkpu Haleluya nke ugbo abụọ ugbu a.
4. Gịnị ka e sere onyinyo ya site n’eziokwu bụ na anwụrụ ọkụ Babilọn Ukwu ahụ “na-arịgo elu ruo mgbe nile ebighị ebi”?
4 E sunyewo ọkụ na Babilọn Ukwu ahụ dị ka obodo e meriri emeri, anwụrụ ọkụ ya ‘na-arịgokwa elu ruo mgbe nile ebighị ebi.’ Mgbe usuu ndị agha nwere mmeri sunyere obodo nkịtị ọkụ, anwụrụ ọkụ ya na-anọgide na-arịgo elu n’oge nile ntụ ahụ ka dị ọkụ. Icheku ọkụ nke mkpọmkpọ ebe ya nile ga-ere onye ọ bụla nke nwara iwughachi ya mgbe anwụrụ ọkụ ka na-akwụpụta na ya. Ebe ọ bụ na anwụrụ ọkụ nke Babilọn Ukwu ahụ ga-arịgo “ruo mgbe nile ebighị ebi” dị ka ihe àmà nke ikpe ya nke na-enweghị mmekwata, ọ dịghị onye ọ bụla ga-enwe ike iwughachi obodo ahụ rụrụ arụ. Okpukpe ụgha apụwo ruo mgbe ebighị ebi. Haleluya, n’ezie!—Tụlee Aịsaịa 34:5, 9, 10.
5. (a) Gịnị ka 24 ndị okenye na ihe anọ ahụ dị ndụ mere, kwuokwa? (b) N’ihi gịnị ka abụ Haleluya ahụ ji bụrụ ihe dị ụtọ karịa Haleluya a na-abụ na chọọchị nile nke Krisendọm?
5 N’otu ọhụụ bu ụzọ, Jọn hụrụ ihe anọ dị ndụ gburugburu ocheeze ahụ, ha na 24 ndị okenye ahụ ndị sere onyinyo ndị nketa Alaeze ahụ n’ọnọdụ ha dị ebube n’eluigwe. (Mkpughe 4:8-11) Ugbu a ọ hụrụ ha ọzọ ka ha na-etipụ mkpu Haleluya nke ugbo atọ n’ihi mbibi Babilọn Ukwu ahụ: “ [Ndị okenye iri abụọ na anọ] ahụ na ihe anọ ahụ nke dị ndụ wee daa n’ala, kpọọ isiala nye Chineke, bụ́ Onye na-anọkwasị n’ocheeze ahụ, sị, Amen; Haleluya.” (Mkpughe 19:4) Ya mere, ntikọ mkpu Haleluya nke a bụ tụkwasị ‘n’abụ ọhụrụ’ nke otuto ahụ a na-abụ nye Nwa Atụrụ ahụ. (Mkpughe 5:8, 9) Ugbu a, ha na-abụ abụ mmeri ahụ mara oké mma, nke na-enye Eze Onyenwe anyị bụ́ Jehova otuto nile n’ihi oké mmeri o meriri oké akwụna ahụ, bụ́ Babilọn Ukwu ahụ. Haleluya ndị a na-adapụta ụda ọma karịa abụ Haleluya ọ bụla a bụworo na chọọchị nile nke Krisendọm, ebe a na-adịghị enye Jehova, ma ọ bụ Jaa, nsọpụrụ, na-ewedakwa ya n’ala. A na-emenyụ ịbụ abụ ihu abụọ ahụ nke na-ekwutọ Jehova ugbu a ruo mgbe ebighị ebi!
6. Ònye ka a nụrụ “olu” ya, gịnị ka ọ gbara ume ya, oleekwa ndị na-ekere òkè n’ịza òkù ahụ?
6 Ọ bụ na 1918 ka Jehova malitere inyeghachi ‘ndị na-atụ egwu aha ya ụgwọ ọrụ, ndị nta na ndị ukwu’—ndị mbụ n’ime ndị a bụ ndị Kraịst ahụ e tere mmanụ ndị nwụworo n’ikwesị ntụkwasị obi, ndị ọ kpọlitere ma debekwa ha n’ọnọdụ ndị okenye 24 ahụ nọ n’eluigwe. (Mkpughe 11:18) Ndị ọzọ na-esonyere ndị a n’ịbụ abụ Haleluya ndị ahụ, n’ihi na Jọn kọrọ, sị: “Otu olu wee site n’ocheeze ahụ daa, sị, Na-etonụ Chineke anyị, unu ndị ohu ya nile, ndị na-atụ egwu ya, ndị nta na ndị ukwu.” (Mkpughe 19:5) Nke a bụ “olu” nke Ọnụ Na-ekwuru Jehova, bụ́ Ọkpara nke ya, Jisọs Kraịst, onye na-eguzo “n’etiti ocheeze ahụ.” (Mkpughe 5:6) Ọ bụghị nanị n’eluigwe, kamakwa n’elu ala ebe a, “unu ndị ohu ya nile” na-ekere òkè n’ịbụ abụ ahụ, ebe òtù Jọn ahụ e tere mmanụ na-ebute ụzọ n’elu ala. Lee nnọọ ka ndị a nile si jiri ọṅụ na-ekere òkè n’irube isi n’iwu ahụ bụ́: “Na-etonụ Chineke anyị”!
7. Mgbe e bibisịrị Babilọn Ukwu ahụ, olee ndị ga na-enye Jehova otuto?
7 Ee, a gụnyekwara ndị nke oké ìgwè mmadụ ahụ n’etiti ndị ohu ndị a. Kemgbe 1935, ndị a anọgidewo na-apụta site na Babilọn Ukwu ahụ, ha enwetawokwa mmezu nke nkwa Chineke, bụ́: “Ọ ga-agọzi ndị na-atụ egwu Jehova, ma ndị nta ma ndị ukwu.” (Abụ Ọma 115:13) Mgbe e bibiri Babilọn ahụ nke yiri akwụna, ọtụtụ nde n’ime ha ga-esonye ‘n’ito Chineke anyị’—ha na ndị òtù Jọn ahụ na ìgwè ndị nile bi n’eluigwe. Mgbe e mesịrị, ihe ịrụ ụka adịghị ya na ndị a kpọlitere n’ọnwụ n’elu ala, ma ha bụbu ndị a ma ama ma ọ bụ na ha abụghị, ga-abụkwa abụ Haleluya ndị ọzọ mgbe ha nụrụ na Babilọn Ukwu ahụ agabigawo ruo mgbe ebighị ebi. (Mkpughe 20:12, 15) Otuto nile dịrị Jehova maka oké mmeri nke a o meriri nwanyị ahụ na-akwa iko eri ogologo oge!
8. Mkpali dị aṅaa ka abụ otuto ndị ahụ Jọn hụrụ ka a na-abụ n’eluigwe kwesịrị inye anyị ugbu a, tupu e bibie Babilọn Ukwu ahụ?
8 Lee nnọọ ihe mkpali ihe a nile bụụrụ anyị ikere òkè zuru ezu n’ọrụ Chineke maka oge a! Ka ndị ohu nile nke Jaa tinye onwe ha site n’obi na mkpụrụ obi ha dum n’ịkpọsa ikpe nile nke Chineke, tinyekwara olileanya Alaeze ahụ dị ebube ugbu a, tupu a chụpụ Babilọn Ukwu ahụ n’ọkwá ma bibie ya.—Aịsaịa 61:1-3; 1 Ndị Kọrint 15:58.
‘Haleluya—Jehova Bụ Eze!’
9. N’ihi gịnị ka Haleluya nke ikpeazụ ahụ ji bụrụ ụda juru nnọọ eju, dapụtakwa nke ọma?
9 E nwere ihe ndị ọzọ kpatara a ga-eji nwee ọṅụ, dị ka Jọn gara n’ihu ịgwa anyị: “M wee nụ ihe dị ka olu nke oké ìgwè ndị, dịkwa ka olu ọtụtụ mmiri, dịkwa ka olu égbè eluigwe dị ike, na-asị, Haleluya: n’ihi na Onyenwe anyị Chineke anyị, Onye Pụrụ Ime Ihe Nile, na-abụ eze.” (Mkpughe 19:6) Haleluya nke ikpeazụ a bụ nke mere mkpọsa ahụ ka o nwee akụkụ anọ hà nhata. Ọ bụ ụda eluigwe dị ukwuu, dịkwa mma karịa ụda olu òtù egwu ọ bụla nke ụmụ mmadụ, dịkwa ebube karịa mmiri ọ bụla si n’elu na-asọdata n’ebe ọ bụla n’elu ala, na-akpatakwa egwu karịa ụda égbè eluigwe ọ bụla a nụrụ na mbara igwe. Ìgwè olu ndị ahụ a nụrụ n’eluigwe na-enwe ọṅụ n’ihi eziokwu ahụ bụ́ na ‘Jehova Chineke anyị, Onye Pụrụ Ime Ihe Nile, amalitewo ịbụ eze.’
