Chineke Na-eche Banyere Gị
MARY, nwanyị bụ́ onye Kraịst nọ ná ngwụsị nke afọ ndị 40 ya, atawo ahụhụ nke ukwuu ná ndụ ya. Ịkwa iko nke di ya dubara n’ịgba alụkwaghịm ihe karịrị iri afọ gara aga. Mgbe nke ahụ gasịrị, Mary gbasiri mgba ike ịrụzu ọrụ ya dị ka nne ọ bụ nanị ya na-azụ ụmụ ya anọ. Ma ọ ka nọ nanị ya, mgbe ụfọdụkwa owu ọmụma ahụ na-eyi ihe a na-agaghị edili. Mary na-eche, sị, ‘Nke a ọ̀ pụtara na Chineke adịghị eche banyere m ma ọ bụ ụmụ m na-enweghị nna?’
Ma ì nwetụwo ihe isi ike dị otú ahụ ma ọ bụ na i nwetụbeghị, n’ezie ị pụrụ ịghọta mmetụta Mary. Anyị nile atachiwo obi n’ọnọdụ ndị siri oké ike, ọ pụkwara ịbụ na anyị echewo nnọọ n’echiche mgbe na otú Jehova ga-esi mee ihe n’ihi anyị. Ụfọdụ n’ime ahụmahụ ndị a bụ ihe sitere kpọmkwem ná nrapara anyị rapaara n’iwu Chineke. (Matiu 10:16-18; Ọrụ 5:29) Ndị ọzọ bụ ihe ndị si n’anyị ịbụ ndị mmadụ na-ezughị okè na-ebi n’ụwa nke Setan na-achị pụta. (1 Jọn 5:19) Pọl onyeozi dere, sị: “Ihe e kere eke nile na-asụkọ ude, ime na-emekọkwa ha.”—Ndị Rom 8:22.
Otú ọ dị, eziokwu bụ na ị na-eche ule siri ike ihu apụtaghị na Jehova agbahapụwo gị ma ọ bụ na o nweghị mmasị n’ọdịmma gị. Olee otú ị pụrụ isi jiri nke a n’aka? Gịnị na-egosi na Chineke na-eche banyere gị?
Ihe Atụ Oge Ochie
Bible na-enye ihe àmà doro anya nke nlekọta Jehova maka ndị mmadụ n’otu n’otu. Tụlee banyere Devid. Jehova nwere mmasị onwe onye n’ebe nwatakịrị a na-azụ atụrụ nọ, na-ahụ ya ịbụ “otu nwoke dị ka obi Ya si chọọ.” (1 Samuel 13:14) Ka oge na-aga, mgbe Devid chịrị dị ka eze, Jehova kwere ya nkwa, sị: “M [ga-anọnyere] gị ebe ọ bụla i jere.”—2 Samuel 7:9.
Nke a ọ̀ pụtara na Devid biri ndụ e ji “ọgwụ” chebe, nke na-enweghị ihe isi ike ọ bụla? Ee e, Devid chere ule ndị siri ike ihu tupu na mgbe ọ na-achị. Ruo ọtụtụ afọ tupu ya aghọọ eze, Eze Sọl ahụ nzube ya bụ igbu ọchụ chụsosiri ya ike. N’oge a nke ndụ ya, Devid dere, sị: “Mkpụrụ obi m nọ n’etiti ọdụm . . . ụmụ mmadụ, ndị ezé nile ha bụ ube na àkụ́.”—Abụ Ọma 57:4.
Ma, n’ime ihe isi ike a nile o doro Devid anya na Jehova nwere nlekọta onwe onye n’ebe ọ nọ. “Mwagharị m ka Gị onwe gị gụworo ọnụ,” ka o kwuru n’ekpere nye Jehova. Ee, nye Devid ọ dị ka a ga-asị na Jehova dekọrọ ule ndị ahụ nile siri ike. Mgbe ahụ Devid gbakwụnyere, sị: “Tinye anya mmiri m nile n’ime karama akpụkpọ Gị; hà adịghị n’akwụkwọ Gị?”a (Abụ Ọma 56:8) Site n’ihe atụ a, Devid kwupụtara obi ike ya na Jehova maara ọ bụghị nanị ọnọdụ ahụ kama mmetụta ọ ga-enwe n’uche ya.
Ka ọ na-eru ná ngwụsị nke ndụ ya, Devid pụrụ ide site n’ahụmahụ nke onwe ya, sị: “Site n’aka Jehova ka e meworo ka nzọụkwụ nile nke mmadụ guzosie ike; ụzọ ya na-atọkwa Ya ụtọ. Mgbe ọ ga-ada, a gaghị atụdasị ya: n’ihi na Jehova na-akwagide aka ya.” (Abụ Ọma 37:23, 24) Gị onwe gị kwa pụrụ inwe obi ike na ọbụna ọ bụrụ na ule ndị ị na-enwe nọgidere ma na-aga n’ihu, Jehova na-ahụ ma na-eji ntachi obi gị akpọrọ ihe. Pọl dere, sị: “Chineke abụghị onye ajọ omume ichezọ ọrụ unu na ịhụnanya ahụ unu gosiri n’ebe aha Ya dị, ebe unu jeere ndị nsọ ozi, na-ejekwara ha ozi.”—Ndị Hibru 6:10.
Ọzọkwa, Jehova pụrụ ime ihe n’ihi gị site n’inye gị ume iji tachiere ihe mgbochi ọ bụla e tinyere n’ụzọ gị obi. “Ha dị ọtụtụ, bụ́ ihe ọjọọ nke na-adakwasị onye ezi omume,” ka Devid dere, “ma n’aka ha nile ka Jehova na-anapụta ya.” (Abụ Ọma 34:19) N’ezie, Bible na-agwa anyị na anya Jehova “na-ejegharị n’ụwa nile, igosi Onwe ya onye dị ike n’akụkụ ndị obi ha zuru okè n’ebe Ọ nọ.”—2 Ihe Emere 16:9.
Jehova Adọtawo Gị
Ihe àmà ọzọ e nwere nke nlekọta onwe onye Jehova ka a pụrụ ịhụ n’okwu Jisọs. “Ọ dịghị onye ọ bụla pụrụ ịbịakwute m,” ka o kwuru, “ọ bụrụ na Nna Nke zitere m adọghị ya.” (Jọn 6:44) Ee, Jehova na-enyere ndị mmadụ aka n’otu n’otu iji uru nile nke àjà Kraịst eme ihe. N’ụzọ dị aṅaa? Ruo n’ókè dị ukwuu, ọ bụ site n’ọrụ nkwusa Alaeze ahụ. N’eziokwu, ọrụ a na-eje ozi dị ka “àmà nye mba nile,” ma ọ na-eru ndị mmadụ n’otu n’otu. Eziokwu nke bụ na ị na-aṅa ntị ma na-azaghachi n’ozi nke ozi ọma ahụ bụ ihe àmà nke nchegbu onwe onye nke Jehova nwere maka gị.—Matiu 24:14.
Site na mmụọ nsọ, Jehova na-adọrọkwa ndị mmadụ n’otu n’otu gaa n’Ọkpara ya na n’olileanya nke ndụ ebighị ebi. Nke a na-eme ka onye ọ bụla ghọta ma tinye eziokwu ime mmụọ n’ọrụ n’agbanyeghị erughị eru na ezughị okè e ketara eketa. N’ezie, mmadụ apụghị ịghọta nzube nke Chineke n’enweghị enyemaka nke mmụọ Chineke. (1 Ndị Kọrint 2:11, 12) Dị ka Pọl degaara ndị Tesalọnaịka, “ọ bụghị mmadụ nile nwere okwukwe.” (2 Ndị Tesalọnaịka 3:2) Jehova na-enye nanị ndị na-egosi mmasị ịbụ ndị ọ dọtara mmụọ ya.
Jehova na-adọta ndị mmadụ n’ihi na ọ hụrụ ha n’anya dị ka ndị mmadụ n’otu n’otu ma chọọ ka ha nweta nzọpụta. Lee ihe àmà siri ike ọ bụ nke nlekọta onwe onye nke Jehova! Jisọs kwuru, sị: “Ọ bụghị ihe a chọrọ n’ihu Nna unu Nke bi n’eluigwe, ka otu n’ime ndị nta ndị a laa n’iyi.” (Matiu 18:14) Ee, n’anya Chineke onye ọ bụla dị mkpa dị ka onye dị iche. Ọ bụ ya mere Pọl pụrụ iji dee, sị: “[Ọ] ga-enyeghachi onye ọ bụla dị ka ọrụ ya nile si dị.” (Ndị Rom 2:6) Pita onyeozi kwukwara, sị: “Chineke abụghị onye na-ele mmadụ anya n’ihu: kama n’ime mba ọ bụla onye na-atụ egwu Ya, onye na-arụkwa ọrụ ezi omume, bụ onye Ọ na-anara nke ọma.”—Ọrụ 10:34, 35.
Ọrụ Ebube Dị Iche Iche nke Jisọs
E gosiri mmasị onwe onye Chineke nwere n’ebe ụmụ mmadụ nọ n’ụzọ na-emetụ n’ahụ n’ọrụ ebube Ọkpara ya, bụ́ Jisọs rụrụ. Mmetụta dị omimi na ọgwụgwọ ọrịa ndị a gakọrọ. (Mak 1:40, 41) Ebe ọ bụ na Jisọs “apụghị ime ihe ọ bụla n’Onwe ya, ma ọ bụghị ihe Ọ hụrụ na Nna Ya na-eme,” ọmịiko ya na-ese onyoonyo nchegbu ịhụnanya nke Jehova maka ohu ya nke ọ bụla.—Jọn 5:19.
Tụlee akụkọ nke otu ọrụ ebube Jisọs rụrụ, nke e dekọrọ na Mak 7:31-37. N’ebe a Jisọs gwọrọ otu nwoke ntị chiri, nke na-asụkwa nsụ. O “wee si n’ìgwè mmadụ ahụ kupụ [nwoke ahụ] iche,” ka Bible na-akọ. Mgbe ahụ, “O wee lee anya n’eluigwe, sụọ ude, sị ya, Efata, nke isi ya bụ, Ghere oghe.”
N’ihi gịnị ka Jisọs ji si n’ebe ìgwè mmadụ ahụ nọ kupụ nwoke a? Ọ dị mma, o yikarịrị ka onye ntị chiri, bụ́ onye ọ na-esiri ike nke ukwuu ikwu okwu ga na-eme ihere n’ihu ndị na-ele ya anya. Ọ pụrụ ịbụ na Jisọs achọpụtawo ahụ erughị ala nke nwoke a, ọ bụkwa ya mere o ji họrọ ịgwọ ya ebe nanị ha abụọ nọ. “Akụkọ ahụ nile,” ka otu onye ọkà mmụta Bible na-ekwu, “na-egosi anyị n’ụzọ kasị doo anya na Jisọs eleghị nwoke ahụ anya nanị dị ka onye ọrịa; o lere ya anya dị ka otu mmadụ. Nwoke ahụ nwere mkpa pụrụ iche na nsogbu pụrụ iche, sitekwa ná nchebara echiche kasị dị nro Jisọs mesoro ya omume n’ụzọ na-emejọghị mmetụta ya nakwa n’ụzọ ọ pụrụ ịghọta.”
Akụkọ a na-egosi na Jisọs nwere nchegbu onwe onye maka ndị mmadụ. Ị pụkwara ijide n’aka na otú ahụkwa ka o si nwee mmasị n’ebe ị nọ. N’eziokwu, ọnwụ ịchụàjà ya bụ ngosipụta nke ịhụnanya maka ụwa nile nke ihe a kpọrọ mmadụ a pụrụ ịgbapụta agbapụta. Ma, ị pụrụ iwere ihe ahụ o mere dị ka ihe metụtara gị onwe gị, dị ka Pọl mere, bụ́ onye dere, sị: ‘Ọkpara Chineke . . . hụrụ m n’anya, rarakwa Onwe ya nye n’ihi m.’ (Ndị Galetia 2:20) Ebe ọ bụkwa na Jisọs kwuru na “onye hụworo m anya ahụwo Nna m anya,” anyị pụrụ ijide n’aka na Jehova nwere otu ụdị mmasị ahụ n’ebe onye ọ bụla n’ime ndị ohu ya nọ.—Jọn 14:9.
Jehova Na-aghọ Onye Na-akwụghachi Ụgwọ
Ịnara ihe ọmụma Chineke gụnyere ịbịa mara akụkụ nke ọ bụla nke àgwà ya dị ka e kpughere ya na Bible. Aha ahụ bụ́ Jehova pụtara “Ọ Na-eme Ka Ọ Ghọọ,” na-egosi na Jehova pụrụ ịghọ ihe ọ bụla ọ na-ahọrọ ịghọ iji mezuo uche ya. N’akụkọ ihe mere eme nile, o werewo ọrụ dị iche iche, tinyere nke ịbụ Onye Okike, Nna, Eze Onyenwe Anyị, Onye Ọzụzụ Atụrụ, Jehova nke usuu nile nke ndị agha, Onye Na-anụ ekpere, Onyeikpe, Onye Ozizi Kasị Ukwuu, na Onye Mgbapụta.b
Iji ghọtazuo ihe aha Chineke pụtara, anyị aghaghịkwa ịbịa mara Jehova n’ọrụ ya dị ka Onye Na-enyeghachi Ụgwọ Ọrụ. Pọl dere, sị: “A sị na okwukwe adịghị ọ bụ ihe a na-apụghị ime, bụ́ ime ihe ga-atọ Chineke ezi ụtọ: n’ihi na onye na-abịakwute Chineke aghaghị ikwe na Ọ dị, na Ọ na-egosikwa Onwe ya Onye na-enyeghachi ndị na-achọ Ya ụgwọ ọrụ.”—Ndị Hibru 11:6.
Jehova ekwewo nkwa ndụ ebighị ebi n’elu ala bụ́ paradaịs nye ndị nile taa na-ahọrọ iji obi ha nile na-ejere ya ozi. Ọ bụghị ịchọ ọdịmma onwe onye nanị ilepụ anya ná mmezu nke nkwa ahụ dị ebube, ọ bụghịkwa ịdị mpako mmadụ iji uche ya hụ ka ọ na-ebi n’ebe ahụ. Mosis “wepụrụ anya ya lee nnyeghachi nke ụgwọ ọrụ ahụ.” (Ndị Hibru 11:26) N’otu aka ahụ Pọl tụsiri anya ike maka mmezu nke nkwa Chineke maka ndị Kraịst e tere mmanụ kwesịrị ntụkwasị obi. O dere, sị: “Ana m agbakwuru oké ịgba ọsọ ka m wee nata ihe a na-agbata n’ọsọ nke ọkpụkpọ dị elu nke Chineke n’ime Kraịst Jisọs.”—Ndị Filipaị 3:14.
Gị onwe gị kwa pụrụ ilepụ anya maka ụgwọ ọrụ nke Jehova na-ekwe ndị na-atachi obi nkwa ya. Ịtụ anya ụgwọ ọrụ ahụ bụ akụkụ bụ́ isi nke ọmụma ị maara Chineke na ntachi obi gị n’ozi ya. Ya mere tụgharịa uche kwa ụbọchị ná ngọzi nile ndị Jehova kwadebewooro gị. Mary, onye e hotara ná mmalite, emewo mgbalị pụrụ iche ime nke a. “Na nke mbụ ya ná ndụ m,” ka ọ na-asị, “na nso nso a anakweere m na àjà mgbapụta Jisọs metụtara m. M malitewo na-eche na Jehova na-eche banyere m dị ka otu mmadụ. Abụwo m onye Kraịst ruo ihe karịrị 20 afọ, kama ọ bụ nanị na nso nso a ka m malitere n’ezie ikwere nke a.”
Site n’ịmụ na ịtụgharị uche site n’obi na Bible, Mary, tinyere ọtụtụ nde ndị ọzọ, na-abịa ịmụta na Jehova na-eche banyere ndị ya ọ bụghị nanị dị ka otu ìgwè kamakwa dị ka mmadụ n’otu n’otu. Pita onyeozi kwenyesiri ike na nke a nke na o dere, sị: “Na-atụkwasịnụ [Chineke] nchegbu nile unu na-echegbu onwe unu, n’ihi na ihe nile banyere unu na-emetụ Ya n’obi.” (1 Pita 5:7) Ee, Chineke na-eche banyere gị!
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Karama akpụkpọ bụ ololo akpụkpọ anụ nke a na-eji etinye ihe ndị dị ka mmiri, mmanụ, mmiri ara ehi, mmanya, bọta, na cheese. Karama oge ochie dịgasị iche n’ibu na n’ọdịdị, ụfọdụ ha na-abụ akpa akpụkpọ anụ, ndị ọzọ na-abụkwa ololo nwere olu mịrị mịrị ndị nwere ihe e ji ekwuchi ha.
b Lee Ndị Ikpe 11:27; Abụ Ọma 23:1; 65:2; 73:28; 89:26; Aịsaịa 8:13; 30:20; 40:28; 41:14; leekwa New World Translation of the Holy Scriptures—With References, Appendix 1J, peji nke 1568, nke Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., bipụtara.
[Igbe dị na peeji nke 6]
Mbilite n’Ọnwụ—Ihe Àmà na Chineke Na-eche Banyere Anyị
IHE àmà na-edo anya nke mmasị Chineke nwere n’ebe onye ọ bụla n’otu n’otu nọ bụ nke a na-ahụ n’ime Bible na Jọn 5:28, 29 (NW): “Hour ahụ na-abịa mgbe ndị nile dị n’ili ncheta ga-anụ olu [Jisọs], wee pụta.”
Ọ dị mma ịmara na e ji okwu Grik bụ́ mne·meiʹon (ili ncheta) mee ihe n’ebe a kama iji taʹphos (ili). Okwu ahụ bụ́ taʹphos na-enye nanị nghọta nke ili mmadụ. Ma mne·meiʹon na-atụ aro na a na-echeta ihe ndekọ nke onye ahụ nwụworonụ.
Banyere nke a, cheedị nnọọ echiche banyere ihe mbilite n’ọnwụ ga-achọ n’aka Jehova Chineke. Iji weghachi mmadụ ná ndụ, ọ ghaghị ịma ihe nile banyere onye ahụ—tinyere àgwà ndị o ketara eketa na ike ncheta ya zuru ezu. Ọ bụ nanị mgbe ahụ ka a pụrụ iweghachi onye ahụ n’otu ọdịdị ahụ.
Otú ọ dị, nke a agaghị ekwe omume n’otú mmadụ si ele ihe anya, ma “a pụrụ ime ihe nile n’ebe Chineke nọ.” (Mak 10:27) Ọbụna na ọ pụrụ ịchọpụta ihe dị n’ime obi mmadụ. Ọbụna ma ọ bụrụ na mmadụ anwụworị kemgbe ọtụtụ narị afọ, ncheta Chineke na-echeta ya anaghị ada ada; ọ naghị apụ n’uche. (Job 14:13-15) N’ihi ya, mgbe ọ na-akpọtụ Abraham, Aịsak, na Jekọb aha, Jisọs pụrụ ikwu ọbụna ọtụtụ narị afọ mgbe ha nwụsịrị na Jehova ‘abụghị Chineke nke ndị nwụrụ anwụ, kama Ọ bụ nke ndị dị ndụ: n’ihi na ọ bụ n’ebe Ọ nọ ka mmadụ nile dị ndụ.’—Luk 20:38.
Ya mere, ihe zuru ezu banyere ọtụtụ ijeri ndị nwụworonụ dị ná ncheta Jehova Chineke. Lee oké ihe àmà na-egosi na Chineke na-eche banyere ụmụ mmadụ n’otu n’otu!
[Foto dị na peeji nke 7]
Jisọs nwere mmasị onwe onye n’ebe ndị ọ gwọrọ nọ