Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w96 10/15 p. 15-19
  • Di na Okenye—Ịhazi Ibu Ọrụ Ahụ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Di na Okenye—Ịhazi Ibu Ọrụ Ahụ
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ịbụ Okenye na Ịlụ Nwunye Bụ Ihe Ndị Kwekọrọ
  • ‘E Kewara Nwoke Ji Nwanyị Ekewa’
  • Ezigbo Ndị Di Ndị Bụkwa Ezigbo Ndị Okenye
  • Ọrụ Akwụkwọ Nsọ Kwadoro n’Ebe Nwunye Nọ
  • “Mkpagbu n’Anụ Ahụ”
  • Ndị Nwunye Ji Onwe Ha Achụ Àjà
  • Nna na Okenye—Ịrụzu Ọrụ Abụọ Ahụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
  • Unu Atọsala Ihe Chineke Kekọtara
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2007
  • Nduzi Amamihe Dị Na Ya Maka Ndị Di Na Nwunye
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2005
  • Ndụ Ezinụlọ—Ụzọ Ị Pụrụ Isi Nwee Ihe Ịga nke Ọma
    Obi Ụtọ—Ụzọ E Si Enweta Ya
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
w96 10/15 p. 15-19

Di na Okenye—Ịhazi Ibu Ọrụ Ahụ

‘Onye na-elekọta nzukọ Kraịst anya aghaghị ịbụ di nke otu nwunye.’—1 TIMOTI 3:2.

1, 2. N’ihi gịnị ka abanyeghị n’ọlụlụ nke ndị ụkọchukwu ji ghara ikwekọ n’Akwụkwọ Nsọ?

NA NARỊ narị afọ mbụ, ndị Kraịst kwesịrị ntụkwasị obi tinyere uche n’ịhazi ibu ọrụ ha dị iche iche. Mgbe Pọl onyeozi kwuru na onye Kraịst nke nọgidere n’alụghị di ma ọ bụ nwunye “ga-emekwa nke ọma karị,” ò bu n’uche na nwoke dị otú ahụ ga-ekwesị ekwesị karị maka ije ozi dị ka onye nlekọta n’ọgbakọ ndị Kraịst? N’ezie ọ̀ na-eme alụghị di ma ọ bụ nwunye ihe a chọrọ maka ịbụ okenye? (1 Ndị Kọrint 7:38) A chọrọ abanyeghị n’ọlụlụ n’aka ndị ụkọchukwu Katọlik. Ma abanyeghị n’ọlụlụ ndị ụkọchukwu ọ̀ dabeere n’Akwụkwọ Nsọ? Chọọchị Orthodox Ebe Ọwụwa Anyanwụ na-ekwe ka ndị ụkọchukwu parish ha bụrụ ndị ikom lụrụ nwunye, ma ọ bụghị ndị bishọp ha. Nke ahụ ò kwekọrọ na Bible?

2 Ọtụtụ n’ime ndị ozi 12 nke Kraịst, ndị e ji tọọ ntọala ọgbakọ ndị Kraịst, bụ ndị ikom lụrụ nwunye. (Matiu 8:14, 15; Ndị Efesọs 2:20) Pọl dere: “Ọ̀ ga-abụ na anyị enweghị ike ikuru nwunye, bụ́ nwanna nwanyị n’ime Kraịst, jegharịa, dị ka ndị ozi fọdụrụ na-emekwa, ha na ụmụnne Onyenwe anyị, na Sifas [Pita]?” (1 Ndị Kọrint 9:5) New Catholic Encyclopedia kwetara na “iwu ịnọ n’alụghị di ma ọ bụ nwunye malitere n’aka chọọchị” nakwa na “iwu ejighị ndị ozi nke A[gba] Ọ[hụrụ] ịnọ n’abanyeghị n’ọlụlụ.” Ndịàmà Jehova na-agbaso ụkpụrụ Akwụkwọ Nsọ kama iwu chọọchị.—1 Timoti 4:1-3.

Ịbụ Okenye na Ịlụ Nwunye Bụ Ihe Ndị Kwekọrọ

3. Eziokwu Akwụkwọ Nsọ dịgasị aṅaa na-egosi na ndị Kraịst bụ́ ndị nlekọta pụrụ ịbụ ndị ikom ji nwanyị?

3 Kama nnọọ ịchọ na ndị ikom a họpụtara dị ka ndị nlekọta kwesịrị ịbụ ndị na-ejighị nwanyị, Pọl degaara Taịtọs akwụkwọ, sị: “N’ihi nke a ka m hapụrụ gaa na Krit, ka i wee dozie ihe fọdụrụ, dookwa mmadụ ndị okenye [Grik, pre·sbyʹte·ros] n’obodo nile ọ bụla, dị ka mụ onwe m nyere gị iwu; ọ bụrụ na onye ọ bụla bụ onye a na-apụghị ibo ebubo, di nke otu nwunye, na-enwe ụmụ kwere ekwe, bụ́ ndị a na-eboghị ebubo na ha na-adị ndụ ịla n’iyi, ndị na-abụghịkwa ndị na-ekweghị ịdị n’okpuru iwu. N’ihi na onye ahụ nke na-elekọta nzukọ Kraịst anya [Grik, e·piʹsko·pos, ebe e si nweta okwu bụ́ “bishọp”] aghaghị ịbụ onye a na-apụghị ibo ebubo, dị ka onye na-achị ezinụlọ Chineke.”—Taịtọs 1:5-7.

4. (a) Olee otú anyị si mara na alụmdi na nwunye abụghị ihe a chọrọ n’aka ndị Kraịst maka ịbụ ndị nlekọta? (b) Ọnọdụ dị aṅaa ka mma ka nwanna nwoke bụ okenye nke na-ejighị nwanyị nwere?

4 N’aka nke ọzọ, ịlụ nwunye abụghị ihe Akwụkwọ Nsọ chọrọ maka ịbụ okenye. Jisọs alụghị nwunye. (Ndị Efesọs 1:22) Pọl, onye nlekọta pụtara ìhè n’ime ọgbakọ ndị Kraịst nke narị afọ mbụ, ejighị nwanyị mgbe ahụ. (1 Ndị Kọrint 7:7-9) Taa, e nwere ọtụtụ ndị Kraịst na-alụghị nwunye bụ́ ndị na-eje ozi dị ka ndị okenye. Ọnọdụ alụghị nwunye ha ma eleghị anya na-ahapụrụ ha oge ka ukwuu ịrụ ọrụ ha dị ka ndị nlekọta.

‘E Kewara Nwoke Ji Nwanyị Ekewa’

5. Eziokwu Akwụkwọ Nsọ dị aṅaa ka ụmụnna ji nwanyị kwesịrị ịnakwere?

5 Mgbe nwoke bụ́ onye Kraịst lụrụ nwanyị, o kwesịrị ịmata na ọ na-anakwere ibu ọrụ ndị ọhụrụ ga-achọ oge na uche ya. Bible na-asị: “Onye na-enweghị nwunye na-echegbu onwe ya n’ihe nke Onyenwe anyị, otú ọ ga-eme ihe ga-atọ Onyenwe anyị ụtọ: ma onye nwere nwunye na-echegbu onwe ya n’ihe ụwa, otú ọ ga-eme ihe ga-atọ nwunye ya ụtọ, [e kewakwara ya ekewa, NW].” (1 Ndị Kọrint 7:32-34) N’echiche dị aṅaa ka e kewara ya ekewa?

6, 7. (a) Olee otu ụzọ e si ‘kewaa’ nwoke ji nwanyị? (b) Olee ndụmọdụ Pọl nyere ndị Kraịst nọ n’alụmdi na nwunye? (ch) Olee otú nke a pụrụ isi metụta mkpebi nwoke ịnakwere ọrụ e kenyere ya?

6 Otu ihe bụ na nwoke ji nwanyị na-agbahapụ ikike n’ebe ahụ onwe ya dị. Pọl mere ka nke a pụta ìhè nke ọma: “Ọ bụghị nwunye na-achị ahụ nke onwe ya, kama ọ bụ di ya: otú a kwa ọ bụghị di na-achịkwa ahụ nke onwe ya, kama ọ bụ nwunye ya.” (1 Ndị Kọrint 7:4) Ụfọdụ ndị na-eche echiche ịbanye n’alụmdi na nwunye pụrụ iche na nke a abụghị oké ihe n’ihi na mmekọahụ agaghị abụ isi ihe n’alụmdi na nwunye ha. Otú ọ dị, ebe ịdị ọcha tupu alụmdi na nwunye bụ ihe Akwụkwọ Nsọ chọrọ, ndị Kraịst n’ezie adịghị ama mkpa ndị miri emi nke di ma ọ bụ nwunye ha n’ọdịnihu.

