Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w03 11/15 p. 8-12
  • ‘Na-ejizi Okwu Chineke Ejizi’

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • ‘Na-ejizi Okwu Chineke Ejizi’
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2003
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Pọl—Onye Nkwusa Alaeze Na-anụ Ọkụ n’Obi
  • Ozi Anyị Aghaghị Ịgbanye Mkpọrọgwụ n’Okwu Chineke
  • Okwu Chineke Nwere Ikike Ịgbanwe Mmadụ
  • Nọgide Na-ejizi Okwu Chineke Ejizi
  • Ị̀ Na-ekwuzi Okwu Chineke?
    Ozi Alaeze Anyi—1996
  • Jiri “Mma Agha Nke Mmụọ Nsọ” Na-arụ Ọrụ Nke Ọma
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2010
  • Ngwá Ọrụ Ndị Anyị Ji Akụziri Ndị Mmadụ Baịbụl
    Ozi Alaeze Anyi—2015
  • Na-akụzi Eziokwu
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2018
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2003
w03 11/15 p. 8-12

‘Na-ejizi Okwu Chineke Ejizi’

“Mee ike gị nile iche onwe gị n’ihu Chineke dị ka onye a nwapụtara anwapụta, onye ọrụ nke na-enweghị ihe ọ ga-emere ihere, na-ejizi okwu nke eziokwu ahụ ejizi.”—2 TIMOTI 2:15.

1, 2. (a) N’ihi gịnị ka ngwá ọrụ ji dị ndị ọrụ mkpa? (b) Ọrụ dị aṅaa ka Ndị Kraịst na-arụ, oleekwa otú ha si egosi na ha bu ụzọ na-achọ Alaeze ahụ?

NGWÁ ọrụ dị ndị ọrụ mkpa iji nyere ha aka ịrụ ọrụ ha. Otú ọ dị, o zughị ezu inwe nnọọ ụdị ngwá ọrụ ọ bụla. Ọ dị onye ọrụ mkpa inwe ngwá ọrụ kwesịrị ekwesị, ọ ghaghịkwa iji ya eme ihe nke ọma. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na ka ị na-arụ ụlọ ahịa, ị chọọ ịkụkọta osisi abụọ ọnụ, ị ga-achọ ihe karịrị otùtù na ntú. Ị ghaghị ịma otú e si akụba ntú n’ime osisi n’akụrọghị ntú ahụ. Ịnwa ịkụba ntú n’ime osisi n’amaghị otú e si eji otùtù eme ihe ga-esiri gị nnọọ ike, ọbụna gwụ gị ike. Ma ngwá ọrụ ndị e ji mee ihe nke ọma na-enyere anyị aka ịrụzu ọrụ anyị ma rụpụta ihe na-eju afọ.

2 Dị ka Ndị Kraịst, anyị nwere ọrụ anyị ga-arụ. Ọ bụ ọrụ dị nnọọ oké mkpa. Jizọs Kraịst gbara ụmụazụ ya ume ‘iburu ụzọ na-achọ alaeze ahụ.’ (Matiu 6:33) Olee otú anyị pụrụ isi na-eme nke a? Otu ụzọ bụ site n’ịdị na-anụ ọkụ n’obi n’ọrụ nkwusa Alaeze na nke ime ndị na-eso ụzọ. Ime ka ozi anyị gbanyesie mkpọrọgwụ ike n’Okwu Chineke bụ ụzọ ọzọ. Àgwà ọma bụ nke atọ. (Matiu 24:14; 28:19, 20; Ọrụ 8:25; 1 Pita 2:12) Iji dịrị irè ma na-enwe obi ụtọ n’ọrụ a e nyere Ndị Kraịst, ọ dị anyị mkpa inwe ngwá ọrụ ndị kwesịrị ekwesị na ịma otú e si eji ha eme ihe nke ọma. Pọl onyeozi setịpụrụ ihe nlereanya dị ịrịba ama n’akụkụ a dị ka Onye Kraịst na-adọgbu onwe ya n’ọrụ, ọ gbakwara ndị kwere ekwe ibe ya ume iṅomi ya. (1 Ndị Kọrint 11:1; 15:10) Ya mere, gịnị ka anyị pụrụ ịmụta n’aka Pọl, bụ́ onye ọrụ ibe anyị?

Pọl—Onye Nkwusa Alaeze Na-anụ Ọkụ n’Obi

3. N’ihi gịnị ka a pụrụ iji kwuo na Pọl onyeozi bụ onye ọrụ Alaeze nke na-anụ ọkụ n’obi?

3 Ụdị onye ọrụ dị aṅaa ka Pọl bụ? N’ezie, ọ bụ onye na-anụ ọkụ n’obi. Pọl dọgburu onwe ya n’ọrụ, na-agbasa ozi ọma ahụ ruo ọtụtụ ebe gburugburu ógbè Mediterenian. N’ikwu ihe mere o ji jiri ịnụ ọkụ n’obi na-akpọsa Alaeze ahụ, onyeozi a ike na-adịghị agwụ sịrị: “Ọ bụrụkwa na m na-akpọsa ozi ọma, ọ bụghị ihe mere m ga-eji na-anya isi, n’ihi na e mewo ka m nwee mkpa. N’ezie, ahụhụ dịịrị m ma ọ bụrụ na akpọsaghị m ozi ọma!” (1 Ndị Kọrint 9:16) Pọl ò nwere mmasị n’ịzọpụta nanị ndụ nke ya? Ee e. Ọ dịghị achọ ọdịmma onwe ya nanị. Kama nke ahụ, ọ chọrọ ka ndị ọzọ ritekwa uru n’ozi ọma ahụ. O dere, sị: “M na-eme ihe nile n’ihi ozi ọma, ka m wee bụrụ onye ya na ndị ọzọ na-ekerịta ya.”—1 Ndị Kọrint 9:23.

4. Olee ngwá ọrụ ndị ọrụ bụ́ Ndị Kraịst ji akpọrọ ihe karịsịa?

4 Pọl onyeozi bụ onye ọrụ maara ebe ike ya ruru bụ́ onye ghọtara na ya apụghị ịdabere nanị na nkà nke onwe ya. Dị nnọọ ka otùtù dị ọkwa nkà mkpa, ngwá ọrụ kwesịrị ekwesị dị Pọl mkpa iji kụnye eziokwu Chineke n’obi ndị na-ege ya ntị. Olee ngwá ọrụ o ji mee ihe n’ụzọ bụ́ isi? Ọ bụ Okwu Chineke, bụ́ Akwụkwọ Nsọ. N’otu aka ahụ, Bible bụ ngwá ọrụ bụ́ isi anyị ji eme ihe iji nyere anyị aka ime ndị na-eso ụzọ.

5. Iji bụrụ ndị ozi dị irè, gịnị dị mkpa ka anyị na-eme tụkwasị n’ihota Akwụkwọ Nsọ?

5 Pọl maara na iji Okwu Chineke eme ihe n’ụzọ kwesịrị ekwesị gụnyere ihe karịrị ihota ihe site na ya. O ‘kwuru okwu n’ụzọ ga-eme ka e kweta.’ (Ọrụ 28:23) Ò si aṅaa mee ya? Pọl ji Okwu Chineke e dere ede mee ihe nke ọma iji mee ka ọtụtụ ndị nabata eziokwu Alaeze ahụ. O so ha tụgharịa uche. Ruo ọnwa atọ n’ụlọ nzukọ dị n’Efesọs, Pọl nọ ‘na-arụ ụka nke na-eme ka e kweta na-ekwu okwu dị iche iche banyere alaeze Chineke.’ Ọ bụ ezie na “ụfọdụ ndị malitere ime ka obi ha kpọọ nkụ ma ghara ikwere,” ndị ọzọ gere ntị. N’ihi ozi Pọl jere n’Efesọs, “okwu Jehova nọgidere na-eto eto ma na-enwe mmeri n’ụzọ dị ike.”—Ọrụ 19:8, 9, 20.

6, 7. Olee otú Pọl si mee ka ozi ya nwee ùgwù, oleekwa otú anyị pụrụ isi mee otú ahụ?

6 Dị ka onye nkwusa Alaeze na-anụ ọkụ n’obi, Pọl ‘mere ka ije ozi ya nwee ùgwù.’ (Ndị Rom 11:13) N’ụzọ dị aṅaa? O nweghị mmasị n’ibuli onwe ya elu; ihere emeghịkwa ya ịbụ onye a maara n’ihu ọha dị ka otu n’ime ndị ha na Chineke na-arụkọ ọrụ. Kama nke ahụ, o lere ozi ya anya dị ka ihe ùgwù kasịnụ. Pọl ji nkà jiri Okwu Chineke mee ihe n’ụzọ dị irè. Ozi ya nke rụpụtara ihe kpaliri ndị ọzọ, na-enye aka ịkwali ha ije ozi ha n’ụzọ zuru ezu karị. N’ụzọ dị otú a kwa, e mere ka ozi ya nwee ùgwù.

7 Dị ka Pọl, anyị pụrụ ime ka ozi anyị nwee ùgwù site n’iji Okwu Chineke eme ihe ugboro ugboro na n’ụzọ dị irè. N’akụkụ nile nke ozi ubi anyị, ihe mgbaru ọsọ anyị kwesịrị ịbụ iso ọtụtụ ndị dị ka o kwere mee kwurịta ihe sitere n’Akwụkwọ Nsọ. Olee otú anyị pụrụ isi mee nke a n’ụzọ ga-eme ka e kweta? Tụlee ụzọ atọ dị mkpa: (1) Dọrọ uche gaa n’Okwu Chineke n’ụzọ ga-eme ka a kwanyere ya ùgwù. (2) Jiri akọ kọwaa ihe Bible na-ekwu ma gosi otú o si metụta ihe unu na-ekwu. (3) Soro ha tụgharịa uche n’Akwụkwọ Nsọ n’ụzọ ga-eme ka e kweta.

8. Ngwá ọrụ ndị dị aṅaa e ji eme nkwusa Alaeze ka anyị nwere taa, oleekwa otú i siworo jiri ha mee ihe?

8 Ndị nkwusa Alaeze nke oge a nwere ngwá ọrụ ndị Pọl onyeozi na-enweghị n’oge ozi ya. Ha gụnyere akwụkwọ ukwu, magazin, broshuọ, mpempe akwụkwọ, traktị, kaseeti a na-ege ege na nke vidio. Na narị afọ gara aga, e jikwa kaadị ịgba àmà, ígwè phonograph, ụgbọala ndị a rụnyere ihe e ji agbasa ozi, na mgbasa ozi redio mee ihe. N’ezie, ngwá ọrụ anyị kasị mma bụ Bible, ọ dịkwa mkpa ka anyị jiri ngwá ọrụ a dị oké mkpa na-eme ihe nke ọma na n’ụzọ kwesịrị ekwesị.

Ozi Anyị Aghaghị Ịgbanye Mkpọrọgwụ n’Okwu Chineke

9, 10. A bịa n’iji Okwu Chineke eme ihe, gịnị ka anyị pụrụ ịmụta na ndụmọdụ Pọl nyere Timoti?

9 Olee otú anyị pụrụ isi jiri Okwu Chineke na-eme ihe dị ka ngwá ọrụ dị irè? Ọ bụ site n’ịṅa ntị n’okwu a Pọl gwara onye ọrụ ibe ya bụ́ Timoti, sị: “Mee ike gị nile iche onwe gị n’ihu Chineke dị ka onye a nwapụtara anwapụta, onye ọrụ nke na-enweghị ihe ọ ga-emere ihere, na-ejizi okwu nke eziokwu ahụ ejizi.” (2 Timoti 2:15) Gịnị ka ‘ijizi okwu nke eziokwu ahụ ejizi’ na-agụnye?

10 Okwu Grik a sụgharịrị ịbụ “ijizi ejizi” pụtara n’ụzọ nkịtị “igbubi n’ụzọ kwụ ọtọ” ma ọ bụ “ịchabi n’ụzọ kwụ ọtọ.” Ọ bụ nanị na ndụmọdụ Pọl nyere Timoti ka e ji okwu ahụ mee ihe n’Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst. A pụrụ iji otu okwu ahụ mee ihe iji kọwaa ịkọ ọgba ala na-agbagọghị agbagọ. Ọgba ala gbagọrọ agbagọ ga-abụrụ onye ọrụ ugbo bụ́ aka ochie ihe ihere. Iji bụrụ “onye ọrụ nke na-enweghị ihe ọ ga-emere ihere,” e chetaara Timoti na o kwesịghị izi ihe dị iche n’ezi ozizi nke Okwu Chineke. Timoti agaghị ekwe ka echiche onwe ya metụta ozizi ya. Ọ ga-eme ka nkwusa ya na izi ihe ya dabere kpam kpam n’Akwụkwọ Nsọ. (2 Timoti 4:2-4) N’ụzọ dị otú a, a ga-eduzi ndị nwere obi eziokwu ile ihe anya dị ka Jehova si ele ya, ọ bụghị ịnakwere nkà ihe ọmụma ụwa. (Ndị Kọlọsi 2:4, 8) Otu ahụ ka ọ dịkwa taa.

Àgwà Anyị Aghaghị Ịdị Mma

11, 12. Mmetụta dị aṅaa ka omume anyị na-enwe n’anyị ijizi Okwu Chineke ejizi?

11 Anyị aghaghị ime ihe karịrị ijizi Okwu Chineke ejizi site n’ịkpọsa eziokwu ndị dị na ya. Àgwà anyị aghaghị ikwekọ na ya. “Anyị bụ ndị ha na Chineke na-arụkọ ọrụ,” n’ihi ya, anyị agaghị abụ ndị ọrụ nwere ihu abụọ. (1 Ndị Kọrint 3:9) Okwu Chineke na-ekwu, sị: “Otú ọ dị, gị onye na-akụziri onye ọzọ ihe, ị́ dịghị akụziri onwe gị? Gị, onye na-ekwusa ‘Ezula ohi,’ ị̀ na-ezu ohi? Gị, onye na-asị ‘Akwala iko,’ ị̀ na-akwa iko? Gị, onye na-ekwupụta na ị na-asọ arụsị oyi, ị̀ na-ezu ihe dị n’ụlọ arụsị?” (Ndị Rom 2:21, 22) N’ihi ya, dị ka ndị ha na Chineke na-arụkọ ọrụ n’oge a, otu ụzọ anyị si ejizi Okwu Chineke ejizi bụ site n’ịṅa ntị na ndụmọdụ a: “Tụkwasị Jehova obi gị nile, adaberekwala nghọta gị: n’ụzọ gị nile mara Ya, Ya onwe ya ga-emekwa ka okporo ụzọ gị nile zie ezie.”—Ilu 3:5, 6.

12 Gịnị ka anyị pụrụ ịtụ anya ga-esi n’ijizi Okwu Chineke ejizi apụta? Tụlee ike Okwu Chineke e dere ede pụrụ ịkpa ná ndụ ndị nwere obi eziokwu.

Okwu Chineke Nwere Ikike Ịgbanwe Mmadụ

13. Gịnị ka itinye Okwu Chineke n’ọrụ pụrụ ịrụpụta n’ime mmadụ?

13 Ọ bụrụ na anyị ewere ya mere ihe ndabere, Okwu Chineke na-akpa ike dị mma nke na-enyere ndị mmadụ aka ime mgbanwe ndị dị ịrịba ama ná ndụ ha. Pọl ahụwo ebe okwu Chineke na-akpa ike, hụkwa mmetụta dị mma o nwere n’ahụ́ ndị ghọrọ Ndị Kraịst na Tesalonaịka oge ochie. N’ihi ya, ọ gwara ha, sị: “Anyị . . . na-ekele Chineke n’akwụsịghị akwụsị, n’ihi na mgbe unu natara okwu Chineke, bụ́ nke unu nụrụ n’ọnụ anyị, unu nakweere ya, ọ bụghị dị ka okwu ụmụ mmadụ, kama, dị nnọọ ka ọ bụ n’eziokwu, dị ka okwu Chineke, bụ́ nke na-arụkwa ọrụ n’ime unu ndị kwere ekwe.” (1 Ndị Tesalonaịka 2:13) Nye Ndị Kraịst ahụ—n’ezie, nye ezi ụmụazụ nile nke Kraịst—a pụghị iji nkà ihe ọmụma dị ala nke mmadụ tụnyere amamihe kasị elu nke Chineke. (Aịsaịa 55:9) Ndị Tesalonaịka “ji ọṅụ nke mmụọ nsọ nakwere okwu ahụ n’ime mkpagbu dị ukwuu” ma ghọọrọ ndị kwere ekwe ndị ọzọ ihe nlereanya.—1 Ndị Tesalonaịka 1:5-7.

14, 15. Ike ha aṅaa ka ozi dị n’Okwu Chineke na-akpa, ọ bụkwa n’ihi gịnị?

14 Okwu Chineke dị ike, dị ka Onye o si n’aka ya, bụ́ Jehova. O si n’aka “Chineke dị ndụ,” onye e sitere n’okwu ọnụ ya “mee eluigwe,” okwu ahụ ‘na-agakwa nke ọma mgbe nile n’ihe e zigara ya.’ (Ndị Hibru 3:12; Abụ Ọma 33:6; Aịsaịa 55:11) Otu ọkà mmụta Bible kwuru, sị: “Chineke adịghị ekewapụ onwe ya n’ebe Okwu ya dị. Ọ dịghị ajụ ya dị ka a ga-asị na ọ dịghị ihe jikọrọ ya na ya. . . . N’ihi ya, ọ bụghị ihe nwụrụ anwụ, ọ dịghị egosi omume enweghị mmasị n’ihe e ji ya eme; n’ihi na ọ bụ ihe jikọtara ya na Chineke dị ndụ n’ụzọ chiri anya.”

15 Ike ha aṅaa ka ozi dị n’Okwu Chineke na-akpa? Ọ na-akpa ike dị ukwuu. N’ụzọ dabara adaba, Pọl dere, sị: “Okwu Chineke dị ndụ ma na-akpa ike, dịkwa nkọ karịa mma agha ihu abụọ ọ bụla, na-amapukwa amapu ọbụna ruo n’ikewa mkpụrụ obi na mmụọ, nakwa nkwonkwo na ụmị ha, o nwekwara ike ịchọpụta echiche na ebumnuche nke obi.”—Ndị Hibru 4:12.

16. Ruo ókè ha aṅaa ka Okwu Chineke pụrụ ịgbanweru mmadụ nke ọma?

16 Ozi dị n’Okwu Chineke e dere ede ‘dị nkọ karịa mma agha ihu abụọ ọ bụla.’ N’ihi ya, o nwere ike dị ukwuu iji bamie n’ime mmadụ nke na ọ karịrị ngwá ọrụ ọ bụla aka mere. Okwu Chineke na-adụbanye n’akụkụ ndị kasị dịrị n’ime mmadụ nweekwa ike ịgbanwe onye ahụ n’ime, na-emetụta otú o si eche echiche na ihe ndị ọ hụrụ n’anya, na-eme ka ọ bụrụ onye ọrụ Chineke na-anakwere. Lee ngwá ọrụ dị ike ọ bụ!

17. Kọwaa ike Okwu Chineke nwere ịgbanwe mmadụ.

17 Okwu Chineke na-ekpughe ihe mmadụ bụ n’ezie n’ime bụ́ nke dị iche n’ihe onye ahụ chere na ya bụ ma ọ bụ ihe ọ na-eme ka ndị ọzọ hụ. (1 Samuel 16:7) Ọbụna ajọ mmadụ pụrụ mgbe ụfọdụ iji obiọma ma ọ bụ ime nsọ nsọ kpuchie ihe ọ bụ n’ime. Ndị ajọ mmadụ na-eme ka hà bụ ihe ha na-abụghị iji mezuo nzube ọjọọ. Ndị mpako na-eme ka hà dị umeala n’obi iji nweta otuto nke mmadụ. Otú ọ dị, site n’ime ka a mara n’ezie ihe dị n’obi, Okwu Chineke pụrụ ịkpali nnọọ onye dị umeala n’obi iyipụ mmadụ ochie ma ‘yikwasị ụdị mmadụ ọhụrụ ahụ bụ́ nke e kere dị ka uche Chineke si dị n’ezi omume na iguzosi ike n’ihe.’ (Ndị Efesọs 4:22-24) Ozizi nke Okwu Chineke pụkwara ịgbanwe ndị ihere ịghọ Ndịàmà Jehova obi kara na ndị nkwusa Alaeze na-anụ ọkụ n’obi.—Jeremaịa 1:6-9.

18, 19. Na-adabere na paragraf ndị a ma ọ bụ n’ahụmahụ i nwetara n’ozi ubi, gosi otú eziokwu Akwụkwọ Nsọ pụrụ isi gbanwee àgwà mmadụ.

18 Ike Okwu Chineke nwere ịgbanwe mmadụ na-enwe mmetụta dị mma n’ahụ́ ndị mmadụ n’ebe nile. Dị ka ihe atụ, ndị nkwusa Alaeze sitere na Phnom Penh, Cambodia, na-eme nkwusa n’ógbè Kompong Cham ugboro abụọ n’ọnwa. Mgbe otu pastọ nụsịrị ka ndị pastọ ndị ọzọ kwuru okwu megide Ndịàmà Jehova, o mere ndokwa iso Ndịàmà nọkọọ mgbe ọzọ ha bịara n’ógbè ahụ. Ọ jụrụ ha ọtụtụ ajụjụ banyere ime ememe dị iche iche ma gee ntị nke ọma ka ha so ya tụgharịa uche site n’Akwụkwọ Nsọ. O kwuziri, sị: “Ugbu a ka m matara na ihe ndị pastọ ibe m kwuru banyere unu abụghị eziokwu! Ha kwuru na unu adịghị eji Bible eme ihe, ma n’ụtụtụ a, ọ bụ nanị ya ka unu ji mee ihe!”

19 Nwanyị a nọgidere soro Ndịàmà na-enwe nkwurịta okwu ndị dabeere na Bible, o kweghịkwa ka iyi egwu nke iwepụ ya n’ọkwa pastọ kwụsị ya. Ọ gwara otu enyi ya banyere nkwurịta okwu ndị ahụ dabeere n’Akwụkwọ Nsọ, bụ́ onye malitekwara iso Ndịàmà na-amụ Bible. Enyi ya ahụ bịara nwee mmasị dị ukwuu n’ihe ọ na-amụta nke na n’otu okwuchukwu ya, a kpaliri ya ikwu sị, “Bịanụ soro Ndịàmà Jehova na-amụ Bible!” N’oge na-adịghị anya ka nke ahụ gasịrị, o si na chọọchị ahụ pụọ. Onye ahụ bụbu pastọ, enyi ya, na ndị ọzọ malitere iso Ndịàmà Jehova na-amụ Bible.

20. Olee otú ahụmahụ nke otu nwanyị na Ghana si gosi ike Okwu Chineke na-akpa?

20 Ihe banyere Paulina, otu nwanyị bi na Ghana, gosikwara ike Okwu Chineke na-akpa. Onye nkwusa oge nile nke Alaeze ahụ ji akwụkwọ bụ́ Ihe Ọmụma nke Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi a mụọrọ ya Bible. Di Paulina lụrụ karịa otu nwanyị, Paulina chọpụtakwara mkpa ọ dị ime mgbanwe, ma di ya na ndị ikwu ya nile megidere ya n’ụzọ kpụ ọkụ n’ọnụ. Nna nna ya, onye bụ́ ọkàikpe nke ụlọikpe dị elu na okenye chọọchị, gbalịrị ime ka ọ gbanwee obi site n’ịkọwahie Matiu 19:4-6. Okwu ọkàikpe ahụ dara ka ihe ezi uche dị na ya, ma Paulina ghọtara ngwa ngwa na nke a yiri mgbagọ Setan gbagọrọ Akwụkwọ Nsọ mgbe ọ nwara Jizọs Kraịst. (Matiu 4:5-7) O chetara okwu doro anya Jizọs kwuru banyere alụmdi na nwunye, na-ekwu n’ụzọ bụ́ isi na Chineke kere mmadụ nwoke na nwanyị, ọ bụghị nwoke na ụmụ nwanyị, nakwa na ha abụọ, ọ bụghị ha atọ, gaje ịghọ otu anụ ahụ́. Ọ nọgidesiri ike ná mkpebi ya, e mesịakwa nabata ịgba alụkwaghịm ya n’ụzọ omenala pụọ n’alụmdi na nwunye ahụ a lụrụ karịa otu nwanyị. N’oge na-adịghị anya, ọ ghọrọ onye nkwusa Alaeze nwere obi ụtọ e mere baptizim.

Nọgide Na-ejizi Okwu Chineke Ejizi

21, 22. (a) Mkpebi dị aṅaa siri ike ka anyị kwesịrị ime dị ka ndị nkwusa Alaeze? (b) Gịnị ka anyị ga-atụle n’isiokwu na-esonụ?

21 N’ezie, Okwu Chineke e dere ede bụ ngwá ọrụ dị ike anyị ga-eji na-eme ihe n’inyere ndị ọzọ aka ime mgbanwe ná ndụ ha iji bịaruo Jehova nso. (Jems 4:8) Dị nnọọ ka ndị ọrụ bụ́ ọkà si eji ngwá ọrụ arụpụta ezi ihe, ka anyị kpebisie ike itinye mgbalị siri ike iji jiri Okwu Chineke, bụ́ Bible, na-eme ihe n’ụzọ bụ́ ịgba n’ọrụ Chineke nyere anyị dị ka ndị nkwusa Alaeze.

22 Olee otú anyị pụrụ isi jiri Akwụkwọ Nsọ na-eme ihe n’ụzọ dị irè karị n’ọrụ anyị nke ime ndị na-eso ụzọ? Otu ụzọ bụ site n’ịzụlite nkà anyị dị ka ndị na-ezi ihe n’ụzọ ga-eme ka e kweta. Biko tụlee isiokwu na-esonụ, n’ihi na ọ na-atụ aro ụzọ a pụrụ isi zie ndị ọzọ ihe ma nyere ha aka ịnakwere ozi Alaeze ahụ.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

a Nke Ndịàmà Jehova bipụtara.

Ị̀ Na-echeta?

• Ngwá ọrụ ndị dị aṅaa ka ndị nkwusa Alaeze nwere?

• N’ụzọ ndị dị aṅaa ka Pọl si bụrụ ihe nlereanya dị ka onye ọrụ Alaeze?

• Gịnị ka iji Okwu Chineke eme ihe nke ọma gụnyere?

• Ike ha aṅaa ka Okwu Jehova e dere ede na-akpa?

[Foto ndị dị na peeji nke 10]

Ngwá ọrụ ụfọdụ Ndị Kraịst ji eme ihe n’ọrụ nkwusa Alaeze

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya