Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w98 4/1 p. 10-15
  • Akwụkwọ Dịịrị Mmadụ Nile

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Akwụkwọ Dịịrị Mmadụ Nile
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Akwụkwọ A Kasị Ekesa n’Ụwa
  • Ihe Ndekọ Pụrụ Iche nke Nchekwa
  • Gaa n’Asụsụ Ndị Dị Ndụ nke Ihe A Kpọrọ Mmadụ
  • O Kwesịrị Ịtụkwasị Obi
  • Akwụkwọ “Na-asụ” Asụsụ Ndị Dị Ndụ
    Akwụkwọ Dịịrị Mmadụ Nile
  • Olee Otú Akwụkwọ Ahụ Si Lanarị?
    Akwụkwọ Dịịrị Mmadụ Nile
  • Ọ̀ Dị Anyị Mkpa n’Ezie Inweta Ndị Mbụ Ahụ?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
  • Otú Baịbụl Si Rute Anyị Aka
    Teta!: Otú Baịbụl Si Rute Anyị Aka
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
w98 4/1 p. 10-15

Akwụkwọ Dịịrị Mmadụ Nile

“Chineke abụghị onye na-ele mmadụ anya n’ihu: kama n’ime mba ọ bụla onye na-atụ egwu Ya, onye na-arụkwa ọrụ ezi omume, bụ onye Ọ na-anara nke ọma.”—ỌRỤ 10:34, 35.

1. Olee otú otu prọfesọ si zaghachi mgbe a jụrụ ya ihe o chere banyere Bible, gịnịkwa ka o kpebiri ime?

ONYE prọfesọ ahụ nọ n’ụlọ n’otu ehihie Sunday, n’enweghị onye ọbịa ọ na-atụ anya ya. Ma mgbe otu nwanna anyị nwanyị bụ́ onye Kraịst gara n’ụlọ ya, o gere ntị. Nwanna nwanyị ahụ kwuru banyere mmetọ na ọdịnihu ụwa—isiokwu ndị masịrị ya. Otú ọ dị, mgbe o webatara Bible ná nkwurịta okwu ahụ, o yiri onye nwere obi abụọ. Ya mere ọ jụrụ ya ihe o chere banyere Bible.

“Ọ bụ akwụkwọ ọma ndị ikom ụfọdụ nwere ọgụgụ isi dere,” ka ọ zara, “ma Bible abụghị ihe a ga-eji kpọrọ mkpa.”

“Ị̀ gụtụwo Bible?” ka nwanna nwanyị ahụ jụrụ.

N’ịtụnanya, prọfesọ ahụ aghaghị ikweta na ya agụtụbeghị ya.

Mgbe ahụ ọ jụrụ, sị: “Olee otú ị pụrụ isi kwusie okwu ike banyere akwụkwọ ị na-agụtụbeghị?”

Nwanna anyị nwanyị ji okwu. Prọfesọ ahụ kpebiri inyocha Bible wee mezie mkpebi banyere ya.

2, 3. N’ihi gịnị ka Bible ji bụụrụ ọtụtụ ndị akwụkwọ a na-adịghị agụ agụ, nke a na-echekwa anyị ihe ịma aka dị aṅaa n’ihu?

2 Ọ bụghị nanị prọfesọ ahụ na-eche otú ahụ. Ọtụtụ ndị nwere echiche nke ha kpọmkwem banyere Bible ọ bụ ezie na ha agụtụbeghị ya n’onwe ha. Ha pụrụ inwe Bible. Ha pụrụ ikweta n’uru ọ bara na nkà mmụta ma ọ bụ n’akụkọ ihe mere eme. Ma nye ọtụtụ ndị, ọ bụ akwụkwọ a na-adịghị agụ agụ. ‘Enweghị m ohere ịgụ Bible,’ ka ụfọdụ na-ekwu. Ndị ọzọ na-ajụ sị, ‘Olee otú akwụkwọ ochie pụrụ isi dị mkpa ná ndụ m?’ Echiche dịgasị otú ahụ na-eche anyị oké ihe ịma aka n’ihu. Ndịàmà Jehova kwenyesiri ike na Bible “si n’obi Chineke pụta, ọ bakwara uru iji zie ihe.” (2 Timoti 3:16, 17) Ma olee otú anyị pụrụ isi mee ka ndị mmadụ kwenye na n’agbanyeghị nzụlite agbụrụ, mba, ma ọ bụ ebo ha, ha kwesịrị inyocha Bible?

3 Ka anyị tụlee ihe ụfọdụ mere Bible ji kwesị nnyocha. Ntụle dị otú ahụ pụrụ ịkwadebe anyị iso ndị anyị zutere n’ozi anyị tụgharịa uche, ikekwe na-eme ka ha kwenye na ha kwesịrị ichebara ihe Bible na-ekwu echiche. N’otu oge ahụ, ntụleghachi a kwesịrị iwusi okwukwe nke anyị ike na Bible bụ, n’ezie, ihe ọ na-azọrọ ịbụ—“okwu Chineke.”—Ndị Hibru 4:12.

Akwụkwọ A Kasị Ekesa n’Ụwa

4. N’ihi gịnị ka a pụrụ iji kwuo na Bible bụ akwụkwọ a kasị ekesa n’ụwa?

4 Nke mbụ, Bible kwesịrị nchebara echiche n’ihi na n’ọ̀tụ̀tụ̀ dị ukwuu ọ bụ akwụkwọ a kasị ekesa na nke a kasị asụgharị n’akụkọ ihe mere eme nile nke mmadụ. Ihe karịrị afọ 500 gara aga, e biri mbipụta mbụ e ji ígwè mkpụrụ akwụkwọ ndị a na-edogharị edogharị bie n’ígwè obibi akwụkwọ Johannes Gutenberg. Eri mgbe ahụ, e biwo ihe dị ka ijeri Bible anọ, n’ozuzu ya ma ọ bụ akụkụ ya ụfọdụ. Ka ọ na-erule 1996, a sụgharịwo Bible dum ma ọ bụ akụkụ ya ụfọdụ gaa n’asụsụ na olumba 2,167.a Ihe karịrị pasent 90 nke ezinụlọ mmadụ nwere ike inweta ma ọ dịkarịa ala akụkụ ụfọdụ nke Bible n’asụsụ nke aka ha. Ọ dịghị akwụkwọ ọzọ—nke okpukpe ma ọ bụ nke na-abụghị—bịatụrụ nso!

5. N’ihi gịnị ka anyị kwesịrị iji tụọ anya na ndị mmadụ gburugburu ụwa ga-enwe ike inweta Bible?

5 Ndekọ ọnụ ọgụgụ nanị adịghị anwapụta na Bible bụ Okwu Chineke. Ma, n’ezie anyị kwesịrị ịtụ anya ka ihe ndekọ nke si n’obi Chineke pụta bụrụ ihe ụmụ mmadụ n’ụwa nile nwere ike inweta. E kwuwerị, Bible n’onwe ya na-agwa anyị na “Chineke abụghị onye na-ele mmadụ anya n’ihu: kama n’ime mba ọ bụla onye na-atụ egwu Ya, onye na-arụkwa ọrụ ezi omume, bụ onye Ọ na-anara nke ọma.” (Ọrụ 10:34, 35) N’adịghị ka akwụkwọ ọ bụla ọzọ, Bible agabigawo ókèala mba nile, meriekwa ihe mgbochi agbụrụ na ebo. N’ezie, Bible bụ akwụkwọ dịịrị mmadụ nile!

Ihe Ndekọ Pụrụ Iche nke Nchekwa

6, 7. N’ihi gịnị ka ọ na-abụghị ihe ijuanya na ọ dịghị nke n’ime ihe ndị mbụ e dere na Bible a maara ka dị, ajụjụ dị aṅaa ka nke a na-ewelitekwa?

6 E nwere ihe ọzọ mere Bible ji kwesị nnyocha. Ọ lanarịwo ihe mgbochi ma ndị na-esiteghị n’aka mmadụ ma ndị sitere n’aka mmadụ. Ihe ndekọ nke otú e siworo chekwaa ya n’agbanyeghị ihe ịma aka ndị dị ukwuu pụrụ nnọọ iche n’ebe ihe odide ndị nke oge ochie dị.

7 Ihe àmà na-egosi na ndị dere Bible ji ink dee okwu ha n’elu papyrus (e si n’ihe ọkụkụ Ijipt nwere otu aha ahụ mee) na parchment (e ji akpụkpọ anụ mee).b (Job 8:11) Ma, ihe ndị dị otú ahụ e ji ede ihe nwere ndị iro na-esiteghị n’aka mmadụ. Ọkà mmụta bụ́ Oscar Paret na-akọwa, sị: “Ihe abụọ ndị a e ji ede ihe nọ n’otu oké ihe ize ndụ ahụ nke mmiri, evu, na ụdị ikpuru dị iche iche. Anyị maara site n’ihe na-eme kwa ụbọchị ụzọ o si dị mfe na akwụkwọ, na ọbụna akpụkpọ anụ siri ike, na-erekasị n’èzí ma ọ bụ n’ọnụ ụlọ dị udè.” Ya mere ọ bụghị ihe ijuanya na ọ dịghị nke n’ime ndị mbụ a maara ka dị; ikekwe ha erekasịwo ogologo oge gara aga. Ma ọ bụrụ na ndị iro na-esiteghị n’aka mmadụ mebiri ndị mbụ, olee otú Bible si lanarị?

8. Eri ọtụtụ narị afọ, olee otú e si chekwaa ihe odide Bible?

8 Ngwa ngwa e desịrị ndị mbụ, a malitere imepụta ndị e ji aka depụtaghachi. N’ezie, idepụtaghachi Iwu ahụ na akụkụ ndị ọzọ nke Akwụkwọ Nsọ ghọrọ aka ọrụ n’Israel oge ochie. Dị ka ihe atụ, a kọwara onye nchụàjà bụ́ Ezra dị ka “odeakwụkwọ nke bụ onye ọkà n’iwu Mosis.” (Ezra 7:6, 11; tụlee Abụ Ọma 45:1.) Ma ndị e depụtaghachiri na-emebikwa emebi; ka oge na-aga ndị ọzọ kwa e ji aka depụtaghachi aghaghị ịnọchi ha. Usoro a nke ndepụtaghachi gara n’ihu ruo ọtụtụ narị afọ. Ebe ụmụ mmadụ na-ezughị okè, ihe ndị odeakwụkwọ dehiere hà gbanwere ihe odide Bible nke ukwuu? Ihe àmà dị ukwuu na-aza mba!

9. Olee otú ihe atụ ndị Masorete si egosi oké nlezianya na izi ezi nke ndị ndepụtaghachi Bible?

9 Ọ bụghị nanị na ndị odeakwụkwọ ahụ nwere nnọọ nkà kamakwa ha nwere nkwanye ùgwù miri emi maka okwu ndị ha depụtaghachiri. Okwu Hibru maka “odeakwụkwọ” na-ezo aka n’ịgụkọ na idekọ ihe. Iji maa atụ oké nlezianya na izi ezi nke ndị odeakwụkwọ ahụ, tụlee ndị Masorete, ndị ndepụtaghachi nke Akwụkwọ Nsọ Hibru bụ́ ndị biri ndụ n’agbata narị afọ nke isii na iri O.A. Dị ka ọkà mmụta bụ́ Thomas Hartwell Horne si kwuo, ha gụkọrọ “ugbo ole mkpụrụ akwụkwọ [Hibru] nke ọ bụla pụtara n’Akwụkwọ Nsọ Hibru dum.” Chee banyere ihe nke ahụ pụtara! Iji gbochie ịhapụ ọbụna otu mkpụrụ akwụkwọ, ndị ndepụtaghachi a tinyere uche ha n’ọrụ gụrụ ọ bụghị nanị okwu ha depụtaghachiri ọnụ kamakwa mkpụrụ akwụkwọ. Ee, dị ka ngụkọ otu ọkà mmụta si dị, a kọrọ na ha gụkọrọ mkpụrụ akwụkwọ 815,140 n’otu n’otu n’Akwụkwọ Nsọ Hibru! Mgbalị ịdị uchu dị otú ahụ mere ka e nwee ọ̀tụ̀tụ̀ dị elu nke izi ezi.

10. Olee ihe àmà dị ike e nwere na ihe odide Hibru na nke Grik ndị nsụgharị oge a dabeere na ha na-anọchite anya okwu nke ndị mbụ dere ihe n’ụzọ ziri ezi?

10 N’ezie, e nwere ihe akaebe dị ike na ihe odide Hibru na nke Grik ndị nsụgharị ndị nke oge a dabeere na ha na-anọchite anya okwu nke ndị mbụ dere Bible n’izi ezi dị ịrịba ama. Ihe akaebe ahụ gụnyere ọtụtụ puku ihe odide Bible ndị e ji aka depụtaghachi—nke e mere atụmatụ ya ịbụ 6,000 nke Akwụkwọ Nsọ Hibru dum ma ọ bụ akụkụ ya ụfọdụ na ihe dị ka 5,000 nke Akwụkwọ Nsọ Ndị Kraịst na Grik—nke lanarịworo ruo ụbọchị anyị. Ntụle ntụnyere e ji nlezianya mee nke ọtụtụ ihe odide dịnụ emewo ka ndị ọkà mmụta ihe odide nwee ike ịchọpụta ndehie ihe ndị ndepụtaghachi ọ bụla ma kpebie ihe bụ ihe odide mbụ. N’ikwu banyere akụkụ ihe odide Akwụkwọ Nsọ Hibru, ọkà mmụta bụ́ William H. Green pụrụ ikwu n’ihi ya, sị: “A pụrụ nnọọ ikwu n’enweghị mgbagha na ọ dịghị ihe odide oge ochie ọ bụla ọzọ e depụtaworo n’ụzọ ziri ezi dị ka nke a.” A pụrụ inwe obi ike yiri nke ahụ n’akụkụ ihe odide nke Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst.

11. N’ihi ihe dị na 1 Pita 1:24, 25, gịnị mere Bible jiworo lanarị ruo ụbọchị anyị?

11 Lee ka ọ gaara esiwo dị mfe Bible ịla n’iyi e wezụga ndị ahụ e ji aka depụtaghachi nọchiri ndị mbụ, ha na ozi ha dị oké ọnụ ahịa! E nwere nanị otu ihe mere o ji lanarị—Jehova bụ Onye Nchekwa na Onye Nchebe nke Okwu ya. Dị ka Bible n’onwe ya na-ekwu, na 1 Pita 1:24, 25: “Anụ ahụ nile dị ka ahịhịa, ebube ya nile dịkwa ka ụzarị ahịhịa. Ahịhịa akpọnwụwo, ụzarị ya adapụwokwa: ma okwu Onyenwe anyị na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.”

Gaa n’Asụsụ Ndị Dị Ndụ nke Ihe A Kpọrọ Mmadụ

12. Tinyere ọtụtụ narị afọ nke ndepụtaghachi, olee ihe mgbochi ọzọ Bible chere ihu?

12 Ịlanarị ọtụtụ narị afọ nke ndepụtaghachi bụ oké ihe ịma aka, ma Bible chere ihe mgbochi ọzọ ihu—nsụgharị gaa n’asụsụ ndị a na-asụ. Bible aghaghị ịdị na-asụ asụsụ ndị mmadụ iji nwee ike ikwu okwu ga-eru n’obi ha. Otú ọ dị, ịsụgharị Bible—ya na ihe karịrị isiakwụkwọ 1,100 na amaokwu 31,000 ya—abụghị ọrụ dị mfe. Ma, eri ọtụtụ narị afọ, ndị nsụgharị tinyere uche ha n’ọrụ ji ọṅụ nakwere ihe ịma aka ahụ, na-eche ihe mgbochi ndị yiri ka a pụghị imeri ha ihu mgbe ụfọdụ.

13, 14. (a) Olee ihe ịma aka onye nsụgharị Bible bụ́ Robert Moffat chere ihu n’Africa ná mmalite narị afọ nke 19? (b) Olee otú ndị na-asụ Tswana si meghachi omume mgbe e wepụtara Oziọma Luk n’asụsụ ha?

13 Dị ka ihe atụ, tụlee otú e si sụgharịa Bible gaa n’asụsụ ndị Africa. N’afọ 1800, e nwere nanị ihe dị ka asụsụ iri na abụọ a na-ede ede n’Africa nile. Ọtụtụ narị asụsụ ndị ọzọ a na-asụ asụ enweghị usoro odide. Nke a bụ ihe ịma aka chere onye nsụgharị Bible bụ́ Robert Moffat ihu. Na 1821, n’afọ ndụ nke 25, Moffat hiwere òtù chọọchị n’etiti ndị ndịda Africa na-asụ Tswana. Iji mụta asụsụ ha a na-adịghị ede ede, o so ndị ahụ na-emekọrịta ihe. Moffat tachiri obi, n’enweghị enyemaka akwụkwọ nkụzi ma ọ bụ ọkọwa okwu ọ bụla, mesịa mụta asụsụ ahụ, mepụta ụdị ya a na-ede ede, kụziekwara ụfọdụ ndị Tswana ịgụ ihe odide ahụ. Na 1829, mgbe ọ rụworo ọrụ n’etiti ndị Tswana ruo afọ asatọ, ọ sụgharịsịrị Oziọma Luk. O mesịrị kwuo, sị: “E nwere ndị m maara si ọtụtụ narị mile bịa iji nweta Oziọma St. Luk. . . . Ahụwo m ka ha nwetara akụkụ ụfọdụ nke St. Luk, bekwasị ha ákwá, bịakwasịsie ha ike n’obi ha, gbaakwa anya mmiri nke obi ekele, ruo mgbe m gwaworo ihe karịrị otu onye sị, ‘Ị ga-eji anya mmiri mebie akwụkwọ gị.’” Moffat kọkwara banyere otu nwoke Africa hụrụ ndị nọ na-agụ Oziọma Luk ma jụọ ha ihe ha ji. “Ọ bụ okwu Chineke,” ka ha zara. “Ọ̀ na-ekwu okwu?” ka nwoke ahụ jụrụ. “Ee,” ka ha zara, “ọ na-agwa obi okwu.”

14 Ndị nsụgharị tinyere uche ha n’ọrụ dị ka Moffat nyere ọtụtụ ndị Africa ohere mbụ iji ihe odide zirịta ozi. Ma ndị nsụgharị ahụ nyere ndị Africa onyinye bara uru ọbụna karị—Bible n’asụsụ nke ha. Ọzọ, Moffat mere ka ndị Tswana mara aha Chineke, o jikwa aha ahụ mee ihe ná nsụgharị ya dum.c N’ihi ya, ndị Tswana zoro aka n’ebe Bible dị dị ka “ọnụ Jehova.”—Abụ Ọma 83:18.

15. N’ihi gịnị ka Bible ji dị nnọọ ndụ taa?

15 Ndị nsụgharị ọzọ n’akụkụ dị iche iche nke ụwa chere ihe mgbochi ndị yiri ya ihu. Ọbụna na ụfọdụ tinyere ndụ ha n’ihe ize ndụ iji sụgharịa Bible. Chee banyere nke a: A sị na Bible dịgidere nanị na Hibru na Grik ochie, o nwere ike “ịnwụwo” ogologo oge gara aga, n’ihi na ka oge na-aga ọha mmadụ chezọrọ nnọọ asụsụ ndị ahụ, ọ dịghịkwa mgbe e ji mara ha n’ọtụtụ akụkụ nke ụwa. Ma Bible dị nnọọ ndụ, n’adịghị ka akwụkwọ ọ bụla ọzọ, ọ pụrụ “ịgwa” ndị mmadụ gburugburu ụwa okwu n’asụsụ nke aka ha. N’ihi ya, ọ “na-arụsikwa ọrụ ike n’ime . . . ndị kwere [na ya].” (1 Ndị Tesalọnaịka 2:13) The Jerusalem Bible dere okwu ndị a otú a: “Ọ ka bụkwa ike dị adị n’etiti unu ndị kweere ya.”

O Kwesịrị Ịtụkwasị Obi

16, 17. (a) Ka Bible wee kwesị ịtụkwasị obi, olee ihe àmà kwesịrị ịdị? (b) Nye otu ihe atụ na-egosi ezoghị ọnụ nke Mosis so dee Bible.

16 ‘À pụrụ n’ezie ịtụkwasị Bible obi?’ ka ụfọdụ pụrụ ịjụ. ‘Ọ̀ na-ezo aka n’ebe ndị a na-apụghị ịgbagha agbagha na ha dịrị ndụ, ebe ndị dịrị adị n’ezie, na ihe ndị mere eme n’eziokwu dị?’ Ọ bụrụ na anyị ga-atụkwasị ya obi, e kwesịrị inwe ihe àmà na ọ bụ ndị na-elezi anya, na-ekwu eziokwu, dere ya. Nke a na-eweta anyị n’ihe ọzọ mere a ga-eji nyochaa Bible: E nwere ihe àmà dị ike na o ziri ezi, kwesịkwa ịtụkwasị obi.

17 Ndị na-ekwu eziokwu na-ede ihe ga-edekọ ọ bụghị nanị ihe ịga nke ọma kamakwa ọdịda, ọ bụghị nanị ike kamakwa adịghị ike. Ndị dere Bible gosipụtara ezoghị ọnụ dị otú ahụ na-eme ka obi ruo ala. Tụlee, dị ka ihe atụ, ịkọ ihe hoo haa nke Mosis. N’ime ihe ndị ọ gbapere ọnụ kọọ bụ okwu agaghị were were n’ọnụ nke ya, nke n’echiche ya mere ka ọ ghara iru eru ịbụ onye ndú Israel (Ọpụpụ 4:10); ajọ ihie ụzọ o hiere nke gbochiri ya ịbanye n’Ala Nkwa ahụ (Ọnụ Ọgụgụ 20:9-12; 27:12-14); nzọhie ụkwụ nke nwanne ya nwoke, bụ́ Erọn, onye kwenyeere ụmụ Israel na-enupụ isi n’ịkpụ nwa ehi ọlaedo (Ọpụpụ 32:1-6); nnupụisi nke nwanne ya nwanyị, bụ́ Miriam na ahụhụ na-emenye ihere a tara ya (Ọnụ Ọgụgụ 12:1-3, 10); ịrụ arụ nke ụmụ nwanne ya bụ́ Nedab na Abaịhu (Levitikọs 10:1, 2); na ime mkpesa ugboro ugboro na ntamu nke ndị nke Chineke. (Ọpụpụ 14:11, 12; Ọnụ Ọgụgụ 14:1-10) Ọ̀ bụ na ịgbape ọnụ kọọ ihe otú a n’ezoghị ọnụ adịghị egosi ezi nchegbu maka eziokwu? Ebe ndị dere Bible dị njikere ịkọ ihe ndị na-adịghị mma banyere ndị ha hụrụ n’anya, ndị nke ha, na ọbụna ha onwe ha, ọ̀ bụ na e nweghị ezi ihe mere a ga-eji tụkwasị ihe ha dere obi?

18. Gịnị na-aka ihe ndị ndị deturu Bible dere akara dị ka nke kwesịrị ịtụkwasị obi?

18 Nkwekọ nke ndị deturu Bible na-akakwa ihe ndị ha dere akara dị ka nke kwesịrị ịtụkwasị obi. Ọ dị ịrịba ama n’ezie na ndị ikom 40 na-ede ihe n’ogologo oge were afọ 1,600 nwere nkwekọ, ọbụna mgbe a bịara n’ụmụ irighiri ihe. Otú ọ dị, a kpachaghị anya hazie nkwekọ a nke na ọ ga-akpali inyowe enyo ma a kpara ya akpa. N’ụzọ megidere nke ahụ, o doro anya na e bughị ụzọ kpaa nkata nkwekọ ndị ahụ; nkwekọ ahụ doro anya na ọ na-abụkarị ná ndabara.

19. Olee otú akụkọ Oziọma banyere njide Jisọs si na-ekpughe nkwekọ nke o doro anya na a maghị ụma hazie?

19 Iji maa atụ, tụlee otu ihe mere n’abalị e jidere Jisọs. Mmadụ anọ dum dere Oziọma dekọrọ na otu n’ime ndị ahụ na-eso ụzọ mịịrị mma agha gbuo ya ohu onye isi nchụàjà, bepụ ntị nwoke ahụ. Ma, nanị Luk kọọrọ anyị na Jisọs ‘metụrụ ntị ya aka, mee ka ahụ dị ya ike.’ (Luk 22:51) Ma nke ahụ ọ̀ bụghị ihe anyị ga-atụ anya ya n’aka onye edemede a maara dị ka “dibịa nke a hụrụ n’anya”? (Ndị Kọlọsi 4:14) Akụkọ Jọn na-agwa anyị na n’ime ndị na-eso ụzọ nile nọ ya, onye nke mịịrị mma agha bụ Pita—eziokwu nke na-adịghị eju anya n’ihi àgwà Pita nke ime ihe ọkụ ọkụ na n’ike n’ike. (Jọn 18:10; tụlee Matiu 16:22, 23 na Jọn 21:7, 8.) Jọn kọrọ ihe ọzọ yiri ka ọ dịghị mkpa: “Aha ohu ahụ bụ Malkọs.” Gịnị mere o ji bụrụ nanị Jọn nyere aha nwoke ahụ? E ji ihe nta ọzọ bụ eziokwu e kwukanyere ekwukanye n’ihe ndekọ Jọn nye nkọwa ya— “Onye isi nchụàjà maara” Jọn. Ezinụlọ onye isi nchụàjà makwaara ya; ndị na-eje ozi makwa ya, ọ makwa ha.d (Jọn 18:10, 15, 16) Mgbe ahụ, o kwesịrị nnọọ ekwesị na Jọn kpọrọ aha nwoke ahụ e merụrụ ahụ, ebe ndị ọzọ dere Oziọma, ndị na-amaghị nwoke ahụ, na-emeghị otú ahụ. Nkwekọ dị n’etiti ụmụ irighiri ihe nile a dị ịrịba ama, ma o doro anya na ọ bụ n’amaghị ụma. E nwere ọtụtụ ihe atụ ndị yiri ha na Bible dum.

20. Gịnị dị ndị nwere obi eziokwu mkpa ịma banyere Bible?

20 Ya mere ànyị pụrụ ịtụkwasị Bible obi? Kpọmkwem! Ezoghị ọnụ nke ndị dere Bible na nkwenyekọ dị n’ime Bible na-enye ya akara doro anya nke eziokwu. Ọ dị ndị nwere obi eziokwu mkpa ịmara na ha pụrụ ịtụkwasị Bible obi, n’ihi na ọ bụ Okwu sitere n’ike mmụọ nsọ nke “Jehova, Chineke nke eziokwu.” (Abụ Ọma 31:5) E nwere ihe ndị ọzọ mere Bible ji bụrụ akwụkwọ dịịrị mmadụ nile, dị ka isiokwu na-esonụ ga-atụle.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

a Na-adabere n’ọnụ ọgụgụ ndị United Bible Societies bipụtara.

b N’oge ịnọ mkpọrọ ya nke abụọ na Rom, Pọl gwara Timoti ka o weta “akwụkwọ nile, ma nke kachasịnụ, weta akwụkwọ parchment nile.” (2 Timoti 4:13) Ikekwe Pọl na-ekwu ka e weta akụkụ dị iche iche nke Akwụkwọ Nsọ Hibru ka o wee nwee ike ịmụ ha mgbe ọ nọ n’ụlọ mkpọrọ. Nkebi okwu bụ́ “ma nke kachasịnụ . . . parchment nile” pụrụ igosi na ọ gụnyere ma akwụkwọ mpịakọta papyrus ma ndị ọzọ bụ́ nke parchment.

c Na 1838, Moffat sụgharịsịrị Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst. Site n’enyemaka otu enyi ya, ọ sụgharịsịrị Akwụkwọ Nsọ Hibru na 1857.

d E gosikwuru ọmụma Jọn na onye isi nchụàjà na ezinụlọ ya maara onwe ha ma a gatụkwuo n’akụkọ ahụ. Mgbe onye ọzọ n’ime ndị ohu onye isi nchụàjà boro Pita ebubo ịbụ otu n’ime ndị na-eso ụzọ Jisọs, Jọn kọwara na ohu a bụ “onye ikwu nke onye ahụ Pita bipụrụ ntị ya.”—Jọn 18:26.

Olee Otú Ị Ga-esi Zaa?

◻ N’ihi gịnị ka anyị kwesịrị iji tụọ anya ka Bible bụrụ akwụkwọ a kasị nwee ike inweta n’ụwa?

◻ Olee ihe akaebe dịnụ na e chekwawo Bible n’izi ezi?

◻ Olee ihe mgbochi ndị ndị sụgharịrị Bible chere ihu?

◻ Gịnị na-aka ihe ndị e dere na Bible akara dị ka ndị kwesịrị ịtụkwasị obi?

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya