Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w93 12/15 p. 22-25
  • Rehab—A Gụrụ Ya n’Onye Ezi Omume Site n’Ọrụ Okwukwe

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Rehab—A Gụrụ Ya n’Onye Ezi Omume Site n’Ọrụ Okwukwe
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1993
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ndị Israel Na-abịa!
  • Rehab Ewere Nguzo Ya
  • Mgbidi Ájá Ndị Ahụ Adaa!
  • Ilenye Anya n’Àgwà Dị Iche Iche nke Rehab
  • Ụgwọ Ọrụ Rehab
  • E ‘Sitere n’Ọrụ Ya Kpọọ Ya Onye Ezi Omume’
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2013
  • Rehab Ṅara Ntị n’Akụkọ A Kọọrọ Ya
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2009
  • Rehab Kweere na Jehova
    Kụziere Ụmụ Gị Ihe
  • Rehab Zoro Ndị Nnyopụta
    Ihe Ị Ga-amụta n’Akụkọ Baịbụl
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1993
w93 12/15 p. 22-25

Rehab—A Gụrụ Ya n’Onye Ezi Omume Site n’Ọrụ Okwukwe

LEEDỊ nnọọ! A kpọrọ nwanyị akwụna onye ezi omume site n’ụzọ Chineke si ele ihe anya. “Ọ pụghị ime!” ka ọtụtụ ga-eti ná mkpu. Ma nke ahụ bụ ihe mere Rehab bụ́ akwụna, onye Jeriko, obodo oge ochie nke Kenean.

Jemes so dee Bible dekọrọ, sị: “A na-esite n’ọrụ gụọ mmadụ n’onye ezi omume, adịghị esitekwa nanị n’okwukwe. Ma n’ụzọ dị otú a é siteghịkwa n’ọrụ gụọ Rehab, bụ́ nwanyị na-akwa iko, n’onye ezi omume, mgbe ọ kpọbatara ndị ozi ahụ, wee zipụ ha n’ụzọ dị iche? N’ihi na dị ka ahụ bụ ihe nwụrụ anwụ ma mmụọ adịghị ya, ọbụna otú a okwukwe bụ ihe nwụrụ anwụ ma ọrụ adịghị ya.” (Jemes 2:24-26) N’ihi gịnị ka e ji gụọ Rehab n’onye ezi omume? Gịnị ka o mere e ji nye ya nguzo ihe ùgwù dị otú ahụ n’ihu Chineke?

Ndị Israel Na-abịa!

Ka anyị laghachi azụ n’afọ 1473 T.O.A. Were anya nke uche lee ọnọdụ dịnụ. E wusiri Jeriko nnọọ ike. Ụlọ Rehab na-akwa iko guzo n’elu mgbidi obodo ahụ. Site n’ebe a dị mma, ọ pụrụ ikwe ya omume ilega anya n’akụkụ ọwụwa anyanwụ gaa ná mmiri na-etofe ókè nke osimiri Jọdan. (Joshua 3:15) N’ụsọ osimiri n’akụkụ ọwụwa anyanwụ, ọ pụrụ ikiri ọmụma ụlọikwuu ndị Israel, na-enwe ihe karịrị 600,000 ndị na-eje agha. Ha nọpụrụ nanị kilomita ole na ole!

Rehab amatawo banyere ihe ndị Israel meworo n’agha. Ọ nụwokwa banyere ngosipụta nke ike Jehova, karịsịa n’imeghere ndị Israel ụzọ mgbapụ n’etiti Osimiri Uhie. Mgbe ahụ n’ezie, mmiri ahụ tojubigara ókè nke Jọdan agaghị abụ ihe mgbochi ọ bụla. Nke a bụ oge oké ihe omume! Olee otú Rehab ga-esi meghachi omume?

Rehab Ewere Nguzo Ya

N’oge na-adịghị anya, Rehab nwetara ndị ọbịa abụọ a na-atụghị anya ha—ndị nledo sitere n’ọmụma ụlọikwuu ndị Israel. Ha na-achọ ebe ha ga-anọ ọnọdụ abalị, o wee kpọbata ha n’ụlọ ya. Ma okwu banyere ọnụnọ ha ruru ntị eze Jeriko. Ngwa ngwa o zipụrụ ndị ọrụ ya na-ahụ na e debere iwu ije kpọchie ha.—Joshua 2:1, 2.

Mgbe ndị ọrụ eze ahụ na-erutela, Rehab ewerewo nguzo ya maka Jehova Chineke. “Mee ka ha pụta, bụ́ ndị ikom ahụ ndị bakwutere gị,” ka ndị ozi eze nyere iwu ya. Rehab ezobewo ndị nledo ahụ n’etiti osisi flax ndị a wụsara n’elu uko ụlọ ya ka ha kpọọ nkụ. Ọ sịrị: “Ọ bụ otú a, ndị ikom ahụ bakwutere m, ma amaghị m ebe ha si bịa: o ruo, mgbe a gaje imechi ọnụ ụzọ ámá, n’ọchịchịrị, na ndị ikom ahụ pụrụ: amaghị m ebe ndị ikom ahụ jere: chụọnụ ha ngwa ngwa; n’ihi na unu ga-eru ha ahụ.” (Joshua 2:3-5) Nke ahụ ka ndị ikom eze mere—na nkịtị.

Rehab eduhiewo ndị iro ahụ ụzọ. Ozugbo o mere ihe ndị ọzọ gosikwuru okwukwe ya n’ebe Jehova nọ site n’ọrụ. Ọ gara n’uko ụlọ ahụ ma gwa ndị nledo ahụ, sị: “Amawo m na Jehova enyewo unu ala nke a.” Rehab kwetara na egwu ji ndị nile bi n’ala ahụ n’ihi na ha anụwo na Chineke “mere ka mmiri Oké Osimiri Uhie takọrọ” n’ihu ndị Israel 40 afọ tupu mgbe ahụ. Ndị ahụ makwaara na ndị Israel gbupịara ndị eze abụọ nke ndị Amọraịt. “Mgbe anyị nụrụ ya,” ka Rehab na-ekwu, “obi anyị wee lọọ anyị mmiri, ọ dịghịkwa mmụọ guzoro ọzọ n’ime nwoke ọ bụla, n’ihi unu: n’ihi na Jehova, bụ́ Chineke unu, Ya onwe ya bụ Chineke n’eluigwe dị n’elu, na n’elu ụwa dị n’okpuru.”—Joshua 2:8-11.

Rehab arịọ arịrịọ: “Ma ugbu a, biko, werenụ Jehova ṅụọrọ m iyi, n’ihi na emeere m unu ebere, na unu, ọbụna unu onwe unu, ga-emere ụlọ nna m ebere, nyekwa m ihe ịrịba ama eziokwu: na unu ga-emekwa ka nna m, na nne m, na ụmụnne m ndị ikom, na ụmụnne m ndị inyom, na ihe nile ha nwere, dị ndụ.”—Joshua 2:12, 13.

Ndị ikom ahụ kwenyere ma gwa Rehab ihe ọ ga-eme. Site na window ya, ọ ghaghị ikowe eriri ogho uhie nke e ji weda ndị nledo ahụ ná mpụta mgbidi ájá nke Jeriko. Ọ ghaghị ịchịkọta ezinụlọ ya n’ime ụlọ ya, ebe ha na-aghaghị ịnọgide maka nchebe. Rehab enye ndị nledo ahụ ihe ọmụma bara uru ka ha na-ala banyere otú ala ahụ dị ma gwa ha ụzọ ha ga-esi zonarị ndị na-achụso ha. Nke a ka ndị nledo ahụ mere. Mgbe o kowesịrị eriri ogho uhie ahụ ma chịkọta ndị òtù ezinụlọ ya, Rehab cheere ka ihe ndị ọzọ mee.—Joshua 2:14-24.

Gịnị ka Rehab meworo? Eenụ, o gosipụtawo na okwukwe ya bụ n’ebe Chineke Onye Pụrụ Ime Ihe Nile, bụ́ Jehova, nọ! Ọ ga-ebi ndụ n’ụzọ kwekọrọ n’ụkpụrụ ya nile. Ee, a ga-agụkwa ya n’onye ezi omume maka ọrụ okwukwe ndị dị otú ahụ.

Mgbidi Ájá Ndị Ahụ Adaa!

Izu ole na ole agafee. Ka ndị nchụàjà na-esonyere ha—ụfọdụ ji opì ike oké ụda, ndị ọzọ bukwa igbe ọgbụgba ndụ ahụ dị nsọ—ndị ikom Israel na-eje agha na-agba Jeriko gburugburu. Ha anọwo na-eme nke a otu ugbo otu ụbọchị ruo ụbọchị isii ugbu a. Ma, n’ụbọchị nke asaa a, ha azọworị ije gburugburu obodo ahụ ugboro isii. Ha amalitewo ịga ọzọ!

A gazuola nke ugboro asaa, oké ụda dị ogologo site n’opì ike ndị ahụ azụọ n’ikuku. Ndị Israel ugbu a etie oké mkpu. Mgbe ahụ, Jehova emee ka mgbidi na-echebe Jeriko daruo ala n’oké mkpọtụ. Nanị akụkụ ahụ ebe ụlọ Rehab dị ka guzoro. E bibiri ihe nile ọzọ dị n’obodo na ndị bi n’ime ya. Ebe e jiworo ọrụ nwapụta okwukwe ya, e chebere nwanyị ahụ na-akwa iko nke chegharịrịnụ, ya na ezinụlọ ya, o wee malite ibinyere ndị Jehova.—Joshua 6:1-25.

Ilenye Anya n’Àgwà Dị Iche Iche nke Rehab

Rehab abụghị ma ọlị onye umengwu a zụtọrọ azụtọ, n’ihi na n’uko ụlọ ya e nwere ókpòrò osisi flax a gbara n’anwụ. A ga-eji eriri flax mee ákwà linen. E nwekwara ùkwù eriri ogho uhie n’ụlọ Rehab. (Joshua 2:6, 18) Ya mere ọ pụrụ ịrụwo ọrụ imepụta ákwà linen na ma eleghị anya mara ka e si esiji ákwà. Ee, Rehab bụ nwanyị na-arụsi ọrụ ike. Karịsịa ihe nile, ọ zụlitewo egwu nsọpụrụ ofufe n’ebe Jehova nọ.—Tụlee Ilu 31:13, 19, 21, 22, 30.

Gịnị banyere ọrụ nke ọzọ nke Rehab? Ọ bụghị nanị onye na-elekọta ụlọ nnabata ndị njem. Ee e, Akwụkwọ Nsọ kọwara ya site n’iji okwu Hibru na Grik ndị na-egosi onye akwụna. Dị ka ihe atụ, okwu Hibru bụ́ zoh·nahʹ na-emetụtakarị mmekọrịta rụrụ arụ. Ọ dabara na n’etiti ndị Kenean, ịgba akwụna abụghị ọrụ a na-asọ oyi.

Jehova iji onye akwụna mee ihe na-egosi oké ebere ya. Ihe ndị a na-ahụ anya pụrụ iduhie anyị, ma Chineke “na-ele obi.” (1 Samuel 16:7) Ya mere, ndị akwụna nwere obi ziri ezi bụ́ ndị chegharịrị n’ịgba akwụna ha pụrụ ịnata mgbaghara nke Jehova Chineke. (Tụlee Matiu 21:23, 31, 32.) Rehab n’onwe ya si ná mmehie chigharịa gaa n’ụzọ ezi omume nke nwere nkwado Chineke.

Ndị nledo ahụ bụ́ ndị Israel na-ebi ndụ kwekọrọ n’Iwu Chineke, ya mere ha anọghị ọnọdụ abalị n’ụlọ Rehab maka omume rụrụ arụ. Ihe ha bu n’uche pụrụ ịbụwo na o yikarịghị ka ha ịnọ n’ụlọ onye akwụna ọ̀ ga-akpali ndị mmadụ inyo ha enyo. Ọnọdụ ya ná mgbidi ájá obodo ahụ ga-enyekwara ha aka ịgbapụ ngwa ngwa. Ihe àmà na-egosi na Jehova duuru ha gakwuru onye mmehie obi ya nweworo mmetụta dị mma site n’akụkọ ndị ọ nụworo banyere mmeso Chineke mesoro ndị Israel nke na o chegharịrị ma gbanwee ụzọ ya. Okwu Chineke kwuru na Israel ga-achụpụsi ndị Kenean n’ihi omume ha rụrụ arụ, na ngọzi ya n’isi Rehab na ná mmeri e meriri Jeriko, na-enye ihe àmà nke na ndị nledo ahụ emeghị omume rụrụ arụ.—Levitikọs 18:24-30.

Gịnị banyere okwu nduhie ndị Rehab gwara ndị ahụ na-achụso ndị nledo ahụ? Chineke kwadoro ụzọ o si mee ihe. (Tụlee Ndị Rom 14:4.) O mere ihe dị ize ndụ iji chebe ndị na-ejere ya ozi, na-enye ihe àmà nke okwukwe ya. Ọ bụ ezie na ịgha ụgha na-emerụ ahụ dị njọ n’anya Jehova, ọ bụghị iwu na mmadụ ga-enye ndị ọ na-adịghịrị ihe ọmụma bụ eziokwu. Ọbụna Jisọs Kraịst ekwuzughị ihe nile a chọrọ ma ọ bụ nye azịza kpọmkwem mgbe ime otú ahụ pụrụ iweta mmerụ ahụ a pụrụ izere ezere. (Matiu 7:6; 15:1-6; 21:23-27; Jọn 7:3-10) Ihe àmà na-egosi na ihe Rehab mere nke iduhie ndị agha onye iro ahụ ụzọ bụ nke a na-aghaghị ile anya n’ụzọ dị otú ahụ.

Ụgwọ Ọrụ Rehab

Olee ụzọ e si nye Rehab ụgwọ ọrụ maka igosipụta okwukwe? Ichebe ya ndụ n’oge mbibi Jeriko bụ n’ezie ngọzi sitere n’aka Jehova. E mesịa, Salmọn (Salma), nwa Nahshọn bụ́ onye isi nke agbụrụ Juda n’ọzara, lụrụ ya. Dị ka nne na nna nke Boaz na-atụ egwu Chineke, Salmọn na Rehab batara n’eriri usoro ọmụmụ dujere n’Eze Devid nke Israel. (1 Ihe Emere 2:3-15; Rut 4:20-22) Ihe kakwa ịrịba ama bụ na Rehab bụbu nwanyị na-akwa iko bụ otu n’ime nanị ndị inyom anọ a kpọrọ aha n’usoro ọmụmụ Matiu dekọrọ banyere Jisọs Kraịst. (Matiu 1:5, 6) Lee aha ngọzi ọ bụ site n’aka Jehova!

Ọ bụ ezie na ọ bụghị onye Israel, bụrụkwa onye na-akwa iko ná mbụ, Rehab bụ ihe nlereanya pụtara ìhè nke nwanyị ji ọrụ ya gosipụta na ya nwere okwukwe zuru ezu na Jehova. (Ndị Hibru 11:30, 31) Dị ka ndị ọzọ, nke ụfọdụ n’ime ha gbahapụworo ndụ ịgba akwụna, ọ ka ga-anata ụgwọ ọrụ ọzọ—mbilite n’ọnwụ site ná ndị nwụrụ anwụ gaa ná ndụ n’ụwa paradaịs. (Luk 23:43) N’ihi okwukwe ya e ji ọrụ kwadoo, Rehab nwetara nnwapụta nke Nna anyị na-ahụ n’anya ma na-agbaghara mmehie, onye bi n’eluigwe. (Abụ Ọma 130:3, 4) N’ụzọ e jikwa n’aka, ihe nlereanya ọma ya na-enye ndị nile hụrụ ezi omume n’anya agbamume ilegara Jehova Chineke anya maka ndụ ebighị ebi.

[Foto dị na peeji nke 23]

A gụrụ Rehab n’onye ezi omume n’ihi na ọrụ ya nwapụtara na o nwere okwukwe

[Foto ndị dị na peeji nke 24]

Ndị ọkà n’ihe mgbe ochie e gwupụtara n’ala egwupụtawo ihe fọrọ na Jeriko oge ochie, gụnyere akụkụ dị nta nke mgbidi oge ochie

[Ebe E Si Nweta Foto]

Pictorial Archive (Near Eastern History) Est.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya