“Ntachi Obi Dị Unu Mkpa”
“NTACHI obi dị [anyị] mkpa,” ma ọ bụrụ na anyị ga-anata “nkwa ahụ.” (Ndị Hibru 10:36) Otu onye ọkà mmụta Bible na-akọwa na okwu Grik maka “ntachi obi” nke Pọl onyeozi jiri mee ihe n’akụkụ ihe odide a mgbe ụfọdụ na-akọwa “ikike osisi nwere ịdị ndụ n’okpuru ọnọdụ ndị siri ike ma dị njọ.”
Ụdị osisi dị otú ahụ na-eto n’ugwu nke Europe. N’ụzọ na-akpali nnọọ mmasị, a na-akpọ ya dị-ndụ-ebighị-ebi. Otú ọ dị, osisi alpine nke a adịghị adị ndụ ebighị ebi, ma ọ na-anọgide ndụ site n’afọ ruo n’afọ, na-emepụta ọmarịcha okooko osisi n’oge okpomọkụ ọ bụla. Akwụkwọ bụ́ The New Encyclopædia Britannica na-akọwa na e nyere osisi ahụ aha ahụ bụ́ dị-ndụ-ebighị-ebi n’ihi “isi ike na ịnọte anya” ya. (Aha sayensị maka osisi ndị a so n’ụdị Sempervivum pụtakwara “dị-ndụ-ebighị-ebi.”)
Ihe na-eme ka osisi a na-anọte anya bụrụ ihe pụrụ iche bụ na ọ na-eto n’ebe kasị bụrụ ebe na-adịghị mma n’ahụ. A pụrụ ịhụ ya n’ọnụ ọnụ nke mkpọda ugwu ebe ifufe na-azakọrọ ihe dị na ya, ebe ọ̀tụ̀tụ̀ okpomọkụ pụrụ ịdalata nke ukwuu ruo ihe dị ka 35° C na nanị 24 hour. Ọ pụrụ ịgbanye mkpọrọgwụ ná ntakịrị oghere dị na nkume nke nwere ntakịrị ájá. Olee ụfọdụ n’ime ihe ndị kpatara ya ịnọgide na-adị ndụ n’ọnọdụ ndị ahụ siri ike?
Osisi dị-ndụ-ebighị-ebi nwere akwụkwọ ndị dị pokopoko, ndị na-eji nlezianya na-agbakọba mmiri. Nke a na-eme ya ka o jiri mmiri sitere ná mmiri ozuzo ma ọ bụ snow na-agbaze agbaze na-eme ihe n’ụzọ zuru ezu. Ọzọkwa, ọ na-eto n’ụyọkọ dị iche iche ndị na-ejikọta ume ha ọnụ iji gbadosie ụkwụ ike n’ala nkume ha. Site n’ịgbanye mkpọrọgwụ n’oghere ndị ahụ, o nwere nchebe ụfọdụ pụọ n’ọnọdụ ihu igwe, ọ bụ ezie na a pụrụ inwe ntakịrị ájá. N’ikwu ya n’ụzọ ọzọ, ọ na-eme nke ọma site n’iji ọnọdụ ndị siri ike eme ihe kasị mma.
N’ikwu ya n’ụzọ ime mmụọ, anyị pụrụ ịhụ onwe anyị n’ọnọdụ ndị na-ele ọdịdị nke ntachi obi anyị ule. Gịnị ga-enyere anyị aka ịtachi obi n’okpuru ule? Dị ka osisi ịdị ndụ ebighị ebi ahụ, anyị pụrụ ịgbakọba mmiri na-enye ndụ nke Okwu Chineke ma soro ezi ndị Kraịst na-akpachi anya maka nkwado na nchebe. Nke ka nke, dị ka okooko osisi alpine ahụ, anyị aghaghị ịrapagidesi ike ‘n’oke nkume’ anyị, bụ́ Jehova, nakwa n’Okwu ya na nzukọ ya.—2 Samuel 22:3.
N’eziokwu, osisi dị-ndụ-ebighị-ebi ahụ bụ ihe ncheta na-adọrọ adọrọ nke na, ọbụna na gburugburu ebe siri ike, anyị pụrụ ịtachi obi ma ọ bụrụ na anyị ewere ndokwa ndị dịnụ mee ihe. Jehova na-emesi anyị obi ike na ụdị ntachi obi ahụ ga-eduje n’anyị ‘iketa nkwa ahụ,’ bụ́ nke ga-apụta n’ụzọ nkịtị ịdị ndụ ebighị ebi.—Ndị Hibru 6:12; Matiu 25:46.