Gịnị Na-eme Ndị Mmadụ Obi Ụtọ?
Ruo iri afọ abụọ otu ìgwè nke ndị na-eme nchọpụta gbaa ụwa gburugburu anọwo na-enwe ihe ọmụmụ na-aga n’usoro nke obi ụtọ. Gịnị ka ha chọpụtara? “Obi ụtọ eyighị ka ọ na-adabere n’ụzọ pụtara ìhè n’ihe ndị a na-ahụ anya,” ka magazin bụ́ Scientific American na-akọ.
Akwụkwọ nkà mmụta sayensị a kwukwara, sị: “Akụ̀ na ụba apụtaghịkwa obi ụtọ. Ndị mmadụ enwebeghị obi ụtọ karị ebe ọha mmadụ ha bawanyeworo ọgaranya. . . . N’ọtụtụ mba njikọ dị n’etiti ego a na-akpata na obi ụtọ dị oké nta.”
Ihe ọmụmụ ahụ na-egosi ihe anọ e ji mata ndị nwere obi ụtọ: Ha nwere mmasị n’onwe ha ma nwee ùgwù onwe onye dị elu, ha na-enwe mmetụta na ha na-achịkwa ndụ ha, ha na-enwe nchekwube, ha na-enwekwa mmasị iso ndị ọzọ mekọọ ihe. Ọzọkwa, alụmdi na nwunye dị mma na mmekọrịta mmadụ na mmadụ ndị chiri anya bụ ihe ndị na-eso akpata ndụ obi ụtọ, ndị a na-amụbakwa ahụ ike na ogologo ndụ.
Ọ bụ ihe na-akpali mmasị na Scientific American kọrọ, sị: “Ndị na-ekpesi okpukpe ike na-akọkwa banyere inwe obi ụtọ ka ukwuu. Otu nnyocha njụta echiche chọpụtara na ndị ji okpukpe kpọrọ ihe nke ukwuu ji okpukpu abụọ yie ka ha nọ n’ọnọdụ ikwupụta na ha nwere obi ụtọ karịa ndị ji ihe ime mmụọ kpọrọ ihe n’ụzọ kasị dị ala. Nnyocha ndị ọzọ, gụnyere ihe ọmụmụ mba 16 jikọrọ aka mee nke metụtara mmadụ 166,000 n’ime mba 14, achọpụtawo na obi ụtọ na ndụ afọ ojuju a kọrọ na e nwere na-eso inwe njikọ okpukpe na ịgachi nnọkọ ofufe anya amụba.”
Ogologo oge gara aga ọbụ abụ bụ́ Devid kpughere na obi ụtọ onwe onye nwere njikọ chiri anya ya na ofufe dị n’otu nke Jehova Chineke, na-ede, sị: “Aṅụrịrị m ọṅụ mgbe ha na-asị m, ka anyị jee n’ụlọ Jehova.”—Abụ Ọma 122:1.
Ka a sịkwa ihe mere Pọl onyeozi ji gbaa ndị Kraịst ibe ya ume, sị: “Ka anyị na-atụgharịtakwa uche n’ahụ ibe anyị ịkpasu ịhụnanya na ọrụ ọma dị iche iche; ka anyị gharakwa ịhapụ nzukọ nke onwe anyị”! (Ndị Hibru 10:24, 25, ọ bụ anyị dere okwu ụfọdụ n’ụdị dị iche.) N’ezie, ịgbakọta ọnụ iji soro ndị nwere otu ụdị okwukwe dị oké ọnụ ahịa fee Chineke bụ ihe omume na-enye ọṅụ maka ndị hụrụ eziokwu Bible n’anya. Ọtụtụ nde Ndịàmà Jehova ahụwo nke a ịbụ eziokwu, ha na-akpọkwa gị òkù ịhụ nke a n’onwe gị site n’isonyere ha n’ofufe n’Ụlọ Nzukọ Alaeze dị gị nso.