Ka Jehova Dekọọ Ihe Ọma Banyere Gị
“Chineke m, chetakwara m ihe a . . . Chineke m, cheta m, imere m ezi ihe.”—NEHEMAỊA 13:22, 31.
1. Gịnị na-enyere ndị raara onwe ha nye Chineke aka inye Jehova azịza dị mma banyere onwe ha?
NDỊ ohu Jehova nwere ihe inyeaka nile dị ha mkpa maka inye ya azịza dị mma. N’ihi gịnị? N’ihi na ha na Chineke nwere mmekọrịta chiri anya dị ka akụkụ nke nzukọ elu ala ya. O kpugheworo ha nzube ya, o nyewokwa ha ihe inyeaka na nghọta ime mmụọ site na mmụọ nsọ ya. (Abụ Ọma 51:11; 119:105; 1 Ndị Kọrint 2:10-13) N’ihi ọnọdụ ndị a pụrụ iche, Jehova ji ịhụnanya na-akpọku ndị ohu ya n’elu ala inye ya azịza banyere onwe ha ma maka ihe ha bụ na maka ihe ha rụzuru n’ike ya na site n’enyemaka nke mmụọ nsọ ya.
2. (a) N’ụzọ dịgasị aṅaa ka Nehemaịa si nye Chineke azịza dị mma banyere onwe ya? (b) Arịrịọ dị aṅaa ka Nehemaịa ji mechie akwụkwọ Bible bu aha ya?
2 Otu nwoke nyere azịza dị mma banyere onwe ya nye Chineke bụ Nehemaịa, onye na-eburu Eze Ataksakses (Longimanus) nke Peasia ihe ọṅụṅụ. (Nehemaịa 2:1) Nehemaịa ghọrọ onye ọchịchị ndị Juu ma wughachi mgbidi Jerusalem n’ebe e nwere ndị iro na ihe ize ndụ. Site n’ịnụ ọkụ n’obi maka ezi ofufe, o tinyere Iwu Chineke n’ọrụ ma gosi nchegbu maka ndị a na-emegbu. (Nehemaịa 5:14-19) Nehemaịa gbara ndị Livaị ume ido onwe ha ọcha mgbe nile, chee ọnụ ụzọ ámá nche, ma doo Ụbọchị Izu Ike nsọ. Ya mere ọ pụrụ ikpe ekpere, sị: “Chineke m, chetakwara m ihe a, meekwara m ebere, dị ka ịba ụba nke ebere Gị si dị.” N’ụzọ kwesịkwara ekwesị, Nehemaịa mechiri akwụkwọ ya e dere n’ike mmụọ nsọ Chineke n’arịrịọ a: “Chineke m, cheta m, imere m ezi ihe.”—Nehemaịa 13:22, 31.
3. (a) Olee otú ị ga-esi kọwaa onye na-eme ihe ọma? (b) Ịtụgharị uche n’ụzọ Nehemaịa gbasoro pụrụ ịkpatara anyị ịjụ onwe anyị ajụjụ dịgasị aṅaa?
3 Onye na-eme ezi ihe bụ onye dị mma ma na-eme ihe ndị ziri ezi nke na-abara ndị ọzọ uru. Nehemaịa bụ ụdị mmadụ ahụ. O nwere egwu nsọpụrụ Chineke na ịnụ ọkụ n’obi dị ukwuu maka ezi ofufe. Ọzọkwa, o nwere ekele maka ihe ùgwù ya nile n’ozi Chineke ma nye azịza dị mma banyere onwe ya nye Jehova. Ịtụgharị uche n’ụzọ ya pụrụ nnọọ ime ka anyị jụọ onwe anyị, sị, ‘Olee otú m si ele ihe ùgwù na ibu ọrụ ndị Chineke nyere m anya? Azịza dị aṅaa ka m na-enye Jehova Chineke na Jisọs Kraịst banyere onwe m?’
Ihe Ọmụma Na-eme Anyị Ndị Ga-aza Ajụjụ
4. Ọrụ dị aṅaa ka Jisọs nyere ụmụazụ ya, gịnịkwa ka ndị “e doro ịnata ndụ ebighị ebi” mere?
4 Jisọs nyere ụmụazụ ya ọrụ a: “Gaanụ, mee mba nile ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ m, na-eme ha baptism . . . , na-ezi ha ka ha debe ihe nile, ka ha hà bụ́ nke M nyere unu n’iwu.” (Matiu 28:19, 20) A gaje ime ndị na-eso ụzọ site n’izi ha ihe. A gaje ime ndị e si otú a zie ihe na ndị e “doro ịnata ndụ ebighị ebi” baptism, dị ka e mere Jisọs. (Ọrụ 13:48; Mak 1:9-11) Ọchịchọ ha idebe ihe nile o nyeworo n’iwu ga-esite n’obi. Ha ga-eru n’ọnọdụ nke ime nraranye site n’ịnara na itinye ezi ihe ọmụma nke Okwu Chineke n’ọrụ.—Jọn 17:3.
5, 6. Olee otú anyị ga-esi aghọta Jemes 4:17? Nye ihe atụ itinye ya n’ọrụ.
5 Ka ihe ọmụma anyị nke Akwụkwọ Nsọ na-adịwanye omimi, otú ahụ ka ntọala maka okwukwe anyị na-aka mma. N’otu oge ahụ, ajụjụ anyị ga-aza Chineke na-adịwanye ukwuu. Jemes 4:17 na-asị: “Onye matara ime ihe ọma, ma o meghị ya, ọ bụụrụ onye ahụ mmehie.” O doro anya na okwu a bụ mmechi nke ihe Jemes onye na-eso ụzọ ka kwupụrụ banyere itu ọnụ kama ịdabere kpam kpam n’ebe Chineke nọ. Ọ bụrụ na mmadụ maara na ya apụghị imezu ihe ọ bụla na-adịgide adịgide n’enweghị enyemaka Jehova ma ghara ime ihe n’ụzọ kwekọrọ na ya, nke a bụ mmehie. Ma okwu Jemes pụkwara imetụta mmehie ndị nke nleghara anya. N’ilu Jisọs nke atụrụ na ụmụ ewu, dị ka ihe atụ, a mara ụmụ ewu ahụ ikpe, ọ bụghị n’ihi ime ihe ọjọọ, kama n’ihi enyereghị ụmụnna Kraịst aka.—Matiu 25:41-46.
6 Otu nwoke onye Ndịàmà Jehova na-amụrụ Bible na-enwe ọganihu ime mmụọ dị nta, nke doro anya na ọ bụ n’ihi na ọ kwụsịghị ise sịga, ọ bụ ezie na ọ maara na ya kwesịrị ime otú ahụ. Otu okenye gwara ya ka ọ gụọ Jemes 4:17. Mgbe o kwusịrị okwu banyere ihe akụkụ akwụkwọ nsọ ahụ pụtara, okenye ahụ sịrị: “Ọ bụ ezie na e mebeghị gị baptism, ị ga-aza ajụjụ, ị ghaghịkwa ibu ibu ọrụ nile nke mkpebi gị.” Ọ bụ ihe obi ụtọ na nwoke ahụ ṅara ntị, kwụsị ise sịga, ngwa ngwa kwa ruo eru maka baptism ná ngosipụta nke nraranye ya nye Jehova Chineke.
Ndị Ga-aza Ajụjụ Maka Ozi Anyị
7. Olee otu ụzọ isi gosipụta obi ekele anyị maka “ihe ọmụma Chineke”?
7 Ọchịchọ anyị sitere n’obi kwesịrị ịbụ ime ihe na-atọ Onye Okike anyị ụtọ. Otu ụzọ isi gosipụta obi ekele anyị maka “ihe ọmụma Chineke” bụ ịrụ ọrụ nke ime ndị na-eso ụzọ Ọkpara ya, bụ́ Jisọs Kraịst. Nke a bụkwa ụzọ isi gosi ịhụnanya anyị maka Chineke na maka onye agbata obi anyị. (Ilu 2:1-5; Matiu 22:35-40) Ee, ihe ọmụma anyị banyere Chineke na-eme ka anyị bụrụ ndị ga-aza ya ajụjụ, ọ dịkwa anyị mkpa ile ụmụ mmadụ ibe anyị anya dị ka ndị nwere ike ịbụ ndị na-eso ụzọ.
8. N’ihi gịnị ka anyị pụrụ iji kwuo na Pọl nwere mmetụta nke ịza Chineke ajụjụ maka ozi ya?
8 Pọl onyeozi maara na nnakwere site n’obi nile na nrubeisi nye ozi ọma ahụ na-arụpụta nzọpụta, ebe ọjụjụ ya pụrụ iweta mbibi. (2 Ndị Tesalọnaịka 1:6-8) N’ihi ya o nwere mmetụta nke ịbụ onye ga-aza Jehova ajụjụ maka ozi ya. N’ezie, Pọl na ndị òtù ya ji ozi ha kpọrọ ihe nke ukwuu nke na ha ji nlezianya zere ọbụna inye echiche nke ime uru ego site na ya. Ọzọkwa, obi Pọl kwaliri ya ikwu, sị: “A sị na ana m ezisa ozi ọma, enweghị m ihe ịnya isi; n’ihi na mkpa na-akpa m; n’ihi na ahụhụ dịịrị m, a sị na ezisaghị m ozi ọma.”—1 Ndị Kọrint 9:11-16.
9. Ụgwọ dị aṅaa gbara ọkpụrụkpụ ka ndị Kraịst nile na-aghaghị ịkwụ?
9 Ebe anyị bụ ndị ohu Jehova raara onwe ha nye, ‘mkpa na-akpa anyị izisa ozi ọma ahụ.’ Ọ bụ ọrụ anyị ikwusa ozi Alaeze ahụ. Anyị nakweere ibu ọrụ ahụ mgbe anyị raara onwe anyị nye Chineke. (Tụlee Luk 9:23, 24.) Ọzọkwa, anyị nwere ụgwọ anyị ga-akwụ. Pọl sịrị: “Eji m mmadụ nile ụgwọ, ma ndị Grik ma ndị na-asụ asụsụ ọzọ, ma ndị maara ihe ma ndị na-enweghị uche. Otú a, ka ihe banyere mụ onwe m hà, ọ dị m ọkụ n’obi izikwa unu ndị bi na Rom ozi ọma.” (Ndị Rom 1:14, 15) Pọl ji ụgwọ n’ihi na ọ maara na ọ bụ ọrụ ya ime nkwusa ka ndị mmadụ wee nwee ike ịnụ ozi ahụ, e wee zọpụta ha. (1 Timoti 1:12-16; 2:3, 4) Ya mere ọ rụsiri ọrụ ike ịrụzu ọrụ ya na ịkwụ ụgwọ o ji ụmụ mmadụ ibe ya. Dị ka ndị Kraịst, anyị onwe anyị kwa nwere ụgwọ dị otú ahụ ịkwụ. Nkwusa Alaeze bụkwa ụzọ bụ isi nke igosipụta ịhụnanya maka Chineke, maka Ọkpara ya, na maka ndị agbata obi anyị.—Luk 10:25-28.
10. Site n’ime gịnị ka ụfọdụ gbasapụworo ozi ha?
10 Otu ụzọ isi nye Chineke azịza ọ na-anakwere bụ iji ikike anyị nile gbasapụ ozi anyị. Iji maa atụ: E nwewo nnubata nke ndị mmadụ sitere n’ọtụtụ mba n’ime Britain n’afọ ndị a. Iji jiri ozi ọma ahụ rute ndị dị otú ahụ, ihe karịrị ndị ọsụ ụzọ 800 (ndị nkwusa oge nile nke Alaeze) na ọtụtụ narị Ndịàmà ọzọ na-amụ asụsụ dị iche iche. Nke a akpatawo mkpali dị mma nye ozi ahụ. Otu ọsụ ụzọ na-akụzi asụsụ Chinese kwuru, sị: “Ọ dịghị mgbe m chere na ọ dị mgbe m ga-akụziri Ndịàmà ọzọ asụsụ m, ka ha wee soro ndị ọzọ kerịta eziokwu ahụ n’ụzọ dị otú a. Ọ na-enye nnọọ afọ ojuju!” Ị̀ pụrụ ịgbasapụ ozi gị n’ụzọ yiri nke a?
11. Gịnị mere mgbe otu onye Kraịst gbara àmà mberede?
11 Ma eleghị anya, onye ọ bụla n’ime anyị ga-eme ihe anyị pụrụ ime iji zọpụta onye mmiri na-eri. Ndị ohu Jehova na-anụ ọkụ n’obi n’otu aka ahụ iji ikike ha nile gbaa àmà n’ohere ọ bụla. Otu Onyeàmà n’isi nso a nọ n’akụkụ otu nwanyị n’ime bọs ma gwa ya okwu banyere Akwụkwọ Nsọ. N’ịbụ onye ihe ọ nụrụ kpaliri, nwanyị ahụ jụrụ ọtụtụ ajụjụ. Mgbe Onyeàmà ahụ chọrọ ịrịtu na bọs, nwanyị ahụ rịọrọ ya ka ọ bịa n’ụlọ ya kama ịrịtu, ebe ọ ka nwere ọtụtụ ajụjụ. Onyeàmà ahụ kwenyere. Gịnị ka ọ rụpụtara? A malitere ọmụmụ Bible, ọnwa isii kwa n’ihu nwanyị ahụ ghọrọ onye nkwusa Alaeze a na-emebeghị baptism. Ngwa ngwa ọ na-eduzi ọmụmụ Bible ebe obibi isii nke ya. Lee aha ụgwọ ọrụ na-akpali akpali ọ bụ maka mmadụ iji ikike ya nile mee ihe n’ozi Alaeze!
12. Olee otú anyị pụrụ isi jiri ikike anyị dị ka ndị ozi mee ihe nke ọma n’ije ozi ubi?
12 A pụrụ iji ikike anyị dị ka ndị ozi mee ihe n’ụzọ dị irè n’ubi site n’iji mbipụta ndị dị ka akwụkwọ ahụ nwere 192 peji bụ́ Ihe Ọmụma nke Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi eme ihe. Ka ọ na-erule April 1996, Kọmitii Ihe Odide nke Òtù Na-achị Isi nke Ndịàmà Jehova akwadowo mbipụta nke akwụkwọ Ihe Ọmụma n’ihe karịrị asụsụ 140, ka ọ na-erukwa mgbe ahụ e biworị 30,500,000 n’asụsụ 111. E dere akwụkwọ a n’ebumnobi nke inyere ndị a na-eduziri ọmụmụ Bible aka ịmụta ihe zuru ezu banyere Okwu na nzube Chineke iji mee nrara nye Jehova ma mee baptism. Ebe ọ bụ na ndị nkwusa Alaeze agajeghị ịdị na-eduziri otu onye a na-amụrụ ihe ọmụmụ Bible ebe obibi ruo ọtụtụ afọ, ha pụrụ iduziri ọtụtụ mmadụ karị ọmụmụ ihe ma ọ bụ welite òkè ha na-ekere n’ọrụ ụlọ n’ụlọ na n’ụdị ndị ọzọ nke ozi ahụ. (Ọrụ 5:42; 20:20, 21) N’ịmata na ha gaje ịza Chineke ajụjụ, ha na-adọrọ uche gaa n’ịdọ aka ná ntị Chineke. (Ezikiel 33:7-9) Ma ihe bụ isi na-amasị ha bụ inye Jehova nsọpụrụ na inyere ọtụtụ mmadụ dị ka o kwere omume aka ịmụta banyere ozi ọma ahụ n’oge dị mkpirikpi ka fọrọnụ maka ajọ usoro ihe a.
Inye Azịza Dị Mma Dị Ka Ezinụlọ
13. N’ihi gịnị ka ezinụlọ ndị na-atụ egwu Chineke kwesịrị iji na-enwechi ọmụmụ Bible ezinụlọ anya?
13 Mmadụ na ezinụlọ ọ bụla na-anabata ezi Iso Ụzọ Kraịst gaje ịza Chineke ajụjụ, n’ihi ya kwa kwesị ‘iru n’itozu okè’ ma “dị ike n’okwukwe.” (Ndị Hibru 6:1-3; 1 Pita 5:8, 9) Dị ka ihe atụ, ọ dị mkpa ka ndị mụworo akwụkwọ Ihe Ọmụma, e meekwa ha baptism nwetazuo ihe ọmụma Akwụkwọ Nsọ site n’ịgachi nzukọ anya nakwa site n’ịgụ Bible na akwụkwọ ndị ọzọ nke ndị Kraịst. Ezinụlọ ndị na-atụ egwu Chineke kwesịkwara inwechi ọmụmụ ihe ezinụlọ anya, n’ihi na nke ahụ bụ ụzọ dị mkpa isi ‘na-eche nche, na-eguzosi ike n’okwukwe, na-abụ ndị ikom, na-adị ike.’ (1 Ndị Kọrint 16:13) Ọ bụrụ na ị bụ onye isi ezinụlọ, ị kasị nwee ajụjụ ịza nye Chineke maka ijide n’aka na ị na-enyeju ezinụlọ gị afọ n’ụzọ ime mmụọ. Dị nnọọ ka nri nkịtị na-edozi ahụ na-etinye ihe n’ahụ ike nkịtị, otú ahụ ka ụba nri ime mmụọ nke chiri anya dị mkpa ma ọ bụrụ na gị na ezinụlọ gị ga-anọgide ‘n’ahụ ike n’ime okwukwe.’—Taịtọs 1:13.
14. Gịnị ka àmà nwa agbọghọ Israel a kụziiri ihe nke ọma gbara rụpụtara?
14 Ọ bụrụ na e nwere ụmụaka n’ezinụlọ gị, Chineke ga-edekọ ihe ọma banyere gị maka inye ha ọzụzụ ime mmụọ dị mma. Nkụzi dị otú ahụ ga-abara ha uru, dị ka ọ baara otu nwa agbọghọ nta nke Israel onye ndị Siria jidere n’ụbọchị onye amụma Chineke bụ́ Elaịsha. Ọ ghọrọ ohu nwanyị nke nwunye ọchịagha ndị Siria na-arịa ekpenta, bụ́ Neaman. Ọ bụ ezie na nwa agbọghọ ahụ dị nta, ọ gwara nne ya ukwu, sị: “Ọ ga-adị m nnọọ mma, ma a sị na onye nwe m nọ n’ihu onye amụma nke nọ na Sameria! mgbe ahụ ọ ga-eme ka o si n’ekpenta ya dị ọcha soro ndị ya zukọta.” N’ihi ịgba àmà ya, Neaman gara Israel, mesịa gbasoo ntụziaka Elaịsha ịga saa ahụ ugboro asaa n’Osimiri Jọdan, e meekwa ka ọ dị ọcha pụọ n’ekpenta. Ọzọkwa, Neaman ghọrọ onye na-efe Jehova. Lee ka nke ahụ ga-esiworị tọọ nwa agbọghọ nta ahụ ụtọ!—2 Ndị Eze 5:1-3, 13-19.
15. N’ihi gịnị ka o ji dị mkpa ka ndị nne na nna nye ụmụ ha ọzụzụ ime mmụọ dị mma? Nye ihe atụ.
15 Ọ dịghị mfe ịzụlite ụmụ na-atụ egwu Chineke n’ụwa a na-enweghị omume ọma nke na-atọgbọ n’aka Setan. (1 Jọn 5:19) Otú ọ dị, site n’oge Timoti dị na nwa ọhụrụ, nne ya ochie bụ́ Lọịs na nne ya, bụ́ Yunaịsị, kụziiri ya Akwụkwọ Nsọ n’ụzọ gara nke ọma. (2 Timoti 1:5; 3:14, 15) Iso ụmụ gị na-amụ Bible, ịkpọ ha agachi nzukọ ndị Kraịst anya, na imesịa mee ka ha sonyere gị n’ozi bụcha akụkụ nke usoro ọzụzụ ndị ị na-aghaghị inye Chineke azịza. Otu onye Kraịst na Wales, onye nọ ugbu a n’etiti afọ ndị 80 ya, na-echeta na n’afọ ndị mbụ nke 1920, nna ya na-akpọrọ ya mgbe ọ na-aga kilomita 10 gabiga otu ugwu (njem dị kilomita 20 ụga na ụla) iji kesaara ndị ime obodo bi ná ndagwurugwu dị ya nso traktị Bible. “Ọ bụ n’oge ime njem ndị a ka nna m kụbanyere eziokwu ahụ n’obi m,” ka o ji obi ekele na-ekwu.
Ndị Okenye Ga-aza Ajụjụ—N’ụzọ Dị Aṅaa?
16, 17. (a) Ihe ùgwù dịgasị aṅaa ka ndị okenye tozuru okè n’ụzọ ime mmụọ nwere n’Israel oge ochie? (b) E jiri ya tụnyere ọnọdụ dị n’Israel oge ochie, n’ihi gịnị ka e ji chọọ ihe ka ukwuu n’aka ndị okenye ndị Kraịst taa?
16 “Okpueze nke mara mma ka isi awọ bụ, n’ụzọ ezi omume ka a ga-ahụ ya,” ka nwoke amamihe bụ́ Solomọn kwuru. (Ilu 16:31) Ma ọ bụghị nanị afọ ndụ nkịtị na-akwadebe mmadụ maka ibu ọrụ n’ọgbakọ ndị Chineke. Ndị okenye tozuru okè n’ụzọ ime mmụọ n’Israel oge ochie jere ozi dị ka ndị ikpe na ndị ọrụ maka ịhụ na e debere ezi ikpe na maka idebe udo, ezi ịdị n’usoro, na ahụ ike ime mmụọ. (Deuterọnọmi 16:18-20) Ọ bụ ezie na otu ihe ahụ bụ eziokwu n’ọgbakọ ndị Kraịst, a chọrọ ihe ka ukwuu n’aka ndị okenye ka ọgwụgwụ nke usoro ihe nke a na-eru nso. N’ihi gịnị?
17 Ndị Israel bụ ‘ndị a họpụtara’ bụ́ ndị Chineke napụtara n’Ijipt oge ochie. Ebe ha natara Iwu ahụ site n’aka onye ogbugbo ha, bụ́ Mosis, a mụnyere ụmụ ha ná mba a raara nye, ha makwaara ụkpụrụ Jehova nke ọma. (Deuterọnọmi 7:6, 11) Otú ọ dị, ọ dịghị onye a na-amụnye ná mba dị otú ahụ taa a raara nye, ọ bụkwa nnọọ mmadụ ole na ole na-etolite n’ezinụlọ na-atụ egwu Chineke, ndị maara eziokwu Akwụkwọ Nsọ nke ọma. Ndị ka malitere ọhụrụ ‘ijegharị n’eziokwu ahụ’ karịsịa pụrụ inwe mkpa ntụziaka nke ụzọ isi bie ndụ kwekọrọ n’ụkpụrụ Akwụkwọ Nsọ. (3 Jọn 4) Lee ibu ọrụ na-adịkwasị n’ubu ndị okenye na-ekwesị ntụkwasị obi n’ihi ya ka ha ‘na-ejide ihe ilereanya nke okwu na-enye ezi ndụ’ ma na-enyere ndị Jehova aka!—2 Timoti 1:13, 14.
18. Ụdị enyemaka dị aṅaa ka ndị okenye ọgbakọ na-aghaghị ịdị njikere inye, n’ihi gịnịkwa?
18 Nwatakịrị na-amụ ije nwere ike ịsụ ngọngọ ma daa. Ọ na-enwe mmetụta nke anọghị ná nchebe ma chọọ enyemaka na mmesi obi ike nke nne na nna. Onye raara onwe ya nye Jehova pụrụ n’otu aka ahụ ịsụ ngọngọ ma ọ bụ daa n’ụzọ ime mmụọ. Ọbụna Pọl onyeozi hụrụ na ọ dị mkpa ịgba mgba ime ezi ihe ma ọ bụ ihe ọma n’anya Chineke. (Ndị Rom 7:21-25) Ọ dị ndị na-azụ ìgwè atụrụ Chineke mkpa inyere ndị Kraịst dahieworo ma chegharịa n’ezie aka n’ụzọ ịhụnanya. Mgbe ndị okenye letara otu nwanyị raara onwe ya nye nke hieworo ụzọ nke dị oké njọ, o kwuru n’ihu di ya raara onwe ya nye: “Amaara m na unu ga-achụpụ m!” Ma ọ malitere ibe ákwá mgbe a gwara ya na ndị okenye chọrọ ịmara ụdị enyemaka dị mkpa iji weghachi ezinụlọ ahụ n’ụzọ ime mmụọ. N’ịmara na ha aghaghị ịza ajụjụ, ndị okenye nwere obi ụtọ inyere onye kwere ekwe ibe ha nke chegharịrịnụ aka.—Ndị Hibru 13:17.
Nọgide Na-enye Azịza Dị Mma
19. Olee otú anyị pụrụ isi nọgide na-enye Chineke azịza dị mma banyere onwe anyị?
19 Ọ dị ndị okenye ọgbakọ na ndị ohu Chineke nile ndị ọzọ mkpa ịnọgide na-enye azịza dị mma banyere onwe ha nye Jehova. Nke a kwere omume ma anyị rapagidesie ike n’Okwu Chineke ma na-eme uche ya. (Ilu 3:5, 6; Ndị Rom 12:1, 2, 9) Karịsịa anyị na-achọ imere ndị ezinụlọ nke okwukwe anyị ihe ọma. (Ndị Galetia 6:10) Otú ọ dị, owuwe ihe ubi ahụ ka hiri nne, ndị ọrụ ka dịkwa ole na ole. (Matiu 9:37, 38) Ya mere ka anyị meere ndị ọzọ ihe ọma site n’iji ịdị uchu na-akpọsa ozi Alaeze. Jehova ga-edekọ ihe ọma banyere anyị ma ọ bụrụ na anyị emezuo nraranye anyị, mee uche ya, ma jiri ikwesị ntụkwasị obi kpọsaa ozi ọma ahụ.
20. Gịnị ka anyị na-amụta site n’ịtụle ụzọ Nehemaịa gbasoro?
20 Ya mere ka anyị nọgide na-arụbiga ọrụ Onyenwe anyị ókè. (1 Ndị Kọrint 15:58) Anyị ga-emekwa nke ọma ịtụle banyere Nehemaịa, onye wughachiri mgbidi Jerusalem, hụ na e tinyere Iwu Chineke n’ọrụ, ma jiri ịnụ ọkụ n’obi kwalite ezi ofufe. O kpere ekpere na Jehova Chineke ga-echeta ya n’ihi ihe ọma o meworo. Ka ị bụrụ onye raara onwe ya nye Jehova dị ka ya, ka o dekọkwaara gị ihe ọma.
Gịnị Bụ Azịza Gị?
◻ Olee ihe nlereanya Nehemaịa setịpụrụ?
◻ N’ihi gịnị ka ihe ọmụma ji eme anyị ndị ga-aza Chineke ajụjụ?
◻ Olee otú anyị pụrụ isi nye Jehova azịza a na-anakwere n’ozi anyị?
◻ Gịnị ka ezinụlọ dị iche iche pụrụ ime iji nye Chineke azịza dị mma?
◻ Olee otú ndị okenye ndị Kraịst si aza ajụjụ?
[Foto ndị dị na peeji nke 18]
Dị ka Pọl, anyị pụrụ inye Chineke azịza dị mma dị ka ndị nkwusa Alaeze
[Foto dị na peeji nke 19]
Ụmụ gị hà siri ike n’okwukwe dị ka nwa agbọghọ nta Israel ahụ nọ n’ụlọ Neaman?