N’agbanyeghị Ọnwụnwa, Jidesie Okwukwe Gị Ike!
“Gụọnụ ya n’ọṅụ nile, ụmụnna m, mgbe ọ bụla unu dabara n’ọnwụnwa dị iche iche.”—JEMES 1:2.
1. N’agbanyeghị gịnị ka ndị Jehova na-ejere ya ozi n’okwukwe, na-enwekwa ‘obi ụtọ’?
NDỊ Jehova ji ‘obi ụtọ’ na okwukwe n’ebe ọ nọ na-eje ozi dị ka Ndịàmà ya. (Deuterọnọmi 28:47; Aịsaịa 43:10) Ha na-eme nke a n’agbanyeghị na ọtụtụ ọnwụnwa na-adakwasị ha. N’agbanyeghị ihe isi ike ha, ha na-enweta nkasi obi site n’okwu ndị bụ́: “Gụọnụ ya n’ọṅụ nile, ụmụnna m, mgbe ọ bụla unu dabara n’ọnwụnwa dị iche iche, ebe unu maara na nnwapụta nke okwukwe unu na-arụpụta ntachi obi.”—Jemes 1:2, 3.
2. Gịnị ka a maara banyere onye dere akwụkwọ ozi Jemes?
2 Jemes onye na-eso ụzọ, bụ́ onye otu nne ji ya na Jisọs Kraịst, dere okwu ahụ n’ihe dị ka 62 O.A. (Mak 6:3) Jemes bụ okenye n’ọgbakọ Jerusalem. N’ezie, ya, Sifas (Pita), na Jọn “bụ ndị a kpọrọ idé”—ndị nkwado siri ike ma kwụrụ chịm nke ọgbakọ. (Ndị Galetia 2:9) Mgbe okwu banyere ibi úgwù pụtara n’ihu “ndị ozi na ndị okenye” n’ihe dị ka na 49 O.A., Jemes tụrụ ezi aro dabeere n’Akwụkwọ Nsọ bụ nke òtù na-achị isi nke narị afọ mbụ tinyere n’ọrụ.—Ọrụ 15:6-29.
3. Gịnị bụ ụfọdụ n’ime nsogbu chere ndị Kraịst narị afọ mbụ ihu, oleekwa otú anyị pụrụ isi nweta abamuru kasị ukwuu site n’akwụkwọ ozi Jemes?
3 Dị ka onye ọzụzụ atụrụ ime mmụọ nwere nchegbu, Jemes ‘maara ihu ìgwè ewu na atụrụ’ ahụ. (Ilu 27:23) Ọ ghọtara na ndị Kraịst n’oge ahụ chere ọnwụnwa siri ike ihu. Echiche ụfọdụ ndị chọrọ mgbazi, n’ihi na ha na-emelara ndị ọgaranya ihe. Nye ọtụtụ ndị, ofufe bụ nanị imezu iwu. Ụfọdụ ji ire ha na-adịghị eguzo n’otu ebe akpata nsogbu. Mmụọ nke ụwa nọ na-enwe mmetụta ndị na-emebi ihe, ọtutụ enweghịkwa ndidi, ha adịghịkwa ekpe ekpere. N’eziokwu, ọrịa ime mmụọ adakwasịwo ụfọdụ ndị Kraịst. Akwụkwọ ozi Jemes na-atụle okwu ndị dị otú ahụ n’ụzọ na-ewuli elu, ndụmọdụ ya dịkwa irè taa dị ka ọ dị na narị afọ mbụ O.A. Anyị ga-erite uru dị ukwuu ma ọ bụrụ na anyị ewere akwụkwọ ozi a dị ka nke e deere anyị kpọmkwem.a
Mgbe A Na-anwa Anyị
4. Olee otú anyị kwesịrị isi ele ọnwụnwa anya?
4 Jemes na-egosi anyị ụzọ isi lee ọnwụnwa anya. (Jemes 1:1-4) N’ekwughị banyere nkekọ ezinụlọ o nwere n’ebe Ọkpara Chineke nọ, o ji obi umeala na-akpọ onwe ya “ohu nke Chineke na nke Onyenwe anyị Jisọs Kraịst.” Jemes na-edegara “ebo iri na abụọ” nke Israel ime mmụọ ‘gbasasịrị agbasasị’ na mbụ n’ihi mkpagbu, akwụkwọ. (Ọrụ 8:1; 11:19; Ndị Galetia 6:16; 1 Pita 1:1) Dị ka ndị Kraịst, a na-akpagbukwa anyị, anyị ‘na-adabakwa n’ọnwụnwa dị iche iche.’ Ma ọ bụrụ na anyị echeta na ọnwụnwa ndị a tachiri obi na ha na-ewusi okwukwe anyị ike, anyị ‘ga-agụ ya n’ọṅụ nile’ mgbe ha dakwasịrị anyị. Ọ bụrụ na anyị anọgide na-eguzosi ike n’ezi ihe nye Chineke n’oge ọnwụnwa, nke a ga-ewetara anyị obi ụtọ na-adịgide adịgide.
5. Gịnị ka ọnwụnwa anyị pụrụ ịgụnye, gịnị na-emekwa mgbe anyị tachichara obi na ha?
5 Ọnwụnwa anyị na-agụnye ahụhụ ndị ihe a kpọrọ mmadụ dum na-ata. Dị ka ihe atụ, ọrịa pụrụ iti anyị ihe otiti. Chineke adịghị agwọ ọrịa n’ụzọ ọrụ ebube ugbu a, ma ọ na-aza ekpere anyị na-ekpe maka amamihe na obi ike dị mkpa iji nagide nrịanrịa. (Abụ Ọma 41:1-3) Anyị na-atakwa ahụhụ n’ihi ezi omume dị ka Ndịàmà Jehova a na-akpagbu. (2 Timoti 3:12; 1 Pita 3:14) Mgbe anyị tachichara obi n’ọnwụnwa ndị dị otú ahụ, a na-anwapụta okwukwe anyị, na-aghọ nke ‘a nwapụtara anwapụta.’ Mgbe okwukwe anyị merikwara, nke a “na-arụpụta ntachi obi.” Okwukwe e ji ọnwụnwa mee ka o sikwuo ike ga-enyere anyị aka ịtachi obi n’ule ndị dị n’ihu.
6. Olee otú ‘ntachi obi si arụzu ọrụ ya,’ oleekwa nzọụkwụ dị irè ndị a pụrụ iwere mgbe a na-anwa anyị?
6 “Ma,” ka Jemes na-ekwu, “ka ntachi obi rụzuo ọrụ ya.” Ọ bụrụ na anyị ahapụ ọnwụnwa ka ọ gaa n’ihu n’agbalịghị iji ụzọ Akwụkwọ Nsọ na-akwadoghị kwụsị ya, ntachi obi ga-arụ “ọrụ” nke ime ka anyị zuo ezu dị ka ndị Kraịst, n’enweghị ụkọ nke okwukwe. Otú ọ dị, ọ bụrụ na ọnwụnwa ekpughee adịghị ike ụfọdụ, anyị kwesịrị ịchọ enyemaka Jehova iji merie ya. Gịnị ma ọ bụrụ na ọnwụnwa ahụ bụ nke inwe mmekọahụ rụrụ arụ? Ka anyị kpee ekpere banyere nsogbu ahụ, mgbe ahụ meekwa ihe kwekọrọ n’ekpere anyị. Ọ pụrụ ịdị anyị mkpa ịgbanwe ebe ọrụ anyị ma ọ bụ iwere nzọụkwụ ndị ọzọ iji nọgide na-eguzosi ike n’ezi ihe nye Chineke.—Jenesis 39:7-9; 1 Ndị Kọrint 10:13.
Ọchịchọ A Na-achọ Amamihe
7. Olee otú a pụrụ isi nyere anyị aka ịnagide ọnwụnwa?
7 Jemes na-egosi anyị ihe a ga-eme ma ọ bụrụ na anyị amaghị ụzọ isi nagide ọnwụnwa. (Jemes 1:5-8) Jehova agaghị ata anyị ụta maka enweghị amamihe ma jiri okwukwe na-ekpe ekpere maka ya. Ọ ga-enyere anyị aka ile ọnwụnwa anya n’ụzọ kwesịrị ekwesị na ịtachi obi na ya. A pụrụ ichetara anyị akụkụ akwụkwọ nsọ dị iche iche site n’ọnụ ndị kwere ekwe ibe anyị ma ọ bụ n’oge ọmụmụ Bible. Ihe ndị e mere site ná nduzi Chineke pụrụ inyere anyị aka ịhụ ihe anyị kwesịrị ime. Mmụọ Chineke pụrụ iduzi anyị. (Luk 11:13) Iji rite uru ndị dị otú ahụ, dị ka ọ na-adịkarị anyị aghaghị ịrapagidesi ike n’ebe Chineke na ndị ya nọ.—Ilu 18:1.
8. Gịnị mere na onye nwere obi abụọ agaghị anata ihe ọ bụla site n’aka Jehova?
8 Jehova na-enye anyị amamihe iji nagide ọnwụnwa ma anyị “rịọ n’okwukwe, n’enweghị obi abụọ.” Onye nwere obi abụọ “yiri ebili miri nke oké osimiri mgbe ifufe na-efegharị ya, a na-atụlikwa ya elu” n’ụzọ a na-ejighị n’aka. Ọ bụrụ na anyị akwụsighị ike otú ahụ n’ụzọ ime mmụọ, ‘anyị ekwesịghị iche na anyị ga-anata ihe ọ bụla n’aka Jehova.’ Ka anyị ghara ‘inwe uche abụọ,’ ‘n’adịghị eguzo n’otu ebe’ n’ekpere ma ọ bụ n’ụzọ ndị ọzọ. Kama nke ahụ, ka anyị nwee okwukwe na Jehova, bụ́ Isi Iyi nke amamihe.—Ilu 3:5, 6.
Ọgaranya na Ogbenye Pụrụ Ịnya Isi
9. N’ihi gịnị ka anyị ji nwee ihe mere a ga-eji nyaa isi dị ka ndị na-efe Jehova?
9 Ọ bụrụgodị na ịda ogbenye bụ otu n’ime ọnwụnwa anyị, ka anyị buru n’uche na ma ndị Kraịst bara ọgaranya ma ndị dara ogbenye pụrụ ịnya isi. (Jemes 1:9-11) Tupu ha aghọọ ụmụazụ Jisọs, ihe ka ọtụtụ ná ndị e tere mmanụ nwere ihe onwunwe dị nta, ụwa ledakwara ha anya. (1 Ndị Kọrint 1:26) Ma ha pụrụ ịnya isi ‘n’ọnọdụ ha dị elu’ ná nguzo ha nke ịbụ ndị nketa Alaeze. (Ndị Rom 8:16, 17) N’aka nke ọzọ, ndị ọgaranya bụ́ ndị a na-enyebu nsọpụrụ nwetara ọnọdụ ‘dị ala’ dị ka ụmụazụ Kraịst n’ihi ịbụ ndị ụwa na-elelị. (Jọn 7:47-52; 12:42, 43) Otú ọ dị, dị ka ndị ohu Jehova, anyị nile pụrụ ịnya isi n’ihi na akụ̀ na ụba na ọkwá dị elu nke ụwa bụ ihe efu ma e jiri ha tụnyere ụba ime mmụọ ndị anyị na-anụ ụtọ ha. Leekwa ekele anyị nwere na e nweghị n’etiti anyị ọnọdụ ọ bụla maka nganga n’ihi ọkwá mmadụ n’ọha na eze!—Ilu 10:22; Ọrụ 10:34, 35.
10. Olee otú onye Kraịst kwesịrị isi ele akụ̀ na ụba nkịtị anya?
10 Jemes na-enyere anyị aka ịhụ na ndụ anyị adịghị adabere n’akụ̀ na ụba na ihe a na-arụzu n’ụwa. Dị ka ịma mma okooko osisi na-apụghị igbochi ya ịnwụ ‘n’ikuku dị ọkụ’ nke anyanwụ, otú ahụ ka akụ̀ na ụba onye bara ọgaranya na-apụghị ịgbatịkwu ndụ ya. (Abụ Ọma 49:6-9; Matiu 6:27) Ọ pụrụ ịnwụ mgbe ọ na-achụso ‘ije ya nile,’ ikekwe n’achụmnta ego. N’ihi ya, ihe dị mkpa bụ ịba “ọgaranya n’ebe Chineke nọ” na ime ihe nile anyị pụrụ ime ịkwalite ọdịmma Alaeze.—Luk 12:13-21; Matiu 6:33; 1 Timoti 6:17-19.
Ngọzi Na-adịrị Ndị Na-atachi Obi n’Ọnwụnwa
11. Gịnị bụ atụmanya dị maka ndị na-ejidesi okwukwe ha ike n’oge ọnwụnwa?
11 Ma ànyị bụ ọgaranya ma ọ bụ ogbenye, anyị pụrụ ịbụ ndị ngọzi dịịrị ma ọ bụrụ na anyị atachie obi n’ọnwụnwa anyị. (Jemes 1:12-15) Ọ bụrụ na anyị atachie obi n’ọnwụnwa n’emebighị okwukwe anyị, a pụrụ ikwu na ngọzi dịịrị anyị, n’ihi na ọṅụ dị n’ime ihe ziri ezi n’anya Chineke. Site n’ijidesi okwukwe ha ike ruo n’ọnwụ, ndị Kraịst e ji mmụọ nsọ mụọ na-anara “okpueze nke ndụ,” bụ́ anwụghị anwụ n’eluigwe. (Mkpughe 2:10; 1 Ndị Kọrint 15:50) Ọ bụrụ na anyị nwere olileanya elu ala ma nọgide na-enwe okwukwe n’ebe Chineke nọ, anyị pụrụ ịtụ anya ndụ ebighị ebi n’elu ụwa paradaịs. (Luk 23:43; Ndị Rom 6:23) Lee ka Jehova si dị mma nye ndị nile na-egosipụta okwukwe n’ebe ọ nọ!
12. Mgbe anyị na-ata ahụhụ, gịnị mere anyị na-ekwesịghị ịsị: “A na-esite n’aka Chineke anwa m”?
12 Ò kwere omume na Jehova n’onwe ya ji ahụhụ na-anwa anyị? Ee e, anyị ekwesịghị ịsị: “A na-esite n’aka Chineke anwa m.” Jehova adịghị agbalị ịraba anyị ime mmehie kama ọ ghaghị inyere anyị aka ma nye anyị ume dị mkpa iji tachie obi n’ọnwụnwa ma ọ bụrụ na anyị anọgidesie ike n’okwukwe. (Ndị Filipaị 4:13) Chineke dị nsọ, n’ihi ya ọ dịghị edebe anyị n’ọnọdụ ndị ga-ebelata ikike anyị nwere iguzogide ime ihe ọjọọ. Ọ bụrụ na anyị etinye onwe anyị n’ọnọdụ ọjọọ ma mee mmehie ụfọdụ, anyị ekwesịghị ịta ya ụta, “n’ihi na Chineke bụ Onye a na-apụghị iwere ihe ọjọọ nwaa Ya, Ya onwe ya adịghị anwakwa onye ọ bụla.” Ọ bụ ezie na Jehova pụrụ ikwe ka otu ọnwụnwa bịa iji dọọ anyị aka ná ntị maka ọdịmma anyị, ọ dịghị eji nzube ọjọọ anwa anyị. (Ndị Hibru 12:7-11) Setan pụrụ ịnwa anyị ime ihe ọjọọ, ma Chineke pụrụ ịnapụta anyị n’aka ajọ onye ahụ.—Matiu 6:13.
13. Gịnị pụrụ ime ma ọ bụrụ na anyị ajụghị ọchịchọ ọjọọ?
13 Ọ dị anyị mkpa ịdị na-ekpe ekpere n’ihi na ọnọdụ ụfọdụ pụrụ iduga n’ọchịchọ ọjọọ nke pụrụ ịraba anyị ná mmehie. Jemes na-asị: “A na-anwa onye ọ bụla mgbe agụụ ihe ọjọọ nke aka ya na-adọkpụfu ya, e wee rafuo ya.” Anyị apụghị ịta Chineke ụta maka mmehie anyị ma ọ bụrụ na anyị ekwe ka obi anyị dịkwasị n’ọchịchọ ọjọọ. Ọ bụrụ na anyị akwụsịghị iche ihe ọjọọ, ‘ọ na-atụrụ ime,’ a na-azụlite ya n’obi, ọ ‘na-amụpụtakwa mmehie.’ Mgbe e mere mmehie, ọ ‘na-amụpụta ọnwụ.’ O doro anya na ọ dị anyị mkpa iche obi anyị nche ma jụ ọchịchọ mmehie. (Ilu 4:23) A dọrọ Ken aka ná ntị na mmehie na-aga imeri ya, ma ọ gbasoghị ya mgba. (Jenesis 4:4-8) Ya mere, gịnịzi ma ọ bụrụ na anyị amalite ịgbaso ụzọ Akwụkwọ Nsọ na-akwadoghị? N’ezie anyị kwesịrị inwe ekele ma ọ bụrụ na ndị Kraịst bụ́ ndị okenye agbalịa ịgbazi anyị ka anyị wee ghara imehie megide Chineke.—Ndị Galetia 6:1.
Chineke—Isi Iyi nke Ezi Ihe
14. N’echiche dị aṅaa ka a pụrụ ikwu na onyinye Chineke “zuru okè”?
14 Anyị kwesịrị icheta na Jehova bụ Isi Iyi, ọ bụghị nke ọnwụnwa, kama nke ezi ihe. (Jemes 1:16-18) Jemes na-akpọ ndị kwere ekwe ibe ya “ụmụnna m ndị m hụrụ n’anya” ma na-egosi na Chineke bụ Onye Na-enye “ezi onyinye ọ bụla na ihe ọ bụla zuru okè e nyere enye.” Onyinye ime mmụọ na nke nkịtị Jehova na-enye “zuru okè,” ma ọ bụ zuo ezu, n’enweghị ihe kọrọ ya. Ha “si n’elu” bịa, site n’ebe obibi Chineke n’eluigwe. (1 Ndị Eze 8:39) Jehova bụ “Nna nke ìhè”—anyanwụ, ọnwa, na kpakpando. Ọ na-enyekwa anyị ìhè ime mmụọ na eziokwu. (Abụ Ọma 43:3; Jeremaịa 31:35; 2 Ndị Kọrint 4:6) N’adịghị ka anyanwụ nke na-eme ka onyinyo gbanwee mgbe ọ na-agagharị, nke na-anọkwa n’ọ̀tụ̀tụ̀ ya kasị elu nanị n’etiti ehihie, Chineke nọ n’ọ̀tụ̀tụ̀ ya kasị elu mgbe nile n’inye ezi ihe. N’ezie ọ ga-akwadebe anyị iche ọnwụnwa ihu ma ọ bụrụ na anyị ejiri ndokwa ime mmụọ ọ na-enye site n’Okwu ya na “ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche,” mee ihe n’ụzọ zuru ezu.—Matiu 24:45.
15. Gịnị bụ otu n’ime onyinye kasị mma nke Jehova?
15 Gịnị bụ otu n’ime onyinye ndị kasị mma nke Chineke? Iji mmụọ nsọ mụpụta ụmụ ime mmụọ, n’ịrụ ọrụ n’ụzọ kwekọrọ n’ozi ọma ahụ, ma ọ bụ “okwu nke eziokwu.” Ndị a na-amụ n’ime mmụọ bụ “otu aha mkpụrụ mbụ,” ndị a họọrọ n’etiti ihe a kpọrọ mmadụ ịbụ “alaeze na ndị nchụàjà” nke eluigwe. (Mkpughe 5:10; Ndị Efesọs 1:13, 14) Ọ pụrụ ịbụ na Jemes na-eche banyere mkpụrụ mbụ nke ọka barley e nyere na Nisan 16, bụ́ ụbọchị a kpọlitere Jisọs n’ọnwụ, na banyere onyinye nke ógbè achịcha ọka wheat abụọ n’ụbọchị Pentikọst, mgbe a wụpụrụ mmụọ nsọ. (Levitikọs 23:4-11, 15-17) Ọ bụrụ otú ahụ, Jisọs ga-abụ mkpụrụ mbụ ahụ, ndị nketakọ ya ga-abụkwa “otu aha mkpụrụ mbụ.” Gịnị ma ọ bụrụ na anyị nwere olileanya elu ala? Iburu ya n’obi ga-enyere anyị aka ijidesi okwukwe anyị nwere n’ebe Onye Na-enye “ezi onyinye ọ bụla” nọ ike, bụ́ onye meworo ka ndụ ebighị ebi kwe omume n’okpuru ịchịisi Alaeze.
Bụrụ ‘Onye Na-eme Okwu Ahụ’
16. N’ihi gịnị ka anyị ga-eji ‘na-anụ ihe ọsọ ọsọ ma ghara ịdị ngwa iwe iwe’?
16 Ma à na-anwa okwukwe anyị ugbu a ma ọ bụ na adịghị anwa ya, anyị aghaghị ịbụ “ndị na-eme okwu ahụ.” (Jemes 1:19-25) Ọ dị anyị mkpa ịbụ ndị ‘na-anụ okwu Chineke ọsọ ọsọ,’ bụrụ ndị ji nrubeisi na-eme ya. (Jọn 8:47) N’aka nke ọzọ, ka anyị ghara ‘ịdị ngwa ikwu okwu,’ jiri nlezianya na-atụle ihe anyị na-ekwu. (Ilu 15:28; 16:23) Ọ pụrụ ịbụ na Jemes na-agba anyị ume ịghara ịdị ngwa ikwu na ọnwụnwa anyị sitere n’aka Chineke. A na-enyekwa anyị ndụmọdụ ịbụ ndị “na-adịghịkwa ngwa iwe iwe: n’ihi na iwe mmadụ adịghị arụ ọrụ ezi omume Chineke.” Ọ bụrụ na ihe mmadụ kwuru akpasuo anyị iwe, ka anyị ‘jiritụ nwayọọ’ iji wee zere iji obi iwe azaghachi. (Ndị Efesọs 4:26, 27) Mmụọ jupụtara n’iwe nke pụrụ ịkpatara anyị nsogbu ma ghọọrọ ndị ọzọ ọnwụnwa apụghị ịrụpụta ihe inwe okwukwe na Chineke nke ezi omume anyị chọrọ n’aka anyị. Ọzọkwa, ọ bụrụ na anyị “nwere ọtụtụ nghọta,” anyị ga-abụ ndị “na-adịghị ewe iwe ọsọ ọsọ,” a ga-adọtakwa ụmụnna anyị ndị nwoke na ndị nwanyị n’ebe anyị nọ.—Ilu 14:29.
17. Gịnị ka a na-arụzu site n’iwepụ ihe ọjọọ n’obi na n’uche?
17 Ọ dị anyị mkpa n’ezie iwepụsị “unyi nile”—ihe ọ bụla Chineke kpọrọ asị, ndị na-akwalite iwe iwe. Ọzọkwa, anyị aghaghị ‘iwezụga njubiga oké nile nke ihe ọjọọ.’ Anyị nile kwesịrị iwepụcha ná ndụ anyị adịghị ọcha ọ bụla nke anụ ahụ ma ọ bụ nke mmụọ. (2 Ndị Kọrint 7:1; 1 Pita 1:14-16; 1 Jọn 1:9) Iwepụ ihe ọjọọ n’obi na n’uche nyeere anyị aka ‘iwere nwayọọ nara okwu nke eziokwu ahụ a kụworo.’ (Ọrụ 17:11, 12) N’agbanyeghị ogologo oge anyị bụworo ndị Kraịst, anyị aghaghị ịnọgide na-ekwere ka a kụkwuo eziokwu nke Akwụkwọ Nsọ n’ime anyị. N’ihi gịnị? N’ihi na site ná mmụọ Chineke, okwu ahụ a kụworo na-amịpụta “mmadụ ọhụrụ” nke na-enweta nzọpụta.—Ndị Efesọs 4:20-24.
18. Olee otú onye na-anụ okwu ahụ nanị si dị iche n’ebe onye bụkwa onye na-eme ya nọ?
18 Olee otú anyị si egosi na okwu ahụ na-eduzi anyị? Site n’ịbụ ndị ji nrubeisi bụrụ ‘ndị na-eme okwu ahụ, ọ bụghị ndị na-anụ nanị.’ (Luk 11:28) ‘Ndị na-eme ya’ nwere okwukwe nke na-akpata ọrụ ndị dị ka iji ịnụ ọkụ n’obi na-eje ozi ndị Kraịst na ikerechi òkè anya ná nzukọ ndị Chineke. (Ndị Rom 10:14, 15; Ndị Hibru 10:24, 25) Onye na-anụ okwu ahụ nanị “yiri nwoke nke na-ekiri ihu ya n’enyo.” Ọ na-ele anya, mgbe ahụ pụọ ma chefuo banyere ihe pụrụ ịdị mkpa iji dozie ọdịdị ya. Dị ka “ndị na-eme okwu ahụ,” anyị ji nlezianya na-amụ ma na-erube isi ‘n’iwu zuru okè’ nke Chineke, nke na-emetụta ihe nile ọ chọrọ n’aka anyị. Nnwere onwe anyị si otú ahụ anụ ụtọ ya bụ ihe na-emegide kpọmkwem ịnọ n’ohu nke mmehie na ọnwụ, n’ihi na ọ na-eduga ná ndụ. Ya mere ka anyị ‘nọgide n’iwu ahụ zuru okè,’ na-enyocha ma na-erube isi na ya mgbe nile. Cheekwa echiche! Dị ka ‘ndị na-arụ ọrụ ahụ, ọ bụghị ndị na-anụ ma na-echezọ,’ anyị nwere ọṅụ nke na-esite n’inwe ihu ọma Chineke.—Abụ Ọma 19:7-11.
Ihe Karịrị Ịbụ Ndị Na-ekpere Chineke
19, 20. (a) Dị ka Jemes 1:26, 27 si kwuo, gịnị ka ofufe dị ọcha na-achọ n’aka anyị? (b) Gịnị bụ ihe atụ ụfọdụ nke ofufe a na-emerụghị emerụ?
19 Ọ bụrụ na anyị ga-enwe ihu ọma Chineke, ọ dị anyị mkpa icheta na ezi ofufe abụghị nanị imezu iwu. (Jemes 1:26, 27) Anyị pụrụ iche na anyị bụ ndị ‘na-ekpere’ Jehova a na-anakwere, ma ọ bụ otú o si were onye ọ bụla n’ime anyị bụ ihe dị mkpa n’ezie. (1 Ndị Kọrint 4:4) Otu ntụpọ dị njọ pụrụ ịbụ enweghị ike ‘ịkwa ire nga.’ Anyị ga na-aghọgbu onwe anyị ma ọ bụrụ na anyị echee na ofufe anyị na-amasị Chineke ma ọ bụrụ na anyị na-ekwutọ ndị ọzọ, na-agha ụgha, ma ọ bụ na-eji ire eme ihe n’ụzọ ndị ọzọ na-adịghị mma. (Levitikọs 19:16; Ndị Efesọs 4:25) N’ezie, anyị achọghị ka “okpukpe Chineke” anyị bụrụ “ihe efu” na ihe Chineke na-adịghị anakwere n’ihi ihe ọ bụla.
20 Ọ bụ ezie na Jemes adịghị ezo aka n’akụkụ nile nke ofufe dị ọcha, ọ na-ekwu na ọ na-agụnye “ileta ụmụ mgbei na ndị inyom di ha nwụrụ n’ime mkpagbu ha.” (Ndị Galetia 2:10; 6:10; 1 Jọn 3:18) Ọgbakọ ndị Kraịst na-egosi mmasị pụrụ iche n’inye ndị inyom di ha nwụrụ ihe. (Ọrụ 6:1-6; 1 Timoti 5:8-10) Ebe ọ bụ na Chineke bụ Onye Nchebe nke ndị inyom di ha nwụrụ na ndị na-enweghị nna, ka anyị kwadoo Ya site n’ime ihe anyị pụrụ ime iji nyere ha aka n’ụzọ ime mmụọ na n’ụzọ nkịtị. (Deuterọnọmi 10:17, 18) Ofufe dị ọcha pụtakwara ‘idebe onwe onye n’enweghị ntụpọ site n’ụwa,’ bụ́ ọha mmadụ ajọ omume na-atọgbọ n’ike Setan. (Jọn 17:16; 1 Jọn 5:19) Ya mere ka anyị nọgide na-enwere onwe anyị pụọ n’omume asọpụrụghị Chineke nke ụwa ka anyị wee nwee ike inye Jehova otuto, bụrụkwa ndị e ji eme ihe n’ozi ya.—2 Timoti 2:20-22.
21. N’ihe banyere akwụkwọ ozi Jemes, olee ajụjụ ọzọ ndị kwesịrị ka anyị tụlee?
21 Ndụmọdụ Jemes anyị tụleworo rute n’ebe a kwesịrị inyere anyị aka ịtachi obi n’ọnwụnwa ma rapara n’okwukwe anyị. O kwesịrị ịtụkwasị ihe n’ekele anyị nwere maka Onye Na-enye ezi onyinye nke na-ahụ n’anya. Okwu Jemes na-enyekwara anyị aka ife ezi ofufe. Gịnị ọzọ ka ọ na-echetara anyị? Olee nzọụkwụ ndị ọzọ anyị pụrụ iwere iji nwapụta na anyị nwere ezi okwukwe n’ebe Jehova nọ?
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a N’oge ọmụmụ ihe onwe onye ma ọ bụ nke ezinụlọ n’isiokwu a na abụọ ndị na-eso ya, ị ga-ahụ na ọ bara uru karịsịa ịgụ akụkụ ọ bụla e hotara n’akwụkwọ ozi Jemes ahụ na-ewusi okwukwe ike.
Olee Otú Ị Ga-esi Zaa?
◻ Gịnị ga-enyere anyị aka ịtachi obi n’ọnwụnwa?
◻ N’agbanyeghị ọnwụnwa, n’ihi gịnị ka ndị Kraịst pụrụ iji nyaa isi?
◻ Olee otú anyị pụrụ isi bụrụ ndị na-eme okwu ahụ?
◻ Gịnị ka ofufe dị ọcha na-agụnye?
[Foto dị na peeji nke 9]
Mgbe a na-anwa gị, gosi okwukwe n’ike Jehova ịza ekpere
[Foto ndị dị na peeji nke 10]
“Ndị na-eme okwu ahụ” na-akpọsa Alaeze Chineke n’ụwa nile