Nọrọ ná Nchebe Dị Ka Akụkụ nke Nzukọ Chineke
“Ụlọ elu dị ike ka aha Jehova bụ: n’ime ya ka onye ezi omume na-agbaba, o wee nọọ n’elu.”—ILU 18:10.
1. Dị ka ekpere Jisọs na-egosi, ọnọdụ dị aṅaa tara akpụ ka ndị Kraịst nọ n’ime ya?
NWA oge tupu ọ nwụọ, Jisọs kpegaara Nna ya nke bi n’eluigwe ekpere n’isi ụmụazụ ya. Site ná nchebara echiche ịhụnanya, ọ sịrị: “Mụ onwe m enyewo ha okwu Gị; ụwa kpọkwara ha asị, n’ihi na ha esiteghị n’ụwa, dị ka Mụ onwe m na-esiteghị n’ụwa. Ekpeghị m ekpere ka I wepụ ha n’ụwa, kama ka I debe ha ka ha pụọ n’aka ajọ onye ahụ.” (Jọn 17:14, 15) Jisọs maara na ụwa ga-abụ ebe dị ize ndụ nye ndị Kraịst. Ọ ga-egosi ịkpọasị o nwere n’ebe ha nọ site n’ịgha ụgha banyere ha na ịkpagbu ha. (Matiu 5:11, 12; 10:16, 17) Ọ ga-abụkwa isi iyi nke omume rụrụ arụ.—2 Timoti 4:10; 1 Jọn 2:15, 16.
2. Ebee ka ndị Kraịst pụrụ ịchọta ebe nchebe ime mmụọ?
2 Ndị mejupụtara ụwa nke ga-akpọ ndị Kraịst asị bụ ndị e wezụgara n’ebe Chineke nọ, bụrụkwa ndị nọ n’okpuru nchịkwa Setan. (1 Jọn 5:19) Ụwa a buru nnọọ ibu karịa ọgbakọ ndị Kraịst, Setan n’onwe ya dịkwa nnọọ ike karịa mmadụ ọ bụla. N’ihi ya, ịkpọasị nke ụwa bụ ihe iyi egwu n’ezie. Olee ebe ụmụazụ Jisọs pụrụ ịchọta nchebe ime mmụọ? Okwu dị ná mbipụta Ụlọ Nche nke December 1, 1922 (Bekee) tụrụ aro azịza ya: “Anyị nọ ugbu a n’ụbọchị ọjọọ. Ọgụ ebirila ọkụ n’etiti nzukọ Setan na nzukọ Chineke. Ọ bụ ọgụ siri oké ike.” N’agha a, nzukọ Chineke bụ ebe nchebe ime mmụọ. Gịnịzi bụ nzukọ a? Oleekwa otú anyị pụrụ isi nweta nchebe na ya?
Nzukọ Jehova
3, 4. (a) Dị ka otu akwụkwọ ọkọwa okwu na Ụlọ Nche si kwuo, gịnị bụ nzukọ? (b) N’echiche dị aṅaa ka a pụrụ ịkpọ òtù zuru mba nile nke Ndịàmà Jehova nzukọ?
3 Nzukọ bụ “òtù a haziri ahazi,” dị ka Concise Oxford Dictionary si kọwaa ya. N’iburu nke ahụ n’uche, anyị na-aghọta na ebe ọ bụ na ndị ozi haziri ndị Kraịst nke narị afọ mbụ gaa n’ọgbakọ dị iche iche n’okpuru nlekọta nke òtù na-achị isi nọ na Jerusalem, o kwesịrị ekwesị ikwu banyere “òtù ndị bụ ụmụnna” ahụ dị ka nzukọ. (1 Pita 2:17) Ndịàmà Jehova taa nwere ụdị nzukọ yiri nke ahụ. “Onyinye n’ụdị mmadụ,” (NW) dị ka “ndị na-azụ atụrụ Chineke na ndị ozizi” mere ka ịdị n’otu nke òtù narị afọ mbụ ahụ sie ike. Ụfọdụ n’ime ndị a mere njem site n’ọgbakọ gaa n’ọgbakọ, ebe ndị ọzọ bụ ndị okenye n’ọgbakọ dị n’ógbè ha. (Ndị Efesọs 4:8, 11, 12; Ọrụ 20:28) “Onyinye” ndị yiri nke ahụ na-eme ka ịdị n’otu nke Ndịàmà Jehova sie ike taa.
4 Mbipụta Ụlọ Nche nke November 1, 1922, (Bekee) kwuru banyere okwu ahụ bụ́ “nzukọ”: “Nzukọ bụ òtù ndị mmadụ maka nzube nke imezu ihe e mere atụmatụ ya.” Ụlọ Nche ahụ gara n’ihu na-akọwa na ịkpọ Ndịàmà Jehova nzukọ emeghị ha “ịrọ òtù n’echiche nke a na-eji okwu ahụ eme ihe, kama ọ pụtara nanị na Ndị Mmụta Bible [Ndịàmà Jehova] na-agbalịsi ike imezu nzube Chineke, na-emekwa ya dị ka Onyenwe anyị na-eme ihe ọ bụla, n’ụzọ dị n’usoro.” (1 Ndị Kọrint 14:33) Pọl onyeozi gosiri na ndị Kraịst nọ n’oge ya mekwara ihe n’usoro. O ji nzụkọ ndị Kraịst e tere mmanụ tụnyere ahụ mmadụ, bụ́ nke nwere ọtụtụ akụkụ, nke ọ bụla ana-arụzu ọrụ e kenyere ya ka ahụ wee nwee ike ịrụ ọrụ nke ọma. (1 Ndị Kọrint 12:12-26) Nke ahụ bụ ihe atụ magburu onwe ya nke ihe bụ nzukọ! N’ihi gịnị ka e ji hazie ndị Kraịst? Iji jee ozi maka “nzube Chineke,” iji mee uche Jehova.
5. Gịnị bụ nzukọ a na-ahụ anya nke Chineke?
5 Bible buru amụma na ezi ndị Kraịst taa ga-adị n’otu, na a ga-achịkọta ha n’otu “ala” dị ka otu “mba,” ebe ha ga “na-enye ìhè n’ụwa.” (Aịsaịa 66:8; Ndị Filipaị 2:15) “Mba” a a haziri ahazi agafewo nde mmadụ ise na ọkara ugbu a. (Aịsaịa 60:8-10, 22) Otú ọ dị, nke ahụ abụghị nanị ókè nzukọ Chineke hà. Ndị mmụọ ozi sokwa na ya.
6. N’echiche ya kasị saa mbara, olee ndị mejupụtara nzukọ Chineke?
6 E nwere ọtụtụ ihe atụ nke ndị mmụọ ozi isoro ndị ohu Chineke bụ́ mmadụ na-arụkọ ọrụ. (Jenesis 28:12; Daniel 10:12-14; 12:1; Ndị Hibru 1:13, 14; Mkpughe 14:14-16) Ya mere, n’ụzọ dabara adaba, mbipụta Ụlọ Nche nke May 15, 1925 (Bekee) sịrị: “Ndị mmụọ ozi nile dị nsọ bụ akụkụ nke nzukọ Chineke.” Tụkwasị na nke ahụ, ọ sịrị: “N’isi nke nzukọ Chineke, na-enwe ike nile, [ka] Onyenwe anyị bụ́ Jisọs Kraịst [nọ].” (Matiu 28:18) N’ihi ya, n’echiche ya kasị saa mbara, ndị nile nọ n’eluigwe na n’elu ụwa bụ́ ndị na-arụkọ ọrụ ọnụ ime uche Chineke mejupụtara nzukọ Chineke. (Lee igbe.) Lee ihe ùgwù magburu onwe ya ọ bụ ịbụ akụkụ nke a! Leekwa ihe ọṅụ ọ bụ ilepụ anya n’oge mgbe ihe nile e kere eke dị ndụ, n’elugiwe na n’elu ụwa, ga-abụ ndị a haziri ito Jehova Chineke n’ịdị n’otu! (Mkpughe 5:13, 14) Ma, olee nchebe nke nzukọ Chineke na-enye taa?
Ịbụ Ndị E Chebere ná Nzukọ Chineke—N’ụzọ Dị Aṅaa?
7. N’ụzọ dị aṅaa ka nzukọ Chineke si echebe anyị?
7 Nzukọ Chineke pụrụ inye aka ichebe anyị pụọ n’ebe Setan na aghụghọ ya nile dị. (Ndị Efesọs 6:11) Setan na-arụgide, na-akpagbu, ma na-anwa ndị na-efe Jehova ofufe ọnwụnwa na-eburu nanị otu nzube n’obi: ịdọpụ ha ‘n’ụzọ ha ga-ejeso.’ (Aịsaịa 48:17; tụlee Matiu 4:1-11.) Ọ dịghị mgbe anyị ga-enwe ike izerecha mwakpo ndị ahụ n’usoro ihe a. Otú ọ dị, mmekọrịta chiri anya nke anyị na Chineke na nzukọ ya na-ewusi anyị ike ma na-echebe anyị wee si otú a na-enyere anyị aka ịnọgide ‘n’ụzọ ahụ.’ N’ihi ya, anyị adịghị ahapụ inweta olileanya anyị.
8. Olee otú nzukọ a na-adịghị ahụ anya nke Jehova si akwado ndị ohu ya nọ n’elu ala?
8 Olee otú nzukọ Chineke si enye nchebe a? Nke mbụ, anyị nwere nkwado na-adịghị ada ada nke ndị ohu Jehova bụ́ mmụọ. Mgbe Jisọs nọ n’oké nrụgide, otu mmụọ ozi jeere ya ozi. (Luk 22:43) Mgbe e ji ọnwụ na-eyi ya egwu, otu mmụọ ozi zọpụtara Pita n’ụzọ ọrụ ebube. (Ọrụ 12:6-11) Ọ bụ ezie na e nweghị ọrụ ebube ndị dị otú ahụ taa, e kwere ndị Jehova nkwa nkwado ndị mmụọ ozi n’ọrụ nkwusa ha. (Mkpughe 14:6, 7) Ha na-enwetakarị ọkịka nke ike mgbe ha na-eche ọnọdụ ndị tara akpụ ihu. (2 Ndị Kọrint 4:7) Ọzọkwa, ha maara na “mmụọ ozi nke Jehova na-ama ụlọ ikwuu ya gburugburu ndị na-atụ egwu Ya, o wee dọpụta ha.”—Abụ Ọma 34:7.
9, 10. Olee otú a pụrụ isi kwuo na “ụlọ elu dị ike ka aha Jehova bụ,” oleekwa otú ụkpụrụ a si metụta nzukọ Chineke n’ozuzu ya?
9 Nzukọ Jehova a na-ahụ anya bụkwa ihe nchebe. N’ụzọ dị aṅaa? N’Ilu 18:10, anyị na-agụ, sị: “Ụlọ elu dị ike ka aha Jehova bụ: n’ime ya ka onye ezi omume na-agbaba, o wee nọọ n’elu.” Nke a adịghị enye echiche na nanị ịkpọghachi aha Chineke na-enye nchebe. Kama nke ahụ, anyị ịgbaba n’aha Chineke na-egosipụta na anyị tụkwasịrị Jehova obi. (Abụ Ọma 20:1; 122:4) Ọ pụtara ịkwado ọbụbụeze ya, ịkwalite iwu na ụkpụrụ ya nile, na inwe okwukwe ná nkwa ya. (Abụ Ọma 8:1-9; Aịsaịa 50:10; Ndị Hibru 11:6) Ọ na-agụnye inye Jehova ofufe a na-ekewaghị ekewa. Ọ bụ nanị ndị na-efe Jehova n’ụzọ dị otú a pụrụ ikwu dị ka ọbụ abụ ahụ: “Ọ bụ n’ime [Jehova] ka obi anyị na-aṅụrị ọṅụ, n’ihi na ọ bụ aha nsọ Ya ka anyị tụkwasịworo obi.”—Abụ Ọma 33:21; 124:8.
10 Ugbu a ndị nile nọ ná nzukọ Chineke a na-ahụ anya so Maịka na-asị: “Anyị onwe anyị ga na-ejegharịkwa n’aha Jehova, bụ́ Chineke anyị, ruo mgbe nile ebighị ebi.” (Maịka 4:5) Nzukọ nke oge a bụ nke a chịkọtara gburugburu “Israel nke Chineke,” bụ́ nke a kpọrọ n’ime Bible ‘ndị e wepụtaara aha ya.’ (Ndị Galetia 6:16; Ọrụ 15:14; Aịsaịa 43:6, 7; 1 Pita 2:17) N’ihi ya, ịbụ akụkụ nke nzukọ Jehova pụtara ịbụ akụkụ nke ndị na-achọ, na-anatakwa, nchebe n’aha Chineke.
11. N’ụzọ ndị dị aṅaa kpọmkwem ka nzukọ Jehova si enye ndị bụ akụkụ ya nchebe?
11 Tụkwasị na nke ahụ, nzukọ Chineke a na-ahụ anya bụ òtù ndị nwere okwukwe, òtù ndị kwere ekwe bụ́ ndị na-ewuli ma na-agbarịta ibe ha ume. (Ilu 13:20; Ndị Rom 1:12) Ọ bụ ebe ndị ọzụzụ atụrụ bụ́ ndị Kraịst na-elekọta atụrụ, na-agba ndị ọrịa na ndị dara mbà n’obi ume, ma na-achọ iweghachi ndị daworo ada. (Aịsaịa 32:1, 2; 1 Pita 5:2-4) “Ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche” na-enye “[nri, NW] n’oge ya” site na nzukọ a. (Matiu 24:45) “Ohu” ahụ, nke ndị Kraịst e tere mmanụ mejupụtara, na-enye ezi ihe ime mmụọ ndị kasị mma—ihe ọmụma ziri ezi, nke dabeere na Bible nke pụrụ iduje ná ndụ ebighị ebi. (Jọn 17:3) N’ihi nduzi sitere n’aka “ohu” ahụ, a na-enyere ndị Kraịst aka ịnọgide na-enwe ụkpụrụ omume ndị dị elu nakwa ịbụ “ndị nwere uche dị ka agwọ, ndị na-adịghịkwa aghụghọ dị ka nduru” n’ọnọdụ ndị dị ize ndụ gbara ha gburugburu. (Matiu 10:16) A na-enyekwara ha aka mgbe nile ịbụ ndị “na-arụbiga ọrụ Onyenwe anyị ókè,” nke bụ ihe nchebe dị ike n’onwe ya.—1 Ndị Kọrint 15:58.
Olee Ndị Bụ Akụkụ nke Nzukọ Chineke?
12. Olee ndị e mere ka a mata na ha bụ akụkụ nke nzukọ eluigwe nke Chineke?
12 Ebe ndị bụ akụkụ nke nzukọ Chineke pụrụ inweta nchebe a, olee ndị ka nke a gụnyere? Banyere nzukọ eluigwe, azịza nke ajụjụ a doro anya. Setan na ndị mmụọ ozi ya anọkwaghị n’eluigwe. N’aka nke ọzọ, ndị mmụọ ozi kwesịrị ntụkwasị obi ka nọ n’ebe ahụ ‘ná mgbakọ ọha nke ndị mmụọ ozi nile.’ Jọn onyeozi hụrụ na ná mgbe ikpeazụ “Nwa atụrụ ahụ,” ndị cherub (“ihe anọ ahụ nke dị ndụ”), na “ọtụtụ ndị mmụọ ozi” ga-anọ ocheeze Chineke nso. Ndị okenye 24 ahụ ga-esonyekwara ha—bụ́ ndị na-anọchite anya ndị Kraịst ahụ e tere mmanụ bawororị n’ihe nketa eluigwe ha dị ebube. (Ndị Hibru 12:22, 23; Mkpughe 5:6, 11; 12:7-12) N’ụzọ doro anya ha nile bụ akụkụ nke nzukọ Chineke. Otú ọ dị, n’etiti ndị mmadụ, ihe adịchaghị mfe.
13. Olee otú Jisọs si kọwaa ndị bụ akụkụ nke nzukọ Chineke na ndị na-abụghị?
13 Jisọs kwuru banyere ụfọdụ ndị ga-azọrọ na ha na-agbaso ya, sị: “Ọtụtụ mmadụ ga-asị m n’ụbọchị ahụ, Onyenwe anyị, Onyenwe anyị, ànyị ejighị aha Gị buo amụma, ànyị ejighịkwa aha Gị chụpụ ndị mmụọ ọjọọ, ànyị ejighịkwa aha Gị rụọ ọtụtụ ọrụ dị ike? Ma mgbe ahụ ka M ga-ekwupụtara ha, sị, Ọ dịghị mgbe ọ bụla M maara unu: si n’ebe M nọ pụọ, unu ndị na-arụ ọrụ na-emebi iwu.” (Matiu 7:22, 23) Ọ bụrụ na mmadụ bụ onye na-arụ ọrụ na-emebi iwu, ọ bụtụghị akụkụ nke nzukọ Chineke, n’agbanyeghị ihe ọ na-azọrọ, n’agbanyeghịkwa ebe ọ na-aga efe ofufe. Jisọs gosikwara otú a ga-esi amata onye bụ akụkụ nke nzukọ Chineke. Ọ sịrị: “Ọ bụghị onye ọ bụla nke na-asị m, Onyenwe anyị, Onyenwe anyị, ga-aba n’alaeze eluigwe; kama ọ bụ onye na-eme ihe Nna m Nke bi n’eluigwe na-achọ.”—Matiu 7:21.
14. Olee akụkụ nke ihe Chineke na-achọ a kọwara dị ka ihe ndị bụ akụkụ nke nzukọ Chineke na-aghaghị ime?
14 N’ihi ya, iji bụrụ akụkụ nke nzukọ Chineke—nke “alaeze eluigwe” bụ akụkụ ya bụ́ isi—mmadụ aghaghị ịdị na-eme ihe Chineke na-achọ. Gịnị bụ ihe ọ na-achọ? Pọl mere ka a mata otu akụkụ ya dị mkpa mgbe ọ sịrị: “[Chineke] na-achọ ka a zọpụta mmadụ nile, ka ha bịaruokwa mmazu nke eziokwu.” (1 Timoti 2:4) Ọ bụrụ na mmadụ achọọ n’ezie inweta ezi ihe ọmụma sitere na Bible, itinye ya n’ọrụ ná ndụ ya, nakwa ịkpọsara ya “mmadụ nile,” ọ na-eme ihe Chineke na-achọ. (Matiu 28:19, 20; Ndị Rom 10:13-15) Ọ bụkwa uche Chineke ka a zụọ ma lekọta atụrụ Jehova. (Jọn 21:15-17) Nzukọ ndị Kraịst na-emezu akụkụ dị mkpa ná nke a. Onye ọ bụla nke nweere onwe ya ịga nzukọ ndị ahụ ma leghara ime otú ahụ anya enweghị ekele maka ọnọdụ ya ná nzukọ Chineke.—Ndị Hibru 10:23-25.
Ịbụ Enyi nke Ụwa
15. Olee ịdọ aka ná ntị nke Jemes nyere ọgbakọ ndị nọ n’oge ya?
15 Ihe dị ka afọ 30 mgbe Jisọs nwụchara, onye otu nne ji ya na ya bụ́ Jemes mere ka a mata ihe ụfọdụ pụrụ itinye ọnọdụ mmadụ ná nzukọ Chineke n’ihe ize ndụ. O dere, sị: “Unu ndị na-akwa iko, ùnu amataghị na ịbụ enyi nke ụwa bụ ịbụ onye iro nke Chineke? Ya mere onye ọ bụla nke zubere ịbụ enyi nke ụwa na-edo onwe ya onye iro nke Chineke.” (Jemes 4:4) Onye iro Chineke abụtụghị akụkụ nke nzukọ ya. Gịnịzi bụ ịbụ enyi nke ụwa? A kọwawo ya dị ka ihe dị n’ụdị dị iche iche, dị ka mmadụ ịzụlite ma ọ bụ isonye ná mkpakọrịta ọjọọ. Ọzọkwa, Jemes lekwasịrị anya n’otu ihe kpọmkwem—àgwà uche ndị na-ezighị ezi ndị na-eduga n’omume na-ekwesịghị ekwesị.
16. Gịnị bụ okwu ndị gbara ịdọ aka ná ntị Jemes nke bụ́ na ịbụ enyi nke ụwa bụ ịbụ onye iro nke Chineke gburugburu?
16 Na Jemes 4:1-3, anyị na-agụ: “Olee ebe ibu agha si bịa, olee ebe kwa ịlụ ọgụ si bịa, bụ́ nke dị n’etiti unu? ọ̀ bụghị n’ebe ahụ, bụ́ ihe ụtọ nile unu nke na-ebu agha n’ihe nile dị unu n’ahụ, ka ha si bịa? Agụụ na-agụ unu, ma unu enweghị: unu na-egbu mmadụ, na-ekwokwa ekworo, unu apụghịkwa ịhụ ihe unu chọrọ: unu na-alụ ọgụ, na-ebukwa agha; unu enweghị, n’ihi na unu arịọghị. Unu na-arịọ arịrịọ, ma unu adịghị anata ihe, n’ihi na unu na-arịọ n’obi ọjọọ, ka unu wee mefuo ya n’ihe ụtọ nile unu.” Ọ bụ mgbe o desịrị okwu ndị a ka Jemes dọrọ aka ná ntị megide ịbụ enyi nke ụwa.
17. N’ụzọ dị aṅaa ka e nwere “agha” na “ọgụ” n’ọgbakọ ndị Kraịst na narị afọ mbụ?
17 Ọtụtụ narị afọ mgbe Jemes nwụsịrị, ndị Kraịst ụgha buru agha megide onwe ha ma gburịta onwe ha n’ụzọ nkịtị. Otú ọ dị, Jemes nọ na-edegara ndị òtù “Israel nke Chineke” nke narị afọ mbụ akwụkwọ, bụ́ ndị ga-abụ ‘ndị nchụàjà na ndị eze’ n’eluigwe. (Mkpughe 20:6) Ha egbughị ibe ha n’agha nkịtị. Ya mere gịnị mere Jemes ji kwuo banyere ihe ndị dị otú ahụ n’etiti ndị Kraịst? Jọn onyeozi kpọrọ onye ọ bụla na-akpọ nwanna ya asị ogbu mmadụ. Pọl kwukwara banyere ndịrịta iche n’ọdịdị mmadụ na esemokwu n’ime ọgbakọ dị ka “ịlụ ọgụ” na “ise okwu.” (Taịtọs 3:9; 2 Timoti 2:14; 1 Jọn 3:15-17) N’otu akụkụ a, o doro anya na ihe Jemes bu n’uche—n’ụzọ bụ́ isi, bụ ahụghị ndị Kraịst ibe anyị n’anya. N’etiti onwe ha, ndị Kraịst na-akpa àgwà n’ụzọ yiri otú ndị nọ n’ụwa na-esikarị emeso ibe ha ihe.
18. Gịnị pụrụ iduje n’omume na mmetụta ịhụnanya na-adịghị na ha n’etiti ndị Kraịst?
18 N’ihi gịnị ka ụdị ihe ndị ahụ ji mee n’ọgbakọ ndị Kraịst? N’ihi àgwà ọjọọ, ndị dị ka anyaukwu na “ọchịchọ maka ihe ụtọ.” (NW) Nganga, ekworo, na oké ọchịchọ pụkwara imebi mmekọrịta ịhụnanya ndị Kraịst n’ọgbakọ. (Jemes 3:6, 14) Àgwà ndị dị otú ahụ na-eme mmadụ enyi nke ụwa, sizie otú ahụ bụrụ onye iro nke Chineke. Ọ dịghị onye nwere àgwà ndị yiri ndị ahụ pụrụ ịtụ anya ịnọgide na-abụ akụkụ nke nzukọ Chineke.
19. (a) Ònye n’ụzọ bụ́ isi ka a ga-ata ụta ma ọ bụrụ na onye Kraịst achọpụta na echiche na-ezighị ezi na-agbanye mkpọrọgwụ n’obi ya? (b) Olee otú onye Kraịst pụrụ isi merie echiche na-ezighị ezi?
19 Ònye ka anyị pụrụ ịta ụta ma ọ bụrụ na anyị achọpụta na echiche ọjọọ na-agbanye mkpọrọgwụ n’obi anyị? Ọ̀ bụ Setan? N’ọ̀tụ̀tụ̀ ụfọdụ, ee. Ọ bụ “onyeisi nke ike nke mbara” nke ụwa a, bụ́ ebe àgwà ndị dị otú ahụ jupụtara. (Ndị Efesọs 2:1, 2; Taịtọs 2:12) Otú ọ dị, mkpọrọgwụ nke echiche na-ezighị ezi na-adịkarị n’anụ ahụ anyị na-ezughị okè. Mgbe ọ dọsịrị aka ná ntị megide ịbụ enyi nke ụwa, Jemes dere, sị: “Ùnu na-eche na ihe e deworo n’akwụkwọ nsọ na-ekwu okwu n’efu? Agụụ anyị [ọ̀] na-agụsi Mmụọ ahụ ike n’ụzọ ekworo, bụ́ Mmụọ Nke O mere ka O biri n’ime anyị?” (Jemes 4:5) Anyị nile nwere ọchịchọ a mụnyere n’ime anyị ime ihe ọjọọ. (Jenesis 8:21; Ndị Rom 7:18-20) Otú ọ dị, anyị pụrụ ịlụso ọchịchọ ahụ agha ma ọ bụrụ na anyị ekweta adịghị ike anyị ma na-adabere n’enyemaka Jehova iji merie ha. Jemes na-asị: ‘[Chineke] na-enye amara karịrị [ọchịchọ a mụnyere n’ime anyị inwe anyaụfụ].’ (Jemes 4:6) N’ihi enyemaka mmụọ nsọ Chineke na nkwado nke ụmụnna bụ́ ndị Kraịst, nakwa site n’uru nke àjà mgbapụta Jisọs, adịghị ike nke anụ ahụ ha adịghị emeri ndị Kraịst kwesịrị ntụkwasị obi. (Ndị Rom 7:24, 25) Ha nọ ná nchebe na nzukọ Chineke, bụrụ ndị enyi Chineke, ọ bụghị nke ụwa.
20. Olee ngọzi bara ụba nke ndị bụ akụkụ nke nzukọ Chineke na-enweta?
20 Bible na-ekwe nkwa, sị: “Jehova ga-enye ndị Ya ike; Jehova ga-eji udo gọzie ndị Ya.” (Abụ Ọma 29:11) Ọ bụrụ n’eziokwu na anyị bụ akụkụ nke “mba” Jehova nke oge a, bụ́ nzukọ ya a na-ahụ anya, anyị ga-enweta ike nke ọ na-enye ma nụ ụtọ udo o ji na-agọzi ndị ya. N’eziokwu, ụwa Setan karịrị nnọọ nzukọ Jehova a na-ahụ anya, Setan kakwa anyị ike nke ukwuu. Ma Jehova bụ Onye Pụrụ Ime Ihe Nile. A gaghị emerili ike ọrụ ya. Ndị mmụọ ozi ya dị ike sokwa anyị na-ejere Chineke ozi. N’ihi ya, n’agbanyeghị ịkpọasị anyị na-eche ihu, anyị pụrụ iguzosi ike. Dị ka Jisọs, anyị pụrụ imeri ụwa.—Jọn 16:33; 1 Jọn 4:4.
Ị̀ Pụrụ Ịkọwa?
◻ Gịnị bụ nzukọ a na-ahụ anya nke Chineke?
◻ N’ụzọ ndị dị aṅaa ka nzukọ Chineke si enye nchebe?
◻ Olee ndị bụ akụkụ nke nzukọ Chineke?
◻ Olee otú anyị pụrụ isi zere ịbụ ndị enyi nke ụwa?
[Igbe dị na peeji nke 9]
Gịnị Bụ Nzukọ Chineke?
N’akwụkwọ Ndịàmà Jehova, e ji okwu ahụ bụ́ “nzukọ Chineke” eme ihe n’ụzọ atọ.
1 Nzukọ Jehova nke eluigwe, a na-adịghị ahụ anya nke ihe ndị e kere eke bụ́ mmụọ na-ekwesị ntụkwasị obi mejupụtara. A kpọrọ nke a “Jerusalem dị n’elu” n’ime Bible.—Ndị Galetia 4:26.
2 Nzukọ Jehova a na-ahụ anya, nke mmadụ. Taa, nke a gụnyere ihe fọdụrụnụ e tere mmanụ bụ́ ndị oké ìgwè mmadụ ahụ na-esonyere.
3 Nzukọ eluigwe na ụwa nke Jehova. Taa, ihe mejupụtara nke a bụ nzukọ eluigwe nke Jehova ya na ndị ya e tere mmanụ, ndị e doro dị ka ụmụ n’elu ụwa, bụ́ ndị nwere olileanya ime mmụọ. Ka oge na-aga, ọ ga-agụnyekwa ụmụ mmadụ zuru okè n’elu ụwa.
[Foto dị na peeji nke 10]
A na-enye nri ime mmụọ kasị mma site ná nzukọ Jehova