Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • jd isi 14 p. 179-191
  • “Ngọzi Ruo Mgbe Ọ Na-adịghị Ihe Ga-akọ” Gị

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • “Ngọzi Ruo Mgbe Ọ Na-adịghị Ihe Ga-akọ” Gị
  • Buru Ụbọchị Jehova n’Uche Na-ebi Ndụ
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • OGE IME KA A DỊ ỌCHA N’ỤZỌ IME MMỤỌ
  • “BIKO, NWALEENỤ M N’IHE A”
  • AHA GỊ DỊ N’AKWỤKWỌ NKE NDỤ
  • OKWUKWE NA-EDUGA NÁ NZỌPỤTA
  • IHE A KỌWARA BANYERE PARADAỊS
  • Ònye Ga-alanahụ Ụbọchị Jehova?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2002
  • “Webatanụ Otu Ụzọ n’Ụzọ Iri Nile n’Ụlọ Akụ Nke M”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1992
  • Ngọzi Jehova Na-eme Mmadụ Ọgaranya
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1992
  • Jehova—Chineke nke Na-ekwu Ihe Ga-eme n’Ọdịnihu ma Mezuo Ya
    Buru Ụbọchị Jehova n’Uche Na-ebi Ndụ
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Buru Ụbọchị Jehova n’Uche Na-ebi Ndụ
jd isi 14 p. 179-191

ISI NKE IRI NA ANỌ

“Ngọzi Ruo Mgbe Ọ Na-adịghị Ihe Ga-akọ” Gị

1, 2. (a) Olee mkpebi ndị bara uru onye ọ bụla n’ime anyị pụrụ ime? (b) Mmezu nke amụma dị aṅaa na-emetụta ngọzi ndị anyị pụrụ inweta?

OGE anyị bi ugbu a bụ oge ịma ikpe na oge ngọzi. Ọ bụ oge okpukpe na-adakpọ nakwa oge e weghachiri ezi ofufe. O doro anya na ị chọrọ inweta ngọzi na mmetụta dị mma ezi ofufe ahụ e weghachiri na-eme ka e nwee ugbu a nakwa nke ọ ga-eme ka e nwee n’ọdịnihu! Ma, olee ihe ị ga-eme iji hụ na i nwetara ihe ndị a? Azịza ya metụtara otu amụma nke nwere mmezu bụ́ isi ngwa ngwa ‘oge ikpeazụ’ malitere n’afọ 1914. (2 Timoti 3:1) Malakaị buru amụma, sị: “‘Ezi Onyenwe unu [Jehova], bụ́ onye unu na-achọ, ga-abịa n’ụlọ nsọ Ya, ya na onye ozi nke ọgbụgba ndụ ahụ, onye unu nwere mmasị na ya. Lee! Ọ ga-abịa,’ ka Jehova nke ụsụụ ndị agha kwuru.”—Malakaị 3:1.

2 Amụma a nke dị oké mkpa ná ndụ gị dị n’akwụkwọ nke ikpeazụ n’ime akwụkwọ amụma iri na abụọ ndị ahụ. Ka anyị na-atụle nke ikpeazụ n’ime ha, ihe Malakaị dere dị nnọọ ezigbo mkpa. Akwụkwọ ya nwere ndụmọdụ dị oké mkpa nke ga-eme ka gị na ndị ọzọ na-efe Jehova nweta “ngọzi ruo mgbe ọ na-adịghị ihe ga-akọ unu.” (Malakaị 3:10) Ka anyị lerukwuo anya n’isi nke atọ n’akwụkwọ Malakaị.

OGE IME KA A DỊ ỌCHA N’ỤZỌ IME MMỤỌ

3. Olee ihe mere n’etiti ndị Chineke n’oge ochie nke mere ka a họrọ “Izrel nke Chineke”?

3 Ihe dị ka narị afọ ise mgbe Malakaị dịsịrị ndụ, Jehova, bụ́ onye Kraịst (bụ́ “onye ozi [Chineke] nke ọgbụgba ndụ [Ebreham]”) nọchitere anya ya, bịara n’ụlọ nsọ ahụ dị na Jeruselem ka o kpee ndị ha na Ya gbara ndụ ikpe. Mba ahụ dum gosiri na o rughị eru ịnọgide na-enweta ihu ọma Jehova. N’ihi ya, Jehova jụrụ ya. (Matiu 23:37, 38) Ị pụrụ ịhụ ihe na-egosi nke ahụ n’ihe mere n’afọ 70 O.A. O dokwara anya na Chineke họọrọ mba ime mmụọ o ji dochie anya ya, ya bụ, “Izrel nke Chineke,” nke dị otu narị puku na puku iri anọ na puku anọ, ndị e si ná mba dị iche iche nweta. (Ndị Galeshia 6:16; Ndị Rom 3:25, 26) Ma nke ahụ abụghị mmezu ikpeazụ amụma Malakaị ga-emezu. Ọ na-ekwukwa banyere oge anyị a ma na-emetụta kpọmkwem olileanya i nwere n’ọdịnihu inweta “ngọzi ruo mgbe ọ na-adịghị ihe ga-akọ” gị.

4. Olee ajụjụ ọ dị mkpa ka a zaa mgbe e chisịrị Jizọs Eze n’afọ 1914?

4 Mmezu nke amụma Baịbụl na-egosi na n’afọ 1914, e mere ka Jizọs ghọọ Eze nke Alaeze eluigwe Jehova. Oge ruziri ka Jizọs mee ka a mata ìgwè Ndị Kraịst ruru eru inweta ihu ọma Chineke. Olee ndị ọ hụrụ na ha dị ọcha n’ụzọ ime mmụọ? Ị ga-ahụ azịza ya n’ihe Malakaị kwuru: “Ònye pụrụ idi ụbọchị ọ ga-abịa, ònye pụkwara iguzo mgbe ọ ga-apụta? N’ihi na ọ ga-adị ka ọkụ nke onye na-anụcha ihe.” (Malakaị 3:2) Olee mgbe, ọ̀ bụkwa n’ụzọ dị aṅaa, ka Jehova bịara ‘n’ụlọ nsọ’ ya maka ikpe ikpe?

5, 6. (a) Mgbe Jehova bịara ileta ụlọ nsọ ime mmụọ ya, gịnị ka ọ hụrụ n’etiti ihe ka n’ọnụ ọgụgụ ndị sịrị na ha na-efe ya? (b) Gịnị dị ndị Chineke e ji mmụọ nsọ tee mmanụ mkpa?

5 O doro anya na Chineke abịaghị n’ụlọ nsọ e ji nkume na ụrọ wuo. E bibiri ụlọ nsọ ikpeazụ dị otú ahụ e wuru maka ezi ofufe n’afọ 70 O.A. Kama nke ahụ, Jehova bịara n’ụlọ nsọ ime mmụọ, bụ́ ndokwa e mere nke ụmụ mmadụ pụrụ isi na ya bịakwute ya ma fee ya ofufe n’ihi àjà mgbapụta Jizọs Kraịst. (Ndị Hibru 9:2-10, 23-28) N’ezie, ọ bụghị chọọchị dị iche iche nke Krisendọm bụ ụlọ nsọ ime mmụọ ahụ, n’ihi na ha so n’usoro okpukpe nke ikpe ịwụfu ọbara na ịgba akwụna n’ụzọ ime mmụọ mara, usoro okpukpe nke na-akwado ozizi ụgha kama ịkwado ezi ofufe. Jehova gbara “akaebe ọsọ ọsọ megide” ya, ị makwaara na ikpe Jehova mara ya ziri ezi. (Malakaị 3:5) Otú ọ dị, mgbe e guzobesịrị Alaeze Chineke, e nwere otu ìgwè ezi Ndị Kraịst na-eje ozi n’ogige ụlọ nsọ ime mmụọ nke Chineke, bụ́ ndị gosipụtara site n’ọnwụnwa ndị tara akpụ ha gabigara na ha na-eguzosi ike n’ebe Chineke nọ. Ka o sina dị, ọ dị mkpa ka a nụchaa ọbụna ndị e tere mmanụ. Ihe ndị amụma iri na abụọ ahụ dere rụtụrụ aka na nke ahụ, n’ihi na nkwa ndị na-enye obi ụtọ e kwere banyere ịkpọlata ndị ohu Chineke ma n’ụzọ ime mmụọ ma n’ụzọ anụ ahụ́ dị n’ime ha. Malakaị buru amụma na a ga-enwe ndị Jehova “ga-anụcha . . . dị ka ọlaedo, nụchaakwa ha dị ka ọlaọcha.” Ha “ga-aghọkwara Jehova ndị na-eweta onyinye inweta ihu ọma n’ezi omume.”—Malakaị 3:3.

6 Dị ka nnukwu ihe àmà e nwere na-egosi, malite n’afọ 1918 gaa n’ihu, Jehova mere ka Ndị Kraịst e tere mmanụ dị ọcha bụ́ nke dị ha mkpa, meekwa ka ofufe ha, omume ha, na ozizi ha dị ọcha.a Ha na “oké ìgwè mmadụ” ahụ bụ́ ndị mesịrị sonyere ha eritewo uru dị ukwuu. (Mkpughe 7:9) Dị ka ìgwè dị n’otu, ha nọgidere na-ewetara Jehova “onyinye inweta ihu ọma n’ezi omume,” bụ́ nke ‘na-atọ Jehova ụtọ.’—Malakaị 3:3, 4.

Ihe Osise ndị dị na peeji nke 180 na 181

Jehova anọwo na-anụcha ndị ya dị ka otu ìgwè. Ọ̀ dị mkpa ka a nụchaa anyị n’otu n’otu n’ebe ụfọdụ?

7. Olee ihe anyị kwesịrị ịjụ onwe anyị banyere otú Chineke si ele anyị anya?

7 Otú ahụ ka ndị Chineke niile na-eme, ma olee banyere anyị n’otu n’otu? Ị pụrụ ịjụ, sị, ‘È nwere ihe ụfọdụ ọ ka dị mkpa ka m mezie n’àgwà m na n’omume m? Ọ̀ dị mkpa ka m mezie àgwà m, dị nnọọ ka Jehova nụchara ndị ya e tere mmanụ?’ Anyị ebuwo ụzọ hụ na ndị amụma iri na abụọ ahụ mere ka echiche na àgwà ndị na-ezighị ezi pụta ìhè, meekwa ka àgwà na omume ndị dị mma pụta ìhè. Otú ha si mee ka ihe ndị ahụ pụta ìhè emewo ka i nwee ike ịmata ihe Jehova “na-achọ n’aka gị.” (Maịka 6:8) Buru n’obi na a sịrị “n’aka gị.” Nke ahụ na-egosi ihe mere onye ọ bụla n’ime anyị kwesịrị iji nyochaa ma ọ̀ dị ebe o kwesịrị ịnụchakwu ma ọ bụ mekwuo ka ọ dị ọcha.

“BIKO, NWALEENỤ M N’IHE A”

8. Olee òkù Jehova na-akpọ ndị ya?

8 Tụlee ihe Jehova gara n’ihu ikwu site n’ọnụ Malakaị n’isi atọ, amaokwu nke iri. N’ebe ahụ, ị ga-ahụ òkù a Jehova ji ịhụnanya na-akpọ: “‘Webatanụ otu ụzọ n’ụzọ iri niile n’ụlọ nkwakọba ihe m, ka nri wee dịrị n’ụlọ m; biko, nwaleenụ m n’ihe a,’ ka Jehova nke ụsụụ ndị agha kwuru, ‘ma ḿ gaghị emeghe ọnụ ụzọ mmiri nke eluigwe wee wụsa unu ngọzi ruo mgbe ọ na-adịghị ihe ga-akọ unu.’” Ọ bụ ndị Chineke niile ka a na-akpọ òkù ahụ. Ị̀ na-ewere nke a dị ka òkù a kpọrọ gị?

9. Olee ụdị àjà ị pụrụ ịchụrụ Jehova, na otu ụzọ n’ụzọ iri ị pụrụ inye ya?

9 Olee otú ị pụrụ isi nye Jehova “otu ụzọ n’ụzọ iri”? N’ezie, iwu ejighị gị inye onyinye nakwa otu ụzọ n’ụzọ iri nkịtị, dị ka Iwu Mozis kwuru. Ihe Chineke na-atụ anya ya ugbu a bụ onyinye ime mmụọ. Dị ka anyị tụlere n’Isi nke Iri na Atọ, Pọl kọwara na ọrụ ịgba àmà ị na-arụ bụ ịchụ àjà. (Hosia 14:2) Onyeozi ahụ kwuziri banyere ụdị àjà ọzọ. O dere, sị: “Unu echefukwala ime ihe ọma na ịdị na-enye ndị ọzọ ihe [ihe onwunwe], n’ihi na àjà ndị dị otú ahụ na-adị Chineke ezi mma.” (Ndị Hibru 13:15, 16) Ya mere, o doro anya na “otu ụzọ n’ụzọ iri” ahụ e kwuru okwu ya na Malakaị 3:10 bụ onyinye ime mmụọ nakwa onyinye nkịtị. Dị ka Onye Kraịst e mere baptizim, ị raara onwe gị dum nye Jehova. Ma otu ụzọ n’ụzọ iri gị na-anọchite anya ụfọdụ n’ime ihe i nwere bụ́ ndị i nwere ike iwetara Jehova ma ọ bụ jiri jeere ya ozi. Ihe ndị ahụ bụ ma oge gị ma ike gị ma ihe onwunwe gị i ji na-ejere Jehova ozi.

10. Olee otú ị pụrụ isi ‘nwalee Jehova’ n’ụzọ ziri ezi?

10 Lee ka o si kwesị ekwesị na i ji iguzosi ike n’ihe na ịhụnanya na-enye Jehova otu ụzọ n’ụzọ iri ndị ahụ bụ́ ihe atụ! Nke a chọkwara ka ị ghọta na oge agwụwala! Ị ma na oké ụbọchị Jehova ji ọsọ na-abịa, na ọ “dịkwa oké egwu.” (Joel 2:1, 2, 11) Ndụ ndị mmadụ nọ n’ihe ize ndụ. Chineke na-akpọ òkù nke ị pụrụ ịza. Jehova na-agwa gị ka ị ‘nwalee ya.’ N’ezie, ọ dịghị mmadụ nkịtị kwesịrị ịnwa anwa nwalee Jehova dị ka à ga-asị na a pụghị ịtụkwasị Chineke obi. (Ndị Hibru 3:8-10) Ma, ị pụrụ iji obi umeala nwalee ya n’ụzọ kwesịrị ekwesị. N’ụzọ dị aṅaa? O kwere nkwa ngọzi. Mgbe ị na-erubere Chineke isi, ị na-anwale ya, dị ka à ga-asị na ị na-ajụ, sị, ‘Ọ̀ ga-agọzi m?’ N’ihi ya, ọ na-eme ka ọ bụrụ iwu na ọ ghaghị ime otú ahụ, imezu nkwa ahụ o kwere. Ya mere, nkwere Chineke kwere ka ị ‘nwalee ya’ na-eme ka i kwenyesikwuo ike na ọ ga-agọzi gị nke ukwuu.

11, 12. Olee ngọzi Jehova na-enye ndị ya bụ́ ndị gị onwe gị hụworo?

11 Ị pụrụ ịhụ na ndị Jehova ejiriwo mmesapụ aka jiri ihe onwunwe ha nye onyinye ma chụọ àjà n’ụzọ ime mmụọ. Jehova awụsawokwa ha ‘ngọzi ruo mgbe ọ na-adịghị ihe kọrọ ha.’ Ma eleghị anya, ị hụwo ka a na-awụsa ndị Chineke ngọzi ahụ, dị ka mmụba dị ukwuu nke Ndịàmà Jehova na-amụba n’ọnụ ọgụgụ malite ná mbido narị afọ nke iri abụọ ruo taa na-egosi. Ị hụwokwa ọganihu dị ukwuu e nwere n’ịghọta “ihe ndị miri emi nke Chineke.” (1 Ndị Kọrịnt 2:10; Ilu 4:18) Otú ọ dị, legodị nke a anya n’ụzọ ọzọ: Olee mmetụta nke a nweworo n’ebe ị nọ?

12 Ma eleghị anya, ọ dị mgbe ị nọ n’otu chọọchị, ma ọ bụkwanụ, mgbe ị ka malitere ịga ọmụmụ ihe Ndịàmà Jehova amalite. N’oge ahụ, ole n’ime eziokwu bụ́ isi ndị dị na Baịbụl ka ị ghọtara? Ugbu a, jiri nke ahụ tụnyere ihe ị mụtaworo kemgbe ahụ nakwa ihe ndị ị pụrụ iji Akwụkwọ Nsọ kwado. Ma ọ bụkwanụ, chee echiche banyere ihe ndị miri emi karị ị ghọtaworo, tinyere amụma ndị na-emezu ugbu a. Tụleekwa ọganihu ndị i nweworo n’iji ihe e kwuru n’amaokwu dị iche iche nke Baịbụl na-ebi ndụ. Lee ọganihu dị ukwuu i nweworo! Gị onwe gị kwa pụrụ ikwu dị ka Pita onyeozi, sị: “E mewo ka okwu amụma ahụ bụrụ ihe anyị ji n’aka karị.” (2 Pita 1:19) Isi ihe anyị na-ekwu bụ: ‘Jehova akụziworo gị ihe,’ ị bụkwa otu onye n’ime ezi Ndị Kraịst, bụ́ ndị chọrọ ijere Jehova ozi ruo mgbe ebighị ebi. (Aịzaya 54:13) Ka ọ dị ugbu a, ị pụrụ ikwu n’ụzọ ziri ezi na ọ gọziwo gị nke ukwuu.

AHA GỊ DỊ N’AKWỤKWỌ NKE NDỤ

13. Olee otú a pụrụ isi deba aha mmadụ n’akwụkwọ ncheta nke Chineke?

13 Ị ga-ahụkwu ngọzi ndị ọzọ Jehova na-enye, bụ́ ndị a kpọtụrụ aha na Malakaị 3:16, sị: “N’oge ahụ, ndị na-atụ egwu Jehova nọ na-akparịta ụka, otu onye na ibe ya, Jehova nọkwa na-ege ntị ma na-anụ ihe ha na-ekwu. E wee malite ide akwụkwọ ncheta n’ihu ya maka ndị na-atụ egwu Jehova nakwa maka ndị na-echebara aha ya echiche.” Ma ndị e tere mmanụ ma oké ìgwè mmadụ ahụ na-eji nsọpụrụ atụ “egwu Jehova.” Ọ̀ bụ na i cheghị na ịbụ otu n’ime Ndịàmà Jehova bụ ihe ùgwù, ịbụ otu n’ime ndị na-enwe obi ụtọ, ndị na-echebara aha Jehova echiche ma na-ebuli ya elu n’ụwa niile? Lee ka ị pụrụ isi nwee afọ ojuju ma nwee obi ike na Jehova na-echeta ikwesị ntụkwasị obi gị!—Ndị Hibru 6:10.

14. Olee otú ndị amụma iri na abụọ ahụ siworo nyere gị aka ịhụ omume na àgwà ndị Jehova kpọrọ asị?

14 Ma, olee otú gị onwe gị pụrụ isi ruo eru ka e denye aha gị ‘n’akwụkwọ ncheta’ ahụ, bụ́ nke a na-ede ọbụna ugbu a n’ihu Jehova? Cheta ụfọdụ n’ime ndụmọdụ amamihe dị na ha bụ́ ndị anyị hụrụ n’akwụkwọ ndị amụma iri na abụọ ahụ dere. Anyị ghọtara omume, àgwà, na ụzọ ndụ ndị na-adịghị amasị Jehova. Dị ka ihe atụ, ndị amụma ahụ mere ka anyị mara omume ndị Chineke sịrị na ha ekwekọghị n’ụkpụrụ ya ziri ezi, ndị pụkwara ime ka ndụ anyị laa n’iyi; dị ka “omume rụrụ arụ” na “mmụọ ịkwa iko.” (Hosia 4:12; 6:9) Chineke kpọrọ ndị na-aghọgbu di ha ma ọ bụ nwunye ha asị, tinyere ndị na-aghọgbu ndị ezinụlọ ha ndị ọzọ. (Malakaị 2:15, 16) Jehova kpaliri ndị amụma ya ka ha kwusie okwu ike na ụdị ime ihe ike ọ bụla adịghị amasị ya. (Emọs 3:10) O mekwara ka ha kọwaa na ọ dị mkpa izere ikpe ikpe na-ezighị ezi ma ọ bụ emeghị ihe n’eziokwu n’achụmnta ego nakwa n’okwu ego. (Emọs 5:24; Malakaị 3:5) Akwụkwọ iri na abụọ ahụ kwusiri okwu ike na ọ dị mkpa ka ndị e nyere ikike ghara ikwe ka ile mmadụ anya n’ihu ma ọ bụ ịchọ ọdịmma onwe ha naanị kpuchie ha anya.—Maịka 7:3, 4.

15. Olee ụfọdụ n’ime uru ndị mara mma ị na-erite n’ịgbaso agbamume ndị amụma iri na abụọ ahụ?

15 Ma, ihe ndị amụma ahụ mere abụghị naanị ime ka anyị mara ihe ndị anyị kwesịrị izere. Ha mere ka uru ndị anyị pụrụ irite n’ibi ndụ kwekọrọ n’ụkpụrụ Chineke pụta ìhè. Anyị na Chineke ga-enwe mmekọrịta chiri anya karị. (Maịka 4:5) Mgbe e nwere ezi omume, ọgbakọ anyị ga-akwụrụ chịm ma na-arụsikwu ọrụ ike. Alụmdi na nwunye anyị ga-esi ike karị, ezinụlọ anyị ga-adị n’otu karị ma lekwasị anya n’ihe ime mmụọ. (Hosia 2:19; 11:4) Site n’ime ihe ziri ezi nakwa site n’ime ihe n’eziokwu, ndị ọzọ ga na-asọpụrụ anyị. Ọ bụrụ na anyị eṅomie obi ebere Jehova, anyị ga na-egosi ụmụnna anyị ndị nwoke na ndị nwaanyị ọmịiko na obiọma. Ha onwe ha ga na-egosikwa anyị ọmịiko na obi ebere. (Maịka 7:18, 19) Ee, ndị ji ihe ime mmụọ kpọrọ ihe ga-agba anyị gburugburu, ya bụ, ụmụnna nwoke na ụmụnna nwaanyị ndị hụrụ eziokwu na udo n’anya. Karịsịakwa, Jehova ga-abụ enyi anyị. (Zekaraya 8:16, 19) Ọ̀ bụ na i kweghị na ihe ndị a bụ ngọzi ndị ị maliteworo inweta ugbu a?

16. Olee ọdịiche pụtara ìhè taa, gịnịkwa ka nke a ga-apụta n’ụbọchị Jehova ga-eme ka a zaa ajụjụ?

16 N’ihi ihe ndị anyị ka tụlesịrị, ọ bụ nnọọ eziokwu na “ihe dị iche n’etiti onye ezi omume na onye ajọ omume”—n’etiti ezi Ndị Kraịst na Ndị Kraịst ụgha—edokwuola nnọọ anya ugbu a karịa mgbe ọ bụla ọzọ. (Malakaị 3:18) Anyị na-agbalịsi ike ibi ndụ kwekọrọ n’ụkpụrụ Jehova, ebe ụwa na-emikpukwu onwe ha n’omume asọpụrụghị Chineke. Ị makwaara na ọdịiche a ga-adị oké mkpa mgbe “oké ụbọchị Jehova” ga-abịa.—Zefanaya 1:14; Matiu 25:46.

17. Olee otú ị pụrụ isi jiri ihe e kwuru n’akwụkwọ a mee ihe n’ọdịnihu?

17 O doro anya na ndụmọdụ ndị amụma iri na abụọ ahụ nyere bara uru n’oge ọ bụla. Mgbe ọ bụla ị na-eche otu nsogbu ihu ma ọ bụ chọọ ime mkpebi, i kwesịrị ịtụle ihe bara uru e kwuru n’akwụkwọ a. Ị pụrụ isi otú a gosi na ọ bụ ọchịchọ gị mgbe niile ka a na-ezi gị ụzọ Jehova nakwa ka ị ‘na-eje ije n’ụzọ ya.’ (Maịka 4:2) Otú ọ dị, ije ije n’ụzọ ya abụghị naanị n’oge a. Ihe ị chọsiri ike bụ ka e dee aha gị n’ụzọ a na-agaghị ehichapụ ya ehichapụ n’akwụkwọ ncheta Jehova, ọ́ bụghị ya? Akwụkwọ ndị amụma iri na abụọ ahụ dere ga-enyere gị aka ime nke ahụ.

OKWUKWE NA-EDUGA NÁ NZỌPỤTA

18. Olee ihe dị mkpa a chọrọ nke e kwuru na Joel 2:32, oleekwa ihe Pọl onyeozi gbakwụnyere n’ihe ahụ a chọrọ?

18 Ka Joel na-egosi otu ihe bụ́ isi nke pụrụ ime ka ị nọgide na-enwe ihu ọma Chineke, o kwuru, sị: “Onye ọ bụla nke ga-akpọku aha Jehova ga-alanahụ.” (Joel 2:32) Ndịozi abụọ, bụ́ Pita na Pọl, kwughachiri ihe a dị oké mkpa a chọrọ. (Ọrụ 2:21; Ndị Rom 10:13) Pọl gbakwụnyere ihe ọzọ n’agbamume ahụ mgbe ọ jụrụ, sị: “Olee otú ha ga-esi kpọkuo onye ha na-enwebeghị okwukwe n’ebe ọ nọ?” (Ndị Rom 10:14) Ma gị onwe gị kwesịrị n’ezie ịkpọku aha Jehova ma nwee okwukwe n’ebe ọ nọ ugbu a, ruokwa mgbe ebighị ebi!

Ihe Osise dị na peeji nke 187

Joel

19. Gịnị ka ịkpọku aha Jehova pụtara?

19 Ịkpọku aha Jehova abụghị naanị ịmara ezigbo aha Chineke na ịkpọ ya. (Aịzaya 1:15) Ihe e kwuru na Joel 2:32 na-emesi ike mkpa ọ dị inwe ezi nchegharị na inwe obi ike na Jehova na-agbaghara mmehie. (Joel 2:12, 13) Ịkpọku aha Chineke pụtara ịmara onye ọ bụ n’ezie, ịtụkwasị ya obi, irubere ya isi, na ibute ya ụzọ ná ndụ anyị. Ee, ijere Jehova ozi na-aghọ ihe kasị mkpa ná ndụ anyị. Nke ahụ na-emezi ka anyị dịtee ndụ aka ma na-eweta afọ ojuju, nke bụ́ ngọzi si n’aka Chineke.—Matiu 6:33.

20. Ka ị na-enwe okwukwe, olee ụgwọ ọrụ magburu onwe ya ị pụrụ inweta?

20 Jehova kwuru site n’ọnụ Habakọk, sị: “Onye ezi omume ga-esi n’ikwesị ntụkwasị obi ya dị ndụ.” (Habakọk 2:4) Buru nke ahụ n’obi. Ọ bụ otu n’ime eziokwu bụ́ isi ndị dị na Baịbụl. Pọl rụtụrụ aka ugboro atọ n’amaokwu ahụ n’ihe ndị o dere site n’ike mmụọ nsọ.b (Ndị Rom 1:16, 17; Ndị Galeshia 3:11, 14; Ndị Hibru 10:38) Ihe eziokwu nke a chọrọ bụ ka i nwee okwukwe n’àjà ahụ Jizọs Kraịst chụrụ maka mmehie anyị. Jizọs kọwara, sị: “Chineke hụrụ ụwa n’anya nke ukwuu nke na o nyere Ọkpara ọ mụrụ naanị ya, ka . . . onye ọ bụla nke nwere okwukwe na ya . . . nwee ndụ ebighị ebi.” Anyị na-agụkwa, sị: “Onye nwere okwukwe n’Ọkpara ahụ nwere ndụ ebighị ebi.” (Jọn 3:16, 36) Àjà ahụ na-eme ka e nweta ọgwụgwọ nke ọ bụ naanị Onye mgbapụta anyị pụrụ inye. Mgbe Malakaị desịrị ihe Jehova kwuru na oké ụbọchị Ya ga-eme ụwa Setan, ọ gara n’ihu ikwu, sị: “Anyanwụ nke ezi omume, bụ́ nke nku ya na-eweta ọgwụgwọ, ga-awakwasị unu ndị na-atụ egwu aha m; unu ga-apụkwa na-awụgharị dị ka ehi mara abụba.” Ee, Jizọs ga-awa dị ka anyanwụ ma weta ọgwụgwọ. Nke ahụ gụnyere ọgwụgwọ ime mmụọ anyị na-enweta ugbu a. Ma, lee ka o si bụrụ ihe na-enye obi ụtọ iche echiche na ọ ga-agụnye ọgwụgwọ anụ ahụ́ zuru ezu n’ime ụwa ọhụrụ!—Malakaị 4:2.

21. N’ihi gịnị ka ị pụrụ iji nwee okwukwe na Jehova nwere ikike imezu nzube ya?

21 Ọ dịkwa oké mkpa inwe okwukwe na Chineke nwere ikike imezu uche ya. N’oge Maịka, o siri ike mmadụ ịtụkwasị mmadụ ibe ya obi. Onye amụma ahụ kwuru, sị: “Unu enwela okwukwe n’ebe enyi unu nọ. Unu atụkwasịla enyi ọma unu obi.” Ma, o sighịrị Maịka ike ịtụkwasị Jehova obi, o kwesịghịkwa isiri gị ike. Maịka kwuru, sị: “Mụ onwe m, m ga na-ele anya Jehova.” (Maịka 7:5, 7) N’adịghị ka ụmụ mmadụ a na-ejighị n’aka, Jehova chọrọ ma nwee ikike imezu nzube ya maka igosi na o ruuru ya ịbụ eze nakwa maka ọdịmma na-adịte aka nke ụmụ mmadụ.

22. Gịnị ka ndị ji okwukwe na-akpọku aha Jehova ga-enweta?

22 Ị pụrụ iji obi ike kwuo ihe Habakọk kwuru: “Mụ onwe m ga-aṅụrị ọṅụ n’ime Jehova; m ga-enwe aṅụrị n’ime Chineke nke nzọpụta m.” (Habakọk 3:18) Joel onye amụma mere ka o doo anya ihe mere ndị ji okwukwe na-akpọku aha Jehova ga-eji nwee ọṅụ: Ha “ga-alanahụ” ma ọ bụ, dị ka Pọl si kwuo ya, a “ga-azọpụta” ha. (Joel 2:32; Ndị Rom 10:13) Olee otú o si bụrụ na ha ga-alanahụ, ma ọ bụ na a ga-azọpụta ha? Okwukwe i nwere anapụtaworị gị n’aghụghọ Setan nakwa n’ọtụtụ ihe ọjọọ ndị mmehie na-aghaghị iche ihu. (1 Pita 1:18) Tụkwasị na nke ahụ, ị pụrụ iji obi ike na-atụ anya ịbụ onye a zọpụtara n’ọgwụgwụ nke ajọ usoro ihe a nke ga-eweta ọdachi. Nke ahụ ga-emeghere gị ụzọ inweta ọtụtụ ngọzi ndị amụma iri na abụọ ahụ buru n’amụma.

IHE A KỌWARA BANYERE PARADAỊS

23, 24. (a) Olee ihe ụfọdụ ndị amụma iri na abụọ ahụ kọwara banyere Paradaịs? (b) Olee otú ihe ndị amụma iri na abụọ ahụ dere siworo metụta otú i si ele ọdịnihu anya?

23 E nwere ngọzi ndị na-adịte aka nke ndị “na-atụ egwu Jehova” ga-enweta. (Malakaị 3:16) Ụfọdụ n’ime ndị amụma iri na abụọ ahụ kọwara ihe ụfọdụ banyere Paradaịs elu ala ahụ, nke dị nnọọ nso, n’ụzọ doro anya. Ihe ahụ a kọwara pụrụ ime ka ị ṅụrịa ọṅụ nke ukwuu, meekwa ka ị na-atụ anya Paradaịs. Dị ka ihe atụ, Maịka dere, sị: “Onye ọ bụla n’ime ha ga-anọdụ n’okpuru osisi vaịn ya nakwa n’okpuru osisi fig ya, ọ dịghịkwa onye ga-eme ka ha maa jijiji.” (Maịka 4:4) N’ezie, mgbe Alaeze Chineke ga-amalite ịchị, ahụ́ ga-eru gị ala, ị ga-erikwa ihe ị rụpụtara!

24 Ịtụ anya mgbe ọrịa, iru uju, na ọbụna ọnwụ ga-akwụsị abụghị ịmụ anya arọ nrọ. Chegodị echiche banyere ụdị ọṅụ ndị a kpọlitere n’ọnwụ ga-enwe, bụ́ ndị ga-enwe olileanya ịbụ ndị zuru okè! N’ụzọ zuru ezu, ha ga-anọ n’ụwa nweta ihe ahụ Hosia 13:14 kwuru okwu ya, sị: “M ga-agbapụta ha n’aka Shiol; m ga-agbapụta ha n’aka ọnwụ. Ọnwụ, olee ebe ihe i ji agba mmadụ dị? Shiol, olee ebe mbibi ị na-eweta dị?” Pọl ji amaokwu ahụ kọwaa mbilite n’ọnwụ nke ndị ga-aga eluigwe—1 Ndị Kọrịnt 15:55-57.

25. Olee otú obi ga-adị gị n’ime ụwa ọhụrụ?

25 O kwesịghị ịbụ ihe sibigara ike ókè ikweta na a ga-enwe mbilite n’ọnwụ nke ndị ga-ebi n’ụwa. (Zekaraya 8:6) Mgbe Emọs na Maịka buru amụma na ndị Chineke ga-esi n’ebe a dọọrọ ha n’agha laa lọta, nke ahụ nwere ike isiworị ike nkweta. Ma, ị ma na o mere. (Emọs 9:14, 15; Maịka 2:12; 4:1-7) Ndị ahụ si esi lọta zara, sị: “Ọ dị anyị ka ọ̀ bụ ná nrọ. Ọchị juru anyị ọnụ n’oge ahụ, mkpu ọṅụ jupụtakwara n’ire anyị. . . . Jehova emewo oké ihe n’ihe o meere anyị. Anyị na-aṅụrị ọṅụ.” (Abụ Ọma 126:1-3) Ọ bụ otú ahụ ka ọ ga-adị gị n’ụwa ọhụrụ ahụ mgbe ị ga na-enweta “ngọzi ruo mgbe ọ na-adịghị ihe ga-akọ” gị.

Ndị hụrụ eziokwu na ikpe ziri ezi n’anya gbara ndị ohu Jehova gburugburu

26. Gịnị na-echere ndị bu ụbọchị Jehova n’uche na-ebi ndụ?

26 Mgbe “ụbọchị Jehova” kpochapụsịrị ajọ omume n’ụwa, “ọbụbụeze ga-abụkwa nke Jehova” n’echiche zuru ezu karị. (Obedaya 15, 21) Nke ahụ ọ́ gaghị abụrụ ndị niile nọ n’ụwa, bụ́ ndị ọ na-achị, ngọzi magburu onwe ya? I nwekwara ike iso ná ndị e kwuru banyere ha na Malakaị isi 3, sị: “‘Ha ga-aghọkwa nke m,” ka Jehova nke ụsụụ ndị agha kwuru, . . . M ga-enwekwara ha ọmịiko, dị nnọọ ka mmadụ na-enwere nwa ya nke na-ejere ya ozi ọmịiko.’” (Malakaị 3:17) N’ụzọ doro anya, ikwesị ntụkwasị obi gị, bụ́ nke mere ugbu a ka ị bụrụ onye a ga-azọpụta, ga-eme ka i nwee “ngọzi ruo mgbe ọ na-adịghị ihe ga-akọ” gị. Lee atụmanya magburu onwe ya nke a bụ!

a Iji nwetakwuo ihe ọmụma, lee Ụlọ Nche nke June 15, 1987, peeji nke 14-20.

b Pọl kwuru ihe e kwuru na Septuagint Grik, bụ́ ebe otú e si kwuo ya dịtụ iche n’otú ọ dị n’ihe odide Hibru.

OLEE OTÚ O SIWORO METỤTA GỊ?

  • Olee uru i ritere n’otú e si mee ka ndị Jehova n’oge a dị ọcha n’ụzọ ime mmụọ? —Daniel 12:10; Malakaị 3:12.

  • Olee ihe mere i ji chọọ ịmụbakwu àjà ị na-achụrụ Chineke?—Hosia 14:2; 1 Pita 2:5.

BURU ỤBỌCHỊ JEHOVA N’UCHE NA-EBI NDỤ

  • Gịnị mere i ji chee na ọ dị oké mkpa iburu Habakọk 2:4 n’uche?—Hosia 2:18, 20.

  • Olee otú ndị amụma iri na abụọ ahụ siworo mee ka ị na-atụsikwu anya ụwa ọhụrụ ahụ ike?—Abụ Ọma 126:1-3.

  • Gịnị mere i ji kpebisie ike iburu ụbọchị Jehova n’uche na-ebi ndụ?—Joel 2:1, 2; Habakọk 2:2, 3.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya