Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • Ị̀ Banyela N’izu Ike Chineke?
    Ụlọ Nche—2011 | Julaị 15
    • “Okwu Chineke Dị Ndụ”

      20. Olee ihe abụọ ihe e dere ná Ndị Hibru 4:12 nwere ike ịpụta? (Kwuo ihe e dere n’ala ala peeji.)

      20 Mgbe Pọl dere na “okwu Chineke dị ndụ,” ọ bụchaghị Baịbụl ka o bu n’obi.c Ihe ndị ọzọ o kwuru mgbe ahụ gosiri na ihe o bu n’obi bụ nkwa Chineke kwere. Ihe Pọl na-ekwu bụ na Chineke anaghị ekwe nkwa ghara imezu ya. Jehova si n’ọnụ Aịzaya onye amụma gosi na nke a bụ eziokwu. Ọ sịrị: ‘Okwu m agaghị agba aka lọghachikwute m, kama ọ ga-emezukwa ihe m zigara ya ka o mee.’ (Aịza. 55:11) Ya mere, o kwesịghị ịdị anyị ọsọ ọsọ mgbe ihe na-emeghị ngwa ngwa otú anyị tụrụ anya ya. Ka obi sie anyị ike na Jehova “na-arụ ọrụ” iji mezuo ihe ndị o zubere.—Jọn 5:17.

      21. Olee otú ihe e dere ná Ndị Hibru 4:12 si na-agba ndị jeerela Jehova ozi ọtụtụ iri afọ, bụ́ ndị so ‘n’oké ìgwè mmadụ’ ahụ, ume?

      21 Ọtụtụ ndị so ‘n’oké ìgwè mmadụ’ ejeerela Jehova ozi ọtụtụ iri afọ. (Mkpu. 7:9) Ọtụtụ n’ime ha atụghị anya na ha ga-anọ n’ụwa ochie a mee agadi. Ma, ha adabeghị mbà. (Ọma 92:14) Ha ma na “okwu Chineke dị ndụ,” marakwa na Jehova ga-emezu nkwa ya. Ebe nzube Chineke dị ya ezigbo mkpa, anyị ga-eme ka obi ya ṅụrịa ma ọ bụrụ na anyị ejiri ihe o zubere kpọrọ ihe. Jehova anọwo na-ezu ike kemgbe ụbọchị nke asaa. Ọ makwa na nzube ya ga-emezurịrị nakwa na ndị ohu ya ga na-eme ihe kwekọrọ ná nzube ya. Ị̀ ga na-eme ihe kwekọrọ ná nzube ya? Ị̀ banyela n’izu ike Chineke?

  • Ị̀ Banyela N’izu Ike Chineke?
    Ụlọ Nche—2011 | Julaị 15
    • c Taa, Chineke na-esi n’Okwu ya e dere ede, bụ́ nke nwere ike ịgbanwe ndụ anyị, agwa anyị okwu. N’ihi ya, e nwere ike ikwu na ihe Pọl dere ná Ndị Hibru 4:12 gbasakwara Baịbụl.

Akwukwo Igbo (1984-2025)
Pụọ
Banye
  • Igbo
  • Ziga ya
  • Ịgbanwe Ihe
  • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
  • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
  • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
  • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
  • JW.ORG
  • Banye
Ziga ya