-
Ihe Dị Iche ná Ndị Na-efe Chineke na Ndị Na-anaghị Efe YaỤlọ Nche (Nke A Na-amụ Amụ)—2018 | Jenụwarị
-
-
9. Gịnị ga-enyere ụmụaka aka ịna-erubere ndị mụrụ ha isi?
9 Olee ihe ga-enyere ụmụaka aka ịna-erubere ndị mụrụ ha isi ọ bụrụgodị na ndị ọzọ anaghị eme otú ahụ? Ọ bụrụ na ha ana-echebara ihe ọma ndị mụrụ ha meere ha echiche, obi kwesịrị ịdị ha ụtọ, ya emee ka ha na-erubere ha isi. Ụmụaka kwesịkwara ịghọta na Chineke, bụ́ Nna anyị, chọrọ ka ha na-erubere ndị mụrụ ha isi. Ọ bụrụ na ụmụaka ana-ekwu okwu ọma banyere nne na nna ha, ụmụaka ibe ha ga-amụtakwa ịsọpụrụ ndị nne na nna nke ha. Ma ọ bụrụ na ndị nne na nna enweghị obi mmadụ ma ọ bụ ghara ịna-egosi ụmụ ha na ha hụrụ ha n’anya, ọ ga-esiri ụmụ ha ike iji obi ha niile na-asọpụrụ ha. Ma nwatakịrị chọpụtakwanụ na ndị mụrụ ya hụrụ ya n’anya n’eziokwu, ọ ga-eme ka ọ na-asọpụrụ ha ma mgbe ọ na-adịghịrị ya mfe ime otú ahụ. Otu nwata aha ya bụ Austin kwuru, sị: “Ọ bụ eziokwu na m na-achọkarị ime ihe papa m gwara m emela, ma, papa m na mama m na-agwa m ihe dị mma m kwesịrị ịna-eme, na-agwakwa m ihe mere m ji kwesị ime ya. Ha na-emekwa ka ọ dịrị m mfe mụ na ha ịna-ekwurịta okwu. Ihe a nyeere m aka ịna-erubere ha isi. M chọpụtara na ha hụrụ m n’anya, ya emeekwa ka m na-erubere ha isi.”
10, 11. (a) Olee àgwà ọjọọ ndị mmadụ ga na-akpa nke na-egosi na ha ahụghị ibe ha n’anya? (b) Olee otú Ndị Kraịst hụruru ndị ọzọ n’anya?
10 Pọl kwukwara àgwà ọjọọ ndị ọzọ na-egosi na ndị mmadụ ahụghị ibe ha n’anya. Mgbe o kwuchara na a ga-enwe “ndị na-enupụrụ ndị mụrụ ha isi,” o kwuru banyere ndị na-enweghị ekele. Otú a o si kwuo ya dabara adaba n’ihi na ndị na-enweghị ekele anaghị eji ihe ọma mmadụ meere ha akpọrọ ihe. O kwukwara na ndị mmadụ ga-abụ ndị na-adịghị eguzosi ike n’ihe. Ha ga-abụkwa ndị na-adịghị achọ inwe nkwekọrịta ọ bụla, ya bụ na ha agaghị achọ ime ihe ga-eme ka ha na ndị ọzọ dịrị n’udo. Ndị mmadụ ga-abụkwa ndị nkwulu na ndị na-arara mmadụ nye. Ọ pụtara na ha ga na-ekwu okwu ọjọọ gbasara mmadụ ibe ha nakwa Chineke. Ihe ọzọ o kwukwara bụ na a ga-enwe ndị nkwutọ, ya bụ ndị ga na-ekwu okwu ụgha iji mebie aha ndị ọzọ.a
-
-
Ihe Dị Iche ná Ndị Na-efe Chineke na Ndị Na-anaghị Efe YaỤlọ Nche (Nke A Na-amụ Amụ)—2018 | Jenụwarị
-
-
a Okwu Grik a sụgharịrị “onye nkwutọ” ma ọ bụ “onye ebubo” bụ di·aʹbo·los. Nke a bụ utu aha e ji mara Setan na Baịbụl, bụ́ onye kwutọrọ Chineke.
-