Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ
Gịnị ka onye na-eso ụzọ bụ́ Jemes bu n’uche mgbe ọ sịrị: “Unu aghọla ọtụtụ ndị ozizi, ụmụnna m, ebe unu matara na anyị ga-anata ikpe ka ukwuu”? —Jemes 3:1.
N’ezie Jemes adịghị akụda ndị Kraịst aka izi ndị ọzọ eziokwu. Na Matiu 28:19, 20, Jisọs nyere ndị na-eso ụzọ ya iwu ka ha “mee mba nile ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ m, . . . na-ezi ha ka ha debe ihe nile, ka ha hà, bụ́ nke M nyere unu n’iwu.” N’ihi ya, ndị Kraịst nile kwesịrị ịbụ ndị ozizi. Pọl onyeozi dụrụ ndị Hibru bụ́ ndị Kraịst ọdụ n’ihi na ha a ka abụbeghị ndị na-ezi ihe. O dere, sị: “N’ihi na mgbe unu kwesịrị ịbụ ndị ozizi n’ihi oge, ọ dị unu mkpa ọzọ ka mmadụ zie unu ihe bụ ihe ozizi mbụ nke mmalite okwu si n’ọnụ Chineke pụta.”—Ndị Hibru 5:12.
Mgbe ahụ, gịnị ka Jemes na-ekwu banyere ya? Ọ na-ezo aka ná ndị nwere ihe ùgwù izi ihe pụrụ iche n’ọgbakọ. Ná Ndị Efesọs 4:11, anyị na-agụ, sị: “Ya onwe ya [Jisọs Kraịst, Isi nke ọgbakọ] nyekwara ụfọdụ ka ha bụrụ ndị ozi; nyekwa ụfọdụ ka ha bụrụ ndị amụma; nyekwa ụfọdụ ka ha bụrụ ndị na-ezisa ozi ọma; nyekwa ụfọdụ ka ha bụrụ ndị na-azụ atụrụ Chineke na ndị ozizi.” E nwere ihe ùgwù izi ihe ndị pụrụ iche n’etiti ọgbakọ ndị dị na narị afọ mbụ dịkwa ka e nwere taa. Dị ka ihe atụ, Òtù Na-achị Isi na-anọchi anya “ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche” ma nwee ibu ọrụ pụrụ iche ilekọta ozizi ihe nke ọgbakọ zuru ụwa ọnụ. (Matiu 24:45) Ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị na ndị okenye ọgbakọ nwekwara ibu ọrụ izi ihe pụrụ iche.
Jemes ọ̀ na-agwa ndị ikom ndị Kraịst ruru eru na ha ekwesịghị ịnara ọrụ nke onye ozizi n’ihi egwu nke ikpe ka ukwuu nke Chineke? Ọ dịghị ma ọlị. Ọrụ onye okenye bụ oké ihe ùgwù, dị ka 1 Timoti 3:1 gosipụtara, bụ́ nke na-asị: “Ọ bụrụ na onye ọ bụla na-agbaso ọnọdụ onye na-elekọta nzukọ Kraịst anya, agụ ọrụ ọma na-agụụ ya.” Otu n’ime ihe a chọrọ maka ịhọpụta mmadụ dị ka onye okenye ọgbakọ bụ na nwoke ga-abụ onye “nwere ike izi ihe.” (1 Timoti 3:2) Jemes ekwugideghị okwu Pọl dere n’ike mmụọ nsọ.
Otú ọ dị, o yiri ka na narị afọ mbụ O.A., ụfọdụ na-eguzobe onwe ha dị ka ndị ozizi, ọ bụ ezie na ha erughị eru, a họpụtaghịkwa ha. O yikarịrị ka ha chere na e nwere oké aha dị n’ọrụ ahụ, ha chọkwara inwe otuto onwe onye. (Tụlee Mak 12:38-40; 1 Timoti 5:17.) Jọn onyeozi kpọtụrụ Diọtrefis aha, bụ́ onye ‘ọ na-atọ ụtọ ịbụ onye isi n’etiti ha, ma na-anaraghị Jọn nke ọma.’ (3 Jọn 9) Timoti nke Mbụ 1:7 na-ekwu banyere ụfọdụ ndị ‘chọrọ ịbụ ndị ozizi nke iwu, ọ bụ ezie na ha aghọtaghị ihe ha na-ekwu, ha aghọtaghịkwa ihe ahụ ha na-ekwusi ike banyere ha.’ Okwu Jemes 3:1 kwesịrị nnọọ ekwesị karịsịa maka ndị ikom chọrọ ịbụ ndị ozizi ma bụrụ ndị nwere ebumnuche na-ezighị ezi. Ụdị ndị ahụ pụrụ imerụ ìgwè atụrụ ahụ ahụ, ha gakwa anata ikpe ka ukwuu n’ikwekọ na nke ahụ.—Ndị Rom 2:17-21; 14:12.
Jemes 3:1 bụkwa ezi ihe ncheta maka ndị ruru eru ma na-eje ozi dị ka ndị ozizi. Ebe ọ bụ na a tụkwasịwo ihe dị ukwuu n’ubu ha, a ga-achọkwa ihe dị ukwuu n’aka ha. (Luk 12:48) Jisọs kwuru, sị: “Okwu ọ bụla nke mmadụ ga-ekwu nke na-abaghị n’ihe, ha ga-aza ajụjụ banyere ya n’ụbọchị ikpe.” (Matiu 12:36) Nke a bụ eziokwu karịsịa nye ndị okwu ha nwere mmetụta ka ukwuu, ndị okenye a họpụtara ahọpụta.
Ndị okenye ga-aza ajụjụ maka ụzọ ha si na-emeso atụrụ Jehova omume. (Ndị Hibru 13:17) Ihe ha na-ekwu na-emetụta ndụ. N’ihi ya, onye okenye kwesịrị ilezi anya ka ọ ghara iwelite echiche nke ya onwe ya ma ọ bụ mesoo atụrụ ahụ n’ụzọ na-adịghị mma dị ka ndị Farisii mere. Ọ ghaghị ịgbalịsi ike igosipụta ụdị ịhụnanya ahụ dị omimi Jisọs gosiri. N’ọnọdụ izi ihe ọ bụla, karịsịakwa mgbe o metụtara okwu ikpe, onye okenye kwesịrị ịtụle okwu ya nke ọma, n’ejighị okwu ndị a na-echebaraghị echiche eme ihe ma ọ bụ na-ekwu kpọmkwem echiche onwe ya. Site n’ịdabere kpam kpam na Jehova, Okwu ya, na nduzi ya sitere n’ọgbakọ ya, ndị ọzụzụ atụrụ ga-anata ngọzi bara ụba nke Chineke, ọ bụghị “ikpe ka ukwuu.”