Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ
Ná Ndị Hibru 11:26, à na-ekwu banyere Mosis dị ka “Kraịst ahụ,” ka ọ bụ na ọ bụ onye yiri Jisọs Kraịst?
Mgbe a na-ekwu okwu banyere okwukwe Mosis, Pọl onyeozi dere na Mosis “gụrụ ịta ụta nke Kraịst anyị n’àkụ̀ dịkarịrị àkụ̀ nile nke Ijipt ukwuu: n’ihi na ọ wepụrụ anya ya lee nnyeghachi nke ụgwọ ọrụ ahụ.” (Ndị Hibru 11:26) O yiri ka Pọl ọ̀ na-ezo aka n’ebe Mosis nọ dị ka “Kraịst anyị,” ma ọ bụ onye e tere mmanụ, n’echiche ụfọdụ.
Ọ bụ ezie na, n’ụzọ dị iche iche, Mosis setịpụrụ ihe nlereanya maka Mesaịa ahụ na-abịanụ. Ọ bụ ezie na Mosis n’onwe ya bụ onye amụma, o buru amụma banyere ọbịbịa nke onye amụma ka ukwuu ‘dị ka onwe ya.’ Ọtụtụ ndị Juu nwere echiche na Jisọs bụ “Onye amụma ahụ,” bụ́ nke ndị na-eso ụzọ ya gosipụtara ịbụ eziokwu. (Deuterọnọmi 18:15-19; Jọn 1:21; 5:46; 6:14; 7:40; Ọrụ 3:22, 23; 7:37) Mosis bụkwa onye ogbugbo nke ọgbụgba ndụ Iwu ahụ, ma Jisọs natara “ofufe nke ka mma” dị ka “onye ogbugbo nke ọgbụgba ndụ ka mma,” bụ́ ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ dị ebube. (Ndị Hibru 8:6; 9:15; 12:24; Ndị Galetia 3:19; 1 Timoti 2:5) Ya mere n’ụzọ ụfọdụ a pụrụ ikwu na Mosis yiri Mesaịa ahụ na-abịanụ.
Otú ọ dị, nke ahụ eyighị ka ọ bụ ihe Ndị Hibru 11:26 pụtara n’ụzọ bụ isi. E nweghị ihe ọ bụla na-egosi na Mosis maara ihe nile banyere Mesaịa ahụ, mara ụma na-ebuli ahụhụ ndị ọ tara n’Ijipt elu dị ka ihe o mere n’ihi Mesaịa ahụ ma ọ bụ onye nnọchianya Ya.
Ụfọdụ atụwo aro na okwu Pọl ná Ndị Hibru 11:26 nwere ihe ọ pụtara nke yiri okwu ya nke bụ na ndị Kraịst hụrụ “ahụhụ nile Kraịst hụrụ.” (2 Ndị Kọrịnt 1:5) Ndị Kraịst e tere mmanụ maara na Jisọs Kraịst atawo ahụhụ nakwa na ọ bụrụ na ha na ya ‘na-ahụko ahụhụ, a ga-enyekọkwa ha na ya otuto’ n’eluigwe. Ma Mosis amaghị ahụhụ Mesaịa ahụ na-abịanụ ga-ata, Mosis enweghịkwa olileanya eluigwe.—Ndị Rom 8:17; Ndị Kọlọsi 1:24.
E nwere nghọta dị mfe karị nke otú Mosis si ‘gụọ ịta ụta nke Kraịst anyị dị ka àkụ̀.’
Mgbe Pọl dere “Kraịst anyị” ná Ndị Hibru 11:26, o ji okwu Grik ahụ bụ́ Khri·stouʹ mee ihe, bụ́ nke ya na okwu Hibru ahụ bụ́ Ma·shiʹach, ma ọ bụ Mesaịa bụ otu. Ma “Mesaịa” ma “Kraịst” pụtara “onye e tere mmanụ.” Ya mere Pọl na-ede banyere Mosis ‘ịgụ ịta ụta nke onye ahụ e tere mmanụ n’àkụ̀ dịkarịrị àkụ̀ nile.’ A pụrụ ịkpọ Mosis n’onwe ya “onye e tere mmanụ”?
Ee. N’oge Bible a pụrụ ime ka o doo anya na mmadụ nọ n’ọkwa ọrụ pụrụ iche site n’ịwụkwasị mmanụ n’isi ya. “Samuel wee were karama mmanụ, wụkwasị ya n’isi [Sọl].” “Samuel wee were mpi mmanụ ahụ, tee [Devid] n’etiti ụmụ nne ya: mmụọ nke Jehova wee na-adakwasị Devid.” (1 Samuel 10:1; 16:13; tụlee Ọpụpụ 30:25, 30; Levitikọs 8:12; 2 Samuel 22:51; Abụ Ọma 133:2.) Ma, ụfọdụ, dị ka onye amụma bụ Elaịsha na Eze Siria bụ Hazael, bụ ndi e kwuru okwu ha dị ka ndị “e tere mmanụ” ọbụna ọ bụrịị eziokwu na enweghị ihe ngosipụta na a wụkwasịrị ha mmanụ nkịtị. (1 Ndị Eze 19:15, 16; Abụ Ọma 105:14, 15; Aịsaịa 45:1) N’ihi nke a, mmadụ pụrụ ịbụ “onye e tere mmanụ” site n’ịbụ onye a họpụtara ma ọ bụ e nyere ọrụ n’ụzọ pụrụ iche.
N’echiche nke a Mosis n’onwe ya bụ onye Chineke e tere mmanụ, ụfọdụ Bible nyekwara nsụgharị dị ka “Onye Chineke e tere mmanụ” ma ọ bụ “Onye E Tere Mmanụ” ná Ndị Hibru 11:26. E nyere Mosis ọrụ dị ka onye nnochianya Jehova na onye ga-eduru Israel pụọ n’Ijipt. (Ọpụpụ 3:2-12, 15-17) Ọ bụ ezie na a zulitere Mosis n’etiti akụ na ụba na ebube nke Ijipt, o weere ọrụ e nyere ya dị ka àkụ̀ dị elu karị, bụ́ nke ọ nakweere ma mezuo. Ya mere, Pọl pụrụ ide na Mosis “gụrụ ịta ụta nke Kraịst anyị n’àkụ̀ dịkarịrị àkụ̀ nile nke Ijipt ukwuu.”