-
“Na-echetanụ Ndị Na-edu Ndú n’Etiti Unu”Ndị A Haziri Ime Uche Jehova
-
-
GỊNỊ MERE ANYỊ GA-EJI ‘NA-ECHETA NDỊ NA-EDU NDÚ’?
9 E nwere ọtụtụ ihe mere anyị ga-eji ‘na-echeta ndị na-edu ndú’ ma na-erubere ha isi. Ma, olee uru ọ ga-abara anyị? Pọl onyeozi kwuru, sị: “Ha na-eche mkpụrụ obi unu nche dị ka ndị ga-aza ajụjụ; ka ha wee jiri ọṅụ na-eme nke a, ọ bụghị ịsụ ude, n’ihi na nke a ga-emebiri unu ihe.” (Hib. 13:17) Anyị kwesịrị ịna-erubere ndị na-edu ndú ná nzukọ Jehova isi n’ihi na ha na-enyere anyị aka ka anyị na Chineke dịrị ná mma nakwa ka ihe gaziere anyị.
10 Pọl kwuru ná 1 Ndị Kọrịnt 16:14, sị: “Ka ihe niile unu na-eme bụrụ n’ịhụnanya.” Ndị na-edu ndú ná nzukọ Jehova hụrụ anyị n’anya. Ọ bụ ya mere ha ji eme mkpebi na-abara anyị uru. Baịbụl kwuru gbasara ịhụnanya ná 1 Ndị Kọrịnt 13:4-8, sị: “Ịhụnanya nwere ogologo ntachi obi na obiọma. Ịhụnanya adịghị ekwo ekworo, ọ dịghị etu ọnụ, ọ dịghị afụli onwe ya elu, ọ dịghị akpa àgwà na-ekwesịghị ekwesị, ọ dịghị achọ ọdịmma nke ya, ọ dịghị abụ nke a kpasuru iwe. Ọ dịghị agụkọ ihe ọjọọ. Ọ dịghị aṅụrị ọnụ n’ihi ajọ omume, kama ọ na-eso eziokwu aṅụrị ọṅụ. Ọ na-edi ihe niile, na-ekwere ihe niile, na-enwe olileanya ihe niile, na-atachi obi n’ihe niile. Ịhụnanya adịghị ada ada.” Ebe ọ bụ na ndị na-edu ndú ná nzukọ Jehova na-eme mkpebi ndị na-abara anyị uru n’ihi na ha hụrụ anyị n’anya, anyị kwesịrị iji obi anyị niile na-eme ihe ha gwara anyị. Anyị kwesịkwara ịghọta na ọ bụ Jehova na-eji ha agwa anyị ihe ndị ahụ n’ihi na ọ hụrụ anyị n’anya.
Anyị kwesịrị ịna-erubere ndị na-edu ndú ná nzukọ Jehova isi ka anyị na Chineke nwee ike ịdị ná mma
11 Jehova ji ụmụ mmadụ na-ezughị okè na-eduzi nzukọ ya taa otú o mere n’oge ndịozi. Tupu oge ndịozi, Jehova jikwa ndị na-ezughị okè mezuo nzube ya. Noa rụrụ ụgbọ, kọọkwara ndị mmadụ banyere mbibi Chineke chọrọ ibibi ndị ajọ omume n’oge ahụ. (Jen. 6:13, 14, 22; 2 Pita 2:5) Jehova họpụtara Mozis ka o duru ụmụ Izrel pụta n’ala Ijipt. (Ọpụ. 3:10) O ji mmụọ nsọ ya duzie ụmụ mmadụ na-ezughị okè, ha edee Baịbụl. (2 Tim. 3:16; 2 Pita 1:21) N’agbanyeghị na ọ bụ ụmụ mmadụ na-ezughị okè ka Jehova ji na-eduzi ozi ọma anyị na-ekwusa, anyị ekwesịghị inyo ihe ọ bụla nzukọ Jehova gwara anyị enyo. Kama, obi kwesịrị isi anyị ike n’ihi na anyị ma na ihe niile nzukọ a merela agaraghị enwe isi ma a sị na Jehova anaghị akwado ya. Kemgbe ọtụtụ afọ, ihe ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi merela egosila na ọ bụ mmụọ nsọ Chineke na-edu ha n’agbanyeghị nsogbu ndị tara akpụ bịaara ha. Jehova agọziela nzukọ ya nke ukwuu. N’ihi ya, anyị kwesịrị iji obi anyị niile na-akwado nzukọ Jehova ma na-eme ihe a na-agwa anyị.
-
-
“Na-echetanụ Ndị Na-edu Ndú n’Etiti Unu”Ndị A Haziri Ime Uche Jehova
-
-
14 Otú ọzọ anyị si egosi na anyị na-akwado nzukọ Jehova bụ ịna-eme ihe a na-agwa anyị. Otú anyị nwere ike isi mee ya bụ ime ihe ndị okenye na ndị nlekọta sekit na-agwa anyị. Ụmụnna ndị a so ná “ndị na-edu ndú” Baịbụl kwuru ka anyị na-erubere isi. (Hib. 13:7, 17) Ọ bụrụgodị na anyị aghọtachaghị ihe mere ha ji sị anyị mee ihe ụfọdụ, anyị ma na ihe ndị ahụ ga-abara anyị uru ma anyị mee ha. Jehova na-agọzikwa anyị n’ihi na anyị na-eme ihe nzukọ ya na Okwu ya na-akụziri anyị. Ihe ndị a anyị na-eme na-egosikwa na anyị na-erubere Nna anyị ukwu bụ́ Jizọs Kraịst isi.
-