Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w97 11/15 p. 13-18
  • Okwukwe Na-akwali Anyị Ime Ihe!

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Okwukwe Na-akwali Anyị Ime Ihe!
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ile Mmadụ Anya n’Ihu na Okwukwe Enweghị Nkwekọ
  • “Ebere Na-anyara Ikpe Isi”
  • Okwukwe Na-arụpụta Ezi Ọrụ
  • Chịkwaa Ire Ahụ!
  • Jiri Amamihe Si n’Elu Bịa Mee Ihe
  • Inwe Okwukwe na Ime Ihe Dị Mma Nwere Ike Ime Ka Anyị Bụrụ Ndị Ezi Omume
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2023
  • Nwee Okwukwe ná Nkwa Ndị Jehova Kwere
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2016
  • Ì Nwere Okwukwe N’ezie N’ozi Ọma Ahụ?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2003
  • Ihe Mere Okwukwe na Amamihe Ji Dị Anyị Mkpa
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
w97 11/15 p. 13-18

Okwukwe Na-akwali Anyị Ime Ihe!

“Ị hụwo na okwukwe [Abraham] sooro ọrụ ya rụkọọ ọrụ, e sitekwara n’ọrụ ahụ mee ka okwukwe ahụ zuo okè.”—JEMES 2:22.

1, 2. Olee otú anyị ga-esi eme omume ma ọ bụrụ na anyị nwere okwukwe?

ỌTỤTỤ ndị na-ekwu na ha nwere okwukwe na Chineke. Ma, ikwu nanị na e nwere okwukwe nwụrụ anwụ dị ka ozu. “Okwukwe, ma ọ bụrụ na o nweghị ọrụ, ọ bụ ihe nwụrụ anwụ n’onwe ya,” ka Jemes onye na-eso ụzọ dere. O kwukwara na Abraham na-atụ egwu Chineke nwere okwukwe nke “sooro ọrụ ya rụkọọ ọrụ.” (Jemes 2:17, 22) Olee ihe okwu ndị dị otú ahụ pụtara maka anyị?

2 Ọ bụrụ na anyị nwere ezi okwukwe, ọ bụghị nanị na anyị ga-ekwere n’ihe anyị na-anụ ná nzukọ ndị Kraịst. Anyị ga-enye ihe àmà nke okwukwe n’ihi na anyị bụ Ndịàmà Jehova na-arụsi ọrụ ike. Ee, okwukwe ga-akwali anyị itinye Okwu Chineke n’ọrụ ná ndụ, ọ ga-akwalikwa anyị ime ihe.

Ile Mmadụ Anya n’Ihu na Okwukwe Enweghị Nkwekọ

3, 4. Olee otú okwukwe kwesịrị isi emetụta ụzọ anyị si emeso ndị ọzọ?

3 Ọ bụrụ na anyị nwere ezi okwukwe na Chineke na Kraịst, anyị agaghị na-ele mmadụ anya n’ihu. (Jemes 2:1-4) Ụfọdụ ndị Jemes degaara akwụkwọ adịghị egosipụta eleghị mmadụ anya n’ihu a chọrọ n’aka ezi ndị Kraịst. (Ndị Rom 2:11) N’ihi ya, Jemes na-ekwu, sị: “Unu [enweghị, NW] okwukwe nke Onyenwe anyị Jisọs Kraịst, bụ́ Onye nwe ebube, n’ile mmadụ anya n’ihu.” Ọ bụrụ na onye ọgaranya na-ekweghị ekwe yi mgbaaka ọlaedo na uwe mara oké mma bịa nzukọ, onye na-ekweghị ekwe bụ ‘ogbenye eyirikwa uwe ruru inyi’ bata, e kwesịrịrịị ịnabata ha abụọ nke ọma, ma a na-egosi ndị bara ọgaranya nlebara anya pụrụ iche. E nyere ha oche ‘n’ebe ọma,’ ebe a gwara ndị ogbenye na-ekweghị ekwe ka ha guzoro ọtọ ma ọ bụ nọdụ n’ala n’ụkwụ mmadụ.

4 Jehova nyere àjà mgbapụta Jisọs Kraịst maka ma ndị ọgaranya ma ndị ogbenye. (2 Ndị Kọrint 5:14) Ya mere, ọ bụrụ na anyị emelaara ndị bara ọgaranya ihe, anyị ga-esi n’okwukwe Kraịst wezụga onwe anyị, bụ́ ‘onye ghọrọ ogbenye ka anyị wee were ogbenye Ya ghọọ ndị ọgaranya.’ (2 Ndị Kọrint 8:9) Ka anyị ghara ịtụ ndị mmadụ n’ihe ọ̀tụ̀tụ̀ ma ọlị n’ụzọ dị otú ahụ—n’ebumnobi ọjọọ nke inye ndị mmadụ nsọpụrụ. Chineke adịghị ele ndị mmadụ anya n’ihu, ma ọ bụrụ na anyị na-ele ndị mmadụ anya n’ihu, anyị ga-abụ “ndị ikpe na-eche echiche ọjọọ.” (Job 34:19) N’inwe ọchịchọ ime ihe na-atọ Chineke ụtọ, anyị agaghị adaba ma ọlị n’ọnwụnwa nke ile mmadụ anya n’ihu ma ọ bụ ‘ịja ihu mmadụ n’ihi uru nke aka anyị.’—Jud 4, 16.

5. Ole ndị ka Chineke họpụtaworo ịbụ “ndị ọgaranya n’okwukwe,” oleekwa otú ndị bara ọgaranya n’ụzọ ihe onwunwe si emekarị omume?

5 Jemes na-eme ka a mata ndị bụ ọgaranya n’eziokwu ma na-agba ume ka e gosi mmadụ nile ịhụnanya n’eleghị mmadụ anya n’ihu. (Jemes 2:5-9) ‘Chineke ahọpụtawo ndị ogbenye ka ha bụrụ ndị ọgaranya n’okwukwe, bụrụkwa ndị nketa nke Alaeze.’ Nke a dị otú ahụ n’ihi na ndị ogbenye na-anakwerekarị ozi ọma ahụ. (1 Ndị Kọrint 1:26-29) Dị ka otu ìgwè, ndị ọgaranya n’ụzọ ihe onwunwe na-emejọ ndị ọzọ n’ihe banyere ụgwọ, ụgwọ ọrụ, na okwu ikpe. Ha na-ekwutọ Kraịst, na-akpagbukwa anyị n’ihi na anyị na-aza aha ya. Ma ka ọ bụrụ mkpebisi ike anyị irube isi ‘n’iwu nke eze anyị,’ bụ́ nke chọrọ ịhụnanya ndị agbata obi—na-ahụ ndị ọgaranya na ndị ogbenye n’anya n’ụzọ hà nhata. (Levitikọs 19:18; Matiu 22:37-40) Ebe nke a bụ ihe Chineke chọrọ, ile mmadụ anya n’ihu bụ ‘ime mmehie.’

“Ebere Na-anyara Ikpe Isi”

6. Olee otú anyị ga-esi bụrụ ndị na-emebi iwu ma ọ bụrụ na anyị emesoghị ndị ọzọ n’ụzọ ebere?

6 Ọ bụrụ na anyị elee ndị mmadụ anya n’ihu n’emeghị ebere, anyị bụ ndị na-emebi iwu. (Jemes 2:10-13) Site n’ịzọhie ụkwụ n’ọnọdụ a, anyị na-aghọ ndị na-emebi iwu nile nke Chineke. Ndị Israel na-akwaghị iko ma bụrụ ndị ohi ghọrọ ndị njehie nke Iwu Mosis. Dị ka ndị Kraịst, a na-ekpe anyị ikpe site ‘n’iwu nke ndị nweere onwe ha’—Israel ime mmụọ nọ n’ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ, na-enwe iwu ya n’ime obi ha.—Jeremaịa 31:31-33.

7. N’ihi gịnị ka ndị nọgidere na-ele mmadụ anya n’ihu na-apụghị ịtụ anya ebere site n’aka Chineke?

7 Ọ bụrụ na anyị na-azọrọ na anyị nwere okwukwe ma nọgide na-ele mmadụ anya n’ihu, anyị nọ n’ihe ize ndụ. Ikpe nke ebere na-adịghị ya ka a ga-ekpe ndị na-adịghị egosi ịhụnanya na ebere. (Matiu 7:1, 2) Jemes na-asị: “Ebere na-anyara ikpe isi.” Ọ bụrụ na anyị anara nduzi nke mmụọ nsọ Jehova site n’igosi ebere ná mmeso anyị nile, a gaghị ama anyị ikpe mgbe a ga-ekpe anyị ikpe. Kama nke ahụ, a ga-emere anyị ebere, ọ ga-esikwa otú ahụ nyaara ikpe emeghị ebere ma ọ bụ amamikpe isi.

Okwukwe Na-arụpụta Ezi Ọrụ

8. Gịnị bụ ọnọdụ onye na-ekwu na ya nwere okwukwe ma o nweghị ọrụ?

8 E wezụga ime ka anyị nwee ịhụnanya ma na-eme ebere, okwukwe na-arụpụta ezi ọrụ ndị ọzọ. (Jemes 2:14-26) N’ezie, okwukwe a na-eme nkwupụta ya nke ọrụ na-adịghị agajeghị ịzọpụta anyị. Ee, anyị apụghị inweta nguzo ezi omume n’ebe Chineke nọ site n’ọrụ nke Iwu ahụ. (Ndị Rom 4:2-5) Jemes na-ekwu banyere ọrụ a kpaliri, ọ bụghị site n’usoro iwu, kama site n’okwukwe na ịhụnanya. Ọ bụrụ na àgwà ndị dị otú ahụ kwaliri anyị, anyị agaghị ekwu nanị okwu na-egosi obiọma maka onye ofufe ibe anyị nọ ná mkpa. Anyị ga-eji ihe onwunwe nyere nwanna nwoke ma ọ bụ nwanna nwanyị gba ọtọ aka ma ọ bụ nke agụụ na-agụ aka. Jemes na-ajụ, sị: ‘Ọ bụrụ na ị gwa nwanna nwoke nọ ná mkpa: Laba n’udo, nyaa ọkụ, rijuokwa afọ ma i nyeghị ya ihe ndị dị mkpa, uru gịnị ka nke ahụ bara?’ Ọ dịghị. (Job 31:16-22) “Okwukwe” dị otú ahụ adịghị ndụ!

9. Gịnị na-egosi na anyị nwere okwukwe?

9 Anyị pụrụ iso ndị Chineke na-akpakọrịta ruo n’ókè ụfọdụ, ma nanị ọrụ ndị sitere n’obi dum pụrụ ịkwado nzọrọ anyị na-azọrọ na anyị nwere okwukwe. Ọ dị mma ma ọ bụrụ na anyị ajụwo nkwenkwe Atọ n’Ime Otu ma kwere na e nwere nanị otu ezi Chineke. Ma, nkwenkwe nanị abụghị okwukwe. “Ndị mmụọ ọjọọ kwekwara,” ha wee “kụja” n’egwu n’ihi na mbibi na-echere ha. Ọ bụrụ na anyị nwere okwukwe n’ezie, ọ ga-akwali anyị ịrụ ọrụ ndị dị ka ikwusa ozi ọma na inye ndị ofufe ibe anyị nọ ná mkpa ihe oriri na uwe oyiyi. Jemes na-ajụ, sị: “Ị̀ na-achọ ka ị mara, gị mmadụ efu [na-ejupụtaghị n’ezi ihe ọmụma Chineke], na okwukwe bụ ihe na-adịghị arụpụta ihe ma ọrụ adịghị ya?” Ee, okwukwe chọrọ ime ihe.

10. N’ihi gịnị ka e ji kpọọ Abraham “nna nke ndị nile kwere”?

10 Okwukwe nna ochie ahụ na-asọpụrụ Chineke bụ́ Abraham kwaliri ya ime ihe. Dị ka “nna nke ndị nile kwere,” a ‘gụrụ ya n’onye ezi omume, mgbe ọ chụrụ Aịsak nwa ya nwoke n’elu ebe ịchụ àjà.’ (Ndị Rom 4:11, 12; Jenesis 22:1-14) Gịnị ma a sị na Abraham enweghị okwukwe na Chineke pụrụ ịkpọlite Aịsak n’ọnwụ ma mezuo nkwa Ya banyere mkpụrụ ga-esite na ya? Mgbe ahụ Abraham agaraghị agbalịwo ịchụ nwa ya nwoke n’àjà. (Ndị Hibru 11:19) Ọ bụ site n’ọrụ nrubeisi nke Abraham ka ‘e mere ka okwukwe ya zuo okè,’ ma ọ bụ ka o zuo ezu. N’ụzọ dị otú ahụ, “e wee mezuo ihe e deworo n’akwụkwọ nsọ [Jenesis 15:6] nke na-asị, Abraham wee kwere okwu Chineke, e wee gụọ ya nye ya n’ezi omume.” Ọrụ Abraham n’ịgbalị ịchụ Aịsak n’àjà mesiri ike ihe Chineke kwuru ná mmalite na Abraham bụ onye ezi omume. Site n’ọrụ nke okwukwe, o gosiri ịhụnanya ya maka Chineke, e wee kpọọ ya “enyi nke Chineke.”

11. Ihe àmà dị aṅaa nke okwukwe ka anyị nwere n’ihe banyere Rehab?

11 Abraham nwapụtara “na a na-esite n’ọrụ gụọ mmadụ n’onye ezi omume, a dịghị esitekwa nanị n’okwukwe.” Nke ahụ bụkwa eziokwu banyere Rehab, bụ́ nwanyị na-akwa iko na Jeriko. ‘E sitekwara n’ọrụ gụọ ya n’onye ezi omume, mgbe ọ kpọbatara ndị ozi [Israel] ahụ, wee zipụ ha n’ụzọ dị iche’ nke mere ka ha gbanahụ ndị Kenean bụ́ ndị iro ha. Tupu o zute ndị nledo Israel, ọ matara Jehova dị ka ezi Chineke, okwu ndị o mesịkwara kwuo na nkwụsị ọ kwụsịrị ịgba akwụna nyere ihe àmà nke okwukwe ya. (Joshua 2:9-11; Ndị Hibru 11:31) Mgbe ihe nlereanya nke abụọ a nke okwukwe e gosiri site n’ọrụ gasịrị, Jemes na-asị: “N’ihi na dị ka ahụ bụ ihe nwụrụ anwụ ma mmụọ adịghị ya, ọbụna otú a okwukwe bụ ihe nwụrụ anwụ ma ọrụ adịghị ya.” Mgbe mmadụ nwụrụ, a dịghị enwe ike ịdị ndụ, ma ọ bụ “mmụọ,” na-adị n’ime ya, ọ dịghịkwa arụzu ihe ọ bụla. Ime nkwupụta efu nke okwukwe yiri nnọọ ihe na-adịghị ndụ na ihe na-abaghị uru dị ka ozu. Otú ọ dị, ọ bụrụ na anyị nwere ezi okwukwe, ọ ga-akwali anyị ime ihe ọma.

Chịkwaa Ire Ahụ!

12. Gịnị ka ndị okenye nọ n’ọgbakọ kwesịrị ime?

12 Ikwu okwu na izi ihe pụkwara inye ihe àmà nke okwukwe, ma e nwere mkpa maka inwe ihe mgbochi. (Jemes 3:1-4) Dị ka ndị ozizi n’ọgbakọ, ndị okenye nwere ibu ọrụ dị arọ na ajụjụ dị ukwuu ha ga-aza Chineke. N’ihi ya, ha kwesịrị iji obi umeala nyochaa nzube na iru eru ha. E wezụga ihe ọmụma na inwe ike, ndị ikom ndị a aghaghị inwe ịhụnanya miri emi maka Chineke na maka ndị kwere ekwe ibe ha. (Ndị Rom 12:3, 16; 1 Ndị Kọrint 13:3, 4) Ndị okenye aghaghị ihiwe ndụmọdụ ha isi n’Akwụkwọ Nsọ. Ọ bụrụ na onye okenye ehie ụzọ n’ozizi ya, ọ bụrụkwa na nke a kpatara ndị ọzọ nsogbu, Chineke ga-esite n’aka Jisọs Kraịst maa ya ikpe. N’ihi ya ndị okenye kwesịrị inwe obi umeala ma na-amụsi ihe ike, na-arapara n’Okwu Chineke n’ikwesị ntụkwasị obi.

13. N’ihi gịnị ka anyị ji asụ ngọngọ n’okwu?

13 Ọbụna ndị na-ezi ihe nke ọma—n’ezie, anyị nile—“na-asụ ngọngọ n’ọtụtụ ihe” n’ihi ezughị okè. Ịsụ ngọngọ n’okwu bụ otu n’ime emezighị emezi na-emekarị, bụrụkwa nke kasị nwee ike imebi ihe. Jemes na-asị: “Ọ bụrụ na onye ọ bụla asụghị ngọngọ n’okwu, onye ahụ bụ nwoke tozuru okè, bụrụkwa onye pụrụ ịkwa ahụ ya dum nga.” N’adịghị ka Jisọs Kraịst, anyị adịghị achịkwa ire anyị n’ụzọ zuru okè. Ọ bụrụ na anyị emee otú ahụ, anyị pụrụ ịchịkwa ihe ndị ọzọ dị anyị n’ahụ. E kwuwerị, bridle na ihe ndị e ji ekonye ha na-eme ka ịnyịnya gaa n’ebe anyị chọrọ, site n’iji ntakịrị ụmara isi ụgbọ eme ihe, a pụrụ ịnyagharị ọbụna nnukwu ụgbọ epeepe ifufe siri ike na-ebugharị dị ka onye isi ụgbọ ahụ si chọọ.

14. Olee otú Jemes si emesi ike mkpa mgbalị dị iji wee chịkwaa ire?

14 Anyị nile aghaghị iji ezi obi kwenye na ezi mgbalị dị mkpa iji chịkwaa ire. (Jemes 3:5-12) E jiri ya tụnyere ịnyịnya, bridle dị nta; otú ahụkwa ka ụmara isi ụgbọ dị ma e jiri ya tụnyere ụgbọ mmiri. Mgbe e jikwa ya tụnyere ahụ mmadụ, ire dị nta, “na-anyakwa isi oké ihe.” Ebe ọ bụ na Akwụkwọ Nsọ mere ka o doo anya na ịnya isi adịghị amasị Chineke, ka anyị chọọ enyemaka ya iji kwụsị ya. (Abụ Ọma 12:3, 4; 1 Ndị Kọrint 4:7) Ka anyị jighachikwa ire anyị mgbe a kpasuru anyị iwe, na-echeta na ọ na-ewe nanị otu mkpakepụ ọkụ iji suo oké ọhịa ọkụ. Dị ka Jemes na-egosi, “ire bụkwa ọkụ” nwere ikike ime ka e bibie ihe dị ukwuu. (Ilu 18:21) Leenụ, ire na-adịghị eguzo n’otu ebe “bụ ụwa ahụ nke ajọ omume”! E jikọtara àgwà ọjọọ nile nke ụwa ajọ omume a na ire a na-achịkwaghị achịkwa. Ọ bụ ya na-akpata ihe na-emebi ihe ndị dị ka nkwutọ na ozizi ụgha. (Levitikọs 19:16; 2 Pita 2:1) Gịnị ka i chere? Okwukwe anyị ó kwesịghị ịkwali anyị ịrụsi ọrụ ike iji chịkwaa ire anyị?

15. Olee mmerụ ahụ ire a na-akwaghị nga pụrụ ịkpata?

15 Ire a na-achịkwaghị achịkwa ‘na-enyezu anyị ntụpọ.’ Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na a nwụde anyị n’ịgha ụgha ugboro ugboro, a pụrụ ịmara anyị dị ka ndị ụgha. Otú ọ dị, olee otú ire na-adịghị eguzo n’otu ebe si ‘afụnwu ihe na-aga dị ka a mụnyere ya ọkụ’? Site n’ime ka ndụ yie otu ihe ọjọọ na-akpata nke ka njọ. Otu ire a na-achịkwaghị achịkwa pụrụ iwetara ọgbakọ dum nsogbu. Jemes na-akpọtụ “Gehena” (NW) aha, bụ́ Ndagwurugwu Hinọm. N’ịbụ nke e jiri mee ihe n’otu oge maka ịchụ ụmụaka n’àjà, ọ ghọrọ ebe a na-eji ọkụ ebibi ihe mkpofu na Jerusalem. (Jeremaịa 7:31) Ya mere Gehena bụ ihe nnọchianya nke ịla n’iyi. N’otu echiche, e ji ike mbibi Gehena akọwa ire na-adịghị eguzo n’otu ebe. Ọ bụrụ na anyị akwaghị ire anyị nga, ọkụ anyị maliteworo pụrụ iripịa anyị onwe anyị. (Matiu 5:22) Ọbụna na a pụrụ ịchụpụ anyị n’ọgbakọ maka ikwutọ mmadụ.—1 Ndị Kọrint 5:11-13.

16. N’ihi ihe ire na-adịghị eguzo n’otu ebe pụrụ imebi, gịnị ka anyị kwesịrị ime?

16 Dị ka ị pụrụ ịmata site n’ịgụ Okwu Chineke, Jehova nyere iwu na mmadụ kwesịrị ido anụmanụ e kere eke n’okpuru ha. (Jenesis 1:28) Emejụwo ụdị ihe nile e kere eke anya. Dị ka ihe atụ, e jiriwo agụ nkwọ ndị a zụrụ azụ chụọ nta. “Ihe na-akpụ akpụ” Jemes na-akpọtụ aha pụrụ ịgụnye ajụala nke ndị na-ara agwọ nwere ike n’ebe ha nọ. (Abụ Ọma 58:4, 5) Mmadụ pụrụ ọbụna ịchịkwa azụ whale, ma dị ka ndị mmadụ na-eme mmehie anyị apụghị imejụ ire anya. Ka o sina dị, anyị kwesịrị izere ikwu okwu mkparị, okwu na-emerụ ahụ, ma ọ bụ nke nkwulu. Ire na-adịghị eguzo n’otu ebe pụrụ ịbụ ngwá ọrụ dị ize ndụ nke jupụtara ná nsí na-egbu egbu. (Ndị Rom 3:13) N’ụzọ dị mwute, ire nke ndị ozizi ụgha chigharịrị ụfọdụ ndị Kraịst oge mbụ pụọ n’ebe Chineke nọ. Ya mere ka anyị ghara ịhapụ onwe anyị mgbe ọ bụla ka okwu na-emerụ ahụ nke ndị si n’ezi ofufe dapụ rikpuo anyị, ma è kwuru ha ekwu ma e dere ha ede.—1 Timoti 1:18-20; 2 Pita 2:1-3.

17, 18. Ekwekọghị ekwekọ dị aṅaa ka e zoro aka na ya na Jemes 3:9-12, gịnịkwa ka anyị kwesịrị ime n’ọnọdụ a?

17 Okwukwe na Chineke na ọchịchọ ime ihe na-atọ ya ụtọ pụrụ ichebe anyị pụọ ná ndapụ n’ezi ofufe, ọ pụkwara igbochi anyị iji ire eme ihe n’ụzọ na-ekwekọghị ekwekọ. N’izo aka n’ebe ekwekọghị ekwekọ nke ụfọdụ ndị dị, Jemes na-ekwu na ‘anyị ji ire na-agọzi Nna anyị, bụ́ Jehova, ma na-abụ ndị mmadụ ọnụ bụ́ ndị e keworo dị ka onyinyo Chineke si dị.’ (Jenesis 1:26) Jehova bụ Nna anyị n’ihi na ọ “na-enye mmadụ nile ndụ, na ume, na ihe nile.” (Ọrụ 17:24, 25) N’echiche ime mmụọ, ọ bụkwa Nna nke ndị Kraịst e tere mmanụ. Anyị nile dị “n’onyinyo Chineke” n’ọdịdị uche na omume, gụnyere ịhụnanya, ikpe ziri ezi, na amamihe nke na-edo anyị iche pụọ n’ebe ụmụ anụmanụ nọ. Ya mere, oleezi otú anyị kwesịrị isi mee omume ma ọ bụrụ na anyị nwere okwukwe na Jehova?

18 Ọ bụrụ na anyị ga-abụ ndị mmadụ ọnụ, nke ahụ ga-apụta na anyị ga-akpọ ha iyi ma ọ bụ kọchaa ha. Ebe ọ bụ na anyị abụghị ndị amụma nwere ike mmụọ nsọ Chineke bụ́ ndị e nyere ike ịkọcha onye ọ bụla, okwu dị otú ahụ ga-abụ ihe àmà nke ịkpọasị nke ga-eme ka ngọzị anyị na-agọzi Chineke bụrụ ihe efu. O kwesịghị ekwesị ka ma ‘ngọzi ma ọbụbụ ọnụ’ site n’otu ọnụ ahụ na-apụta. (Luk 6:27, 28; Ndị Rom 12:14, 17-21; Jud 9) Lee mmehie ọ ga-abụ ịbụ abụ otuto nye Chineke ná nzukọ ma mesịa na-ekwu ihe ọjọọ banyere ndị kwere ekwe ibe anyị! Mmiri na-atọ ụtọ na mmiri na-elu ilu apụghị isite n’otu isi iyi na-asụpụta. Dị ka ‘osisi fig na-apụghị ịmị olive ma ọ bụ osisi vine ịmị fig,’ mmiri nnu apụghị ịsụpụta mmiri na-atọ ụtọ. E nwere ihe dị njọ n’ụzọ ime mmụọ ma ọ bụrụ na anyị, bụ́ ndị kwesịrị ikwu ihe dị mma, anọgide na-ekwu okwu na-emerụ ahụ. Ọ bụrụ na anyị adabawo n’àgwà dị otú ahụ, ka anyị kpee ekpere maka enyemaka Jehova iji kwụsị ikwu okwu n’ụzọ dị otú ahụ.—Abụ Ọma 39:1.

Jiri Amamihe Si n’Elu Bịa Mee Ihe

19. Ọ bụrụ na amamihe sitere n’eluigwe na-eduzi anyị, olee otú anyị pụrụ isi emetụta ndị ọzọ?

19 Amamihe dị anyị nile mkpa iji kwuo okwu ma mee ihe kwesịrị ndị nwere okwukwe. (Jemes 3:13-18) Ọ bụrụ na anyị na-atụ Chineke egwu nsọpụrụ, ọ na-enye anyị amamihe sitere n’eluigwe, ikike iji ihe ọmụma mee ihe n’ụzọ ziri ezi. (Ilu 9:10; Ndị Hibru 5:14) Okwu ya na-akụziri anyị ụzọ isi gosipụta “ịdị nwayọọ nke amamihe.” N’ihi na anyị dịkwa nwayọọ, anyị na-akwalite udo ọgbakọ. (1 Ndị Kọrint 8:1, 2) Ndị ọ bụla na-anya isi banyere ịbụ oké onye nkụzi nke ndị kwere ekwe ibe ha ‘na-ekwukwa okwu ụgha megide eziokwu ndị Kraịst,’ bụ́ nke na-akatọ ịchọ otuto efu ha. (Ndị Galetia 5:26) “Amamihe” ha bụ “nke ụwa”—nke e ji mara ụmụ mmadụ bụ ndị mmehie e kewapụrụ n’ebe Chineke nọ. Ọ bụ “nke mkpụrụ obi mmadụ na-achị,” ebe ọ bụ ihe echiche anụ ahụ na-arụpụta. Leenụ, ọbụna na ọ bụ “ihe ndị mmụọ ọjọọ na-ezi,” n’ihi na ndị ajọ mmụọ dị nganga! (1 Timoti 3:6) Ya mere ka anyị jiri amamihe na ịdị umeala n’obi mee ihe ka anyị ghara ime ihe ọ bụla iji kpata ọnọdụ ebe ‘omume na-adịghị mma’ dị otú ahụ dị ka nkwutọ na ile mmadụ anya n’ihu pụrụ itolite.

20. Olee otú ị pụrụ isi kọwaa amamihe sitere n’eluigwe?

20 “Amamihe ahụ nke si n’elu bịa buru ụzọ dị ọcha,” na-eme ka anyị dị ọcha n’omume na n’ime mmụọ. (2 Ndị Kọrint 7:11) “Ọ dị udo,” na-akwali anyị ịgbaso udo. (Ndị Hibru 12:14) Amamihe sitere n’eluigwe na-eme ka anyị “nwee obiọma,” ọ bụghị ikwesi olu ike ma bụrụ ndị o siri ike iso mekọọ ihe. (Ndị Filipaị 4:5) Amamihe si n’elu bịa “na-ekwenye okwu nke ọma,” na-akwalite nrubeisi nye izi ihe Chineke na iso nzukọ Jehova na-arụkọ ọrụ. (Ndị Rom 6:17) Amamihe si n’elu bịa na-emekwa ka anyị jupụta n’ebere, nweekwa ọmịiko. (Jud 22, 23) N’ịbụ nke jupụtara ná “mkpụrụ nke ezi omume,” ọ na-akpalite nchegbu maka ndị ọzọ nakwa omume ndị kwekọrọ n’ịdị mma, ezi omume, na eziokwu. (Ndị Efesọs 5:9) Dịkwa ka ndị na-eme udo, anyị nwere “mkpụrụ nke ezi omume” nke na-eto nke ọma n’okpuru ọnọdụ dị n’udo.

21. Dị ka Jemes 2:1–3:18 si ekwu, olee ihe ndị okwukwe anyị nwere na Chineke kwesịrị ịkwali anyị ime?

21 Mgbe ahụ, o doro anya na okwukwe na-akwali anyị ime ihe. Ọ na-eme ka anyị ghara ile mmadụ anya n’ihu, na-eme ebere, na-arụsikwa ezi ọrụ ike. Okwukwe na-enyere anyị aka ịchịkwa ire na iji amamihe sitere n’eluigwe eme ihe. Ma ihe anyị pụrụ ịmụta n’akwụkwọ ozi a agwụbeghị. Jemes nwekwuru ndụmọdụ pụrụ inyere anyị aka ịkpa àgwà n’ụzọ kwesịrị ndị nwere okwukwe na Jehova.

Olee Otú Ị Ga-esi Zaa?

◻ Gịnị dị njọ n’ile mmadụ anya n’ihu?

◻ Olee njikọ okwukwe na ọrụ nwere?

◻ N’ihi gịnị ka o ji dị oké mkpa ịchịkwa ire?

◻ Gịnị ka amamihe sitere n’eluigwe yiri?

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya