-
Ị̀ Na-ahụ “Onye A Na-apụghị Ịhụ Anya”?Ụlọ Nche—2014 | Eprel 15
-
-
10. (a) Gịnị ka Jehova gwara ndị Izrel ka ha mee n’ọnwa Naịsan nke afọ 1513 Tupu Oge Ndị Kraịst? (b) Gịnị mere Mozis ji rubere Chineke isi?
10 N’ọnwa Naịsan nke afọ 1513 Tupu Oge Ndị Kraịst, Jehova gwara Mozis na Erọn ka ha gaa gwa ndị Izrel ka ha mee ihe ha na-emetụbeghị, ya bụ, ka ha gbuo ebule ma ọ bụ mkpi ahụ́ dị mma, fesa ọbara ya n’awara ụzọ ha. (Ọpụ. 12:3-7) Gịnị ka Mozis mere? Pọl onyeozi mechara dee banyere Mozis, sị: “Ọ bụ okwukwe ka o ji mee ememme ngabiga, fesakwa ọbara n’awara ụzọ, ka onye mbibi ahụ wee ghara ibitụ ndị ha e bu ụzọ mụọ aka.” (Hib. 11:28) Mozis ma na Jehova na-emezu nkwa ọ bụla o kwere, ya enwee okwukwe na ụmụ ndị Ijipt niile e bu ụzọ mụọ ga-anwụ.
11. Gịnị mere Mozis ji gwa ndị Izrel ihe ha ga-eme?
11 Ọ ga-abụ na ụmụ Mozis nọ na Midian mgbe ahụ. O nweghị ihe ga-eme ha n’ebe ahụ.a (Ọpụ. 18:1-6) Ma, Mozis rubeere Chineke isi, gwa ndị isi ezinụlọ ọ bụla ihe ha ga-eme ka “onye mbibi ahụ” ghara igbu ụmụ ha e bu ụzọ mụọ. Mozis hụrụ ndị Izrel ibe ya n’anya. N’ihi ya, o mere ngwa ngwa kpọọ ndị okenye Izrel niile, gwa ha ka ha gbuo anụ ememme ngabiga.—Ọpụ. 12:21.
12. Olee ozi dị mkpa Jehova gwara anyị kwusaa?
12 Ndị mmụọ ozi na-enyere ndị Jehova aka, ha ana-ekwusa ozi dị mkpa, ya bụ, “Tụọnụ egwu Chineke, nyekwa ya otuto, n’ihi na oge awa nke ikpe si n’aka ya eruwo, n’ihi ya, feenụ Onye ahụ nke kere eluigwe na ụwa na oké osimiri na isi mmiri niile.” (Mkpu. 14:7) Ọ bụ ugbu a ka anyị ga-ekwusa ya. Anyị kwesịrị ịdọ ndị agbata obi anyị aka ná ntị ka ha si na Babịlọn Ukwu ahụ pụta, ka ha ghara “ịnata ụfọdụ n’ime ihe otiti ya.” (Mkpu. 18:4) “Atụrụ ọzọ” so Ndị Kraịst e tere mmanụ na-arịọ ndị ha na Chineke na-adịghị ná mma ka ha mee ka ha na ya “dị ná mma.”—Jọn 10:16; 2 Kọr. 5:20.
I nwee okwukwe ná nkwa Jehova, ọ ga na-agụ gị agụụ ikwusa ozi ọma (A ga-akọwa ya na paragraf nke 13)
13. Gịnị ga-eme ka ọ na-agụkwu anyị agụụ ikwusa ozi ọma?
13 Obi siri anyị ike na ugbu a bụ “oge awa nke ikpe” Chineke. Obi sikwara anyị ike na e kwesịrị ikwusa ozi ọma ngwa ngwa otú ahụ Jehova kwuru. N’ọhụụ, Jọn onyeozi hụrụ “ndị mmụọ ozi anọ ndị guzo na nkuku anọ nke ụwa, ha jidesiri ifufe anọ nke ụwa ike.” (Mkpu. 7:1) Okwukwe i nwere ò mere ka ị ghọta na ọ fọrọ obere ka ndị mmụọ ozi ahụ hapụ ifufe ahụ ha ji, nke ga-eme ka oké mkpagbu ahụ malite n’ụwa? Ọ bụrụ na okwukwe i nwere mere ka ị na-ahụ ndị mmụọ ozi ahụ, obi ga-esi gị ike ịna-ekwusa ozi ọma.
-
-
Ị̀ Na-ahụ “Onye A Na-apụghị Ịhụ Anya”?Ụlọ Nche—2014 | Eprel 15
-
-
a Jehova dunyere ndị mmụọ ozi ya ka ha gaa gbuo ụmụ ndị Ijipt e bu ụzọ mụọ.—Ọma 78:49-51.
-