-
Ihe Dị Iche ná Ndị Na-efe Chineke na Ndị Na-anaghị Efe YaỤlọ Nche (Nke A Na-amụ Amụ)—2018 | Jenụwarị
-
-
3. Olee ndị na-akpa àgwà ndị e kwuru banyere ha na 2 Timoti 3:2-5?
3 Pọl onyeozi kwuru na “n’oge ikpeazụ,” a ga-enwe “oge dị oké egwu, nke tara akpụ.” O kwuziri àgwà ọjọọ iri na itoolu ndị mmadụ ga na-akpa n’oge ikpeazụ a. Ihe ndị o kwuru ebe ahụ yiri ihe ndị e kwukwara ná Ndị Rom 1:29-31. Ma àgwà ụfọdụ Pọl kwuru na ndị mmadụ ga na-akpa n’akwụkwọ ozi o degaara Timoti adịghị ebe ọ bụla ọzọ n’Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst. Pọl si otú a bido ikwu banyere àgwà ndị ahụ: “N’ihi na ndị mmadụ ga-abụ . . . ” Ma, ọ bụghị mmadụ niile na-akpa àgwà ndị ahụ. Ndị Kraịst anaghị akpa ha.—Gụọ Malakaị 3:18.
-
-
Ihe Dị Iche ná Ndị Na-efe Chineke na Ndị Na-anaghị Efe YaỤlọ Nche (Nke A Na-amụ Amụ)—2018 | Jenụwarị
-
-
4. Olee otú ị ga-esi akọwa ndị nganga fụliri elu?
4 Mgbe Pọl kwuchara na ọtụtụ ndị ga-abụ ndị hụrụ naanị onwe ha n’anya na ndị hụrụ ego n’anya, o kwukwara na ha ga-abụ ndị na-anya isi, ndị mpako na ndị nganga fụliri elu. Ndị na-akpa àgwà ndị a na-echekarị na ha ka ndị ọzọ n’ihi otú ha dị n’anya, ihe ndị ha nwere ike ime, ihe ndị ha nwere ma ọ bụkwanụ ọkwá ha nọ na ya. Ha na-achọkarịkwa ka ndị ọzọ na-eto ha ma ọ bụ na-akwanyere ha ùgwù pụrụ iche. Otu onye ọkà mmụta kwuru na mpako bụ otu ụzọ mmadụ si efe onwe ya kama ife Chineke. Ụfọdụ ekwuola na mpako bụ àgwà jọgburu onwe ya n’ihi na ndị dị mpako anaghị achọ iji anya ahụ ndị ọzọ dị mpako.
-
-
Ihe Dị Iche ná Ndị Na-efe Chineke na Ndị Na-anaghị Efe YaỤlọ Nche (Nke A Na-amụ Amụ)—2018 | Jenụwarị
-
-
8. (a) Olee otú ụfọdụ ndị taa si ele mmadụ inupụrụ ndị mụrụ ya isi, anya? (b) Olee ihe Akwụkwọ Nsọ gwara ụmụaka ka ha na-eme?
8 Pọl kwuru otú ndị mmadụ ga-esi na-emeso ibe ha ihe n’oge ikpeazụ a. O kwuru na ụmụaka ga-abụ ndị na-enupụrụ ndị mụrụ ha isi. Ọ bụ eziokwu na mgbe ụfọdụ, ọtụtụ akwụkwọ, fim na ihe omume tiivi ụfọdụ na-eme ka o yie ka ọ̀ dị mma ụmụaka inupụrụ ndị mụrụ ha isi, nke bụ́ eziokwu bụ na nnupụisi na-eme ka ezinụlọ ghara ịdị n’otu. Nke a na-akpakwa obodo aka ọjọọ. Kemgbe ụwa, ndị mmadụ ma na ihe a bụ eziokwu. Dị ka ihe atụ, na Gris oge ochie, mmadụ kụọ ndị mụrụ ya ihe, a ga-anapụ ya ihe niile ruuru ya dị ka nwa amaala. N’iwu ndị Rom, a na-ewere onye kụrụ nna ya ihe ka onye gburu ọchụ. Ma n’Akwụkwọ Nsọ Hibru ma n’Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst, a gwara ụmụaka ka ha na-asọpụrụ ndị mụrụ ha.—Ọpụ. 20:12; Efe. 6:1-3.
-
-
Ihe Dị Iche ná Ndị Na-efe Chineke na Ndị Na-anaghị Efe YaỤlọ Nche (Nke A Na-amụ Amụ)—2018 | Jenụwarị
-
-
10, 11. (a) Olee àgwà ọjọọ ndị mmadụ ga na-akpa nke na-egosi na ha ahụghị ibe ha n’anya? (b) Olee otú Ndị Kraịst hụruru ndị ọzọ n’anya?
10 Pọl kwukwara àgwà ọjọọ ndị ọzọ na-egosi na ndị mmadụ ahụghị ibe ha n’anya. Mgbe o kwuchara na a ga-enwe “ndị na-enupụrụ ndị mụrụ ha isi,” o kwuru banyere ndị na-enweghị ekele. Otú a o si kwuo ya dabara adaba n’ihi na ndị na-enweghị ekele anaghị eji ihe ọma mmadụ meere ha akpọrọ ihe. O kwukwara na ndị mmadụ ga-abụ ndị na-adịghị eguzosi ike n’ihe. Ha ga-abụkwa ndị na-adịghị achọ inwe nkwekọrịta ọ bụla, ya bụ na ha agaghị achọ ime ihe ga-eme ka ha na ndị ọzọ dịrị n’udo. Ndị mmadụ ga-abụkwa ndị nkwulu na ndị na-arara mmadụ nye. Ọ pụtara na ha ga na-ekwu okwu ọjọọ gbasara mmadụ ibe ha nakwa Chineke. Ihe ọzọ o kwukwara bụ na a ga-enwe ndị nkwutọ, ya bụ ndị ga na-ekwu okwu ụgha iji mebie aha ndị ọzọ.a
-