Jide n’Aka na I Butere Ihe Ndị Mbụ Ụzọ!
Ọ bụ abalị nzukọ, ma i nwere ọrụ ị ga-arụ. Gịnị ka ị ga-ebute ụzọ?
Ị BỤ di na nna. Ka ogologo ụbọchị na-agwụ ike nke ọrụ na-abịa ná njedebe, echiche gị agbaga ná nzukọ ọgbakọ nke e dokwara maka uhuruchi ahụ. Ọ bụrụ na ị hapụ ọrụ ozugbo, oge ga-ezuru gị nanị ịsa ahụ, gbanwee uwe gị, ma rie nri ngwa ngwa tupu ị na-aga nzukọ. Na mberede, onye were gị n’ọrụ abịakwute gị ma gwa gị ka ị rụkwuo ọrụ ma a gbasaa ọrụ. O kwere nkwa ịkwụ gị ezigbo ego. Ego ahụ dị gị mkpa.
Ma ọ bụ ị bụ nwunye na nne. Ka ị na-akwadebe nri anyasị, ị hụrụ ikpo ákwà a na-edebeghị ede, bụ́ nke a ga-eyi ụfọdụ n’ime ha echi. Gị ajụọ onwe gị, ‘Ọ bụrụ na m agaa nzukọ n’abalị a, olee mgbe m ga-enwe ohere ide ha?’ N’ịbụ onye werewooro ọrụ oge nile na nso nso a, ị na-achọpụta otú o si sie ike ilekọta ọrụ ndị dị n’ụlọ ka ị na-akpata ihe e ji ebi ndụ.
Ma ọ bụ ị bụ nwa akwụkwọ. N’ime ụlọ gị, ihe omume ndị a ga-eme n’ụlọ kpojuru na table gị. Ihe ka ọtụtụ n’ime ha bụ ndị e nyere gị mgbe gara aga, ma i yigharịwo mgbe ị ga-eme ha, ugbu a kwa ọtụtụ ihe omume achọọla ka e mechaa ha n’otu mgbe. A nwara gị ịnata ndị mụrụ gị ike iji ghara ịga nzukọ ka i wee metọpụ ihe omume ndị e nyere gị mee n’ụlọ.
Olee nke ị ga-ebute ụzọ: ọrụ ego ahụ a ga arụ ma a gbasaa ọrụ, ide ákwà, ihe omume ahụ a ga-eme n’ụlọ, ka ọ̀ bụ nzukọ ọgbakọ? N’ikwu ya n’ụzọ ime mmụọ, gịnị ka ọ pụtara bụ́ ibute ihe ndị mbụ ụzọ? Gịnị bụ echiche Jehova?
Gịnị Kwesịrị Ibute Ụzọ?
Nwa oge mgbe ụmụ Israel natasịrị Iwu Iri ahụ, a hụrụ otu nwoke ka ọ na-achịkọta nkụ n’Ụbọchị Izu Ike. Iwu ahụ machibidoro nke a kpam kpam. (Ọnụ Ọgụgụ 15:32-34; Deuterọnọmi 5:12-15) Olee otú ị gaara esiworị kpee ikpe ahụ? Ị̀ gaara agọpụrụ nwoke ahụ, na-arụ ụka na, e kwuwerị, ọ nọghị na-arụ ọrụ iji nọgide na-ebi ndụ okomoko kama ọ bụ iji nye ezinụlọ ya ihe ndị dị ha mkpa? Ị̀ gaara echeworị na a ga-enwe ọtụtụ oge ndị ọzọ n’ime afọ maka idebe Ụbọchi Izu Ike nakwa na edebeghị ya otu ugbo, ikekwe n’ihi ọdịda nwoke ahụ dara ibu ụzọ mee atụmatụ maka ọdịnihu, bụ ihe a pụrụ ịgbaghara n’ụzọ dị mfe?
Jehova lere okwu ahụ anya n’ụzọ ka sie ike. Bible na-ekwu, sị: “Jehova wee sị Mosis, A ghaghị ime ka nwoke ahụ nwụọ.” (Ọnụ Ọgụgụ 15:35) Gịnị mere Jehova ji nwee mmetụta dị ukwuu banyere ihe nwoke ahụ mere?
Ndị ahụ nwere ụbọchị isii nke ha ga-eji chịkọta nkụ nakwa ịhụ banyere mkpa ha n’ihe metụtara nri, uwe, na ebe obibi. Ụbọchị nke asaa ka a ga-esetịpụ iche maka mkpa ime mmụọ ha. Ọ bụ ezie na ọ dịghị njọ ịchịkọta nkụ, ọ dị njọ iji oge nke e kwesịrị iwepụtaworịị iche iji fee Jehova ofufe mee nke ahụ. Ọ bụ ezie na ndị Kraịst anọghị n’okpuru Iwu Mosis, ihe omume a ọ̀ dịghị akụziri anyị ihe n’isetịpụ ihe ndị anyị ga-ebute ụzọ n’ụzọ kwesịrị ekwesị taa?—Ndị Filipaị 1:10.
Mgbe ha nọsịrị 40 afọ n’ọzara, ụmụ Israel jikeere ịbanye n’Ala Nkwa ahụ. Ike agwụla ụfọdụ iri manna ahụ Chineke nyere ha n’ọzara, ihe ịrụ ụka adịghịkwa ya na ha na-ele anya maka ịgbanwe nri. Iji nyere ha aka inwe echiche kwesịrị ekwesị ka ha na-abanye n’ala ahụ nke “mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ na-eru na ya,” Jehova chetaara ha, sị: “Ọ bụghị nanị achịcha ka mmadụ ga-eji dị ndụ, kama ọ bụ ihe nile ọ bụla nke na-esi n’ọnụ Jehova pụta ka mmadụ ga-eji dị ndụ.”—Ọpụpụ 3:8; Deuterọnọmi 8:3.
Ụmụ Israel aghaghị ịrụsi ọrụ ike maka “mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ” ha. E nwere usuu ndị agha a ga-emeri, ụlọ ndị a ga-arụ, ubi ndị a ga-akụ ihe ọkụkụ. N’agbanyeghị nke ahụ, Jehova nyere ndị ahụ iwu iwepụta oge kwa ụbọchị iji tụgharịa uche n’ihe ime mmụọ. Ha ga-ewepụtakwa oge ịkụziri ụmụ ha ụzọ nile nke Chineke. Jehova sịrị: “Unu ga-ezi ụmụ unu [iwu m], n’ikwu okwu banyere ha mgbe ị na-anọdụ n’ụlọ gị, na mgbe ị na-eje ije n’ụzọ, na mgbe ị na-edina ala, na mgbe ị na-ebili ọtọ.”—Deuterọnọmi 11:19.
E nyere nwoke ọ bụla bụ́ onye Israel na onye ọ bụla na-eso ụzọ ndị Juu n’ala ahụ iwu ịbịa n’ihu Jehova ugboro atọ n’afọ. N’ịghọta na ezinụlọ nile ga-erite uru n’ụzọ ime mmụọ site n’ihe omume ndị dị otú ahụ, ọtụtụ ndị isi ezinụlọ mere ndokwa ka nwunye ha na ụmụ ha sonyere ha. Ma ònye ga-echebe ebe obibi ha na ubi ha pụọ ná mwakpo ndị iro mgbe ezinụlọ ahụ na-anọghị ya? Jehova kwere nkwa, sị: “Ọ dịghịkwa onye ọ bụla ga-enwe anyaukwu n’ebe ala gị dị, mgbe ị na-arịgo ka e wee hụ gị n’ihu Jehova, bụ́ Chineke gị, ugbo atọ n’afọ.” (Ọpụpụ 34:24) Ọ chọrọ okwukwe ka ụmụ Israel wee kwere na ọ bụrụ na ha ebute ọdịmma ime mmụọ ụzọ, ha agaghị ada ogbenye. Jehova ò mere ihe o kwuru? N’ezie o mere!
Buru Ụzọ Chọọ Alaeze Ahụ
Jisọs kụziiri ụmụazụ ya idebe ihe mgbaru ọsọ ime mmụọ n’ọnọdụ mbụ karịa ihe ọ bụla ọzọ. N’Ozizi Elu Ugwu ahụ, ọ dụrụ ndị na-ege ya ntị ọdụ, sị: “Unu echegbula onwe unu, sị, Gịnị ka anyị ga-eri? ma ọ bụ, Gịnị ka anyị ga-aṅụ? ma ọ bụ, Gịnị ka a ga-eji gbokwasị anyị? Burunụ ụzọ chọọ alaeze Ya, na ezi omume Ya; a ga-atụkwasịkwara unu ihe [onwunwe dị mkpa] ndị a nile.” (Matiu 6:31, 33) N’oge na-adịghị anya mgbe ọnwụ Jisọs gasịrị, ndị Kraịst e mere baptism ọhụrụ gbasoro ndụmọdụ ahụ. Ọtụtụ bụ ndị Juu ma ọ bụ ndị na-eso ụzọ ndị Juu ndị gaworo Jerusalem maka ememe Pentikọst na 33 O.A. Mgbe ha nọ ebe ahụ, ihe a na-atụghị anya ya mere. Ha nụrụ ma nakwere ozi ọma banyere Jisọs Kraịst. N’ịbụ ndị nwere oké mmasị n’ịmụtakwu banyere okwukwe ọhụrụ ha, ha nọgidere na Jerusalem. Ihe ndị ha ji bịa malitere ịgwụ, ma ntụsara ahụ nke ihe onwunwe na-enye nọ n’ọnọdụ nke abụọ nye ha. Ha achọtawo Mesaịa ahụ! Ụmụnna ha ndị Kraịst sooro ha kerịta ihe onwunwe ndị ha nwere ka ha nile wee nwee ike ‘ịnọgidesi ike n’ozizi ndị ozi na n’ekpere.’—Ọrụ 2:42.
Ka oge na-aga, ụfọdụ ndị Kraịst leghaara mkpa nke ife ofufe chiri anya ná nzukọ anya. (Ndị Hibru 10:23-25) Ikekwe ha ghọrọ ndị hụrụ ihe onwunwe n’anya, na-eleghara ihe ime mmụọ anya ka ha na-agbalị inweta ego zuru ezu maka onwe ha na ezinụlọ ha. Mgbe ọ gbasịrị ụmụnna ya ume ịghara ịhapụ nzukọ, Pọl onyeozi dere, sị: “Ka ọchịchọ obi unu ghara ịdị n’ịhụnanya ego; ka afọ ju unu n’ihe unu nwere ugbu a: n’ihi na Ya onwe ya ekwuwo, sị, M gaghị aha gị aka ma ọlị, M gaghị ahapụkwa gị ma ọlị.”—Ndị Hibru 13:5.
Ndụmọdụ Pọl ghọrọ ihe bịara n’ezi oge. Ihe dị ka afọ ise mgbe Pọl degasịịrị ndị Hibru akwụkwọ ozi ya, ndị agha Rom nke Cestius Gallus gbara Jerusalem gburugburu. Ndị Kraịst kwesịrị ntụkwasị obi chetara ịdọ aka ná ntị Jisọs: “Mgbe ọ bụla unu ga-ahụ [ihe a] . . . , onye nọkwa n’elu ụlọ, ya ghara ịrịdata, ma ọ bụ ịba n’ime, ịkwapụ ihe ọ bụla n’ụlọ ya: onye nọkwa n’ubi, ya ghara ịlaghachi ịchịrị uwe ya.” (Mak 13:14-16) Ha maara na nlanarị ha dabeere, ọ bụghị n’ọrụ ha ịbụ nke e ji n’aka ma ọ bụ n’uru nke ihe onwunwe ha, kama ná nrubeisi ha nye ntụziaka Jisọs. Ihe ịrụ ụka adịghị ya na ọ dịịrị ndị ahụ zaghachiworo na ndụmọdụ Pọl ma bute ọdịmma ime mmụọ ụzọ mfe ịhapụ ebe obibi, ọrụ, uwe, na ihe onwunwe ndị e ji kpọrọ ihe ma gbalaga n’ugwu karịa onye ọ bụla nke na-ahapụbeghị ịhụ ego n’anya.
Otú Ụfọdụ Si Ebute Ihe Ndị Mbụ Ụzọ Taa
Ndị Kraịst kwesịrị ntụkwasị obi taa na-eji mkpakọrịta chiri anya nke ha na ụmụnna ha kpọrọ ihe, ọtụtụ na-achụkwa ọtụtụ àjà iji bịa nzukọ. N’ógbè ụfọdụ, nanị ọrụ dịnụ bụ nke na-achọ onye rụtụ ibe ya arụọ. Otu nwanna nwoke na-adị njikere ịrụchitere ndị òtù ọrụ ya ọrụ ha n’abalị Saturday, nke ọtụtụ mmadụ n’ógbè ya na-ahọrọ iji atụrụ ndụ, ma ọ bụrụ na ha onwe ha ga-arụ ọrụ nke ya n’abalị nzukọ. Ụmụnna ndị ọzọ bụ́ ndị na-arụ ọrụ onye rụtụ ibe ya arụọ na-aga nzukọ nke ọgbakọ dị nso ma ọ bụrụ na ọrụ ha egbochie ha ịga nke ha. N’ụzọ dị otú a, ọ fọrọ nke nta ka ha ghara ịhapụ nzukọ ọ bụla. Otu onye ọhụrụ nwere mmasị na Canada ghọtara ngwa ngwa mkpa nke Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke na Nzukọ Ije Ozi, ma ndokwa ọrụ ya gbochiri ya ịga. N’ihi ya, ọ kwụrụ onye ọrụ ibe ya ụgwọ ka ọ rụchitere ya ọrụ ya ka o wee nwee ohere ịga nzukọ ndị a dị mkpa.
Ọtụtụ ndị na-arịa ọrịa na-adịghị ala ala adịghị ekwecha ka nzukọ kwaa ha. Ha na-anọ n’ụlọ na-ege ntị n’usoro ihe omume ahụ site na telifon ma ọ bụ nke e kwunyere na tepụ mgbe ha na-enweghị ike ịbịa n’Ụlọ Nzukọ Alaeze. Ha na-egosi ekele kwesịrị ịja mma maka ndokwa ime mmụọ nke Jehova na-eme site n’aka “ohu [ya] kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche”! (Matiu 24:45) Ndị Kraịst na-elekọta ndị mụrụ ha meworo agadi na-enwe ekele n’ezie mgbe otu nwanna nwoke ma ọ bụ nwanyị wepụtara onwe ya ịnọnyere nne ma ọ bụ nna ahụ meworo agadi ka onye ahụ na-elekọta ha wee nwee ike ịga nzukọ ọgbakọ.
Mee Atụmatụ n’Oge!
Ndị nne na nna maara mkpa ime mmụọ nke onwe ha na-enyere ụmụ ha aka inwe ekele maka nzukọ ndị Kraịst. Dị ka ọ na-adịkarị, ha na-atụ anya ka ụmụ ha mee ihe omume e nyere ha mee n’ụlọ otú ahụ e si nye ya kama ikwe ka ihe omume tụkọba. N’abalị nzukọ ụmụaka ahụ na-eme ihe omume e nyere ha mee n’ụlọ ozugbo ha si ụlọ akwụkwọ bata. A dịghị ekwe ka ntụrụndụ na ihe omume ndị ọzọ gbochie nzukọ ọgbakọ.
Dị ka di na nna, ị̀ na-edebe ịga nzukọ n’ọkwá mbụ? Dị ka nwunye na nne, ị̀ na-agbalị idokwa ibu ọrụ gị nke ọma ka i wee nwee ohere ịga nzukọ? Dị ka onye nọ n’afọ iri na ụma, ì weere nzukọ dị ka ihe ka mkpa karịa ihe omume e nyere gị mee n’ụlọ ka ì weere ihe omume e nyere gị mee n’ụlọ dị ka ihe ka mkpa karịa nzukọ?
Nzukọ ọgbakọ bụ ndokwa ịhụnanya nke Jehova. E kwesịrị ime mgbalị ọ bụla iji kere òkè ná ndokwa ahụ. Jehova ga-agọzi gị n’ụba ma ọ bụrụ na i bute ihe ndị mbụ ụzọ!