Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • Mee Ka Okwukwe I Nwere n’Ihe Ị Na-ele Anya Ya Sie Ike
    Ụlọ Nche (Nke A Na-amụ Amụ)—2016 | Ọktoba
    • 10. Olee ụfọdụ ndị ohu Chineke na-ekweghị emebi iwu Chineke, gịnịkwa mere ha ji nwee ike ime otú ahụ?

      10 Ná Ndị Hibru isi 11, Pọl onyeozi kọrọ banyere ọnwụnwa ndị bịaara ọtụtụ ndị ohu Chineke a na-akpọghị aha ha. Dị ka ihe atụ, o kwuru banyere ụmụ nwaanyị ndị nwere okwukwe, ndị ụmụ ha nwụrụ, ma e mechaa kpọlite ha n’ọnwụ. O kwukwara banyere ndị ọzọ ‘na-ekweghị ka e jiri ihe mgbapụta ọ bụla tọhapụ ha, ka ha wee nweta mbilite n’ọnwụ ka mma.’ (Hib. 11:35) Ọ bụ eziokwu na anyị amaghị kpọmkwem ndị Pọl bu n’obi, e ji nkume tụgbuo ndị dị ka Nebọt na Zekaraya n’ihi na ha rubeere Chineke isi. (1 Eze 21:3, 15; 2 Ihe 24:20, 21) A gaara ‘atọhapụ’ Daniel na ndị enyi ya ma a sị na ha mebiri iwu Chineke. Kama ime otú ahụ, ha nwere okwukwe na Chineke ga-eme ka ha tachie obi. Ọ bụ ya mere o ji “mechie ọnụ ọdụm,” meekwa ka ‘ọkụ ghara ime ha ihe ọ bụla.’—Hib. 11:33, 34; Dan. 3:16-18, 20, 28; 6:13, 16, 21-23.

  • Mee Ka Okwukwe I Nwere n’Ihe Ị Na-ele Anya Ya Sie Ike
    Ụlọ Nche (Nke A Na-amụ Amụ)—2016 | Ọktoba
    • 12. Olee onye kacha tachie obi mgbe ọnwụnwa bịaara ya, gịnịkwa nyeere ya aka ime otú ahụ?

      12 Mgbe Pọl kwuchara banyere ọtụtụ ụmụ nwoke na ụmụ nwaanyị nwere okwukwe, o kwuru banyere Onyenwe anyị Jizọs Kraịst, bụ́ onye kacha tachie obi. Ndị Hibru 12:2 kwuru, sị: “N’ihi ọṅụ e debere n’ihu ya, o diri osisi ịta ahụhụ, leghara ihere anya, ọ nọdụwokwa ala n’aka nri nke ocheeze Chineke.” N’eziokwu, anyị kwesịrị ‘ichesi echiche ike banyere’ okwukwe Jizọs nwere mgbe ọnwụnwa kacha taa akpụ bịaara ya. (Gụọ Ndị Hibru 12:3.) Ndị Kraịst oge mbụ e gburu n’ihi okwukwe ha mere ka Jizọs. Dị ka ihe atụ, Antipas, bụ́ onye na-eso ụzọ Jizọs, ekweghị emebi iwu Chineke. (Mkpu. 2:13) Ụgwọ Chineke ga-akwụ ha bụ na ọ ga-akpọlite ha n’ọnwụ ka ha gaa eluigwe, nke karịrị ‘mbilite n’ọnwụ ahụ ka mma’ ndị oge ochie nwere okwukwe nọ na-atụ anya ya. (Hib. 11:35) Obere oge Alaeze Chineke malitere ịchị n’eluigwe n’afọ 1914, a kpọlitere ndị ahụ niile e tere mmanụ kwesịrị ntụkwasị obi, ha agaa eluigwe, bụrụ mmụọ, ka ha soro Jizọs chịa ụmụ mmadụ.—Mkpu. 20:4.

Akwukwo Igbo (1984-2025)
Pụọ
Banye
  • Igbo
  • Ziga ya
  • Ịgbanwe Ihe
  • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
  • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
  • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
  • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
  • JW.ORG
  • Banye
Ziga ya