Olee Otú Chineke Si Ele Ofufe Krisendọm Anya?
“ỌBỤGHỊ onye ọ bụla nke na-asị m, Onyenwe anyị, Onyenwe anyị, ga-aba n’alaeze eluigwe,” ka Jisọs Kraịst kwuru, “kama ọ bụ onye na-eme ihe Nna m Nke bi n’eluigwe na-achọ. Ọtụtụ mmadụ ga-asị m n’ụbọchị ahụ, Onyenwe anyị, Onyenwe anyị, ànyị ejighị . . . aha Gị rụọ ọtụtụ ọrụ dị ike? Ma mgbe ahụ ka M ga-ekwupụtara ha, sị, Ọ dịghị mgbe ọ bụla M maara unu: si n’ebe M nọ pụọ, unu ndị na-arụ ọrụ na-emebi iwu.”—Matiu 7:21-23.
Site n’Okwu ya dị nsọ, bụ́ Bible Nsọ, Chineke emewo ka ihe ọ na-achọ doo anya. Chọọchị nile nke Krisendọm hà na-eme ihe Chineke na-achọ? Ka hà bụ ihe Jisọs kpọrọ “ndị na-arụ ọrụ na-emebi iwu”?
Mwụfu Ọbara
N’abalị tupu ọnwụ Nna ya ukwu, ọ fọrọ nke nta ka Pita malite iji ngwá ọgụ lụsoo ìgwè ndị agha e zijere ijide Jisọs ọgụ. (Jọn 18:3, 10) Ma Jisọs weghachiri udo ma dọọ Pita aka ná ntị, sị: “Mmadụ nile ndị weere mma agha ga-ala n’iyi site ná mma agha.” (Matiu 26:52) E nyeghachiri ịdọ aka ná ntị a doro anya ná Mkpughe 13:10. Chọọchị nile nke Krisendọm hà aṅawo ntị na ya? Ka hà bụ ndị a ga-ata ụta maka agha ndị na-aga n’ihu ugbu a n’akụkụ ụfọdụ nke ụwa?
N’oge Agha Ụwa nke Abụọ, e gburu ọtụtụ narị puku ndị Serbia na ndị Croatia n’aha okpukpe. “Na Croatia,” ka akwụkwọ bụ́ The New Encyclopædia Britannica na-akọ, “ọchịchị fascism obodo ahụ tinyere ụkpụrụ nke ‘mkpocha agbụrụ’ n’ọrụ nke gabigara ọbụna omume ndị Nazi. . . . E kwuru na a ga-agbara otu ụzọ n’ime ụzọ atọ nke ndị Serbia ụgbọ nwa mkpi, tọghata otu ụzọ n’ụzọ atọ gaa n’okpukpe Roman Katọlik, gbuchapụkwa otu ụzọ n’ụzọ atọ. . . . Ntinyetụ aka nke ndị ụkọchukwu Katọlik tinyere n’omume ndị a mebiri mmekọrịta nke gọọmenti na chọọchị nke ukwuu mgbe a lụsịrị agha ahụ.” A manyere ọtụtụ mmadụ ịghọ ndị Katọlik ma ọ bụ nwụọ; e nyeghịdị ọtụtụ puku ndị ọzọ nhọrọ ọ bụla. Obodo nta nile—ndị ikom, ndị inyom, na ụmụaka—bụ ndị a kwabanyere n’ime chọọchị Orthodox ha wee gbuo ha. Gịnị banyere ndị agha ọchịchị Kọmunist nọ n’akụkụ nke ọzọ? Hà nwekwara nkwado okpukpe?
“Ụfọdụ n’ime ndị ụkọchukwu keere òkè n’agha ahụ n’akụkụ ndị agha mgbanwe ahụ,” ka akwụkwọ bụ́ History of Yugoslavia na-akọ. “Ndị agha Òtù Ndọrọ Ndọrọ Ọchịchị bịara gụnye ọbụna ndị ụkọchukwu sitere ma na chọọchị nile nke Orthodox ndị Serbia ma nke Roman Katọlik,” ka akwụkwọ bụ́ Yugoslavia and the New Communism na-ekwu. Ndịrịta iche nke okpukpe anọgidewo na-afụnwu ọkụ nke agha na mba ndị Balkan.
Gịnịkwa banyere Rwanda? Odeakwụkwọ ukwu nke Òtù Katọlik Na-ahụ Maka Mmekọrịta Mba Nile, bụ́ Ian Linden, kwuru okwu nkweta ndị a na-esonụ na magazin bụ́ The Month, sị: “Nnyocha nke òtù African Rights mere na London na-enye otu ihe atụ ma ọ bụ abụọ nke ndị ndú Chọọchị Katọlik, Anglikan na Baptist obodo ahụ ịbụ ndị e kpughere na ha, site n’imechiri ahụ ma ọ bụ inye nkwado, tinyere aka n’ogbugbu ndị agha gburu ndị mmadụ. . . . Ihe ịrụ ụka ọ bụla adịtụghị ya na ọnụ ọgụgụ dị ukwuu nke ndị Kraịst a ma ama na parish dị iche iche tinyere aka ha n’igbu ndị mmadụ.” N’ụzọ dị mwute, ịlụ ọgụ n’etiti ndị ahụ kpọrọ onwe ha ndị Kraịst anọgidewo na-eti ebe etiti Africa ihe otiti.
Ịkwa Iko
Dị ka Okwu Chineke si kwuo, e nwere nanị otu ndokwa dị nsọpụrụ maka inwe mmekọahụ, nke ahụ bụkwa n’ime nkekọ alụmdi na nwunye. “Ka ịlụ di na nwunye bụrụ ihe a na-asọpụrụ n’etiti unu nile,” ka Bible na-ekwu, “ka ihe ndina unu bụrụkwa ihe a dịghị emerụ emerụ: n’ihi na Chineke ga-ekpe ndị na-akwa iko ikpe, ha na ndị na-akwa iko, bụ́ ndị ikom nwere nwunye na ndị inyom nwere di.” (Ndị Hibru 13:4) Ndị ndú chọọchị hà na-akwado ozizi Chineke a?
Na 1989 Chọọchị Anglikan dị n’Australia wepụtara akwụkwọ chọọchị ahụ bipụtara n’ihe banyere mmekọahụ bụ́ nke na-atụ aro na inwe mmekọahụ tupu alụmdi na nwunye adịghị njọ ma ọ bụrụ na nwoke na nwanyị kwerịtara onwe ha nkwa. Na nso nso a karị, onye ndú nke Chọọchị Anglikan na Scotland kwuru, sị: “Chọọchị ekwesịghị ịkatọ ịkwa iko dị ka mmehie na ihe dị njọ. Chọọchị aghaghị ịnakwere na ihe anyị ketara eketa na-akpata ịkwa iko nke di ma ọ bụ nwunye.”
Na South Africa ọtụtụ ndị ụkọchukwu ekwupụtawo nkwado ha kwadoro ndina ụdị onwe. Dị ka ihe atụ, na 1990 magazin nke South Africa bụ́ You hotara otu onye okwuchukwu a ma ama nke Anglikan dị ka onye na-asị: “Akwụkwọ Nsọ adịghị ejigide mmadụ ruo mgbe ebighị ebi. . . . Ekwenyere m na a ga-enwe mgbanwe n’àgwà na ụkpụrụ nke chọọchị n’ebe ndị na-edina ụdị onwe ha nọ.”—Tụlee Ndị Rom 1:26, 27.
Dị ka akwụkwọ bụ́ 1994 Britannica Book of the Year si kwuo, mmekọahụ aghọwo ihe iseokwu bụ́ isi na chọọchị nile nke America, karịsịa okwu ndị dị ka “ichi ndị a maara dị ka ndị ikom na-edina ụdị onwe ha na ndị inyom na-edina ụdị onwe ha echichi ụkọchukwu, ịghọta ihe ndị ruuru ndị na-edina ụdị onwe ha n’ụzọ okpukpe, ịgọzi ‘alụmdi na nwunye ndị na-edina ụdị onwe ha,’ na ime ka ọ bụrụ ihe iwu kwadoro ma ọ bụ nkatọ nke ụzọ ndụ ndị e jikọrọ ha na ndina ụdị onwe.” Ihe ka n’ọnụ ọgụgụ nke òtù chọọchị ndị bụ isi na-agbachi ndị ụkọchukwu na-akpọsa maka nnwere onwe mmekọahụ ka ukwuu nkịtị. Dị ka 1995 Britannica Book of the Year si kwuo, 55 ndị bishọp Episcopalian bịanyere aka n’otu nkwupụta okwu “na-akwado nnabata nke omume ndị na-edina ụdị onwe ha na ichi ha echichi.”
Ụfọdụ ndị ụkọchukwu na-arụ ụka iji kwadoo ndina ụdị onwe, na-azọrọ na ọ dịghị mgbe Jisọs kwuru okwu megide ya. Ma nke ahụ ọ̀ dị otú ahụ n’ezie? Jisọs Kraịst kwupụtara na Okwu Chineke bụ eziokwu. (Jọn 17:17) Nke ahụ pụtara na ọ kwadoro echiche Chineke banyere ndina ụdị onwe dị ka a kọwara ya na Levitikọs 18:22, nke na-agụ, sị: “Gị na nwoke edinala, dị ka nwoke na nwanyị na-edina: ihe arụ ka ọ bụ.” Ọzọkwa, Jisọs gụnyere ịkwa iko na ịkwa iko di ma ọ bụ nwunye n’ime “ajọ ihe ndị a nile [ndị] na-esi n’ime mmadụ apụta, ha na-emerụ mmadụ.” (Mak 7:21-23) Okwu Grik maka ịkwa iko bụ okwu sara mbara karịa nke ịkwa iko di ma ọ bụ nwunye. Ọ na-akọwa ụdị mmekọahụ nile na-abụghị n’ime alụmdi na nwunye iwu kwadoro, tinyere ndina ụdị onwe. (Jud 7) Jisọs Kraịst dọkwara ndị na-eso ụzọ ya aka ná ntị ka ha ghara ịnabata onye ọ bụla kpọrọ onwe ya onye nkụzi ndị Kraịst bụ́ onye na-ewere ịdị njọ nke ịkwa iko dị ka ihe dị ala.—Mkpughe 1:1; 2:14, 20.
Mgbe ndị ndú okpukpe na-akpọsa ichi ndị ikom na-edina ụdị onwe ha na ndị inyom na-edina ndị inyom echichi, mmetụta dị aṅaa ka nke a na-enwe n’ahụ ndị òtù chọọchị ha, karịsịa ndị na-eto eto? Ọ́ bụghị ihe mkpali ịma otú mmekọahụ na-abụghị n’ime alụmdi na nwunye si adị? N’ụzọ dị iche, Okwu Chineke na-agba ndị Kraịst ume ka ha ‘gbanarị ịkwa iko.’ (1 Ndị Kọrint 6:18) Ọ bụrụ na onye kwere ekwe ibe anyị adaba n’ụdị mmehie ahụ, a na-enye enyemaka ịhụnanya iji weghachi onye ahụ n’ihu ọma Chineke. (Jemes 5:16, 19, 20) Gịnị ma ọ bụrụ na a jụ enyemaka a? Bible na-ekwu na ọ gwụla ma ndị dị otú ahụ ha chegharịrị, ha “agaghị eketa alaeze Chineke.”—1 Ndị Kọrint 6:9, 10.
“Na-egbochi Mmadụ Ịlụ Di na Nwunye”
N’ihi “ịkwa iko,” Bible na-ekwu na “ịlụ di na nwunye ka ire ọkụ n’agụụ ahụ mma.” (1 Ndị Kọrint 7:2, 9) N’agbanyeghị okwu ndụmọdụ amamihe a, a chọrọ ka ọtụtụ ndị ụkọchukwu nọgide n’alụghị di ma ọ bụ nwunye. “A naghị emebi nkwa ịnọ n’alụghị di ma ọ bụ nwunye,” ka Nino Lo Bello na-akọwa n’akwụkwọ ya bụ́ The Vatican Papers, “ma ọ bụrụ na onye ụkọchukwu, onye mọnk ma ọ bụ onye nọn enwee mmekọahụ. . . . A pụrụ inweta mgbaghara mmehie maka mmekọahụ site n’ime nkwupụta n’obi eziokwu n’ụdị ikwupụta njọ, ebe Chọọchị na-agaghị anabata alụmdi na nwunye nke onye ụkọchukwu ọ bụla.” Ozizi a ọ̀ mịpụtawo ezi mkpụrụ ka ọ bụ nke ọjọọ?—Matiu 7:15-19.
Ihe ịrụ ụka adịghị ya, ọtụtụ ndị ụkọchukwu na-ebi ndụ dị ọcha n’ụzọ omume, ma ọnụ ọgụgụ dị ukwuu anaghị eme otú ahụ. Dị ka akwụkwọ bụ́ 1992 Britannica Book of the Year si kwuo, “a kọrọ na Chọọchị Roman Katọlik kwụrụ $300 nde iji kwụọ ụgwọ mmetọ mmekọahụ nke ndị ụkọchukwu.” E mesịa, mbipụta nke 1994 kwuru, sị: “Ọnwụ nke ọtụtụ ndị ụkọchukwu site n’ọrịa AIDS kpughere ịdị adị nke ndị ụkọchukwu na-edina ụdị onwe ha na nchọpụta nke na e nwere ọnụ ọgụgụ fere ókè nke . . . ndị na-edina ụdị onwe ha a dọtara n’òtù ndị ụkọchukwu.” Ka a sịkwa ihe mere Bible ji na-ekwu na ‘igbochi mmadụ ịlụ di na nwunye’ bụ “ozizi nke ndị mmụọ ọjọọ.” (1 Timoti 4:1-3) “N’echiche nke ụfọdụ ndị ọkọ akụkọ ihe mere eme,” ka Peter de Rosa na-ede n’akwụkwọ ya bụ́ Vicars of Christ, “ikekwe [alụghị di ma ọ bụ nwunye nke ndị ụkọchukwu] emebiwo omume karịa òtù ọ bụla ọzọ n’Ebe Ọdịda Anyanwụ, tinyere ịgba akwụna. . . . [Ọ] bụrụwo n’ụzọ ka ukwuu ntụpọ n’aha Iso Ụzọ Kraịst. . . . Ịnọ n’alụghị di ma ọ bụ nwunye a manyere amanye edujewo n’inwe ihu abụọ n’òtù ndị ụkọchukwu mgbe nile. . . . Onye ụkọchukwu pụrụ ịda otu puku ugboro ma iwu chọọchị machibidoro ya ịlụ nwunye otu ugboro.”
N’ịtụle otú Chineke si ele ofufe Beal anya, o sighị ike ịghọta otú ọ na-aghaghị isi ele chọọchị nile kewara ekewa nke Krisendọm anya. Akwụkwọ ikpeazụ nke Bible jikọtara ụdị nile nke ofufe ụgha n’okpuru aha ahụ bụ́ “Babilọn Ukwu ahụ, nne nke ndị na-akwa iko na nke ihe arụ nile nke ụwa.” “N’ime ya,” ka Bible na-agbakwụnye, “ka a hụrụ ọbara nke ndị amụma na nke ndị nsọ, na nke ndị nile e gbuworo n’elu ụwa.”—Mkpughe 17:5; 18:24.
N’ihi ya, Chineke na-agba ndị nile chọrọ ịbụ ndị na-efe ya ezi ofufe ume, sị: “Ndị nke m, sinụ n’ime ya pụta, ka unu wee ghara iso ya nwekọọ mmehie ya nile, gharakwa ịnata ụfọdụ n’ime ihe otiti ya nile. . . . N’otu ụbọchị ka ihe otiti ya nile ga-abịa, bụ́ ọnwụ, na iru újú, na ụnwụ; a ga-erechapụkwa ya n’ọkụ; n’ihi na Ọ dị ike, bụ́ Onyenwe anyị Chineke, Onye kpere ya ikpe.”—Mkpughe 18:4, 8.
Ajụjụ ahụ na-ebilite ugbu a: Mgbe a pụtasịrị n’okpukpe ụgha, olee ebe mmadụ kwesịrị ịga? Ụdị ofufe dị aṅaa ka Chineke na-anakwere?
[Igbe/Foto dị na peeji nke 5]
Ikpere Arụsị
Ofufe Beal gụnyere iji arụsị eme ihe. Ụmụ Israel nwara ịgwakọta ofufe Jehova na nke Beal. Ọbụna ha webatara arụsị n’ụlọ nsọ Jehova. E mere ka echiche Chineke banyere ife arụsị doo anya mgbe o bibiri Jerusalem na ụlọ nsọ ya.
Ọtụtụ n’ime chọọchị nile nke Krisendọm jupụtara n’arụsị, ma hà dị n’ụdị obé, ihe oyiyi, ma ọ bụ ihe a kpụrụ akpụ nke Meri. Ọzọkwa, a na-akụziri ọtụtụ ndị na-aga chọọchị ịkpọ isiala, igbu ikpere n’ala, ma ọ bụ ime akara nke obé n’ihu ihe oyiyi ndị a. N’ụzọ dị iche, e nyere ezi ndị Kraịst iwu ka ha ‘gbanarị ikpere arụsị.’ (1 Ndị Kọrint 10:14) Ha adịghị anwa iji ihe a na-ahụ anya na-efe Chineke.—Jọn 4:24.
[Ebe E Si Nweta Foto]
Musée du Louvre, Paris
[Igbe dị na peeji nke 7]
“O Kwesịrị Ka Onye Ndú Chọọchị Ghara Inwe Ntụpọ”
OKWU a sitere na Taịtọs 1:7, dị ka Today’s English Version si sụgharịa ya. King James Version na-agụ, sị: “Onye bishọp aghaghị ịbụ onye a na-agaghị ata ụta.” Okwu ahụ bụ́ “bishọp” sitere n’okwu Grik pụtara “onye nlekọta.” Ya mere ndị ikom a họpụtara idu ndú n’ọgbakọ ezi ndị Kraịst aghaghị ibi ndụ kwekọrọ n’ụkpụrụ Bible ndị bụ isi. Ọ bụrụ na ha emeghị otú ahụ, a ghaghị iwepụ ha n’ọkwá nlekọta ha, ebe ha na-abụkwaghị “ihe atụ ìgwè atụrụ nta ahụ ga-eṅomi.” (1 Pita 5:2, 3) Ruo n’ókè ha aṅaa ka chọọchị nile nke Krisendọm ji ihe a a chọrọ kpọrọ ihe?
N’akwụkwọ ya bụ́ I Care About Your Marriage, Dr. Everett Worthington zoro aka ná nnyocha e mere 100 ndị pastọ na steti Virginia, U.S.A. Ihe karịrị 40 pasent kwetara na ha esorowo onye na-abụghị onye òtù ọlụlụ ha mee ụdị omume ụfọdụ na-akpali agụụ mmekọahụ. Ọnụ ọgụgụ buru ibu n’ime ha esorowo onye na-abụghị nwunye ha kwaa iko.
“N’ime iri afọ gara aga,” ka Christianity Today na-ekwu, “mkpughe nke omume rụrụ arụ nke ụfọdụ n’ime ndị ndú ya a kasị akwanyere ùgwù akwawo chọọchị aka ugboro ugboro.” Isiokwu bụ́ “Ihe Mere A Na-ekwesịghị Iji Weghachi Ndị Pastọ Na-akwa Iko” mara omume a na-emekarị na Krisendọm aka nke bụ́ iweghachi ndị ndú chọọchị ngwa ngwa n’ọkwá ha nọbu mgbe “a masịworo ha ikpe mmehie mmekọahụ.”