Isi nke 29
Ịbụ Abụ Mmeri Ọhụrụ Ahụ
Ọhụụ 9—Mkpughe 14:1-20
Isiokwu: 144,000 ahụ na Nwa Atụrụ ahụ nọ n’Ugwu Zaịọn; a na-akpọsa ozi ndị sitere n’ọnụ ndị mmụọ ozi gburugburu ụwa; a na-ewe ihe ubi
Oge mmezu ya: 1914 ruo oké mkpagbu ahụ
1. Gịnị ka anyị mụtaworo banyere Mkpughe isi nke 7, 12, na 13, gịnịkwa ka anyị gaje ịmụta ugbu a?
LEE ka o si bụrụ ihe na-enye ume ọhụrụ ịsaghete ọhụụ na-esonụ nke Jọn hụrụ! N’eyighị nzukọ ndị jọrọ njọ ile anya, ndị yikwara anụ ọhịa nke dragọn ahụ, anyị na-ahụ ugbu a ndị ohu Jehova kwesịrị ntụkwasị obi na ọrụ ha na-arụ n’ime ụbọchị Onyenwe anyị. (Mkpughe 1:10) Mkpughe 7:1, 3 adịlarị mbụ mee ka anyị mara na a na-ejighachi ikuku anọ ahụ nke mbibi azụ ruo mgbe a kazuru ndị nile so na 144,000 ndị ohu ahụ e tere mmanụ akara. Mkpughe 12:17 emewo ka a mara na ‘ndị a fọdụrụ ná mkpụrụ [nwanyị ahụ]’ na-aghọ ebe pụrụ iche Setan, bụ́ dragọn ahụ, lekwasịrị anya n’oge ahụ. Mkpughe isi nke 13 esewokwa ihe onyinyo doro anya nke òtù ndọrọ ndọrọ ọchịchị dị iche iche ndị Setan guzobeworo n’elu ala iwetara ndị ohu Jehova kwesịrị ntụkwasị obi oké nrụgide na mkpagbu obi ọjọọ. Ma onyeisi ndị iro ahụ apụghị imebi nzube Chineke! Anyị gaje ịmụta ugbu a na n’agbanyeghị ọrụ obi ọjọọ nile nke Setan, e nwere ihe ịga nke ọma n’ịchịkọta 144,000 ahụ dum.
2. Olee nhụta bu ụzọ nke ihe obi ụtọ ga-eme n’ikpeazụ nke Jọn nyere anyị ná Mkpughe 14:1, ònye bụkwa Nwa Atụrụ ahụ?
2 Jọn, ya na òtù Jọn nke oge a, natara nhụta bu ụzọ nke ihe obi ụtọ ga-esi na ya pụta: “M wee hụ, ma lee, Nwa Atụrụ ahụ ka ọ na-eguzo n’Ugwu Zaịọn, ya na [narị puku na iri puku anọ na puku anọ], bụ́ ndị e deworo aha ya na aha Nna ya n’egedege ihu ha.” (Mkpughe 14:1) Dị ka anyị hụworo, Nwa Atụrụ nke a na Maịkael ahụ onye mere ka eluigwe dị ọcha site n’ịchụpụ Ekwensu na ndị mmụọ ọjọọ ya, bụ otu onye ahụ. Ọ bụ ya bụ Maịkael ahụ onye Daniel kọwara na ọ “na-eguzo n’akụkụ ụmụ ndị [Chineke]” mgbe ọ na-akwadebe ‘ibili ọtọ’ imezu ikpe ezi omume nile nke Jehova. (Daniel 12:1; Mkpughe 12:7, 9) Kemgbe 1914, Nwa Atụrụ Chineke nke a na-eji onwe ya achụ àjà anọwo na-eguzo n’Ugwu Zaịọn dị ka Eze Mesaịa.
3. Gịnị bụ “Ugwu Zaịọn” ebe Nwa Atụrụ ahụ na 144,000 ahụ “na-eguzo”?
3 Ọ bụ nnọọ dị ka Jehova buru n’amụma, sị: “Ma mụ onwe m emewo ka eze m guzosie ike n’elu Zaịọn, bụ́ ugwu nsọ m.” (Abụ Ọma 2:6; 110:2) Nke a adịghị ezokwa aka n’Ugwu Zaịọn nke dị n’elu ala, bụ́ ebe Jerusalem elu ala ahụ dị, bụ́ obodo ebe ndị eze bụ mmadụ ndị sitere n’usoro ọmụmụ Devid nọbu na-achị achị. (1 Ihe Emere 11:4-7; 2 Ihe Emere 5:2) Ee e, n’ihi na Jisọs, mgbe ọnwụ na mbilite n’ọnwụ ya n’afọ 33 O.A. gasịrị, bụ onye e guzobere dị ka nkume isi nkuku ntọala n’Ugwu Zaịọn dị n’eluigwe, bụ́ ọnọdụ eluigwe ebe Jehova kpebiworo idebe “obodo nke Chineke dị ndụ, bụ́ Jerusalem nke dị n’eluigwe.” Ya mere, n’ebe a “Ugwu Zaịọn” nọchiri anya ọnọdụ e buliri elu nke Jisọs na ndị nketa ibe ya, bụ́ ndị mejupụtara Jerusalem ahụ dị n’eluigwe, nke bụ Alaeze ahụ. (Ndị Hibru 12:22, 28; Ndị Efesọs 3:6) Ọ bụ ọnọdụ ọbụbụeze ahụ dị ebube nke Jehova buliri ha gaa na ya n’ime ụbọchị Onyenwe anyị. N’ime narị afọ ndị gafeworonụ, ndị Kraịst e tere mmanụ, dị ka “nkume dị ndụ,” ejiriwo ịnụ ọkụ n’obi na-elepụ anya gaa n’iguzo n’elu Ugwu Zaịọn ahụ dị n’eluigwe, ebe ha na Onyenwe anyị Jisọs Kraịst e meworo ka ọ dị ebube ga-adị n’otu n’Alaeze ya dị ebube.—1 Pita 2:4-6; Luk 22:28-30; Jọn 14:2, 3.
4. Ò si aṅaa bụrụ na 144,000 ahụ dum na-eguzo n’Ugwu Zaịọn?
4 Jọn hụrụ, ọ bụghị nanị Jisọs, kama ọnụ ọgụgụ ahụ zuru ezu nke 144,000 ndị so ya na-eketa Alaeze eluigwe ahụ ka ha na-eguzo n’elu Ugwu Zaịọn. N’oge ọhụụ ahụ nọchiri anya ya, ọtụtụ n’ime 144,000 ahụ, ma ọ bụghị ha nile, anọworị anọ n’eluigwe. Mgbe oge ụfọdụ gasịrị n’ime otu ọhụụ ahụ, Jọn nụrụ na ụfọdụ n’ime ndị nsọ ahụ ka ga-anọgide na-atachi obi wee nwụọ n’ikwesị ntụkwasị obi. (Mkpughe 14:12, 13) N’ihi ya, ihe àmà na-egosi na ụfọdụ n’ime 144,000 ahụ ka nọ n’elu ala. Ya mere, olee otú o si bụrụ na Jọn hụrụ ha nile ka ha na Jisọs na-eguzo n’elu Ugwu Zaịọn?a Ọ bụ n’echiche nke bụ na dị ka ndị so n’ọgbakọ nke ndị Kraịst e tere mmanụ, ndị a “abịaruwo Ugwu Zaịọn, na obodo nke Chineke dị ndụ, bụ́ Jerusalem nke dị n’eluigwe.” (Ndị Hibru 12:22) Dị ka Pọl mgbe ọ ka nọ n’elu ala, ha adịlarị mbụ—n’ụzọ ime mmụọ—bụrụ ndị e bugoro ka ha na Kraịst Jisọs dịrị n’otu n’ebe ndị dị n’eluigwe. (Ndị Efesọs 2:5, 6) Ọzọkwa, na 1919, ha zara òkù ahụ a kpọrọ ha nke bụ “rịgotanụ n’ebe a,” n’ụzọ ihe atụ, “ha wee rịgoo ruo n’eluigwe n’ime igwe ojii ahụ.” (Mkpughe 11:12) N’iburu akụkụ akwụkwọ nsọ ndị a n’uche, anyị pụrụ ịhụ na 144,000 ahụ dum—n’ikwu ya n’ụzọ ime mmụọ—so Jisọs Kraịst nọrọ n’elu Ugwu Zaịọn.
5. Aha olee ndị ka e dekwasịrị n’egedege ihu nke 144,000 ahụ, gịnịkwa ka aha nke ọ bụla pụtara?
5 Ọ dịghị ihe ọ bụla jikọrọ ndị so na 144,000 ahụ na ndị na-efe anụ ọhịa ahụ ofufe, bụ́ ndị e dekwasịrị akara ihe atụ ahụ bụ 666. (Mkpughe 13:15-18) Kama nke ahụ, e dekwasịrị aha nke Chineke na nke Nwa Atụrụ ahụ n’egedege ihu nke ndị a kwesịrị ntụkwasị obi. Ihe ịrụ ụka adịghị ya na Jọn, bụ́ onye Juu, hụrụ aha Chineke dị ka e si ede ya n’asụsụ Hibru, bụ́ יהוה.b N’ịbụ ndị e dekwasịrị aha Nna Jisọs n’ụzọ ihe atụ n’egedege ihu ha, ndị a a kara akara na-eme ka mmadụ nile mara na ha bụ ndịàmà Jehova, ndị ohu Ya. (Mkpughe 3:12) Ha ịbụ ndị e gosipụtara aha Jisọs n’egedege ihu ha na-egosi na ha nakweere na ọ bụ ya nwe ha. Ọ bụ “di” e kweworo ha na nkwa nye, ha gajekwa ịbụ ‘nwanyị ọ na-alụ ọhụrụ,’ ‘ihe okike ọhụrụ’ ndị na-efe Chineke ofufe n’olileanya nke inweta ndụ eluigwe. (Ndị Efesọs 5:22-24; Mkpughe 21:2, 9; 2 Ndị Kọrint 5:17) Mmekọrịta dị omimi nke ha na Jehova na Jisọs Kraịst nwere na-emetụta echiche na ihe omume ha nile.
Ịbụ Abụ dị ka nke Ọhụrụ
6. Ịbụ abụ dị aṅaa ka Jọn nụrụ, ò sikwa aṅaa kọwaa ya?
6 N’ikwekọ na nke a, Jọn kọrọ, sị: “M wee nụ olu ka ọ na-esi n’eluigwe daa, dị ka olu ọtụtụ mmiri, dịkwa ka olu oké égbè eluigwe: olu ahụ m nụrụ dịkwa ka olu ndị na-akpọ ụbọ akwara mgbe ha na-ewere ụbọ akwara ha na-akpọ: ha wee na-abụ dị ka à ga-asị na ọ bụ abụ ọhụrụ n’ihu ocheeze ahụ, na n’ihu ihe anọ ahụ nke dị ndụ na ndị okenye ahụ: ọ dịghịkwa onye ọ bụla pụrụ ịmụta abụ ahụ ma ọ bụghị [narị puku na iri puku anọ na puku anọ] ahụ, bụ́ ndị a gbatararịị n’ụwa.” (Mkpughe 14:2, 3) Ọ bụghị ihe ijuanya na e chetaghachiiri Jọn, mgbe ọ nụrụ 144,000 olu ndị ahụ ka e jikọtara ha n’otu abụ olu ụtọ, ụda oké mmiri si n’elu na-awụdata na égbè eluigwe na-ada oké ụda. Lee nnọọ ka o si dị ụtọ bụ ụda ụbọ akwara ahụ so ya! (Abụ Ọma 81:2) Olee òtù egwú nọ n’elu ala nke pụrụ iru ịma mma nke òtù egwú ahụ na-enweghị atụ?
7. (a) Gịnị bụ abụ ọhụrụ ahụ dị ná Mkpughe 14:3? (b) Olee otú o si bụrụ na abụ ahụ dị n’Abụ Ọma 149:1 bụ abụ ọhụrụ n’oge anyị a?
7 Gịnịkwa bụ “abụ ọhụrụ” nke a? Dị ka anyị hụtara mgbe anyị na-atụle Mkpughe 5:9, 10, abụ ahụ metụtara nzube Alaeze Jehova na onyinye ya dị ebube, site n’aka Jisọs Kraịst, ime ka Israel ime mmụọ bụrụ “alaeze na ndị nchụàjà nye Chineke anyị.” Ọ bụ abụ otuto nye Jehova, na-akpọsa ihe ọhụrụ ndị ọ na-emezu site n’aka Israel nke Chineke na ihe ndị ọ na-eme n’ihi ha. (Ndị Galetia 6:16) Ndị so n’Israel ime mmụọ nke a na-azaghachi ọkpụkpọ òkù onye ọbụ abụ ahụ nke bụ: “Toonụ Jaa. Bụkuonụ Jehova abụ ọhụrụ, bụ́ otuto ya n’ime mkpọkọta ndị ebere ya. Ka Israel ṅụrịa n’Onye meworo ya: ka ụmụ Zaịọn tegharịa egwú ọṅụ n’Eze ha.” (Abụ Ọma 149:1, 2) Ọ bụ eziokwu na e dere okwu ndị ahụ n’ọtụtụ narị afọ gara aga, ma n’oge anyị a, e jiwo nghọta ọhụrụ na-abụ abụ ahụ. Na 1914, a mụrụ Alaeze Mesaịa ahụ. (Mkpughe 12:10) Na 1919 ndị Jehova nọ n’elu ala malitere iji ịnụ ọkụ n’obi e mere ka ọ dị ọhụrụ na-akpọsa ‘okwu alaeze ahụ.’ (Matiu 13:19) N’ịbụ ndị isiokwu dịịrị afọ 1919 kpaliri (Aịsaịa 54:17), bụrụkwa ndị a gbara ume n’ihi mweghachi e weghachiri ha baa n’ime paradaịs ime mmụọ, ha malitere n’afọ ahụ ‘were abụ ọma na-abụku Jehova abụ n’ime obi ha.’—Ndị Efesọs 5:19.
8. N’ihi gịnị ka o ji bụrụ nanị 144,000 ahụ nwere ike ịmụta abụ ọhụrụ ahụ dị ná Mkpughe 14:3?
8 Ma, gịnị mere o ji bụrụ nanị 144,000 ahụ nwere ike ịmụta abụ ahụ a kpọtụrụ uche na Mkpughe 14:3? Ọ bụ n’ihi na o metụtara ahụmahụ ha dị ka ndị nketa a họpụtara nke Alaeze Chineke. Ọ bụ nanị ha ka a nabatara dị ka ụmụ nke Chineke, jirikwa mmụọ nsọ tee ha mmanụ. Ọ bụ nanị ha ka e si n’elu ala zụta ịghọ akụkụ nke Alaeze eluigwe ahụ, ọ bụkwa nanị ha “ga-abụ ndị nchụàjà . . . ha ga-esokwa [Jisọs Kraịst] bụrụ eze” ruo otu puku afọ iji weta ihe a kpọrọ mmadụ n’izu okè. Ọ bụ nanị ha ka a hụrụ ka ha “na-abụ dị ka à ga-asị na ọ bụ abụ ọhụrụ” kpọmkwem n’ihu Jehova.c Ahụmahụ na olileanya ndị a pụrụ iche na-eme ka ha nwee obi ekele pụrụ iche maka Alaeze ahụ, na-emekwa ka ha nwee ike ịbụ abụ banyere ya n’ụzọ ọ na-adịghị onye ọzọ pụrụ ime ya.—Mkpughe 20:6; Ndị Kọlọsi 1:13; 1 Ndị Tesalọnaịka 2:11, 12.
9. N’ụzọ dị aṅaa ka oké ìgwè mmadụ ahụ siworo meghachi omume n’ịbụ abụ nke ndị ahụ e tere mmanụ, wee si otú a mezuo agbamume dị aṅaa?
9 Ma ndị ọzọ na-ege ntị, na-emeghachikwa omume n’ịbụ abụ ha. Kemgbe 1935, oké ìgwè mmadụ na-aba ụba nke atụrụ ọzọ anụwo abụ mmeri ha, a kpaliwokwa ha isonyere ha n’ịkpọsa Alaeze Chineke. (Jọn 10:16; Mkpughe 7:9) Ọ bụ eziokwu na ndị a bịara ọhụrụ apụghị ịmụta ịbụ kpọmkwem otu abụ ọhụrụ ahụ nke ndị a gaje ịchị achị n’Alaeze Chineke na-abụ. Ma ha onwe ha na-abụkwa abụ olu ụtọ iji too Jehova, bụ́ abụ otuto nke na-aja Jehova mma maka ihe ọhụrụ nile ọ na-emezu. Ha si otú a na-emezu agbamume onye ọbụ abụ ahụ nke bụ: “Bụkuonụ Jehova abụ ọhụrụ: bụkuonụ Jehova abụ, unu ụwa nile. Bụkuonụ Jehova abụ, gọzienụ aha ya; na-ezisanụ ozi nzọpụta ya site n’otu ụbọchị ruo ụbọchị ọzọ. Kọsaanụ akụkọ ebube ya n’etiti mba nile, akụkọ oké ọrụ ya nile n’etiti ndị nile dị iche iche. Nyenụ Jehova, unu agbụrụ nke ndị nile dị iche iche, nyenụ Jehova nsọpụrụ na ike. Sịnụ n’etiti mba nile, Jehova bụ eze.”—Abụ Ọma 96:1-3, 7, 10; 98:1-9.
10. Ò si aṅaa kwe omume na 144,000 ahụ na-abụ abụ “n’ihu” 24 ndị okenye ihe atụ ahụ?
10 Olee otú 144,000 ahụ si na-abụ abụ “n’ihu” ndị okenye ahụ, ebe ọ bụ na 24 ndị okenye ahụ bụkwa 144,000 ahụ n’ọnọdụ ha dị ebube n’eluigwe? Ná mmalite nke ụbọchị Onyenwe anyị, a kpọlitere ndị ahụ “nwụrụ n’ime Kraịst” n’ọnwụ dị ka ndị bụ mmụọ. Otú a, ndị Kraịst e tere mmanụ, ndị ji ikwesị ntụkwasị obi nwee mmeri, nọ n’eluigwe ugbu a, na-arụzu n’ụzọ ihe atụ ọrụ nile a pụrụ iji tụnyere ndị ahụ 24 ìgwè ndị nchụàjà bụ ndị okenye na-arụ. A gụnyere ha n’ọhụụ nke nzukọ Jehova dị n’eluigwe. (1 Ndị Tesalọnaịka 4:15, 16; 1 Ihe Emere 24:1-18; Mkpughe 4:4; 6:11) N’ihi ya, ihe fọdụrụ na 144,000 ahụ ka nọ n’elu ala ebe a na-abụ abụ ọhụrụ n’ihu, ma ọ bụ n’ebe ụmụnna ha a kpọliteworo n’ọnwụ gaa n’eluigwe ga na-ahụ ha.
11. N’ihi gịnị ka e ji na-ezo aka ná ndị ahụ e tere mmanụ nwere mmeri dị ka 24 ndị okenye nakwa dị ka 144,000?
11 N’ebe a, anyị pụkwara ịjụ, sị: N’ihi gịnị ka e ji zoo aka ná ndị a e tere mmanụ, ndị nwere mmeri dị ka 24 ndị okenye ihe atụ ahụ nakwa dị ka 144,000? Ọ bụ n’ihi na akwụkwọ Mkpughe na-ele otu ìgwè a anya site n’ụzọ abụọ dị iche iche. Mgbe nile, a na-egosi 24 ndị okenye ahụ n’ọnọdụ kasị elu ha ga-enwe, nke bụ gburugburu ocheeze Jehova, ndị nọ dị ka ndị eze na ndị nchụàjà n’eluigwe. Ha na-ese onyinyo ìgwè ahụ zuru ezu nke 144,000 n’ọnọdụ ha n’eluigwe, ọ bụ ezie na a ka nwere ọnụ ọgụgụ dị nta fọdụrụ n’ime ndị a n’elu ala. (Mkpughe 4:4, 10; 5:5-14; 7:11-13; 11:16-18) Otú ọ dị, Mkpughe isi nke 7 na-elekwasị anya na 144,000 ahụ dị ka ndị a gbatara n’etiti ihe a kpọrọ mmadụ, ọ na-emesikwa oké nzube Jehova ike, bụ́ ịka ọnụ ọgụgụ ahụ zuru ezu nke ndị Israel ime mmụọ akara n’otu n’otu na inye oké ìgwè mmadụ a na-amaghị ọnụ ọgụgụ ha nzọpụta. Mkpughe isi nke 14 sere ihe onyinyo nke na-emesi eziokwu ahụ ike nke bụ na ọnụ ọgụgụ zuru ezu nke òtù Alaeze ahụ dị 144,000 ndị nwere mmeri n’otu n’otu ga-esonyere ha na Nwa Atụrụ ahụ n’elu Ugwu Zaịọn. E mekwara ka a mara iru eru a chọrọ n’aka mmadụ ka o wee soro na 144,000 ahụ, dị ka anyị gaje ịhụ ugbu a.d
Ndị Na-eso Ụzọ Nwa Atụrụ Ahụ
12. (a) Olee otú Jọn si gaa n’ihu ná nkọwa ya nke 144,000 ahụ? (b) N’echiche dị aṅaa ka e zoro 144,000 ahụ aka dị ka ụmụ agbọghọ na-amaghị nwoke?
12 N’ịga n’ihu ná nkọwa ya nke 144,000 ahụ ndị ‘a gbatara site n’ụwa,’ Jọn na-akọrọ anyị, sị: “Ndị a bụ ndị na-emerụghị onwe ha n’ahụ ndị inyom; n’ihi na ha dị ọcha ka ụmụ agbọghọ na-amaghị nwoke. Ndị a bụ ndị na-eso Nwa Atụrụ ahụ ebe ọ bụla ọ na-eje. Ndị a ka a gbatara n’etiti mmadụ, ịbụrụ Chineke na Nwa Atụrụ ahụ mkpụrụ mbụ. Ọ dịghịkwa ụgha ọ bụla a hụrụ n’ọnụ ha: ha bụ ndị a na-ataghị ụta.” (Mkpughe 14:4, 5) Eziokwu ahụ nke bụ na 144,000 ahụ dị ka “ụmụ agbọghọ na-amaghị nwoke” apụtaghị na ọ bụ iwu na ndị so n’òtù a bụ ndị na-alụghị di ma ọ bụ nwunye mgbe ha ka nọ n’anụ ahụ. Pọl onyeozi degaara ndị Kraịst nwere ọkpụkpọ eluigwe ahụ akwụkwọ na, ọ bụ ezie na e nwere uru ndị na-adịrị onye Kraịst na-alụghị di ma ọ bụ nwunye, ọ ka mma ịlụ di ma ọ bụ nwunye n’ọnọdụ ụfọdụ. (1 Ndị Kọrint 7:1, 2, 36, 37) Ihe e ji amara òtù nke a bụ amaghị nwoke ma ọ bụ nwanyị n’ụzọ ime mmụọ. Ha ezerewo ịkwa iko ime mmụọ nke ha na ndọrọ ndọrọ ọchịchị ụwa na okpukpe ụgha. (Jemes 4:4; Mkpughe 17:5) Dị ka nwanyị e kwere Kraịst nkwa ya n’ọlụlụ di, ha edebewo onwe ha ọcha, bụrụkwa “ndị a na-apụghị ịta ụta n’etiti ọgbọ gbagọrọ agbagọ nke na-enwekwa anya uhie.”—Ndị Filipaị 2:15.
13. N’ihi gịnị ka 144,000 ahụ ji bụrụ nwunye kwesịrị Jisọs Kraịst, hà sikwa aṅaa “na-eso Nwa Atụrụ ahụ ebe ọ bụla ọ na-eje”?
13 Ọzọ, “ọ dịghịkwa ụgha ọ bụla a hụrụ n’ọnụ ha.” Na nke a, ha yiri Eze ha, bụ́ Jisọs Kraịst. Mgbe ọ bụ mmadụ zuru okè, “ọ dịghị mmehie ọ bụla o mere, a hụghịkwa aghụghọ n’ọnụ ya.” (1 Pita 2:21, 22) N’ịbụ ndị a na-apụghị ịta ụta na ndị na-ekwu eziokwu n’otu mgbe ahụ, a kwadebere 144,000 ahụ dị ka nwanyị a na-alụ ọhụrụ nke dị ọcha nye Onyeisi Nchụàjà nke Jehova. Mgbe Jisọs nọ n’elu ala, ọ kpọrọ ndị obi ha ziri ezi òkù ka ha soro ya. (Mak 8:34; 10:21; Jọn 1:43) Ndị zara òkù ahụ gbasoro ihe nlereanya ya nke ịdị ndụ, rubekwa isi n’ozizi ya nile. Otú a, mgbe ha na-adị ndụ n’elu ala, ha “na-eso Nwa Atụrụ ahụ ebe ọ bụla ọ na-eje” ka ọ na-eduru ha gabiga ụwa nke Setan.
14. (a) Ò si aṅaa bụrụ na 144,000 ahụ ‘bụụrụ Chineke na Nwa Atụrụ ahụ mkpụrụ mbụ’? (b) N’echiche dị aṅaa ka oké ìgwè mmadụ ahụ bụkwa mkpụrụ mbụ?
14 Narị puku na iri puku anọ na puku anọ ahụ bụ ndị ‘a gbatara site n’ụwa,’ ndị “a gbatara n’etiti mmadụ.” A na-anabata ha dị ka ụmụ Chineke, mgbe mbilite n’ọnwụ ha gasịrị, ha agaghị abụkwa ụmụ mmadụ efu nwere anụ ahụ na ọbara ọzọ. Dị ka a kpọtụrụ uche n’amaokwu nke 4, ha na-aghọrọ “Chineke na Nwa Atụrụ ahụ mkpụrụ mbụ.” N’eziokwu, laa azụ na narị afọ mbụ, Jisọs bụ “mkpụrụ mbụ nke ndị daworo n’ụra ọnwụ.” (1 Ndị Kọrint 15:20, 23) Ma 144,000 ahụ bụ “otu aha mkpụrụ mbụ” n’etiti ihe a kpọrọ mmadụ na-ezughị okè, ndị e ji àjà Jisọs zụta. (Jemes 1:18) Ma ịchịkọta mkpụrụ site n’etiti ihe a kpọrọ mmadụ adịghị akwụsị mgbe a chịkọtasịrị ha. Akwụkwọ Mkpughe adịlarị mbụ zoo aka ná nchịkọta nke oké ìgwè mmadụ a na-apụghị ịgụta ọnụ ndị ji oké olu na-eti mkpu, sị: “Nzọpụta dịịrị Chineke anyị, onye na-anọkwasị n’ocheeze ahụ, dịkwara Nwa Atụrụ ahụ.” Oké ìgwè mmadụ nke a ga-alanarị oké mkpagbu ahụ, ka ha nọgidekwara na-enweta ume ọhụrụ site “n’isi iyi nke mmiri nke ndụ,” a ga-ebuli ha gaa n’izu okè nke mmadụ n’elu ala. Ogologo oge ụfọdụ mgbe oké mkpagbu ahụ gasịrị, Hedis ga-achịpụta ihe nile dị n’ime ya, a ga-akpọlitekwa ọtụtụ nde ụmụ mmadụ ndị ọzọ n’ọnwụ ha wee nwee ohere ịṅụrụkwa mmiri ndụ ahụ. N’iburu nke a n’uche, ọ ga-abụ ihe ziri ezi ịkpọ oké ìgwè mmadụ ahụ mkpụrụ mbụ nke atụrụ ọzọ ahụ—ha bụ ndị mbụ ‘ga-asa uwe mwụda ha wee mee ka ha dị ọcha n’ime ọbara Nwa Atụrụ ahụ,’ na-enwe olileanya nke ịdị ndụ ebighị ebi n’elu ala.—Mkpughe 7:9, 10, 14, 17; 20:12, 13.
15. Myirịta dịgasị aṅaa ka e nwere n’etiti mkpụrụ mbụ atọ ahụ dị iche iche na ememe ndị e mere n’okpuru Iwu Mosis?
15 Mkpụrụ mbụ atọ ndị a (Jisọs Kraịst, 144,000 ahụ, na oké ìgwè mmadụ ahụ) nwere ihe na-akpali mmasị ndị kwekọrọ na ha n’ememe ndị ahụ a na-eme dị ka Iwu Mosis oge ochie ahụ si dị. Na Nisan 16, n’oge Ememe Achịcha Ekoghị Eko, a na-eche n’ihu Jehova otu ùkwù nke mkpụrụ mbụ sitere n’ọka barley. (Levitikọs 23:6-14) Nisan 16 bụ ụbọchị e si n’ọnwụ kpọlite Jisọs. N’ụbọchị nke 50 malite na Nisan 16, ya bụ n’ọnwa nke atọ, ndị Israel na-eme ememe nke owuwe ihe ubi nke mkpụrụ ndị mbụ chara acha nke ọka wheat. (Ọpụpụ 23:16; Levitikọs 23:15, 16) E mesịrị na-akpọ ememe nke a Pentikọst (site n’okwu Grik pụtara “nke iri ise”), ọ bụkwa na Pentikọst nke 33 O.A. ka e jiri mmụọ nsọ tee ndị mbụ so na 144,000 ahụ mmanụ. N’ikpeazụ, n’ọnwa nke asaa mgbe a chịkọtachara owuwe ihe ubi, a na-eme Ememe Ụlọ Ntu, bụ́ oge iji ọṅụ na-enye ekele, mgbe ndị Israel na-ebi n’ụlọ ntu ruo otu izu, bụ́ ndị e ji ihe dị iche iche mee, ndị gụnyere igu nkwu. (Levitikọs 23:33-43) N’ụzọ kwekọrọ na nke a, oké ìgwè mmadụ ahụ, ndị bụ otu akụkụ nke owuwe ihe ubi ahụ, nọ n’ihu ocheeze ahụ na-enye ekele, “igu nkwu dịkwa n’aka ha.”—Mkpughe 7:9.
Izisa Ozi Ọma Ebighị Ebi
16, 17. (a) Jọn hụrụ mmụọ ozi nke na-efe n’olee ebe, mkpọsa dịkwa aṅaa ka mmụọ ozi ahụ na-eme? (b) Olee ndị na-ekere òkè n’ọrụ nkwusa Alaeze ahụ, ahụmahụ dịgasị aṅaa na-egosikwa nke a?
16 Ihe ọzọ Jọn dere bụ: “M wee hụ mmụọ ozi ka ọ na-efe n’etiti eluigwe, na-enwe ozi ọma ebighị ebi izisara ndị na-anọdụ n’elu ụwa, bụ́ mba nile ọ bụla na ebo nile ọ bụla na asụsụ nile ọ bụla na ndị nile ọ bụla; ọ na-ewerekwa oké olu sị, Tụọnụ egwu Chineke, nyekwa ya otuto; n’ihi na oge hour nke ikpe ya abịawo: kpọọkwanụ isiala nye ya, bụ́ Onye kere eluigwe na ala na oké osimiri na isi iyi nile nke mmiri nile.” (Mkpughe 14:6, 7) Mmụọ ozi ahụ na-efe “n’etiti eluigwe,” bụ́ ebe nnụnụ na-efegharị. (Tụlee Mkpughe 19:17.) N’ihi ya, a pụrụ ịnụ olu ya gburugburu ụwa. Lee nnọọ ka mkpọsa zuru ụwa ọnụ nke mmụọ ozi a na-eme si bụrụ ihe pụrụ ịgbasazu ebe nile karịa mkpọsa akụkọ ọ bụla e ji telivishọn na-eme!
17 A na-agba mmadụ nile ume ka ha tụọ egwu, ọ bụghị ịtụ anụ ọhịa ahụ na onyinyo ya egwu, kama ịtụ Jehova egwu, onye dị ike nke ukwuu karịa anụ ọhịa nke ihe atụ ọ bụla Setan ji na-eme ihe. Ee, ọ bụ Jehova kere eluigwe na ala, ugbu a, oge eruwokwa ka o kpee elu ụwa ikpe! (Tụlee Jenesis 1:1; Mkpughe 11:18.) Mgbe ọ nọ n’elu ala, Jisọs buru amụma banyere oge anyị, sị: “A ga-ekwusakwa ozi ọma nke a nke alaeze eluigwe n’elu ụwa dum mmadụ bi, ka ọ bụrụ àmà nye mba nile; mgbe ahụ ka ọgwụgwụ ihe nile ga-erukwa.” (Matiu 24:14) Ọgbakọ nke ndị Kraịst e tere mmanụ na-arụzu ọrụ nke a. (1 Ndị Kọrint 9:16; Ndị Efesọs 6:15) N’ebe a, Mkpughe na-eme ka a mara na ndị mmụọ ozi a na-adịghị ahụ anya sokwa n’ọrụ nkwusa nke a. Ọtụtụ mgbe, ọ pụtawo ìhè na e nwere nduzi ndị mmụọ ozi n’ịkpọje otu n’ime Ndịàmà Jehova n’ụlọ ebe otu onye nọ n’ihe isi ike nwere ọchịchọ, ọbụna na-ekpe ekpere, maka enyemaka ime mmụọ!
18. Dị ka mmụọ ozi ahụ na-efe n’etiti eluigwe si kwuo, gịnị ka oge hour ya bịaworo, oleekwa ndị ga-ama ọkwa ndị ọzọ?
18 Dị ka mmụọ ozi ahụ nke na-efe n’etiti eluigwe kpọsaworo, oge hour nke ikpe ikpe abịawo. Ikpe dị aṅaa ka Chineke ga-ekpe ugbu a? Ịma ọkwa ndị a gaje ịnụ ugbu a site n’ọnụ mmụọ ozi nke abụọ, nke atọ, nke anọ, na nke ise ga-eme ka ntị sụọ wuruwuru.—Jeremaịa 19:3.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Dị ka 1 Ndị Kọrint 4:8 na-egosi, ndị Kraịst e tere mmanụ adịghị achị dị ka ndị eze mgbe ha ka nọ n’elu ala ebe a. Ma, dị ka amaokwu ndị ahụ dị gburugburu Mkpughe 14:3, 6, 12, 13 na-egosi, ha na-ekere òkè n’ịbụ abụ ọhụrụ ahụ site n’ikwusa ozi ọma mgbe ha na-atachi obi ruo ọgwụgwụ nke ozi elu ala ha.
b Ihe na-akwado nke a bụ ojiji e jiri aha Hibru dị iche iche mee ihe n’ọhụụ ndị ọzọ; e nyere Jisọs aha Hibru ahụ bụ “Abadọn” (nke pụtara “Mbibi”), ọ na-emezukwa ihe e kpere n’ikpe n’ebe ahụ “nke a na-akpọ n’asụsụ Hibru Ha–Magedọn.”—Mkpughe 9:11; 16:16.
c Akwụkwọ nsọ kwuru “dị ka à ga-asị na ọ bụ abụ ọhụrụ,” n’ihi na e dekọworị abụ ahụ n’okwu amụma n’oge ochie. Ma ọ dịghị onye ọ bụla ruru eru ịbụ abụ ahụ. Ugbu a, mgbe e guzobere Alaeze ahụ wee kpọlitekwa ndị nsọ ahụ, ihe na-eme eme malitere imezu amụma ndị ahụ n’ike n’ike, oge eruwokwa maka ịbụpụta abụ ahụ n’ịma mma ya nile.
d A pụrụ iji ọnọdụ a tụnyere nke ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche, nke na-enye ndị nọ n’ezinụlọ nna ya ukwu ihe oriri n’oge kwesịrị ekwesị. (Matiu 24:45) Ohu ahụ, dị ka otu òtù, nwere ibu ọrụ nke inye nri, ma ndị ezinụlọ ahụ, ya bụ ndị mejupụtara òtù ahụ n’otu n’otu, bụ ndị a na-akwado site n’ikere òkè ná nri ime mmụọ ahụ. Ha bụ otu òtù ahụ, kama a kọwara ha n’ụzọ dị iche iche—dị ka otu ìgwè na dị ka ndị mmadụ n’otu n’otu.
[Foto ndị dị na peeji nke 202, 203]
144,000
24 ndị okenye
Ndị ha na Nwa Atụrụ ahụ, bụ́ Kraịst Jisọs, na-eketakọ ihe, dị ka e si ahụ ha site n’ụzọ abụọ dị iche iche