10. N’echiche dị aṅaa ka a pụrụ ikwu na Jehova malitere ịbụ eze mgbe e bibisịrị Babilọn Ukwu ahụ?
10 Ma, ò si aṅaa bụrụ na Jehova malitere ịbụ eze? Ọtụtụ puku afọ agabigawo eri mgbe onye ọbụ abụ ahụ kwupụtara, sị: “Chineke bụ Eze m site na mgbe ochie.” (Abụ Ọma 74:12) Ọbụbụeze Jehova emewo ochie ọbụna n’oge ahụ, ya mere, olee otú òtù egwú eluigwe na ala ahụ ga-esi bụọ abụ sị na ‘Jehova amalitewo ịbụ eze’? Ọ bụ n’ihi na mgbe e bibiri Babilọn Ukwu ahụ, Jehova agaghị enwekwa onye mpako ahụ na-ama ya aka nke ga-ebelata nrubeisi a na-enye ya dị ka Ọkaaka Eluigwe na Ala. Okpukpe ụgha agaghị akpalikwa ndị ọchịchị ụwa imegide ya. Mgbe Babilọn oge ochie dara site n’ọchịchị nke ụwa, Zaịọn nụrụ mkpu mmeri ahụ bụ́: “Chineke gị bụ eze!” (Aịsaịa 52:7) Mgbe a mụsịrị Alaeze ahụ na 1914, ndị okenye 24 ahụ tiri mkpu, sị: “Anyị na-ekele gị, Onyenwe anyị Chineke, . . . n’ihi na i werewo oké ike gị, ị bụkwara eze.” (Mkpughe 11:17) Ugbu a, mgbe mbibi Babilọn Ukwu ahụ gasịrị, a na-etipụkwa mkpu ahụ ọzọ, sị: ‘Jehova amalitewo ịbụ eze.’ Ọ dịghị chi ọ bụla mmadụ mere nke ga-anọgide ịma ọkaaka nke ezi Chineke ahụ, bụ́ Jehova aka!
Ọlụlụ Nwanyị nke Nwa Atụrụ ahụ dị Nso!
11, 12. (a) Gịnị ka Jerusalem oge ochie kpọrọ Babilọn oge ochie, na-esetịpụ ụkpụrụ dị aṅaa nye Jerusalem Ọhụrụ na Babilọn Ukwu ahụ? (b) Mgbe e merisịrị Babilọn Ukwu ahụ, gịnị ka ìgwè ndị nọ n’eluigwe na-abụ, na-emekwa mkpọsa ya?
11 “Gị onye iro m [bụ́ nwanyị, NW]”! Nke ahụ bụ ihe Jerusalem, bụ́ ebe ụlọ nsọ nke ofufe Jehova dị, kpọrọ Babilọn ahụ na-ekpere arụsị. (Maịka 7:8) Otú ahụkwa, “obodo nsọ ahụ, bụ́ Jerusalem Ọhụrụ,” nke ihe mejupụtara ya bụ nwunye ọhụrụ nke nwere 144,000 ndị òtù, nwere ezi ihe mere ọ ga-eji kpọọ Babilọn Ukwu ahụ onye iro ya. (Mkpughe 21:2) Ma n’ikpeazụ oké akwụna ahụ enwetawo ihe isi ike, ọdachi, na mbibi. Omume mgbaasị ya na ndị na-agụrụ ya kpakpando enweghị ike ịzọpụta ya. (Tụlee Aịsaịa 47:1, 11-13.) Nke a bu n’ezie mmeri bụ isi nye ezi ofufe!
12 Ebe ajọ akwụna ahụ, bụ́ Babilọn Ukwu ahụ, pụworo n’anya ruo ebighị ebi, a pụrụ ugbu ilekwasị anya na nwanyị ahụ Nwa Atụrụ ahụ na-alụ ọhụrụ, nke dị ọcha dị ka nwa agbọghọ na-amaghị nwoke! N’ihi ya, ìgwè ndị ahụ nọ n’eluigwe ji oké ọṅụ bụọ abụ n’inye Jehova otuto, sị: “Ka anyị ṅụrịa ọṅụ, ka obi na-atọkwa anyị ụtọ nke ukwuu, ka anyị werekwa otuto nile nye ya: n’ihi na ọlụlụ nwunye nke Nwa Atụrụ ahụ abịawo, nwunye ya edoziwokwa onwe ya. E wee kwenyere ya ka o gbokwasị onwe ya ezi ákwà ọcha na-enwu enwu, nke dịkwa ọcha: n’ihi na ezi ákwà ọcha ahụ bụ ezi omume nile nke ndị nsọ.”—Mkpughe 19:7, 8.
13. Nkwadebe dị aṅaa ka e meworo maka ọlụlụ nwunye Nwa Atụrụ ahụ n’ime ọtụtụ narị afọ ndị gafeworonụ?
13 Kemgbe ọtụtụ narị afọ, Jisọs emewo nkwadebe ịhụnanya maka alụmdi na nwunye eluigwe nke a. (Matiu 28:20; 2 Ndị Kọrint 11:2) Ọ nọwo na-eme ka 144,000 Israel ime mmụọ dịrị ọcha, ka o wee “chee nzukọ ahụ n’ihu onwe ya dị ka ihe dị ebube, n’enweghị ntụpọ ma ọ bụ ihu ndọli ma ọ bụ ihe ọ bụla n’ihe dị otú a; kama ka o wee dị nsọ bụrụkwa ihe a na-apụghị ịta ụta.” (Ndị Efesọs 5:25-27) N’iburu n’uche inweta “ihe a na-agbata n’ọsọ nke ọkpụkpọ dị elu nke Chineke,” ọ dịwo onye Kraịst ọ bụla e tere mmanụ mkpa iyipụ mmadụ ochie na omume ya nile, yikwasị mmadụ ọhụrụ nke onye Kraịst, na-arụkwa ọrụ ezi omume ‘site ná mkpụrụ obi ha nile dị ka hà na-arụrụ ya Jehova.’—Ndị Filipaị 3:8, 13, 14; Ndị Kọlọsi 3:9, 10, 23.
14. Olee ụzọ Setan siworo nwaa imerụ ndị gaje iso n’òtù nwunye Nwa Atụrụ ahụ?
14 Malite na Pentikọst 33 O.A. gaa n’ihu, Setan jiri Babilọn Ukwu ahụ mere ngwá ọrụ ná mgbalị ya imerụ ndị òtù nwunye Nwa Atụrụ ahụ. Ka ọ na-erule ọgwụgwụ nke narị afọ mbụ, ọ kụnyewo mkpụrụ nke okpukpe Babilọn n’ime ọgbakọ. (1 Ndị Kọrint 15:12; 2 Timoti 2:18; Mkpughe 2:6, 14, 20) Pọl onyeozi jiri okwu ndị a kọwaa ndị ahụ na-agba okwukwe mgba okpuru: “N’ihi na mmadụ dị otú a bụ ndị ozi ụgha, ndị ọrụ na-atụ ntụ, ndị na-eme onwe ha ka ha yie ndị ozi Kraịst. Ọ bụghịkwa ihe ijuanya; n’ihi na Setan onwe ya na-eme onwe ya ka o yie mmụọ ozi nke ìhè.” (2 Ndị Kọrint 11:13, 14) Na narị afọ ndị sochirinụ, Krisendọm nke dapụworo n’ezi ofufe, dị ka akụkụ ndị ọzọ nke Babilọn Ukwu ahụ, yikwasịrị onwe ya uwe nke akụ na ihe ùgwù, “ákwà odo odo na ákwà uhie, . . . ọlaedo na nkume dị oké ọnụ ahịa na pearl.” (Mkpughe 17:4) Ndị ụkọchukwu na ndị popu ya esorowo ndị ọchịchị agụụ mwụfu ọbara na-agụsi ike mee nkwekọrịta, ndị dị ka Constantine na Charlemagne. Ọ dịghị mgbe ọ bụla e gbokwasịrị ya “ezi omume nile nke ndị nsọ.” Dị ka nwunye ọhụrụ ụgha, ọ bụ n’ezie ọrụ nkà nke nduhie Setan. N’ikpeazụ, ọ pụwo n’anya ruo mgbe ebighị ebi!
Nwunye Nwa Atụrụ ahụ Edoziwo Onwe Ya
15. Olee ụzọ e si aka akara ahụ, gịnịkwa ka a chọrọ n’aka onye Kraịst e tere mmanụ?
15 Ya mere ugbu a, mgbe ihe chọrọ iru 2,000 afọ gasịworo, 144,000 ndị ahụ nile so n’òtù nwanyị ahụ a na-alụ ọhụrụ akwadebewo onwe ha. Ma, ọ̀ bụ kpọmkwem n’oge dị aṅaa ka a pụrụ ikwu na ‘nwunye Nwa Atụrụ ahụ edoziwo onwe ya’? N’ụzọ na-aga n’ihu n’ihu, malite na Pentikọst 33 O.A., ‘e jiwo nkwa nke mmụọ nsọ ahụ’ kaa ndị kwere ekwe e tere mmanụ akara, nke a bụkwa n’iburu “ụbọchị mgbapụta” n’uche. Dị ka Pọl onyeozi si kwuo ya, Chineke “[akawokwa] anyị akara, nyekwa anyị mmụọ nsọ n’obi anyị, bụ́ ihe anyị ji mara na anyị ga-enwezu nkwa ahụ nile.” (Ndị Efesọs 1:13; 4:30; 2 Ndị Kọrint 1:22) N’otu n’otu, ndị Kraịst e tere mmanụ bụ “ndị a kpọworo, ndị a họpụtawokwara,” ha egosipụtawokwa onwe ha ịbụ “ndị kwesịkwara ntụkwasị obi.”—Mkpughe 17:14.
16. (a) Olee mgbe ịka akara nke Pọl onyeozi ji bụrụ ihe zuru ezu, ànyị sikwa aṅaa mara? (b) Olee mgbe nwunye Nwa Atụrụ ahụ ‘ga-edoziworị onwe ya’ n’ụzọ zuru ezu?
16 Mgbe ọtụtụ iri afọ nke ule gafesịrị, Pọl n’onwe ya pụrụ ikwu, sị: “Agbasịwo m mgba ọma ahụ, agbasịwo m ọsọ ahụ, edebesịwo m okwukwe ahụ: nke fọdụrụ bụ na e debeworo m okpueze nke ezi omume ahụ, nke Onyenwe anyị, bụ́ onye ezi omume n’ikpe ikpe, ga-enyeghachi m n’ụbọchị ahụ: ma ọ bụghị nanị mụ onwe m, kama ọ ga-enyeghachikwa ndị nile hụworo ngosi ya n’anya.” (2 Timoti 4:7, 8) O yiri nnọọ ka akara nke onyeozi ahụ ò zuwo okè, ọ bụ ezie na ọ ka nọ n’anụ ahụ, na ọ ka gajekwa iche ọnwụ okwukwe ihu. N’otu aka ahụkwa, oge ahụ aghaghị ịbịa, bụ́ mgbe ndị nile fọdụrụ na 144,000 ahụ n’elu ala ga-abụworị ndị a kara akara n’otu n’otu dị ka ndị bụ nke Jehova. (2 Timoti 2:19) Nke a ga-abụ mgbe nwunye Nwa Atụrụ ahụ ga-edoziworị onwe ya n’ụzọ zuru ezu—ihe ka n’ọnụ ọgụgụ na 144,000 ahụ ga-abụworị ndị natara ụgwọ ọrụ ha n’eluigwe, ndị ka nọ n’elu ala ga-abụkwa ndị nweworo nnwapụta nke ikpeazụ, ndị a kawokwara akara dị ka ndị kwesịrị ntụkwasị obi.
17. Olee mgbe ọlụlụ nwunye nke Nwa Atụrụ ahụ pụrụ iwere ọnọdụ?
17 Kpọmkwem n’oge a dị ka ọgụgụ oge Jehova si dị, mgbe ịka akara nke 144,000 ahụ zuworo, ndị mmụọ ozi ahụ ga-atọhapụ ikuku anọ nke oké mkpagbu ahụ. (Mkpughe 7:1-3) Nke mbụ, mmezu ikpe ọmụma ga-abịakwasị Babilọn Ukwu ahụ nke yiri akwụna. Mgbe ahụ, Kraịst ahụ na-enwe mmeri ga-aga n’ihu ruo Amagedọn iji bibie ihe fọdụrụ ná nzukọ Setan dị n’elu ala na n’ikpeazụkwa, ịtụba Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya n’abyss. (Mkpughe 19:11–20:3) Ọ bụrụ na e nwere ndị e tere mmanụ fọdụrụ ndụ n’ụwa, ihe ịrụ ụka adịghị ya na ha ga-abanye n’ụgwọ ọrụ ha nke eluigwe n’oge na-adịghị anya mgbe Kraịst merisịrị, ha ga-esonyekwara ndị ibe ha so n’òtù nwunye ọhụrụ ahụ. Mgbe ahụ, n’oge nke Chineke, ọlụlụ nwanyị nke Nwa Atụrụ ahụ ga-ewere ọnọdụ!
18. Abụ Ọma 45 si aṅaa kwadoo usoro ihe omume n’ihe metụtara ọlụlụ nwunye nke Nwa Atụrụ ahụ?
18 Ihe ndekọ amụma dị n’Abụ Ọma 45 na-akọwa usoro ihe ji mee. Eze ahụ e dokwasịworo n’ocheeze bu ụzọ gabiga imeri ndị iro ya. (Amaokwu 1-7) Mgbe ahụ, e mere ememe ọlụlụ di na nwunye ahụ, ụmụ agbọghọ bụ́ ndị enyi nwanyị ahụ a na-alụ ọhụrụ n’eluigwe, bụ́ oké ìgwè mmadụ ahụ, na-ejekwara ya ozi n’elu ala. (Amaokwu 8-15) Ihe ọzọ merenụ bụ na alụmdi na nwunye ahụ mịpụtara mkpụrụ, na-eme ka ihe a kpọrọ mmadụ si n’ọnwụ bilite ruo izu okè n’okpuru nlekọta nke “ndị isi n’ụwa nile.” (Amaokwu 16, 17) Lee nnọọ aha ngọzi dị ebube ndị ga-eso ọlụlụ nwunye nke Nwa Atụrụ ahụ wee bịa!
Obi Ụtọ Na-adịrị Ndị A Kpọrọ Ịbịa
19. Gịnị bụ nke anọ n’ime obi ụtọ asaa ndị dị ná Mkpughe, oleekwa ndị na-enwe obi ụtọ nke a?
19 Ugbu a, Jọn na-edekọ nke anọ n’ime obi ụtọ asaa ndị ahụ dị ná Mkpughe: “O [mmụọ ozi ahụ onye nọworị na-ekpughere Jọn ihe ndị a] wee sị m, Dee akwụkwọ, Ngọzi na-adịrị ndị a kpọworo ịbịa ná nri anyasị ọlụlụ nwunye nke Nwa Atụrụ ahụ. O wee sị m, Ndị a bụ okwu nke Chineke kwuru n’ezie.” (Mkpughe 19:9)a Ndị ahụ a kpọwororịị ịbịa “ná nri anyasị ọlụlụ nwunye nke Nwa Atụrụ ahụ” bụ ndị so n’òtù nwunye ọhụrụ ahụ. (Tụlee Matiu 22:1-14.) Ndị nile e tere mmanụ so ná nnọkọ ọlụlụ nwunye ahụ na-enwe obi ụtọ nke ịbụ ndị natara ọkpụkpọ òkù a. Ihe ka ọtụtụ n’ime ndị a kpọrọ agaworị n’eluigwe, bụ́ ebe a ga-anọ nwee nri anyasị ọlụlụ nwunye ahụ. Ndị ka nọ n’ụwa nwekwara obi ụtọ na ha natara ọkpụkpọ òkù ahụ. Ọnọdụ ha ná nri anyasị nke ọlụlụ nwunye ahụ bụ ihe e ji n’aka. (Jọn 14:1-3; 1 Pita 1:3-9) Mgbe a kpọlitere ha n’ọnwụ gaa n’eluigwe, mgbe ahụ, ozuzu nke nwunye ọhụrụ ahụ dị n’otu ga-aga n’ihu isoro Nwa Atụrụ ahụ kere òkè n’alụmdi na nwunye ahụ nke obi ụtọ na-enweghị atụ.
20. (a) Gịnị ka okwu ndị a pụtara: “Ndị a bụ okwu nke Chineke kwuru n’ezie”? (b) Olee otú okwu mmụọ ozi ahụ si metụta Jọn, gịnịkwa bụ nzaghachi nke mmụọ ozi ahụ?
20 Mmụọ ozi ahụ kwukwara na “ndị a bụ okwu nke Chineke kwuru n’ezie.” Okwu a bụ “n’ezie” na-asụgharị okwu Grik bụ a·le·thi·nosʹ, ọ pụtakwara “nke bụ eziokwu,” ma ọ bụ “ihe a pụrụ ịdabere na ya.” Ebe ọ bụ na okwu ndị a sitere n’ọnụ Jehova n’ezie, ha kwesịrị ntụkwasị obi, kwesịkwa ndabere. (Tụlee 1 Jọn 4:1-3; Mkpughe 21:5; 22:6.) Dị ka onye a kpọworo ịbịa n’oriri ọlụlụ nwunye ahụ, ọ ghaghị ịbụ na ọṅụ jupụtara obi Jọn mgbe ọ nụrụ nke a, mgbe ọ na-atụgharịkwa uche ná ngọzi ndị na-echere òtù nwunye ọhụrụ ahụ. N’eziokwu, a kpaliri ya nke ukwuu nke na ọ dịrị mkpa ka mmụọ ozi ahụ nye ya ndụmọdụ, dị ka Jọn gara n’ihu ịkọ, sị: “M wee daa n’ala n’ihu ụkwụ ya ịkpọ isiala nye ya. O wee sị m, Lezie anya ka ị ghara ime ya: abụ m ohu ibe gị, bụrụkwa ohu ibe nke ụmụnna gị nke nwere àmà nke Jisọs: kpọọ isiala nye Chineke.”—Mkpughe 19:10a.
21. (a) Gịnị ka Mkpughe na-eme ka a mara banyere ndị mmụọ ozi? (b) Àgwà dị aṅaa ka ndị Kraịst kwesịrị inwe n’ebe ndị mmụọ ozi nọ?
21 N’ime akwụkwọ Mkpughe nile, a gbara àmà kwesịrị ịrịba ama banyere ikwesị ntụkwasị obi na ịdị uchu nke ndị mmụọ ozi. Ha so n’usoro e ji na-ekpughe eziokwu. (Mkpughe 1:1) Ha na-esoro ụmụ mmadụ na-arụkọ ọrụ n’ikwusa ozi ọma ahụ na n’ịwụpụ ihe otiti ihe atụ ndị ahụ. (Mkpughe 14:6, 7; 16:1) Ha sooro Jisọs buo agha n’ịchụpụ Setan na ndị mmụọ ozi ya site n’eluigwe, ha ga-esokwa ya lụọ ọgụ ọzọ n’Amagedọn. (Mkpughe 12:7; 19:11-14) N’ezie, ha pụrụ iru kpọmkwem n’ebe Jehova n’onwe ya nọ. (Matiu 18:10; Mkpughe 15:6) Otú o sina dị, ha bụ nanị ndị ohu Chineke dị umeala n’obi. E nweghị ohere ọ bụla n’ezi ofufe maka ife ndị mmụọ ozi ofufe ma ọ bụ ọbụna inye ha ofufe n’ụzọ a kpaara ókè, bụ́ ife Chineke ofufe site n’aka “senti” ma ọ bụ mmụọ ozi. (Ndị Kọlọsi 2:18) Ndị Kraịst na-efe nanị Jehova ofufe, na-arịọ ya arịrịọ ha nile site n’aha Jisọs.—Jọn 14:12, 13.
Ọnọdụ Jisọs n’Amụma
22. Gịnị ka mmụọ ozi ahụ gwara Jọn, gịnịkwa ka okwu ndị ahụ pụtara?
22 Mgbe ahụ, mmụọ ozi ahụ kwuru, sị: “N’ihi na àmà nke Jisọs bụ mmụọ nke amụma.” (Mkpughe 19:10b) N’ụzọ dị aṅaa? Nke a pụtara na amụma nile sitere n’ike mmụọ nsọ na-abịa n’ihi Jisọs na ọnọdụ ya ná nzube nile nke Jehova. Amụma mbụ dị na Bible kwere nkwa ọbịbịa nke otu mkpụrụ. (Jenesis 3:15) Jisọs ghọrọ Mkpụrụ ahụ. Mkpughe ndị sochirinụ wulitere ihe ọmụma dị ukwuu nke eziokwu amụma n’elu ntọala nke nkwa mbụ nke a. Pita onyeozi gwara Kọniliọs onye Jentaịl ahụ kwere ekwe, sị: “Onye ahụ [Jisọs] ka ndị amụma nile na-agbara àmà.” (Ọrụ 10:43) Mgbe ihe dị ka 20 afọ gasịrị, Pọl onyeozi sịrị: “Ka ha hà, bụ́ nkwa nke Chineke, ọ bụ n’ime ya [Jisọs] ka Ee dị.” (2 Ndị Kọrint 1:20) Mgbe 43 afọ ọzọ gasịkwara, Jọn n’onwe ya chetaara anyị, sị: “Eziokwu sitere n’aka Jisọs Kraịst bịa.”—Jọn 1:17.
23. N’ihi gịnị ka ọnọdụ na ike dị elu nke Jisọs nwere na-ewepụghị ihe ọ bụla n’ofufe anyị na-efe Jehova?
23 Nke a ọ̀ na-ewepụ ihe ọ bụla site n’ofufe anyị na-enye Jehova? Ee e. Cheta ndụmọdụ ịdọ aka ná ntị nke mmụọ ozi ahụ: “Kpọọ isiala nye Chineke.” Jisọs anwaghị mgbe ọ bụla ịma Jehova aka. (Ndị Filipaị 2:6) N’eziokwu a gwara ndị mmụọ ozi nile ka ha ‘kpọọ isiala nye [Jisọs],’ ihe nile e kere eke aghaghịkwa ịnakwere ọnọdụ ya dị elu ka ọ ga-abụ na “n’aha Jisọs ka ikpere nile [ga-egbu] n’ala.” Ma, rịba ama na nke a bụ “ka e wee nye Chineke, bụ́ Nna, otuto,” ọ bụkwa iwu o nyere. (Ndị Hibru 1:6; Ndị Filipaị 2:9-11) Jehova nyere Jisọs ike dị elu o nwere, sitekwa n’ịnakwere ike ahụ, anyị na-enye Chineke otuto. Ọ bụrụ na anyị ajụ ịnọ n’okpuru ọchịchị Jisọs, ọ bụ otu ihe ahụ ịjụ Jehova Chineke n’onwe ya.—Abụ Ọma 2:11, 12.
24. Olee ihe omume abụọ dị ebube anyị na-atụ anya ha, n’ihi ya, okwu ndị dị aṅaa ka anyị kwesịrị ikwupụta?
24 Ya mere, ka anyị jikọta olu anyị wee kwupụta okwu mmalite ndị ahụ dị n’Abụ Ọma 146 ruo 150: “Toonụ Jaa.” Ka ụda abụ Haleluya ndị ahụ dapụtasie ike ka a na-atụ anya mmeri Jehova ga-emeri alaeze ụwa nke okpukpe ụgha Babilọn! Ka ọṅụ jupụtakwa ebe nile ka ọlụlụ nwunye nke Nwa Atụrụ ahụ na-abịa nso!
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
a Leekwa Mkpughe 1:3; 14:13; 16:15.
Igbe dị na peeji nke 273]
“Akwụkwọ Ozi E Degaara Sọdọm na Gọmọra”
N’okpuru isiokwu ahụ, Daily Telegraph nke London nke November 12, 1987, kọrọ banyere otu okwu nzukọ General Synod nke Chọọchị England ji n’aka. Nke a na-akpọ òkù ka a chụpụ “ndị Kraịst” na-edina ụdị onwe ha na chọọchị. Onye odeakụkọ bụ Godfrey Barker kwuru, sị: “Achịbishọp nke Canterbury jiri mwute kwuo ụnyahụ, sị: ‘A sị na Senti Pọl ga-edetara Chọọchị England akwụkwọ ozi, anyị pụrụ nnọọ ịjụ ụdị akwụkwọ ozi ọ ga-abụ.’” Maazị Barker n’onwe ya kwuru, sị: “Akwụkwọ ozi e degaara Sọdọm na Gọmọra bụ azịza ya,” wee kwuokwa, sị: “Dr Runcie [achịbishọp ahụ] chere na ọ ga-adị ka ihe dị ná Ndị Rom, Isi 1.”
Onye odeakụkọ ahụ hotara okwu Pọl dị ná Ndị Rom 1:26-32, sị: “Chineke raara ha nye n’agụụ ihe ọjọọ nke obi ha ime ihe rụrụ arụ. . . . Ndị ikom na-esoro ndị ikom na-eme ihe na-asọ oyi . . . ọ bụ ezie na ha maara iwu Chineke na ndị na-eme ihe dị otú ahụ kwesịrị ịnwụ anwụ, ọ bụghị nanị na ha na-eme ya, kama ha na-akwado ndị na-eme ha.” O mechiri okwu ya site n’ịsị: “Nchegbu Senti Pọl bụ nanị banyere ndị nkịtị na-abịa chọọchị. Nsogbu nke Dr Runcie bụ banyere ndị ụkọchukwu.”
N’ihi gịnị ka achịbishọp ahụ ji nwee nsogbu dị otú ahụ? Isi akụkọ ndị gbara okpotokpo ndị e bipụtara na Daily Mail nke London nke October 22, 1987, kwuru, sị: “‘Otu n’ime ndị ejenti atọ ọ bụla bụ ndị na-edina ụdị onwe ha’ . . . Mkpọsa a na-eme iji chụpụ ndị nwoke na-edina nwoke ‘ga-emechi Chọọchị England.’” Akụkọ ahụ hotara ihe onye “reverend” bụ́ odeakwụkwọ ukwu nke Òtù Ndị Kraịst Bụ Ndị Na-edina Ụdị Onwe Ha kwuru, sị: “Ọ bụrụ na a nabata okwu a, ọ ga-eme ka Chọọchị dakpọọ, Achịbishọp nke Canterbury makwaara nke ahụ. Ná nchịkọta, anyị kwere na site na 30 ruo 40 pasentị nke ndị ụkọchukwu Chọọchị England bụ ndị na-edina ụdị onwe ha. Ha bụkwa ndị kasị dịrị irè n’ikere òkè n’ije ozi nke Chọọchị.” Ihe ịrụ ụka adịghị ya na ndalata ọnụ ọgụgụ ndị na-aga chọọchị bụ n’otu akụkụ, ngosipụta nke mwute e nwere ná mmụba ndị ozi chọọchị ndị na-edina ụdị onwe ha.
Gịnị ka nzukọ chọọchị ahụ kpebiri? Ihe ka ọtụtụ n’ebe ọ dị ukwuu, bụ́ 388 ndị so na ya (95 pasentị nke ndị ụkọchukwu) kwadoro ka e belatatụ ịdị ike nke okwu ahụ. Banyere nke a, The Economist nke November 14, 1987, kọrọ, sị: “Chọọchị England na-emegide idina ụdị onwe, ma ọ bụghị n’ụzọ siri ike nke ukwuu. Nzukọ ezumezu ya, bụ́ nnọkọ ndị na-eme iwu nke Chọọchị ahụ, n’iburu ndị ụkọchukwu na-edina ụdị onwe ha n’uche, kpebiri n’izu a na idina ụdị onwe, n’adịghị ka ịkwa iko na ịkwa iko ndị lụworo di na nwunye, abụghị mmehie: ha bụ nanị ‘ihe na-eruchaghị ọ̀tụ̀tụ̀ dị mma,’ na ‘mmekọahụ bụ omume nke nraranye zuru ezu, nke ebe ziri ezi o kwesịrị ịdị bụ ná mmekọrịta na-adịgide adịgide nke alụmdi na nwunye.’” N’igosi ọdịiche dị n’echiche Achịbishọp nke Canterbury na okwu ahụ doro anya nke Pọl onyeozi kwuru ná Ndị Rom 1:26, 27, The Economist depụtara okwu Pọl ndị ahụ n’elu isiokwu nta bụ “Senti Pọl maara ihe o bu n’uche.”
Jisọs Kraịst makwaara ihe o bu n’uche, o kwukwara nke a n’ụzọ pụtara ìhè. O kwuru na “ala Sọdọm ga-anagide okwu n’Ụbọchị Ikpe” karị ndị okpukpe ahụ ndị gbakụtara ozi ya azụ. (Matiu 11:23, 24) N’ebe a, Jisọs ji ụdị ihe atụ gabigara ókè mee ihe iji gosi na ndị ndú okpukpe ahụ ndị jụrụ Ọkpara Chineke na ozizi ya dị njọ ọbụna karịa ndị Sọdọm ahụ. Jud nke 7 kwuru na ndị Sọdọm nwetara “ahụhụ mmehie nke ọmụma ikpe ziri ezi, nke bụ ọkụ ebighị ebi,” nke pụtara mbibi ebighị ebi. (Matiu 25:41, 46) Ya mere, lee ka ọ ga-esi sie ike bụ́ ọmụma ikpe nke ndị ahụ kpọrọ onwe ha ndị ndú ndị Kraịst, bụ́ ndị nọ n’ìsì ma na-eduru ìgwè ndị kpuru ìsì pụọ n’ụkpụrụ dị elu nke Alaeze Chineke banye n’ụzọ ụwa nke onye ọ bụla ime ihe sọrọ ya, nke rụkwara arụ! (Matiu 15:14) Banyere okpukpe ụgha, bụ́ Babilọn Ukwu ahụ, olu ahụ sitere n’eluigwe na-akpọ òkù dị ngwa: “Ndị nke m, sinụ n’ime ya pụta, ka unu wee ghara iso ya nwekọọ mmehie ya nile, gharakwa ịnata ụfọdụ n’ime ihe otiti ya nile.”—Mkpughe 18:2, 4.
[Foto ndị dị na peeji nke 275]
A na-anụ Haleluya anọ n’eluigwe, na-eto Jaa maka mmeri ikpeazụ o meriri Babilọn Ukwu ahụ