7 Pọl na-egosi na ọbụna di na nwunye “na-atụkwasị uche n’ihe nke Mmụọ Nsọ” aghaghị ịtụle mkpa mmekọahụ nke ibe ha. O nyere ndị Kraịst na Kọrint okwu ndụmọdụ, sị: “Ka di kwụghachi nwunye ya ụgwọ o ji ya: otú a kwa ka nwunye kwụghachikwa di ya ụgwọ o ji ya. Unu emegbula onwe unu, ma ọ bụghị ma eleghị anya unu ga-esite n’inwe otu olu mee ya na nwa oge, ka unu wee nwee oghere ikpe ekpere, wee nọkọọkwa ọzọ, ka Setan wee ghara ịnwa unu n’ihi na unu apụghị ijide onwe unu.” (Ndị Rom 8:5; 1 Ndị Kọrint 7:3, 5) N’ụzọ dị mwute, e nwewo mkpesa ịkwa iko ndị di na nwunye mgbe a na-agbasoghị okwu ndụmọdụ a. Ebe ọ dị otú ahụ, onye Kraịst ji nwanyị kwesịrị iji nlezianya tụlee ihe nile tupu ọ nakwere ọrụ nke ga-ekewapụ ya n’ebe nwunye ya nọ ruo oge dị ogologo. O nwekwaghị otu nnwere onwe ahụ nke ime njegharị dị ka o nwere mgbe ọ na-alụbeghị nwunye.

8, 9. (a) Gịnị ka Pọl bu n’uche mgbe o kwuru na ndị Kraịst lụrụ di na nwunye ‘na-echegbu onwe ha n’ihe ụwa’? (b) Gịnị ka ndị Kraịst lụrụ di na nwunye kwesịrị inwe nchegbu ime?

8 N’echiche dị aṅaa ka a pụrụ ikwu na ndị ikom bụ́ ndị Kraịst ji nwanyị, gụnyere ndị okenye, ‘na-echegbu onwe ha n’ihe ụwa [koʹsmos]’? (1 Ndị Kọrint 7:33) O doro nnọọ anya na Pọl adịghị ekwu banyere ihe ọjọọ dị iche iche nke ụwa a, nke ezi ndị Kraịst nile gaje ịjụ. (2 Pita 1:4; 2:18-20; 1 Jọn 2:15-17) Okwu Chineke na-enye anyị ntụziaka “ka anyị wee jụ asọpụrụghị Chineke na agụụ ihe ọjọọ dị n’ụwa [ko·smi·kosʹ], wee dị ndụ uche zuru okè na nke ezi omume na nke ịsọpụrụ Chineke n’oge dị ugbu a.”—Taịtọs 2:12.

9 Ya mere, onye Kraịst nọ n’alụmdi na nwunye “na-echegbu onwe ya n’ihe ụwa” n’ihi na n’izi ezi ọ na-eche banyere ihe ụwa ndị bụ akụkụ nke ndụ alụmdi na nwunye dị ka o kwesịrị ịdị. Nke a na-agụnye ụlọ, nri, uwe, ntụrụndụ—ka a hapụgodị ọtụtụ nchegbu ndị ọzọ ma e nwee ụmụ. Ma ọbụna nye di na nwunye na-amụghị nwa, ọ bụrụ na alụmdi na nwunye ahụ ga-aga aga, ma di ma nwunye aghaghị inwe nchegbu “otú ọ ga-eme ihe ga-atọ” di ma ọ bụ nwunye ya “ụtọ.” Nke a na-adọrọ mmasị ndị okenye bụ́ ndị Kraịst karịsịa ka ha na-ahazi ịbụ ọrụ ha.

Ezigbo Ndị Di Ndị Bụkwa Ezigbo Ndị Okenye

10. Ka onye Kraịst wee ruo eru dị ka okenye, gịnị ka ụmụnna ya na ndị nọ n’èzí kwesịrị inwe ike ịhụta?

10 Ọ bụ ezie na alụmdi na nwunye abụghị ihe a chọrọ maka ịbụ okenye, ọ bụrụ na nwoke bụ onye Kraịst nke ji nwanyị, tupu e wepụta aha ya maka nhọpụta dị ka okenye, o kwesịrị n’ezie inye ihe àmà nke ịdị na-agbalị ịbụ ezigbo di, nke na-ahụ n’anya, ka ọ na-abụ isi n’ụzọ kwesịrị ekwesị. (Ndị Efesọs 5:23-25, 28-31) Pọl dere: “Ọ bụrụ na onye ọ bụla na-agbaso ọnọdụ onye na-elekọta nzukọ Kraịst anya, agụụ ọrụ ọma na-agụ ya. Ya mere onye na-elekọta nzukọ Kraịst anya aghaghị ịbụ onye a na-adịghị akalu, di nke otu nwunye.” (1 Timoti 3:1, 2) O kwesịrị ido anya na okenye na-eme ihe nile o nwere ike iji bụrụ ezigbo di, ma nwunye ya ọ̀ bụ onye Kraịst ibe ya ma ọ bụ na ọ bụghị. N’ezie, ọbụna ndị na-anọghị n’ọgbakọ kwesịrị inwe ike ịhụta na ọ na-elekọta nwunye ya na ibu ọrụ ya ndị ọzọ nke ọma. Pọl gbakwụnyere: “Ọ ghaghịkwa inwe àmà dị mma site n’ọnụ ndị nọ n’èzí; ka ọ ghara ịdaba n’ịta ụta, ya na ịma n’ọnyà ekwensu.”—1 Timoti 3:7.

11. Gịnị ka ahịrịokwu bụ́ “di nke otu nwunye” na-egosi, ya mere nlezianya dị aṅaa ka ndị okenye kwesịrị igosipụta?

11 N’ezie, ahịrịokwu bụ́ “di nke otu nwunye” na-agụpụ ịlụ karịa otu nwanyị, ma ọ na-agụnyekwa ikwesị ntụkwasị obi nke alụmdi na nwunye. (Ndị Hibru 13:4) Ndị okenye karịsịa nwere mkpa ilezi anya karị mgbe ha na-enyere ụmụnna nwanyị nọ n’ọgbakọ aka. Ha kwesịrị izere ịnọ nanị ha mgbe ha na-eleta nwanna nwanyị nwere mkpa ndụmọdụ na nkasi obi. Ha ga-eme nke ọma ime ka okenye ọzọ, ohu na-eje ozi, ma ọ bụ ọbụna nwunye ha sonyere ha ma ọ bụrụ na ọ bụ okwu nke nanị nleta na-agba ume.—1 Timoti 5:1, 2.

12. Nkọwa dị aṅaa ka nwunye ndị okenye na ndị ohu na-eje ozi kwesịrị ịgbalịsi ike ikwekọ na ya?

12 Ná ndabara, ka ọ na-edepụta ihe ndị a chọrọ ndị okenye na ndị ohu na-eje ozi n’aka, Pọl onyeozi nwekwara okwu ndụmọdụ maka ndị nwunye nke ndị a na-atụle maka ihe ùgwù dịgasị otú ahụ. O dere, sị: “Otú ahụ ndị inyom aghaghị ịbụ ndị kwesịrị nsọpụrụ, ndị na-adịghị ebo mmadụ ebubo ụgha, ndị nwere anya udo, ndị kwesịrị ntụkwasị obi n’ihe nile.” (1 Timoti 3:11) Di bụ́ onye Kraịst pụrụ ime ihe dị ukwuu iji nyere nwunye ya aka ikwekọ ná nkọwa ahụ.

Ọrụ Akwụkwọ Nsọ Kwadoro n’Ebe Nwunye Nọ

13, 14. A sịgodị na nwunye okenye abụghị Onyeàmà ibe ya, n’ihi gịnị ka o kwesịrị iji soro ya nọgide ma bụrụ ezigbo di?

13 N’ezie, ndụmọdụ a e nyere nwunye ndị okenye ma ọ bụ ndị ohu na-eje ozi na-egosi na ndị nwunye dị otú ahụ bụ n’onwe ha ndị Kraịst raara onwe ha nye. N’ozuzu ya, otú a ka ọ na-adị n’ihi na a chọrọ ka ndị Kraịst lụọ “nanị n’ime Onyenwe anyị.” (1 Ndị Kọrint 7:39) Ma gịnị banyere nwanna lụworo onye na-ekweghị ekwe mgbe ọ raara ndụ ya nye Jehova, ma ọ bụ onye nwunye ya dapụrụ n’ụzọ ahụ n’ihi ihe ọ na-abụghị di ya kpatara?

14 Nke a, n’onwe ya, agaghị egbochi ya ịbụ okenye. Ma, ọ gakwanụghị eme ka ya ikewapụ n’ebe nwunye ya nọ nanị n’ihi na ya na ya anọghị n’otu okwukwe zie ezie. Pọl nyere okwu ndụmọdụ, sị: “È kekọwo gị na nwunye? achọla ntọpụ.” (1 Ndị Kọrint 7:27) O kwukwasịrị: “Ọ bụrụ na nwanna ọ bụla nwere nwunye na-ekweghị ekwe, ọ bụrụkwa na ọ dị nwanyị ahụ ezi mma ka ya na ya biri, ka di ya ghara ịhapụ ya. Ma ọ bụrụ na onye ahụ nke na-ekweghị ekwe ekewapụ onwe ya, ya kewapụ onwe ya: e meghị ka nwanna anyị nwoke ma ọ bụ nwanna anyị nwanyị bụrụ ohu n’okwu dị otú a: ma Chineke akpọwo anyị n’udo. N’ihi na ì si aṅaa mara, nwunye, ma ị̀ ga-azọpụta di gị? ma ọ bụ ì si aṅaa mara, di, ma ị̀ ga-azọpụta nwunye gị.” (1 Ndị Kọrint 7:12, 15, 16) Ọbụna ma ọ bụrụ na nwunye ya abụghị Onyeàmà, onye okenye kwesịrị ịbụ ezigbo di.

15. Olee ndụmọdụ Pita onyeozi nyere ndị Kraịst bụ di, gịnịkwa pụrụ ime ma ọ bụrụ na onye okenye aghọọ di na-eleghara nwunye ya anya?

15 Ma nwunye ya ọ̀ bụ onye kwere ekwe ibe ya ma ọ bụ na ọ bụghị, onye Kraịst bụ okenye kwesịrị ịmata na nlekọta ịhụnanya dị nwunye ya mkpa. Pita onyeozi dere, sị: “Ndị bụ di, otú ahụ, sonụ nwunye unu bikọọ n’ụzọ ihe ọmụma, na-ekenye ihe bụ nwanyị nsọpụrụ, dị ka onye na-adịghị ike karị, dị ka unu na ha bụkwa ndị na-eketakọ amara nke bụ ndụ; ka e wee ghara igbochi ekpere unu.” (1 Pita 3:7) Di ma ụma hapụ ilekọta mkpa nwunye ya na-etinye mmekọrịta nke ya na Jehova n’ihe ize ndụ; ọ pụrụ igbochi ya ịbịa Jehova nso dị ka ‘e weere igwe ojii kpuchie, ka ekpere wee ghara ịgabiga.’ (Abụ Ákwá 3:44) Nke a pụrụ iduba na ya ịghọ onye na-erughị eru ije ozi dị ka onye nlekọta bụ́ onye Kraịst.

16. Olee isi ihe Pọl na-ekwu, oleekwa echiche ndị okenye kwesịrị inwe banyere nke a?

16 Dị ka e kwuru, echiche bụ isi n’arụmụka Pọl bụ na mgbe nwoke lụrụ nwunye, ọ na-agbahapụ ókè ụfọdụ nke nnwere onwe o nwere dị ka nwoke na-ejighị nwanyị bụ́ nke nyere ya ohere iji “nọdụ n’ihu Onyenwe anyị ghara inwe uche mgbasasị.” (1 Ndị Kọrint 7:35) Akụkọ na-egosi na ndị okenye ụfọdụ ji nwanyị enwebeghị mgbe nile nguzo ziri ezi n’ịtụgharị uche n’okwu Pọl ndị sitere n’ike mmụọ nsọ. N’ọchịchọ ha imezu ihe ha chere na ezi ndị okenye kwesịrị imezu, ha pụrụ ileghara ibu ọrụ ha ụfọdụ nke ịbụ di anya. Ọ ga-esiri ụfọdụ ike ịjụ ihe ùgwù ọgbakọ, ọbụna ma ọ bụrụ na o doro anya na ịnara ya ga-ewetara nwunye ha mmerụ ahụ ime mmụọ. Ha na-anụ ụtọ ihe ùgwù ndị na-eso alụmdi na nwunye, ma hà dị njikere imezu ibu ọrụ ndị na-eso ya?

17. Gịnị meworo ụfọdụ ndị nwunye, oleekwa ụzọ a pụrụ isiwo zere nke a?

17 N’ezie, ịnụ ọkụ n’obi dị ka okenye kwesịrị ịja mma. Ma, onye Kraịst ọ̀ nọ n’ezi nhazi, ma ọ bụrụ na, n’imezu ibu ọrụ ya n’ọgbakọ, ọ na-eleghara ibu ọrụ Akwụkwọ Nsọ ndị o nwere n’ebe nwunye ya nọ anya? Ka ọ na-achọ ịkwado ndị nọ n’ọgbakọ, onye okenye nọ n’ezi nhazi ga-enwekwa nchegbu banyere ọnọdụ ime mmụọ nwunye ya. Ụfọdụ nwunye ndị okenye adawo mbà n’ime mmụọ, ụfọdụ ‘ekpuwokwa ka ụgbọ’ n’ụzọ ime mmụọ. (1 Timoti 1:19) Ọ bụ ezie na ọ dịịrị nwunye ịrụpụta nzọpụta nke ya, n’ọnọdụ ụfọdụ a pụrụ izerewo nsogbu ime mmụọ ahụ ma ọ bụrụ na okenye ahụ ‘azụwo ma lezie’ nwunye ya anya, “dị ka Kraịst na-emekwa nzukọ Ya.” (Ndị Efesọs 5:28, 29) N’ikwu eziokwu, ndị okenye aghaghị ‘ilezi onwe ha na ìgwè atụrụ nta nile anya.’ (Ọrụ 20:28) Ọ bụrụ na ha lụrụ nwunye, nke a gụnyere ndị nwunye ha.

“Mkpagbu n’Anụ Ahụ”

18. Olee akụkụ ụfọdụ nke “mkpagbu” ndị Kraịst lụrụ di na nwunye na-enwe, oleekwa ụzọ nke a pụrụ isi metụta ọrụ onye okenye?

18 Onyeozi ahụ dekwara, sị: “A sịkwa na ọ bụ ezie na ị lụrụ nwunye, i mehieghị; a sịkwa na nwa agbọghọ na-amaghị nwoke lakwuru di, o mehieghị. Otú ọ dị, ndị dị otú a ga-enwe mkpagbu n’anụ ahụ ha: ma mụ onwe m na-emere unu ebere.” (1 Ndị Kọrint 7:28) Pọl chọrọ imere ha ebere bụ́ ndị nwere ike ịgbaso ihe nlereanya ya nke alụghị di ma ọ bụ nwunye pụọ ná nchegbu nile na-aghaghị iso alụmdi na nwunye. Ọbụna nye di na nwunye na-enweghị nwa, nchegbu ndị a pụrụ ịgụnye nsogbu ahụ ike ma ọ bụ ihe isi ike ego nakwa ibu ọrụ Akwụkwọ Nsọ n’ebe nne na nna meworo agadi nke onye òtù ọlụlụ nọ. (1 Timoti 5:4, 8) Onye okenye aghaghị, n’ụzọ isetịpụ ezi ihe nlereanya, ịnakwere ibu ọrụ ndị a, nke a pụkwara mgbe ụfọdụ imetụta ọrụ ya dị ka onye nlekọta bụ́ onye Kraịst. Ọ bụ ihe obi ụtọ na ihe ka ọnụ ọgụgụ ná ndị okenye na-eme nke ọma n’imezu ibu ọrụ ha ma ndị nke ezinụlọ ma ndị nke ọgbakọ.

19. Gịnị ka Pọl bu n’uche mgbe o kwuru, sị: “Ka ndị nwere nwunye wee dị ka ha enweghị”?

19 Pọl gbakwụnyere, sị: “E mewo ka oge a dị mkpụmkpụ, ka ndị nwere nwunye wee dị ka ha enweghị site n’ugbu a.” (1 Ndị Kọrint 7:29) Ee, n’ihi ihe o degawoororịị ndị Kọrint n’isiakwụkwọ a, o doro anya na o bughị n’uche na ndị Kraịst ji nwanyị kwesịrị n’ụzọ ụfọdụ ileghara nwunye ha anya. (1 Ndị Kọrint 7:2, 3, 33) O gosiri ihe o bu n’uche, mgbe o dere, sị: “Ka ndị na-eji ụwa mee ihe wee dị ka ha ejibigaghị ya ókè: n’ihi na ụwa nke a ka e si ahụ ya anya na-agabiga agabiga.” (1 Ndị Kọrint 7:31) Ọbụna otú a ugbu a karịa ka ọ dị n’ụbọchị Pọl ma ọ bụ n’ụbọchị Jọn onyeozi, “ụwa na-agabigakwa.” (1 Jọn 2:15-17) Ya mere, ndị Kraịst lụrụ di ma ọ bụ nwunye bụ́ ndị na-ahụ mkpa nke ịchụ àjà ụfọdụ n’ịgbaso Kraịst apụghị itinyecha uche n’ọṅụ na ihe ùgwù nile nke alụmdi na nwunye.—1 Ndị Kọrint 7:5.

Ndị Nwunye Ji Onwe Ha Achụ Àjà

20, 21. (a) Olee àjà ndị ọtụtụ nwunye ndị Kraịst dị njikere ịchụ? (b) Gịnị ka nwunye pụrụ ịtụ anya ya n’ụzọ ziri ezi n’aka di ya, a sịgodị na ọ bụ okenye?

20 Dị nnọọ ka ndị okenye na-achụ àjà iji baara ndị ọzọ uru, ọtụtụ nwunye ndị okenye agbalịsiwo ike ịhazi ibu ọrụ ha dị iche iche n’alụmdi na nwunye n’ihe banyere ọdịmma Alaeze ndị dị oké mkpa. Ọtụtụ puku ndị inyom bụ́ ndị Kraịst ji obi ụtọ ekwenye ekwenye iji mee ka o kwe di ha omume imezu ibu ọrụ ha dị ka ndị nlekọta. Jehova na-ahụ ha n’anya n’ihi nke a, ọ na-agọzikwa mmụọ ọma ha na-egosi. (Faịlimọn 25) Ka o sina dị, ndụmọdụ Pọl a haziri nke ọma na-egosi na nwunye ndị nlekọta pụrụ n’izi ezi ịtụ anya maka oge na nlekọta buru ibu site n’aka di ha. Ọ bụ ibu ọrụ Akwụkwọ Nsọ dịịrị ndị okenye ji nwanyị iwepụtara ndị nwunye ha oge zuru ezu iji tinye ibu ọrụ ha dị iche iche dị ka di na okenye n’ezi nhazi.

21 Ma gịnị ma ọ bụrụ na tinyere ịbụ di, onye Kraịst bụ́ okenye bụ nna? Nke a na-eme ka ibu ọrụ ya sikwuo ike ma na-emeghere ya akụkụ ọrụ ọzọ nke nlekọta, dị ka anyị ga-ahụ n’isiokwu na-esonụ.

Ná Ntụleghachi

◻ Eziokwu Akwụkwọ Nsọ dịgasị aṅaa na-egosi na onye Kraịst bụ́ onye nlekọta pụrụ ịbụ nwoke ji nwanyị?

◻ Ọ bụrụ na okenye na-ejighị nwanyị alụọ nwunye, gịnị ka o kwesịrị iburu n’uche?

◻ N’ụzọ dịgasị aṅaa ka onye Kraịst lụrụ di ma ọ bụ nwunye “na-echegbu onwe ya n’ihe ụwa”?

◻ Olee otú ọtụtụ ndị nwunye ndị nlekọta si egosi ezi mmụọ nke iji onwe onye achụ àjà?

[Foto dị na peeji nke 17]

N’agbanyeghị iji ọrụ ọchịchị Chineke n’aka, onye okenye kwesịrị inye nwunye ya nlekọta ịhụnanya

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya