“Ndị Na-eme Okwu ahụ” n’Ọṅụ
“Werekwanụ nwayọọ nara okwu ahụ nke a kụworo n’ime unu dị ka n’ubi, nke pụrụ ịzọpụta mkpụrụ obi unu. Ma ghọọnụ ndị na-eme okwu ahụ, unu abụkwala ndị na-anụ nanị.”—JEMES 1:21, 22.
1. Olee otú a gaje isi lee isiokwu anyị dịịrị afọ 1996 anya?
“GHỌỌNỤ NDỊ NA-EME OKWU AHỤ.” Okwu a dị mfe bu ozi dị ike. E si n’ime “Akwụkwọ Ozi nke Jemes” dị na Bible weta ya, a ga-edepụtakwa ya n’Ụlọ Nzukọ Alaeze nile dị ka isiokwu dịịrị afọ nke Ndịàmà Jehova na 1996 dum.
2, 3. N’ihi gịnị ka o ji kwesị ekwesị na Jemes kwesịrị ide akwụkwọ ozi ahụ na-aza aha ya?
2 Jemes, onye nne ji ya na Onyenwe anyị Jisọs, bụ onye a ma ama n’ọgbakọ ndị Kraịst oge mbụ. N’otu oge mgbe Jisọs bilitesịrị n’ọnwụ, Onyenwe anyị gosiri Jemes onwe ya, mesịakwa gosi ndị ozi nile ọzọ. (1 Ndị Kọrint 15:7) E mesịa, mgbe e si n’ụzọ ọrụ ebube tọhapụ Pita onyeozi n’ụlọ mkpọrọ, ọ gwara ìgwè ndị Kraịst zukọrọnụ, sị: “Kọọrọ Jemes na ụmụnna anyị ihe ndị a.” (Ọrụ 12:17) O yiri ka Jemes, ọ bụ ezie na ya onwe ya abụghị onyeozi, nọrọ n’isi oche nke nzukọ òtù na-achị isi na Jerusalem mgbe ndị ozi na ndị okenye kpebiri na ọ dịghị mkpa ka e bie ndị Jentaịl a tọghatara úgwù. Jemes chịkọtara okwu, e zigakwaara ọgbakọ nile mkpebi ahụ mmụọ nsọ kwadoro.—Ọrụ 15:1-29.
3 N’ụzọ doro anya, ntụgharị uche Jemes nke onye tozuru okè nwere ike dị ukwuu. Ma, o ji obi umeala nakwere na ya onwe ya bụ nanị “ohu nke Chineke na nke Onyenwe anyị Jisọs Kraịst.” (Jemes 1:1) Akwụkwọ ozi ya sitere na mmụọ nsọ bu ụba nke ndụmọdụ na agbamume ọma maka ndị Kraịst taa. E dezuru ya ihe dị ka afọ anọ tupu mwakpo mbụ ndị Rom wakporo Jerusalem site n’aka Ọchịagha Cestius Gallus, mgbe e kwusasịrị ozi ọma ahụ n’ọ̀tụ̀tụ̀ dị ukwuu “n’etiti ihe nile e kere eke nke dị n’okpuru eluigwe.” (Ndị Kọlọsi 1:23) Ha bụ oge ndị siri ike, ndị ohu Jehova makwaara nke ọma na a na-achọ imezu ikpe ya n’isi mba Juu ahụ.
4. Gịnị na-egosi na ndị Kraịst mbụ tụkwasịrị obi nke ukwuu n’Okwu Chineke?
4 Ndị Kraịst ahụ enweworị Akwụkwọ Nsọ Hibru dum na ihe ka ukwuu n’Akwụkwọ Nsọ Grik. Dị ka e gosiri n’ọtụtụ ntụaka ha gaa n’ihe odide ndị bu ụzọ, o doro anya na ndị Kraịst so dee Bible nwere obi ike dị ukwuu n’Okwu Chineke. N’otu aka ahụ, anyị taa nwere mkpa iji obi na-anụ ọkụ mụọ Okwu Chineke ma tinye ya n’ọrụ ná ndụ anyị. Iji tachie obi, ume na obi ike ime mmụọ nke Akwụkwọ Nsọ na-enye dị anyị mkpa.—Abụ Ọma 119:97; 1 Timoti 4:13.
5. N’ihi gịnị ka anyị ji nwee mkpa nduzi pụrụ iche taa, oleekwa ebe anyị ga-achọta ya?
5 Taa ihe a kpọrọ mmadụ na-eguzo n’ụsọ “mkpagbu ukwu . . . nke ihe dị ka ya a ka adịghị site ná mmalite ụwa ruo mgbe a, ee e, ọ gaghị adịkwa ma ọlị.” (Matiu 24:21) Nlanarị anyị dabeere n’inwe nduzi Chineke. Olee otú anyị pụrụ isi nweta nke a? Site n’imeghepụ obi anyị nye nkụzi nile nke Okwu Chineke sitere na mmụọ. Nke a ga-eduga anyị ‘n’ịghọ ndị na-eme okwu ahụ,’ dị ka ndị ohu Jehova na-eguzosi ike n’ihe n’oge ndị gara aga. Anyị aghaghị ịdị uchu n’ịgụ na ịmụ Okwu Chineke ma jiri ya na-eto Jehova.—2 Timoti 2:15; 3:16, 17.
Iji Ọṅụ Na-atachi Obi
6. N’ihi gịnị ka anyị kwesịrị iji nweta ọṅụ n’ịdaba n’ọtụtụ ọnwụnwa?
6 N’imeghe akwụkwọ ozi ya, Jemes hotara ọṅụ, mkpụrụ nke abụọ nke mmụọ Chineke. O dere, sị: “Gụọnụ ya n’ọṅụ nile, ụmụnna m, mgbe ọ bụla unu dabara n’ọnwụnwa dị iche iche; ebe unu maara na nnwapụta nke okwukwe unu na-arụpụta ntachi obi. Ma ka ntachi obi rụzuo ọrụ ya, ka unu wee tozuo okè dịzuokwa mma, bụrụ ndị ọ dịghị ihe ọ bụla fọdụrụ nke unu na-enweghị.” (Jemes 1:2-4; Ndị Galetia 5:22, 23) Olee otú a pụrụ isi kwuo na ọ bụ ‘ọṅụ nile’ ịdaba n’ọtụtụ ọnwụnwa? Ọ dị mma, ọbụna Jisọs kwuru n’Ozizi Elu Ugwu ya, sị: “Ngọzi na-adịrị unu mgbe ọ bụla ha na-ata unu ụta, na-esogbukwa unu, na-ekwukwa ajọ ihe nile dị iche iche megide unu n’okwu ụgha, n’ihi m. Ṅụrịanụ ọṅụ, ka obi tọọkwa unu ụtọ nke ukwuu: n’ihi na ụgwọ ọrụ unu dị ukwuu n’eluigwe.” (Matiu 5:11, 12) E nwere afọ ojuju na-enye ọṅụ n’ịhụ ngọzi Jehova ná mgbalị anyị ka anyị na-aga n’ihu iru ihe mgbaru ọsọ nke ndụ ebighị ebi.—Jọn 17:3; 2 Timoti 4:7, 8; Ndị Hibru 11:8-10, 26, 35.
7. (a) Olee otú a pụrụ isi nyere anyị aka ịtachi obi? (b) Dị ka Job, olee otú a pụrụ isi akwụghachi anyị ụgwọ?
7 Jisọs n’onwe ya tachiri obi “n’ihi ọṅụ e debere n’ihu Ya.” (Ndị Hibru 12:1, 2) Site n’ilegide ihe nlereanya obi ike nke Jisọs anya, anyị pụkwara ịtachi obi! Dị ka Jemes hotara ná ngwụsị nke akwụkwọ ozi ya, Jehova na-akwụghachi ndị na-eguzosi ike n’ezi ihe n’ụba. “Lee, anyị na-akpọ ha ndị ngọzi dịịrị, bụ́ ndị tachiri obi,” ka Jemes na-ekwu. “Unu nụrụ ihe banyere ntachi obi nke Job, hụkwa ihe Onyenwe anyị zubere, na Onyenwe anyị bụ onye nwere ọmịiko hie nne, nweekwa obi ebere.” (Jemes 5:11) Cheta otú e si kwụghachi ikwesị ntụkwasị obi Job ụgwọ mgbe e weghachiri ya gaa n’ezi ahụ ike na ịnụrụ ụtọ ndụ juru eju, nke obi ụtọ ya na ndị ọ hụrụ n’anya. Ntachi obi ná nguzosi ike n’ezi ihe pụrụ iwetara gị nṅụrị ọṅụ dị otú ahụ na Paradaịs e kwere ná nkwa nke ụwa ọhụrụ Chineke, dị ka mmezu nke ọṅụ nke ijere Jehova ozi kpọmkwem ugbu a.
Ịchọ Amamihe
8. Olee otú anyị pụrụ isi chọta ezi amamihe dị irè, oleekwa òkè ekpere na-ekere na nke a?
8 Anyị iji ịdị uchu na-amụ Okwu Chineke, ya na itinye ya n’ọrụ n’ụzọ dị irè, ga-arụpụta amamihe Chineke, na-eme ka anyị nwee ike ịtachi obi n’ọnwụnwa n’etiti ịrụ arụ nke usoro ihe Setan nke na-anwụ anwụ. Olee otú anyị pụrụ isi jide n’aka na anyị ga-enweta amamihe dị otú ahụ. Jemes na-agwa anyị, sị: “Ọ bụrụ na amamihe fọdụụrụ onye ọ bụla n’ime unu inwe, ya rịọ n’aka Chineke, Onye na-enye mmadụ nile n’afọ ofufo, n’ataghịkwa ụta; a ga-ewerekwa ya nye ya. Ma ya rịọ n’okwukwe, ghara inwe obi abụọ: n’ihi na onye nwere obi abụọ yiri ebili mmiri nke oké osimiri mgbe ifufe na-efegharị ya, a na-atụlikwa ya elu.” (Jemes 1:5, 6) Anyị kwesịrị ikpe ekpere n’ịnụ ọkụ n’obi, site ná nchekwube na-adịghị ada ada nke na Jehova ga-anụ arịrịọ anyị nakwa na ọ ga-aza ha n’oge na n’ụzọ nke aka ya.
9. Olee otú Jemes si kọwaa amamihe Chineke na itinye ya n’ọrụ?
9 Amamihe Chineke bụ onyinye sitere n’aka Jehova. N’ịkọwa onyinye dịgasị otú ahụ, Jemes na-asị: “Ezi onyinye ọ bụla na ihe ọ bụla zuru okè nke e nyere enye si n’elu bịa, ebe o si n’aka Nna nke ìhè rịdata, Onye ọghịgha ọ bụla na-apụghị ịdị n’ebe Ọ nọ, ma ọ bụ onyinyo nke nchigharị na-eweta.” E mesịa n’akwụkwọ ozi ya, Jemes kọwara ihe na-esite n’inweta ezi amamihe mgbe ọ na-asị: “Ònye bụ onye amamihe nke na-aghọtakwa ihe n’etiti unu? ya site n’ibi obi ọma ya gosi ọrụ ya nile n’ime ịdị nwayọọ nke amamihe. . . . Amamihe ahụ nke si n’elu bịa buru ụzọ dị ọcha, e mesịa ọ dị udo, nwee obi ọma, na-ekwenye okwu nke ọma, jupụta n’ebere na ezi mkpụrụ, n’enweghị obi abụọ, n’enweghị ihu abụọ.”—Jemes 1:17; 3:13-17.
10. Olee otú okpukpe ụgha si dị iche n’ebe nke ezigbo ya dị?
10 N’alaeze ụwa nke okpukpe ụgha, ma ọ̀ bụ na Krisendọm ma ọ̀ bụ n’ala ndị ọzọ, ọ na-abụkarị omenala ka ndị na-efe ofufe na-ekwe ukwe ụfọdụ, na-ege ntị n’ekpere okwu nkwughachi, na ma eleghị anya nụ otu okwu. Ọ dịghị agbamume a na-enye maka ịkpọsa ozi olileanya, n’ihi na ihe ka n’ọnụ ọgụgụ n’okpukpe nile adịghị atụ anya ihe ọma ọ bụla maka ọdịnihu. Olileanya dị ebube nke Alaeze Mesaịa nke Chineke adịghị mgbe a na-ehota ya ma ọ bụ ọ bụrụ nke a ghọtahiere kpam kpam. Jehova na-ekwu n’ụzọ amụma banyere ndị na-eso Krisendọm na-akpakọrịta, sị: “Ihe ọjọọ abụọ ka ndị m meworo; Mụ ka ha hapụworo, bụ́ isi iyi nke mmiri na-enye ndụ, ka ha wee gwuwaara onwe ha olulu mmiri dị iche iche, bụ́ olulu mmiri tipuru etipu, nke na-anagideghị mmiri.” (Jeremaịa 2:13) Ha enweghị mmiri eziokwu ọ bụla. Amamihe si n’eluigwe dị ụkọ.
11, 12. (a) Olee otú amamihe Chineke kwesịrị isi kwalie anyị? (b) Banyere gịnị ka amamihe Chineke na-adọ anyị aka ná ntị?
11 Lee ka ihe si dị iche n’etiti Ndịàmà Jehova taa! Site n’ume dị ukwuu Chineke na-enye, ha ji ozi ọma nke Alaeze Ya na-abịanụ na-awụju ụwa ka mmiri. Amamihe nke ha na-ekwupụta daberesiri ike n’Okwu Chineke. (Tụlee Ilu 1:20; Aịsaịa 40:29-31.) N’ezie, ha na-eji ezi ihe ọmụma na nghọta akpọsa nzube ukwu nile nke Chineke na Onye Okike anyị n’ụzọ dị irè. O kwesịrị ịbụ ọchịchọ anyị ka ndị nile nọ n’ọgbakọ “jupụta ná mmazu nke ihe [Chineke] na-achọ n’ime amamihe na nghọta nile nke Mmụọ Nsọ.” (Ndị Kọlọsi 1:9) Site n’inwe ntọala nke a, ma ụmụaka ma ndị okenye ga-abụ ndị a kpaliri mgbe nile ‘ịghọ ndị na-eme okwu ahụ.’
12 “Amamihe ahụ nke si n’elu bịa” na-adọ anyị aka ná ntị banyere mmehie ndị pụrụ iduba ná nkatọ Chineke. “Unu matara nke a, ụmụnna m ndị m hụrụ n’anya,” ka Jemes na-ekwu. “Ka mmadụ ọ bụla bụrụ onye na-anụ ihe ọsọ ọsọ, onye na-adịghị ngwa ikwu okwu, na-adịghịkwa ngwa iwe iwe: n’ihi na iwe mmadụ adịghị arụ ọrụ ezi omume Chineke.” Ee, anyị aghaghị ime ọsọ ọsọ, na-anụ ọkụ, ige ntị na ndụmọdụ Chineke ma tinye ya n’ọrụ. Otú ọ dị, anyị aghaghị ịnọ na nche megide iji “ihe nta” ahụ, bụ́ ire, mee ihe na-ezighị ezi. Site n’itu ọnụ, asịrị amamihe na-adịghị na ya, ma ọ bụ okwu echiche onwe onye, ire pụrụ n’ụzọ ihe atụ ime ka “oké ọhịa” nwuru ọkụ. Ya mere ọ dị anyị mkpa ịzụlite ịdị ụtọ na njide onwe onye ná mkpakọrịta nile anyị.—Jemes 1:19, 20; 3:5.
13. N’ihi gịnị ka o ji dị mkpa na anyị naara ‘okwu ahụ nke a kụworo n’ime anyị dị ka n’ubi’?
13 “N’ihi nke a,” ka Jemes na-ede, “tụpụnụ unyi nile na njubiga ókè nile nke ihe ọjọọ, werekwanụ nwayọọ nara okwu ahụ nke a kụworo n’ime unu dị ka n’ubi, nke pụrụ ịzọpụta mkpụrụ obi unu.” (Jemes 1:21) Ụwa a nke anyaukwu, ya na ụzọ ndụ ya nke ime ngosi, ịhụ ihe onwunwe n’anya, na nke ibu ndị ọzọ ụzọ na omume ndị retọrọ eretọ, na-achọ ịgabiga. “Ma onye na-eme ihe Chineke na-achọ na-anọgide ruo mgbe ebighị ebi.” (1 Jọn 2:15-17) Ya mere, lee ka o si dị mkpa na anyị nakweere “okwu ahụ nke a kụworo n’ime [anyị] dị ka n’ubi”! Amamihe nke Okwu Chineke na-enye dịpụrụ nnọọ iche n’ihe ọjọọ nke ụwa a na-anwụ anwụ. Anyị achọghị nke ọ bụla n’ihe ọjọọ ahụ. (1 Pita 2:1, 2) Ọ dị anyị mkpa ịhụ na a kụnyere ịhụnanya maka eziokwu ahụ na okwukwe dị ike n’ime obi anyị, ka anyị wee kpebisie ike na ọ dịghị mgbe anyị ga-akpapụ pụọ n’ụzọ ezi omume Jehova. Ma ò zuola ịnụ Okwu Chineke?
Ịghọ “Ndị Na-eme Okwu Ahụ”
14. Olee otú anyị pụrụ isi bụrụ ma “ndị na-anụ” ma “ndị na-eme” Okwu ahụ?
14 Na Jemes 1:22 anyị na-agụ, sị: “Ghọọnụ ndị na-eme okwu ahụ, unu abụkwala ndị na-anụ nanị, ndị na-arafu onwe ha.” “Ghọọnụ ndị na-eme okwu ahụ”! E mere ka isiokwu a pụta ìhè n’ezie n’akwụkwọ ozi Jemes. Anyị aghaghị ịṅa ntị wee mee “otú a”! (Jenesis 6:22) Ọtụtụ ndị taa na-azọrọ na o zuwo ịnụ okwuchukwu ma ọ bụ ikere òkè n’ofufe a haziri ahazi site n’oge ruo n’oge, ma ọ gwụla ihe ha na-eme. Ha pụrụ iche na ọ bụrụhaala na ha na-ebi ‘ndụ ọma’ dị ka ụkpụrụ ha si dị, nke ahụ ezuwo. Ma Jisọs Kraịst kwuru, sị: “Ọ bụrụ na onye ọ bụla achọọ ka o soo m n’azụ, ya jụ onwe ya, buliekwa [osisi ịta ahụhụ, NW] ya, na-esokwa m.” (Matiu 16:24) N’ụzọ doro anya a chọrọ ihe omume nke iji onwe onye achụ àjà na ntachi obi n’ịgbaso ihe ilereanya Jisọs nke ime uche Chineke n’aka ezi ndị Kraịst. Nye ha, uche Chineke taa bụ otu ihe ahụ ọ bụ na narị afọ mbụ mgbe Jisọs e si n’ọnwụ kpọlite nyere iwu, sị: “Ya mere, gaanụ, mee mba nile ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ m.” (Matiu 28:19) Olee otú i si na-eme n’akụkụ nke a?
15. (a) Olee ihe atụ Jemes nyere, na-egosi ụzọ anyị pụrụ isi bụrụ ndị nwere obi ụtọ dị ka “ndị na-eme okwu ahụ”? (b) N’ihi gịnị ka ofufe a haziri ahazi na-ezughị ezu?
15 Ọ bụrụ na anyị anọgide na-enyocha n’Okwu Chineke, ọ pụrụ ịdị ka enyo n’igosi anyị kpọmkwem ụdị onye anyị bụ. Jemes na-asị: “Onye nyochaworo n’ime iwu zuru okè, bụ́ iwu nke inwe onwe ya, nke na-anọgidekwa otú a, ghara ịghọ onye na-anụ anụ nke na-echezọ, kama ọ bụ onye na-eme eme nke na-arụ ọrụ, onye a ga-abụ onye ngọzi n’omume ya.” (Jemes 1:23-25) Ee, ọ ga-abụ ‘onye na-eme okwu ahụ’ n’obi ụtọ. Ọzọkwa, ọ dị mkpa ịbụ ‘onye na-eme eme’ n’akụkụ ọ bụla nke ndụ ndị Kraịst anyị. Anyị ekwesịghị ịghọ onwe anyị aghụghọ mgbe ọ bụla iche na nanị ofufe a haziri ahazi zuru ezu. Jemes na-adụ anyị ọdụ idebe akụkụ ụfọdụ nke ezi ofufe nke ọbụna ndị Kraịst na-anụ ọkụ n’obi pụrụ ilegharawo anya. Ọ na-ede, sị: “Okpukpe Chineke nke dị ọcha nke a na-emerụghịkwa emerụ n’ihu Chineke anyị, bụ́ Nna anyị, bụ nke a, ileta ụmụ mgbei na ndị inyom di ha nwụrụ n’ime mkpagbu ha, na idebe onwe ya n’enweghị ntụpọ site n’ụwa.”—Jemes 1:27.
16. N’ụzọ dịgasị aṅaa ka Abraham ghọrọ “enyi nke Chineke,” oleekwa ụzọ anyị pụrụ isi nweta ọbụbụ enyi Ya?
16 O zughị ezu nanị ịsị, ‘Ekwenyere m na Chineke,’ ma hapụzie okwu otú ahụ. Dị ka Jemes 2:19 rịbara ama: “Gị onwe gị kwere na Chineke bụ otu; ị na-eme nke ọma: ndị mmụọ ọjọọ kwekwara, wee kụja.” Jemes kwusiri ike na “okwukwe, ma ọ bụrụ na o nweghị ọrụ, ọ bụ ihe nwụrụ anwụ n’onwe ya,” zookwa aka n’Abraham, na-asị: “Okwukwe ya soro ọrụ ya rụkọọ ọrụ, e sitekwara n’ọrụ ahụ mee ka okwukwe ahụ zuo okè.” (Jemes 2:17, 20-22) Ọrụ Abraham gụnyere inye ndị obodo ya ahụ efe, ile ọbịa nke ọma, ịkwadebe ịchụ Aịsak n’àjà, na ‘ime nkwupụta ihu ọha’ nke okwukwe a na-apụghị ịkwa aka ná nkwa Chineke nke “obodo ahụ nke nwere ntọala ahụ, nke Chineke bụ onye ọkà ya na onye rụrụ ya,” bụ́ Alaeze Mesaịa ahụ dị n’ihu. (Jenesis 14:16; 18:1-5; 22:1-18; Ndị Hibru 11:8-10, 13, 14; 13:2) N’ụzọ kwesịrị ekwesị, ‘a kpọrọ Abraham enyi nke Chineke.’ (Jemes 2:23) A pụkwara ịkpọ anyị onwe anyị ‘ndị enyi Jehova’ ka anyị na-akpọsasi okwukwe na olileanya anyị ike n’Alaeze ezi omume ya na-abịanụ.
17. (a) N’ihi gịnị ka e ji ‘gụọ Rehab n’onye ezi omume,’ e sikwa aṅaa nye ya ụgwọ ọrụ? (b) Ndepụta dị aṅaa dị ogologo ka Bible na-enye nke ndị ‘ghọrọ ndị na-eme okwu ahụ’? (ch) È si aṅaa nye Job ụgwọ ọrụ, n’ihi gịnịkwa?
17 N’ezie a na-agụ “ndị na-eme okwu ahụ” ná ‘ndị ezi omume site n’ọrụ, ọ bụghị site n’okwukwe nanị.’ (Jemes 2:24) Rehab bụ otu onye tinyere ọrụ n’okwukwe o nwere ‘n’okwu’ ahụ nke ọ nụrụ banyere oké ọrụ nile nke Jehova. O zobere ndị nledo Israel ma nyere ha aka ịgbalaga, o wee kpọkọta ezinụlọ nna ya maka nchebe. Ná mbilite n’ọnwụ, lee ka ọ ga-esi ṅụrịa ịmata na okwukwe ya, nke e ji ọrụ kwado, dubara na ya ịbụ nne ochie nke Mesaịa! (Joshua 2:11; 6:25; Matiu 1:5) Ndị Hibru isi nke 11 na-enye ndepụta dị ogologo nke ndị ọzọ ‘ghọrọ ndị na-eme ihe eme’ n’igosipụta okwukwe ha, a ga-enyekwa ha ụgwọ ọrụ n’ụba. Anyị agaghịkwa echezọ Job, onye n’okpuru ule siri ike kwuru, sị: “Ka aha Jehova bụrụ ihe a gọziri agọzi.” Dị ka anyị rịbawororị àmà, okwukwe na ọrụ ya rụpụtara ụgwọ ọrụ dị ebube. (Job 1:21; 31:6; 42:10; Jemes 5:11) N’otu aka ahụ, ntachi obi anyị taa dị ka “ndị na-eme okwu ahụ” ga-eweta ihu ọma Jehova.
18, 19. Olee otú ụmụnna a kpagbuworo eri ogologo oge siworo ‘ghọọ ndị na-eme okwu ahụ,’ ngọzi dịkwa aṅaa ka ọrụ ha wetaworo?
18 N’etiti ndị tachiworo obi nke ukwuu n’ọtụtụ afọ e nwere ụmụnna anyị n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ Europe. Ugbu a e wepụworo ọtụtụ ihe mgbochi, ndị a n’ezie ‘aghọwo ndị na-eme okwu ahụ’ n’ọnọdụ ọhụrụ ha. Ndị ozi ala ọzọ na ndị ọsụ ụzọ si n’ala ndị agbata obi ha akwabawo iji nye aka ná nkụzi na nhazi. Alaka Finland na alaka ndị ọzọ dị nso nke Watch Tower Society ezigawo ndị bụ ọkà n’iwu ihe, òtù ụmụnna zuru ụwa ọnụ nke ndị na-emesapụ aka enyewokwa ego maka owuwu nke alaka ụlọ ọrụ na Ụlọ Nzukọ Alaeze ndị ọhụrụ.—Tụlee 2 Ndị Kọrint 8:14, 15.
19 Lee ka ụmụnna ahụ a kpagbuworo eri ogologo oge si jiri ịnụ ọkụ n’obi zaghachi n’ubi! Ha ‘na-arụsi ọrụ ike, na-agbasikwa mgba ike’ iru ebe ibe ha nọ, dị ka a pụrụ isi kwuo ya, n’ohere ndị na-adịghịrị ha “n’oge na-ekwesịghị.” (1 Timoti 4:10; 2 Timoti 4:2) Dị ka ihe atụ, n’April gara aga n’Albania, ebe mkpagbu bụworo nke oké obi ọjọọ, e kesara Akụkọ Alaeze nile a kpọrọ “N’ihi Gịnị Ka Ndụ Ji Jupụta Nnọọ ná Nsogbu” e bubatara nanị n’ime ụbọchị atọ. Nke a bụ ihe magburu onwe ya e ji sochie Ememe Ncheta ọnwụ Jisọs, nke 3,491 mmadụ bịara—nke karịrị nnọọ 538 ndị nkwusa ha na-arụsi ọrụ ike.
20. Gịnị ka ọnụ ọgụgụ ndị bịara Ememe Ncheta n’afọ ndị na-adịbeghị anya na-egosi, oleekwa ụzọ a pụrụ isi nyere ọtụtụ ndị aka?
20 Ala ndị ọzọ atụnyewokwa ụtụ dị mkpa n’ọnụ ọgụgụ ndị bịara Ememe Ncheta, bụ́ nke mụbaworonụ n’afọ ndị na-adịbeghị anya gaa n’ihe karịrị 10,000,000. N’ọtụtụ ebe, ndị ọhụrụ, n’ịbụ ndị e wusiri okwukwe ha ike site n’ịbịa na ikiri Ememe Ncheta ahụ, ‘na-aghọ ndị na-eme okwu ahụ.’ Ànyị pụrụ ịgba ọtụtụ n’ime ndị enyi ọhụrụ a ume iru eru maka ihe ùgwù ahụ?
21. N’ikwekọ n’isiokwu anyị dịịrị afọ, ụzọ dị aṅaa ka anyị kwesịrị ịgbaso, na-enwekwa ihe mgbata n’ọsọ dị aṅaa?
21 Dị ka ndị Kraịst ahụ na-anụ ọkụ n’obi na narị afọ mbụ, na ọtụtụ ndị ọzọ eri mgbe ahụ, ka anyị kpebisie ike ịdọgbu onwe anyị n’ọrụ ‘ịgbakwuru oké ịgba ọsọ ka anyị wee nata ihe a na-agbata’ bụ́ ndụ ebighị ebi, ma nke ahụ ọ̀ ga-abụ n’Alaeze eluigwe ma ọ bụ n’elu ụwa ọ ga-achị. (Ndị Filipaị 3:12-14) O ruru mgbalị ọ bụla anyị tinyere inweta ihe mgbata n’ọsọ ahụ. Nke a abụghị oge ịdaghachi azụ n’ịbụ ndị na-anụ anụ nanị, kama oge kachasị mkpa iji ‘dị ike na-arụkwa ọrụ.’ (Hagaị 2:4; Ndị Hibru 6:11, 12) Ebe anyị ‘narawooro ọkụkụ nke okwu ahụ dị ka n’ubi,’ ka anyị ‘ghọọ ndị ji ọṅụ na-eme okwu ahụ’ ugbu a na ruo mgbe nile ebighị ebi na-abịanụ.
Olee Otú Ị Ga-esi Zaa?
◻ Olee otú anyị pụrụ isi jiri ọṅụ tachie obi?
◻ Gịnị bụ “amamihe nke si n’elu bịa,” oleekwa otú anyị pụrụ isi chụsoo ya?
◻ N’ihi gịnị ka anyị na-aghaghị iji ‘ghọọ ndị na-eme okwu ahụ, ọ bụghị ndị na-anụ nanị’?
◻ Akụkọ dịgasị aṅaa kwesịrị ịkpali anyị ịghọ “ndị na-eme okwu ahụ”?
[Foto dị na peeji nke 17]
Ka anyị onwe anyị kwa megheere ozizi Chineke obi anyị
[Foto dị na peeji nke 18]
A kwụghachiri ikwesị ntụkwasị obi Job ụgwọ site n’iweghachi ya gaa ná ndụ juru eju, nke obi ụtọ ya na ndị ọ hụrụ n’anya